Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1924—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

1924—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

BULLETIN a nke Jenụwarị 1924 sịrị: “Oge a afọ na-amalite amalite bụ oge dị mma Onye Kraịst ọ bụla mere baptizim . . . kwesịrị iji chọta ohere ọ ga-eji jekwuoro Jehova ozi.” Ka afọ ahụ na-aga, Ndị Mmụta Baịbụl si ụzọ abụọ mee ihe a a gwara ha. Nke mbụ, ha katara obi. Nke abụọ, ha si ụzọ ndị ọzọ kwusaa ozi ọma.

HA JI REDIO KWUSAA OZI ỌMA

Ụmụnna nọ na Betel rụsiri ọrụ ike ihe karịrị otu afọ iji rụọ ụlọ ọrụ redio aha ya bụ WBBR na Staten Aịland nke dị na Niu Yọk Siti. Mgbe ha sụchara ala ebe ahụ, ha rụrụ ebe buru ibu ndị ọrụ ga-ebi, rụọkwa ụlọ dị iche maka ngwá ọrụ. Mgbe ha rụchara ọrụ a, ha malitere iwekọta ngwá ọrụ dị mkpa ha ga-eji na-agbasa ozi na redio. Ma, e nwere ihe ụfọdụ ga-esiri ha ike.

Itinye antena a ga-eji na-agbasa ozi siiri ụmụnna ezigbo ike. Ọ hà ka poolu eletrik itoolu n’ogologo. E kwesịrị inwe poolu osisi abụọ ga-aha ka ihe dị ka poolu eletrik isii n’ogologo a ga-atụkwasị ya na ha. Mgbalị mbụ ha kụrụ afọ n’ala. Ma ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enyere ha aka. Ha mechara tinye ya. Nwanna Calvin Prosser onye so rụọ ọrụ ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na anyị rụtara ya na nke mbụ ahụ, anyị gaara etowe onwe anyị maka ya.” Ha nyere Jehova otuto maka ihe ha rụpụtara. Mana, nke a abụghị naanị nsogbu ha nwere.

Mgbe a nọ na-egwunye otu n’ime poolu ndị ahụ a ga-atụkwasị antena ụlọ ọrụ redio WBBR na ha

N’oge ahụ, a ka na-amalite iji redio agbasa ozi amalite, e nweghịkwa ebe a na-ere ọtụtụ ngwá ọrụ a na-eji eme ya. N’ihi ya, ụmụnna zụtara ígwè mgbasa ozi mmadụ ji aka ya rụọ e jiburula gbasaa ozi. Kama ịzụ maịkrofon nke ọhụrụ, ha weere maịkrofon dị na telefon. N’otu abalị n’ọnwa Febụwarị, ụmụnna kpebiri ka ha lee otú ihe ndị a ha wekọtara si arụ ọrụ. Ha chọwara ozi ha ga-agbasa na redio. N’ihi ya, ụmụnna ndị ahụ bụrụ abụ Alaeze. Nwanna Ernest Lowe chetara ihe na-atọ ọchị merenụ mgbe ha nọ na-abụ abụ. Ọ sịrị na Nwanna Judge Rutherford b nọ na Bruklin nụ abụ ahụ ha nọ na-abụ na redio, ebe dị ihe dị ka kilomita iri abụọ na ise, ma kpọọ ha na telefon.

Ọ sịrị ha: “Kwụsịnụ mkpọtụ ahụ unu na-eme. Olu unu na-adacha ka ụmụ nwamba.” Ihe a menyere ụmụnna ndị ahụ ihere, ha emee ngwa ngwa gbanyụsịa ihe ndị ha ji na-agbasa ozi. Ma obi siri ha ike na ha ejikerela ibido iji redio agbasa ozi.

N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Febụwarị afọ 1924, n’ozi mbụ ha gbasara na redio, Nwanna Rutherford kwuru na ihe ha ga-eji ụlọ ọrụ redio ahụ na-eme bụ “ịrụ ọrụ Jizọs Kraịst bụ́ Eze nyere ha ka ha na-arụ.” O kwuru na ihe mere ha ji rụọ ụlọ ọrụ redio ahụ bụ ka “o nyere mmadụ niile aka ịmụta eziokwu Baịbụl nakwa ịghọta na oge a anyị bi n’ime ya bụ oge dị ezigbo mkpa.”

