Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 33

Anya Jehova Dị n’Ebe Ndị Ya Nọ

Anya Jehova Dị n’Ebe Ndị Ya Nọ

“Anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ.”​—ỌMA 33:18.

ABỤ NKE 4 “Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị mere Jizọs ji rịọ Jehova ka o chebe ndị na-eso ụzọ ya?

 N’ABALỊ bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ rịọrọ Nna ya nke eluigwe arịrịọ pụrụ iche. Ọ rịọrọ Jehova ka o chebe ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 17:15, 20) O doro anya na anya Jehova dị n’ebe ndị ya nọ mgbe niile, nke pụtara na ọ na-elekọta ha ma na-echebe ha. Ma, Jizọs ma na Ekwensu ga-eme ka mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ bịara ndị na-eso ụzọ ya. Ọ makwa na ọ bụ aka Jehova ga-enyere ha ga-eme ka ha nwee ike imeri ya.

2. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 33:18-20, gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ nsogbu ụjọ?

2 Ụwa Setan na-enye ezigbo Ndị Kraịst taa ọtụtụ nsogbu. Nsogbu ndị na-abịara anyị nwere ike ime ka ike gwụwa anyị. O nwedịrị ike ime ka o siere anyị ike irubere Jehova isi. Ma, dị ka anyị ga-amụta n’isiokwu a, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. Anya Jehova dị n’ebe anyị nọ. Ọ pụtara na ọ na-ahụ ihe ndị na-esiri anyị ike, dịkwa njikere mgbe niile inyere anyị aka. Ka anyị leba anya n’akụkọ abụọ Baịbụl kọrọ na-egosi otú ‘anya Jehova si dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ.’​—Gụọ Abụ Ọma 33:18-20.

MGBE Ọ DỊ ANYỊ KA ANYỊ ENWEGHỊ MMADỤ

3. Olee mgbe o nwere ike ịdị anyị ka anyị enweghị mmadụ?

3 N’agbanyeghị na anyị nwere ọtụtụ ụmụnna n’ọgbakọ, o nwere ike ịdị anyị mgbe ụfọdụ ka anyị enweghị mmadụ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịdị ndị na-eto eto ka hà nọ naanị ha mgbe ha nọ n’ihu ụmụ klas ha na-akọwa ihe ha kweere ma ọ bụ ma ha gafee n’ọgbakọ ọzọ. Obi nwere ike ịna-ajọ ụfọdụ n’ime anyị njọ ma ọ bụkwanụ ike ụwa agwụwa anyị, anyị echewe na e nweghị onye ga-enyere anyị aka ná nsogbu bịaara anyị. O nwere ike isiri anyị ike ịkọrọ ndị ọzọ otú obi dị anyị n’ihi na ọ dị anyị ka hà agaghị aghọta anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche ma è nwedịrị onye chọrọ ịma ma ànyị dị ndụ ma ànyị nwụrụ anwụ. Ọ bụrụ na ọ dị anyị ka anyị enweghị mmadụ n’agbanyeghị ihe kpatara ya, o nwere ike ime ka ike na-agwụ anyị, anyị ana-echegbukwa onwe anyị. Jehova achọghị ka ọ dị anyị otú ahụ. Maka gịnị ka anyị ga-eji kwuo otú ahụ?

4. Gịnị mere Ịlaịja ji sị na ‘ọ fọziri naanị ya’?

4 Chegodị ihe mere Ịlaịja onye amụma. Jezibel fooro ntutu taa na ọ ga-egbu ya. N’ihi ya, ọ nọ na-agba ọsọ ndụ ruo ihe karịrị ụbọchị iri anọ. (1 Eze 19:1-9) Ịlaịja mechara nọrọ naanị ya n’otu ọgba, sị Jehova na ‘ọ fọziri naanị ya.’ (1 Eze 19:10) E nwere ọtụtụ ndị amụma ndị ọzọ n’Izrel. Dị ka ihe atụ, Obedaya jisiri ike chebe otu narị ndị amụma ka Jezibel ghara igbu ha. (1 Eze 18:7, 13) Gịnịzi mere o ji dị Ịlaịja ka ọ̀ bụ naanị ya fọrọ? Ọ̀ ga-abụ na o chere na ndị amụma ndị ahụ Obedaya chebere anwụchaala? Ò chere na ọ bụzi naanị ya fọrọ maka na e nweghị onye bịara soro ya fewe Jehova mgbe Jehova gosichara na ọ bụ ya bụ ezi Chineke n’Ugwu Kamel? Ọ̀ ga-abụ na o chere na e nweghị onye ma ụdị nsogbu ọ nọ na ya? Ka ò chere na e nweghị onye ihe gbasara ya na-emetụ n’obi? Baịbụl ekwughị ihe niile Ịlaịja nọ na-eche. Ma, ihe anyị ma bụ na Jehova ghọtara ihe mere Ịlaịja ji chee na ọ bụ naanị ya fọrọ, marakwa otú ọ ga-esi nyere ya aka.

