Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 34

‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Eziokwu Ahụ’

‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Eziokwu Ahụ’

‘Nọgidenụ na-eje ije n’eziokwu ahụ.”​—3 JỌN 4.

ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee uru ikwurịta gbasara otú anyị si bata n’ọgbakọ na-abara anyị?

 “OLEE otú i si bata n’ọgbakọ?” Ọ ga-abụ na ndị mmadụ ajụọla gị ajụjụ a ọtụtụ ugboro. O so n’ihe mbụ nwanna na-ajụ nwanna ibe ya ma ọ chọwa ịmatakwu onye ọ bụ. Obi na-adị anyị ụtọ ịnụ ka ụmụnna anyị na-ekwu otú ha si mata Jehova na otú ha si hụ ya n’anya. Obi na-adịkwa anyịnwa ụtọ ịgwa ha otú anyị si jiri eziokwu ahụ kpọrọ ihe. (Rom 1:11) Ịkparịta ụdị ihe a na-echetara anyị ụdị uru ịnọ n’ọgbakọ Jehova bara. Ọ na-emekwa ka anyị kpebisikwuo ike ‘ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ.’​—3 Jọn 4.

2. Gịnị ka anyị ga-ekwu gbasara ha n’isiokwu a?

2 N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ihe ụfọdụ mere anyị ji jiri eziokwu ahụ kpọrọ ihe. Anyị ga-ekwukwa otú anyị ga-esi na-egosi na anyị ji onyinye a magburu onwe ya kpọrọ ezigbo ihe. O doro anya na ileba anya n’ihe ndị a ga-eme ka obi na-adịkwu anyị ụtọ na Jehova kpọbatara anyị n’ọgbakọ ya. (Jọn 6:44) Ọ ga-emekwa ka ọ na-agụsikwu anyị agụụ ike ịgwa ndị ọzọ gbasara eziokwu ahụ.

IHE MERE ANYỊ JI JIRI “EZIOKWU AHỤ” KPỌRỌ IHE

3. Olee ihe kacha mkpa mere anyị ji jiri eziokwu ahụ kpọrọ ihe?

3 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji jiri eziokwu ahụ kpọrọ ihe. Nke kachanụ bụ na anyị hụrụ Jehova, bụ́ Onye eziokwu ahụ si n’aka, n’anya. Anyị si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl mata na ọ bụ ya kacha ike, na ọ bụ ya kere eluigwe na ụwa, na ọ hụrụ anyị n’anya, nakwa na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. (1 Pita 5:7) Anyị ma na Chineke anyị ‘na-eme ebere, ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ịhụnanya ya na eziokwu ya dịkwa ukwuu.’ (Ọpụ. 34:6) Jehova ejighị ikpe ziri ezi egwu egwu. (Aịza. 61:8) Ọ na-ewute ya ịhụ ka anyị na-ata ahụhụ. Ọ na-atụsikwa anya ike ka oge ọ kara aka ọ ga-akwụsị ahụhụ niile ruo. (Jere. 29:11) Oge ahụ ga-amagbu nnọọ onwe ya. Ọ bụ otu ihe mere anyị ji hụ Jehova n’anya nke ukwuu.

Eziokwu Baịbụl Dị Ka . . .Nko E Ji Ejide Ụgbọ Mmiri

Otú ahụ nko si ejide ụgbọ mmiri ka olileanya Baịbụl mere ka anyị nwee na-eme ka obi ruo anyị ala ma nsogbu bịara anyị. Eziokwu Baịbụl na-emekwa ka anyị chọọ ịkọrọ ndị ọzọ gbasara olileanya anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 7)

4-5. Gịnị mere Pọl onyeozi ji jiri olileanya anyị nwere tụnyere nko e ji ejide ụgbọ mmiri?

4 Olee ihe ọzọ mere anyị ji jiri eziokwu ahụ kpọrọ ihe? Ọ na-abara anyị ezigbo uru. Legodị otu ihe atụ. Ihe so n’eziokwu dị na Baịbụl bụ olileanya anyị nwere na ọdịnihu ga-aka mma. Iji gosi uru olileanya ahụ bara, Pọl onyeozi dere, sị: “Olileanya a anyị nwere ji ndụ anyị otú nko e ji ejide ụgbọ mmiri si ejide ụgbọ mmiri. O siri ike, e jikwa ya n’aka.” (Hib. 6:19) Otú ahụ nko si ejide ụgbọ mmiri ka olileanya Baịbụl mere ka anyị nwee na-enye aka eme ka obi ruo anyị ala ma nsogbu bịara anyị.

5 Ihe Pọl na-ekwu n’amaokwu ahụ bụ olileanya ịga eluigwe ndị e tere mmanụ nwere. Ma, ihe ahụ o kwuru gbasakwara ndị nwere olileanya ibi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs. (Jọn 3:16) O doro anya na olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi emeela ka ndụ anyị nwee isi.

6-7. Olee uru eziokwu Nwanna Nwaanyị Yvonne mụtara gbasara ọdịnihu baara ya?

6 Legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Yvonne. A mụghị ya n’ọgbakọ. Mgbe ọ dị obere, ụjọ ọnwụ na-atụ ya. E nwere otu ihe ọ gụrụ ọ na-anaghị echefu echefu. Ihe ahụ bụ: “Otu ụbọchị, a gaghị enwezi echi.” Ọ sịrị: “Ihe ahụ m gụtara mere ka m na-amụ anya n’abalị na-eche gbasara ihe ga-eme n’ọdịnihu. M nọ na-eche, sị: ‘A ga-enwerịrị ihe ọzọ mere anyị ji dị ndụ. Gịnị mere anyị ji adị ndụ obere oge ma nwụọ? Achọghị m ịnwụ.’”

7 Ka oge na-aga, mgbe ọ ka na-eto eto, ya na Ndịàmà Jehova hụrụ. Ọ sịrị: “M malitere ikweta na m ga-enweli olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.” Olee uru eziokwu a nwanna nwaanyị a mụtara baara ya? Ọ sịrị: “Anaghịzi m amụ anya n’abalị na-echegbu onwe m gbasara ọnwụ ma ọ bụ ihe ga-eme n’ọdịnihu.” O doro anya na Nwanna Nwaanyị Yvonne ji eziokwu ahụ ọ mụtara kpọrọ ezigbo ihe. Ịkọrọ ndị ọzọ gbasara olileanya ahụ o nwere na-emekwa ya ezigbo obi ụtọ.​—1 Tim. 4:16.

Eziokwu Baịbụl Dị Ka . . . Akụ̀

Ife Jehova ugbu a nakwa olileanya anyị nwere ife ya ruo mgbe ebighị ebi n’Alaeze Chineke dị ka akụ̀. Ọ karịrị ihe ọ bụla anyị ga-ahapụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 11)

8-9. (a) N’ihe atụ Jizọs mere, olee otú otu nwoke si gosi na o ji akụ̀ ọ hụrụ kpọrọ ihe? (b) Olee otú i si were eziokwu ahụ?

8 Ihe ọzọ so n’eziokwu ndị dị na Baịbụl bụ ozi ọma gbasara Alaeze Chineke. Jizọs ji eziokwu gbasara Alaeze Chineke tụnyere akụ̀ zoro ezo. Jizọs kwuru na Matiu 13:​44, sị: “Alaeze eluigwe dị ka akụ̀ e zoro n’ala, nke otu nwoke hụrụ wee zoo ya. Ọ gara ree ihe ndị o nwere wee zụọ ala ahụ n’ihi na ọṅụ juru ya obi.” Ị̀ hụrụ na ọ bụghị akụ̀ ahụ ka nwoke ahụ nọ na-achọ? Ma, mgbe ọ hụrụ ya, ọ hapụrụ ihe ndị dị ya ezigbo mkpa iji nweta ya. O rere ihe niile o nwere. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na akụ̀ ahụ bara ezigbo uru. Ọ hụrụ ihe ka ubi, ree ọba.

9 Ọ̀ bụ otú i si were eziokwu ahụ? O doro anya na i si otú ahụ were ya. Anyị ma na e nweghị ihe anyị ga-eji tụnyere ụdị ọṅụ anyị nwere ugbu a na anyị na-efe Jehova, nakwa olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’Alaeze Chineke. O nweghị ihe ọ bụla anyị hapụrụ ugbu a a ga-eji tụnyere obi ụtọ anyị na-enwe na anyị na Jehova dị n’ezigbo mma. Ihe kacha eme anyị obi ụtọ bụ na anyị “na-eme ya obi ụtọ.”​—Kọl. 1:10.

10-11. Gịnị mere Nwanna Michael ji gbanwee nnukwu ihe ná ndụ ya?

