Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 43

ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

Otú Ị Ga-esi Kwụsị Inwe Obi Abụọ

Otú Ị Ga-esi Kwụsị Inwe Obi Abụọ

“Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile.”​—1 TESA. 5:21.

IHE A GA-AMỤ

Ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na-enwe ụdị obi abụọ nwere ike ịkpa ozi anyị na-ejere Jehova aka ọjọọ.

1-2. (a) Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ndị ohu Jehova na-enwe obi abụọ? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

 ANYỊ niile, ma nwata ma okenye, na-enwe obi abụọ a mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere otu nwanna ka na-eto eto, onye na-eche ma ihe gbasara ya ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi n’eziokwu. Ime baptizim nwere ike ịna-eme ya obi abụọ. I nwekwara ike iche banyere otu nwanna katawarala ahụ́, onye kpebiri iwere ihe gbasara ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa mgbe ọ ka na-eto eto kama iji oge ya niile na-achụ akụnụba. Ugbu a ọ katawara ahụ́, o jisiri ike na-enweta ego na-ezuru ya ilekọta ezinụlọ ya. O nwere ike ịna-eche ma ihe ahụ o kpebiri ime mgbe ọ ka na-eto eto ọ̀ dị mma. Cheekwa gbasara nwanna nwaanyị merela agadi ike na-adịghịzi. Obi nwere ike ịdawa ya mbà maka na ọ naghịzi emeli ihe ndị ọ na-emebu. Ị̀ jụtụla onwe gị ajụjụ ndị dị ka, ‘Jehova ọ̀ na-ahụ m n’eziokwu? Ọ̀ bara uru n’eziokwu na m hapụrụ ihe ụfọdụ maka ozi ya? È nwere ihe ndị m ka nwere ike imere Jehova?’

2 Ọ bụrụ na anyị amataghị azịza ajụjụ ndị a, o nwere ike ime ka anyị kwụsị inwe okwukwe na Jehova ma ọ bụdị kwụsị ife ya. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú ilekwasị anya n’ihe ndị Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị ana-enwe obi abụọ (1) ma ihe gbasara anyị ọ̀ na-emetụ Jehova n’obi, (2) ma ihe anyị kpebiri ime n’oge gara aga ọ̀ dị mma, ma ọ bụ (3) ma à ka nwere ihe ndị anyị ga-emeli n’ozi Jehova.

OTÚ Ị GA-ESI KWỤSỊ INWE OBI ABỤỌ

3. Gịnị bụ otu ihe anyị nwere ike ime ka anyị kwụsị inwe obi abụọ?

3 Otu ihe anyị nwere ike ime iji kwụsị inwe obi abụọ bụ ịga n’Okwu Chineke ka anyị mata azịza ajụjụ ndị anyị nwere. Anyị mee otú ahụ, obi ga-esikwu anyị ike, anyị na Jehova adịkwuo ná mma, anyị ejikerekwuo ‘ime ka okwukwe anyị sie ike.’​—1 Kọr. 16:13.

4. Olee otú anyị si ‘achọpụta nke bụ́ eziokwu n’ihe niile’? (1 Ndị Tesalonaịka 5:21)

4 Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:21. Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘na-achọpụta nke bụ́ eziokwu n’ihe niile.’ Olee otú anyị ga-esi eme ya? E nwee ihe na-eme anyị obi abụọ, anyị kwesịrị ịchọpụta ihe Baịbụl kwuru banyere ya. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara nwanna ahụ na-eto eto, nke na-eche ma ihe banyere ya ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi. Ihe ọ ga-eme ọ̀ bụ ikweta na ihe ahụ na-abata ya n’obi bụ eziokwu? Mba. O kwesịrị ‘ịchọpụta nke bụ́ eziokwu.’ Otú ọ ga-esi eme ya bụ ịmụ Baịbụl ka ọ mata otú Jehova si ele ya anya.

5. Olee otú anyị ga-esi mata ihe Jehova zara anyị gbasara ajụjụ ndị anyị nwere?

5 Anyị gụwa Baịbụl, ọ na-adị ka Jehova ọ̀ na-agwa anyị okwu. Ma, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịgụ Baịbụl ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata ihe Jehova ga-aza anyị. Anyị kwesịrị ịchọta amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere anyị aka n’ajụjụ ahụ ma mụọ ha. Anyị nwere ike ime nchọnchọ banyere isiokwu ahụ, jiri ihe ndị nzukọ Jehova wepụtara mee nchọnchọ. (Ilu 2:3-6) Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ma anyị mewe nchọnchọ ahụ ka anyị nwee ike ịchọta azịza ajụjụ ahụ. Anyị nweziri ike ịchọ ihe Baịbụl kwuru na ihe ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya. Ọ ga-adịkwa mma ka anyị gụọ akụkọ ndị e dere na Baịbụl gbasara ndị fere Jehova obi dị otú ahụ ọ dị anyị, ndị chekwara ụdị ihe ahụ anyị na-eche.

