ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 36
Ndị Jehova Ji Ezi Omume Kpọrọ Ihe
“Ndị agụụ ezi omume na-agụ na ndị akpịrị ya na-akpọ nkụ na-enwe obi ụtọ.”—MAT. 5:6.
ABỤ NKE 9 Jehova Bụ Eze Anyị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ọnwụnwa bịaara Josef? Gịnịkwa ka o mere?
ỌNWỤNWA tara akpụ bịaara Josef, bụ́ nwa Jekob. Otu nwaanyị sịrị ya: “Ka mụ na gị dinaa.” Nwaanyị ahụ bụ nwunye nna ya ukwu, bụ́ Pọtịfa. Josef jụwapụrụ isi. Taa, mmadụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Gịnịkwanụ mere Josef ji jụ?’ Pọtịfa anọghị n’ụlọ. Ihe ọzọ bụ na Josef bụ ohu n’ụlọ ahụ. O doro anya na nwaanyị ahụ ga-emesi ya ike ma ọ jụ ime ihe ahụ ọ gwara ya. Ma, Josef gbadosiri ụkwụ n’ala ike jụ n’agbanyeghị na nwaanyị ahụ rịọrọ ya ugboro ugboro ka ha kwaa iko. N’ihi gịnị? Josef sịrị ya: “Gịnịzi mere m ga-eji eme ihe a jọgburu onwe ya ma mehie Chineke?”—Jen. 39:7-12.
2. Olee otú Josef si mara na ịkwa iko bụ imehie Chineke?
2 Olee otú Josef si mara na Chineke ya weere ịkwa iko ka ‘ihe jọgburu onwe ya’? N’oge ahụ, e debeghị Iwu Mosis, nke otu n’ime iwu dị na ya sịrị: “Akwala iko.” E dere ya mgbe narị afọ abụọ (200) gachara. (Ọpụ. 20:14) Ma, otú Josef maruru Jehova mere ka ọ mata na ịkwa iko agaghị adị ya mma n’obi. Dị ka ihe atụ, Josef ma na Jehova haziri ka otu nwoke lụọ otu nwaanyị. Ọ ga-abụrịrị na ọ nụrụ otú Jehova si chebe nne ya ochie bụ́ Sera ugboro abụọ ka a ghara imerụ ya. Otú ahụkwa ka Jehova si chebe Ribeka nwunye Aịzik. (Jen. 2:24; 12:14-20; 20:2-7; 26:6-11) Ka Josef na-echebara ihe ndị a echiche, ọ ghọtara ihe dị mma na ihe dị njọ n’anya Chineke. Ebe ọ bụ na Josef hụrụ Jehova n’anya, o kpebisiri ike na ọ ga-eme ihe Jehova chọrọ ka o mee.
3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
3 Ì ji ezi omume kpọrọ ihe? O doro anya na i ji ya kpọrọ ihe. Ma, anyị niile ezughị okè. Ọ bụrụkwa na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịmụtawa otú ụwa si ele ezi omume anya. (Aịza. 5:20; Rom 12:2) Ọ bụ ya mere anyị ga-eji mụọ ihe ezi omume bụ, na uru iji ya kpọrọ ihe na-abara anyị. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe atọ anyị ga-eme ka anyị nwee ike iji iwu Jehova kpọrọkwuo ihe.
GỊNỊ BỤ EZI OMUME?
4. Olee ihe na-adịghị mma ọtụtụ ndị na-eche banyere ezi omume?
4 Ọtụtụ ndị nwere ike iche na onye ezi omume bụ onye dị mpako, onye na-ama ndị ọzọ ikpe, ma ọ bụ onye chere na ya ka ndị ọzọ mma. Ma, àgwà ndị a anatụdịghị amasị Chineke. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ katọrọ ndị isi okpukpe n’oge ya n’ihi na ha ji aka ha mee iwu ndị ha weere ka ime ezi omume. (Ekli. 7:16; Luk 16:15) Onye na-eme ihe Jehova kwuru na ọ dị mma anaghị eche na ya ka ndị ọzọ mma.