10 Ọtụtụ n’ime anyị ahapụla ọtụtụ ihe ka ha na Jehova nwee ike ịdị ná mma. Ụfọdụ hapụrụ ọrụ ga-eme ka a mara ha amara n’ụwa. Ụfọdụ kwụsịrị ịchụ akụnụba. E nwekwara ndị nke gbanwere otú ha si ebi ndụ mgbe ha mụtara gbasara Jehova. Ọ bụ ihe Nwanna Michael mere. A mụghị ya n’ọgbakọ. Mgbe ọ bụ okorobịa, ọ gara mụọ ịgba karat. Ọ sịrị: “Ihe ka m mkpa bụ ahụ́ ịgbasi m ike mgbe ọ bụla. Mgbe ụfọdụ, m na-eche na e nweghị onye ga-emerili m.” Ma, mgbe o bidoro mụwa Baịbụl, ọ mụtara otú Jehova si ele tigbuo zọgbuo anya. (Ọma 11:5) Michael kwuru, sị: “E nweghị mgbe di na nwunye mụụrụ m Baịbụl gwara m na m kwesịrị ịkwụsị ịgba karat. Ihe ha mere bụ ịna-akụziri m ihe Baịbụl kwuru.”

11 Ka Michael na-amụtakwu gbasara Jehova, ka ọ na-ahụkwu ya n’anya. Ihe kacha metụ ya n’obi bụ otú Jehova si emere ndị na-efe ya ebere. Ka oge na-aga, Michael chọpụtara na o kwesịrị ikpebi otu ihe ga-agbanwe ndụ ya. Ọ sịrị: “M ma na ịkwụsị ịgba karat ga-abụ ihe kacha siere m ike m metụrụla. Ma, m makwa na ọ ga-eme Jehova obi ụtọ. Obi sikwara m ike na ife Jehova bara uru karịa ihe ọ bụla m ga-ahapụ.” Michael ji eziokwu ahụ ọ mụtara kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere o ji gbanwee nnukwu ihe ná ndụ ya.​—Jems 1:25.

Eziokwu Baịbụl Dị Ka . . . Ọkụ

Ọkụ na-enwusi ike ga-enyere anyị aka ịhụ ụzọ n’ebe gbara ọchịchịrị. Otú ahụ ka Okwu Chineke si eme ka anyị hụ ụzọ n’ụwa Ekwensu a gbara ọchịchịrị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12-13. Olee otú eziokwu Baịbụl si nyere Nwanna Nwaanyị Mayli aka?

12 Iji gosi anyị uru eziokwu ahụ bara, Baịbụl ji ya tụnyere ọkụ a mụnyere n’ebe gbara ọchịchịrị. (Ọma 119:105; Efe. 5:8) E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mayli. Ọ bụ onye Azebaịjan. O ji eziokwu ọ mụtara n’Okwu Chineke kpọrọ ezigbo ihe. Mgbe ọ na-eto, mama ya na papa ya anaghị ekpe otu okpukpe. Papa ya bụ onye Alakụba, mama ya ana-ekpe okpukpe ndị Juu. Nwanna Nwaanyị Mayli sịrị: “Ọ bụ eziokwu na ama m na Chineke dị, ma e nwere ihe ndị ọzọ na-eju m anya. M nọ na-eche, sị: ‘Olee ihe mere Chineke ji kee ụmụ mmadụ, oleekwa ihe mere mmadụ ga-eji tachaa ahụhụ n’ụwa n’oge niile ọ dị ndụ, e mechaakwa, a taa ya ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ?’ Ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-ekwu na ihe niile na-eme bụ uche Chineke, m nọ na-eche, sị: ‘Chineke ọ̀ ga-ekpebichara ndị mmadụ ihe ha ga-eme, ha emee ya, obi adịkwa ya ụtọ ịhụ ka ha na-ata ahụhụ n’ọkụ?’”

13 Nwanna Nwaanyị Mayli nọ na-achọ ịmata azịza ajụjụ ndị ahụ o nwere. Ka oge na-aga, o kwere ka a mụwara ya Baịbụl, mechaakwa bata n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “Ihe ndị Baịbụl kwuru mere ka m malite nwewe obi ụtọ ná ndụ. Otú Baịbụl si kọwaara m ha, ha edoo m anya mere ka obi ruo m ala.” Dị ka Nwanna Nwaanyị Mayli, anyị niile na-eto Jehova bụ́ Onye ‘kpọpụtara anyị n’ọchịchịrị ma kpọba anyị n’ìhè ya dị ebube.’​—1 Pita 2:9.

14. Olee ihe ị ga-eme ka i jiri eziokwu ahụ kpọrọkwuo ihe? (Kọwaa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Ọzọ Baịbụl Ji Eziokwu Ahụ Tụnyere.”)

14 Ihe ndị a bụ ihe atụ ụfọdụ gosiri uru eziokwu ahụ bara. I nwere ike icheta ọtụtụ ihe atụ ndị ọzọ. Ị mụwa ihe n’onwe gị, gbalịa chọpụta ihe ndị ọzọ mere anyị kwesịrị iji jiri eziokwu ahụ kpọrọ ihe. Ka anyị na-eji eziokwu ahụ akpọrọkwu ihe, ka anyị ga-achọ ụzọ ndị anyị ga-esi gosi na anyị ji ya kpọrọ ihe.

