ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 36
Buru Ihe Ndị I Kwesịrị Iburu, Tụfuo Ndị nke Ọzọ
“Ka anyị tụfuo ibu arọ ọ bụla . . . Ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ anyị na-agba.”—HIB. 12:1.
ABỤ NKE 33 Tụkwasị Jehova Ibu Gị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 12:1, olee ihe anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike ịgbaru ọsọ ndụ ahụ n’isi?
BAỊBỤL ji ndụ Ndị Kraịst tụnyere ịgba ọsọ. A ga-eji ndụ ebighị ebi kwụọ ndị gbaruru ọsọ ahụ n’isi ụgwọ ọrụ. (2 Tim. 4:7, 8) Anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka anyị ghara ịkwụsị ịgba ọsọ ahụ, karịchaa, n’ihi na ọsọ ahụ agwụwala agwụ. Pọl onyeozi gbaruru ọsọ nke ya n’isi. O kwuru ihe ndị ga-enyere anyị aka imeri n’ọsọ ahụ. Ọ gwara anyị ka anyị “tụfuo ibu arọ ọ bụla . . . Ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ anyị na-agba.”—Gụọ Ndị Hibru 12:1.
2. Gịnị ka ‘ịtụfu ibu arọ ọ bụla’ pụtara?
2 Mgbe Pọl kwuru na anyị kwesịrị ‘ịtụfu ibu arọ ọ bụla,’ ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ na e nweghị ibu Onye Kraịst kwesịrị iburu? Ọ bụghị ihe ọ na-ekwu. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na anyị kwesịrị ịtụfu ibu ọ bụla na-adịghị mkpa. Ụdị ibu ndị a nwere ike ịdọla anyị azụ, mee ka ike gwụ anyị. Anyị chọọ ịna-atachi obi, anyị kwesịrị ịchọpụta ozugbo ibu ọ bụla nwere ike ịdọla anyị azụ ma tụfuo ya n’egbughị oge. Ma, anyị ekwesịghịkwanụ ịtụfu ibu ndị anyị kwesịrị iburu. Ma ọ́ bụghị ya, anyị agaghịzi eru eru ịgba ọsọ ahụ. (2 Tim. 2:5) Olee ibu ndị anyị kwesịrị iburu?
3. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:5, gịnị ka anyị kwesịrị iburu? (b) Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a? Maka gịnị?
3 Gụọ Ndị Galeshia 6:5. Pọl kwuru ibu anyị kwesịrị iburu. O dere na “onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” N’ebe a, Pọl na-ekwu gbasara ibu anyị ga-ebu, ya bụ, ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme ebe anyị bụ ndị na-efe ya, nke bụ́kwanụ ihe onye ọzọ na-agaghị emere anyị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe bụ́ ‘ibu nke anyị,’ nakwa otú anyị ga-esi buru ya. Anyị ga-achọpụtakwa ibu ndị na-adịghị mkpa ọ ga-abụ na anyị bu, mụtakwa otú anyị ga-esi atụfu ha. Ibu ibu nke anyị nakwa ịtụfu ibu na-adịghị mkpa ga-enyere anyị aka ịgbaru ọsọ nke ndụ n’isi.
IBU NDỊ ANYỊ KWESỊRỊ IBURU
4. Gịnị mere na nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị nyefere ya onwe anyị abụghị ibu arọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
4 Nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, anyị kwere ya nkwa na anyị ga na-efe ya ma na-eme uche ya. Anyị kwesịrị ịna-emezu nkwa ahụ. Imezu nkwa anyị kwere Jehova abụghị obere ihe. Mana, ọ bụghị ibu arọ. A sị ka e kwuwe, Jehova kere anyị ka anyị na-eme uche ya. (Mkpu. 4:11) O kere anyị otú ọ ga na-agụ anyị agụụ ịna-efe ya. O kekwara anyị ka anyị yie ya. N’ihi ya, anyị nwere ike ịbịaru ya nso, ime uche ya ana-atọkwa anyị ụtọ. (Ọma 40:8) Ọ bụrụkwa na anyị ana-eme uche Chineke ma na-eso Ọkpara ya, anyị ‘ga-enweta ume.’—Mat. 11:28-30.
