Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 35

“Na-emenụ Ka Ibe Unu Dị Ike”

“Na-emenụ Ka Ibe Unu Dị Ike”

“Na-agbanụ ibe unu ume ma na-emenụ ka ibe unu dị ike.”​—1 TESA. 5:11.

ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:11, olee ọrụ anyị niile so na-arụ?

 È NWEELA mgbe ndị ọgbakọ unu rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ma ọ bụ rụzigharịa nke dịbu adị? Ọ bụrụ na e nweela, o doro anya na i chetara ọmụmụ ihe mbụ unu gara na ya. Obi dị gị ezigbo ụtọ maka ihe Jehova meere unu. Ọ ga-abụdị na otú obi si tọọ gị ụtọ mere ka anya mmiri gbawa gị nke na ịbụ abụ mmalite siiri gị ike. Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a rụrụ nke ọma na-eme ka e too Jehova. Ma, e nwere ụdị ọrụ ọzọ anyị na-arụ nke ga-aka eme ka e too ya. Ọrụ ahụ dị mkpa karịa ịrụ ụlọ nkịtị. Ọ bụ ịna-eme ka ndị na-abịa n’ebe ndị ahụ a na-anọ efe Jehova dị ike. Ọ bụ ọrụ a ka Pọl onyeozi bu n’obi mgbe o kwuru ihe ahụ dị ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:11. Ọ bụ ebe e si nweta isiokwu a anyị na-amụ.​—Gụọ ya.

2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

2 Pọl onyeozi bụ onye e ji ama atụ n’inyere ụmụnna ya aka. O meteere ha ebere. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú o si nyere ụmụnna ya aka (1) idi nsogbu, (2) ịna-eme ka ha na ibe ha dịrị n’udo, nakwa (3) ịna-eme ka okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike. Ka anyị hụ otú anyị ga-esi na-eme ka ya, si otú ahụ na-eme ka ụmụnna anyị dị ike taa.​—1 Kọr. 11:1.

PỌL NYEERE ỤMỤNNA YA AKA IDI NSOGBU

3. Olee ihe Pọl na-emeghị?

3 Pọl hụrụ ụmụnna ya n’anya nke ukwuu. Yanwa takwara ahụhụ. N’ihi ya, ọ ga-emeteliri ụmụnna ya ndị nsogbu bịaara ebere. E nwere otu oge Pọl na-enweghịzi ego, ya arụwa ọrụ ka o nwee ike ịna-egbo mkpa ya nakwa nke ndị ya na ha so. (Ọrụ 20:34) Ọrụ ya bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu. Mgbe ọ garuru Kọrịnt, o bu ụzọ soro Akwịla na Prisila na-akpa ákwà ụlọikwuu. Ma “n’ụbọchị izu ike ọ bụla,” ọ na-ekwusara ndị Juu na ndị Grik ozi ọma. Ma mgbe Saịlas na Timoti rutere, “Pọl malitere iji oge ya niile na-ekwusa okwu Chineke.” (Ọrụ 18:2-5) Pọl echefughị ihe kacha ya mkpa ná ndụ, ya bụ, ife Jehova. Ebe ọ bụ na Pọl rụsiri ọrụ ike kwusaa ozi ọma, na-arụkwa ọrụ o ji na-egbo mkpa ya, ọ ga-agbali ụmụnna ya ume. O chetaara ha ka ha ghara ikwe ka nsogbu ndị ha nwere nakwa igbo mkpa ezinụlọ ha mee ka ha hapụ “ihe ndị ka mkpa,” ya bụ, ihe niile gbasara ofufe Jehova.​—Fil. 1:10.