5. Gịnị ka Baịbụl kwuru ezi omume pụtara? Nye ihe atụ.
5 Ezi omume bụ àgwà magburu onwe ya. E kwuo ya ná nkenke, ọ pụtara ime ihe Jehova Chineke kwuru na ọ dị mma. Na Baịbụl, okwu ndị e ji kọwaa “ezi omume” pụtara ịna-erubere iwu kacha iwu niile isi, ya bụ, iwu Jehova. Dị ka ihe atụ, Jehova kwuru na ihe ndị ahịa ji atụ̀ ihe kwesịrị ịbụ “nke zuru ezu.” (Diut. 25:15) Okwu Hibru a sụgharịrị “nke zuru ezu” pụtakwara “nke ziri ezi.” N’ihi ya, Onye Kraịst nke chọrọ ịbụ onye ezi omume n’anya Chineke kwesịrị ịna-ekwu eziokwu n’ihe niile ọ na-eme n’azụmahịa ya ma ọ bụ n’ọrụ ya. Ihe ọzọ bụ na onye ezi omume anaghị achọ iji anya ahụ ka a na-emegbu mmadụ. Onye bụ́ onye ezi omume n’eziokwu chọọ ikpebi ihe ọ ga-eme, ọ na-ebu ụzọ chee otú Jehova ga-esi ele ihe o kpebiri anya ka o nwee ike ‘ime Jehova obi ụtọ.’—Kọl. 1:10.
6. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike n’ihe Jehova kwuru gbasara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ? (Aịzaya 55:8, 9)
6 Baịbụl kwuru na ọ bụ Jehova bidoro ezi omume. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ya “onye ezi omume si n’aka ya.” (Jere. 50:7) Ebe ọ bụ Jehova kere anyị, ọ bụ naanị ya ga-agwali anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ebe anyị bụ ndị mmehie na ndị na-ezughị okè, anyị agaghị ejili aka anyị kpebie ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, ebe ọ bụ na Jehova zuru okè, ọ ma ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. (Ilu 14:12; gụọ Aịzaya 55:8, 9.) Ma, ebe ọ bụ na Chineke kere anyị n’oyiyi ya, anyị ga-emeli ihe o kwuru na ọ dị mma. (Jen. 1:27) Ime otú ahụ na-atọgbu anyị atọgbu. Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị na-agbalịsi ike ịna-eme ka ya.—Efe. 5:1.
7. Gịnị mere e ji kwesị inwe iwu a tụkwasịrị obi? Nye ihe atụ.
7 Irube isi n’iwu Jehova nyere anyị gbasara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ na-abara anyị uru. Ị̀ ghọtara ihe kpatara ya? Chegodị ihe ga-eme ma a sị na ụlọ akụ̀ niile dị n’otu mba na-eji aka ha emepụta ego nke ha, nke ga-adị iche n’ego mba ahụ. Ọ ga-akpata ọgba aghara. Ọ bụrụkwa na ndị dọkịta na ndị nọọsụ anaghị eme ihe iwu obodo kwuru gbasara otú e kwesịrị isi na-agwọ ndị ọrịa, ụfọdụ ndị ọrịa nwere ike ịnwụ. N’eziokwu, inwe iwu a tụkwasịrị obi na-echebe ndị mmadụ. Otú ahụkwa ka iwu ndị Chineke nyere anyị gbasara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ si echebe anyị.
8. Olee ngọzi ndị ji ezi omume kpọrọ ihe ga-enweta?
8 Jehova na-agọzi ndị niile na-agbalị na-erubere ya isi. O kwere nkwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 37:29) Cheedị otú ndị mmadụ ga-esi dị n’otu, dịrị n’udo, obi ana-adịkwa ha ụtọ mgbe mmadụ niile ga na-erubere iwu Jehova isi. Ọ bụ ụdị ndụ ahụ ka Jehova chọrọ ka i nweta. N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere onye ọ bụla n’ime anyị ji kwesị iji ezi omume kpọrọ ihe. Olee otú anyị ga-esi eme ka anyị jiri ezi omume kpọrọkwuo ihe? Ka anyị lee ihe atọ anyị nwere ike ime.
