ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 42
ABỤ NKE 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị
Na-egosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ụmụ Nwoke ‘E Ji Nye Anyị Onyinye’
“Mgbe ọ rịgooro n’elu, ọ kpọọrọ ụmụ nwoke . . . , jiri ha nye onyinye.”—EFE. 4:8.
IHE A GA-AMỤ
Otú ndị ohu na-eje ozi, ndị okenye, na ndị nlekọta sekit si enyere anyị aka nakwa otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ụmụ nwoke ndị a kwesịrị ntụkwasị obi na-eme.
1. Olee ụfọdụ ihe Jizọs meerela anyị?
E NWEGHỊ mmadụ ọ bụla na-emesapụ aka ka Jizọs. Mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ rụrụ ọrụ ebube ọtụtụ ugboro nyere ndị ọzọ aka. (Luk 9:12-17) Onyinye kachanụ o nyere anyị bụ iji ndụ ya chụọ àjà maka anyị. (Jọn 15:13) Kemgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ ka na-emesapụkwara anyị aka. Dị ka o kwere ná nkwa, ọ rịọrọ Jehova ka ọ wụkwasị anyị mmụọ nsọ ya iji na-akụziri anyị ihe ma na-akasi anyị obi. (Ihe e dere n’ala ala peeji Jọn 14:16, 17; 16:13) Ọ na-esikwa n’ọmụmụ ihe ọgbakọ anyị na-enwe enyere anyị aka ịna-akụziri ndị nọ n’ụwa niile gbasara Baịbụl na ịna-eme ka ha ghọọ ndị na-eso ụzọ ya.—Mat. 28:18-20.
2. Olee ndị so n’ụmụ nwoke ndị ahụ ‘Jizọs ji nye onyinye’ e kwuru okwu ha ná Ndị Efesọs 4:7, 8?
2 E nwekwara onyinye ọzọ Jizọs nyere anyị. Pọl onyeozi kwuru na mgbe Jizọs rịgochara n’eluigwe, “ọ kpọọrọ ụmụ nwoke . . . , jiri ha nye onyinye.” (Gụọ Ndị Efesọs 4:7, 8.) Pọl kọwara na Jizọs na-esi n’ụzọ dị iche iche eji ụmụ nwoke ndị a enyere ọgbakọ aka. (Efe. 1:22, 23; 4:11-13) Taa, ndị so n’ụmụ nwoke ndị a ‘o ji nye onyinye’ bụ ndị ohu na-eje ozi, ndị okenye, na ndị nlekọta sekit. a Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụ nwoke ndị a ezughị okè. N’ihi ya, ha na-emehie ihe ụfọdụ. (Jems 3:2) Ma, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ji ha na-enyere anyị aka. Ha bụ onyinye o nyere anyị.
3. Mee ihe atụ gosiri otú anyị nwere ike isi na-akwado ọrụ ụmụ nwoke ndị a e ‘ji nye anyị onyinye’ na-arụ.
3 Jizọs nyere ụmụ nwoke ndị a ọrụ dị ezigbo mkpa nke bụ́ ime ka ọgbakọ sie ezigbo ike. (Efe. 4:12) Ma, anyị niile nwere ike inyere ha aka n’ọrụ a dị mkpa. E nwere ike iji ya tụnyere ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. E nwere ndị na-arụ ya, nweekwa ndị na-enyere ndị na-arụ ya aka. Ha nwere ike iwetara ha nri na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa, ma ọ bụkwanụ si n’ụzọ ndị ọzọ na-enyere ha aka. Otú ahụkwa ka anyị niile nwere ike isi n’ihe anyị na-ekwu ma ọ bụ n’ihe anyị na-eme na-enyere ndị ohu na-eje ozi, ndị okenye, na ndị nlekọta sekit aka iji mee ka ọgbakọ na-esi ike. Ka anyị leba anya n’uru anyị na-erite n’ọrụ ha na-arụsi ike. Anyị ga-ahụkwa otú anyị ga-esi gosi ma hanwa ma Jizọs, bụ́ onye ‘ji ụmụ nwoke ndị a nye anyị onyinye,’ na obi dị anyị ụtọ maka onyinye a o nyere anyị.