4. Olee otú Pọl na Timoti si nyere ụmụnna ha aka mgbe a na-akpagbu ha?

4 Obere oge e hiwechara ọgbakọ dị na Tesalonaịka, mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ụmụnna ndị ahụ batara n’ọgbakọ ọhụrụ. Mgbe ndị mmegide iwe ji na-ahụghị Pọl na Saịlas, ha kpụụrụ “ụmụnna ụfọdụ gakwuru ndị na-achị obodo,” sị ha: “Ndị a niile na-emebi iwu Siza.” (Ọrụ 17:6, 7) Chegodị ụdị ụjọ ga na-atụ ụmụnna ndị a batara n’ọgbakọ ọhụrụ mgbe ndị obodo ahụ megidewere ha. Ha gaara akwụsị iji obi ha niile na-efe Jehova. Ma, Pọl achọghị ka ha mee otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na ya na Saịlas hapụrụ obodo ahụ, ha gbalịrị hụ na a na-elekọta ụmụnna ndị ahụ nke ọma. Pọl chetaara ndị Tesalonaịka, sị: “Anyị ziteere unu Timoti, nwanna anyị . . . , ka o mee ka unu kwụsie ike ma kasie unu obi ka okwukwe unu sie ike, ka a ghara inwe onye mkpagbu ndị a ga-eme ka ọ maa jijiji.” (1 Tesa. 3:2, 3) Ọ ga-abụ na a kpagbukwara Timoti n’obodo ya bụ́ Listra. Ọ hụrụ otú Pọl si mee ka ụmụnna ndị ebe ahụ dị ike. Ebe ọ bụ na Timoti ahụla otú Jehova si nyere ya aka n’oge ahụ, o mere ka obi sie ụmụnna ndị ahụ ike na ihe ga-agazikwara ha.​—Ọrụ 14:8, 19-22; Hib. 12:2.

5. Olee otú otu okenye si nyere Nwanna Bryant aka?

5 Olee otú ọzọ Pọl si mee ka ụmụnna ya dị ike? Mgbe Pọl na Banabas gaghachiri Listra, Aịkoniọm, na Antiọk, ha ‘họpụtara ndị okenye n’ọgbakọ nke ọ bụla.’ (Ọrụ 14:21-23) Ndị okenye ndị ahụ kasiri ọgbakọ ndị ahụ obi otú ahụ ndị okenye si eme taa. Legodị ihe otu nwanna aha ya bụ Bryant kwuru. Ọ sịrị: “Mgbe m dị afọ iri na ise, papa m hapụrụ ụlọ, a chụọkwa mama m n’ọgbakọ. Ọ dị m ka à gbahapụla m, ike ụwa agwụkwa m.” Gịnị nyeere Nwanna Bryant aka idi nsogbu a bịaara ya? Ọ sịrị: “Mụ na otu okenye aha ya bụ Tony na-ekwurịta n’ọmụmụ ihe nakwa n’oge ndị ọzọ. Ọ gwara m gbasara ụmụnna ndị nwere ụdị nsogbu a m nwere ma ka na-enwe obi ụtọ. Ọ gụụrụ m Abụ Ọma 27:10, na-agwakwa m mgbe niile gbasara Hezekaya bụ́ onye ji obi ya niile fee Jehova n’agbanyeghị na papa ya abụghị ezigbo mmadụ.” Olee uru aka a e nyeere Bryant baara ya? Ọ sịrị: “Nwanna Tony gbara m ume, mụ emechaa malite ịsụ ụzọ oge niile. Ọ na-emekwa m obi ụtọ.” Ndị okenye, gbalịanụ na-achọpụta ndị e kwesịrị iji “okwu ọma” gbaa ume otú ahụ e meere Bryant.​—Ilu 12:25.

6. Olee otú Pọl si jiri akụkọ gbasara ndị fere Jehova n’oge ochie gbaa ụmụnna ya ume?

6 Pọl chetaara ụmụnna ya na Jehova nyeere “oké ìgwè ndị àmà” ya aka, ha edie nsogbu ndị bịaara ha. (Hib. 12:1) Pọl ma na akụkọ ndị fere Jehova n’oge ochie, bụ́ ndị diri nsogbu niile bịaara ha, nwere ike inyere ụmụnna ya aka ka ha lekwasị anya “n’obodo Chineke dị ndụ.” (Hib. 12:22) Ọ ga-enyekwara anyị aka taa. È nwere onye ga-asị na ịgụ otú Jehova si nyere Gidiọn, Berak, Devid, Samuel, na ọtụtụ ndị ọzọ aka anaghị agba ya ume? (Hib. 11:32-35) Oleekwanụ gbasara ụmụnna ndị nwere okwukwe taa? N’isi ụlọ ọrụ anyị, anyị na-enwetakarị akwụkwọ ozi si n’aka ụmụnna ndị ịgụ akụkọ ndụ ụmụnna anyị n’oge a mere ka okwukwe ha sie ike.

PỌL GOSIRI ỤMỤNNA YA OTÚ HA NA IBE HA GA-ESI NA-ADỊ N’UDO

7. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 14:19-21?

7 Anyị na-eme ka ụmụnna anyị dị ike ma ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ ka udo dịrị n’ọgbakọ. Anyị anaghị ekwe ka obi abụghị otu kewaa anyị. Anyị anaghịkwa esiwe ọnwụ ka e mee ihe anyị chọrọ ma ọ bụrụhaala na ọ gaghị emebi iwu Chineke. Chegodị gbasara ihe atụ a. Ndị nọ n’ọgbakọ dị na Rom bụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu. Mgbe e wepụrụ Iwu Mosis, ndị na-efe Chineke nweziri ike iriwe ihe ndị ahụ a sịbu ha erila. (Mak 7:19) Malite mgbe ahụ, ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu riweziri ụdị nri niile. Ma, e nwekwara ndị nke na-ekweghị eri ihe ndị ahụ. Ihe ahụ mere ka e nwee ndị kwe na ndị ekweghị n’ọgbakọ ahụ. Pọl kwuru ihe gosiri na ọ dị ezigbo mkpa ka udo dịrị n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “Ọ ka mma ka ị ghara ịta anụ ma ọ bụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ime ihe ọ bụla ga-eme ka nwanna gị zọhie ụkwụ.” (Gụọ Ndị Rom 14:19-21.) Pọl ji ihe a o kwuru nyere Ndị Kraịst ibe ya aka ịghọta na ụdị ihe ahụ nwere ike ịkpatara ụfọdụ ndị ma ọ bụ ọgbakọ nsogbu. Ọ gbanwekwara ihe ụfọdụ ná ndụ ya ka ọ ghara ime ka ndị ọzọ zọhie ụkwụ. (1 Kọr. 9:19-22) Dị ka Pọl, anyị ga-eme ka ụmụnna anyị dị ike ma mee ka udo dịrị ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ịrụwa ụka n’ihe mmadụ nwere ike ikpebiri onwe ya.

8. Gịnị ka Pọl mere mgbe e nwere okwu chọrọ ime ka udo ghara ịdị n’ọgbakọ?

8 Anyị ga-amụta ihe n’otú Pọl si mee ka ya na ndị ya na ha na-enweghị otu olu gbasara ihe ndị dị mkpa dịrị n’udo. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ n’oge ndịozi nọ na-esi ọnwụ na e kwesịrị ibi ndị na-abụghị ndị Juu úgwù. O nwere ike ịbụ ka ndị na-anọghị n’ọgbakọ ghara ịna-akatọ ha. (Gal. 6:12) Pọl ekwetaghị ihe ahụ ha kwuru. Ma, kama isiwe ọnwụ ka e mee ya otú ọ chọrọ, o weturu onwe ya ala hazie ka e were okwu ahụ gakwuru ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem. (Ọrụ 15:1, 2) Ihe ahụ o mere mere ka ụmụnna ndị ahụ ka na-enwe obi ụtọ, udo adịrịkwa n’ọgbakọ.​—Ọrụ 15:30, 31.

9. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Pọl?