JIRI IWU JEHOVA KPỌRỌKWUO IHE
9. Gịnị ga-enyere anyị aka iji ezi omume kpọrọ ihe?
9 Nke mbụ: Hụ Onye nyere iwu ndị ahụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iji ezi omume kpọrọ ihe, anyị kwesịrị ịhụkwu Jehova n’anya maka na ọ bụ ya nyere iwu gbasara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị ana-ahụkwu Jehova n’anya, anyị ga na-achọkwu ịna-erubere iwu ya isi. Dị ka ihe atụ, a sị na Adam na Iv hụrụ Jehova n’anya, ha agaraghị enupụrụ iwu ya ziri ezi isi.—Jen. 3:1-6, 16-19.
10. Olee otú Ebreham si matakwuo otú Jehova si eche echiche?
10 O doro anya na anyị achọghị ime ka Adam na Iv. Ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ime ka ha bụ ịna-amụtakwu gbasara Jehova, jiri àgwà ya kpọrọ ihe, ma na-agbalị ịghọta otú o si eche echiche. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị ga na-ahụkwu Jehova n’anya. Chegodị banyere Ebreham. Ọ hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu. Mgbe o siiri ya ike ịghọta ihe mere Chineke ji nye ya iwu, o nupụghị isi. Kama, ọ gbalịrị ịmatakwu Jehova nke ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe Ebreham matara na Jehova ekpebiela ibibi Sọdọm na Gọmọra, ọ tụrụ ụjọ ná mmalite na “Onye na-ekpe ụwa niile ikpe” ga-ebibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume. Ihe a adịghị Ebreham mma. N’ihi ya, o weturu obi jụọ Jehova ọtụtụ ajụjụ. Jehova nweere ya ndidi ma zaa ya ajụjụ ndị ahụ. Ebreham mechara ghọta na Jehova na-enyocha obi mmadụ niile nakwa na o nweghị ihe ga-eme ka o gbukọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume.—Jen. 18:20-32.
11. Olee otú Ebreham si gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya ma tụkwasị ya obi?
11 Ihe ahụ Ebreham na Jehova kparịtara banyere Sọdọm na Gọmọra mere ka ọ mụta ezigbo ihe. O doro anya na o mere ka ọ hụkwuo Jehova n’anya ma na-asọpụrụ ya karịa otú ọ na-emebu. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, e nwere otu ihe mere ka a mata otú Ebreham tụkwasịruru Jehova obi. Jehova gwara ya ka o were nwa ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Aịzik chụọrọ ya àjà. Ma, n’oge ahụ, Ebreham amatakwuola Chineke. N’ihi ya, ọ jụghị Chineke ajụjụ ọ bụla. Naanị ihe Ebreham mere bụ ịga mee ihe Jehova gwara ya. Ma, chegodị otú obi si gbawaa ya mgbe ọ na-ejikere maka ije ahụ. Ọ ga-abụrịrị na Ebreham ebula ụzọ chebara ihe ndị ọ mụtara gbasara Jehova echiche. Ọ ma na Jehova emekataghị mee ihe ọ bụla na-adịghị mma. Pọl onyeozi kwuru na Ebreham kwetara na Chineke ga-akpọliteli nwa ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Aịzik n’ọnwụ. (Hib. 11:17-19) A sịdị ka e kwuwe, Jehova ekwela ya nkwa na Aịzik ga-amụta otu mba. Ma, Aịzik amụtabeghị nwa n’oge ahụ. Ebreham hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụ ya mere obi ji sie ya ike na Jehova ga-eme ihe ziri ezi mgbe niile. Okwukwe ya mere ka o rube isi n’agbanyeghị na ọ dịghịrị ya mfe.—Jen. 22:1-12.
12. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Ebreham? (Abụ Ọma 73:28)
12 Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Ebreham? Anyị kwesịrị ịna-amụ gbasara Jehova otú ahụ Ebreham mere. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị ga-abịarukwu Jehova nso ma na-ahụkwu ya n’anya. (Gụọ Abụ Ọma 73:28.) Anyị ga-azụ akọnuche anyị ka anyị nwee ike ịna-eche echiche ka Jehova. (Hib. 5:14) Mmadụ chọọ ka anyị mee ihe ọjọọ, akọnuche anyị ga-enyere anyị aka ịjụwapụ isi. Anyị agaghị echetụdị n’echiche ime ihe ọ bụla ga-akpasu Nna anyị nke eluigwe iwe ma ọ bụ mee ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. Ma, olee otú ọzọ anyị ga-esi gosi na anyị ji ezi omume kpọrọ ihe?
13. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ezi omume? (Ilu 15:9)
13 Nke abụọ: Gbaa mbọ ka i jiri ezi omume na-akpọrọkwu ihe n’ụbọchị ọ bụla. Onye chọrọ ka ahụ́ gbasie ya ike ga-agba mbọ na-emega ahụ́ mgbe niile. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ịna-agbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji ihe Jehova kwuru na ọ bụ ihe ziri ezi kpọrọ ihe. Anyị ga-emeli ya n’ụbọchị ọ bụla. Jehova anaghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. (Ọma 103:14) O mere ka obi sie anyị ike na “ọ hụrụ onye na-agba mbọ na-eme ezi omume n’anya.” (Gụọ Ilu 15:9.) E nwee ihe anyị chọrọ ime n’ozi Jehova, anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị mee ya. Otú ahụ ka ime ezi omume dị. Jehova ga-enwere anyị ndidi, na-enyekwara anyị aka ịna-emekwu nke ọma ka oge na-aga.—Ọma 84:5, 7.
14. Gịnị bụ ezi omume anyị ga-eyiri ka “ihe e ji echebe obi”? Gịnịkwa mere anyị ji kwesị iyiri ya?
14 Jehova chetaara anyị na ime ezi omume esighị oké ike. (1 Jọn 5:3) Kama nke ahụ, ọ na-echebe anyị, nchebe ya dịkwa anyị mkpa kwa ụbọchị. Cheta ekike agha ahụ Pọl onyeozi kwuru gbasara ya. (Efe. 6:14-18) Olee nke na-echebe obi onye agha Kraịst? Ọ bụ “ihe e ji echebe obi,” ya bụ, ezi omume. Ọ nọchiri anya ihe Jehova kwuru na o ziri ezi. Otú ahụ ihe e ji echebe obi na-echebe obi onye agha, ka ihe ndị Jehova kwuru ga-echebeli obi anyị, ya bụ, ihe ndị na-agụ anyị agụụ, otú obi dị anyị, na ihe ndị anyị na-eche. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka ihe e ji echebe obi, ya bụ, ezi omume, soro n’ekike agha gị.—Ilu 4:23.
15. Olee otú ị ga-esi yiri ezi omume ka ihe e ji echebe obi?
15 Olee otú ị ga-esi yiri ezi omume ka ihe e ji echebe obi? Ọ bụ ịna-echebara iwu Chineke echiche ma i kpebiwe ihe ị ga-eme n’ụbọchị ọ bụla. I kpebiwe ihe gị na mmadụ ga-ekwurịta, egwú ị ga-egere, vidio ị ga-ele, ma ọ bụ akwụkwọ ị ga-agụ, buru ụzọ jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ọ ga-etinye m n’obi? Ihe a ọ̀ ga-adị Jehova mma? Ọ̀ na-akwado omume rụrụ arụ, tigbuo zọgbuo, anyaukwu, na mmadụ ịchọ naanị ọdịmma nke ya, nke bụ́ ihe ụfọdụ Jehova sịrị na ha adịghị mma?’ (Fil. 4:8) Ọ bụrụ na ihe ị na-ekpebi bụ ihe dị Jehova mma, ọ pụtara na ị na-ekwe ka iwu ya na-echebe obi gị.
