Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 32

Dịrị Umeala n’Obi, Matakwa Ebe Ike Gị Ruru

Dịrị Umeala n’Obi, Matakwa Ebe Ike Gị Ruru

‘Jiri obi umeala soro Chineke gị na-eje ije.’​—MAỊ. 6:8.

ABỤ NKE 31 Soro Chineke Na-eje Ije

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe Devid kwuru banyere ịdị umeala n’obi Jehova?

ÀNYỊ ga-ekwuli na Jehova dị umeala n’obi? Ee. E nwere mgbe Devid kwuru, sị: “Ị ga-enyekwa m ọta nzọpụta gị, ọ bụkwa ịdị umeala n’obi gị na-eme ka m dị ukwuu.” (2 Sam. 22:36; Ọma 18:35) O nwere ike ịbụ na Devid na-echeta ihe mere ụbọchị Samuel onye amụma bịara n’ụlọ nna ya ite onye ga-abụ eze Izrel mmanụ. Jehova gosiri na ọ dị umeala n’obi mgbe o weturu onwe ya ala họrọ Devid bụ́ nwa nke ikpeazụ n’ime ụmụ nwoke asatọ nna ha mụrụ ka ọ nọchie Eze Sọl.​—1 Sam. 16:​1, 10-13.

2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

2 O doro anya na Devid kwetara ihe otu ọbụ abụ kwuru gbasara Jehova. Ọbụ abụ ahụ sịrị: ‘Ọ na-ewetu onwe ya ala iji lee eluigwe na ụwa anya, ọ na-esi n’ájá kulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya; ọ na-ebuli ogbenye elu, iji mee ka o soro ndị a ma ama nọdụ ala.’ (Ọma 113:​6-8) N’isiokwu a, anyị ga-ebu ụzọ leba anya n’ihe ndị dị mkpa anyị ga-amụta gbasara ịdị umeala n’obi. Otú anyị ga-esi mee ya bụ ileba anya n’ihe ndị Jehova mere gosiri na ọ dị umeala n’obi. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe anyị ga-amụta n’aka Eze Sọl, Daniel onye amụma, na Jizọs banyere ịdị umeala n’obi.

OLEE IHE ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA N’OTÚ JEHOVA SI DỊ UMEALA N’OBI?

3. Olee otú Jehova si emeso anyị, gịnịkwa ka ọ na-egosi?

3 Jehova si n’otú o si emeso ụmụ mmadụ na-ezughị okè gosi na ya dị umeala n’obi. Ọ bụghị naanị na ọ na-anabata ofufe anyị, kama, ọ na-ewerekwa anyị ka ndị enyi ya. (Ọma 25:14) Iji mee ka anyị na ya nwee ike ịdị ná mma, Jehova bu ụzọ jiri Ọkpara ya chụọ àjà n’ihi mmehie anyị. Ihe a gosiri na Jehova dị ezigbo obi obere, na-enwekwara anyị ọmịiko.

4. Gịnị ka Jehova nyere anyị, n’ihi gịnịkwa?

4 Chegodị gbasara otú ọzọ Jehova si egosi na ọ dị umeala n’obi. Ebe ọ bụ ya kere anyị, ọ gaara eme ka anyị ghara inwe ike iji aka anyị họrọ otú anyị chọrọ isi ebi ndụ. Mana, o meghị otú ahụ. O kere anyị n’oyiyi ya, nyekwa anyị ikike ịhọrọ ihe anyị ga-eme. Ọ chọrọ ka anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-enweghị ebe anyị ruru ya jiri obi anyị na-efe ya n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, nakwa n’ihi na anyị ma na irubere ya isi ga-abara anyị uru. (Diut. 10:12; Aịza. 48:​17, 18) Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ maka na Jehova dị ezigbo umeala n’obi.

Ebe Jizọs nọ n’eluigwe, ụfọdụ ndị ya na ha ga-eso chịa anọrọ ya n’akụkụ, ha ana-ele ìgwè ndị mmụọ ozi. Ụfọdụ ndị mmụọ ozi ahụ na-aga n’ụwa ka ha gaa rụọ ọrụ Chineke nyere ha. Jehova nyere ndị niile e sere na foto a ọrụ. (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Olee otú Jehova si akụziri anyị ịdị umeala n’obi? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