N’aka ekpe: Ebe Nwanna Rutherford nọ n’ebe mbụ a nọ gbasaa ozi na redio

N’aka nri: Ígwè mgbasa ozi

Ozi mbụ ahụ ha gbasara gara nnọọ nke ọma. Ndị Mmụta Baịbụl jikwa ụlọ ọrụ redio ahụ gbasaa ozi ruo afọ iri atọ na atọ sochiri ya.

HA KATARA OBI KWUO NA IHE NDỊ ISI OKPUKPE NA-EME ADỊGHỊ MMA

N’ọnwa Julaị afọ 1924, Ndị Mmụta Baịbụl gbakọtara na Kolọmbọs dị n’Ohayo maka mgbakọ a ga-enwe. Ha si n’ebe niile dị n’ụwa bịa ya. Ha nụkwara okwu ndị e kwuru n’asụsụ Arabik, Bekee, French, Grik, Họngerian, Ịtalian, Jaman, Lituenian, Polish, Rọshịan, Yukrenian, nakwa n’asụsụ ndị a na-asụ na Denmak, Nọọwee, na Swidin. A gbasara ụfọdụ n’ime ihe ndị e mere ná mgbakọ ahụ na redio. Ụmụnna gwara ndị na-ebipụta otu akwụkwọ akụkọ n’obodo ahụ ka ha na-ede gbasara mgbakọ ahụ kwa ụbọchị.

Mgbakọ e nwere na Kolọmbọs dị n’Ohayo n’afọ 1924

Na Tọzdee, abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Julaị, ihe karịrị puku mmadụ ise (5,000) ndị bịara mgbakọ ahụ gara ozi ọma n’obodo e nwere mgbakọ ahụ. Ha nyere akwụkwọ fọrọ obere ka o ruo puku iri atọ (30,000), malitekwara ọtụtụ puku mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ụlọ Nche kpọrọ ụbọchị ahụ “oge kacha tọọ ụtọ ná mgbakọ ahụ.”

Ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ ná mgbakọ ahụ mere na Fraịdee abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Julaị mgbe Nwanna Rutherford ji obi ike gụpụta akwụkwọ e ji gbaa ndị isi okpukpe n’anwụ. O kwuru na ndị ọchịchị, ndị okpukpe, na ndị azụmahịa “na-egbochi ndị mmadụ ịmụta eziokwu gbasara Alaeze Chineke nke Chineke ga-eji agọzi ụmụ mmadụ.” O kwukwara na ihe ahụ ha na-eme adịghị mma n’ihi na ha “na-akwado Njikọ Mba Niile, na-ekwukwa na ọ na-anọchi anya ‘ọchịchị Chineke n’ụwa.’” Ndị Mmụta Baịbụl ga-akata obi ka ha nwee ike ikwusara ndị mmadụ ozi a.

Mgbe e mechara, otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche kwuru na “mgbakọ ahụ e nwere na Kolọmbọs mere ka okwukwe ụmụnna sikwuo ike. . . . O mere ka ha kata obi ịna-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide.” Nwanna Leo Claus onye so gaa mgbakọ ahụ sịrị: “Mgbe anyị na-ala mgbakọ ahụ, ọ na-enu anyị enu n’obi izi ndị mmadụ ozi ahụ.”

Traktị bụ́ Ecclesiastics Indicted

N’ọnwa Ọktoba, Ndị Mmụta Baịbụl malitere ikesa ọtụtụ nde traktị ahụ bụ́ Ecclesiastics Indicted, nke bụ́ okwu ahụ Nwanna Rutherford kwuru nke e biri ebi. N’otu obere obodo bụ́ Klivland dị n’Ọklahoma, otu nwanna aha ya bụ Frank Johnson kechara traktị ahụ n’ebe e kenyere ya, ya afọ nkeji iri abụọ ka a bịa buru ya. Ọ chọghị ịnọ n’ebe a ga-ahụ ya anya n’ihi na ndị ozi ahụ ọ na-ezi na-ewe iwe nọ na-achụgharị ya. N’ihi ya, Nwanna Johnson kpebiri ịga zoo na chọọchị dị nso. Mgbe ọ garuru ebe ahụ, e nweghị onye nọ ya. N’ihi ya, o tinyere ụfọdụ traktị ahụ na Baịbụl pastọ chọọchị ahụ, tụsakwa otu n’oche ọ bụla dị ebe ahụ. Mgbe o mechara ya, o ji ọsọ gbapụ. Oge ka fọtụkwara. N’ihi ya, ọ gakwuru na chọọchị abụọ ọzọ, meekwa ihe o mere na nke mbụ.