NDỊ OHU NA-EJE OZI “NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA”
4. Olee ihe ụfọdụ ndị ohu na-eje ozi mere n’oge ndịozi iji “na-enyere ndị ọzọ aka”?
4 N’oge ndịozi, a họpụtara ụfọdụ ụmụnna ka ha bụrụ ndị ohu na-eje ozi. (1 Tim. 3:8) O yiri ka ọ̀ bụ ha bụ ndị ahụ “na-enyere ndị ọzọ aka” Pọl kwuru okwu ha. (1 Kọr. 12:28) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ndị ohu na-eje ozi rụrụ ọtụtụ ọrụ dị mkpa iji nyere ụmụnna ha aka ka ndị okenye nwee ike ịna-elekwasị anya n’ịkụzi ihe na ịna-elekọta ụmụnna ha. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ ndị ohu na-eje ozi nyere aka na-edepụtaghachi Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ na-azụta ihe ndị e ji ede ha.
5. Olee ụfọdụ ihe ndị ohu na-eje ozi na-eme taa iji na-enyere ndị ọzọ aka?
5 Chegodị gbasara ụfọdụ ọrụ dị mkpa ndị ohu na-eje ozi na-arụ n’ọgbakọ unu. (1 Pita 4:10) Ha nwere ike ịna-edekọ ego ọgbakọ ma ọ bụ na-ahazi ebe ọgbakọ na-ekwusa ozi ọma, na-atụ ọda akwụkwọ, na-enyekwa ya ụmụnna, na-akpa aka n’ígwè n’ọmụmụ ihe, na-enyekwa ndị bịara ọmụmụ ihe oche, ma ọ bụ na-arụzi ihe ndị mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe ndị a niile dị mkpa ka ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ nwee ike ịna-aga nke ọma. (1 Kọr. 14:40) Ihe ọzọ bụkwa na ụfọdụ ndị ohu na-eje ozi na-eme ihe omume n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, na-ekwukwa okwu ihu ọha. E nwekwara ike ịhọpụta ohu na-eje ozi ka ọ na-enyere onye nlekọta ìgwè aka. Mgbe ụfọdụ, ohu na-eje ozi ma nke a na-akọ nwere ike iso okenye gaa nleta ọzụzụ atụrụ.
6. Olee ihe ụfọdụ mere obi kwesịrị iji dị anyị ụtọ maka ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ?
6 Olee ihe ụmụnna ụfọdụ kwurula gosiri uru ndị ohu na-eje ozi na-aba n’ọgbakọ? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Beberly b bi na Bolivia sịrị: “Ndị ohu na-eje ozi na-eme ka ọmụmụ ihe na-atọ m ụtọ. Ọ bụ ọrụ ha na-arụ na-eme ka m nwee ike ịna-abụ abụ, ịna-aza ajụjụ, ịna-ege ntị n’okwu ndị a na-ekwu n’ọmụmụ ihe, nakwa ịna-amụta ihe na vidio na ihe osise ndị a na-egosi. Ha na-enye aka eme ka a ghara inwe ihe ga-eme ndị bịara ọmụmụ ihe, na-enyekwara ndị na-abịalighị ọmụmụ ihe aka isi n’Ịntanet nọrọ n’ụlọ ha na-ele ihe ndị a na-eme. Ọmụmụ ihe gbasaa, ha na-enye aka eme ka Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ọcha, na-edekọ ego ọgbakọ, na-ahụkwa na anyị nwetara akwụkwọ ndị dị anyị mkpa. Obi dị m ezigbo ụtọ maka ọrụ a ha na-arụ.” E nwere nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Leslie bi na Kolombia. Di ya bụ okenye ọgbakọ. Ọ sịrị: “Ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ na-abara di m ezigbo uru. Ọ gaara na-ejikwu ọrụ n’aka karịa ka ọ na-eji ugbu a ma ọ bụrụ na ha anọghị ya. N’ihi ya, obi dị m ezigbo ụtọ na ha na-adị njikere inye aka, jirikwa obi ha niile na-eme ya.” O doro anya na obi dịkwa gị ezigbo ụtọ maka ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ n’ọgbakọ unu.—1 Tim. 3:13.
