Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 42

Gịnị Ka Jehova Ga-eme Ka Ị Bụrụ?

Gịnị Ka Jehova Ga-eme Ka Ị Bụrụ?

“Ọ bụ Chineke na-arụ ọrụ n’ime unu . . . ka unu wee na-enwe ọchịchọ ma [nwee ike ime ihe].”​—FIL. 2:13.

ABỤ NKE 104 Chineke Na-enye Anyị Mmụọ Nsọ Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Jehova nwere ike ime iji mezuo ihe ọ chọrọ?

JEHOVA nwere ike ịbụ ihe ọ bụla ọ dị mkpa ka ọ bụrụ iji mezuo ihe ọ chọrọ. Dị ka ihe atụ, o nweela mgbe Jehova bụ Onye Ozizi, Onye Nkasi Obi, Onye Na-ezisa Ozi Ọma, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. (Aịza. 48:17; 2 Kọr. 7:6; Gal. 3:8) Ma, ọtụtụ mgbe, ọ na-eji ndị mmadụ emezu ihe ọ chọrọ. (Mat. 24:14; 28:​19, 20; 2 Kọr. 1:​3, 4) Jehova nwekwara ike inye onye ọ bụla n’ime anyị amamihe na ike ọ ga-eji bụrụ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo uche ya. Ihe a niile so n’ihe ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na aha Jehova nwere ike ịpụta.

2. (a) Gịnị nwere ike ime ka anyị chewe mgbe ụfọdụ ma Jehova ò jikwa anyị na-arụ ọrụ? (b) Olee ihe anyị ga-amụ n’isiokwu a?

2 Anyị niile chọrọ ịbara Jehova uru. Ma o nwere ike ịna-eme ụfọdụ ndị obi abụọ ma Jehova ò ji ha na-arụ ọrụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ na-adị ha ka afọ ole ha dị, otú ihe si dịrị ha, ma ọ bụ enweghị nkà ọ̀ na-eme ka ha ghara ime ihe niile ha chọrọ ime n’ozi Jehova. E nwekwara ndị na-eche na ha na-eme ihe niile ha kwesịrị ime n’ozi Jehova. N’ihi ya, o nweghị ihe ọzọ ha kwesịrị ime. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova nwere ike isi nyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ime ihe bụ́ uche ya. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú Jehova si mee ka ndị na-ejere ya ozi chọọ ime uche ya, nyekwa ha ike ime ya, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ihe ikpeazụ anyị ga-amụ bụ otú anyị nwere ike isi kwe ka Jehova jiri anyị na-eme uche ya.

OTÚ JEHOVA SI ENYERE ANYỊ AKA

3. N’ihi ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 2:​13, olee otú Jehova nwere ike isi mee ka anyị chọọ ime uche ya?

3 Gụọ Ndị Filipaị 2:13. * Jehova nwere ike ime ka anyị chọọ ime uche ya. Olee otú o nwere ike isi mee ya? O nwere ike ịbụ na anyị chọpụtara na e nwere mkpa n’ọgbakọ anyị ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na ndị okenye gụrụ akwụkwọ ozi alaka ụlọ ọrụ detara na a chọrọ ndị ga-aga nye aka n’ebe ọzọ. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee otú m nwere ike isi gaa nye aka?’ O nwekwara ike ịbụ na e nyere anyị ọrụ tara akpụ, anyị ana-eche ma ànyị ga-emeli ya. Ikekwe, anyị gụchara otu ebe na Baịbụl, chewe, sị: ‘Olee otú m nwere ike isi mee ihe a Baịbụl kwuru iji nyere ndị ọzọ aka?’ Jehova agaghị amanye anyị ime ihe ọ bụla. Ma, ọ bụrụ na ọ hụ na anyị na-eche ihe anyị ga-eme n’ozi ya, o nwere ike ime ka anyị chọọ ime ihe ahụ anyị na-eche gbasara ya.