Mgbe ọ dị anyị ka anyị enweghị mmadụ, olee ihe na-akasi obi anyị nwere ike ịmụta n’otú Jehova si nyere Ịlaịja aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6)

5. Olee otú Jehova si mesie Ịlaịja obi ike na ọ bụghị naanị ya fọrọ?

5 Jehova mere ihe ụfọdụ iji nyere Ịlaịja aka. Ọ gbara Ịlaịja ume ka o kwuo okwu. Ọ jụrụ Ịlaịja ugboro abụọ, sị: “Gịnị ka ị na-eme ebe a?” (1 Eze 19:9, 13) Na nke ọ bụla, Jehova gere ntị ka Ịlaịja na-ekwu otú ọ dị ya n’obi. Otú Jehova si nyere ya aka bụ ime ka ọ mata na ya nọ ebe ahụ nakwa na ike ya dị egwu. O mesikwara Ịlaịja obi ike na e nwere ọtụtụ ndị Izrel ndị ọzọ na-efekwa Chineke. (1 Eze 19:11, 12, 18) O doro anya na obi ruru Ịlaịja ala mgbe ọ gwachara Jehova otú ọ dị ya n’obi, nụkwa ihe Jehova zara ya. Jehova nyere Ịlaịja ọrụ ụfọdụ dị mkpa. Ọ gwara ya ka ọ gaa tee Hazel mmanụ ka ọ bụrụ eze Siria, tee Jihu mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel, teekwa Ịlaịsha mmanụ ka ọ bụrụ onye amụma. (1 Eze 19:15, 16) Jehova ji ọrụ ahụ o nyere Ịlaịja nyere ya aka ka o chewe gbasara ihe ndị dị mma. Chineke nyekwara ya onye ya na ya ga na-arụkọ ọrụ, ya bụ, Ịlaịsha. Olee otú Jehova ga-esi nyere gị aka mgbe ọ dị gị ka ọ̀ bụ naanị gị nọ?

6. Gịnị ka i nwere ike ikpe ekpere maka ya ma ọ dị gị ka ọ̀ bụ naanị gị nọ? (Abụ Ọma 62:8)

6 Jehova na-agwa gị ka ị na-ekpe ekpere. Ọ na-ahụ nsogbu bịaara gị. Ọ na-emesikwa gị obi ike na ọ ga-anụ ekpere i kpere mgbe ọ bụla. (1 Tesa. 5:17) Ịnụ ekpere ndị na-efe ya na-eme ya obi ụtọ. (Ilu 15:8) Olee ihe i nwere ike ikpe ekpere maka ya mgbe ọ dị gị ka ọ̀ bụ naanị gị nọ? Gwa Jehova otú ọ dị gị n’obi otú ahụ Ịlaịja mere. (Gụọ Abụ Ọma 62:8.) Gwa ya ihe ndị na-echegbu gị na otú ha mere ka obi dị gị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịma ihe ị ga-eme mgbe obi na-adịghị gị mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ na-abụ, ụmụ klas unu jụọ gị ajụjụ gbasara ihe i kweere, ya adị gị ka ọ̀ bụ naanị gị nọ, ụjọ ana-atụkwa gị, rịọ Jehova ka o mee ka obi sie gị ike ikwu ihe ị chọrọ ikwu. I nwedịrị ike ịrịọ ya ka o nye gị amamihe ka i nwee ike iji akọ kọwaa ihe i kweere. (Luk 21:14, 15) Ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka i nwee ike ịkọrọ ya Onye Kraịst ma nke a na-akọ. I nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere onye ahụ ị ga-akọrọ ya aka ka o gee gị ntị ma ghọta otú ọ dị gị. Gwa Jehova otú ọ dị gị n’obi, hụ otú ọ ga-esi aza ekpere gị. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ikwe ka ndị ọzọ nyere gị aka. I mee ya, ọ gaghịzi na-adị gị ka ọ̀ bụ naanị gị nọ.

Ị̀ na-achọ ụzọ ndị ị ga-esi wepụtakwuo oge na-ekwusa ozi ọma, sorokwa ndị ọzọ na-ekwusa ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Mauricio mere?

