Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 34

Ị Bara Uru n’Ọgbakọ Jehova

Ị Bara Uru n’Ọgbakọ Jehova

“Dị nnọọ ka ahụ́ ahụ bụ otu ma nwee ọtụtụ akụkụ, ọ bụ ezie na akụkụ niile nke ahụ́ ahụ dị ọtụtụ, ha bụ otu ahụ́, otú ahụ ka Kraịst dịkwa.”​—1 KỌR. 12:12.

ABỤ NKE 101 Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe na-eme anyị obi ụtọ?

OBI dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nọ n’ọgbakọ Jehova. Anyị na ụmụnna anyị dị n’udo, anyị ana-enwekwa obi ụtọ ka anyị na-efekọ Jehova ọnụ. Olee uru ị bara n’ọgbakọ?

2. Olee ihe Pọl onyeozi ji mee ihe atụ n’akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ o dere?

2 Ihe atụ Pọl onyeozi mere n’akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ o dere ga-enyere anyị aka ịmata uru anyị bara n’ọgbakọ. N’akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ, Pọl ji ọgbakọ tụnyere ahụ́ mmadụ, jirikwa ndị nọ n’ọgbakọ tụnyere akụkụ ahụ́ dị iche iche.​—Rom 12:​4-8; 1 Kọr. 12:​12-27; Efe. 4:16.

3. Olee ihe atọ anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

3 Onye ọ bụla n’ime anyị bara uru n’ọgbakọ Jehova. Anyị niile nwere ike inye aka mee ka ọgbakọ Jehova na-eto eto. N’agbanyeghị ebe anyị si, ezinụlọ anyị, omenala anyị, otú anyị nweruru n’ego, nakwa otú anyị gụruru n’akwụkwọ, anyị bara uru n’ọgbakọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe atọ dị mkpa anyị ga-amụta n’ihe atụ ahụ Pọl mere. Nke mbụ, anyị ga-amụta na onye ọ bụla n’ime anyị bara uru n’ọgbakọ Jehova. Nke abụọ, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na o siere anyị ike ịmata uru anyị bara n’ọgbakọ. Nke atọ, anyị ga-elebakwa anya n’ihe mere anyị ji kwesị ịna-arụ ọrụ Jehova nyere anyị n’ọgbakọ.

ONYE Ọ BỤLA N’IME ANYỊ NWERE ỌRỤ Ọ GA-ARỤ N’ỌGBAKỌ JEHOVA

4. Gịnị ka ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 12:​4, 5 na-akụziri anyị?

4 Ihe mbụ anyị ga-amụta n’ihe atụ Pọl bụ na onye ọ bụla n’ime anyị bara uru n’ọgbakọ Jehova. Pọl kwuru, sị: “Dị nnọọ ka anyị nwere ọtụtụ akụkụ ahụ́ n’otu ahụ́, ma akụkụ ahụ́ ndị ahụ niile adịghị arụ otu ọrụ, otú ahụ ka anyị onwe anyị bụ otu ahụ́ n’ime Kraịst, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma bụrụ akụkụ ahụ́ ndị dịịrị ibe anyị n’otu n’otu.” (Rom 12:​4, 5) Gịnị ka ihe a Pọl kwuru pụtara? Ọ pụtara na onye nke ọ bụla n’ime anyị nwere ọrụ dị iche ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ma, anyị niile bara uru.

E nwere ọrụ dị iche iche anyị na-arụ n’ọgbakọ, ma onye ọ bụla n’ime anyị bara uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 ruo na nke 12) *

5. Olee “onyinye” Jehova nyere ọgbakọ ya?

5 Ị chewe gbasara ndị nwere ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ, uche gị nwere ike ịgbaga ozugbo ná ndị na-edu ndú n’ọgbakọ. (1 Tesa. 5:12; Hib. 13:17) Ọ bụ eziokwu na Jehova si n’aka Jizọs nye ọgbakọ ya “onyinye n’ụdị mmadụ.” (Efe. 4:8) Ndị so ‘n’onyinye n’ụdị mmadụ’ ahụ bụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi, ndị na-enyere ha aka, ndị so na Kọmitii Alaka, ndị nlekọta sekit, ndị na-akụzị ihe n’ụlọ akwụkwọ Òtù Na-achị Isi haziri, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi. E ji mmụọ nsọ họpụta ụmụnna ndị a ka ha na-elekọta atụrụ Chineke ma na-enyere ọgbakọ aka.​—1 Pita 5:​2, 3.

6. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 2:​6-8, gịnị ka ụmụnna ndị e ji mmụọ nsọ họpụta na-agbalị ime?

6 A na-eji mmụọ nsọ ahọpụta ụmụnna nwoke ka ha na-arụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ. Otú ahụ akụkụ ahụ́ dị iche iche, dị ka aka na ụkwụ, na-arụ ọrụ na-abara ahụ́ niile uru, ụmụnna nwoke ndị a e ji mmụọ nsọ họpụta na-arụ ọrụ na-abara ọgbakọ niile uru. Ha anaghị achọ ka ndị ọzọ too ha. Kama nke ahụ, ha na-agbalị ilekọta ụmụnna ha ma na-eme ka ha dị ike. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:​6-8.) Anyị na-ekele Jehova maka inye anyị ụmụnna nwoke ndị a ruru eru na-anaghị achọ ọdịmma nke naanị ha.

7. Olee uru ọtụtụ ụmụnna nọ n’ozi oge niile na-erite?

7 E nwere ike ịhọpụta ụfọdụ ụmụnna ka ha bụrụ ndị ozi ala ọzọ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ma ọ bụkwanụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ekpebiela ịna-eje ozi oge niile. Ha esila otú ahụ nyere ọtụtụ ndị aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ọ bụ eziokwu na ụmụnna ndị a enweghị nnukwu ego ma ọ bụ ọtụtụ ihe, Jehova ejirila ọtụtụ ihe gọzie ha. (Mak 10:​29, 30) Anyị ejighị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị a egwu egwu. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị na ha nọ n’ọgbakọ a.

8. Gịnị mere onye nkwusa ọ bụla ji dị Jehova mkpa?

8 Ọ̀ bụ naanị ụmụnna ndị a e ji mmụọ nsọ họpụta na ndị nọ n’ozi oge niile bara uru n’ọgbakọ? Mba. Onye nkwusa ọ bụla baara Chineke na ọgbakọ uru. (Rom 10:15; 1 Kọr. 3:​6-9) Nke bụ́ eziokwu bụ na otu n’ime ihe ndị kacha mkpa mere e ji hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ime ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:​19, 20; 1 Tim. 2:4) Ndị niile na-ekwusa ozi ọma, ma ndị merela baptizim ma ndị nkwusa na-emebeghị baptizim na-ewere ọrụ a ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha.​—Mat. 24:14.

9. Gịnị mere na anyị ejighị ụmụnna nwaanyị anyị egwu egwu?

9 Jehova nyere ụmụnna nwaanyị ọrụ dị ezigbo mkpa n’ọgbakọ. O ji ndị nwunye, ndị nne, ndị di ha nwụrụ, na ndị na-alụbeghị di ji obi ha niile na-efe ya kpọrọ ihe. Baịbụl kwuru gbasara ọtụtụ ụmụ nwaanyị mere ihe dị Chineke mma. A jara ha mma n’ihi amamihe ha, okwukwe ha, ịnụ ọkụ n’obi ha, obi ike ha, mmesapụ aka ha, na ọrụ ọma ha. (Luk 8:​2, 3; Ọrụ 16:​14, 15; Rom 16:​3, 6; Fil. 4:3; Hib. 11:​11, 31, 35) Anyị na-ekele Jehova maka ụmụnna nwaanyị ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ nwere àgwà ọma ndị a.

