Ndị Na-emesapụ Aka Na-enwe Obi Ụtọ
“A na-enweta obi ụtọ . . . n’inye ihe.”—ỌRỤ 20:35.
1. Olee ihe na-egosi na Jehova na-emesapụ aka?
Ọ BỤ eziokwu na e nwere mgbe Jehova nọ naanị ya tupu ya amalite ike ihe, ma ọ naghị eche naanị banyere onwe ya. O mechakwara kee ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ. Ọ na-atọ Jehova ụtọ imere anyị ihe ọma n’ihi na ọ bụ ‘Chineke onye obi ụtọ.’ (1 Tim. 1:11; Jems 1:17) Ebe ọ bụ na ọ chọkwara ka anyị na-enwe obi ụtọ, ọ na-akụziri anyị ka anyị na-emesapụ aka.—Rom 1:20.
2, 3. (a) Gịnị mere imesapụ aka ji eme ka anyị na-enwe obi ụtọ? (b) Olee ihe anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?
2 Chineke kere mmadụ n’onyinyo ya. (Jen. 1:27) Nke a pụtara na Jehova kere anyị ka anyị na-akpa àgwà ka ya. Ka anyị nwee ike ịna-enwe obi ụtọ, Jehova agọziekwa anyị, anyị kwesịrị ịna-eme ka Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, na ịna-emesapụ aka. (Fil. 2:3, 4; Jems 1:5) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova kere anyị ka anyị na-eme otú ahụ. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ịna-emesapụ aka ka Jehova.
3 Baịbụl gwara anyị otú anyị nwere ike isi na-emesapụ aka. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kụziri banyere imesapụ
aka. Anyị ga-ahụ otú imesapụ aka ga-esi eme ka Chineke gọzie anyị, nakwa otú ọ ga-esi enyere anyị aka ịrụ ọrụ Chineke nyere anyị. Anyị ga-atụlekwa otú imesapụ aka ga-esi eme ka anyị na-enwe obi ụtọ, nakwa ihe mere anyị ji kwesị ịna-emesapụ aka.JEHOVA GA-AGỌZI ANYỊ MA ANYỊ NA-EMESAPỤ AKA
4, 5. Olee otú Jehova na Jizọs si na-emesapụ aka, gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji na-eṅomi ha?
4 Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ na-eṅomi ya. N’ihi ya, obi na-atọ ya ụtọ ma anyị na-emesapụ aka. (Efe. 5:1) Ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ihe mere anyị ji mata bụ na o kere anyị n’ụzọ dị egwu, meekwa ka ụwa anyị a mara mma na ihe niile dị na ya na-atọ anyị ụtọ. (Ọma 104:24; 139:13-16) N’ihi ya, anyị na-asọpụrụ ya ma anyị na-agbalị eme ka ndị ọzọ na-enwe obi ụtọ.
5 Ezigbo Ndị Kraịst na-eṅomi Kraịst, bụ́ onye gosiri anyị otú ụmụ mmadụ nwere ike isi na-emesapụ aka. Jizọs kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mat. 20:28) Pọl onyeozi gwakwara Ndị Kraịst, sị: “Nweenụ ụdị echiche a n’ime onwe unu bụ́ nke Kraịst Jizọs nwekwara . . . O mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu.” (Fil. 2:5, 7) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ nwere ike ime ka Jizọs karịadị otú m na-eme ugbu a?’—Gụọ 1 Pita 2:21.
6. Gịnị ka Jizọs ji ihe atụ o mere banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi kụziere anyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
6 Jehova ga-agọzi anyị ma anyị na-eṅomi ya na Ọkpara ya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, nakwa ịchọ otú anyị ga-esi na-enyere ha aka. N’ihe atụ Jizọs mere banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi, o mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị inyere ndị ọzọ aka, ma ndị si agbụrụ ọzọ. (Gụọ Luk 10:29-37.) Ì chetara ihe mere Jizọs ji nye ihe atụ ahụ? Ọ bụ n’ihi na otu onye Juu jụrụ ya, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Ihe Jizọs zara ya gosiri na anyị kwesịrị ịna-enyere ndị ọzọ aka otú ahụ onye Sameria ahụ mere ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gọzie anyị.
