Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 40

ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M

Jehova “Na-akasi Ndị Obi Gbawara Obi”

Jehova “Na-akasi Ndị Obi Gbawara Obi”

“Ọ na-akasi ndị obi gbawara obi. Ọ na-ekechi ọnyá ha.”​—ỌMA 147:3.

IHE A GA-AMỤ

Ihe gbasara ndị obi gbawara na-emetụ Jehova n’obi. Isiokwu a ga-eme ka anyị mata otú o si akasi anyị obi ma ihe na-agbawa obi mee anyị nakwa otú o si enyere anyị aka ịkasi ndị ọzọ obi.

1. Olee otú obi na-adị Jehova gbasara ndị ohu ya?

 GỊNỊ ka Jehova na-ahụ ma o lewe ndị ohu ya nọ n’ụwa? Ọ na-ahụ mgbe ha na-aṅụrị ọṅụ nakwa mgbe ihe na-ewute ha. (Ọma 37:18) Ọ chọpụta na n’agbanyeghị ihe ndị na-agbawa anyị obi, anyị na-eme ike anyị niile ijere ya ozi, obi na-atọ ya ụtọ. Nke kachanụ bụ na ọ chọsiri ike inyere anyị aka ma kasie anyị obi.

2. Gịnị ka Jehova na-emere ndị obi gbawara? Oleekwa ihe anyị ga-eme ka aka ọ na-enyere anyị baara anyị uru?

2 Abụ Ọma 147:3 kwuru na Jehova “na-ekechi ọnyá” ndị obi gbawara. Ọ na-akọwa otú Jehova na-esi eji nwayọọ enyere ndị obi gbawara aka. Gịnị ka anyị ga-eme ka otú a Jehova si enyere anyị aka baara anyị uru? Ka anyị lebagodị anya n’otu ihe atụ. Dọkịta nwere ike ime ọtụtụ ihe iji gwọọ onye merụrụ ahụ́. Ma, ọ bụrụ na ọ chọrọ ka aka ahụ dọkịta na-enyere ya baara ya uru, o kwesịrị ilezi anya mee ihe ndị ahụ dọkịta gwara ya. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ihe Jehova si na Baịbụl gwa ndị obi gbawara nakwa otú anyị ga-esi eme ihe a o kwuru.

JEHOVA NA-EMESI ANYỊ OBI IKE NA ANYỊ BARA URU N’ANYA YA

3. Gịnị mere ka ụfọdụ ndị na-eche na ha abaghị uru?

3 Ụwa a anyị nọ n’ime ya enweghị ịhụnanya. Ọ dị mwute na e meela ka ọtụtụ ndị na-eche na ha abaghị uru ọ bụla. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Helen a sịrị: “Ịhụnanya adịghị n’ezinụlọ anyị chaa chaa. Papa m na-akụ anyị isi aba okpu, na-agwakwa anyị mgbe niile na anyị abaghị uru.” O nwere ike ịbụ na e megbuola gị, katọọ gị ọtụtụ ugboro, ma ọ bụ mee ka i chee na a hụghị gị n’anya otú ahụ e mere Nwanna Nwaanyị Helen. Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike isiri gị ike ikweta na e nwere onye hụrụ gị n’anya n’eziokwu.

4. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 34:18, gịnị ka Jehova na-emesi anyị obi ike banyere ya?

4 Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ na-emegbu gị, ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na o ji gị kpọrọ ihe. Ọ “nọ ndị obi gbawara nso.” (Gụọ Abụ Ọma 34:18.) Ọ bụrụ na “ike ụwa gwụrụ” gị, cheta na Jehova hụrụ ihe dị mma n’obi gị, jirikwa aka ya dọta gị. (Jọn 6:44) Ọ dị njikere mgbe niile inyere gị aka n’ihi na o ji gị kpọrọ ezigbo ihe.

5. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si meso ndị e ledara anya?

