Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 33

Mbilite n’Ọnwụ Na-egosi Ịhụnanya Jehova, Amamihe Ya, na Ndidi Ya

Mbilite n’Ọnwụ Na-egosi Ịhụnanya Jehova, Amamihe Ya, na Ndidi Ya

“A gaje inwe mbilite n’ọnwụ.”​—ỌRỤ 24:15.

ABỤ NKE 151 Ọ Ga-akpọ Òkù

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere Jehova ji kee ihe ndị dị ndụ?

E NWERE mgbe Jehova nọ naanị ya. Ma, owu amaghị ya. Ihe niile zuuru ya. Ma, ọ chọrọ ka ndị ọzọ dịrị ndụ ma na-enwe obi ụtọ. Ọ bụ ịhụnanya mere ka Jehova malite ike ihe.​—Ọma 36:9; 1 Jọn 4:19.

2. Olee otú obi dị Jizọs na ndị mmụọ ozi mgbe Jehova kere ihe ndị ọzọ?

2 Jehova bu ụzọ kee Ọkpara ya bụ́ Jizọs. O sizi n’aka Ọkpara ya “kee ihe ndị ọzọ niile” ma ọtụtụ ndị mmụọ ozi. (Kọl. 1:16) Obi dị Jizọs ezigbo ụtọ na ya na Nna ya rụkọrọ ọrụ. (Ilu 8:30) Obi dịkwa ndị mmụọ ozi ụtọ. Ha hụrụ mgbe Jehova na Jizọs kere eluigwe na ụwa. Gịnị ka ndị mmụọ ozi ahụ mere? Ha malitere “iti mkpu otuto” mgbe e kere ụwa. O dokwara anya na ha tikwara mkpu otuto mgbe e kere ihe ndị ọzọ, karịchaa ụmụ mmadụ. (Job 38:7; Ilu 8:31) Ihe niile Jehova kere gosiri amamihe ya na otú o si hụ anyị n’anya.​—Ọma 104:24; Rom 1:20.

3. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:​21, 22, olee ihe àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mere ka o kwe omume?

3 Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ biri n’ụwa a mara mma o kere ruo mgbe ebighị ebi ma na-enwe obi ụtọ. Ma, mgbe Adam na Iv nupụụrụ Nna ha hụrụ ha n’anya isi, ha na ụmụ ha enweghịzi ike ịdị ndụ ebighị ebi. (Rom 5:12) Gịnị ka Jehova meziri? O kwuru ozugbo otú ọ ga-esi anapụta ụmụ mmadụ. (Jen. 3:15) Jehova ga-eji Ọkpara ya bụ́ Jizọs chụọ àjà iji gbapụta ụmụ Adam na Iv n’aka mmehie na ọnwụ. Nke ahụ ga-emezi ka o nye onye ọ bụla họọrọ ife ya ndụ ebighị ebi.​—Jọn 3:16; Rom 6:23Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:​21, 22.

4. Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

4 E nwere ọtụtụ ajụjụ anyị nwere ike ịjụ gbasara nkwa Chineke kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, olee otú e nwere ike isi kpọlite ndị nwụrụ anwụ? Ànyị ga-amata onye anyị nwụrụ anwụ ma a kpọlite ya? Olee otú mbilite n’ọnwụ ga-esi mee ka anyị nwee obi ụtọ? Oleekwa ihe mbilite n’ọnwụ na-akụziri anyị gbasara ịhụnanya Jehova, amamihe ya, na ndidi ya? Ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị a.

OLEE OTÚ E NWERE IKE ISI KPỌLITE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ?

5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-atụ anya na a gaghị akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ otu mgbe?

5 Mgbe Jehova ga-esi n’aka Ọkpara ya kpọlite ọtụtụ nde mmadụ, anyị nwere ike ịtụ anya na ọ bụghị ndị niile nwụrụnụ ka a ga-akpọlite otu mgbe. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na ha niile ebilite n’ọnwụ n’ụwa otu mgbe, o nwere ike ịkpata ọgba aghara. Jehova anaghị eme ihe ọ bụla a na-ahazighị ahazi. Ọ ma na e kwesịrị ịhazi ihe niile ahazi ka ndị mmadụ nwee ike ibi n’udo. (1 Kọr. 14:33) Jehova nwere amamihe na ndidi mgbe ya na Jizọs ji nwayọọ nwayọọ hazie ụwa a ka ndị mmadụ nwee ike ibi na ya tupu ya ekee mmadụ. Jizọs ga na-enwekwa ndidi na amamihe n’otu puku afọ ahụ ọ ga-achị mgbe ya na ndị Amagedọn na-egbughị ga na-akwadebe ụwa iji nabata ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ.

Ndị na-anwụghị n’Amagedọn ga-akụziri ndị a kpọlitere n’ọnwụ gbasara Alaeze Chineke nakwa ihe ndị Jehova chọrọ ha n’aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6) *

6. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 24:​15, ole ndị ga-eso ná ndị Jehova ga-akpọlite n’ọnwụ?

6 Ihe kacha mkpa bụ na ndị niile na-anwụghị n’Amagedọn ga na-akụziri ndị a kpọlitere n’ọnwụ gbasara Alaeze Chineke na ihe ndị Jehova chọrọ ha n’aka. N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-eso ná “ndị ajọ omume.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15.) Ha ga-agbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ ha ka àjà Jizọs chụrụ nwee ike ịbara ha uru. Chegodị ọrụ buru ibu a ga-arụ ịkụziri ọtụtụ nde mmadụ na-amaghị gbasara Jehova ihe. À ga-akụziri ha ya otu otu otú ahụ anyị si amụrụ ndị mmadụ ihe taa? Hà ga-anọ n’ọgbakọ dị iche iche ebe a ga-anọ kụziere ha ihe ha ga-akụziri ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ? Anyị amabeghị. Ma, ihe anyị ma bụ na ná ngwụcha Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa.” (Aịza. 11:9) Anyị ga-enwe ọtụtụ ọrụ na-eme obi ụtọ anyị ga-arụ n’ime otu puku afọ ahụ.

7. Gịnị mere ndị Chineke ga-eji na-enwe ọmịiko mgbe ha na-akụziri ndị a kpọlitere n’ọnwụ ihe?

7 N’otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị, ndị Jehova niile ga-agbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ ha iji na-eme ihe dị Chineke mma. N’ihi ya, ha niile ga na-enwere ibe ha ọmịiko ka ha na-enyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ aka ịgbanwe, kwụsị iche echiche ọjọọ na ime ihe ọjọọ ma na-eme ihe Jehova na-achọ. (1 Pita 3:8) O doro anya na ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-ahụ na ndị Jehova dị umeala n’obi, nakwa na ha ka na-agbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ ha iji nwee ike ịna-eme ihe dị Jehova mma. Ha ga-achọkwa iso ha na-efe Jehova.​—Fil. 2:12.

ÀNYỊ GA-AMATALI NDỊ ANYỊ A KPỌLITERE N’ỌNWỤ?

8. Gịnị mere anyị ga-eji na-atụ anya na anyị ga-amata ndị anyị nwụrụ anwụ ma a kpọlite ha?

8 E nwere ọtụtụ ihe mere e nwere ike iji kwuo na ndị ahụ ga-anabata ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-amata ndị ha. Dị ka ihe atụ, otú Jehova si kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ n’oge gara aga gosiri na Jehova ga-eme ka ndị si n’ọnwụ bilie nwee ike ikwu okwu na iche echiche otú ha na-emebu, dịrịkwa otú ha dịbu tupu ha anwụọ. Cheta na Jizọs ji ọnwụ tụnyere ụra, jirikwa mbilite n’ọnwụ tụnyere ịkpọte mmadụ n’ụra. (Mat. 9:​18, 24; Jọn 11:​11-13) Mmadụ si n’ụra teta, ọ na-adị otú ọ dịbu, na-ekwukwa okwu otú o si ekwubu. Ọ na-amakwa ihe ndị ọ mabu tupu ya ehiwe ụra. Chegodị gbasara Lazarọs. Abalị anọ agaala kemgbe ọ nwụrụ, n’ihi ya, ahụ́ ya erewela. Ma mgbe Jizọs kpọlitere ya, ụmụnne ya ndị nwaanyị matara ya ozugbo, yanwa amatakwa ha.​—Jọn 11:​38-44; 12:​1, 2

9. Gịnị mere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ agaghị ezu okè mgbe a ga-akpọlite ha?

9 Jehova kwere nkwa na e nweghị onye dị ndụ mgbe ahụ Kraịst ga na-achị ga-asị: “Ana m arịa ọrịa.” (Aịza. 33:24; Rom 6:7) N’ihi ya, ahụ́ ga-agbasi ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ike. Ma, ha agaghị ezu okè ozugbo. Ma ọ́ bụghị ya, ndị mabu ha agaghị amakwa ha. O yiri ka mmadụ niile hà ga-eji nwayọọ nwayọọ zuo okè n’ime otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị. Ọ bụ naanị ná ngwụcha puku afọ ahụ ka Jizọs ga-enyefe Nna ya Alaeze ahụ. Mgbe ahụ, Alaeze ahụ arụzuola ọrụ ya, ma ime ka mmadụ niile zuo okè.​—1 Kọr. 15:​24-28; Mkpu. 20:​1-3.

OLEE OTÚ MBILITE N’ỌNWỤ GA-ESI EME KA ANYỊ NWEE OBI ỤTỌ?

10. Olee otú obi ga-adị gị maka mbilite n’ọnwụ?

10 Chegodị otú obi ga-adị gị ịnabata onye gị nwụrụ anwụ. Obi ụtọ ọ̀ ga-eme ka ị chịwa ọchị ka ọ̀ bụ ka i bewe ákwá? Obi ụtọ ọ̀ ga-eme ka ị bụwa abụ iji too Jehova? Otu ihe doro anya bụ na obi ga-adị gị ezigbo ụtọ n’ebe Nna gị hụrụ gị n’anya na Ọkpara ya nọ n’ihi ime ka e nwee mbilite n’ọnwụ.

11. Dị ka Jizọs kwuru na Jọn 5:​28, 29, olee otú ihe ga-adịrị ndị na-erubere Chineke isi?

11 Chegodị otú obi ga-adị ndị a kpọlitere n’ọnwụ ka ha na-agbanwe ndụ ha iji na-eme ihe Chineke chọrọ. Ndị gbanwerenụ ga-adị ndụ ebighị ebi na Paradaịs. Ma, a gaghị ekwe ka ndị nupụụrụ Chineke isi mee ka udo ghara ịdị na Paradaịs.​—Aịza. 65:20; gụọ Jọn 5:​28, 29.

12. Olee otú Jehova ga-esi gọzie ndị niile bi n’ụwa?

12 N’Alaeze ahụ, ndị Chineke niile ga-ahụ na ihe e kwuru n’Ilu 10:22 bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.” Mmụọ nsọ Chineke ga-eme ka ndị Chineke na-emekwu ka Jizọs, jirikwa nwayọọ nwayọọ zuo okè. (Jọn 13:​15-17; Efe. 4:​23, 24) Kwa ụbọchị, ahụ́ ga na-agbasikwu ha ike, ha abụrụkwuo ndị ezigbo mmadụ. A ga-enwe ezigbo obi ụtọ mgbe ahụ. (Job 33:25) Ma, olee otú iche gbasara mbilite n’ọnwụ ga-esi enyere anyị aka ugbu a?

OLEE IHE ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA GBASARA ỊHỤNANYA JEHOVA?

13. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 139:​1-4, olee otú mbilite n’ọnwụ ga-esi gosi otú Jehova hụruru anyị n’anya?

13 Dị ka anyị kwuburu, ọ bụrụ na Jehova akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ, ọ ga-eme ka ha cheta ihe ndị ha mabu, ha ana-akpakwa àgwà e ji mara ha tupu ha anwụọ. Chegodị echiche ihe nke ahụ pụtara. Otú Jehova hụruru gị n’anya ruru nke na ọ ma ihe niile gbasara gị ma ihe ndị ị na-eche, ihe ndị ị na-ekwu, nakwa ihe ndị ị na-eme. Ọ ga-echetakwa ha. N’ihi ya, ọ kpọlitewe gị n’ọnwụ, ọ ga-adịrị ya mfe ime ka ị dịghachi otú ị dịbu. Eze Devid ma na Jehova ma onye nke ọ bụla n’ime anyị nke ọma. (Gụọ Abụ Ọma 139:​1-4.) Olee otú obi na-adị anyị ịmata na Jehova ma anyị nke ọma?

14. Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị ma anyị na-eche gbasara otú Jehova maruru anyị?

14 Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú Jehova si mara anyị nke ọma, anyị agaghị na-echegbu onwe anyị. N’ihi gịnị? Cheta na ihe gbasara anyị na-emetụ Jehova n’obi. O jighị onye ọ bụla n’ime anyị egwuri egwu. Ọ ma nke ọma ihe ndị mere anyị ji na-eme otú anyị si eme. Ihe a na-eme ka obi ruo anyị ala. Ka anyị ghara iche na anyị nọ naanị anyị. Jehova nọ anyị n’akụkụ mgbe ọ bụla na-achọ otú ọ ga-esi nyere anyị aka.​—2 Ihe 16:9.

AMAMIHE JEHOVA ENWEGHỊ ATỤ

15. Olee otú mbilite n’ọnwụ si egosi na amamihe Jehova enweghị atụ?

15 Ndị mmadụ na-atụ ọnwụ egwu. Ndị Ekwensu na-achị na-ejikarị ya eme ka ndị mmadụ ghọgbuo enyi ha ma ọ bụ mee ihe ha na-ekwesịghị ime. Ma, anyị anaghị atụ ọnwụ egwu. Anyị ma na ọ bụrụ na ndị iro anyị egbuo anyị, Jehova ga-akpọlite anyị. (Mkpu. 2:10) O doro anyị anya na o nweghị ihe ha ga-eme ka anyị kwụsị ife Jehova. (Rom 8:​35-39) Olileanya mbilite n’ọnwụ Jehova mere ka anyị nwee gosiri na amamihe ya enweghị atụ. O ji ya mee ka Ekwensu ghara ịna-eji ọnwụ eyi anyị egwu, meekwa ka obi sie anyị ike ịna-erubere Chineke isi.

Ihe ndị anyị na-ekpebi ime hà na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16) *

16. Olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị? Oleekwa otú azịza ha ga-esi nyere gị aka ịmata ma ị̀ tụkwasịrị Jehova obi?

16 Ọ bụrụ na ndị iro Jehova asị na ha ga-egbu gị, ị̀ ga-atụkwasị Jehova obi na ọ ga-akpọlite gị n’ọnwụ? Olee otú ị ga-esi mara? Otu ụzọ bụ ịjụ onwe gị sị, ‘Mkpebi ọ bụla m na-eme kwa ụbọchị ọ̀ na-egosi na m tụkwasịrị Jehova obi?’ (Luk 16:10) I nwekwara ike ịjụ onwe gị sị, ‘Otú m si ebi ndụ ọ̀ na-egosi na m tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enye m ihe ndị dị m mkpa ma m buru ụzọ na-achọ Alaeze ya?’ (Mat. 6:​31-33) Ọ bụrụ na ihe ị ga-aza na ajụjụ ndị ahụ bụ ee, o gosiri na ị tụkwasịrị Jehova obi, nakwa na ị dị njikere idi nsogbu ọ bụla ga-abịara gị.​—Ilu 3:​5, 6.

JEHOVA NA-ENWE NDIDI

17. (a) Olee otú mbilite n’ọnwụ si egosi na Jehova nwere ndidi? (b) Olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ndidi Jehova?

17 Jehova nwere ụbọchị na awa ọ kara aka ọ ga-ebibi ụwa ochie a. (Mat. 24:36) Ọ gaghị akwụsị inwe ndidi ma bibie ụwa tupu oge ahụ eruo. Ọ chọsiri ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, ma ọ na-enwe ndidi. (Job 14:​14, 15) Ọ na-eche ka oge ọ kara aka ruo ka ọ kpọlite ha n’ọnwụ. (Jọn 5:28) E nwere ọtụtụ ihe mere obi ji kwesị ịdị anyị ụtọ na Jehova na-enwe ndidi. Chegodị echiche: Ọtụtụ ndị, ma anyịnwa, ‘echegharịala’ n’ihi ndidi Jehova nwere. (2 Pita 3:9) Jehova chọrọ ka ọtụtụ ndị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, ka anyị gosi na obi dị anyị ụtọ maka ndidi ya. Olee otú anyị ga-esi egosi ya? Ọ bụ ime ike anyị niile iji chọta ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi,” nakwa inyere ha aka ka ha hụ Jehova n’anya ma na-efe ya. (Ọrụ 13:48) Anyị mee otú ahụ, ndidi Jehova ga-abara ha uru otú ahụ ọ baara anyị.

