Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Olee otú ogo ihe a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ Solomọn hà?
Ihe a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ ahụ dị n’ebe e si abanye n’Ebe Nsọ. Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ndị e bipụtara tupu afọ 2023 kwuru na “ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ ahụ dị kubit iri abụọ n’obosara. Ogo ya dị otu narị na iri abụọ (120). Ihe ahụ na ụlọ ahụ hà n’obosara.” (2 Ihe 3:4) Nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ kwukwara na ogo ihe ahụ a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ ahụ dị “otu narị kubit na iri abụọ (120),” nke pụtara na ogo ya hà ka ihe dị ka poolu eletrik ise.
Ma, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e bipụtara n’afọ 2023 kwuru gbasara ihe ahụ a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abata, sị: “Ogo ya dị kubit iri abụọ,” ya bụ, ihe fọrọ obere ka ọ hara ka otu poolu eletrik. a Ka anyị lee ihe ụfọdụ mere e ji mee mgbanwe a.
E kwughị otú ogo ihe ahụ a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ ahụ hà ná 1 Ndị Eze 6:3. N’amaokwu ahụ, Jeremaya bụ́ onye dere ya dere otú obosara ya na uhiè ya hà, ọ bụghị otú ogo ya hà. N’isi nke asaa, o kwuru gbasara ihe ndị ọzọ dị mkpa n’ụlọ nsọ ahụ, ma otu nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri, nke e ji ọla kpụọ, ihe iri e ji ebu ihe, na ogidi ọla kọpa abụọ dị n’ihu ihe ahụ a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abanye n’ụlọ nsọ ahụ. (1 Eze 7:15-37) Ọ bụrụ na ihe ahụ a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abanye n’ụlọ nsọ ahụ hà ka poolu eletrik ise n’ogologo, dịkwa elu karịa ebe ndị ọzọ n’ụlọ nsọ ahụ, gịnị mere Jeremaya ekwughị gbasara ogo ya? Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, ndị Juu na-ede akụkọ ihe mere n’oge ochie dere na ihe ahụ a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abanye n’ụlọ nsọ adịghị elu karịa ebe ndị ọzọ n’ụlọ nsọ ahụ Solomọn rụrụ.
Ndị ọkà mmụta Baịbụl echeghị na ụlọ nsọ ahụ ga-ebuli ihe a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abanye ya ogo ya hà ka poolu eletrik ise. Ihe ndị e ji okwute na brik rụọ n’oge ochie ndị na-adị ezigbo elu, dị ka ọnụ ụzọ ámá ụlọ nsọ ndị Ijipt, na-asa mbara n’ala ya ma pịa ọnụ n’ebe elu ya. Mana ọ bụghị otú ahụ ka ụlọ nsọ Solomọn dị. Ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu na ahụ́ ụlọ ya akarịghị kubit isii ma ọ bụ amaụkwụ itoolu n’ibu. Otu nwoke aha ya bụ Theodor Busink, na-akọ gbasara ụlọ ndị a rụrụ n’oge ochie, sịrị: “Otú ahụ́ ụlọ ahụ hà n’ibu gosiri na ihe ahụ a rụnyere n’ọnụ ụzọ e si abanye n’ụlọ nsọ erughị otu narị kubit na iri abụọ (120).”
O nwere ike ịbụ na e dejọrọ ihe mgbe a na-edepụtaghachi 2 Ihe E Mere 3:4. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ Baịbụl ndị mere ezigbo ochie e ji aka depụta dere “otu narị na iri abụọ (120)” n’amaokwu a, ma Baịbụl ndị ọzọ e ji aka dee a tụkwasịrị obi dere “kubit iri abụọ,” dị ka Codex Alexandrinus, nke e dere n’ihe dị ka otu puku afọ na narị ise (1,500) gara aga nakwa Codex Ambrosianus, nke e dere n’ihe dị ka otu puku afọ na narị anọ (1,400) gara aga. Gịnị nwere ike ime ka onye depụtaghachiri ya dee “otu narị na iri abụọ (120)” n’amaghị ama? Ihe ndị Hibru na-akpọ “otu narị” na “kubit” yiri. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na onye depụtaghachiri ya dere “otu narị” kama ide “kubit.”
N’eziokwu, anyị na-agbalị ịghọta ihe e kwuru gbasara ụlọ nsọ Solomọn nke ọma ka anyị nwee ike ime ka a mata otú ọ dị. Ma, mkpa anyị bụ ihe ọ nọchiri anya ya, ya bụ, nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova na-akpọ ndị ohu ya niile ka ha bịa fee ya n’ụlọ nsọ ahụ.—Hib. 9:11-14; Mkpu. 3:12; 7:9-17.
a Ihe e dere n’ala ala peeji ya kwuru na “ụfọdụ akwụkwọ Baịbụl ochie ndị e ji aka dee kwuru ‘otu narị kubit na iri abụọ (120),’ mana e nwekwara ụfọdụ nakwa nsụgharị Baịbụl ndị kwuru ‘kubit iri abụọ.’”