4. Olee otú Jehova nwere ike isi nye anyị ike ime uche ya?

4 Jehova nwekwara ike inye anyị ike ime uche ya. (Aịza. 40:29) O nwere ike iji mmụọ nsọ ya mee ka anyị na-emekwu nke ọma na nkà anyị nwere. (Ọpụ. 35:​30-35) Jehova nwere ike iji nzukọ ya kụziere anyị otú anyị ga-esi rụọ ọrụ ụfọdụ. E nwee ọrụ ị na-amachaghị otú ị ga-esi rụọ ya, kwuo ka e nyere gị aka. Nna anyị nke eluigwe na-emesapụ aka. I nwere ike ịrịọ ya mgbe ọ bụla ka o nye gị “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Kọr. 4:7; Luk 11:13) Baịbụl kọrọ otú Jehova si nyere ọtụtụ ndị ohu ya ndị nwoke na ndị nwaanyị aka, ha achọọ ime uche ya, nyekwa ha ike ha ji mee ya. Ka anyị na-amụ gbasara ụfọdụ n’ime ha, gbalịa chee otú Jehova nwere ike isi jiri gị mee ụdị ihe ahụ ha mere.

IHE JEHOVA MERE KA ỤMỤ NWOKE BỤRỤ

5. Olee ihe anyị na-amụta n’otú Jehova si jiri Mozis napụta ndị ya na oge o ji mee ya?

5 Jehova mere ka Mozis bụụrụ ndị Izrel onye nzọpụta. Ma, olee mgbe Jehova ji ya rụọ ọrụ ahụ? Ọ̀ bụ mgbe “a kụziiri Mozis ihe n’amamihe niile nke ndị Ijipt,” ya echee na ya eruola eruo? (Ọrụ 7:​22-25) Mba. Ọ bụ mgbe Jehova nyechaara Mozis aka, ya abụrụ nwoke dị umeala n’obi ka o ji ya rụọ ọrụ. (Ọrụ 7:​30, 34-36) Jehova mere ka Mozis nwee obi ike ịga gwa eze kacha ike n’Ijipt okwu. (Ọpụ. 9:​13-19) Olee ihe anyị na-amụta n’otú Jehova si jiri Mozis rụọ ọrụ na oge o ji mee ya? Jehova na-eji ndị na-agbalị ime ka ya na ndị tụkwasịrị ya obi arụ ọrụ.​—Fil. 4:13.

6. Olee ihe anyị na-amụta n’otú Jehova si jiri Bazilaị nyere Eze Devid aka?

6 Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Jehova ji otu nwoke merela agadi aha ya bụ Bazilaị nyere Eze Devid aka. Mgbe Devid na ndị ya na ha so na-agbara Absalọm nwa ya ọsọ, ‘agụụ nọ na-agụ ha, ike agwụ ha, akpịrị ana-akpọkwa ha nkụ.’ Bazilaị na ndị ọzọ gbara mbọ nyere Devid na ndị ya na ha so aka n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ha. Bazilaị echeghị na ebe ọ bụ na ya emeela agadi, na e nweghịzi ihe Jehova ga-eji ya eme. Kama, o wepụtara ihe o nwere gbooro ndị Chineke mkpa ha. (2 Sam. 17:​27-29) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, Jehova nwere ike iji anyị gbooro ụmụnna anyị ihe siiri ike mkpa ha, ma ọ̀ bụ n’obodo anyị ma ọ̀ bụ n’obodo ọzọ. (Ilu 3:​27, 28; 19:17) Ọ bụrụgodị na anyị agaghị agali gbooro ha mkpa ha, anyị nwere ike inye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ ka e nwee ego a ga-eji gbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka n’ebe e nwere mkpa nakwa mgbe ọ dị mkpa.​—2 Kọr. 8:​14, 15; 9:11.

7. Gịnị ka Jehova ji Simiọn rụọ? Gịnịkwa mere ihe ahụ ga-eji gbaa anyị ume?

7 Simiọn bụ nwoke merela agadi na Jeruselem. O ji obi ya niile na-efe Jehova. Jehova kwere ya nkwa na ọ ga-adị ndụ hụ Mesaya. Ọ ga-abụrịrị na nkwa ahụ gbara Simiọn ume n’ihi na ọ tụọla anya Mesaya ọtụtụ afọ. Jehova gọziri ya maka otú o si nwee okwukwe ma tachie obi. Otu ụbọchị, “mmụọ nsọ mere ka ọ bata n’ụlọ nsọ.” N’ebe ahụ ka ọ hụrụ Jizọs mgbe e ku ya n’aka. Jehova sikwa n’ọnụ Simiọn buo amụma banyere nwatakịrị ahụ ga-emecha bụrụ Kraịst. (Luk 2:​25-35) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ na Simiọn anọghị ndụ hụ mgbe Jizọs jere ozi ya n’ụwa, obi dị ya ụtọ maka otú ahụ Chineke si jiri ya rụọ ọrụ. Ihe ọma Chineke ga-emere ya n’ọdịnihu ga-akadị nke ahụ. N’ụwa ọhụrụ, nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-ahụ otú ọchịchị Jizọs ga-esi mee ka ngọzi zooro ezinụlọ niile nke ụwa ka mmiri. (Jen. 22:18) Obi kwesịkwara ịdị anyị ụtọ maka ihe ọ bụla Jehova ji anyị rụọ n’ozi ya.