16-17. Olee otú Aịzaya 48:18 si mesie anyị obi ike na anyị ga-emeli ihe Jehova kwuru bụ́ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi?
16 Ò nwere mgbe ị na-echegbu onwe gị ma ị̀ ga-enwe ike ịna-erubere iwu Jehova isi kwa ụbọchị nakwa kwa afọ? Chegodị ihe atụ Jehova ji kọwaa ezi omume n’Aịzaya 48:18. (Gụọ ya.) Jehova kwere anyị nkwa na ezi omume anyị ga-adịli ka “ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị.” Were ya na ị nọ n’akụkụ oké osimiri, na-ele ka ebili mmiri na-enugharị n’akwụsịghị akwụsị. N’ebe ahụ dị jụụ, ị̀ ga-echewe na ebili mmiri ahụ nwere ike ịkwụsị otu ụbọchị? Mbanụ. Ị ma na kemgbe ọtụtụ puku afọ, ebili mmiri ahụ na-enugharị n’akwụsịghị akwụsị. Otú ahụkwa ka ọ ga na-eme mgbe niile.
17 Ị ga-emeli ka ezi omume gị dịrị ka ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị. Olee otú ị ga-esi eme ya? E nwee ihe ị chọrọ ikpebi, buru ụzọ chee ihe Jehova ga-achọ ka i mee. Meekwa ya. N’agbanyeghị otú ihe ahụ ị chọrọ ikpebi siruru ike, Jehova, bụ́ Nna gị hụrụ gị n’anya, dị njikere mgbe niile ime ka ị dị ike, nyekwara gị aka ka ị ghara ịkwụsị ime ezi omume kwa ụbọchị.—Aịza. 40:29-31.
18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji ihe anyị chere na-ekpe ndị ọzọ ikpe?
18 Nke atọ: Hapụrụ Jehova ikpe. Anyị na-agba mbọ na-eme ihe Jehova chọrọ ka anyị mee. Ma, anyị ekwesịghị ịna-ekpe ndị ọzọ ikpe ma chee na anyị ka ha mma. Kama ịna-eleda ndị ọzọ anya ka à ga-asị na ọ bụ anyị na-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova bụ “Onye na-ekpe ụwa niile ikpe.” (Jen. 18:25.) Ọ bụghị anyị ka Jehova nyere ikike ikpe ikpe ahụ. Jizọs nyedịrị anyị iwu, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe.”—Mat. 7:1. b
19. Olee otú Josef si gosi na ọ tụkwasịrị ikpe Jehova obi?
19 Ka anyị kwuo ọzọ gbasara Josef, bụ́ onye ezi omume. O kpeghị ndị ọzọ ikpe, ma ndị mere ya ihe ọjọọ. Ụmụnne ya mesiri ya ike, reekwa ya ka ọ gbawa ohu. Ha mekwara ka nna ha kweta na Josef anwụọla. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ndị ezinụlọ Josef kwakwutere ya n’Ijipt. N’oge ahụ Josef bụzi onyeisi ala, ọ gaara eji ikike o nwere maa ụmụnne ya ikpe ma megwara ha ihe ha mere ya. Ụjọ tụrụ ha na Josef ga-emegwara n’agbanyeghị na ha ji obi ha niile chegharịa. Ma, Josef mesiri ha obi ike, sị: “Unu atụla egwu. Ọ̀ bụ m bụ Chineke?” (Jen. 37:18-20, 27, 28, 31-35; 50:15-21) Josef dị umeala n’obi ma hapụrụ Jehova ikpe.
