Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE I NWERE IKE ỊMỤ

Tụleghachi Ihe Ndị Bụ́ Isi

Tụleghachi Ihe Ndị Bụ́ Isi

È nwetụla mgbe o siiri gị ike icheta ihe ị ka mụpụrụ? Ọ na-eme anyị niile mgbe ụfọdụ. Gịnị ga-enyere gị aka? Ọ bụ ịtụleghachi ihe ndị kacha mkpa n’ihe ị mụrụ.

Ị mụwa ihe, kwụsịtụ mgbe ụfọdụ chebara ihe ndị kacha mkpa ị mụrụ echiche. Ọ bụ ihe Pọl onyeozi gwara ụmụnna ya ka ha mee ma ha gụwa akwụkwọ ozi o detaara ha. Ọ sịrị: “Isi ihe anyị na-ekwu bụ na.” (Hib. 8:1) O si otú ahụ nyere ha aka ịghọta ihe o bu n’obi na ihe jikọrọ ihe niile o kwuru.

Ị mụchaa ihe, i nwere ike iwepụta ihe dị ka nkeji iri chebara ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ihe ndị ị mụrụ echiche. Ọ bụrụ na i chetalịghị ha, gaghachi n’isiokwu nta ndị dị na ya ma ọ bụ gị agụọ ahịrịokwu ndị mbụ dị na paragraf nke ọ bụla ka ha nyere gị aka icheta ha. E nwee ihe ọhụrụ ị mụtara, gbalịa jiri okwu nke aka gị kọwaa ya. Ka ị na-atụleghachi ihe ndị bụ́ isi ị mụtara, ọ ga-adịrị gị mfe icheta ha. Ị ga-aghọtakwukwa otú ị ga-esi eme ihe ị mụtara.