6. Olee otú ọmụmụ ihe anyị si enyere anyị aka ịkwụsị inwe obi abụọ?

6 Anyị mụwa Baịbụl n’ọmụmụ ihe, ọ na-adịkwa anyị ka Jehova ọ̀ na-agwa anyị okwu. Ọ bụrụ na anyị na-agachi ọmụmụ ihe anya, anyị nwere ike ịnụ okwu ma ọ bụ ihe mmadụ zara bụ́ nnọọ azịza ajụjụ ahụ anyị nwere. (Ilu 27:17) Ka anyị lebazie anya n’ihe nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị inwe obi abụọ.

MGBE Ị NA-ENWE OBI ABỤỌ MA IHE GBASARA GỊ Ọ̀ NA-EMETỤ JEHOVA N’OBI

7. Olee ajụjụ ụfọdụ ndị nwere ike ịna-ajụ?

7 È nwetụla mgbe ị nọ na-eche, sị, ‘Jehova ọ̀ na-ahụ m n’eziokwu?’ Ọ bụrụ na i chewe na Jehova anaghị ahụ gị, o nwere ike isiri gị ike iche na gị na Onye kere ihe niile ga-abụli enyi. Ọ ga-abụ na Eze Devid chere ụdị ihe ahụ. Ọ tụrụ ya n’anya na Jehova na-ahụ ụmụ mmadụ, ihe banyere ha ana-emetụkwa ya n’obi. Ọ sịrị: “Jehova, gịnị ka mmadụ bụ nke mere i ji na-eche banyere ya? Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ efu bụ nke mere i ji na-elebara ya anya?” (Ọma 144:3) Olee ebe i nwere ike isi mata azịza ajụjụ ndị a?

8. Dị ka e kwuru na 1 Samuel 16:6, 7, 10-12, gịnị ka Jehova na-ahụ n’ebe ndị mmadụ nọ?

8 Anyị si na Baịbụl mata na Jehova na-ahụ ndị e nwere ike iwere ka ndị na-enweghị ihe ha bụ. Dị ka ihe atụ, Jehova zigara Samuel ka ọ gaa n’ụlọ Jesi tee otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke asatọ mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị Izrel. Jesi kpọpụtara ụmụ ya ndị nwoke asaa ka ha bịa hụ Samuel. Mana, ọ kpọpụtaghị Devid bụ́ nke ikpeazụ. b Ma, ọ bụ Devid ka Jehova họọrọ. (Gụọ 1 Samuel 16:6, 7, 10-12.) Jehova hụrụ ụdị mmadụ Devid bụ, ya bụ, na o ji ihe gbasara ofufe ya kpọrọ ezigbo ihe.

9. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na ihe banyere gị na-emetụ Jehova n’obi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

9 Chegodị otú Jehova sirila gosi na ọ na-ahụ gị. Ọ na-enye gị ndụmọdụ kacha mma n’otú ọ bụla ihe si dịrị gị. (Ọma 32:8) Ọ̀ ga-eme ya ma ọ bụrụ na ọ maghị gị nke ọma? (Ọma 139:1) I mee ihe Jehova gwara gị ma hụ otú o si baara gị uru, obi ga-esi gị ike na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi. (1 Ihe 28:9; Ọrụ 17:26, 27) Jehova na-ahụ mbọ niile ị na-agba. Ọ na-ahụ àgwà ọma ndị i nwere. Ọ chọkwara ịbụ Enyi gị. (Jere. 17:10) Obi ga-adị ya ụtọ ma gịnwa chọọkwa ịbụ enyi ya.​—1 Jọn 4:19.

“Ị chọọ [Jehova], ị ga-achọta ya.”​—1 Ihe 28:9 (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9) c


MGBE Ị NA-ENWE OBI ABỤỌ MA IHE I KPEBIRI N’OGE GARA AGA Ọ̀ DỊKWA MMA

10. Anyị chee banyere ihe ndị anyị kpebiri n’oge gara aga, olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị?

10 Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche ma ihe ha kpebiri n’oge gara aga ọ̀ dịkwa mma. O nwere ike ịbụ na ha kpebiri ịhapụ ọrụ ga-enye ha ezigbo ego ma ọ bụ hapụ ibido achụmnta ego ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Ma ugbu a, o nwere ike ịbụ na ọtụtụ afọ agaala. Ha nwere ike ịhụ ndị ha mabu kpebiri iji ndụ ha eme ihe ọzọ. Ha bụzi aka ji akụ̀, ya adịkwa ka ihe niile ò zuuru ha. O nwere ike ime ka ha chewe, sị: ‘Ọ̀ bara uru na m hapụrụ ihe niile maka ofufe Jehova? Ka ò mere ka m ghara inweta ohere ndị magburu onwe ha?’