Nwanna Johnson gbaghachiri n’ebe ahụ a ga-abịa buru ya. O zoro n’azụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala, na-elegharịkwa anya ma ọ̀ ga-ahụ ndị ahụ na-achụgharị ya. Ha ji ụgbọala gbafee, mana ha ahụghị ya. Ozugbo ha gbafere, ndị ha na Nwanna Johnson so ekwusa ozi ọma, ndị nọkwa na-ekwusa ozi ọma n’ebe dị nso, bịara buru ya, ha niile apụọ.

Otu n’ime ụmụnna ndị ahụ sịrị: “Ka anyị nọ na-apụ, anyị gafere chọọchị atọ. E nwere ihe dị ka mmadụ iri ise guzo n’ihu chọọchị nke ọ bụla. Ụfọdụ n’ime ha nọ na-agụ traktị ahụ. E nwekwara ndị nke welitere traktị ahụ ka pastọ ha hụ ya. Ọ fọrọ ntakịrị ka ha jide anyị. Ma, ekele dịrị Jehova Chineke anyị maka ichebe anyị nakwa maka inye anyị amamihe anyị ji zie ozi ya ma ghara ịdaba n’aka ndị iro anyị.”

ỤMỤNNA KATARA OBI KWUSAA OZI ỌMA N’OBODO NDỊ ỌZỌ

Józef Krett

N’obodo ndị ọzọ, Ndị Mmụta Baịbụl katakwara obi kwusaa ozi ọma. N’ebe ugwu Frans, Nwanna Józef Krett kwusaara ndị Poland na-egwupụta kol ozi ọma. A haziri ka o kwuo okwu isiokwu ya bụ “A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Oge Na-adịghị Anya.” Mgbe ụmụnna kpọrọ ndị bi n’obodo ahụ ka ha bịa gere okwu ahụ, otu ụkọchukwu gwara ndị chọọchị ya ka ha ghara ịga. Mana, ihe a o mere meziri ka ọtụtụ ndị bịa. Ihe karịrị puku mmadụ ise (5,000) bịara gere okwu ahụ. Ụkọchukwu ahụ sokwa bịa. Nwanna Krett gwara ụkọchukwu ahụ ka ọ bịa kwuo gbasara ihe o kweere, mana o kweghị. Nwanna Krett nyefere akwụkwọ niile o ji. Ọ chọpụtakwara na agụụ ịnụ Okwu Chineke na-agụ ndị ahụ o ziri ozi ọma.​—Emọs 8:11

Claude Brown

N’Afrịka, Nwanna Claude Brown malitere izi ozi ọma na Gold Kost, bụ́ ebe a na-akpọ Gana ugbu a. Okwu ndị o kwuru nakwa akwụkwọ ndị o kesara nyere aka mee ka eziokwu gbasaa ngwa ngwa n’obodo ahụ. John Blankson, onye nọ na-amụ gbasara imepụta ọgwụ, gara gere otu n’ime okwu ndị o kwuru. Ọ ghọtara ozugbo na ya achọtala eziokwu. Ọ sịrị: “Eziokwu ahụ m mụtara mere m ezigbo obi ụtọ. M kwukwara gbasara ya n’ụlọ akwụkwọ anyị.”

John Blankson

Otu ụbọchị, John gara na chọọchị ndị Anglịkan ka ọ jụọ ụkọchukwu ha gbasara atọ n’ime otu n’ihi na ọ ghọtala na Baịbụl anaghị akụzi na Chineke bụ atọ n’ime otu. Iwe were ụkọchukwu ahụ, ya etie mkpu, sị: “Ị bụghị Onye Kraịst. Ị bụ nwa Ekwensu. Si ebe a pụọ!”

Mgbe John lọrutere n’ụlọ ya, o deere ụkọchukwu ahụ akwụkwọ ozi, gwa ya ka ọ bịa n’ebe ọtụtụ ndị gbakọrọ ka ha kwurịta gbasara atọ n’ime otu. Ụkọchukwu ahụ gwara John ka ọ gaa n’ọfis onyeisi ndị nkụzi n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Onye nkụzi ahụ jụrụ ya ma ò deere ụkọchukwu ahụ akwụkwọ ozi.