7. Olee otú anyị si egosi na anyị kwetasiri ike na ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme bụ ihe kacha mma anyị kwesịrị ime? Kọwaa.
7 Ndị Kraịst nwere ọtụtụ ihe mere ha kwesịrị iji na-emesapụ aka. Dị ka ihe atụ, àgwà a gbasara ihe Setan kwuru n’ogige Iden. Olee otú o si gbasa ya? Setan kwuru na Adam na Iv ga-aka enwe obi ụtọ ma ha na-eme ihe ga-abara naanị onwe ha uru kama irubere Chineke isi. Ihe a Setan kwuru gbasakwara mmadụ niile taa. Iv mere ihe ga-abara naanị onwe ya uru n’ihi na ọ chọrọ ịdị ka Chineke. Adam mekwara ihe ga-abara naanị onwe ya uru ma mee ihe nwunye ya chọrọ kama ime ihe Chineke chọrọ. (Jen. 3:4-6) O doro onye ukwu na onye nta anya na ihe a ha mere kpatara ezigbo nsogbu. Mmadụ ime ihe ga-abara naanị onwe ya uru anaghị eme ka ọ na-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-emesapụ aka, anyị na-egosi na anyị kwetasiri ike na ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme bụ ihe kacha mma anyị kwesịrị ime.
ỊRỤ ỌRỤ CHINEKE NYERE NDỊ OHU YA
8. Gịnị mere Adam na Iv kwesịrị iji na-eche banyere ndị ọzọ?
8 Ihe Chineke gwara Adam na Iv kwesịrị ime ka ha na-eche gbasara ndị ọzọ n’agbanyeghị na ọ bụ naanị ha nọ n’ogige Iden. Jehova gọziri ha ma gwa ha ka Jen. 1:28) Otú ahụ Onye kere anyị chọrọ ka ụmụ mmadụ na-enwe obi ụtọ ka Adam na Iv kwesịkwara ịchọ ka ụmụ ha ga-amụta na-enwe obi ụtọ. Jehova chọrọ ka ha mee ka ụwa niile ghọọ Paradaịs ka ọ baara ụmụ ha niile uru. Ọrụ a abụghị obere ọrụ. Ọ chọrọ ka ụmụ Adam niile gbakọta aka mee ka ụwa ghọọ Paradaịs.
ha baa ụba, jupụta ụwa ma meekwa ka ọ dịrị n’okpuru ha. (9. Olee otú ime ka ụwa ghọọ Paradaịs gaara esi eme ka ụmụ mmadụ na-enwe obi ụtọ?
9 Ụmụ mmadụ zuru okè na Jehova kwesịrị ịrụkọ ọrụ ka ha nwee ike ime ka ụwa ghọọ Paradaịs ma mezuo nzube ya. Ha ga-esi otú a banye n’izu ike ya. (Hib. 4:11) Chegodị otú obi gaara esi na-atọ ha ụtọ mgbe ha na-arụ ọrụ a. Jehova gaara agọzi ha mmaji kwuru mmaji maka ime ihe ga-abara ndị ọzọ uru.
10, 11. Olee otú anyị ga-esi kwusaa ozi ọma ma mee ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?
10 Taa, Jehova nyere anyị ọrụ pụrụ iche anyị ga-arụ. Ọ chọrọ ka anyị na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ a, anyị kwesịrị ịna-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ihe ga-eme ka anyị nọgide na-arụ ọrụ a bụ ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya.
11 N’oge ndị ozi Jizọs, Pọl kwuru na ya na Ndị Kraịst ndị ọzọ bụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” n’ihi na ha na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ eziokwu. (1 Kọr. 3:6, 9) Taa, anyị nwekwara ike ịbụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” ma anyị jiri oge anyị, ihe ndị anyị nwere, na ike anyị na-ekwusa ozi ọma Chineke gwara anyị na-ekwusa. Ihe a bụ ezigbote ihe ùgwù.
12, 13. Olee uru ọ bara ime ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?