7. Olee otú anyị si egosi na obi dị anyị ụtọ maka ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
7 Baịbụl gwara anyị, sị: ‘Na-ekelenụ Chineke mgbe niile.’ (Kọl. 3:15) Anyị nwekwara ike ịna-emere ndị ohu na-eje ozi otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na obi nwere ike ịdị anyị ụtọ maka ọrụ ha na-arụ, ma anyị kwesịkwara ịna-ekele ha. E nwere otu okenye bi na Finland aha ya bụ Krzysztof. O kwuru otú ọ na-esi egosi na obi dị ya ụtọ maka ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ. Ọ sịrị: “M na-ezigara ohu na-eje ozi kaadị ma ọ bụ deere ya ozi n’ekwentị. M na-edenye otu amaokwu Baịbụl, kwuokwa otu ihe o mere gbara m ume ma ọ bụ mere obi ji dị m ụtọ maka ọrụ ọ na-arụ.” Otu nwanna aha ya bụ Pascal na nwunye ya Jael, ndị bi na Niu Kaledonia, na-etinyekarị ndị ohu na-eje ozi n’ekpere. Nwanna Pascal sịrị: “N’oge na-adịbeghị anya, anyị na-ekpe ekpere maka ndị ohu na-eje ozi nọ n’ọgbakọ anyị, na-ekele Jehova maka ha, na-arịọkwa ya ka ọ nọnyere ha ma nyere ha aka.” Jehova na-anụ ụdị ekpere ahụ. Ọ na-abakwara ọgbakọ niile uru.—2 Kọr. 1:11.
NDỊ OKENYE ỌGBAKỌ “NA-ARỤSI ỌRỤ IKE N’ETITI UNU”
8. Gịnị mere Pọl ji sị na ndị okenye n’oge ndịozi ‘rụsiri ọrụ ike’? (1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13)
8 Ndị okenye nọ n’oge ndịozi rụsiiri ọgbakọ ọrụ ike. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13; 1 Tim. 5:17) Ha nọ ‘na-eduzi’ ọgbakọ, ya bụ, iduzi ọmụmụ ihe na iji otu obi na-eme mkpebi. Ọ bụ ha ‘na-adụ ụmụnna ọdụ.’ Otú ha si eme ya bụ iji obiọma na-enye ụmụnna ndụmọdụ a kapịrị ọnụ ka ha nwee ike isi ike n’okwukwe. (1 Tesa. 2:11, 12; 2 Tim. 4:2) N’eziokwu, ụmụ nwoke ndị a na-agbasikwa mbọ ike igboro ndị ezinụlọ ha mkpa ha, na-emekwa ka ha na Jehova dịrị ná mma.—1 Tim. 3:2, 4; Taị. 1:6-9.
9. Olee ụfọdụ ọrụ ndị okenye na-arụ taa?
9 Taa, ndị okenye na-ejikwa ọrụ n’aka mgbe niile. Ha na-ezisa ozi ọma. (2 Tim. 4:5) Ha na-anụsi ọkụ n’obi ike n’ozi ọma, na-ahazi ozi ọma ọgbakọ na-ekwusa, na-akụzikwara anyị otú e si ezi ozi ọma na otú e si akụzi ihe nke ọma. Ha na-abụkwa ndị ikpe dị obi ebere, ndị na-anaghịkwa ele mmadụ anya n’ihu. Ọ bụrụ na Onye Kraịst emee mmehie dị oké njọ, ndị okenye na-agbalịsi ike inyere ya aka ka ya na Jehova dịrịkwa ná mma. Ma, ha na-elezikwa anya eme ka ọgbakọ dị ọcha. (1 Kọr. 5:12, 13; Gal. 6:1) Ọrụ kachanụ ha na-arụ bụ ịzụ atụrụ Jehova. (1 Pita 5:1-3) Ha na-ekwu okwu si na Baịbụl ha kwadoro nke ọma, na-agbalịsi ike ịmata onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ, na-agakwa nleta ọzụzụ atụrụ. Ụfọdụ ndị okenye na-enyekwa aka arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na imezi ihe ndị mebiri emebi na ha, na-ahazi mgbakọ, sorokwa ná Ndị Na-aga Eleta Ndị Ọrịa nakwa Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ, na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ. Ndị okenye na-agbara anyị ezigbo mbọ.