John zara ya, sị: “Ee, Nna anyị ukwu”

Onye nkụzi ahụ gwara ya ka o dee akwụkwọ ozi iji rịọ ụkọchukwu ahụ mgbaghara. N’ihi ya, John dere, sị:

“Nna anyị ukwu, onye nkụzi m gwara m ka m deere gị akwụkwọ ozi iji rịọ gị mgbaghara. M chọkwara idere gị ya. Mana, otu ihe ị ga-eme bụ ikweta na ihe ị na-akụzi abụghị eziokwu.”

Ihe a John dere juru onye nkụzi ahụ anya, ya ajụọ ya, sị: “Blankson, ọ̀ bụ ihe a ka i bu n’obi ide?”

Ọ zara ya, sị: “Ee, Nna anyị ukwu, ọ bụ ihe m ma m ga-edeli.”

Ọ sịziri ya: “Anyị ga-achụpụ gị n’ụlọ akwụkwọ a. Olee otú ị ga-esi na-ekwugide onye bụ́ ụkọchukwu na chọọchị gọọmenti nwe, gị achọọkwa ịka nọrọ n’ụlọ akwụkwọ a?”

John zara ya, sị: “Ma Nna anyị ukwu, . . . ọ bụrụ na ị na-akụziri anyị ihe, ya enwee ihe na-edoghị anyị anya, ọ̀ kwa anyị na-ajụ gị ajụjụ?”

Ya azaa ya, sị: “Ee, unu na-ajụ m ajụjụ.”

John agwazie ya, sị: “Nna anyị ukwu, ọ bụkwa ihe merenụ. Nwa amadị a nọ na-akụziri anyị Baịbụl, mụ ajụọ ya ajụjụ. Ọ bụrụ na o nweghị ike ịza m ajụjụ m jụrụ ya, olee ihe mere m ga-eji dee akwụkwọ ozi iji rịọ ya mgbaghara?”

A chụpụghị John. O deghịkwa akwụkwọ ozi ọ bụla iji rịọ mgbaghara.

OBI TỌRỌ NDỊ MMỤTA BAỊBỤL ỤTỌ MAKA ỌRỤ NDỊ HA GA-ARỤKWU

Ụlọ Nche kwuru gbasara ihe ndị mere n’afọ ahụ, sị: “Anyị nwere ike ikwu ihe Devid kwuru. Ọ sịrị: ‘Ị ga-enye m ike m ga-eji alụ agha.’ (Ọma 18:39) Afọ a agbaala anyị ezigbo ume n’ihi na anyị ahụla otú Jehova si nyere anyị aka n’ozi ya. . . . Obi na-atọkwa ndị ji obi ha niile na-efe ya ụtọ . . . n’ihi ozi ọma ha na-ekwusa.”

Ná ngwụcha afọ ahụ, ụmụnna mere atụmatụ ịrụ ụlọ ọrụ redio ọzọ. A rụrụ ụlọ ọrụ redio ahụ na Chikago. Ọ dabara adaba na a kpọrọ ụlọ ọrụ redio ahụ WORD, nke pụtara “okwu,” n’ihi na a ga-eji redio ahụ na-ekwusa Okwu Chineke. Na nke ugbu a, ha ji ngwá ọrụ bụ́ ọkpọka ga-eme ka ọ dị mfe ndị nọ n’ebe dị ezigbo anya ịnụ ozi ọma Alaeze, ma na Kanada nke dị n’ebe ugwu ma e si Amerịka gawa ya.

N’afọ 1925, Jehova nyeere ụmụnna aka ịghọta ihe ọhụrụ na-eme obi ụtọ gbasara Mkpughe isi iri na abụọ. Ihe a nwere ike ime ka ụfọdụ ndị kwụsị ife Jehova. Ma obi ga-adị ọtụtụ ndị ọzọ ụtọ ịghọtakwu ihe mere n’eluigwe nakwa otú o si gbasa ndị Chineke nọ n’ụwa.

a Ihe a na-akpọzi ya bụ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ.

b Ihe e ji mara Nwanna J. F. Rutherford, onye na-eduzi ọrụ Ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ, bụ Judge Rutherford. Tupu ya ejewe ozi na Betel, e nwere oge ọ bụ onyeikpe pụrụ iche n’otu ụlọikpe dị na Mizuri.