Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Nwanna Rutherford na-ekwu okwu ná mgbakọ ukwu e mere na Sida Pọịnt, dị n’Ohayo, n’afọ 1919

1919​—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

1919​—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

AGHA ỤWA MBỤ, bụ́ agha a lụrụ ihe karịrị afọ anọ, biri tupu afọ 1919. Ọ bụ ná ngwụcha afọ bu ya ụzọ ka mba niile kwụsịrị ịlụ agha ahụ. N’abalị iri na asatọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1919, e bidoro inwe nnọkọ udo na Paris. Otu n’ime uru nnọkọ ahụ bara bụ na o mere ka e nwee nkwekọrịta e nwere n’obodo Vasaị. Ọ bụ nkwekọrịta ahụ mere ka agha ahụ mba dị iche iche lụsoro Jamanị kwụsị. A bịanyere aka ná nkwekọrịta ahụ n’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Jun afọ 1919.

Nkwekọrịta ahụ mekwara ka e hiwe òtù ọhụrụ a kpọrọ Njikọ Mba Niile. Ihe mere e ji hiwe ya bụ ka “o mee ka mba niile nwee otu obi, meekwa ka e nwee udo na obi iru ala n’ụwa niile.” Ọtụtụ chọọchị kwadoro òtù ahụ. Òtù Chọọchị nke Kraịst n’Amerịka toro ya, kwuo na ọ bụ “ihe na-anọchi anya Alaeze Chineke n’ụwa.” Òtù Chọọchị ahụ kwadoro Njikọ Mba Niile ma ziga ndị ga-anọchite anya ha ná nnọkọ udo ahụ e nwere na Paris. Otu n’ime ndị ahụ kwuru na nnọkọ ahụ pụtara na “oge kacha mma e nwetụrụla kemgbe ụwa amalitela.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na oge kacha mma ebidowela mgbe ahụ. Ma, ọ bụghị ndị ahụ gara nnọkọ ahụ mere ka e nwee ya. N’afọ 1919, e nwere oge kacha mma n’ọrụ ikwusa ozi ọma mgbe Jehova nyere ndị ya ike ha ga-eji kwusaa ozi ọma otú a na-ekwusatụbeghị ya. Ma, e nwere ihe dị mkpa ga-ebugodị ụzọ gbanweere Ndị Mmụta Baịbụl.

MKPEBI TARA AKPỤ

Joseph F. Rutherford

E kwuru na a ga-eme ntụliaka a na-eme kwa afọ iji họpụta ndị na-eduzi Watch Tower Bible and Tract Society na Satọdee, abalị anọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1919. N’oge ahụ, a tụrụ Nwanna Joseph F. Rutherford, bụ́ onye Jehova ji na-eduzi ndị ya, mkpọrọ arụrụala n’Atlanta, Jọjịa, dị n’Amerịka, ya na ụmụnna asaa ndị ọzọ. Ajụjụ dị mkpa bụ, È kwesịrị ịhọpụtaghachi ụmụnna ndị ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ ndị sobu na-eduzi nzukọ a? Ka à ga-eji ndị ọzọ dochie ha?

Evander J. Coward

Nwanna Rutherford nọ n’ụlọ mkpọrọ na-eche gbasara ihe ga-emecha mee nzukọ a. Ọ ma na ụfọdụ ụmụnna chere na ọ ga-aka mma ka a họpụta onye ọzọ ga-abụ onyeisi oche. Ọ bụ ya mere o ji degara ndị bịara nnọkọ ahụ akwụkwọ ozi, tụọ aro ka a họpụta Nwanna Evander J. Coward ka ọ bụrụ onyeisi oche. Nwanna Rutherford kwuru na ‘obi ruru Nwanna Coward ala,’ na o ‘nwere uche, jirikwa ọrụ Onyenwe anyị kpọrọ ihe.’ Ma, ihe ọtụtụ ụmụnna chọrọ bụ ka e yigharịa ntụliaka ahụ, mezie ya n’ọnwa isii na-abịa abịa. Ndị ọkàiwu na-ekwuchite ọnụ ụmụnna ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ kwetara. Iwe bịara ụfọdụ ụmụnna mgbe a na-akpa ihe ahụ.

Richard H. Barber

E nweziri ihe merenụ, nke Richard H. Barber mechara kwuo na ọ bụ ‘ihe mere ka ebe niile daa jii.’ Otu n’ime ụmụnna ndị nọ ebe ahụ katara obi kwuo, sị: “Abụghị m ọkàiwu. Ma, amakwanụ m ihe e kwesịrị ime ma ụdị ihe a mee. Chineke chọrọ ka anyị dụnyere ya úkwù. Otú kacha mma anyị ga-esi gosi na anyị dụnyeere Chineke úkwù bụ ime ntụliaka họpụtaghachi Nwanna Rutherford ka ọ bụrụ onyeisi oche.”​—Ọma 18:25.