7 Jehova enyela anyị niile ọrụ bara ezigbo uru anyị ga-arụ. Ka obi sie gị ike na ọ na-ahụ mbọ niile ị na-agba iji mee ihe i kwesịrị ime n’ọgbakọ nakwa n’ozi ọma. O jikwa ya kpọrọ ihe. (Ọma 110:3) Olee otú ịrụsi ọrụ a ike ga-esi nyere gị aka mgbe ọ dị gị ka ọ̀ bụ naanị gị nọ? Chegodị banyere otu nwanna bụ́ okorobịa aha ya bụ Mauricio. b Obere oge o mechara baptizim, otu ezigbo enyi ya ji nwayọọ nwayọọ hapụwa ọgbakọ. Ọ sịrị: “Mgbe m hụrụ na ọ hapụla Jehova, o mere ka m chewe ma m̀ ga-efelikwa Jehova. M nọ na-eche ma m̀ ga-emezuli nkwa m kwere Jehova, nọsiekwa ike n’ọgbakọ ya. Ọ bịara dị m ka ọ̀ bụ naanị m nọ, mụ echewekwa na e nweghị onye ga-aghọtali otú ọ dị m.” Gịnị nyeere nwanna a aka? Ọ sịrị: “M wepụtakwuru oge na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụ ihe nyeere m aka ịkwụsị ịna-eche gbasara onwe m na otú obi dị m. Mụ na ndị ọzọ nọrọ n’ozi ọma, obi na-adị m ụtọ, mụ akwụsịkwa iche na enweghị m mmadụ.” N’eziokwu, ọ bụrụgodị na anyị na ụmụnna anyị agaghị esoli zie ozi ọma ihu na ihu, iso ha jiri ihe ndị dị ka akwụkwọ ozi na ekwentị na-ezi ozi ọma na-agba anyị ume. Olee ihe ọzọ nyeere Nwanna Mauricio aka? O kwuru, sị: “M bidokwara ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ. E nye m ihe omume, m na-agbalịsi ike mụọ ya ma mee ya nke ọma. Ihe omume ndị ahụ mere ka m mata na Jehova na ndị ọzọ ji m kpọrọ ihe.”

MGBE NSOGBU TARA AKPỤ JI ANYỊ N’OLU

8. Olee otú nsogbu ndị tara akpụ nwere ike ime ka obi dị anyị?

8 Anyị ma na nsogbu ga-abịara anyị n’oge ikpeazụ a. (2 Tim. 3:1) Ma, mgbe ọ ga-abịa na ụdị nke ga-abịara anyị nwere ike ịda anyị na mberede. Ego nwere ike ịkọ anyị na mberede, ma ọ bụ ya abụrụ na a chọpụtara na anyị na-arịa ajọ ọrịa, ma ọ bụkwanụ na onye dị anyị n’obi nwụrụ. Ụdị ihe ahụ mee, obi nwere ike ịgbawa anyị, anyị adịrị ka onye mmiri chọrọ iri, karịchaa ma ọ bụrụ na ọ dị ka nsogbu ndị a hà na-ezoro anyị ka mmiri ma ọ bụdị na ha zuru anyị ahụ́ otu mgbe. Ma, cheta na anya Jehova dị n’ebe anyị nọ. Ebe ọ bụ na ọ na-enyere anyị aka, obi kwesịrị isi anyị ike ma nsogbu ọ bụla bịara anyị.

9. Kọwaa nsogbu ụfọdụ bịaara Job.

9 Chegodị otú Jehova si nyere ohu ya bụ́ Job aka. N’obere oge, nsogbu si n’elu si n’ala zuo Job ahụ́. N’otu ụbọchị, a kọọrọ Job na anụ ụlọ ya niile anwụchaala, na e gbuokwala ụmụ ya na ndị na-ejere ya ozi. (Job 1:13-19) Ka ọ ka na-eru uju nke ahụ, obere oge, ọrịa abịa ya. Ọrịa ahụ na-afụ ụfụ, na-erikasịkwa mmadụ ahụ́. (Job 2:7) Otú ihe si siere Job ike mere ka o tie mkpu, sị: “Ndụ m agwụla m ike. Achọghịzi m ịdị ndụ.”​—Job 7:16.

