Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 41

Na-erubere Chineke Isi n’Oge “Oké Mkpagbu”

Na-erubere Chineke Isi n’Oge “Oké Mkpagbu”

“Hụnụ Jehova n’anya, unu niile ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ. Jehova na-echebe ndị kwesịrị ntụkwasị obi.”​—ỌMA 31:23.

ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Olee ihe ndị ọchịchị ụwa ga-ama ọkwa ya n’oge na-adịghị anya? (b) Olee ajụjụ ndị e kwesịrị ịza?

WERE ya na ọ dịbeghị anya ndị ọchịchị ụwa machara ọkwa ahụ Baịbụl buru amụma na ha ga-ama, na e nweela “udo na obi iru ala.” Ha nwere ike na-etu ọnụ na e nwetụbeghị mgbe e nwere udo dị otú ahụ n’ụwa, ha ana-achọkwa ka anyị kweta na ha ga-akwụsịli nsogbu niile e nwere n’ụwa. Ma, o nweghị otú ha ga-esi kwụsị ihe na-aga ime. N’ihi gịnị? Dị ka Baịbụl kwuru, “mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya; . . . ha agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.”​—1 Tesa. 5:3.

2 Ajụjụ ndị dị mkpa e kwesịrị ịza bụ: Gịnị ga-eme n’oge “oké mkpagbu” ahụ? Gịnị ka Jehova ga-achọ ka anyị mee n’oge ahụ? Oleekwa otú anyị nwere ike isi jikere ugbu a ka anyị nwee ike ịna-erubere Chineke isi n’oge ahụ?​—Mat. 24:21.

OLEE IHE GA-EME N’OGE “OKÉ MKPAGBU” AHỤ?

3. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 17:​5, 15-18, olee otú Chineke ga-esi bibie “Babịlọn Ukwu” ahụ?

3 Gụọ Mkpughe 17:​5, 15-18. A ga-ebibi “Babịlọn Ukwu” ahụ. Dị ka anyị kwuru ná mbido, o nweghị otú ndị ọchịchị ụwa ga-esi kwụsị ihe na-aga ime mgbe ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ‘Chineke ga-etinye ya n’obi ha imezu echiche ya.’ Gịnị bụ echiche ya ahụ? Ọ bụ ibibi okpukpe ụgha niile dị n’ụwa, ma Krisendọm. * Chineke ga-etinye echiche ya n’obi “mpi iri” nke ‘anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie.’ Mpi iri ahụ nọchiri anya ọchịchị niile na-akwado “anụ ọhịa” ahụ bụ́ Òtù Mba Ụwa. (Mkpu. 17:​3, 11-13; 18:8) Mgbe ndị ọchịchị ụwa ga-alụso okpukpe ụgha ọgụ, ọ pụtara na oké mkpagbu ahụ ebidola. Ọ ga-eme na mberede, meekwa ka ụwa maa jijiji.

4. (a) Olee ihe ndị ọchịchị ụwa nwere ike ịsị na ọ bụ ya mere ha ji lụso okpukpe ụgha ọgụ? (b) Olee ihe ndị nọbu n’okpukpe ndị ahụ nwere ike ime?

4 Anyị amaghị ihe ndị ọchịchị ụwa ga-asị na ọ bụ ya mere ha ji lụso Babịlọn Ukwu ahụ ọgụ. Ha nwere ike ikwu na okpukpe ndị dị n’ụwa na-eme ka udo ghara ịdị, na-agbalịkwa mgbe niile ịgwa ndị ọchịchị ihe ha ga-eme. Ha nwekwara ike ịsị na akụ̀ okpukpe ndị ahụ kpatara akarịala. (Mkpu. 18:​3, 7) Mgbe ahụ ndị ọchịchị ụwa ga-alụso okpukpe ụgha ọgụ, mkpa ha nwere ike ịbụ ibibi okpukpe ndị ahụ, ọ bụghị igbu ndị niile nọ n’ime ha. Ozugbo e bibichara okpukpe ụgha, ndị nọbu na ha ga-amata na ndị isi ha agharịpụla ha. Ha nwekwara ike ikwu na o nweghịzi ihe jikọrọ ha na okpukpe ndị ahụ.

5. Olee nkwa Jehova kwere gbasara oké mkpagbu ahụ? Maka gịnị?

5 Baịbụl ekwughị ụbọchị ole a ga-eji bibie Babịlọn Ukwu ahụ. Ma, anyị ma na oge a ga-eji mee ya agaghị ebucha ibu. (Mkpu. 18:​10, 21) Jehova kwere nkwa na ọ ga-eme ka oge oké mkpagbu ahụ “dị mkpirikpi” ka e nwee ike ichebe “ndị a họọrọ” nakwa ezigbo okpukpe. (Mak 13:​19, 20) Oké mkpagbu ahụ malite, oleekwanụ ihe Jehova ga-achọ ka anyị na-eme tupu agha Amagedọn ebido?