Alexander H. Macmillan

Nwanna A. H. Macmillan, onye so n’ụmụnna ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ, mechara kwuo na n’ụbọchị na-esote ụbọchị e mere ntụliaka ahụ, Nwanna Rutherford kụrụ aka n’ahụ́ ụlọ ụlọ mkpọrọ ebe Nwanna Macmillan nọ, ma nye ya akwụkwọ ozi ụmụnna ziteere Nwanna Rutherford gbasara ihe e metara ná ntụliaka ahụ. Nwanna Macmillan ghọtara ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ ozugbo. Ihe ọ pụtara bụ na a họpụtaghachila ụmụnna niile ahụ a tụrụ mkpọrọ, ndị sobu na-eduzi nzukọ a. Joseph Rutherford na William Van Amburgh ka ga na-arụkwa ọrụ ha. N’ihi ya, Nwanna Rutherford ka bụkwa onyeisi oche.

A KPỌPỤTARA HA N’ỤLỌ MKPỌRỌ

Mgbe ụmụnna ndị ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ, Ndị Mmụta Baịbụl gwara ndị mmadụ ka ha bịanye aka n’akwụkwọ ozi ha chọrọ izigara ndị ọchịchị, na-arịọ ka a kpọpụta ụmụnna ndị ahụ n’ụlọ mkpọrọ. Ihe karịrị narị puku mmadụ asaa bịanyere aka n’akwụkwọ ozi ahụ ụmụnna ndị ahụ nwere obi ike dere. Na Wenezdee, n’abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Mach afọ 1919, tupu e zigara ndị ọchịchị akwụkwọ ozi ahụ, a kpọpụtara Nwanna Rutherford na ụmụnna ndị ọzọ ahụ n’ụlọ mkpọrọ.

N’okwu Nwanna Rutherford gwara ndị bịara ịnabata ya n’ụlọ ya, ọ sịrị: “Obi siri m ike na ihe a mere anyị niile na-akwadebe anyị maka oge ka taa akpụ na-abịa n’ọdịnihu. . . . Ihe mere unu ji lụọ ọgụ a abụghị ka a kpọpụta ụmụnna unu n’ụlọ mkpọrọ. Ọ bụghị ya bụ ihe mere anyị ji arụ ihe a niile. . . . Ihe mere unu ji lụọ ọgụ a bụ ka e too Jehova. Otú Chineke si gọzie ndị so lụọ ya enweghị atụ.”

Ihe ndị mere mgbe a na-ekpe ụmụnna ndị a ikpe nwere ike igosi na aka Jehova dị n’ihe ahụ niile. N’abalị iri na anọ n’ọnwa Mee afọ 1919, ihe ụlọikpe mkpegharị ikpe kpebiri bụ: “E kpeghị ndị a a mara ikpe ikpe nkwụmọtọ e kwesịrị ikpe ha. N’ihi ya, a kagbuola ikpe a mara ha.” A maburu ụmụnna ndị ahụ ikpe na ha mere mpụ jọgburu onwe ya. Ikpe ahụ a mara ha agaraghị apụ apụ n’akwụkwọ ndị ọchịchị ma a sị na naanị ihe e mere bụ ịgbaghara ha ma ọ bụ ibelata ahụhụ a tara ha. E nweghịzi ihe ọjọọ ụlọikpe ahụ sịrị na ha mere. Ọ bụ ya mere Nwanna Rutherford, bụ́ ọkàikpe, ji ka ruo eruo ikwuchite ọnụ ndị Jehova n’Ụlọikpe Kacha Elu n’Amerịka. O mere otú ahụ ọtụtụ ugboro mgbe a kpọpụtachara ya n’ụlọ mkpọrọ.

HA KPEBISIRI IKE IKWUSA OZI ỌMA

Nwanna Macmillan kwuru, sị: “Anyị agaghị adị umengwụ, fanye aka n’ụkwụ na-eche ka Onyenwe anyị kpọrọ anyị gaa eluigwe.” Ọ sịkwara: “Anyị ghọtara na anyị kwesịrị ịgba mbọ mata ihe bụ́ uche Onyenwe anyị n’eziokwu.”

Ma, ihe ụmụnna ndị nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị ga-eme abụghị naanị ịrụwakwa ọrụ ahụ ha na-arụ kemgbe ọtụtụ afọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’oge ahụ a tụrụ ha mkpọrọ, e bibiri plet niile e ji ebiri anyị akwụkwọ. Ihe a mere ka ike gwụ ụmụnna ụfọdụ, ha echewezie ma è kwusachaala ozi ọma.