8. Olee otú Jehova nwere ike isi jiri anyị rụọ ụdị ọrụ ahụ o ji Banabas rụọ?

8 N’oge ndịozi Jizọs, otu nwoke na-emesapụ aka aha ya bụ Josef wepụtara onwe ya ka Jehova jiri ya rụọ ọrụ. (Ọrụ 4:​36, 37) O nwere ike ịbụ na ihe mere ndịozi ji kpọọ ya Banabas bụ na ịkasi ndị mmadụ obi doro ya anya. Banabas pụtara “Nwa Nkasi Obi.” Dị ka ihe atụ, mgbe Sọl chegharịrị, ụjọ ekweghị ọtụtụ ụmụnna bịa ya nso n’ihi na onye ọ bụla ma na ọ kpagburu ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma, Banabas nwoke obiọma bịara nyere Sọl aka. Ọ ga-abụrịrị na ihe ọma a o mere tọgburu Sọl atọgbu. (Ọrụ 9:​21, 26-28) Mgbe e mechara, ndị okenye nọ na Jeruselem chọpụtara na ha kwesịrị ịgba ụmụnna nọ n’Antiọk nke Siria ume. Ònye ka ha zigara? Ọ bụ Banabas. Onye a ha họtara dị mma. Baịbụl kwuru na Banabas ‘malitere ịgba ha niile ume ka ha jiri obi ha kpebisie ike ịnọgide n’ime Onyenwe anyị.’ (Ọrụ 11:​22-24) Otú ahụ ka ọ dị taa. Jehova nwere ike inyere anyị aka ịbụrụ ụmụnna anyị “nwa nkasi obi.” Dị ka ihe atụ, o nwere ike iji anyị kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi. O nwekwara ike ime ka anyị gaa leta onye ahụ́ na-adịghị ma ọ bụ onye ike ụwa gwụrụ ma ọ bụkwanụ kpọọ ya n’ekwentị gwa ya okwu ga-eme ka obi dị ya mma. Ị̀ ga-ekwe ka Jehova jiri gị rụọ ụdị ọrụ ahụ o ji Banabas rụọ?​—1 Tesa. 5:14.

9. Olee ihe anyị na-amụta n’otú Jehova si nyere nwanna Vasily aka ịbụ okenye aka siri ike n’ọgbakọ?

9 Jehova nyeere otu nwanna aha ya bụ Vasily aka ịbụ okenye aka siri ike n’ọgbakọ. Vasily dị iri afọ abụọ na isii mgbe e mere ya okenye n’ọgbakọ. Ụjọ nọ na-atụ ya na ya erughị eru inyere ndị ọgbakọ ha aka, karịchaa ndị nsogbu bịaara. Ma, ndị okenye bụ́ aka ochie kụziiri ya ihe baara ya uru. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze nyekwaara ya aka. Vasily gbalịsiri ike na-emekwu nke ọma. Dị ka ihe atụ, o depụtara obere ihe ndị o kpebiri ime. Nke ọ bụla o mepụrụ, obi ana-akakwu ya. Ugbu a, ọ sịrị: “Ihe na-atụbu m ụjọ na-emezi m ezigbo obi ụtọ. Mgbe ọ bụla Jehova nyeere m aka ịchọta amaokwu Baịbụl dabara adaba m ga-eji kasie nwanna obi, ọ na-eme m ezigbo obi ụtọ.” Ụmụnna nwoke, ọ bụrụ na unu ewepụta onwe unu otú ahụ Vasily mere ka Jehova jiri unu rụọ ọrụ, o nwere ike inye unu ike unu ga-eji rụkwuoro ya ọrụ n’ọgbakọ.