5 Jehova si n’otú o si emeso anyị na-akụziri anyị otú e si adị umeala n’obi. Ọ bụ Jehova kacha nwee amamihe n’eluigwe na n’ụwa. N’agbanyeghị ya, ọ dị njikere ige ihe ndị ọzọ kwuru ntị. Dị ka ihe atụ, o kwere ka Ọkpara ya nyere ya aka kee ihe niile. (Ilu 8:​27-30; Kọl. 1:​15, 16) N’agbanyeghịkwa na ọ bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ na-enye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ka ha rụọ. Dị ka ihe atụ, ọ họpụtara Ọkpara ya ịbụ Eze nke Alaeze ya. Ọ ga-enyekwa otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ha na Jizọs ga-eso chịa ikike ụfọdụ. (Luk 12:32) Jehova zụrụ Ọkpara ya ka ọ bụrụ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà. (Hib. 5:​8, 9) Ọ zụkwara ndị ha na Jizọs ga-eso chịa ka ha nwee ike ịrụ ọrụ ha, ma, ọ naghị achọ ịgwa ha otú ha ga-esi na-arụ ya. Ọ tụkwasịrị ha obi na ha ga-eme uche ya.​—Mkpu. 5:10.

Anyị na-eme ka Jehova ma ọ bụrụ na anyị ana-azụ ndị ọzọ ma na-enye ha ọrụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7) *

6-7. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Nna anyị nke eluigwe gbasara inye ndị ọzọ ọrụ?

6 Ọ bụrụ na Nna anyị nke eluigwe bụ́ onye enyemaka mmadụ ọ bụla na-adịghị mkpa na-enye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ, anyịnwa kwesịkwara ịna-eme otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ ma ọ bụ okenye n’ọgbakọ, na-enye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ka Jehova. Achọkwala ka ị na-agwa ha otú ha ga-esi na-arụ ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ka Jehova, ị ga-ahụ na ọrụ ga na-aga nke ọma, gị ana-azụ ndị ọzọ, meekwa ka obi sie ha ike n’ọrụ ha. (Aịza. 41:10) Olee ihe ndị ọzọ ndị Jehova nyere ọrụ nwere ike ịmụta n’aka ya?

7 Baịbụl kwuru ihe gosiri na Jehova na-achọ ịmata ihe ndị mmụọ ozi chere gbasara ihe ọ chọrọ ime. (1 Eze 22:​19-22) Ndị nne na nna, olee otú unu nwere ike isi na-eme ka Jehova? Mgbe ụfọdụ, jụọnụ ụmụ unu ihe bụ́ uche ha gbasara ihe unu chọrọ ime. Mgbe ọ dabara adaba, meenụ ihe ha kwuru.

8. Olee otú Jehova si nweere Ebreham na Sera ndidi?

8 Otú ọzọ Jehova si egosi na ọ dị umeala n’obi bụ na ọ na-enwe ndidi. Dị ka ihe atụ, Jehova na-enwe ndidi ma ndị na-efe ya meda obi na-ajụ ya ajụjụ gbasara ihe ọ chọrọ ime. Jehova gere Ebreham ntị mgbe ọ na-agwa ya na ya echeghị na ọ dị mma ka o bibie Sọdọm na Gọmọra. (Jen. 18:​22-33) Chetakwa otú Jehova si meso Sera nwunye Ebreham. Jehova eweghị iwe mgbe Sera chịrị ọchị gbasara nkwa o kwere na ọ ga-adị ime n’agadi ya. (Jen. 18:​10-14) Kama, ọ kwanyeere Sera ùgwù.

9. Gịnị ka ndị nne na nna na ndị okenye nwere ike ịmụta n’aka Jehova?

Ndị nne na nna na ndị okenye, gịnị ka unu nwere ike ịmụta n’aka Jehova? Gịnị ka ị na-eme ma ọ bụrụ na ụmụ gị ma ọ bụ ụfọdụ ndị n’ọgbakọ ekwetaghị n’ihe i kpebiri? Ihe mbụ ị na-eme ọ̀ bụ ịbara ha mba? Ka ị̀ na-agbalị ịghọta ihe ha chere? O doro anya na obi ga na-atọ ndị ezinụlọ na ndị nọ n’ọgbakọ ụtọ ma ọ bụrụ na ndị nne na nna na ndị okenye ana-eme ka Jehova. Anyị elebala anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jehova gbasara ịdị umeala n’obi. Ugbu a, ka anyị si n’aka ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl mụta otú anyị ga-esi na-adị umeala n’obi.

IHE ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA N’AKA NDỊ ỌZỌ

10. Olee otú Jehova si eji akụkọ gbasara ndị ọzọ akụziri anyị ihe?

10 Ebe Jehova bụ “Onye Ozizi Ukwu” anyị, o dere gbasara ndị ụfọdụ n’Okwu ya iji kụziere anyị ihe. (Aịza. 30:​20, 21) Ọ bụrụ na anyị na-eche gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, anyị ga-amụta otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ndị na-eme Chineke obi ụtọ, dị ka ịma ebe ike anyị ruru. Anyị ga-amụtakwa ihe n’ihe mere ndị na-akpaghị àgwà ndị na-eme Chineke obi ụtọ.​—Ọma 37:37; 1 Kọr. 10:11.

11. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Sọl mejọrọ?

11 Chegodị gbasara ihe mere Eze Sọl. Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, ọ ma ebe ike ya ruru. Ọ chọghịdị ka e nyekwuo ya ọrụ. (1 Sam. 9:21; 10:​20-22) Ma ka oge na-aga, Sọl malitere ịdị mpako. Ọ malitere ịkpa àgwà ọjọọ a obere oge ọ ghọchara eze. N’otu oge, o nweghị ndidi chere Samuel onye amụma. Kama, ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-azọpụta ndị ya, Sọl chụụrụ Jehova àjà n’agbanyeghị na ọ bụghị ọrụ ya. N’ihi ya, Jehova jụrụ ya, mechaakwa mee ka ọ gharazie ịbụ eze. (1 Sam. 13:​8-14) Ọ bụrụ na anyị amụta ihe n’ihe a mere Sọl ma mara ebe ike anyị ruru, anyị ga-abụ ndị maara ihe.

12. Olee otú Daniel si gosi na ya ma ebe ike ya ruru?

12 Legodị ihe Daniel onye amụma mere. O meghị ka Sọl. Ná ndụ ya niile, ọ bụ ohu Jehova dị umeala n’obi, marakwa ebe ike ya ruru. Ọ na-achọkarị ka Jehova na-eduzi ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova ji ya kọwaara Nebukadneza nrọ ya, o kweghị ka e too ya maka ya. Kama, o ji obi umeala kwuo na ọ bụ Jehova ka e kwesịrị ito. (Dan. 2:​26-28) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ bụrụ na okwu anyị kwuru n’ọmụmụ ihe atọọ ụmụnna ụtọ ma ọ bụ na o nwere ihe ọma ndị mere n’ozi anyị, anyị kwesịrị ito Jehova maka ha. Anyị kwesịrị ịmata na ọ bụ Jehova nyeere anyị aka ime ihe ndị ahụ. (Fil. 4:13) Anyị na-eme otú a, anyị na-emekwa ka Jizọs. Olee otú ọ bụ?

13. Dị ka e kwuru na Jọn 5:​19, 30, gịnị ka anyị na-amụta n’aka Jizọs?

13 N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, bụrụkwa Ọkpara Chineke, ọ tụkwasịrị Jehova obi. (Gụọ Jọn 5:​19, 30.) O nweghị mgbe ọ chọrọ ịnara Nna ya nke eluigwe ọkwá n’ike. Ndị Filipaị 2:6 sịrị: “O cheghị echiche ịnara ọkwá n’ike, ya bụ, ka ọ hara ka Chineke.” Jizọs ma ebe ike ya ruru ma na-erubere Nna ya isi.

Jizọs ma ebe ike ya ruru, ọ chọghịkwa ịgafe ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Gịnị ka Jizọs mere mgbe a gwara ya mee ihe ike ya na-erughị ime?

14 Chegodị ihe Jizọs mere mgbe Jems, Jọn na mama ha bịakwutere ya gwa ya ka o mee ihe ike ya na-erughị ime. N’egbughị oge, Jizọs gwara ha na ọ bụ naanị Nna ya ka ọ dị n’aka ikpebi onye ga-anọ Jizọs n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe n’Alaeze. (Mat. 20:​20-23) Ihe a Jizọs mere gosiri na ọ ma ebe ike ya ruru, ọ chọghịkwa ịgafe ya. O nwetụghị mgbe o mere ihe Jehova na-enyeghị ya ikike ime. (Jọn 12:49) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ya?

Olee otú anyị ga-esi mara ebe ike anyị ruru ka Jizọs? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15-16. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 4:6?

15 Anyị na-eme ka Jizọs ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 4:6. Ebe ahụ sịrị: “Unu agabigala ihe e dere ede.” N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ achọọ ka anyị nye ya ndụmọdụ, anyị agaghị agwa ya ihe anyị chere ozugbo n’ebughị ụzọ chebara ya echiche. Kama, anyị ga-egosi ya ihe Baịbụl na ihe ndị e ji amụ Baịbụl kwuru gbasara ya. Anyị na-eme otú ahụ, anyị na-egosi na anyị ma ebe ike anyị ruru. Anyị na-egosikwa na anyị dị umeala n’obi n’ihi na anyị ghọtara na ndụmọdụ Jehova karịrị nke anyị.​—Mkpu. 15:​3, 4.

16 E wezụga ịsọpụrụ Jehova, e nwere ezigbo ihe ndị ọzọ mere anyị kwesịrị iji dịrị umeala n’obi. Ka anyị lebazie anya n’otú ịdị umeala n’obi na ịma ebe ike anyị ruru ga-esi mee ka anyị na-enwe obi ụtọ, meekwa ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma.