Jehova gwara Job otú o si elekọta ihe dị iche iche o kere iji mee ka obi sie ya ike na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na ọ ga-elekọta ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee otú Jehova si nye Job ihe ga-eme ka ọ tachie obi ná nsogbu ndị bịaara ya? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

10 Anya Jehova dị n’ebe Job nọ. Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ Job n’anya, o nyere Job ihe ga-eme ka ọ tachie obi ná nsogbu ya ma na-erubere ya isi. Jehova gwara ya okwu, chetara ya na amamihe Chineke enweghị atụ nakwa na ọ na-elekọta ihe ndị o kere eke. O kwuru gbasara ọtụtụ anụmanụ dị ịtụnanya. (Job 38:1, 2; 39:9, 13, 19, 27; 40:15; 41:1, 2) Jehova jikwa Elaịhu, bụ́ nwa okorobịa nwere okwukwe, gbaa Job ume, kasiekwa ya obi. Elaịhu mere ka obi sie Job ike na ọ bụrụ na ndị na-efe Jehova atachie obi, Jehova na-agọzi ha mgbe niile. Ma, Jehova mekwara ka Elaịhu nye Job ezigbo ndụmọdụ. Elaịhu nyeere Job aka ka o lekwasị anya n’ihe kacha mkpa. Otú o si mee ya bụ ichetara Job na o nweghị ebe o ruru ma e jiri ya tụnyere Jehova, bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa. (Job 37:14) Jehova nyekwara Job ọrụ ọ ga-arụ, ya bụ, ka o kpeere ndị enyi ya atọ mere mmehie ekpere. (Job 42:8-10) Olee otú Jehova si akwado anyị taa ma nsogbu siri ike bịara anyị?

11. Olee otú Baịbụl si akasi anyị obi ma nsogbu bịara anyị?

11 Jehova anaghị esi n’eluigwe agwa anyị okwu taa otú ahụ ọ gwara Job. Ma, ọ na-esi n’Okwu ya bụ́ Baịbụl agwa anyị okwu. (Rom 15:4) Otú o si akasi anyị obi bụ ime ka anyị nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Chegodị gbasara ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike ịkasi anyị obi ma nsogbu bịara anyị. Na Baịbụl, Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na e nweghị ihe ọ bụla ga-enwe ike “ime ka Chineke kwụsị ịhụ anyị n’anya,” ọ sọkwa ya ya bụrụ nsogbu tara akpụ. (Rom 8:38, 39) O mekwara ka obi sie anyị ike na ọ “nọ ndị niile na-akpọku ya nso.” (Ọma 145:18) Jehova gwara anyị na ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi, anyị ga-edili nsogbu ọ bụla, nweedị obi ụtọ ọ bụrụgodị na anyị na-ata ahụhụ. (1 Kọr. 10:13; Jems 1:2, 12) Okwu Chineke na-echetakwara anyị na nsogbu ndị na-abịara anyị anaghị adịte aka ma e jiri ha tụnyere ndụ ebighị ebi Chineke ga-enye anyị. (2 Kọr. 4:16-18) Jehova emeela ka anyị nwee ezigbo olileanya na ọ ga-ewepụ ndị na-akpata nsogbu anyị niile, ya bụ, Ekwensu na ndị ọjọọ na-eme ka ya. (Ọma 37:10) È nwere amaokwu Baịbụl ụfọdụ na-akasi obi i bu n’isi, ndị ga-enyere gị aka ịtachi obi ná nsogbu ndị ga-abịara gị?

12. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mee ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Okwu ya baara anyị ezigbo uru?

12 Jehova chọrọ ka anyị na-ewepụta oge mgbe niile na-amụ Baịbụl ma na-echebara ihe ndị anyị mụrụ echiche. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị anyị mụtara, okwukwe anyị ga na-esikwu ike, anyị na Nna anyị nke eluigwe ana-adịkwu ná mma. Ọ ga-eme ka anyị nwee ike idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Ihe ọzọ Jehova na-emere ndị tụkwasịrị Okwu ya obi bụ inye ha mmụọ nsọ ya. Mmụọ nsọ ga-eme ka anyị nwee “ike karịrị ike mmadụ.”​—2 Kọr. 4:7-10.

13. Olee otú ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ji enyeju anyị afọ si enyere anyị aka ịtachi obi ná nsogbu ndị bịaara anyị?

13 Jehova na-enyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” aka ịna-ewepụta isiokwu, vidio, na egwú ndị ga-enyere anyị aka inwe okwukwe siri ike, anyị na ya ana-adịkwa ná mma. (Mat. 24:45) Anyị kwesịrị iji ihe ndị a niile Jehova na-enye anyị n’oge kwesịrị ekwesị na-enyere onwe anyị aka. N’oge na-adịbeghị anya, otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka kwuru na obi atọgbuola ya maka ihe ndị a Jehova ji eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ sịrị: “Kemgbe afọ iri anọ m fewere Jehova, ọtụtụ ọnwụnwa abịarala m.” Nsogbu ndị tara akpụ bịaara ya. Otu ọkwọ ụgbọala mmanya na-egbu gburu papa mama ya, ọrịa gbukwara nne ya na nna ya, yanwa arịakwa kansa ugboro abụọ. Olee ihe nyeere ya aka ịtachi obi? Ọ sịrị: “Jehova na-elekọta m mgbe niile. Ihe ndị o si n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na-enye anyị iji mee ka okwukwe anyị sie ike enyerela m aka ịtachi obi. O meela ka obi dị m otú ọ dị Job mgbe ọ sịrị: ‘Ruo mgbe m nwụrụ, m ga-ejisi Chineke aka ike.’”​—Job 27:5.