12 Mmadụ iji oge ya na ike ya na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-eme ka ọ na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ihe a ka ọtụtụ ụmụnna ndị mụrụla mmadụ Baịbụl na ndị na-amụrụ mmadụ Baịbụl ugbu a na-ekwu. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ma anyị hụ ka ndị anyị na-amụrụ ihe na-aghọta ihe Baịbụl na-akụzi, okwukwe ha esikwuo ike, ha agbanwee otú ha si ebi ndụ ma na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị ha na-amụta. Obi tọkwara Jizọs ezigbo ụtọ mgbe mmadụ iri asaa ahụ o zipụrụ ka ha gaa kwusaa ozi ọma ‘ji ọṅụ lọta,’ n’ihi otú ndị mmadụ si gee ha ntị.—Luk 10:17-21.
13 Ụmụnna anyị n’ụwa niile na-enwekwa obi ụtọ ma ha hụ otú ndị mmadụ si agbanwe ndụ ha n’ihi ozi ọma a na-ezi ha. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị na-eto eto aha ya bụ Anna chọrọ ijekwuru Jehova ozi. N’ihi ya, ọ kwagara n’otu obodo dị na Yurop, bụ́ ebe a chọkwuru ndị nkwusa. * Nwanna nwaanyị a kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ ndị a na-amụrụ Baịbụl n’ebe a, ọ na-atọkwa m ezigbo ụtọ. Ozi m na-eje ebe a na-eme ka m na-enwe ezigbo obi ụtọ. Mgbe ọ bụla m si ozi ọma lọta, anaghị m enwe ohere iche banyere onwe m. M na-eche banyere nsogbu ndị m na-amụrụ Baịbụl na-enwe. M na-achọ otú m ga-esi na-agba ha ume ma na-egboro ha mkpa ha. Ekwetasiela m ike na ‘a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.’”—Ọrụ 20:35.
14. Olee otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’ozi ọ bụrụgodị na ọ bụ mmadụ ole na ole gere gị ntị?
14 Obi ga-atọ anyị ụtọ ma anyị gaa na nke ndị mmadụ ọ bụrụgodị na ha agaghị ege anyị ntị. A sị ka e kwuwe, ozi anyị na-ezi taa yiri ozi Jehova gwara Ezikiel onye amụma ka o zie. Jehova gwara ya, sị: “Gwa ha okwu m, ma hà ga-anụ ma ha agaghị anụ.” (Ezik. 2:7; Aịza. 43:10) Ọ bụrụgodị na ụfọdụ egeghị anyị ntị, anyị ma na Jehova ejighị mbọ anyị na-agba egwu egwu. (Gụọ Ndị Hibru 6:10.) Otu nwanna kwuru gbasara ozi ya, sị: “Anyị akụọla mkpụrụ, gbaa ya mmiri, kpee ekpere ma nwee olileanya na Jehova ga-eme ka ndị mmadụ nwekwuo mmasị.”—1 Kọr. 3:6.
OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ
15. Olee ihe ọtụtụ ndị na-eme ma e mesapụrụ ha aka, ma ò kwesịrị ime ka anyị ghara ịna-emesapụrụ ha aka?
15 Jizọs chọrọ ka anyị na-emesapụ aka ka anyị nwee ike ịna-enwe obi ụtọ. Obi na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ ma e mesapụrụ ha aka. Ọ bụ ya mere o ji gwa anyị, sị: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe. Ha ga-awụnyekwa n’apata ụkwụ unu ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, nke a bịara aka, yọkọta ọnụ, nke jubigakwara ókè. N’ihi na ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.” (Luk 6:38) Ọ bụghị mmadụ niile ga-enwe obi ụtọ mgbe i mesapụụrụ ha aka. Ma, ụfọdụ nwee obi ụtọ, o nwere ike ime ka hanwa na-emesapụkwa aka. N’ihi ya, na-enye ndị mmadụ ihe ma obi ọ̀ dị ha ụtọ ma ọ bụ na ọ dịghị ha. Ị maghị uru ihe ọma i meere mmadụ nwere ike ịbara ya.
