Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị mmadụ kwesịrị ịnụ aka ná ntị a na-adọ ha na ikpe Chineke na-abịa ka “oké ifufe”

Tupu Chineke Ekpee Ikpe, Ọ̀ Bụ Mgbe Niile Ka Ọ Na-ama Ọkwa Ya Mgbe Oge Ka Dị?

Tupu Chineke Ekpee Ikpe, Ọ̀ Bụ Mgbe Niile Ka Ọ Na-ama Ọkwa Ya Mgbe Oge Ka Dị?

KA ONYE ọkachamara na-enyocha ihe na-enyere ya aka ịmata otú ihu ígwé ga-adị, ọ hụrụ ka ajọ ifufe fe na-aga n’obodo ọtụtụ ndị bi. Ọ gbalịsiri ike na-adọ ndị bi ebe ahụ aka ná ntị tupu ihe emebie n’ihi na ọ chọghị ka ihe ọ bụla mee ha.

Jehova na-eme ụdị ihe ahụ taa. Ọ na-agwa ndị bi n’ụwa gbasara “oké ifufe” dị njọ karịa nke ọ bụla ndị na-enyocha ihu ígwé nwere ike ịhụ. Olee otú o si eme ya? Gịnịkwa mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ọ ga-enye ndị mmadụ oge ga-ezuru ha ime ihe ha kwesịrị ime? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị burugodị ụzọ kwuo gbasara ụfọdụ aka ná ntị Jehova dọrọ ndị mmadụ n’oge ochie.

MGBE CHINEKE DỌRỌ NDỊ MMADỤ AKA NÁ NTỊ

N’oge ochie, Jehova dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị gbasara ikpe ọ ga-ekpe ndị kpachaara anya na-enupụrụ ya isi. Baịbụl ji ikpe ahụ tụnyere “oké ifufe.” (Ilu 10:25; Jere. 30:23) Na nke ọ bụla, ọ dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị mgbe ezigbo oge ka dị, gwakwa ha ihe ha kwesịrị ime iji mee uche ya. (2 Eze 17:​12-15; Nehe. 9:​29, 30) Iji nyere ha aka ime ihe ha kwesịrị ime, ọ na-esikarị n’aka ndị ohu ya nọ n’ụwa amara ndị mmadụ ọkwa na ikpe ya na-abịa, meekwa ka ha ghọta na ha kwesịrị ime ihe ozugbo.​—Emọs 3:7.

Dị ka ihe atụ, Chineke si n’aka Noa maa ọkwa ihe ọ ga-eme. Ruo ọtụtụ afọ, Noa ji obi ike dọọ ndị na-eme omume rụrụ arụ na ndị na-eme tigbuo zọgbuo aka ná ntị na Chineke ga-eji Iju Mmiri bibie ụwa. (Jen. 6:​9-13, 17) Ọ gwakwara ha ihe ha kwesịrị ime ka a ghara ibibi ha. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ya “onye na-ekwusa ezi omume.”​—2 Pita 2:5.

N’agbanyeghị mbọ niile Noa gbara, ndị oge ahụ leghaara ihe Chineke kwuru anya. Ha mere ihe gosiri na ha enwetụdịghị okwukwe. N’ihi ya, ha nwụrụ mgbe Iju Mmiri ahụ “bịara wee kpochapụ ha niile.” (Mat. 24:39; Hib. 11:7) Mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, ha enweghị ọnụ ikwuwe na Chineke ebughị ụzọ dọọ ha aka ná ntị.

E nwere oge ndị ọzọ Jehova dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị obere oge tupu ikpe ya abịa ka “oké ifufe.” N’agbanyeghị nke ahụ, o mere ka ndị ihe ahụ ga-egbu nwee oge ga-ezuru ha ime ihe ha kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, o bu ụzọ dọọ ndị Ijipt aka ná ntị tupu ya etie ha Ihe Otiti Iri n’oge ochie. Otu n’ime oge ndị ahụ bụ mgbe Jehova dunyere Mozis na Erọn ka ha gaa dọọ Fero na ndị na-ejere ya ozi aka ná ntị na ihe otiti nke asaa, ya bụ, akụ́ mmiri igwe, ga-anyụ ha anya. Ebe ọ bụ na akụ́ mmiri igwe ahụ ga-ebido n’echi ya, Chineke ò nyere ha oge ga-ezuru ha inweta ebe ha ga-agbaba ma gbanahụ akụ́ mmiri igwe ahụ? Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke tụrụ egwu okwu Jehova n’etiti ndị na-ejere Fero ozi mere ka ndị na-ejere ya ozi na anụ ụlọ ya gbaba n’ime ụlọ, ma onye ọ bụla ọ na-emetụghị n’obi iji okwu Jehova kpọrọ ihe hapụrụ ndị na-ejere ya ozi na anụ ụlọ ya n’ọhịa.” (Ọpụ. 9:​18-21) O doro anya na Jehova dọrọ ha aka ná ntị mgbe oge ka dị. N’ihi ya, ndị mere ihe ha kwesịrị ime ozugbo esoghị ndị ọzọ taa ụdị ahụhụ ha tara.