AKWỤSỊLA IFE JEHOVA OTÚ Ọ CHỌRỌ

6. E wezụga isepụ aka n’okpukpe ụgha, olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime?

6 Dị ka e kwuru ná mbido isiokwu a, Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya sepụ aka na Babịlọn Ukwu ahụ. Ma, ihe anyị ga-eme abụghị naanị isepụ aka n’okpukpe ụgha. Anyị kwesịrị ikpebisi ike na anyị ga na-akwado ezigbo okpukpe, ya bụ, ofufe Jehova nke dị ọcha. Ka anyị leba anya n’ụzọ abụọ anyị ga-esi eme ya.

Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịga ọmụmụ ihe, ma mgbe ihe siri ezigbo ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. (a) Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ihe Jehova gwara anyị gbasara omume ọma? (b) Olee otú Ndị Hibru 10:​24, 25 si mee ka anyị ghọta na ọmụmụ ihe dị ezigbo mkpa, karịchaa ugbu a?

7 Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ịna-eme ihe niile Jehova gwara anyị gbasara omume ọma. Anyị ekwesịghị ịnabata omume rụrụ arụ ndị ụwa na-eme. Dị ka ihe atụ, anyị agaghị anabata omume rụrụ arụ n’ụdị ya ọ bụla, ma mmadụ ịlụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ma ụdị omume rụrụ arụ ndị ọzọ ndị na-eme otú ahụ na-eme. (Mat. 19:​4, 5; Rom 1:​26, 27) Nke abụọ bụ na anyị kwesịrị ịna-eso ụmụnna anyị efe Jehova. Anyị ga na-eme ya n’ebe ọ bụla anyị ga-emeli ya, ma ọ̀ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ụlọ nwanna, ma ọ bụdị na nzuzo. Ihe ọ sọkwara ya mee, anyị agaghị akwụsị ịga ọmụmụ ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị ịna-aga ọmụmụ ihe, “na-emekwa otú ahụ karị, ka [anyị] na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”​—Gụọ Ndị Hibru 10:​24, 25.

8. Olee otú ozi anyị ga na-ezi nwere ike isi gbanwee?

8 N’oge oké mkpagbu ahụ, ozi anyị na-ekwusa nwere ike ịgbanwe. Ihe anyị na-ezi ndị mmadụ ugbu a bụ ozi ọma Alaeze Chineke, na-agbalịkwa ime ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma n’oge ahụ, anyị nwere ike iziwe ndị mmadụ ozi ga na-agba ha agba, nke ga-adị ha ka akụ́ mmiri ígwé ọ̀ na-ada ha. (Mkpu. 16:21) Anyị nwere ike ịna-agwa ndị mmadụ na a ga-ebibi ụwa Setan n’oge na-adịghị anya. Ka oge na-aga, anyị ga-amata ihe anyị ga na-ezi na otú anyị ga-esi na-ezi ya. Ànyị ga na-ezi ozi ahụ otú anyị si ezi ozi ọma kemgbe ihe karịrị otu narị afọ? Ka è nwere otú ọzọ anyị ga-esi na-ezi ya? Anyị amabeghị. Nke ọ bụla ọ bụ, o yiri ka ihe anyị ga-eme mgbe ahụ ọ̀ bụ ikwusa ikpe Jehova n’atụghị ụjọ.​—Ezik. 2:​3-5.

9. Gịnị ka ndị ọchịchị ụwa nwere ike ime n’ihi ozi anyị ga na-ezi? Ma, gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike maka ya?

9 O nwere ike ịbụ na ozi ahụ anyị ga na-ezi ga-eme ka ndị ọchịchị ụwa gbalịwa imemila anyị kpamkpam. Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi mgbe ahụ otú ahụ anyị na-atụkwasị ya obi n’ozi ọma anyị na-ekwusa ugbu a. Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-enye anyị ike anyị ga-eji mee uche ya.​—Maị. 3:8.