È nwere onye ka chọrọ ịnụ ozi ọma Ndị Mmụta Baịbụl na-ekwusa? Iji zaa ajụjụ a, Nwanna Rutherford kpebiri na ya ga-ekwu okwu ihu ọha a ga-akpọ mmadụ niile ka ha bịa gere. Nwanna Macmillan kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nweghị onye bịaranụ, anyị amara na e kwusachaala ozi ọma.”

Akwụkwọ akụkọ e ji kpọsaa okwu ihu ọha Nwanna Rutherford isiokwu ya bụ “Olileanya Dịịrị Ụmụ Mmadụ Nọ ná Nsogbu.” O kwuru ya na Lọs Anjelis dị na Kalịfọnịa, n’afọ 1919

N’agbanyeghị na ezigbo ahụ́ na-arịa Nwanna Rutherford, na Sọnde bụ́ abalị anọ n’ọnwa Mee afọ 1919, o kwuru okwu ihu ọha isiokwu ya bụ: “Olileanya Dịịrị Ụmụ Mmadụ Nọ ná Nsogbu.” Ọ bụ na Lọs Anjelis dị na Kalịfọnịa ka ọ nọ kwuo ya. Ihe dị ka puku mmadụ atọ na narị ise bịara gere ya, a gwakwa ọtụtụ narị ndị ọzọ ka ha lawa n’ihi na e nweghị ebe ha ga-anọ. N’echi ya, otu puku mmadụ na narị ise bịara. Ụmụnna anyị amatala ihe ha chọrọ ịma. Ndị mmadụ ka chọrọ ịnụ ozi ọma anyị.

Ihe ọzọ ụmụnna ndị ahụ mere meziri ka Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma otú ha si ekwusa ya ruokwa taa.

HA JIKEERE MAKA ỌGANIHU E MECHARA NWEE

N’Ụlọ Nche Bekee nke Ọgọst 1, 1919, a mara ọkwa na ná mbido Septemba, a ga-enwe nnukwu mgbakọ na Sida Pọịnt dị n’Ohayo. N’oge ahụ, Nwanna Clarence B. Beaty bụ nwa okorobịa si Mizuri. Ọ sịrị: “O nweghị onye na-achọghị ịga.” Ụmụnna ndị bịara ya karịrị puku isii. Ha karịrị ihe a tụrụ anya ya. Ihe ọzọ mere ka obi dịkwuo ha ụtọ bụ na ndị mere baptizim n’Ọdọ Mmiri Irii, dị nso ebe ahụ, karịrị narị mmadụ abụọ.

Ihu magazin The Golden Age mbụ, nke Ọktoba 1, 1919

N’abalị ise n’ọnwa Septemba afọ 1919, bụ́ ụbọchị nke ise ná mgbakọ ahụ, Nwanna Rutherford kwuru okwu isiokwu ya bụ “Okwu A Na-agwa Ndị Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ.” Mgbe ọ na-ekwu okwu ahụ, ọ mara ọkwa na e bipụtala magazin ọhụrụ aha ya bụ The Golden Age. * Ọ ga na-akọ gbasara “ihe ndị dị mkpa na-eme ugbu a, jirikwa Baịbụl na-akọwa ihe mere ihe ndị ahụ ji na-eme.”

Magazin ọhụrụ ahụ mere ka Ndị Mmụta Baịbụl jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma. Otu akwụkwọ ozi nke kwuru otú a ga-esi hazie ikwusa ozi ọma sịrị: “Ka onye ọ bụla e mere baptizim cheta na ikwusa ozi ọma bụ ihe ọma Chineke meere anyị, ma jiri ohere e nwere ugbu a kwusasie ozi ọma ike.” Ọtụtụ ndị zara òkù ahụ. Tupu Disemba agafee, ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi enwetala ihe karịrị iri puku ọda magazin ahụ ise.

Ụmụnna nọ na Bruklin dị na Niu Yọk, na gwongworo magazin bụ́ The Golden Age juru

Ná ngwụcha afọ 1919, a hazigharịrị ndị Jehova, meekwa ka ha na-anụ ọkụ n’obi. Ihe ọzọ bụ na e mezuru amụma ụfọdụ dị mkpa e buru gbasara oge ikpeazụ. A nụchaala ndị Chineke ma nwalee ha otú ahụ e buru n’amụma na Malakaị 3:​1-4. E sikwala na “Babịlọn Ukwu” ahụ tọpụ ndị Jehova. Jizọs ahọpụtakwala “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” * (Mkpu. 18:​2, 4; Mat. 24:45) Ndị Mmụta Baịbụl adịziela njikere ịrụ ọrụ Jehova chọrọ ka ha rụọ.

^ par. 22 N’afọ 1937, a gbanwere aha The Golden Age ka ọ bụrụ Consolation, malitekwa ịkpọ ya Teta! n’afọ 1946.