9 E nwee ezigbo nsogbu, anyị na-eme ka udo dịrị ma ọ bụrụ na anyị ajụọ ndị Jehova họpụtara ka ha na-elekọta ọgbakọ ya ihe a ga-eme. Ọtụtụ mgbe, anyị ga-ahụ ihe Baịbụl chọrọ ka anyị mee n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl ma ọ bụ ná ntụziaka ndị nzukọ Jehova nyere. Ọ bụrụ na ihe ka anyị mkpa abụrụ ime ihe ndị ahụ a gwara anyị mee karịa ime ka ndị ọzọ mewe ihe anyị chere, anyị ga na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ.

10. Olee ihe ọzọ Pọl mere iji mee ka udo dịrị n’ọgbakọ?

10 Otú ọzọ Pọl si mee ka udo dịrị n’ọgbakọ bụ ịna-ekwu gbasara ebe ụmụnna na-emeta, ọ bụghị ebe ndị ha na-anaghị emeta. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-emechi akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, ọ kpọrọ aha ọtụtụ ndị, kwuokwa ihe ọma ụfọdụ n’ime ha mere ma ọ bụ kwuo ihe ụfọdụ gbasara ha. Otú anyị ga-esi na-eme ka Pọl bụ ịna-ekwu gbasara àgwà ọma ụmụnna anyị nwere. Anyị ga-esi otú ahụ mee ka ụmụnna anyị na ibe ha na-adị ná mma, nke ga-eme ka ha na-ahụkwu ibe ha n’anya.

11. Anyị na nwanna nwee nghọtahie, olee otú anyị ga-esi mee ka anyị na ya dịrị n’udo?

11 Mgbe ụfọdụ, ụmụnna ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ nwedịrị ike inwe nghọtahie. Ihe a mere Pọl na ezigbo enyi ya bụ́ Banabas. Ha abụọ nwere ezigbo nghọtahie n’ihe gbasara ịkpọ Mak aga ikwusa ozi ọma n’ebe ọzọ ha chọrọ ịga. Ha abụọ ‘sere ezigbo okwu,’ nke mere ka ha kewaa. (Ọrụ 15:37-39) Ma, Pọl, Banabas, na Mak mechara kpezie. O gosiri na ihe ka ha mkpa bụ ka udo dịrị n’ọgbakọ, ọgbakọ adịrịkwa n’otu. Pọl mechara kwuo okwu ọma gbasara Banabas na Mak. (1 Kọr. 9:6; Kọl. 4:10) Anyị kwesịkwara ịgbalị ka anyị na nwanna ọ bụla anyị na ya nwere nghọtahie kpezie, anyị elekwasịzie anya n’àgwà ọma ndị o nwere. Anyị ga-esi otú ahụ mee ka udo dịrị, anyị ana-adịkwa n’otu.​—Efe. 4:3.

PỌL MERE KA OKWUKWE ỤMỤNNA YA SIE IKE

12. Olee ụfọdụ nsogbu ụmụnna anyị na-enwe?

12 Anyị ga-eme ka ụmụnna anyị dị ike ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ka okwukwe ha nwere na Jehova sikwuo ike. E nwere ụmụnna ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndịàmà Jehova ma ọ bụ ndị ndị ọrụ ibe ha ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha na-akwa emo. E nwere ndị nsogbu nke ha bụ nnukwu ọrịa ha na-arịa ma ọ bụkwanụ ezigbo iwe a kpasuru ha. Ụfọdụ bụ ndị mere baptizim ọtụtụ afọ gara aga, ha ana-eche kemgbe ahụ ka e bibie ụwa ochie a. Ihe ndị a nwere ike ime ka okwukwe Onye Kraịst nyụwa ka ọkụ taa. Ọtụtụ ụmụnna n’oge ndịozi nwere ụdị nsogbu ndị a. Gịnị ka Pọl mere iji mee ka ụmụnna ndị a dị ike?

Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ụmụnna anyị dị ike otú ahụ Pọl mere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) b

13. Olee otú Pọl si nyere ndị a na-akwa emo maka ihe ndị ha kweere aka?

13 Pọl ji Akwụkwọ Nsọ mee ka ụmụnna ya nwekwuo okwukwe. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst amaghị ihe ha ga-aza ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-ekwu na okpukpe ndị Juu ka okpukpe Ndị Kraịst mma. O doro anya na akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru nyeere Ndị Kraịst ndị ahụ ezigbo aka. (Hib. 1:5, 6; 2:2, 3; 9:24, 25) Ihe ndị doro anya o kwuru ebe ahụ nwere ike inyere ha aka ịma ihe ha ga-aza ndị ahụ na-akatọ ha. Taa, anyị nwekwara ike inyere ụmụnna anyị aka ka ha mata otú ha ga-esi jiri akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl kọwaara ndị na-akwa ha emo ihe ha kweere. Ọ bụrụ na a na-achị ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ anyị ọchị n’ihi na ha kweere na e nwere Onye kere ihe niile, anyị nwere ike inyere ha aka ka ha chọta ihe e kwuru na broshọ bụ́ Was Life Created? na The Origin of Life​—Five Questions Worth Asking, nke ha ga-eji kọwaa ihe mere ha ji kweta na e kere ihe ndị dị ndụ eke.

Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ụmụnna anyị dị ike otú ahụ Pọl mere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14) c

14. N’agbanyeghị na Pọl nọ na-ekwusa ozi ọma, na-akụzikwa ihe, gịnị ka o mere?

14 Pọl gbara ụmụnna ya ume ka ha na-arụ “ezigbo ọrụ” ga-egosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya. (Hib. 10:24) O ji ma okwu ọnụ ya ma omume ya nyere ụmụnna ya aka. Dị ka ihe atụ, mgbe ụnwụ dara na Judia, Pọl wetaara ụmụnna nọ n’ebe ahụ ihe ụfọdụ dị ha mkpa. (Ọrụ 11:27-30) N’agbanyeghị na Pọl nọ na-ekwusa ozi ọma, na-akụzikwara ndị mmadụ Baịbụl, ọ chọrọ otú ọ ga-esi nyere ndị ihe na-esiri ike aka mgbe niile. (Gal. 2:10) O si otú ahụ mee ka obi sie ụmụnna ya ike na Jehova ga na-elekọta ha. Taa, ọ bụrụ na anyị ana-ewepụta oge anyị, ike anyị, na nkà ndị anyị nwere na-enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, anyị na-eme ka okwukwe ụmụnna anyị sie ike. Anyị na-emekwa otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na anyị ana-enye onyinye mgbe niile iji kwado ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị a na ihe ndị ọzọ, anyị na-enyere ụmụnna anyị aka ịtụkwasị Jehova obi na ọ gaghị ahapụ ha.

Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ụmụnna anyị dị ike otú ahụ Pọl mere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 16) d

15-16. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ụmụnna ndị okwukwe ha na-esighịzi ike?

15 Pọl akwụsịghị inyere ndị okwukwe ha na-esighịzi ike aka. O meteere ha ebere ma jiri olu ọma gwa ha okwu. (Hib. 6:9; 10:39) Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, o dere okwu bụ́ “anyị” ọtụtụ ugboro. O si otú ahụ gosi na yanwa kwesịkwara ịna-eme ihe ndị ahụ o kwuru. (Hib. 2:1, 3) Dị ka Pọl, anyị ekwesịghị ịkwụsị inyere ndị okwukwe ha na-esighịzi ike aka. Kama ịkwụsị, anyị kwesịrị ịna-egosi ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Anyị ga-esi otú ahụ mee ka ha dị ike, meekwa ka obi sie ha ike na anyị hụrụ ha n’anya. Olu ọma anyị ji na-agwa ha okwu nwekwara ike ime ka ihe anyị na-agwa ha gbakwuo ha ume.