10. Gịnị mere anyị ji jiri ndị agadi nọ n’ọgbakọ kpọrọ ihe?

10 Anyị nwekwara ọtụtụ ndị agadi n’ọgbakọ anyị. N’ụfọdụ ọgbakọ, e nwere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị merela agadi jeerela Jehova ozi ná ndụ ha niile. Ụfọdụ ndị agadi ndị a ka batara n’ọgbakọ n’oge na-adịbeghị anya. Ahụ́ agbasighịzi ọtụtụ n’ime ndị agadi ndị a ike n’ihi nká. Nsogbu ndị a nwere ike ime ka ha gharazie inwe ike ime ọtụtụ ihe n’ọgbakọ nakwa n’ozi ọma. Ma, ha ka na-agbalị ike ha n’ozi ọma, na-agbalịsikwa ike ịgba ndị ọzọ ume na ịzụ ha. Anyị na-amụtakwa ihe n’aka ha. Jehova ji ha kpọrọ ihe, anyịnwa jikwa ha kpọrọ ihe.​—Ilu 16:31.

11-12. Olee otú obi na-adị gị ma ị hụ ndị na-eto eto n’ọgbakọ?

11 Cheekwa gbasara ndị na-eto eto. Ọtụtụ nsogbu na-abịara ha n’ụwa Ekwensu a e nwere ọtụtụ nkụzi ndị na-abaghị uru. (1 Jọn 5:19) Ma, obi na-adị anyị ụtọ ma anyị na-ahụ ndị na-eto eto ka ha na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, na-aga ozi ọma, jirikwa obi ike na-agwa ndị mmadụ ihe ha kweere. N’eziokwu, ndị na-eto eto bara ezigbo uru n’ọgbakọ Jehova.​—Ọma 8:2.

12 Ma, ọ na-esiri ụfọdụ ụmụnna anyị ike ikweta na ha baara ọgbakọ Jehova uru. Olee ihe ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ikweta na ọ bara uru n’ọgbakọ? Ka anyị lee.

MATA NA Ị BARA URU N’ỌGBAKỌ

13-14. Olee ihe nwere ike ime ka ụfọdụ chewe na ha abaghị uru n’ọgbakọ?

13 Ihe nke abụọ anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Pọl na-echetara anyị nsogbu ọtụtụ n’ime anyị nwere taa. Ọ na-esiri ọtụtụ n’ime anyị ike ikweta na anyị bara uru n’ọgbakọ. Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na ụkwụ asị: ‘N’ihi na abụghị m aka, abụghị m akụkụ ahụ́,’ ọ bụghị ya mere ọ ga-eji ghara ịbụ akụkụ ahụ́. Ọ bụrụkwa na ntị asị: ‘N’ihi na abụghị m anya, abụghị m akụkụ ahụ́,’ ọ bụghị ya mere ọ ga-eji ghara ịbụ akụkụ ahụ́.” (1 Kọr. 12:​15, 16) Gịnị ka Pọl na-akụziri anyị?

14 Ọ bụrụ na i jiri onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ n’ọgbakọ, o nwere ike ime ka i chewe na o nweghị uru ị bara. Ndị ụfọdụ n’ọgbakọ nwere ike inwe onyinye ịkụzi ihe, ịhazi ihe nke ọma, ma ọ bụkwanụ bụrụ ọkà n’ịgba ndị ọzọ ume. I nwere ike ịna-eche na ị gaghị emeli ihe ndị ahụ nke ọma ka ha. Nke ahụ gosiri na ị dị umeala n’obi, marakwa ebe ike gị ruru. (Fil. 2:3) Ma, kpacharakwa anya. Ọ bụrụ na i jiri onwe gị na-atụnyere ndị nwere onyinye ụfọdụ mgbe niile, o nwere ike ime ka ị daa mbà. O nwedịrị ike ime ka i mewe ihe ahụ Pọl kwuru, ya bụ, ka i chewe na e nweghị uru ị bara n’ọgbakọ. Olee ihe ga-enyere gị aka ịghara iche otú ahụ?

15. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 12:​4-11, gịnị ka anyị kwesịrị ịma gbasara onyinye ndị anyị nwere?