5 Anyị nwere ike ịmụta otú obi na-adị Jehova ma anyị tụlee ihe Jizọs mere. N’oge ọ na-eje ozi ya n’ụwa, ọ hụrụ na e nwere ndị a na-eleda anya. O metakwaara ha ebere. (Mat. 9:9-12) Mgbe otu nwaanyị, onye chọrọ ka a gwọọ ya ọrịa ọjọọ na-arịa ya, metụrụ uwe Jizọs aka, ọ kasiri nwaanyị ahụ obi ma jaa ya mma maka okwukwe ya. (Mak 5:25-34) Jizọs mere nnọọ ka Nna ya. (Jọn 14:9) N’ihi ya, ka obi sie gị ike na Jehova ji gị kpọrọ ihe nakwa na ọ na-ahụ àgwà ọma ndị i nwere, ma okwukwe gị ma otú i si hụ ya n’anya.

6. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na i chee na ị baghị uru?

6 Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka ị baghị uru? Gụọ amaokwu Baịbụl ndị ga-emesi gị obi ike na Jehova ji gị kpọrọ ihe. Tụgharịakwa uche na ha. b (Ọma 94:19) Ọ bụrụ na e nwere ihe ị chọrọ ime ị na-emelighị ma ọ bụ na obi dara gị mbà n’ihi na ị gaghị emeli ihe ndị ọzọ na-eme, atala onwe gị ụta. Jehova anaghị atụ anya ka i mee ihe ị na-agaghị emeli. (Ọma 103:13, 14) Ọ bụrụ na e metọrọ gị n’oge gara aga ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ megbuo gị, atakwala onwe gị ụta maka ihe onye ahụ mere gị. E kwesịghị ime gị ụdị ihe ahụ. Chetakwa na Jehova ga-ekpe ndị na-emegbu ndị ọzọ ikpe ma nyere ndị e megburu aka. (1 Pita 3:12) E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sandra. E chiri ya ọnụ n’ala mgbe ọ dị obere. Ọ sịrị: “M na-arịọ Jehova mgbe niile ka o nyere m aka ịna-ele onwe m anya otú kwesịrị ekwesị, ya bụ, otú o si ele m anya.”

7. Olee otú ihe ndị mere anyị n’oge gara aga nwere ike isi nyere anyị aka n’ozi anyị na-ejere Jehova?

7 Ya emekwala gị obi abụọ na Jehova nwere ike iji gị nyere ndị ọzọ aka. O mere ka gị na ya na-arụkọ ọrụ n’ikwusa ozi ọma. (1 Kọr. 3:9) Ọ ga-abụkwa na ihe ndị mere ná ndụ gị emeela ka ọ na-adịkwuru gị mfe ịghọta otú ọ na-adị ndị na-ata ahụhụ. I nwere ike inyere ha aka. E nyeere Nwanna Nwaanyị Helen anyị kwuru okwu ya ná mmalite aka. Yanwa na-enyeziri ndị ọzọ aka ugbu a. Ọ sịrị: “Jehova emeela ka mụnwa na-enweghị ihe m bụ ghọta na ọ hụrụ m n’anya nakwa na m bara uru.” Obi na-atọ nwanna nwaanyị a ụtọ na ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile.

JEHOVA CHỌRỌ KA ANYỊ KWETA NA Ọ GBAGHARALA ANYỊ

8. Gịnị ka Jehova na-agwa anyị n’Aịzaya 1:18?

8 Obi na-agbawa ụfọdụ ndị ohu Jehova n’ihi ihe ndị ha mere n’oge gara aga. O nwere ike ịbụ tupu ha emee baptizim ma ọ bụdị mgbe ha mechara baptizim. Ma, anyị kwesịrị icheta na Jehova nyere anyị ihe mgbapụta n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ chọrọ ka anyị nabata onyinye ahụ. Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na ‘anyị na ya ekpeziela,’ c ọ naghị agụkọrọ anyị mmehie anyị. (Gụọ Aịzaya 1:18.) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Nna anyị hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova na-echefu mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga. Mana, ọ naghị echefu ihe ọma ndị anyị mere.​—Ọma 103:9, 12; Hib. 6:10.

9. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agbalịsi ike ilekwasị anya n’ihe ndị anyị ga-emeli ugbu a nakwa n’ihe ọma ndị ga-emere anyị n’ọdịnihu kama ichewe banyere ihe ndị mere n’oge gara aga?