JIKERE MAKA ỌGỤ A GA-ALỤSO NDỊ CHINEKE

10. Dị ka e buru n’amụma na Luk 21:​25-28, gịnị ka ọtụtụ ndị ga-eme n’ihi ihe ga-eme n’oge oké mkpagbu ahụ?

10 Gụọ Luk 21:​25-28. N’oge oké mkpagbu ahụ, ndị mmadụ ga-akụja mgbe ha ga-ahụ na ihe niile ha tụkwasịrị obi alawala n’iyi. Ha ga-anọ ná “nhụjuanya,” obi ekorokwa ha n’elu na a ga-egbu ha n’oge ahụ kacha njọ e nwetụrụla n’ụwa. (Zef. 1:​14, 15) N’oge ahụ, ihe nwedịrị ike isikwuru ndị Jehova ike. Ebe ọ bụ na anyị abụghị nke ụwa Setan, ihe ụfọdụ nwere ike isiri anyị ike. O nwere ike ịpụta na anyị agaghị enwe ihe ụfọdụ dị anyị mkpa.

11. (a) E bibichaa okpukpe ụgha, gịnị mere ndị ọchịchị ụwa ga-eji lekwasị Ndịàmà Jehova anya? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ oké mkpagbu ahụ egwu?

11 O nwere mgbe ọ ga-eru, ndị ahụ e bibiri okpukpe ha ewewe iwe maka na Ndịàmà Jehova ka nọkwa na-ekpe okpukpe ha. Chegodị otú ha ga-esi na-eme ka ndị ọzọ mara na ezigbo iwe ji ha, na-emekwa ya ma n’Ịntanet. Mba dị iche iche na Setan bụ́ onye na-achị ha ga-akpọ anyị asị maka na ọ bụ naanị okpukpe anyị fọrọ. Ọ ga-apụta na ha emelighị ihe ha bu n’obi, nke bụ́ ibibi okpukpe niile dị n’ụwa. N’ihi ya, anya ha ga-adịzi n’ebe anyị nọ. Ọ bụ n’oge ahụ ka mba dị iche iche ga-aghọ Gọg nke Megọg. * Ha ga-agbakọ aka jiri ike ha niile lụso ndị Jehova ọgụ. (Ezik. 38:​2, 14-16) Anyị chewe ihe nwere ike ime n’oké mkpagbu ahụ, o nwere ike ime ka anyị chịrị obi n’aka, nke ka nke, ebe ọ bụ na anyị amabeghị ihe niile ga-eme mgbe ahụ. Ma, otu ihe doro anyị anya bụ na anyị ekwesịghị ịtụ oké mkpagbu ahụ egwu. Jehova ga-agwa anyị otú a ga-esi chebe anyị. (Ọma 34:19) Anyị ga-enwe ike ‘iguzo kwem ma welie isi anyị elu,’ n’ihi na anyị ma na ‘nnapụta anyị na-eru nso.’ *

12. Olee otú “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” si na-akwadebe anyị maka ihe ga-eme n’ọdịnihu?

12 “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-akwadebe anyị ka anyị nwee ike irubere Chineke isi ma gafee oké mkpagbu ahụ. (Mat. 24:45) E nwere ọtụtụ ụzọ o sirila na-eme ya. Ma, chegodị gbasara otu n’ime ha, ya bụ, ihe omume mgbakọ ukwu anyị malite n’afọ 2016 ruo 2018. E ji ya gbaa anyị ume ịmatakwu àgwà ndị ga-abara anyị uru ka ụbọchị Jehova na-eru nso. Ka anyị leruo àgwà ndị ahụ anya ná nkenke.

NA-AMỤTAKWU IGUZOSI IKE N’EBE JEHOVA NỌ, NTACHI OBI, NA OBI IKE

Kwadebe ugbu a maka ịlafere “oké mkpagbu ahụ” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 16) *

13. Olee otú anyị ga-esi mụtakwuo iguzosi ike n’ebe Jehova nọ? Gịnịkwa mere anyị ji kwesị ime otú ahụ ugbu a?

13 Iguzosi Ike n’Ebe Chineke Nọ: Isiokwu mgbakọ ukwu nke afọ 2016 bụ “Guzosie Ike n’Ebe Jehova Nọ.” Ihe omume mgbakọ ahụ kụziiri anyị na ihe ga-enyere anyị aka iguzosi ike n’ebe Jehova nọ bụ anyị na ya ịdị n’ezigbo mma. O chetaara anyị na otú anyị ga-esi bịaruo Jehova nso bụ ịna-ekpe ekpere si anyị n’obi na ịna-amụsi Okwu Chineke ike. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe ike imeri nsogbu ọ bụla bịaara anyị ọ bụrụgodị nke siri ezigbo ike. Ka ụwa Setan na-agbazi egwú ụla, anyị kwesịrị ịtụ anya na a ga-enwekwu ihe ndị ga-eme ka a mata ma ànyị ji obi anyị niile na-akwado Chineke na Alaeze ya. O nwere ike ndị mmadụ agaghị akwụsị ịkwa anyị emo. (2 Pita 3:​3, 4) Ụdị ihe ahụ nwere ike ime karịchaa n’ihi na o nweghị ndị anyị na-akwado n’ụwa Setan. Anyị kwesịrị ịmụtakwu iguzosi ike n’ebe Jehova nọ ugbu a ka anyị nwee ike ime otú ahụ n’oké mkpagbu ahụ.