IHE JEHOVA MERE KA ỤMỤ NWAANYỊ BỤRỤ

10. Gịnị ka Abigel mere? Oleekwa ihe ị na-amụta n’àgwà ọma ya?

10 Eze Sọl nọ na-achụgharị Devid na ndị ya na ha so. Ha chọkwara enyemaka. Ha gara rịọ otu onye Izrel bụ́ aka ji akụ̀ aha ya bụ Nebal ka o nyetụ ha ihe oriri. Ihe mere ha ji rịọ ya ihe ahụ bụ na ha chebere ìgwè atụrụ ya n’ala ịkpa. Ma, Nebal dị aka ntagide. O kweghị enye ha ihe ọ bụla. Ezigbo iwe bịara Devid, ya ekpebie ịga gbuo Nebal na ụmụ nwoke niile nọ n’ụlọ ya. (1 Sam. 25:​3-13, 22) Ma, ọmarịcha nwunye Nebal bụ́ Abigel nwere uche. Ọ katara obi gaa daa n’ụkwụ Devid, rịọ ya ka ọ ghara ịga gbuo Nebal na ndị ezinụlọ ya ma mee ka ọbara ha dị ya n’isi. O ji akọ gwa Devid ka ọ hapụrụ Jehova okwu ahụ. Okwu ahụ Abigel ji olu ọma kwuo na otú o si gosi na o nwere uche metụrụ Devid n’obi, ya aghọta na ọ bụ Jehova zitere nwaanyị ahụ. (1 Sam. 25:​23-28, 32-34) Abigel mụtara àgwà ndị mere ka Jehova jiri ya rụọ ọrụ. Otú ahụkwa ka ọ dị ụmụnna nwaanyị taa. Ọ bụrụ na ha amụta ịdị akọ ma nwee nghọta, Jehova nwere ike iji ha mee ka okwukwe ndị ezinụlọ ha na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ha sie ike.​—Ilu 24:3; Taị. 2:​3-5.

11. Gịnị ka ụmụ Shalọm ndị nwaanyị mere? Oleekwa ndị na-eme ka ha n’oge anyị a?

11 Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, ụmụ Shalọm ndị nwaanyị so ná ndị Jehova ji rụzie mgbidi Jeruselem. (Nehe. 2:20; 3:12) N’agbanyeghị na nna ha so ná ndị isi, ha ji obi ha niile soro rụọ ọrụ ahụ siri ike, nke nwekwara ike imerụ mmadụ ahụ́. (Nehe. 4:​15-18) Ha emeghị ka ndị ukwu bụ́ ndị Tekoa, ndị ‘na-ewedaghị onwe ha ala ịrụ ọrụ’ ahụ. (Nehe. 3:5) Chegodị otú ọṅụ si ju ụmụ Shalọm ndị ahụ obi mgbe ha hụrụ na e ji naanị ụbọchị iri ise na abụọ rụchaa ọrụ ahụ. (Nehe. 6:15) N’oge anyị a, ụmụnna nwaanyị na-eji obi ụtọ enye aka n’ịrụ ọrụ pụrụ iche ná nzukọ Jehova, ya bụ, iso na-arụ ma na-elekọta ebe ndị a na-anọ efe Jehova. Nkà ha, otú ha si anụ ọkụ n’obi, na otú ha si erubere Jehova isi na-eme ka ọrụ ahụ na-aga nke ọma.

12. Olee otú Jehova nwere ike isi jiri anyị rụọ ọrụ otú ahụ o si jiri Tabita rụọ ọrụ?

12 Jehova mere ka Tabita na-arụ “ezi ọrụ,” na-enyekwa “onyinye ebere.” Ndị ọ kacha emere ya bụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ. (Ọrụ 9:36) N’ihi otú o si emesapụ aka ma dị obiọma, ọtụtụ ndị ruuru ya uju mgbe ọ nwụrụ. Ma, ọnụ ọchị ekweghị ha fụnwuo ọkụ mgbe Pita onyeozi kpọlitere ya n’ọnwụ. (Ọrụ 9:​39-41) Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Tabita? Ma ànyị bụ ndị na-eto eto, ndị agadi, ndị nwoke ma ọ̀ bụ ndị nwaanyị, e nwere ihe anyị niile nwere ike ime iji nyere ụmụnna anyị aka.​—Hib. 13:16.

13. Olee otú Jehova si jiri otú nwanna nwaanyị aha ya bụ Ruth rụọ ọrụ n’agbanyeghị na ọ bụ onye ihere? Gịnịkwa ka o kwuru?