Olee otú anyị ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka n’ọgbakọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee otú Jehova si eji ụmụnna anyị akwado anyị ma nsogbu bịara anyị? (1 Ndị Tesalonaịka 4:9)

14 Jehova na-akụziri ndị ya ka ha hụ ibe ha n’anya ma na-akasi ibe ha obi n’oge ihe siri ike. (2 Kọr. 1:3, 4; gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 4:9.) Ụmụnna anyị na-eme ka Elaịhu. Ọ bụrụ na nsogbu bịara anyị, ha na-agbalịsi ike inyere anyị aka ka okwukwe anyị sie ike. (Ọrụ 14:22) Dị ka ihe atụ, chegodị otú ndị ọgbakọ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Diane si gbaa ya ume ma nyere ya aka ka okwukwe ya sie ike mgbe ọrịa ọjọọ bịara di ya. Ọ sịrị: “Ọ dịghị mfe. Ma, anyị hụrụ otú Jehova si jiri obiọma ya kwado anyị n’ọnwa ndị ahụ siri ike. Ndị ọgbakọ anyị mere ọtụtụ ihe iji nyere anyị aka. Ha bịara leta anyị, kpọọ anyị n’ekwentị, makụọkwa anyị. Ihe a niile nyeere anyị aka ịtachi obi. Ebe ọ bụ na anaghị m anya ụgbọala, ụmụnna gbara mbọ hụ na e bugara m ọmụmụ ihe nakwa na m gara ozi ọma mgbe ọ bụla m nwere ike.” Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nwere ụdị ụmụnna ndị a hụrụ anyị n’anya n’ọgbakọ.

OBI DỊ ANYỊ ỤTỌ MAKA OTÚ JEHOVA SI ELEKỌTA ANYỊ

15. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na anyị ga-edili nsogbu bịaara anyị?

15 Nsogbu nwere ike ịbịara onye ọ bụla n’ime anyị. Ma, anyị amụtala na o nweghị mgbe a ga-ahapụ naanị anyị. Anya Jehova dị n’ebe anyị nọ mgbe niile otú ahụ nna na-emere ụmụ ya. Ọ nọ anyị nso, dịkwa njikere ịnụ arịrịọ anyị na-arịọ ka o nyere anyị aka. Ọ chọsikwara ike ịna-akwado anyị. (Aịza. 43:2) Obi siri anyị ike na anyị ga-edili nsogbu bịaara anyị n’ihi na o nyela anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ịtachi obi. O nyela anyị ọmarịcha onyinye, ya bụ, ekpere, Baịbụl, ihe ndị o ji akụziri anyị Baịbụl, na ụmụnna hụrụ anyị n’anya, ndị na-enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị.

16. Gịnị ka anyị ga-eme ka anya Jehova dịrị n’ebe anyị nọ ruo mgbe ebighị ebi?

16 Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka na Nna anyị nke eluigwe na-elekọta anyị. “Anyị na-enwe obi ụtọ n’ihi Chineke anyị.” (Ọma 33:21) Otú anyị ga-esi gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka nlekọta ọ na-elekọta anyị bụ iji ihe niile o nyere anyị na-eme ihe bara uru. Anyị kwesịkwara ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka ọ kwụsị ịna-elekọta anyị. Ihe ọ pụtara bụ na, ọ bụrụ na anyị ana-eme ike anyị niile irubere Jehova isi ma na-eme ihe dị ya mma, anya ya ga-adị n’ebe anyị nọ ruo mgbe ebighị ebi.​—1 Pita 3:12.

ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M

a Anyị chọrọ enyemaka Jehova ka anyị nwee ike imeri nsogbu ndị na-abịara anyị taa. Isiokwu a ga-eme ka obi sie anyị ike na anya Jehova dị n’ebe ndị ya nọ. Ọ na-ahụ nsogbu ndị na-abịara onye ọ bụla n’ime anyị. Ọ na-enyekwa anyị ihe ga-eme ka anyị merie ha.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.