ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Ọktoba 2019

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ na Disemba 2 ruo 29, 2019.

1919​—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

N’afọ 1919, Jehova nyere ndị ya ike ịna-ekwusa ozi ọma otú ha na-ekwusatụbeghị ya. Ma, e nwere ihe dị mkpa ga-ebugodị ụzọ gbanweere Ndị Mmụta Baịbụl.

Tupu Chineke Ekpee Ikpe, Ọ̀ Bụ Mgbe Niile Ka Ọ Na-ama Ọkwa Ya Mgbe Oge Ka Dị?

Jehova Chineke na-agwa ndị bi n’ụwa gbasara oké ifufe dị njọ karịa nke ọ bụla ndị na-enyocha ihu ígwé nwere ike ịhụ. Olee otú o si eme ya?

Na-ekwusasi Ozi Ọma Ike ná Ngwụcha “Oge Ikpeazụ A”

Olee ihe ndị ga-eme ná ngwụcha “oge ikpeazụ” a? Olee ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme mgbe anyị na-echere ka ihe ndị ahụ mee?

Na-erubere Chineke Isi n’Oge “Oké Mkpagbu”

Gịnị ka Jehova ga-achọ ka anyị mee n’oge “oké mkpagbu” ahụ? Olee otú anyị nwere ike isi jikere ugbu a ka anyị nwee ike ịna-erubere Chineke isi n’oge ahụ?

Gịnị Ka Jehova Ga-eme Ka Ị Bụrụ?

N’oge ochie, Jehova nyeere ndị ohu ya aka, ha achọọ ime uche ya, nyekwa ha ike ha ji mee ya. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ka anyị nwee ike ijere ya ozi n’oge anyị a?

Na-efe Naanị Jehova

Isiokwu a lebara anya n’ihe abụọ anyị na-eme ná ndụ ga-enyere anyị aka ịmata ma ọ̀ bụ naanị Jehova ka anyị na-efe.