15 Chegodị ihe a: N’oge ndịozi, Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka ụfọdụ Ndị Kraịst rụọ ọrụ ebube, ma ọ bụghị ha niile ka o nyere onyinye ahụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 12:​4-11.) Jehova nyere ha onyinye dị iche iche. Ma, onye nke ọ bụla n’ime ha bara uru. Taa, Jehova anaghị eji mmụọ nsọ ya eme ka anyị rụọ ọrụ ebube. Ma, ọ bụ eziokwu na anyị nwere onyinye dị iche iche, anyị niile bara uru n’anya Jehova.

16. Olee ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere anyị kwesịrị ige ntị?

16 Kama iji onwe anyị na-atụnyere Ndị Kraịst ndị ọzọ, anyị kwesịrị ịna-ege ntị na ndụmọdụ Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ nye anyị. Ọ sịrị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya, mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.”​—Gal. 6:4.

17. Olee otú ige ntị na ndụmọdụ Pọl ga-esi baara anyị uru?

17 Ọ bụrụ na anyị egee ntị na ndụmọdụ ahụ Pọl nyere anyị ma lebara ihe ndị anyị na-eme anya, o nwere ike ime ka anyị hụ na anyị nwere onyinye pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, e nwere ike otu okenye enweghị onyinye ịkụzi ihe, ma o nwere ike ịna-eme nke ọma n’ime ndị na-eso ụzọ. O nwekwara ike ọ maghị otú e si ahazi ihe nke ọma ka ụfọdụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ ha, ma o nwere obi ọma, hụ ndị ọzọ n’anya, obi ana-erukwa ụmụnna ala ịbịakwute ya ka o jiri Baịbụl nye ha ndụmọdụ. O nwekwara ike ịbụ na e ji ile ọbịa nke ọma mara ya. (Hib. 13:​2, 16) Ọ bụrụ na anyị achọpụta onyinye ndị anyị nwere, ọ ga-eme ka obi dị anyị ụtọ na o nwere uru anyị na-aba n’ọgbakọ. O nwekwara ike ime ka anyị ghara ịna-emere ụmụnna ndị ọzọ anyaụfụ maka onyinye hanwa nwere.

18. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịna-akụzi ihe nke ọma?

18 N’agbanyeghị uru anyị bara n’ọgbakọ, anyị niile kwesịrị ịna-agbalị na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ. Iji nyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma, Jehova na-esi n’ọgbakọ ya enye anyị ọzụzụ pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, n’ọmụmụ ihe etiti izu anyị, a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ozi ọma. Ị̀ na-eme ihe ndị ị na-amụta na ya?

19. Olee otú i nwere ike isi ruo eru ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze?

19 Otú ọzọ e si azụ anyị bụ Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ndị nwere ike ịga ụlọ akwụkwọ a bụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị nọ n’ozi oge niile nọ n’agbata afọ iri abụọ na atọ na afọ iri isii na ise. O nwere ike ịdị gị ka o nweghị mgbe ị ga-eru eru ịga ụlọ akwụkwọ a. Ma, kama ichewe ihe ndị mere na ị gaghị eru eru ịga ya, chewe gbasara ihe ndị mere i ji chọọ ịga ya. Hazizie onwe gị ka i nwee ike iru eru ịga ya. Ọ bụrụ na ị gbalịsie ike, Jehova ga-enyere gị aka mee ka ihe ahụ i chere na ọ gaghị ekwe omume kwe omume.

JIRI ONYINYE GỊ NA-ENYERE ỌGBAKỌ AKA

20. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta ná Ndị Rom 12:​6-8?

20 Ihe nke atọ anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Pọl dị ná Ndị Rom 12:​6-8. (Gụọ ya.) N’ebe ahụ, Pọl kwukwara na onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nwere onyinye dị iche iche. Ma, o kwuziri na anyị kwesịrị iji onyinye ọ bụla anyị nwere na-enyere ọgbakọ aka.

21-22. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Robert na Felice?