5. Olee ihe ga-enyere gị aka imezu nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị? (1 Jọn 5:3)
5 Olee otú ị ga-esi ebu ibu ahụ? E nwere ihe abụọ ga-enyere gị aka. Nke mbụ, i kwesịrị ịna-agba mbọ na-ahụkwu Jehova n’anya. Ihe ga-enyere gị aka ime ya bụ ịna-atụgharị uche n’ihe ọma ndị Chineke meere anyị nakwa ndị nke ọ ka ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na ị na-ahụkwu Jehova n’anya, ọ ga-adịkwuru gị mfe ịna-erubere ya isi. (Gụọ 1 Jọn 5:3.) Nke abụọ, na-eme ka Jizọs. Jizọs mere uche Chineke n’ihi na o kpere ekpere, rịọ Jehova ka o nyere ya aka, lekwasịkwa anya n’ụgwọ a ga-akwụ ya. (Hib. 5:7; 12:2) Dị ka Jizọs, na-ekpe ekpere ka Jehova nye gị ike, na-echetakwa ndụ ebighị ebi o kwere ná nkwa mgbe niile. Ọ bụrụ na ị na-ahụkwu Jehova n’anya ma na-eme ka Ọkpara ya, ị ga-emezuli nkwa i kwere ya mgbe i nyefere ya onwe gị.
6. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-arụ ọrụ ndị anyị kwesịrị ịrụ n’ezinụlọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
6 Ọrụ ndị anyị nwere n’ezinụlọ. Ka anyị na-agba ọsọ ndụ, anyị kwesịrị ịhụ Jehova na Jizọs n’anya karịa otú anyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị. (Mat. 10:37) Mana, ihe a ọ̀ pụtara na anyị ga-ahapụ ọrụ dịịrị anyị n’ezinụlọ dị ka à ga-asị na ha na-egbochi anyị ime uche Chineke na nke Kraịst? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova na Jizọs nabata anyị, anyị ekwesịghị ịgbara ọrụ dịịrị anyị n’ezinụlọ ọsọ. (1 Tim. 5:4, 8) Ọ bụrụ na anyị ana-arụ ya, obi ga na-atọkwu anyị ụtọ. A sị ka e kwuwe, Jehova ma na ezinụlọ ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na di na nwunye ana-ahụ ibe ha n’anya ma na-asọpụrụ ibe ha, ndị nne na nna ahụ ụmụ ha n’anya ma na-azụ ha nke ọma, ụmụaka ana-erubekwara nne na nna ha isi.—Efe. 5:33; 6:1, 4.
7. Olee otú ị ga-esi na-arụ ọrụ ndị dịịrị gị n’ezinụlọ?
7 Olee otú ị ga-esi ebu ibu ahụ? N’agbanyeghị ihe bụ́ ọrụ gị n’ezinụlọ, tụkwasị amamihe dị na Baịbụl obi, kama ịtụkwasị ihe i chere, omenala unu, ma ọ bụ ihe ndị a na-akpọ ndị ọkachamara kwuru obi. (Ilu 24:3, 4) Na-agụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ha ga-enyere gị aka ịhụ otú ị ga-esi eme ihe Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka” kwuru ihe ndị ga-abara ndị di na nwunye, ndị nne na nna, nakwa ndị na-eto eto uru ná nsogbu ndị ha na-enwe taa. b Kpebisie ike na ị ga-eme ihe Baịbụl kwuru, ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ gị ndị ọzọ anaghị eme ya. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-abara ndị ezinụlọ gị uru, Jehova ga-agọzikwa gị.—1 Pita 3:1, 2.
8. Olee ihe nwere ike isi n’ihe anyị kpebiri pụta?
8 Ihe si n’ihe anyị kpebiri pụta. Jehova hapụrụ anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ọ chọkwara ka obi na-adị anyị ụtọ maka na anyị ekpebiela ime ihe dị mma. Ma, ọ naghị echebe anyị ka anyị ghara iji isi anyị buru ihe anyị kpebitara. (Gal. 6:7, 8) N’ihi ya, anyị na-eji isi anyị eburu ihe na-adịghị mma anyị kpebitara, ma ọ bụ okwu na-adịghị mma anyị kwuru, ma ọ bụkwanụ omume anyị mere n’echeghị echiche. Ihe anyị mere nwere ike ime ka akọnuche anyị mawa anyị ikpe. Ma, anyị cheta na anyị ga-eji isi anyị buru ihe anyị kpebitara, o nwere ike ime ka anyị kwupụta mmehie anyị, mezie ihe anyị mejọrọ, ma ghara imeghachi ihe ahụ ọzọ. Ime otú ahụ nwere ike inyere anyị aka ịnọsi ike n’ọsọ ndụ a.