10. Olee ụfọdụ ihe mere obi ji adị anyị ụtọ maka ndị okenye anyị na-arụsi ọrụ ike?
10 Jehova buru amụma na ndị ọzụzụ atụrụ ga na-azụ anyị nke ọma, nakwa na anyị “agaghịzi atụ egwu. Ụjọ agaghịkwa atụ” anyị. (Jere. 23:4) E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Finland aha ya bụ Johanna. Ọ chọpụtara na ihe a bụ eziokwu mgbe ezigbo ọrịa bịara mama ya. Ọ sịrị: “Ọ bụ eziokwu na o siiri m ike ịgwa ndị ọzọ otú obi dị m, otu okenye m na-amaghị nke ọma weturu obi gee m ntị mgbe m na-akọrọ ya otú obi dị m. O kpeere m ekpere, meekwa ka obi sie m ike na Jehova hụrụ m n’anya. Echetaghị m ihe niile o kwuru. Ma, m chetara na ihe o kwuru mere ka ụjọ kwụsị ịtụ m. M ma na ọ bụ Jehova zitere ya ka ọ bịa nyere m aka n’oge kwesịrị nnọọ ekwesị.” Olee otú ndị okenye ọgbakọ unu sirila nyere gị aka?
11. Olee otú anyị nwere ike isi gosi ndị okenye na obi dị anyị ụtọ maka ọrụ ha na-arụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
11 Jehova chọrọ ka anyị si n’obi anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ ‘n’ihi ọrụ ndị okenye na-arụ.’ (1 Tesa. 5:12, 13) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Henrietta bi na Finland sịrị: “Ndị okenye na-eji obi ha niile enyere ndị ọzọ aka. Mana ihe a apụtaghị na oge na ike ha nwere ka nke ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ na ha enweghị nsogbu nke ha. Mgbe ụfọdụ, naanị ihe m na-asị okenye bụ: ‘N’eziokwu, ị bụ nnọọ ezigbo okenye. Ọ bụ ihe m chọrọ ka ị mara.’” E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sera bi na Tọkiye. c Ọ sịrị: “Anyị kwesịrị ịna-agba ndị okenye ume ka ha nwee ike ịrụrụ ọrụ ha na-aga. N’ihi ya, anyị nwere ike ide ihe na kaadị nye ha, kpọọ ha ka ha bịa rie ihe n’ụlọ anyị, ma ọ bụkwanụ anyị na ha arụọ n’ozi ọma.” È nwere okenye obi dị gị ụtọ karịchaa maka otú o si arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ? Chọọ ụzọ ndị ị ga-esi gosi ya na obi dị gị ụtọ maka ọrụ ọ na-arụ.—1 Kọr. 16:18.
NDỊ NLEKỌTA SEKIT NA-EME KA ỌGBAKỌ SIE IKE N’OKWUKWE
12. Olee nhazi ọzọ e mere n’oge ndịozi iji gbaa ọgbakọ ume? (1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8)
12 Jizọs nyekwara ụfọdụ ụmụ nwoke ọrụ isi n’ụzọ ọzọ nyere ọgbakọ aka. O mere ka ndị okenye nọ na Jeruselem ziga Pọl, Banabas, na ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. (Ọrụ 11:22) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi otu ihe ahụ mere e ji họpụta ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye, ya bụ, ka ha na-eme ka ọgbakọ sie ike n’okwukwe. (Ọrụ 15:40, 41) Ụmụ nwoke ndị ahụ hapụrụ ọtụtụ ihe ka ha nwee ike ịna-arụ ọrụ a. Mgbe ụfọdụ, ha na-emedị ihe nwere ike ịta isi ha ka ha nwee ike ịkụziri ụmụnna ha ihe, gbaakwa ha ume.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.