14. (a) Olee ihe ga-agbanwe n’ihe gbasara ndị Jehova ji eduzi ndị ya n’ụwa? (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwado ha mgbe ahụ?

14 N’oké mkpagbu ahụ, a ga-agbanwe ndị Jehova ji na-eduzi ndị ya n’ụwa. O nwere mgbe ọ ga-eru, a chịkọta ndị niile e tere mmanụ ka fọrọ n’ụwa, ha agaa eluigwe ka ha nwee ike soro lụọ agha Amagedọn. (Mat. 24:31; Mkpu. 2:​26, 27) Ọ pụtara na Òtù Na-achị Isi agaghịzi eso anyị nọrọ n’ụwa a. Ma, oké ìgwè mmadụ ahụ ka ga-abụ ndị a haziri ahazi. Ụmụnna ruru eru so n’atụrụ ọzọ ga na-eduzi ndị Chineke. Anyị kwesịrị igosi na anyị na-akwado Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-akwado ụmụnna ndị ahụ ma na-eme ihe ha gwara anyị Chineke chọrọ ka anyị mee. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-alafere.

15. Olee otú anyị ga-esi mụtakwuo ịtachi obi? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị mee otú ahụ ugbu a?

15 Ntachi Obi: Isiokwu mgbakọ ukwu afọ 2017 bụ “Adala Mbà.” Ihe omume mgbakọ ahụ nyeere anyị aka ịmụtakwu otú anyị ga-esi na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị. Anyị mụtara na ihe na-eme ka anyị tachie obi abụghị na ihe dịịrị anyị mma, kama ọ bụ ịtụkwasị Jehova obi. (Rom 12:12) Ka anyị ghara ichefu nkwa Jizọs kwere anyị. Ọ sịrị: “Ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.” (Mat. 24:13) Nkwa a o kwere pụtara na anyị kwesịrị ịtachi obi n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Anyị die nsogbu ọ bụla bịaara anyị ugbu a, okwukwe anyị ga-esikwu ike tupu oké mkpagbu ahụ ebido.

16. Olee ihe na-eme ka anyị nwee obi ike? Oleekwa otú anyị nwere ike isi mụta inwe obi ike ugbu a?

16 Obi Ike: Isiokwu mgbakọ ukwu nke afọ 2018 bụ “Nwee Obi Ike.” Ihe omume mgbakọ ahụ chetaara anyị na ọ bụghị ịtụkwasị onwe anyị obi na-eme ka anyị nwee obi ike. Ọ bụ ịtụkwasị Jehova obi na-eme ka anyị nwee ezigbo obi ike, otú ahụ ọ na-emekwa ka anyị tachie obi. Olee otú anyị ga-esi mụta ịtụkwasịkwu Jehova obi? Ọ bụ ịna-agụ Okwu ya kwa ụbọchị na ịna-atụgharị uche n’otú Jehova si chebe ndị ya n’oge gara aga. (Ọma 68:20; 2 Pita 2:9) Mgbe mba dị iche iche ga-alụso anyị ọgụ n’oké mkpagbu ahụ, anyị kwesịrị inwe obi ike ma tụkwasị Jehova obi karịa otú anyị metụrụla. (Ọma 112:​7, 8; Hib. 13:6) Anyị tụkwasị Jehova obi ugbu a, anyị ga-enwe obi ike anyị kwesịrị inwe mgbe Gọg ga-alụso anyị ọgụ. *

NA-ATỤSI ANYA NNAPỤTA IKE

N’oge na-adịghị anya, Jizọs na ndị agha ya nke eluigwe ga-agbara ịnyịnya bịa ịlụ agha Amagedọn ka ha bibie ndị iro Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ Amagedọn? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

17 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ọtụtụ n’ime anyị bi n’oge ikpeazụ a kemgbe a mụrụ anyị. Ma, anyị nwekwara olileanya ịdị ndụ gafee oké mkpagbu na-abịanụ. Ọ bụ agha Amagedọn ga-apịachi ọgwụgwụ ụwa ochie a. Ma, anyị ekwesịghị ịtụ egwu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ Chineke ga-alụ agha ahụ. (Ilu 1:33; Ezik. 38:​18-20; Zek. 14:3) Jehova ga-agwa Jizọs mgbe ọ ga-edu ndị agha ya bido agha ahụ. Ndị ga-eso ya bụ ndị e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ na ìgwè ndị mmụọ ozi. Ha ga-agbakọ aka lụso Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na ndị òtù ha nọ n’ụwa agha.​—Dan. 12:1; Mkpu. 6:2; 17:14.