11. Gịnị nọ na-echegbu onye dere Abụ Ọma nke 73?

11 Ọ bụrụ na ị jụtụla onwe gị ụdị ajụjụ ndị ahụ, chee otú obi dị onye dere Abụ Ọma nke 73. Ọ hụrụ ndị na-anaghị efe Jehova, mana, ahụ́ dị ha, ha abụrụ ọgaranya, ya adịkwa ka ha enweghị nsogbu. (Ọma 73:3-5, 12) Ka ọ na-ele otú ha si yie ndị ihe na-agaziri, o bidoro iche na mbọ niile ọ gbara n’ofufe Jehova abaghị uru. Ihe ahụ na-adịghị mma ọ na-eche nọ ‘na-enye ya nsogbu ụbọchị niile.’ (Ọma 73:13, 14) Olee otú o si kwụsị iche gbasara ihe ahụ na-adịghị mma?

12. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 73:16-18, gịnị nyeere onye dere abụ ọma ahụ aka ịkwụsị ichegbu onwe ya?

12 Gụọ Abụ Ọma 73:16-18. Onye dere abụ ọma a gara n’ụlọ nsọ Jehova. N’ebe ahụ, o chere echiche nke ọma. Ọ chọpụtara na n’agbanyeghị na o yiri ka ihe ọ̀ na-agaziri ụfọdụ ndị, ha enweghị olileanya maka ọdịnihu. Ihe a mere ka obi ruo ya ala, ya amata na ife Jehova bụ mkpebi kacha mma mmadụ nwere ike ime. O kpebiziri na ya agaghị akwụsị ife Jehova.​—Ọma 73:23-28.

13. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị na-akwa mmakwaara maka ihe ụfọdụ i kpebiri n’oge gara aga? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 Okwu Chineke bụ́ Baịbụl nwere ike ime ka obi ruo gị ala otú o ruru onye dere Abụ Ọma nke 73. Olee otú ọ bụ? Chee banyere ihe ọma ndị i nwere, ma adịm ná mma gị na Jehova. Chetakwa na Jehova anaghị enyere ndị na-anaghị efe ya aka. Ọtụtụ n’ime ha chere na ihe kacha mkpa ná ndụ bụ inwe ezigbo ọrụ n’ihi na ha enweghị olileanya. Ma, Jehova na-emere gị ọtụtụ ihe ọma ugbu a. O kwekwara nkwa imere gị nke karịrị ya n’ọdịnihu. (Ọma 145:16) Cheekwa gbasara ihe a: Ị maghị otú ihe gaara adịrị gị ma a sị na i kpebiri ime ihe dị iche. Otu ihe doro anya bụ na ọ bụrụ na i kpebie ihe ndị ị ga-eme n’ihi na ị hụrụ Jehova na ndị ọzọ n’anya, ị ga na-enwe ihe ndị ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ kachanụ.

Na-eche banyere ọtụtụ ihe ọma Jehova ga-emere gị n’ọdịnihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) d


MGBE Ị NA-ENWE OBI ABỤỌ MA Ị̀ KA BAARA JEHOVA URU

14. Olee nsogbu bịaara ụfọdụ ndị? Oleekwa ajụjụ ha nwere ike ịna-ajụ onwe ha?

14 Ụfọdụ ndị ohu Jehova anaghịzi emeli ihe ndị ha chọrọ ime n’ofufe Jehova n’ihi nká, ọrịa, ma ọ bụ nsogbu ọzọ. O nwere ike ime ka obi gharazie isi ha ike na ha ka baara Jehova uru. Ha nwere ike ịna-ajụ onwe ha, sị, ‘M̀ ka baara Jehova uru?’

15. Olee ihe obi siri onye dere Abụ Ọma nke 71 ike banyere ya?

15 Onye dere Abụ Ọma nke 71 chere ụdị ihe ahụ. Ọ rịọrọ Jehova, sị: “Ahapụla m mgbe ike na-adịghịzi m.” (Ọma 71:9, 18) Ma, obi siri ọbụ abụ ahụ ike na ọ bụrụ na o jiri obi ya niile na-efe Jehova, ọ ga na-edu ya, na-akwadokwa ya. Ọ mụtara na obi na-adị Jehova ụtọ n’ebe ndị ji obi ha niile na-efe ya nọ n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ha.​—Ọma 37:23-25.

