Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere ndị iro Jizọs ji katọọ ya maka ihe gbasara ịkwọ aka?

Ịkwọ aka so n’ọtụtụ ihe mere ndị iro Jizọs ji katọọ ya na ndị na-eso ụzọ ya. Iwu Mozis kwuru ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ ghara ịdị ọcha. O nwere ike ịbụ na e nwere ihe na-agbapụta onye ahụ n’ahụ́, na ọ bụ onye ekpenta, ma ọ bụ na o metụrụ ozu mmadụ ma ọ bụ nke anụmanụ aka. Ihe ọzọ e kwuru n’iwu ahụ bụ otú e si eme ka onye na-adịghị ọcha dị́ ọcha. Onye ahụ nwere ike ịchụ àjà, ịsụ ákwà ya, ma ọ bụkwanụ e fesa yanwa mmiri.—Lev., isi nke 11 ruo 15; Ọnụ Ọgụ., isi nke 19.

Ndị na-akụzi ihe n’okpukpe ndị Juu tinyere iwu ndị ahụ nnu na ose. Otu akwụkwọ kwuru na ndị Farisii ‘na-enyocha ihe ọ bụla na-eme ka mmadụ bụrụ onye na-adịghị ọcha, mata otú o si bute ya, ma ò nwere ike ibufe ya mmadụ, otú o nwere ike isi bufee ya, ihe ndị a ga-emeli ka ha ghara ịdị ọcha na ihe ndị a na-agaghị emeli ka ha ghara ịdị ọcha nakwa otú e nwere ike isi mee ka ha dị́ ọcha.’

Ndị iro Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị mere na ndị na-eso ụzọ gị adịghị eme omume dị ka ọdịnala ndị oge gboo si dị, kama ha na-eji aka e merụrụ emerụ eri nri ha?” (Mak 7:5) Ihe ndị Farisii ahụ jụrụ Jizọs agbasaghị ụdị ịkwọ aka mmadụ kwesịrị ịkwọ tupu ya eriwe nri ka ọ ghara ibute ọrịa. Omenala ha bụ na tupu mmadụ eriwe nri, a ga-awụsa onye ahụ mmiri n’aka. Akwụkwọ ahụ kwukwara na ndị Farisii “na-arụkwa ụka gbasara ụdị ihe e kwesịrị iji wụsa onye ahụ mmiri n’aka, ụdị mmiri e kwesịrị ịwụsa ya, onye kwesịrị ịwụsa ya, na ebe e kwesịrị ịwụsaru mmiri n’aka onye ahụ.”

Otú Jizọs si were iwu niile ahụ ndị mmadụ ji aka ha mee doro anya. Ọ gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu n’oge ahụ, sị: “Aịzaya buru amụma n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere unu, unu ndị ihu abụọ, dị ka e dere, sị, ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ. Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.’ Unu na-ahapụ iwu Chineke ma na-agbasosi ọdịnala ụmụ mmadụ ike.”—Mak 7:6-8.