9. Olee ihe nwere ike inyere gị aka ma ọ bụrụ na ihe i kpebiri adịghị mma? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
9 Olee otú ị ga-esi ebu ibu ahụ? Ọ bụrụ na ị gaghị emezili ihe si n’ihe i kpebiri pụta, were ihe otú i si hụ ya. Mata na ị gaghị agbanweli ihe gara aga. Ejila oge gị na ike gị na-agbalị igosi na ihe i mere dị mma ma ọ bụ tawa ndị ọzọ ụta maka ihe i mejọrọ. Kama ime otú ahụ, kweta ebe i mejọrọ ma gbalịsie ike ime ihe ga-akacha baara gị uru ugbu a. Ọ bụrụ na ihe i mejọrọ mere ka obi na-ama gị ikpe, wetuo obi kpee ekpere ka Jehova nyere gị aka. Kweta ihe i mejọrọ ma rịọ ya ka ọ gbaghara gị. (Ọma 25:11; 51:3, 4) Rịọ ndị i mejọrọ ka ha gbaghara gị. Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa, gakwuru ndị okenye ka ha nyere gị aka. (Jems 5:14, 15) Si n’ihe ndị i mejọrọ mụta ihe, gbalịakwa ka ị ghara ime ha ọzọ. I mee otú ahụ, ka obi sie gị ike na Jehova ga-emere gị ebere ma na-akwado gị.—Ọma 103:8-13.
IBU NDỊ ANYỊ KWESỊRỊ ‘ỊTỤFU’
10. Gịnị mere ịtụ anya ihe anyị na-agaghị emeli ji bụrụ ibu arọ? (Ndị Galeshia 6:4)
10 Ịtụ anya ihe anyị na-agaghị emeli. Ọ bụrụ na anyị ejiri onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ, ihe ndị anyị tụrụ anya ime anyị na-emelighị nwere ike ịghọrọ anyị ibu. (Gụọ Ndị Galeshia 6:4.) Ọ bụrụ na anyị ejiri onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ mgbe niile, o nwere ike ime ka anyị nwewe anyaụfụ ma ọ bụ mawa ndị ọzọ aka. (Gal. 5:26) Anyị gbalịwa ime ihe ndị ọzọ mere n’agbanyeghị na anyị agaghị emeli ya, anyị nwere ike ịkpatara onwe anyị nsogbu. Ebe ọ bụ na “ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na ihe ọ na-atụ anya ya emezughị mgbe ọ tụrụ anya ya,” ọ ga-aka agbawa anyị obi ma ọ bụrụ na anyị agbalịwa ime ihe ndị anyị na-agaghị emeli. (Ilu 13:12) Ime otú ahụ nwere ike ime ka ike na-agwụ anyị, anyị adawa mbà n’ọsọ ndụ anyị na-agba.—Ilu 24:10.
11. Olee ihe ga-enyere gị aka ka ị ghara ịtụ anya ime ihe ndị ị na-agaghị emeli?
11 Olee otú ị ga-esi tụfuo ibu ahụ? Atụla anya ka i mee ihe karịrị ihe Jehova chọrọ ka i mee. Jehova anaghị atụ anya ka i nye ihe ị na-enweghị. (2 Kọr. 8:12) Obi sie gị ike na Jehova anaghị eji ihe anyị na-eme atụnyere ihe ndị ọzọ na-eme. (Mat. 25:20-23) O ji ozi i ji obi gị niile na-ejere ya kpọrọ ihe, ma otú i si erubere ya isi, ma otú i si atachi obi. Dịrị obi umeala ma mata na e nwere ihe ndị ị ga-achọ ime ị na-agaghị emeli ugbu a n’ihi ọrịa, afọ ole ị dị, na otú ihe si dịrị gị. Dị ka Bazilaị, jụ ọrụ ụfọdụ ma ọ bụrụ na otú ihe si dịrị gị ga-eme ka ọ ghọọrọ gị nsogbu. (2 Sam. 19:35, 36) Dị ka Mosis, kwe ka e nyere gị aka. Nyefeekwa ndị ọzọ ọrụ i kwesịrị ịrụ mgbe ọ bụla ọ dabara adaba. (Ọpụ. 18:21, 22) Ọ bụrụ na i si otú ahụ gosi na ị ma ebe ike gị ruru, ọ ga-eme ka ị ghara ịtụwa anya ime ihe ndị ị na-agaghị emeli, nke nwere ike ime ka ike gwụwa gị n’ọsọ ndụ ị na-agba.
12. Ọ̀ bụ anyị ka a ga-ata ụta maka ihe na-adịghị mma ndị ọzọ kpebiri? Kọwaa.
12 Ichewe na ọ bụ gị kpatara mkpebi na-adịghị mma ndị ọzọ mere. Ọ bụghị anyị ga-ekpebiri ndị ọzọ ihe ha ga-eme. Anyị agaghịkwanụ echebe ha ka ha ghara iji isi ha buru ihe ha kpebitara. Dị ka ihe atụ, nwatakịrị nwere ike imecha kpebie ịkwụsị ife Jehova. Ihe ahụ o kpebiri nwere ike ịgbawa ndị mụrụ ya obi. Ma, ọ bụrụ na ndị mụrụ ya ana-ata onwe ha ụta maka ihe na-adịghị mma nwa ha kpebiri ime, ọ pụtara na ha na-ebo onwe ha ibu arọ. Ọ bụghị ụdị ibu Jehova chọrọ ka ha buru.—Rom 14:12.
13. Gịnị ka nne ma ọ bụ nna nwere ike ime ma ọ bụrụ na nwa ya ekpebie ihe na-adịghị mma?
13 Olee otú ị ga-esi tụfuo ibu ahụ? Ghọta na Jehova hapụrụ anyị niile ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ọ hapụrụ onye nke ọ bụla ka o jiri aka ya họrọ ihe ọ ga-eme. Ihe ndị so n’ihe anyị ga-ekpebi bụ ma ànyị ga-efe ya. Jehova ma na ndị nne na nna ezughị okè. Naanị ihe ọ chọrọ ka i mee bụ ihe niile i nwere ike ime. Ihe nwa gị kpebiri ime ga-adị ya n’isi, ọ bụghị gịnwa. (Ilu 20:11) Ma, ọ ka nwere ike ịna-ewute gị maka ihe ndị gịnwa bụ́ nne ma ọ bụ nna na-emetaghị. Ọ bụrụ otú ahụ, mee ka Jehova mara otú ọ dị gị, rịọkwa ya ka ọ gbaghara gị. Ọ ma na ị gaghị agbanweli ihe ndị mere n’oge gara aga. Ọ naghịkwa atụ anya ka i gbochie nwa gị ịghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ. Buru n’obi na ọ bụrụ na nwa gị agbalịa ịlọghachikwute Jehova, Jehova ga-eji obi ya niile nabata ya.—Luk 15:18-20.
14. Gịnị mere obi ịma anyị ikpe gafee ókè ji bụrụ ibu anyị kwesịrị ịtụfu?
14 Inwe obi amamikpe mgbe niile. Ọ bụrụ na anyị emehie, ọ dịghị njọ ma ọ bụrụ na obi na-ama anyị ikpe. Ma, obi ịma anyị ikpe mgbe niile bụ ibu Chineke na-achọghị ka anyị buru. Ọ bụ ibu anyị kwesịrị ịtụfu. Olee otú anyị ga-esi ama ma ọ bụrụ na obi amamikpe anyị agafeela ókè? Ọ bụrụ na anyị ekwupụtala mmehie anyị, chegharịa, na-emekwa ihe anyị kwesịrị ime ka anyị ghara ime ya ọzọ, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agbagharala anyị. (Ọrụ 3:19) Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a anyị kwesịrị ime, Jehova achọghị ka obi na-ama anyị ikpe mgbe niile. Ọ ma na ọ bụrụ na obi na-ama anyị ikpe mgbe niile, ọ ga-akpatara anyị nsogbu. (Ọma 31:10) Anyị nwee mwute gafee ókè, o nwere ike ime ka anyị daa mbà n’ọsọ ndụ anyị na-agba.—2 Kọr. 2:7.