13 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ruth bụ onye ihere. Ọ chọrọ ịbụ onye ozi ala ọzọ. Mgbe ọ ka dị obere, ọ na-eji ịnụ ọkụ n’obi aga n’ụlọ n’ụlọ, na-ekesa traktị. O kwuru, sị: “Ọrụ ahụ tọgburu m atọgbu.” Ma, ịga na-agwa ndị ọzọ gbasara Alaeze Chineke n’ụlọ n’ụlọ siiri ya ike. N’agbanyeghị na ọ bụ onye ihere, ọ malitere ịsụ ụzọ mgbe ọ dị afọ iri na asatọ. N’afọ 1946, ọ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied, mechaakwa jee ozi na Hawaị na Japan. Jehova ji ya kwusasie ozi ọma ike n’obodo ndị ahụ. Mgbe Ruth kwusarala ozi ọma ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri asatọ, o kwuru, sị: “Jehova na-enyere m aka mgbe niile. O nyerela m aka ịkwụsị ime ihere. Ekwetasiri m ike na Jehova nwere ike iji onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi rụọ ọrụ.”

KWE KA JEHOVA JIRI GỊ RỤỌ ỌRỤ

14. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 1:​29, olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova jiri anyị rụọ ọrụ?

14 Kemgbe ụwa, Jehova na-eme ka ndị na-efe ya rụọ ọtụtụ ọrụ dị iche iche. Gịnị ka ọ ga-eji gị rụọ? Ọ ga-esi n’otú i si dị njikere ịrụsi ọrụ ike. (Gụọ Ndị Kọlọsi 1:29.) Ọ bụrụ na i wepụta onwe gị, Jehova nwere ike ime ka ị bụrụ onye na-ekwusasi ozi ọma ike, onye na-akụzi ihe nke ọma, onye na-akasi ndị ọzọ obi nke ọma, onye nwere nkà, ezigbo enyi, ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla ọzọ dị mkpa iji mezuo uche ya.

15. Dị ka e kwuru na 1 Timoti 4:​12, 15, gịnị ka ụmụnna nwoke na-eto eto kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nyere ha aka ime?

15 Oleekwanụ gbasara ụmụnna ndị nwoke fọrọ obere ka ha toruo ihe e ji nwoke eme? A chọkwuru ụmụ nwoke gbasiri ike ga-abụ ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. N’ọtụtụ ọgbakọ, ndị okenye e nwere karịrị ndị ohu na-eje ozi. Ụmụnna ndị nwoke na-eto eto, ùnu nwere ike ịgbakwu mbọ ka unu ruo eruo ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ? Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ụmụnna nwoke na-ekwu, sị: “Ọ kaara m mma ịbụ naanị onye nkwusa.” Ọ bụrụ na ọ bụ ihe ị na-eche, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ọ na-agụ gị agụụ ịchọ ka i ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi, nyekwa gị ike ịrụ ihe niile i nwere ike ịrụ n’ozi ya. (Ekli. 12:1) Anyị chọrọ ka unu nye aka n’ọgbakọ.​—Gụọ 1 Timoti 4:​12, 15.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o meere anyị? N’ihi gịnịkwa?

16 Jehova nwere ike ime ka ị bụrụ ihe ọ bụla ọ chọrọ iji mee uche ya. N’ihi ya, rịọ ya ka o mee ka ị chọọ ịrụrụ ya ọrụ, rịọkwa ya ka o nye gị ike ị ga-eji rụọ ya. Ma ị̀ bụ onye na-eto eto ma ị̀ bụ agadi, jiri oge gị, ike gị, na ihe ndị ọzọ i nwere mee ka e too Jehova ugbu a. (Ekli. 9:10) Ekwela ka ụjọ ma ọ bụ iche na o nweghị ihe ị dị mma ya mee ka ị ghara ịrụ ọrụ e nyere gị n’ọgbakọ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Nna anyị nke eluigwe na-ekwe ka anyị mee ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji nye ya otuto kwesịịrị ya.

ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ

^ par. 5 Ọ̀ na-adị gị ka ya bụrụ na ị ga-enwe ike ijekwuru Jehova ozi? Ị̀ na-eche ma ị̀ ka baara Jehova uru? Ka ị̀ na-eche na ọ dịghị mkpa ka i wepụta onwe gị jekwuoro Jehova ozi otú ọ bụla ọ chọrọ? Isiokwu a ga-akọwa ụzọ dị iche iche Jehova nwere ike isi mee ka ị chọọ ịbụ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo uche ya, nyekwa gị ike ime ya.

^ par. 3 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs ka Pọl degaara akwụkwọ ozi ahụ, e nwere ike ikwu na ọ gbasakwara ndị niile na-efe Jehova.