IHE MERE ỊDỊ UMEALA N’OBI JI DỊ MMA

17. Gịnị mere obi ji adị ndị dị umeala n’obi na ndị ma ebe ike ha ruru ụtọ?

17 Ọ bụrụ na anyị adị umeala n’obi ma mara ebe ike anyị ruru, o nwere ike ime ka anyị na-enwe obi ụtọ. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na anyị ekweta na e nwere ihe ndị anyị na-agaghị emeliri onwe anyị, obi ga-adị anyị ụtọ ma onye ọzọ meere anyị ha. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ihe merenụ mgbe Jizọs gwọrọ ndị ekpenta iri. Ọ bụ naanị otu n’ime ha lọghachiri bịa kelee Jizọs maka ịgwọ ya ọrịa ọjọọ ahụ, bụ́kwanụ ihe nwoke ahụ na-agaghị emeli n’onwe ya. N’ihi ya, obi dị ya ezigbo ụtọ maka ihe ahụ Jizọs meere ya, ya ekeleekwa Jehova maka ya.​—Luk 17:​11-19.

18. Olee otú ịdị umeala n’obi na mmadụ ịma ebe ike ya ruru si eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma? (Ndị Rom 12:10)

18 Ndị dị umeala n’obi na ndị ma ebe ike ha ruru na ndị ọzọ na-adịkarị ná mma. Ọtụtụ mgbe, ha na-emeta ezigbo ndị enyi. N’ihi gịnị? N’ihi na obi na-adị ha ụtọ ịmata àgwà ọma ndị ọzọ nwere ma tụkwasị ha obi. Ha na-enwe obi ụtọ na ihe na-agaziri ndị ọzọ, na-ajakwa ha mma ma na-asọpụrụ ha maka ya.​—Gụọ Ndị Rom 12:10.

19. Olee ihe ụfọdụ mere anyị kwesịrị iji ghara ịdị mpako?

19 Ma, ọ na-esiri ndị dị mpako ike ịja ndị ọzọ mma. Ha na-achọ ka ọ bụrụ hanwa ka a ga na-eto. Ha na-achọkarị iji onwe ha tụnyere ndị ọzọ, na-agbalịkwa ịka ndị ọzọ mma. Onye dị mpako na-echekarị na ọ ka mma iji aka ya meere onwe ya ihe n’ihi na ndị ọzọ agaghị emetali ya otú ọ chọrọ. Ọ na-achọkarị ịka ndị ọzọ, na-emekwara ha anyaụfụ. (Gal. 5:26) Ụdị ndị ahụ anaghị enwe ezigbo ndị enyi. Anyị chọpụta na anyị nwere ụdị nsogbu ahụ, anyị kwesịrị ikpesi ekpere ike ka Jehova nyere anyị aka ‘ime ka uche anyị dị ọhụrụ’ ka omume ọjọọ a ghara ịgbanye mgbọrọgwụ n’ime anyị.​—Rom 12:2.

20. Gịnị mere anyị kwesịrị iji dịrị umeala n’obi ma mara ebe ike anyị ruru?

20 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova dị umeala n’obi. Otú o si emeso ndị ohu ya gosiri ya. Anyị chọrọ ịna-eme ka ya, chọọkwa ịna-eme ka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ji umeala n’obi fee Jehova. Ka anyị na-enye Jehova otuto na nsọpụrụ ruuru ya mgbe niile. (Mkpu. 4:11) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a, anyị na Jehova ga-abụ enyi ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na ọ hụrụ ndị dị umeala n’obi na ndị ma ebe ike ha ruru n’anya.

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

^ par. 5 Onye dị umeala n’obi na-eme ebere, na-enwekwara ndị ọzọ ọmịiko. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu na Jehova dị umeala n’obi. N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú anyị ga-esi na-adị umeala n’obi ka Jehova. Anyị ga-esikwa n’aka Eze Sọl, Daniel onye amụma na Jizọs mụta ịdị umeala n’obi.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: Ebe otu okenye wepụtara oge na-azụ otu nwanna na-eto eto ka o nwee ike ịna-ahazi okèala ọgbakọ ha. Ka oge na-aga, okenye ahụ abịaghị na-agwa nwanna ahụ na-eto eto otú ọ ga-esi na-arụ ọrụ ahụ, kama, ọ hapụrụ ya ka ọ na-arụ ya.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-ajụ otu okenye ma ọ̀ ga-adị mma ka ọ gaa agbamakwụkwọ a kpọrọ ya na chọọchị. Okenye ahụ agwaghị ya ihe o chere, kama, ọ gwara ya ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere ya aka.