16. Olee otú ndị agadi si abara Jehova uru? (Abụ Ọma 92:12-15)

16 Ndị agadi, werenụ onwe unu otú Jehova si were unu. O nwere ike inyere unu aka ka unu na ya na-adị ná mma n’agbanyeghị na ike adịghịzi unu. (Gụọ Abụ Ọma 92:12-15.) Kama ichewe banyere ihe ndị ị na-anaghịzi emeli, na-eche gbasara ihe ndị ị ga-emeli. Dị ka ihe atụ, otú i si erubere Jehova isi na otú i si egosi ndị ọzọ na ihe banyere ha na-emetụ gị n’obi nwere ike inyere ha aka. I nwere ike ịna-akọrọ ndị ọzọ otú Jehova sirila na-enyere gị aka kemgbe ọtụtụ afọ nakwa nkwa Baịbụl ndị ị na-atụsi anya ike ka ha mezuo. Echefukwala na icheta ndị ọzọ n’ekpere na-aba ezigbo uru. (1 Pita 3:12) N’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, a ka nwere ihe anyị niile ga-emeliri Jehova na ndị ọzọ.

17. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ?

17 Obi jọwa gị njọ n’ihi na i nweghịzi ike ịgbakwu mbọ n’ozi Jehova, ka obi sie gị ike na Jehova ji ihe ndị ị na-emeliri ya kpọrọ ihe. I nwere ike ịchọ iji ihe ndị ị na-emeli tụnyere ihe ndị ọzọ na-eme. Emela otú ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova anaghị eme otú ahụ. (Gal. 6:4) Dị ka ihe atụ, Meri nyere Jizọs mmanụ na-esi ísì ọma dị oké ọnụ. (Jọn 12:3-5) Ma nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye tụnyere naanị mkpụrụ ego abụọ ga-azụtali ihe dị nnọọ ntakịrị n’igbe onyinye. (Luk 21:1-4) Ma, Jizọs ejighị ihe otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị ahụ mere tụnyere ihe onye nke ọzọ mere. Kama ọ hụrụ na ha abụọ nwere ezigbo okwukwe. Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya. N’ihi ya, ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ ihe niile ị na-eme n’ozi ya n’ihi na i nwere okwukwe, hụkwa ya n’anya. O jikwa ha kpọrọ ihe ọ bụrụgodị na i chere na ha dị ezigbo obere.

18. Gịnị ga-enyere gị aka ịkwụsị inwe obi abụọ? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Okwu Jehova Nwere Ike Inyere Gị Aka Ịkwụsị Inwe Obi Abụọ.”)

18 Anyị niile na-enwe obi abụọ mgbe ụfọdụ. Ma, dị ka anyị hụrụla, Okwu Chineke bụ́ Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị inwe obi abụọ. N’ihi ya, gbaa ezigbo mbọ kwụsị inwe obi abụọ. Obi ga-esikwa gị ike gị akwụsị ịna-echegbu onwe gị. N’eziokwu, Jehova na-ahụ gị. O ji ihe ọ bụla ị hapụrụ maka ya kpọrọ ihe. O kwekwara nkwa na ọ ga-akwụ gị ụgwọ. Ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ ndị ji obi ha niile na-efe ya n’anya. Ihe gbasara ha na-emetụkwa ya n’obi.

ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

a NKỌWAKWU: N’isiokwu a, ụdị obi abụọ anyị na-ekwu okwu ya bụ nke na-eme ka obi ghara isi anyị ike na Jehova ji anyị kpọrọ ihe ma ọ bụ na ihe ndị anyị kpebiri n’oge gara aga bara uru. Ọ bụghị ụdị obi abụọ Baịbụl kwuru nwere ike igosi na mmadụ enweghị okwukwe na Jehova nakwa ná nkwa ndị o kwere.

b Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị afọ ole Devid dị mgbe Jehova họọrọ ya, o nwere ike ịbụ na o rubeghị afọ iri abụọ.​—Gụọ Ụlọ Nche September 1, 2011, peeji nke 29, paragraf nke 2.

c NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-eto eto na-amụ Baịbụl ka ọ mata ihe Jehova chere gbasara otú ihe si dịrị ya.

d NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-arụ ọrụ iji kpaa afọ ezinụlọ ya. Ma n’ime obi ya, ọ na-ahụ onwe ya na Paradaịs.