13. Olee ụfọdụ ọrụ ndị nlekọta sekit na-arụ?
13 Mgbe niile, ndị nlekọta sekit na-esi otu ebe aga ebe ọzọ. Tupu ụfọdụ n’ime ha esi n’otu ọgbakọ gaa n’ọgbakọ ọzọ, ha na-aga ọtụtụ kilomita. Kwa izu, onye nlekọta sekit na-ekwu okwu ụfọdụ, na-aga nleta ọzụzụ atụrụ, na-eduzi nnọkọ ya na ndị ọsụ ụzọ, nnọkọ ya na ndị okenye, na nzukọ ozi ubi. Ọ na-akwadebe okwu dị iche iche, na-ahazikwa mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu. Ọ na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ, na-ahazikwa nnọkọ pụrụ iche ya na ndị ọsụ ụzọ nọ na sekit na-enwe, na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ alaka ụlọ ọrụ na-enye ya. Ụfọdụ n’ime ha na-adị ọkụ ọkụ.
14. Olee ụfọdụ ihe mere anyị ji jiri ndị nlekọta sekit anyị na-arụsi ọrụ ike kpọrọ ihe?
14 Olee otú ọrụ ndị dị mkpa ndị nlekọta sekit na-arụ si abara ọgbakọ uru? Mgbe otu nwanna nọ na Tọkiye na-ekwu gbasara ọbịbịa ndị nlekọta sekit, ọ sịrị: “Ọbịbịa ha nke ọ bụla na-eme ka m wepụtakwuo oge nyere ụmụnna m aka. Mụ na ọtụtụ ndị nlekọta sekit anọọla. Ma, e nwebeghị onye nke yiri onye na-achọghị ka ya na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu ma ọ bụkwanụ mee ka m chewe na ọrụ anaghị enye ya ohere.” Nwanna Nwaanyị Johanna anyị kwuburu okwu ya na onye nlekọta sekit rụrụ n’ozi ọma. Ma, e nweghị onye ha hụrụ n’ụlọ. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “N’agbanyeghị ya, agaghị m echefu ụbọchị ahụ echefu. Ụmụnne m ndị nwaanyị abụọ kwagara ebe ọzọ. Ịhụ ha nọkwa na-agụsi m ike. Onye nlekọta sekit ahụ weturu obi gbaa m nnọọ ume, nyekwara m aka ịghọta na o nwere ike anyị na ndị ezinụlọ anyị ma ọ bụ ndị enyi anyị ebighị nso ugbu a, ma n’ụwa ọhụrụ, ohere anyị na ha ga-eji na-anọkọ agaghị agwụ agwụ.” Ọtụtụ n’ime anyị hụrụ ndị nlekọta sekit n’anya otú a n’ihi otú ha sirila nyere anyị aka.—Ọrụ 20:37–21:1.
15. (a) Dị ka e kwuru na 3 Jọn 5-8, olee otú i nwere ike isi gosi na obi dị gị ụtọ maka ndị nlekọta sekit? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.) (b) Gịnị mere anyị ji kwesị igosi na obi dị anyị ụtọ maka ndị nwunye ụmụnna na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ? Olee otú anyị nwere ike isi mee ya? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Na-echeta Ndị Nwunye Ha.”)