16. Olee ndị ka anyị ga-emesapụrụ aka? N’ihi gịnịkwa?
16 O doro anya na ndị na-emesapụ aka anaghị enye ihe ka ha nweta ihe n’aka ndị Luk 14:13, 14) Otu onye so dee Baịbụl kwuru, sị: “Onye anya ya na-eme ebere ka a ga-agọzi.” Onye ọzọ kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe.” (Ilu 22:9; Ọma 41:1) N’eziokwu, anyị kwesịrị ịna-enye ndị ọzọ ihe n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ.
ha nyere ihe. Ọ bụ ihe a ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru, sị: “Mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, ndị ìsì; ị ga-enwekwa obi ụtọ, n’ihi na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ gị ụgwọ.” (17. Olee ụzọ anyị nwere ike isi na-enye ndị mmadụ ihe nke ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ?
17 Mgbe Pọl kwuru ihe Jizọs kwuru nke bụ́ na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe,” ihe ọ na-ekwu abụghị naanị inye mmadụ ego, kama na anyị nwekwara ike ịgba ndị nọ ná mkpa ume, iji Baịbụl nye ha ndụmọdụ, nakwa inyere ha aka n’ụzọ ndị ọzọ. (Ọrụ 20:31-35) Pọl si n’ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere gwa anyị na ọ dị mkpa ka anyị jiri oge anyị na ike anyị na-enyere ndị mmadụ aka, nakwa ka anyị na-ahụ ha n’anya ma na-elekọta ha.
18. Olee ihe ọtụtụ ndị na-eme nchọnchọ kwuru banyere inye ihe?
18 Ndị na-eme nchọnchọ banyere otú ndị mmadụ si akpa àgwà achọpụtala na inye mmadụ ihe na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Otu isiokwu dị n’otu akwụkwọ kwuru na ndị mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ha meere ndị ọzọ ihe. Ndị na-eme nchọnchọ na-ekwu na ọ bụrụ na anyị ana-enyere ndị mmadụ aka, ọ na-eme ka anyị na-eche na anyị ji ndụ anyị mee ihe bara uru. N’ihi ya, ụfọdụ ndị ọkachamara na-agwa ndị mmadụ ka ha na-arụrụ ndị mmadụ ọrụ ebere n’ihi na ọ ga-eme ka ha na-enwekwu obi ụtọ, ahụ́ agbasiekwa ha ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe a ha chọpụtara ejughị anyị anya n’ihi na Onye kere anyị, bụ́ Jehova agwala anyị ya ọtụtụ ugboro.—2 Tim. 3:16, 17.
NỌGIDE NA-EMESAPỤ AKA
19, 20. Olee ihe ndị mere i ji chọọ ịna-emesapụ aka?
19 O nwere ike isiri anyị ike ịna-emesapụ aka ma ndị anyị na ha nọ bụrụ ndị na-achọ ihe na-abara naanị onwe ha uru. Ma, Jizọs gwara anyị na iwu abụọ kachanụ bụ iji obi anyị niile, uche anyị niile, ike anyị niile hụ Jehova n’anya, nakwa ịhụ onye agbata obi anyị n’anya otú anyị hụrụ onwe anyị. (Mak 12:28-31) Anyị amụtala n’isiokwu a na ndị hụrụ Jehova n’anya na-eṅomi ya. Jehova na Jizọs na-emesapụ aka. Ha gwakwara anyị ka anyị na-eme otú ahụ n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị agbasie mbọ ike na-emesapụ aka n’ihe anyị na-emere Chineke na ndị ọzọ, ọ ga-eme ka a sọpụrụ Jehova, ya abaakwara anyị na ndị ọzọ uru.
20 O doro anya na ị na-agbalị inyere ndị ọzọ aka, nke ka nke, ụmụnna anyị. (Gal. 6:10) Ọ bụrụ na ị nọgide na-eme otú ahụ, ndị ọzọ ga-ahụ gị n’anya, obi ga-atọ ha ụtọ, na-atọkwa gịnwa ụtọ. Ilu 11:25 kwuru, sị: “Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba, onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.” N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi buru ezigbo ihe n’obi na-enye ndị mmadụ ihe ma n’ihe ndị anyị na-eme ma n’ozi ọma anyị na-ezi. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ ụzọ ndị ahụ.
^ para. 13 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.