9 Ọ bụrụ na obi na-ama gị ikpe n’ihi ihe ndị i mere n’oge gara aga, mee ike gị niile ka i lekwasị anya n’ihe ndị ị na-eme ugbu a nakwa n’ihe ndị i nwere ike ime n’ọdịnihu, ọ bụghị n’ihe ndị mere n’oge gara aga. Ka anyị kwuo banyere Pọl onyeozi. Ọ kwara mmakwaara n’ihi na e nwere mgbe o ji obi ịta mmiri megbuo Ndị Kraịst. Ma, ọ ma na Jehova agbagharala ya. (1 Tim. 1:12-15) Ọ̀ nọ na-eche mgbe niile banyere mmehie ndị o mere n’oge gara aga? O doro anya na ọ bụghị ihe o mere, otú ahụ ọ na-anọghị na-eche gbasara ihe ndị o meburu iji bụrụ onye Farisii a na-akwanyere ùgwù. (Fil. 3:4-8, 13-15) Kama ime otú ahụ, Pọl ji obi ya niile na-eje ozi ya, na-echekwa banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Dịkwa ka Pọl, ị gaghị agbanweli ihe ndị mere n’oge gara aga. Ma, i nwere ike ito Jehova ma na-eme ihe dị ya mma ugbu a. I nwekwara ike iche gbasara ihe ọma ndị o kwere nkwa imere gị n’ọdịnihu.

10. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ihe anyị mere n’oge gara aga kpataara ndị ọzọ nsogbu?

10 Ihe nwere ike ịna-ewute gị bụ ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga kpataara ndị ọzọ nsogbu. Gịnị ga-enyere gị aka? Mee ihe ndị ị ga-emeli iji dozie nsogbu ahụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike iji obi gị niile rịọ ndị i mejọrọ mgbaghara. (2 Kọr. 7:11) Rịọ Jehova ka o nyere ndị ihe ahụ i mere kpataara nsogbu aka. O nwere ike inyere gị na ha aka idi nsogbu ahụ, meekwa ka obi ruo unu ala.

11. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Jona onye amụma? (Kọwaakwa foto.)

11 Mụta ihe n’ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga, dịrịkwa njikere ikwe ka Jehova jiri gị rụọ ọrụ otú ọ bụla ọ chọrọ. Cheta ihe mere Jona onye amụma. Kama ịgawa Ninive Jehova gwara ya ka ọ gaa, o tinyere isi ebe ọzọ. Jehova dọrọ Jona aka ná ntị, ya amụtakwa ihe n’ihe ahụ o mejọrọ. (Jona 1:1-4, 15-17; 2:7-10) Ike Jona agwụghị Jehova. Jehova gwakwara ya ọzọ ka ọ gaa Ninive. Na nke ugbu a, Jona rubere isi ozugbo. O kweghị ka ihe o mejọrọ n’oge gara aga mee ka ọ ghara ịrụ ọrụ ahụ Jehova nyere ya.​—Jona 3:1-3.

Mgbe Jona onye amụma si n’afọ nnukwu azụ̀ pụta ná ndụ, Jehova gwara ya ọzọ ka ọ gaa Ninive zie ozi o ziri ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


JEHOVA NA-EJI MMỤỌ NSỌ YA AKASI ANYỊ OBI

12. Olee otú Jehova si eme ka anyị nwee udo ma ihe na-agbawa obi mee anyị? (Ndị Filipaị 4:6, 7)

12 Jehova na-eji mmụọ nsọ ya akasi anyị obi ma ihe ọjọọ mee anyị. Ka anyị legodị ihe mere Nwanna Ron na nwunye ya Carol. Ọ dị mwute na nwa ha nwoke gburu onwe ya. Ha sịrị: “Ọnwụnwa ndị siri ezigbo ike abịatụrụla anyị. Mana, nke a karịchara ha niile. E nwere ọtụtụ abalị anyị na-ehilighị ụra. Anyị ji oge ndị ahụ kpee ekpere. Anyị nwetakwara ụdị udo ahụ a kọwara ná Ndị Filipaị 4:6, 7.” (Gụọ ya.) E nwee ihe gbawara gị obi, i nwere ike ikpe ekpere gwa Jehova otú ọ dị gị ugboro ole ọ bụla ị chọrọ, ruokwa ogologo oge ọ bụla ị chọrọ. (Ọma 86:3; 88:1) Rịọ Jehova ọtụtụ ugboro ka o nye gị mmụọ nsọ ya. Ọ ga-aza gị ekpere ahụ.​—Luk 11:9-13.