15 Jọn onyeozi gwara Gayọs ka ọ na-ele ụmụnna bịara ịgba ọgbakọ ha ume ọbịa, gwakwa ya ka ọ “gbalịa nyere ha aka otú ga-adị Chineke mma” mgbe ha na-ala. (Gụọ 3 Jọn 5-8.) Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịkpọ onye nlekọta sekit ka ọ bịa rie nri n’ụlọ anyị. Ụzọ ọzọ bụ ịna-abịa nzukọ ozi ubi ọ ga-eduzi. Nwanna Nwaanyị Leslie anyị kwuburu okwu ya na-esi n’ụzọ ndị ọzọ egosi na obi dị ya ụtọ. Ọ sịrị: “M na-ekpe ekpere na-arịọ Jehova ka o nye ha ihe ndị dị ha mkpa. Mụ na di m edegakwarala ha akwụkwọ ozi gwa ha otú ọbịbịa ha bịara si nyere anyị aka.” Chetakwa na ndị nlekọta sekit bụ ndị mmadụ ibe anyị. Mgbe ụfọdụ, ha na-arịa ọrịa, na-echegbu onwe ha, ike ụwa na-agwụkwa ha. Okwu ọma ị gwara ha ma ọ bụ obere onyinye i nyere ha nwere ike ịbụ otú Jehova si za ekpere ha.—Ilu 12:25.
ANYỊ CHỌKWURU ỤMỤ NWOKE ‘E JI NYE ANYỊ ONYINYE’
16. Dị ka e kwuru n’Ilu 3:27, olee ajụjụ ndị ụmụnna nwoke nwere ike ịjụ onwe ha?
16 N’ụwa niile, anyị chọkwuru ụmụnna nwoke ga-abụ ndị ‘e ji nye anyị onyinye.’ Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke mere baptizim, ì ‘nwere ike inye aka’? (Gụọ Ilu 3:27.) Ị̀ dị njikere ịgbalị iru eru ịbụ ohu na-eje ozi? Ọ bụrụ na ị bụ ohu na-eje ozi, ị̀ ga-agbalịsi ike ka ị ghọọ okenye ka i nwee ike inyere ụmụnna gị aka? d Ị̀ ga-agbanweli ihe ụfọdụ ná ndụ gị ka i nwee ike ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze? Ụlọ akwụkwọ ahụ ga-azụ gị ma nyere gị aka ịbakwuru Jizọs uru. Ọ bụrụ na i chee na ị gaghị emeli ya, kpee ekpere rịọ Jehova ka o jiri mmụọ nsọ ya nyere gị aka ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere gị nke ọma.—Luk 11:13; Ọrụ 20:28.
17. Gịnị ka ụmụnna ndị a ‘e ji nye anyị onyinye’ na-egosi gbasara Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst?
17 Ụmụnna ndị a Jizọs họpụtara ‘e ji nye anyị onyinye’ gosiri na ọ na-edu anyị n’oge ikpeazụ a. (Mat. 28:20) Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ na anyị nwere Eze hụrụ anyị n’anya, na-emesapụ aka, mara mkpa anyị, na-enyekwa anyị ụmụnna ndị ga-enyere anyị aka? N’ihi ya, chọọ ohere ndị ị ga-eji gosi na obi dị gị ụtọ maka ụmụnna ndị a na-arụsi ọrụ ike. Echefukwala ikele Jehova bụ́ Onye anyị si n’aka ya “enweta onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.”—Jems 1:17.
ABỤ NKE 99 Anyị Bụ Ìgwè Ụmụnna
a Ndị okenye so n’Òtù Na-achị Isi, ndị na-enyere Òtù Na-achị Isi aka, ndị so na Kọmitii Alaka, na ndị na-arụ ọrụ ndị ọzọ ná nzukọ Jehova sokwa n’ụmụ nwoke ndị a ‘e ji nye anyị onyinye.’
b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
c Ihe a na-akpọbu ya bụ Tọki.
d Ị chọọ ịmatakwu otú i nwere ike isi ruo eruo ka ị bụrụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye, gụọ isiokwu bụ́ “Ụmụnna Nwoke, Ùnu Na-agbalịsi Ike Ka Unu Ruo Eruo Ịbụ Ndị Ohu Na-eje Ozi?” na “Ụmụnna Nwoke, Ùnu Na-agbalịsi Ike Ka Unu Ruo Eruo Ịbụ Ndị Okenye?” ndị gbara n’Ụlọ Nche Nọvemba 2024.