18. Olee ihe mere o ji dị mma inwere ndị ọzọ ndidi?

18 Jehova ga-eji ndidi chere ruo mgbe Jizọs chịchara otu puku afọ tupu ya atụwa anya na anyị ga-ezu okè. Tupu mgbe ahụ, Jehova dị njikere ịgbaghara anyị mmehie anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-eme ka Jehova na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-emeta ma na-enwere ha ndidi. Chegodị ihe mere otu nwanna nwaanyị di ya malitere ichegbu onwe ya ma kwụsị ịga ọmụmụ ihe. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Ihe a wutere m n’ihi na o mere ka ihe ndị anyị bu n’obi ime ghara inwe isi.” N’agbanyeghị ihe ndị a, nwaanyị a hụrụ di ya n’anya nweere ya ndidi. Ike agwụghị ya n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. O mere ka Jehova. Otú o si mee ya bụ na o lekwasịrị anya n’àgwà ọma ndị di ya nwere. Ọ sịrị: “Di m nwere àgwà ndị magburu onwe ha. Ọ na-agbasi mbọ ike ịkwụsị ichegbu onwe ya.” Ọ dị ezigbo mkpa inwere ndị ezinụlọ anyị ma ọ bụ ndị ọgbakọ anyị nọ ná nsogbu ndidi.

19. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

19 Jizọs na ndị mmụọ ozi nwere obi ụtọ mgbe mbụ e kere ụwa. Chetụgodịnụ ụdị obi ụtọ ha ga-enwe ma ha hụ na ụwa a jupụtaziri ná ndị zuru okè hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Chee ụdị obi ụtọ ndị ahụ ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe ga-enwe ma ha hụ ka ọchịchị ha na-abara ndị mmadụ uru. (Mkpu. 4:​4, 9-11; 5:​9, 10) Cheekwa otú ọ ga-adị mgbe obi ụtọ ga-anọchi ákwá, mgbe ọrịa, iru uju, na ọnwụ na-agaghịzi adị ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpu. 21:4) Ruo mgbe ihe ndị a ga-eme, kpebisie ike na ị ga na-eme ka Nna anyị hụrụ anyị n’anya, nwee amamihe, na-enwekwa ndidi. I mee otú ahụ, ị ga na-enwe obi ụtọ, n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara gị. (Jems 1:​2-4) Anyị nwere ezigbo obi ụtọ maka nkwa Jehova kwere anyị “na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ.”​—Ọrụ 24:15.

ABỤ NKE 141 Ndụ Bụ Ọrụ Ebube

^ par. 5 Jehova bụ Nna anyị hụrụ anyị n’anya, nwee amamihe, na-enwekwa ndidi. Anyị na-ahụ àgwà ndị a ma n’otú o si kee ihe ndị o kere ma ná nkwa o kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ụfọdụ anyị nwere ike ịjụ banyere mbilite n’ọnwụ, tụleekwa otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova bụ Chineke hụrụ anyị n’anya, nwee amamihe, na-enwekwa ndidi.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Ebe a kpọlitere otu nwoke nwụrụ kemgbe ọtụtụ narị afọ gara aga n’ime otu puku afọ Kraịst na-achị. Ebe otu nwanna na-anwụghị n’Amagedọn ji obi ụtọ na-akụziri otu nwoke ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ihe o kwesịrị ime iji rite uru n’àjà Jizọs.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-agwa onye were ya n’ọrụ na e nwere ụbọchị ụfọdụ n’izu ọ na-agaghị arụ ọrụ ma ọrụ gbasaa. Ọ kọwaara ya na o wepụtara mgbede ụbọchị ndị ahụ iji fee Jehova. Ma, na ya dị njikere ịrụ ọrụ ma ọrụ gbasaa n’ụbọchị ndị ọzọ ma a chọọ.