13. Olee otú mmụọ nsọ nwere ike isi nyere anyị aka iji obi anyị niile na-efe Jehova? (Ndị Efesọs 3:16)

13 È nweela ihe mere gị nke mere ka ike gwụ gị? Mmụọ nsọ nwere ike ime ka i nweta ike ị ga-eji na-efe Jehova. (Gụọ Ndị Efesọs 3:16.) Ka anyị hụ ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Flora. Ya na di ya nọ na-eje ozi ala ọzọ mgbe di ya kwara iko, ha agbaa alụkwaghịm. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Otú o si gharịpụ m wuteruru m n’ọkpụkpụ. E nweghịzi ihe ọzọ m nọ na-eche. M kpere ekpere ka Jehova nye m mmụọ nsọ ya ka m nwee ike idi ya. Jehova kasiri m obi, ọ bụ eziokwu na o yiri ihe na-agaghị ekwe omume na mbụ. Jehova mere ka m nwee ike idi ya.” Nwanna nwaanyị a chọpụtara na Chineke nyeere ya aka ịtụkwasịkwu ya obi. Ugbu a, obi esiela ya ike na Jehova ga na-enyere ya aka ná nsogbu ya niile. Ọ sịrị: “Ihe e kwuru n’Abụ Ọma 119:32 kọwara otú Jehova si nyere m aka. Ebe ahụ sịrị: ‘M ga-eji obi m niile na-edebe iwu gị n’ihi na ị na-eme ka obi m nabata ha.’”

14. Olee otú anyị nwere ike isi kwe ka mmụọ nsọ Chineke na-enyere anyị aka?

14 Anyị rịọchaa Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Na-eme ihe ndị ga-eme ka mmụọ nsọ Chineke na-akpa ike n’ahụ́ gị. Ihe ndị ahụ bụ ịga ọmụmụ ihe na izi ndị ọzọ ozi ọma. Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ka o nyere gị aka ịna-atụgharị uche n’echiche Chineke. (Fil. 4:8, 9) Ka ị na-agụ Baịbụl, chọpụta ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ọnwụnwa bịaara, tụgharịakwa uche n’otú Jehova si nyere ha aka idi ya. Nwanna Nwaanyị Sandra anyị kwuburu okwu ya tara ahụhụ n’ihi ọtụtụ nsogbu bịaara ya. Ọ sịrị: “Akụkọ Josef na-agba m ezigbo ume. E nweghị mgbe o kwere ka ahụhụ ndị ọ tara na mmegbu e megburu ya mee ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma.”​—Jen. 39:21-23.

JEHOVA NA-EJI ỤMỤNNA ANYỊ AKASI ANYỊ OBI

15. Olee ndị nwere ike ịkasi anyị obi? Oleekwa otú ha nwere ike isi enyere anyị aka? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

15 Anyị tawa ahụhụ, ụmụnna anyị nwere ike ‘ịkasi anyị nnọọ obi.’ (Kọl. 4:11) Ụmụnna anyị bụ otu ụzọ Jehova si egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Ha nwere ike ịkasi anyị obi ma ha bịa nọnyere anyị, geekwa anyị ntị ka anyị na-ekwu otú obi dị anyị. Ha nwere ike ịgụrụ anyị amaokwu Baịbụl ga-akasi anyị obi ma ọ bụ kpeere anyị ekpere. d (Rom 15:4) Mgbe ụfọdụ, nwanna nwere ike ichetara anyị otú Jehova si eche echiche. Ihe a nwekwara ike inyere anyị aka ịtachi obi. Ụmụnna anyị nwekwara ike isi n’ụzọ ndị ọzọ nyere anyị aka, dị ka inye anyị nri mgbe anyị nọ ná nsogbu.

Ụmụnna a tụkwasịrị obi, ndị ma nke a na-akọ, nwere ike ịkasi gị obi ma nyere gị aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


16. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka ụmụnna anyị nyere anyị aka?