18. (a) Olee nkwa Jehova kwere anyị? (b) Olee otú Mkpughe 7:​9, 13-17 si eme ka obi sie gị ike ma i cheta ihe ga-eme n’ọdịnihu?

18 Jehova kwere anyị nkwa, sị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.” (Aịza. 54:17) “Oké ìgwè mmadụ” ndị ji obi ha niile na-efe Jehova ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta’ ná ndụ. Ha ga na-ejekwara ya ozi dị nsọ. (Gụọ Mkpughe 7:​9, 13-17.) Ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu na-eme ka obi sie anyị ezigbo ike. Anyị ma na “Jehova na-echebe ndị kwesịrị ntụkwasị obi.” (Ọma 31:23) Obi ga-adị ndị niile hụrụ Jehova n’anya ma na-eto ya ụtọ ịhụ mgbe ọ ga-eme ka a kwụsị ịta aha nsọ ya ụta.​—Ezik. 38:23.

19. Olee ihe magburu onwe ya anyị na-atụ anya ya n’oge na-adịghị anya?

19 Chegodị otú e nwere ike isi dee 2 Timoti 3:​2-5 ma e jiri ya na-akọwa ndị bi n’ụwa ọhụrụ mgbe Setan na-agaghịzi na-akpa ike. (Gụọ igbe bụ́ “ Àgwà Ndị Mmadụ Ga Na-akpa Mgbe Ahụ.”) Otú Nwanna George Gangas, * onye sobu n’Òtù Na-achị Isi, si kọwaa ya bụ: “Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe mmadụ niile ga-abụ ndị na-efe Jehova. N’oge na-adịghị anya, ị ga-enwe ike ibi n’ụwa ọhụrụ. Ị ga-adịrị ndụ na-aga ka Jehova. Anyị ga-adị ndụ ebighị ebi.” Ọ bụ olileanya magburu onwe ya.

ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm

^ par. 5 Anyị ma na a ga-enwe “oké mkpagbu” n’ụwa n’oge na-adịghị anya. Olee otú ihe ga-adịrị ndị Chineke n’oge ahụ? Gịnị ka Jehova ga-achọ ka anyị na-eme mgbe ahụ? Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịna-erubere Chineke isi mgbe ahụ? Anyị ga-amata azịza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

^ par. 3 NKỌWAKWU: Krisendọm bụ okpukpe ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst, ma ha anaghị akụziri ndị mmadụ ka ha fee Jehova otú ọ chọrọ.

^ par. 11 NKỌWAKWU: Okwu ahụ bụ́ Gọg nke Megọg (na aha mkpọbiri ya bụ́ Gọg) pụtara ọtụtụ mba ndị ga-agbakọ aka bịa ịlụso ndị na-efe Chineke ọgụ n’oge oké mkpagbu ahụ.

^ par. 11 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru ihe niile ga-eme tupu agha Amagedọn, gụọ isi nke 21 n’akwụkwọ Alaeze Chineke Amalitela Ịchị! Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru ihe gbasara ọgụ ahụ Gọg nke Megọg ga-alụso ndị Chineke na otú Jehova ga-esi chebe ndị ya n’Amagedọn, gụọ isi nke 17 na nke 18 n’akwụkwọ Pure Worship of Jehovah​—Restored At Last!

^ par. 16 Ihe omume mgbakọ ukwu nke afọ 2019 isiokwu ya bụ “Ịhụnanya Adịghị Ada Ada” ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-echebe anyị n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ.​—1 Kọr. 13:8.

^ par. 19 Gụọ isiokwu bụ́ “Ọrụ Ya Nile Na-eso Ya.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Disemba 1, 1994.

^ par. 65 NKỌWA FOTO: Ebe Ndịàmà Jehova ole na ole gbakọtara n’ọhịa na-enwe ọmụmụ ihe ọgbakọ n’oge oké mkpagbu ahụ.

^ par. 67 NKỌWA FOTO: Oké ìgwè mmadụ ji obi ha niile na-efe Jehova ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta ná ndụ, na-enwekwa obi ụtọ.