21 Chegodị gbasara ihe mere otu nwanna anyị ga-akpọ Robert. Mgbe o jechara ozi n’otu mba, a gwara ya ka ọ bịa jewe ozi na Betel dị n’obodo ya. N’agbanyeghị na a gwara ya na ihe mere e ji gbanweere ya ọrụ abụghị na o nwere ihe ọ na-emetaghị, ọ sịrị: “Ruo ọtụtụ ọnwa, obi adịghị m mma n’ihi na m nọ na-eche na o nwere ihe m na-emetaghị. E nwere mgbe ọ dị m ka m kwụsị ije ozi na Betel.” Olee ihe mere ka obi dịwakwa ya mma? Otu okenye chetaara ya na Jehova na-eji ihe ọ bụla anyị rụụrụ ya n’oge gara aga na-azụ anyị ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ o nyere anyị ugbu a. Ihe a mere ka Robert kwụsị ịna-eche gbasara ihe ndị gara aga ma chewe gbasara ihe ndị o nwere ike ime ugbu a.

22 Nwanna Felice Episcopo nwekwara ụdị nsogbu ahụ. Ya na nwunye ya gụchara akwụkwọ na Gilied n’afọ 1956, rụọkwa ọrụ sekit na Bolivia. N’afọ 1964, ha mụtara otu nwa. Nwanna Episcopo kwuru, sị: “O siiri anyị ike ịhapụ ọrụ a na-atọgbu anyị atọgbu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ruo ihe dị ka otu afọ, obi nọ na-ajọ m njọ. Ma, Jehova nyeere m aka ịgbanwe ma lekwasị anya n’ọrụ ọhụrụ m nwetara, ya bụ, ịbụ nna.” Ọ̀ dị gị otú ọ dị Robert ma ọ bụ Felice? Obi ọ̀ na-ajọ gị njọ na ị naghịzi arụ ihe ị na-arụbu n’ọgbakọ? Ọ bụrụ otú ahụ, obi ga-aka adị gị ụtọ ma ọ bụrụ na i lekwasị anya n’ihe i nwere ike ime ugbu a iji fee Jehova na iji nyere ụmụnna gị aka. Jiri onyinye gị na-enyere ndị ọzọ aka. Ị na-eme otú ahụ, obi ga-adị gị ụtọ ka ị na-enyere ọgbakọ aka.

23. Gịnị ka anyị kwesịrị iwepụta oge mee, gịnịkwa ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-esonụ?

23 Jehova ejighị onye nke ọ bụla n’ime anyị egwu egwu. Ọ chọrọ ka anyị soro n’ezinụlọ ya. Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge chee gbasara ihe anyị ga-eme iji nyere ụmụnna anyị aka, meekwa ihe ndị ahụ, anyị agaghịzi na-eche na e nweghị uru anyị na-aba n’ọgbakọ. Ma, oleekwanụ otú anyị si ele ndị ọzọ anya n’ọgbakọ? Olee otú anyị nwere ike isi gosi ha na anyị hụrụ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù? N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe a dị ezigbo mkpa.

ABỤ NKE 24 Bịanụ n’Ugwu Jehova

^ par. 5 Anyị niile chọrọ ka Jehova hụ anyị n’anya. Ma mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche ma è nwere uru anyị ga-abara ya. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịhụ na onye ọ bụla n’ime anyị bara ezigbo uru n’ọgbakọ.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Foto atọ ndị a na-egosi ihe na-eme tupu ọmụmụ ihe amalite, mgbe ọmụmụ ihe na-aga n’ihu, na mgbe a gbasara. Foto nke 1: Ebe otu okenye ji ihu ọchị na-ekele onye bịara ọmụmụ ihe, ebe otu nwanna na-eto eto na-edozi ígwè okwu, na ebe otu nwanna nwaanyị na nwanna nwaanyị merela agadi na-ekwurịta okwu. Foto nke 2: Ebe ma ndị na-eto eto ma ndị agadi na-agbalị ịza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Foto nke 3: Ebe otu di na nwunye na-enye aka na-eme ka Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ọcha. Ebe otu nwanna nwaanyị na-enyere nwa ya aka itinye ego n’igbe onyinye. Ebe otu nwanna na-eto eto na-elekọta akwụkwọ, nwanna nke ọzọ ana-agba nwanna nwaanyị merela agadi ume.