20-21. Olee otú anyị nwere ike isi ghara ịna-eche na anyị ka ndị ọzọ mma?
20 Dị ka Josef, anyị na-ahapụrụ Jehova ikpe. Dị ka ihe atụ, nwanna mee ihe, anyị anaghị eche ozugbo na anyị ma ihe mere o ji mee ihe o mere. Anyị anaghị enyocha obi. Ọ bụ naanị “Jehova na-enyocha ihe mmadụ bu n’obi.” (Ilu 16:2) Ọ hụrụ ụdị mmadụ niile n’anya n’agbanyeghị ezinụlọ ha si nakwa omenala ha. Jehova gbakwara anyị ume ka anyị ‘jiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya.’ (2 Kọr. 6:13) Anyị na-agba mbọ ịna-ahụ ụmụnna anyị niile n’anya, ọ bụghị ịna-ekpe ha ikpe.
21 Ọ pụtakwara na anyị ekwesịghị ịna-ekpe ndị na-anọghị n’ọgbakọ ikpe. (1 Tim. 2:3, 4) Ị̀ ga-amali onye ikwu gị na-anaghị efe Jehova ikpe, sị, “Nwoke ahụ enweghị ike ịbata n’ọgbakọ?” Mbanụ. Ikwu otú ahụ ga-abụ mmadụ ime ihe a na-enyeghị ya ikike ime nakwa ịbụ onye oké ezi omume. Jehova ka na-enye “mmadụ niile n’ebe niile” ohere ka ha chegharịa. (Ọrụ 17:30) Na-echeta mgbe niile na Jehova na-ewere onye na-eche na ya ka ndị ọzọ mma ka onye ajọ omume.
22. Gịnị mere i ji kpebisie ike iji ezi omume kpọrọ ihe?
22 Anyị jiri ezi omume Jehova kpọrọ ihe, anyị ga na-enwe obi ụtọ. Ọ ga-eme ka ndị ọzọ chọọ ịna-eme otú ahụ, meekwa ka ha hụkwuo anyị na Jehova n’anya. Ka anyị ghara ịkwụsị ịbụ “ndị agụụ ezi omume na-agụ na ndị akpịrị ya na-akpọ nkụ.” (Mat. 5:6) Ka obi sie gị ike na Jehova na-ahụ mbọ niile ị na-agba nakwa na obi dị ya ụtọ na ị na-emekwu nke ọma. Ka ndị mmadụ na-aṅụ ajọ omume ka mmiri n’ụwa a, adala mbà. Na-echeta mgbe niile na “Jehova hụrụ ndị ezi omume n’anya.”—Ọma 146:8.
ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ
a N’ụwa ọjọọ a, o siri ike ịhụ ndị na-agbalị na-eme ezi omume. Ma, e nwere ọtụtụ nde mmadụ taa na-eme ezi omume. O doro anya na i so na ha. Ihe mere i ji na-eme ya bụ maka na ị hụrụ Jehova n’anya. Jehova jikwa ezi omume kpọrọ ihe. Olee otú anyị nwere ike isi jiri ezi omume kpọrọkwuo ihe? N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe ezi omume bụ, na uru iji ya kpọrọ ihe na-abara anyị. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike iji ezi omume kpọrọkwuo ihe.
b Mgbe ụfọdụ, ndị okenye na-ekpe ikpe gbasara mmehie dị oké njọ nakwa nchegharị. (1 Kọr. 5:11; 6:5; Jems 5:14, 15) Ma, ha dị umeala n’obi. Ha na-aghọta na ha agaghị enyochali obi, nakwa na ọ bụ Jehova ka ha na-ekpere ikpe ahụ. (I nwere ike ịtụle 2 Ihe E Mere 19:6.) Ha na-akpachara anya ka ihe ha ga-ekpebi bụrụ ihe dabara n’otú Jehova si eme ebere, na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, na-ekpekwa ikpe ziri ezi.