OTÚ ANYỊ GA-ESI EGOSI NA ANYỊ JI EZIOKWU AHỤ KPỌRỌ IHE

15. Olee otu ụzọ anyị ga-esi gosi na anyị ji eziokwu ahụ kpọrọ ihe?

15 Anyị ga-egosi na anyị ji eziokwu ahụ kpọrọ ihe ma anyị na-amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl mgbe niile. A sị ka e kwuwe, n’agbanyeghị afọ ole anyị nọrọla n’ọgbakọ, a ka nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta. Ụlọ Nche mbụ e bipụtara kwuru, sị: “Eziokwu yiri obere okooko osisi dị n’ebe ahịhịa na-ama pokopoko juru. Ahịhịa ahụ fọrọ obere ka ọ kpagbuo okooko osisi ahụ. Onye chọrọ ịhụ okooko osisi ahụ ga-elezi anya. . . . Onye chọkwara inweta ya ga-ehulata ala. Afọ ekwesịghị iju ya ma o nweta naanị otu. . . . Ọ ga-agba mbọ ka o nwetakwuo.” Ịmụ ihe anaghị adị mfe, ma ọ na-aba ezigbo uru.

16. Olee otú i si amụ ihe ya ana-abara gị uru? (Ilu 2:4-6)

16 Ọ bụghị anyị niile ka ịgụ ihe na ịmụ ihe na-amasị. Ma, Jehova gwara anyị ka anyị “na-achọ” eziokwu ahụ ka anyị nwee ike ịghọtakwu ya. (Gụọ Ilu 2:4-6.) Ọ bụrụ na anyị agbasie mbọ ike, ọ ga-abara anyị uru. Otu nwanna aha ya bụ Corey kwuru na ya gụwa Baịbụl n’onwe ya, ọ na-elekwasị anya n’otu amaokwu n’otu oge. Ọ sịrị: “M na-agụ ihe niile e dere n’ala ala peeji amaokwu ahụ na ihe e dere n’etiti peeji, meekwa nchọnchọ. . . . Isi otú a amụ ihe na-eme ka m mụtakwuo ihe.” Ma ànyị si otú a ma ọ bụ otú ọzọ na-amụ ihe, otú anyị ga-esi egosi na anyị ji eziokwu ahụ kpọrọ ihe bụ iwepụta oge na-amụ ihe, gbasiekwa mbọ ike ka anyị mụta ihe.​—Ọma 1:1-3.

17. Olee otú anyị ga-esi na-ebi ndụ gosiri na anyị ma eziokwu ahụ? (Jems 1:25)

17 Anyị ma na ihe dị mkpa abụghị naanị ịmụta eziokwu ahụ. Anyị kwesịrị ịna-ebi ndụ gosiri na anyị ma eziokwu ahụ, ya bụ, ịna-eme ihe ndị anyị mụtara. Ọ bụ ya ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ. (Gụọ Jems 1:25.) Olee otú anyị ga-esi hụ na anyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta? Otu nwanna kwuru na ihe nwere ike inye aka bụ ileru onwe anyị anya ka anyị chọpụta ma ànyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta, chọpụtakwa ebe anyị kwesịrị ịna-emekwu nke ọma. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Otú ọ bụla anyị merurula nke ọma, ka anyị si otú ahụ mere nke ọma na-aga.”​—Fil. 3:16.

18. Gịnị mere anyị ji agbalị ike anyị niile ‘ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ’?

18 Chegodị gbasara uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ana-agbalị ike anyị niile ‘ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ.’ Ọ bụghị naanị na ndụ ga na-atọkwu anyị ụtọ, anyị ga na-emekwa Jehova na ụmụnna anyị obi ụtọ. (Ilu 27:11; 3 Jọn 4) N’eziokwu, ihe ndị a bụ ezigbo ihe mere anyị ji kwesị iji eziokwu ahụ kpọrọ ihe ma na-eme ihe ndị ahụ anyị mụtara.

ABỤ NKE 144 Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ

a Anyị na-akpọkarị ihe ndị anyị kweere na ihe ndị anyị na-eme “eziokwu ahụ.” Ma ànyị batara ọhụrụ n’ọgbakọ ma ọ̀ dịla anya anyị batara, iche echiche gbasara ihe mere anyị ji jiri eziokwu ahụ kpọrọ ihe ga-abara anyị ezigbo uru. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịna-eme ihe dị Jehova mma.