16 Mgbe ụfọdụ, anyị chọọ ka ndị ọzọ nyere anyị aka, anyị ga-agwa ha. Ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya, chọọkwa inyere anyị aka. (Ilu 17:17) Ma, e nwere ike ha amaghị otú ọ dị anyị na ihe ndị dị anyị mkpa. (Ilu 14:10) Ọ bụrụ na obi na-agbawa gị, i nwere ike ịgwa ndị enyi gị ma nke a na-akọ otú ọ dị gị n’obi. Gwa ha ihe ọ ga-abụ e meere gị, ya enyere gị aka. I nwekwara ike ịgwa otu okenye ma ọ bụ ndị okenye abụọ obi ga-eru gị ala ịkọrọ nsogbu gị. Ụfọdụ ụmụnna nwaanyị achọpụtala na ịkọrọ nwanna nwaanyị ọzọ ma nke a na-akọ ihe na-echegbu ha na-akasi ha obi.

17. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka o sie ike ụmụnna anyị ịgba anyị ume? Oleekwa ihe anyị ga-eme maka ha?

17 Ka gị na ụmụnna gị na-anọrị. N’ihi otú obi si gbawaa anyị, o nwere ike ịdị anyị ka anyị nọọrọ onwe anyị. Mgbe ụfọdụ, ụmụnna anyị nwere ike ịghọtahie anyị ma ọ bụ gwa anyị okwu gbawara anyị obi. (Jems 3:2) Ekwela ka ụdị ihe ahụ mee ka ị ghara ịnọ ụmụnna gị nso ka ha nyere gị aka. Jehova nwere ike iji ha gbaa gị ume. E nwere otu okenye aha ya bụ Gavin. Ike ụwa na-agwụkarị ya. Ọ sịrị: “Ọtụtụ mgbe, anaghị m achọ ka mụ na ndị enyi m nọrọ ma ọ bụ ka mụ na ha kwurịta okwu.” Ma, ọ na-agba mbọ ka ya na ha nọrọ. Ihe a na-emekwa ka o nweta onwe ya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Amy sịrị: “N’ihi ihe ndị mere m n’oge gara aga, ọ na-esiri m ike ịtụkwasị ndị mmadụ obi. Ma, m na-amụ otú m ga-esi ahụ ụmụnna m n’anya ma tụkwasị ha obi otú ahụ Jehova na-eme. Ama m na ihe a na-eme Jehova obi ụtọ. Ọ na-emekwa mụnwa obi ụtọ.”

IHE JEHOVA KWERE NKWA IMERE ANYỊ N’ỌDỊNIHU GA-AKASILI ANYỊ OBI

18. Gịnị ga-eme n’oge na-adịghị anya? Gịnịkwa ka anyị nwere ike ime ugbu a?

18 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ewepụ ihe niile na-akpatara anyị ahụhụ na obi mgbawa. (Mkpu. 21:3, 4) N’oge ahụ, ihe ndị mere anyị gbawara anyị obi ‘agaghị abatakwa anyị n’obi.’ (Aịza. 65:17) Dị ka anyị hụrụla, Jehova na-elekọta anyị mgbe anyị na-ata ahụhụ, ma ugbu a. Gbaa mbọ ka ị nabata ụzọ ndị o si enyere gị aka, na-akasikwa gị obi. Ya enwekwala mgbe ọ ga-emewe gị obi abụọ na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’​—1 Pita 5:7.

ABỤ NKE 7 Jehova Bụ Ike Anyị

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe.”

c Ka anyị na Jehova nwee ike ‘ikpezi,’ anyị kwesịrị igosi na anyị echegharịala. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịrịọ ya ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị, anyị agbanweekwa àgwà anyị. Ọ bụrụ na anyị mere mmehie dị oké njọ, anyị kwesịkwara ịga ka ndị okenye nyere anyị aka.​—Jems 5:14, 15.

d Dị ka ihe atụ, gụọ amaokwu Baịbụl ndị dị n’okpuru isiokwu bụ́ “Nchegbu” na “Nkasi Obi” n’akwụkwọ bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova.