Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 33

Mụta Ihe n’Aka Daniel

Mụta Ihe n’Aka Daniel

“Ị bụ onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.”​—DAN. 9:23.

ABỤ NKE 73 Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị mere ihe Daniel onye amụma ji masị ndị Babịlọn?

 DANIEL onye amụma bụ nwa okorobịa mgbe ndị Babịlọn dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn bụ́ obodo dị ezigbo anya na Jeruselem. Ma, ihe Daniel na-eme masịrị ndị ahụ dọọrọ ya n’agha. Ha hụrụ ‘ihe anya mmadụ na-ahụ,’ ya bụ, na Daniel ‘enweghị nkwarụ ọ bụla, maakwa mma’ nakwa na o si n’ezinụlọ ndị a ma ama. (1 Sam. 16:7) Ọ bụ ihe ndị a mere ndị Babịlọn ji zụọ ya, ya ana-eje ozi n’obí eze.—Dan. 1:3, 4, 6.

2. Olee otú Jehova si were Daniel? (Ezikiel 14:14)

2 Jehova hụrụ Daniel n’anya. Ihe mere o ji hụ ya n’anya abụghị n’ihi na ọ mara mma ma ọ bụ n’ihi ọkwá ya n’obí eze. Kama ọ bụ n’ihi ụdị onye nwa okorobịa ahụ bụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe Jehova kwuru na Daniel dị ka Noa na Job, ọ ga-abụ na Daniel dị naanị ihe dị ka afọ iri abụọ. N’ihi ya, Jehova weere ya na n’agbanyeghị na Daniel bụ nwa okorobịa, na ọ na-erubere ya isi ka Noa na Job, bụ́ ndị ji obi ha niile fee ya ruo ọtụtụ afọ. (Jen. 5:32; 6:9, 10; Job 42:16, 17; gụọ Ezikiel 14:14.) Jehova akwụsịghịkwa ịhụ Daniel n’anya n’oge niile ọ dịrị ndụ.—Dan. 10:11, 19.

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’àgwà abụọ Daniel nwere mere Jehova ji hụ ya n’anya nke ukwuu. Anyị ga-ebu ụzọ kọwaa nke ọ bụla n’ime àgwà ndị ahụ, kwuokwa oge ndị o gosiri na o nwere àgwà ndị ahụ. Anyị ga-ahụkwa ihe nyeere Daniel aka ịmụta àgwà ndị ahụ. N’ikpeazụ, anyị ga-ekwu otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị na-eto eto ka e bu n’obi dee isiokwu a, anyị niile nwere ike ịmụta ihe n’aka Daniel.

NA-ENWE OBI IKE KA DANIEL

4. Olee otú Daniel si gosi na o nwere obi ike? Mee ihe atụ.

4 Ụjọ nwere ike ịtụ ndị nwere obi ike. Ma, ha anaghị ekwe ka ụjọ ahụ mee ka ha ghara ime ihe dị mma. Daniel bụ nwa okorobịa nwere ezigbo obi ike. Legodị oge abụọ o mere ihe gosiri na o nwere obi ike. O nwere ike ịbụ na nke mbụ mere n’ihe dị ka afọ abụọ mgbe ndị Babịlọn bibichara Jeruselem. Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn rọrọ nrọ tụrụ ya ụjọ gbasara otu nnukwu ihe a kpụrụ akpụ. O kwuru na ọ ga-egbu ndị niile ma ihe, ma Daniel, ma ọ bụrụ na ha enweghị ike ịgwa ya ihe ọ rọrọ ná nrọ, kọwaakwara ya nrọ ahụ. (Dan. 2:3-5) Daniel kwesịrị ime ihe ngwa ngwa, ma ọ́ bụghị ya, a ga-egbu ọtụtụ ndị. Ọ “gakwuuru eze rịọ ya ka o nyetụ ya oge ka o wee kọọrọ ya ihe nrọ ya pụtara.” (Dan. 2:16) Ihe a o mere gosiri na o nwere ezigbo obi ike na okwukwe. Olee otú anyị si mara? O nweghị ebe Baịbụl kwuru na Daniel akọwatụla nrọ tupu mgbe ahụ. Ọ gwara ndị enyi ya ndị Babịlọn gụrụ Shedrak, Mishak, na Abednego ka ha “rịọ Chineke nke eluigwe ka o meere ha ebere ma mee ka ha mata ihe nzuzo a.” (Dan. 2:18) Jehova zara ekpere ahụ. O nyeere Daniel aka ya akọwaa nrọ Nebukadneza ahụ. Ihe a zọrọ Daniel na ndị enyi ya ndụ.

5. Olee oge ọzọ Daniel kwesịrị igosi na o nwere obi ike?

5 Mgbe Daniel kọwachara nrọ Nebukadneza ahụ, afọ ụfọdụ agachaa, ihe ọzọ mere nke ga-egosi na o nwere obi ike. Nebukadneza rọkwara nrọ ọzọ tụrụ ya ụjọ. Nrọ ahụ gbasara otu nnukwu osisi. Daniel ji obi ike kọwaara eze ihe nrọ ahụ pụtara. Ọ gwadịrị eze na ọ ga-agba ara, nakwa na ọ ga-akwụsị ịbụ eze ruo afọ ụfọdụ. (Dan. 4:25) Eze nwere ike iche na Daniel na-agba ya mgba okpuru. O nwedịrị ike iji maka ya gbuo Daniel. Ma, Daniel gosiri na o nwere obi ike, kọwaara eze nrọ ahụ n’agbanyeghị ihe o nwere ike ịkpatara ya.

6. Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya nyeere Daniel aka inwe obi ike?

6 Olee ihe o nwere ike ịbụ ya nyeere Daniel aka inwe obi ike n’oge niile ọ dị ndụ? Mgbe Daniel bụ nwata, ọ ga-abụrịrị na ọ mụtara ihe n’aka mama ya na papa ya. O doro anya na ha mere ihe Jehova gwara ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel ka ha na-eme. Ha kụziiri nwa ha Iwu Chineke. (Diut. 6:6-9) Ọ bụghị naanị na Daniel ma ihe ndị bụ́ isi dị n’Iwu e nyere ndị Izrel, dị ka Iwu Iri ahụ, ọ makwa ihe onye Izrel kwesịrị iri na ihe ọ na-ekwesịghị iri. b (Lev. 11:4-8; Dan. 1:8, 11-13) Daniel mụkwara akụkọ gbasara ndị Chineke, matakwa ihe mere ha mgbe ha kwụsịrị irubere Jehova isi. (Dan. 9:10, 11) Ihe niile mere ná ndụ Daniel mere ka obi sie ya ike na Jehova na ndị mmụọ ozi ya dị ike na-akwado ya.—Dan. 2:19-24; 10:12, 18, 19.

Ihe nyeere Daniel aka ịmụta inwe obi ike bụ ịmụ Okwu Chineke, ikpe ekpere, na ịtụkwasị Jehova obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Olee ihe ọzọ nyeere Daniel aka inwe obi ike? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Daniel mụrụ akwụkwọ ndị amụma nke ọma, ma amụma ndị Jeremaya buru. Daniel si n’ihe ndị ahụ ọ mụrụ mata na ndọrọ ndị Babịlọn dọọrọ ndị Juu n’agha laa n’obodo ha kemgbe ọtụtụ afọ ga-ebi n’oge na-adịghị anya. (Dan. 9:2) Daniel hụrụ otú okwu Jehova si mezuo. Ihe a mekwara ka okwukwe ya n’ebe Jehova nọ sie ezigbo ike. Ndị okwukwe ha siri ike na-enwekwa ezigbo obi ike. (I nwere ike ịtụle Ndị Rom 8:31, 32, 37-39.) Ihe kacha mkpa bụ na Daniel kpere ekpere ọtụtụ mgbe ka Nna ya nke eluigwe nyere ya aka. (Dan. 6:10) O kwupụtaara Jehova mmehie ya, gwa ya otú obi dị ya, rịọkwa ya ka o nyere ya aka. (Dan. 9:4, 5, 19) Ebe ọ bụ na Daniel bụ mmadụ dị ka anyị, a mụghị ya, ya enwee obi ike. Kama, ọ mụtara àgwà ahụ amụta. Otú o si mụta ya bụ ịna-amụ Baịbụl, ịna-ekpe ekpere, na ịtụkwasị Jehova obi.

8. Olee otú anyị nwere ike isi mụta inwe obi ike?

8 Iji nwee obi ike, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Nne na nna anyị nwere ike ịna-agwa anyị ka anyị nwee obi ike. Mana, ha agaghị ekenyeli anyị obi ike ha nwere otú ahụ nna si ekenye ụmụ ya akụ̀ ya. Ịmụta inwe obi ike dị ka ịmụta aka ọrụ. Otu ụzọ i nwere ike isi mụta aka ọrụ bụ ile onye na-akụziri gị ya anya nke ọma, na-emekwa ihe o mere. Otú ahụ ka inwe obi ike dị. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ndị ọzọ nwere obi ike anya nke ọma, na-emekwa ka ha, anyị ga-amụta inwe obi ike. N’ihi ya, gịnị ka anyị mụtarala n’aka Daniel? Dị ka Daniel, anyị kwesịrị ịma Okwu Chineke nke ọma. Anyị ga-agba mbọ ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agwa ya okwu mgbe niile, na-agwakwa ya otú obi dị anyị. Anyị kwesịkwara ịtụkwasị Jehova obi, obi esie anyị ezigbo ike na ọ ga-akwado anyị mgbe niile. Ọ bụrụzie na ọnwụnwa abịara anyị, anyị ga-enwe obi ike.

9. Olee uru inwe obi ike na-abara anyị?

9 E nwere ọtụtụ uru inwe obi ike ga-abara anyị. Ka anyị kwuo gbasara otu nwanna aha ya bụ Ben. Ọ gara otu ụlọ akwụkwọ na Jamanị. N’ụlọ akwụkwọ ahụ, onye ọ bụla kwetara na ihe niile nọkatara pụta, na-ekwukwa na ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ Chineke kere ihe niile bụ akụkọ ifo. Otu ụbọchị, e nyere Ben ohere ka ọ pụta n’ihu klas kwuo ihe mere o ji kweta na e kere ihe ndị dị ndụ eke. O ji obi ike gwa onye ọ bụla ihe o kwetara. Olee uru ọ bara? Ben sịrị: “Onye nkụzi anyị gere ntị nke ọma. O bipụtara akwụkwọ m ji kwuo ihe mere m ji kweta na e nwere onye kere ihe niile, nye onye ọ bụla nọ na klas anyị otu.” Gịnị ka ụmụ klas Nwanna Ben mere? Ọ sịrị: “Ọtụtụ n’ime ha gere m ntị. Ha kwukwara na ihe m masịrị ha.” Ihe a Nwanna Ben mere gosiri na ndị mmadụ na-akwanyekarịrị ndị nwere obi ike ùgwù. O nwekwara ike ime ka ndị nwere ezi obi bịa mata gbasara Jehova. O doro anya na e nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị inwe obi ike.

MỤTA IJISI JEHOVA AKA IKE KA DANIEL

10. Gịnị bụ ijisi onye ọzọ aka ike ma ọ bụ ịhụnanya pụrụ iche?

10 Na Baịbụl, okwu Hibru a sụgharịrị “ịhụnanya,” “ịhụnanya pụrụ iche” ma ọ bụ ‘ijisi onye ọzọ ike’ na-apụtakarị otú Chineke si jiri obiọma ya hụ ndị na-efe ya n’anya. A na-ejikwa okwu ahụ akọwa otú ndị na-efe Jehova si hụ ibe ha n’anya. (2 Sam. 9:6, 7) Anyị nwere ike ịmụta ịna-ejidesikwu Jehova aka ike ka oge na-aga. Legodị otú Daniel si mee ya.

Jehova kwụrụ Daniel ụgwọ n’ihi na o jidesiri ya aka ike. Otú o si mee ya bụ izitere ya otu mmụọ ozi nakwa imechi ọnụ ọdụm (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Olee ọnwụnwa bịaara Daniel mgbe o mere agadi? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

11 E nwere ọnwụnwa ndị bịaara Daniel ná ndụ ya ga-eme ka o gosi ma ò jidesiri Jehova aka ike ma ọ bụ na o jidesighị ya. Ma, otu n’ime ndị kacha sie ike bịaara ya mgbe ọ gaferela afọ iri itoolu. N’oge ahụ, ndị Midia na ndị Peshia emeriela Babịlọn. Onye na-achị Babịlọn mgbe ahụ bụ Eze Darayọs. Ụfọdụ ndị isi n’obí eze kpọrọ Daniel asị, ha anaghịkwa akwanyere Chineke ọ na-efe ùgwù. N’ihi ya, ha kpara nkata otú ha ga-esi egbu Daniel. Ha mere ka eze bịanye aka n’iwu ga-egosi ma Daniel ọ̀ ga-ejidesi Chineke ya aka ike ka ọ̀ ga-ahapụ ya rubere eze isi. Naanị ihe a chọrọ ka Daniel mee iji gosi na ọ na-erubere eze isi ma mewe ihe ndị ọzọ niile na-eme bụ ịkwụsị ikpe ekpere ruo ụbọchị iri atọ. Daniel ekweghị ahapụ Jehova. N’ihi ya, a tụbara ya n’olulu ọdụm. Ma, Jehova napụtara ya n’aka ọdụm, si otú ahụ gọzie ya maka ijidesi ya aka ike. (Dan. 6:12-15, 20-22) Olee otú anyị nwere ike isi jidesie Jehova aka ike ka Daniel?

12. Olee otú Daniel si mụta ijidesi Jehova aka ike?

12 Dị ka anyị kwuburu, ihe ga-eme ka anyị jidesie Jehova aka ike bụ iji obi anyị niile hụ ya n’anya. Ihe mere Daniel ji jidesie Jehova aka ike bụ na ọ hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya nke ukwuu. O doro anya na ihe mere Daniel ji hụ Jehova n’anya otú a bụ iche gbasara àgwà ndị Jehova nwere nakwa otú Jehova si egosi àgwà ndị ahụ. (Dan. 9:4) Daniel chebakwaara ihe ọma niile Jehova meere ya na ụmụ Izrel echiche nke ọma, obi dịkwa ya ezigbo ụtọ maka ha.—Dan. 2:20-23; 9:15, 16.

I nwere ike ịmụta ijidesi Jehova aka ike otú ahụ Daniel mere ma ọ bụrụ na i jiri obi gị niile hụ ya n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. (a) Olee ọnwụnwa na-abịara ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst? Mee ihe atụ. (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.) (b) Dị ka e gosiri na vidio, gịnị ka i nwere ike ikwu ma ndị ọzọ jụọ gị ma Ndịàmà Jehova hà na-akwado ndị ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-edina?

13 Dị ka Daniel, ndị gbara ndị na-eto eto gburugburu bụ ndị na-anaghị akwanyere Jehova na iwu ya ùgwù. Ụdị ndị ahụ nwere ike ịkpọ onye ọ bụla hụrụ Jehova n’anya asị. Ụfọdụ n’ime ha na-agbalịdị imesi ndị a na-eto eto ike ka ha kwụsị ijidesi Jehova aka ike. Dị ka ihe atụ, legodị ihe mere otu nwa okorobịa aha ya bụ Graeme. O bi n’Ọstrelia. E nwere ọnwụnwa bịaara ya mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị. Onye nkụzi ha jụrụ ndị klas ha ihe ha ga-eme ma ọ bụrụ na enyi ha agwa ha na ya na nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-edina. Onye nkụzi ahụ gwara ha niile ka onye ọ bụla kwetara na ihe ahụ enyi ya na-eme abụghị ihe ọjọọ guzoro n’otu akụkụ, ndị nke na-ekwetaghị eguzoro n’akụkụ nke ọzọ. Nwanna Graeme sịrị: “E wepụ mụ na nwanna ọzọ nọ na klas anyị, ndị klas anyị niile gara guzoro n’ebe ahụ ndị kwetara na ọ bụghị ihe ọjọọ guzo.” Ihe mezirinụ bụ ezigbo ọnwụnwa ga-egosi ma Nwanna Graeme ọ̀ ga-ejidesi Jehova aka ike. Ọ sịrị: “N’oge fọrọ afọ n’ime otu awa ahụ onye nkụzi anyị ji akụzi ihe, ya na ụmụ klas anyị nọ na-akparị anyị. M gbalịrị ike m, wetuo obi ka m kọwaara ha ihe mere m ji kwere ihe m kweere. Ma, ha ekweghị ege ntị n’ihe ọ bụla m kwuru.” Olee otú obi dị Nwanna Graeme maka ihe ahụ? Ọ sịrị: “Obi adịghị m ụtọ na e si otú a kparịa m. Ma, obi dị m ezigbo ụtọ na m jidesiri Jehova aka ike, kọwaakwara ha ihe m kweere.” c

14. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi mụta ijidesi Jehova aka ike?

14 Anyị ga-ejidesili Jehova aka ike ma ọ bụrụ na anyị amụta ịhụ ya n’anya ka Daniel. Anyị ga-ahụkwu Jehova n’anya ma ọ bụrụ na anyị amụọ gbasara àgwà ndị o nwere. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịmụ gbasara ihe ndị o kere. (Rom 1:20) Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịhụkwu Jehova n’anya na ịna-akwanyekwuru ya ùgwù, i nwere ike ịgụ isiokwu ndị gbara n’isiokwu bụ́ “È Kere Ya Eke?” ma ọ bụkwanụ lee vidio ndị dị na ya. I nwekwara ike ịgụ broshọ bụ́ Was Life Created? na The Origin of Life​—Five Questions Worth Asking. Legodị ihe otu nwanna nwaanyị na-eto eto aha ya bụ Esther, bụ́ onye Denmak, kwuru gbasara akwụkwọ ndị ahụ. Ọ sịrị: “Otú e si kọwaa ihe dị na ha magburu onwe ya. Ihe broshọ ndị ahụ na-eme abụghị ịgwa gị ihe ị ga-ekwere. Kama, ọ ga-agwa gị nke bụ́ eziokwu, hapụzie gị ka i kpebie ihe ị ga-ekwere.” Ben anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ihe ndị e dere n’akwụkwọ ndị a na-eme ka okwukwe mmadụ sie ezigbo ike. O mere ka o doo m anya na ọ bụ Chineke kere ihe niile.” Ị mụchaa ihe ndị a, i nwere ike ikweta ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́, “Jehova Chineke anyị, onye dị ike, i ruru eru ka ndị niile too gị ma sọpụrụ gị, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụ n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere i ji kee ha.”—Mkpu. 4:11. d

15. Olee otú ọzọ anyị nwere ike isi mee ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma?

15 Otú ọzọ i nwere ike isi mụta ịna-ahụkwu Jehova n’anya bụ ịmụ gbasara Ọkpara ya, bụ́ Jizọs. Ọ bụ ihe otu nwa agbọghọ aha ya bụ Samira mere. O bi na Jamani. Ọ sịrị: “Ịmụ gbasara Jizọs mere ka m matakwuo onye Jehova bụ.” Mgbe nwanna nwaanyị a dị obere, o siiri ya ike ịghọta na Jehova hụrụ ya n’anya. Ma, ọ ghọtara na Jizọs hụrụ ya n’anya. Ọ sịrị: “Ihe Jizọs masịrị m n’ihi na ya na ndị mmadụ na-adị ná mma, ọ hụkwara ụmụaka n’anya.” Ka ọ na-amụkwu gbasara Jizọs, ọ bịara na-amatakwu Jehova, na-ahụkwukwa ya n’anya. N’ihi gịnị? Ọ sịrị: “M ji nwayọọ nwayọọ mata na Jizọs na-eme ka Nna ya. Ha abụọ yiri nnọọ. M ghọtara na ihe a so n’ihe mere Jehova ji zite Jizọs n’ụwa, ka o kwe ụmụ mmadụ omume ịmatakwu Jehova.” (Jọn 14:9) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na Jehova dịrịkwuo ná mma, i kwesịrị iwepụta oge mụta ihe niile i nwere ike ịmụta gbasara Jizọs. I mee otú ahụ, ị ga-ahụkwu Jehova n’anya, gị ejidesikwuo ya aka ike.

16. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ejisie Jehova aka ike? (Abụ Ọma 18:25; Maịka 6:8)

16 Anyị jiri obi anyị niile hụ ndị ọzọ n’anya, anyị ga-enwe ezigbo ndị enyi ga-ejikwa obi ha niile hụ anyị n’anya. (Rut 1:14-17) Ọ bụrụkwa na anyị jidesiri Jehova aka ike, obi ga-eru anyị ala, ihe anyị nwere ejukwa anyị afọ. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova kwere nkwa na ọ gaghị ahapụ ndị jisiri ya aka ike. (Gụọ Abụ Ọma 18:25; Maịka 6:8.) Chegodị ihe a. N’agbanyeghị na anyị dị ezigbo ntakịrị ma e jiri anyị tụnyere Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, o kwere nkwa na ọ gaghị akwụsị ịhụ anyị n’anya. Ọ bụrụkwa na anyị na ya adị n’ezigbo mma, ọnwụnwa, mkpagbu, ma ọ bụdị ọnwụ agaghị eme ka ọ kwụsị ịhụ anyị n’anya. (Dan. 12:13; Luk 20:37, 38; Rom 8:38, 39) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme ka Daniel, jidesiekwa Jehova aka ike.

AKWỤSỊLA ỊMỤTA IHE N’AKA DANIEL

17-18. Gịnị ọzọ ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Daniel?

17 N’isiokwu a, anyị elebala anya naanị n’àgwà abụọ Daniel nwere. Ma, e nwere ọtụtụ ihe anyị ka nwere ike ịmụta n’aka ya. Dị ka ihe atụ, Jehova mere ka Daniel hụ ọtụtụ ọhụụ, rọọkwa ọtụtụ nrọ. O nyekwara ya ikike ịkọwa amụma. Ọtụtụ n’ime amụma ndị ọ kọwara emezuola. Ụfọdụ n’ime ha kwukwara ihe ga-eme n’ọdịnihu nke ga-agbasa onye ọ bụla nọ n’ụwa a.

18 N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’amụma abụọ Daniel dere. Ịghọta ha ga-enyere anyị niile aka, ma nwata ma okenye, ikpebi ihe ndị dị mma ugbu a. Amụma ndị ahụ nwekwara ike ime ka anyị nwekwuo obi ike, jidesiekwuo Jehova aka ike ka anyị nwee ike ịkwadebe maka ọnwụnwa ndị ga-abịara anyị n’oge na-adịghị anya.

ABỤ NKE 119 Ka Anyị Nwee Okwukwe

a E nwere ọtụtụ nsogbu na-abịara ndị na-eto eto na-efe Jehova taa na-eme ka o siere ha ike inwe obi ike nakwa irubere Jehova isi. Ụmụ klas ha nwere ike ịna-achị ha ọchị n’ihi na ha kwetara na e nwere onye kere ihe niile. Ndị ọgbọ ha nwere ike ịna-eme ka ha chee na ha dị iberiibe n’ihi na ha na-efe Chineke, na-erubekwara ya isi. Ma, n’isiokwu a, anyị ga-ahụ na ndị na-eme ka Daniel onye amụma, jiri obi ike na-efe Jehova, na-erubekwara ya isi, ma ihe n’eziokwu.

b E nwere ihe atọ o nwere ike ịbụ ya mere Daniel ji were nri ndị Babịlọn ka ihe na-adịghị ọcha: (1) O nwere ike ịbụ na anụ ndị Babịlọn na-eri so n’anụ Iwu Mosis sịrị ndị Izrel erila. (Diut. 14:7, 8) (2) O nwere ike ịbụ na e gbupụghị anụ ndị ahụ ọbara. (Lev. 17:10-12) (3) Iri nri ahụ nwere ike ịpụta na onye ahụ efeela arụsị.—I nwere ike ịtụle Levitikọs 7:15 na 1 Ndị Kọrịnt 10:18, 21, 22.

c Gaa na jw.org lee vidio bụ́ Ezi Omume A Ga Na-eme Ga-eme Ka Udo Dị.”

d I nwekwara ike ịmụ akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso ka o nyere gị aka ịhụkwu Jehova n’anya. Ọ ga-enyere gị aka ịmatakwu gbasara àgwà ndị Jehova nwere nakwa ụdị onye ọ bụ.