Otú ahụkwa ka Jehova si dọọ Fero na ndị ohu ya aka ná ntị tupu ihe otiti nke iri ahụ. Ma, ha zuzuuru jụ aka ná ntị ahụ Jehova dọrọ ha. (Ọpụ. 4:​22, 23) Ọ bụ ya mere ụmụ ha ndị bụ́ ọkpara ji nwụọ pịị. Ọ dị mwute. (Ọpụ. 11:​4-10; 12:29) A sị na ha chọrọ, hà gaara eme ihe ahụ a gwara ha tupu oge agaa? Eenụ. Mozis gwara ndị Izrel ozugbo na ihe otiti nke iri ahụ na-abịa, gwakwa ha otú ha ga-esi chebe ezinụlọ ha. (Ọpụ. 12:​21-28) Mmadụ ole mere ihe ahụ a gwara ha? Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ihe ruru nde mmadụ atọ, ma ndị Izrel ma “ìgwè mmadụ gwara ọgwa” bụ́ ndị Ijipt na ndị ọzọ na-abụghị ndị Izrel, si n’Ijipt pụta n’enweghị ihe mere ha.​—Ọpụ. 12:38.

Ihe ndị a Baịbụl kọrọ gosiri na ọ bụ mgbe niile ka Jehova na-eme ka e buru ụzọ dọọ ndị mmadụ aka ná ntị mgbe oge ka dị. (Diut. 32:4) Gịnị mere Chineke ji eme otú ahụ? Pita onyeozi kwuru na Jehova ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’ (2 Pita 3:9) N’eziokwu, ihe gbasara ndị mmadụ na-emetụ Chineke n’obi. Ọ chọrọ ka ha chegharịa ma mee ihe ha kwesịrị ime tupu ikpe ya amalite.​—Aịza. 48:​17, 18; Rom 2:4.

NDỊ MMADỤ KWESỊRỊ IRUBE ISI N’AKA NÁ NTỊ CHINEKE NA-ADỌ HA TAA

Taa, mmadụ niile kwesịkwara ime ihe dị mkpa Chineke na-agwa ndị mmadụ ka ha mee n’ụwa niile. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwuru na a ga-emecha bibie ụwa ochie a n’oge “oké mkpagbu.” (Mat. 24:21) Mgbe Jizọs na-ekwu gbasara ikpe ahụ a ga-ekpe n’ọdịnihu, o buru amụma mere ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta nke ọma ihe ha ga-atụ anya ịhụ ma oge ahụ ruwe. O si otú ahụ kọwaa ihe ndị dị mkpa na-eme n’ụwa taa anyị ji anya anyị na-ahụ.​—Mat. 24:​3-12; Luk 21:​10-13.

Otú ahụ Jizọs buru n’amụma, Jehova na-agwa mmadụ niile ugbu a ka ha rubere ọchịchị ya isi. Ọ chọrọ ka ndị na-erubere ya isi na-ebi ndụ ka mma ugbu a nakwa ka ngọzi ndị ga-adị n’ụwa ọhụrụ ruo ha aka. (2 Pita 3:13) Jehova chọrọ inyere ndị mmadụ aka ka ha tụkwasị nkwa ya obi. Otú o si enyere ha aka bụ ime ka a na-ezi ha ozi ọma ga-azọ ha ndụ. Ozi ahụ bụ ‘ozi ọma alaeze’ Chineke, nke Jizọs kwuru na ‘a ga-ekwusa n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.’ (Mat. 24:14) Chineke ahaziela ndị na-efe ya ka ha nwee ike izisa ozi a si n’aka ya n’ihe dị ka narị mba abụọ na iri anọ. Jehova chọrọ ka ọtụtụ ndị rube isi ka ha nwee ike ịgbanahụ ikpe ya ziri ezi, nke ga-abịa ka “oké ifufe.”​—Zef. 1:​14, 15; 2:​2, 3.

N’ihi ya, ajụjụ dị mkpa abụghị ma Jehova ọ̀ ga-enyekwa ndị mmadụ oge ga-ezuru ha ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ihe ndị mere eme gosiri na ọ na-eme otú ahụ mgbe niile. Kama, ajụjụ dị mkpa bụ: Ndị mmadụ hà ga-emekwa ihe Chineke chọrọ ka ha mee mgbe oge ka dị? Ka anyị niile bụ́ ndị ozi Chineke na-enyere ọtụtụ ndị aka ịlafere ọgwụgwụ ụwa ochie a.