15. Olee ihe nwere ike inyere gị aka ma ọ bụrụ na obi na-ama gị ikpe mgbe niile? (1 Jọn 3:19, 20) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
15 Olee otú ị ga-esi tụfuo ibu ahụ? Ọ bụrụ na obi na-ama gị ikpe mgbe niile, na-echeta na Chineke ‘na-agbaghara anyị mmehie anyị n’eziokwu.’ (Ọma 130:4) Ọ bụrụ na ọ gbaghara ndị ji obi ha niile chegharịa, o kwere nkwa, sị: “Agaghịzi m echeta mmehie ha.” (Jere. 31:34) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova agaghị emecha tawa gị ahụhụ maka mmehie i mere n’oge gara aga. N’ihi ya, ewerela ahụhụ ọ bụla ị na-ata maka mmehie i mere n’oge gara aga ka ihe na-egosi na Chineke agbagharabeghị gị. Ewesakwala onwe gị iwe n’ihi na ị naghịzi arụ ọrụ ụfọdụ ị na-arụbu n’ọgbakọ. Jehova anaghị eche banyere mmehie gị mgbe niile, gịnwa ekwesịghịkwa ime otú ahụ.—Gụọ 1 Jọn 3:19, 20.
NA-AGBA ỌSỌ KA I MERIE
16. Ebe anyị na-agba ọsọ ndụ, gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta?
16 Ka anyị na-agba ọsọ ndụ, anyị kwesịrị ịna-agba ya ‘otú ga-eme ka anyị merie.’ (1 Kọr. 9:24) Anyị ga-emeli ya ma ọ bụrụ na anyị aghọta ihe dị iche n’ibu ndị anyị kwesịrị iburu na ibu ndị anyị kwesịrị ịtụfu. N’isiokwu a, anyị ekwuola ibu ụfọdụ ndị anyị kwesịrị iburu na ndị nke anyị kwesịrị ịtụfu. Mana, e nwere ike ikwu banyere ibu ndị ọzọ. Jizọs kwuru na “iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ” nwere ike ‘ịnyịgbu obi anyị.’ (Luk 21:34) Amaokwu ndị e dere na paragraf a na amaokwu ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ịmata ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe ka i nwee ike ịgbara ọsọ ndụ a na-aga.
17. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị ga-emeri n’ọsọ ndụ anyị na-agba?
17 Ka obi sie anyị ike na anyị ga-emeri n’ọsọ ndụ anyị na-agba n’ihi na Jehova ga-enye anyị ike anyị kwesịrị inwe. (Aịza. 40:29-31) N’ihi ya, adala mbà. Na-eme ka Pọl onyeozi. O ji ike ya niile gbaa ọsọ ya iji nweta ụgwọ ọrụ a ga-enye ya. (Fil. 3:13, 14) O nweghị onye ga-agbara gị ọsọ ndụ a. Ma, ọ bụrụ na Jehova enyere gị aka, ị ga-emerili na ya. Jehova ga-enyere gị aka ibu ibu ndị i kwesịrị ibu ma tụfuo ibu ndị na-adịghị mkpa. (Ọma 68:19) Ebe ọ bụ na ọ na-akwado gị, ị ga-enwe ike ịtachi obi, gbara ọsọ a ruo n’isi ma merie.
ABỤ NKE 65 Gaa n’Ihu
a Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịgba ọsọ ndụ. Ebe anyị bụ ndị na-agba ọsọ, e nwere ibu ndị anyị kwesịrị iburu. Ihe ndị ahụ bụ nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị nyefere ya onwe anyị, ọrụ anyị nwere n’ezinụlọ anyị, nakwa ihe ọ bụla si n’ihe anyị kpebiri ime pụta. Ma, anyị kwesịrị ịtụfu ibu ọ bụla nwere ike ịdọla anyị azụ. Olee ihe ndị ọ bụ? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu a.
b Ị ga-ahụ isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka” na jw.org. Ụfọdụ n’ime isiokwu ndị gbara ebe ahụ maka ndị di na nwunye bụ: “Otú Ị Ga-esi Na-akwanyere Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù” na “Otú Di na Nwunye Ga-esi Na-ekele Ibe Ha Maka Ihe Ọma Ha Mere”; maka ndị nne na nna, “Ịkụziri Ụmụ Gị Otú Ha Ga-esi Jiri Ekwentị Bụ́ Ọkpọka Na-eme Ihe Bara Uru” na “Otú Gị na Nwa Gị Ga-esi Na-ekwurịta Okwu”; nakwa maka ndị na-eto eto, “Otú Ị Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ Gị Na-enye Gị” na “Ihe Ị Ga-eme ma I Chee na Ndị Enyi Gị Na-agbara Gị Ọsọ.”