16 Pọl mere ka obi sie ụmụnna ya ike na Jehova na-ahụ ọrụ ọma ndị ha na-arụ. (Hib. 10:32-34) Anyị nwekwara ike ime otú ahụ mgbe anyị na-enyere nwanna okwukwe ya na-esighịzi ike aka. Anyị nwere ike ịgwa ya ka ọ kọọrọ anyị otú o si bata n’ọgbakọ ma ọ bụ gwa ya ka o chee gbasara oge dị iche iche Jehova nyeere ya aka. Anyị nweziri ike ime ka obi sie ya ike na Jehova echefubeghị otú o si gosi na ọ hụrụ ya n’anya, nakwa na Jehova agaghị ahapụ ya n’ọdịnihu. (Hib. 6:10; 13:5, 6) Ikwurịta ụdị ihe ndị a nwere ike ime ka ọ gụwa ụmụnna ndị a agụụ ka ha fewekwa Jehova.

“NA-AGBANỤ IBE UNU UME”

17. Olee ihe anyị ga-agba mbọ ka anyị na-amụtakwu?

17 Ka mmadụ na-arụkwu ọrụ ya, ọ ga na-amụtakwu ya. Ọ bụrụkwa na anyị ana-eme ka ụmụnna anyị dị ike, anyị ga na-emekwu ya nke ọma ka oge na-aga. Otú anyị nwere ike isi mee ka ụmụnna nwee ike idi nsogbu bịaara ha bụ ịkọrọ ha gbasara ndị tachiri obi n’oge gara aga. Otú anyị ga-esi mee ka udo dịrị bụ ịna-ekwu gbasara àgwà ọma ụmụnna anyị nwere, ịgba mbọ ka udo dị ma e nwee ihe chọrọ ise okwu, na ịga ka anyị na onye anyị na ya nwere nghọtahie kpezie. Anyị ga na-emekwa ka okwukwe ụmụnna anyị sikwuo ike ma ọ bụrụ na anyị na-agwa ha eziokwu ndị dị mkpa dị na Baịbụl, na-enyere ha ezigbo aka, na-agbakwa ndị okwukwe ha na-esighịzi ike ume.

18. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

18 Obi na-adị ndị na-eso arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova ezigbo ụtọ. Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị soro na-enyere ụmụnna anyị aka ka okwukwe ha sikwuo ike. Ụlọ nkịtị a rụrụ nwere ike imecha dakasịa. Ma, uru inyere ụmụnna anyị aka na-aba nwere ike ịdịru mgbe ebighị ebi. Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị akwụsị ‘ịna-agba ibe anyị ume na ịna-eme ka ibe anyị dị ike.’​—1 Tesa. 5:11.

ABỤ NKE 100 Na-anabata Ha nke Ọma

a Ihe siri ezigbo ike n’ụwa ochie a. Ọtụtụ nsogbu na-abịara ụmụnna anyị. Anyị nwere ike ịgba ha ezigbo ume ma ọ bụrụ na anyị ana-achọ ụzọ ndị anyị ga-esi na-agba ha ume. Ịmụ gbasara ihe Pọl onyeozi mere ga-enyere anyị aka ime ya.

b NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-egosi nwa ya nwaanyị otú ọ ga-esi jiri aro ndị a tụrụ n’akwụkwọ anyị zaa ndị na-enye ya nsogbu ka ọ gbaa Krismas.

c NKỌWA FOTO: Ebe di na nwunye gara n’obodo ọzọ ka ha nyere ndị ọdachi dakwasịrị aka.

d NKỌWA FOTO: Ebe okenye gara ileta otu nwanna okwukwe ya na-esighịzi ike. O gosiri nwanna ahụ ụfọdụ foto ha sere mgbe ha gakọrọ Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ ọtụtụ afọ gara aga. Foto ndị ahụ mere ka nwanna ahụ cheta otú obi si tọọ ha ụtọ n’oge ahụ, meekwa ka ọ chọwakwa ịna-enwe ụdị obi ụtọ ọ na-enwebu mgbe ọ na-efe Jehova. O mechara lọghachi n’ọgbakọ.