Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 44

Ụmụ Gị Hà Ga-efe Jehova Ma Ha Tolite?

Ụmụ Gị Hà Ga-efe Jehova Ma Ha Tolite?

“Jizọs nọkwa na-eto, na-enwekwu amamihe na ihu ọma Chineke na nke ndị mmadụ.”—LUK 2:52.

ABỤ NKE 134 Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee mkpebi kacha mma mmadụ nwere ike ime?

ỌTỤTỤ mgbe, mkpebi ndị nne na nna mere na-emetụta ụmụ ha ruo ogologo oge. Ọ bụrụ na ha emee mkpebi na-adịghị mma, ọ ga-akpatara ụmụ ha nsogbu. Ha meekwanụ mkpebi dị mma, ọ ga-enyere ụmụ ha aka ibi ezigbo ndụ ma na-enwe obi ụtọ. Ma, ụmụ kwesịkwara ime mkpebi dị mma. Mkpebi kacha mma mmadụ nwere ike ime bụ ife Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova.—Ọma 73:28.

2. Olee mkpebi dị mma Jizọs na nne na nna ya mere?

2 Nne na nna Jizọs kpebisiri ike na ha ga-enyere ụmụ ha aka ife Jehova. Mkpebi ndị ha mere gosikwara na ife Jehova bụ ihe kacha ha mkpa ná ndụ. (Luk 2:40, 41, 52) Jizọs mekwara mkpebi ndị nyeere ya aka imezu ihe Jehova bu n’obi zite ya. (Mat. 4:1-10) Jizọs toro bụrụ nwoke dị obiọma, na-erube isi ma nwee obi ike. N’eziokwu, ọ bụ ụdị onye nne na nna ọ bụla na-efe Chineke ga-achọ ka ọ bụrụ nwa ha.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Olee mkpebi ndị dị mma Jehova mere gbasara Jizọs? Olee ihe ndị nne na nna ga-amụta ná mkpebi nne na nna Jizọs mere? Oleekwa ihe ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst ga-amụta ná mkpebi ndị Jizọs mere?

MỤTA IHE N’AKA JEHOVA

4. Olee ezigbo mkpebi Jehova mere banyere Ọkpara ya?

4 Jehova họọrọ di na nwunye e ji ama atụ ka ọ bụrụ ha ga-amụ Jizọs. (Mat. 1:18-23; Luk 1:26-38) Ihe ndị e dere na Baịbụl Meri ji obi ya niile kwuo gosiri na ọ hụrụ Jehova na Okwu ya n’anya. (Luk 1:46-55) Ihe Josef mere mgbe Jehova gwara ya ihe ọ ga-eme gosikwara na ọ na-atụ egwu Chineke, na-emekwa uche ya.—Mat. 1:24.

5-6. Olee nsogbu ndị Jehova hapụrụ ka ha bịara Ọkpara ya?

5 Ị̀ chọpụtara na Jehova ahọrọghị ndị bara ọgaranya ka ha bụrụ nne na nna Jizọs? Ihe Josef na Meri ji chụọ àjà mgbe a mụchara Jizọs gosiri na ha dara ogbenye. (Luk 2:24) O nwere ike ịbụ na Josef nwere ntakịrị ebe ọ na-anọ arụ ọrụ ịkwa nkà n’akụkụ ebe ha bi na Nazaret. Ọ ga-abụrịrị na ha mere ka ndụ ha dị mfe, karịchaa mgbe ha bịara mụọ ihe ruru ụmụ asaa.—Mat. 13:55, 56.

6 Jehova chebere Jizọs ka ọ ghara ịdaba ná nsogbu ụfọdụ. Ma, o chebeghị ya ka nsogbu ghara ịbịara ya chaa chaa. (Mat. 2:13-15) Dị ka ihe atụ, ndị ikwu ya ụfọdụ anaghị efe Chineke. Chegodị otú o si wute Jizọs na ụfọdụ ndị ezinụlọ ya ekwetaghị na ọ bụ ya bụ Mesaya ná mmalite. (Mak 3:21; Jọn 7:5) Ọ ga-abụkwa na nna Jizọs bụ́ Josef nwụrụ, Jizọs eruo uju ya. O nwere ike ịbụ na ihe a mere ka Jizọs bụ́ diọkpara rụwazie ọrụ ịkwa nkà ahụ e ji mara ezinụlọ ha. (Mak 6:3) Ka Jizọs na-etolite, ọ ghọtakwara na ọ bụ ya kwesịrị ịna-elekọta ezinụlọ ha. Ọ ga-abụrịrị na ọ rụsiri ọrụ ike iji lekọta ha. N’ihi ya, Jizọs maara otú ọ na-adị mmadụ ma onye ahụ rụchaa ọrụ n’ụbọchị, ike agwụ ya.

Ndị nne na nna, na-azụnụ ụmụ unu ka ha mụta ịna-eji Okwu Chineke achọpụta ihe ha ga-eme ma nsogbu bịara ha n’ọdịnihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. (a) Olee ajụjụ ndị ga-enyere ndị di na nwunye aka ịzụ ịmụ ha? (b) Olee otú Ilu 2:1-6 ga-esi enyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha?

7 Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, ya abụrụkwa na unu chọrọ ịmụ ụmụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ànyị bụ di na nwunye dị umeala n’obi ma jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe, ndị Jehova ga-achọ ka ha lekọta nwa ọhụrụ?’ (Ọma 127:3, 4) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-akụziri ụmụ m ịrụsi ọrụ ike?’ (Ekli. 3:12, 13) ‘M̀ na-echebe ụmụ m ka ha ghara ịdaba ná nsogbu ma ọ bụ n’omume rụrụ arụ juru n’ụwa Setan a?’ (Ilu 22:3) Ị gaghị echebeli ụmụ gị ka nsogbu ghara ịbịara ha chaa chaa. Ma, i nwere ike iji nwayọọ nwayọọ na-azụ ha ka ha mụta ịna-eji Okwu Chineke achọpụta ihe ha ga-eme ma nsogbu bịara ha n’ọdịnihu. (Gụọ Ilu 2:1-6.) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ezinụlọ unu ahapụ Jehova, nyere ụmụ gị aka ka ha si n’Okwu Chineke chọpụta ihe mere o ji dị mkpa ka ha nọgide na-erubere Jehova isi. (Ọma 31:23) Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na mmadụ anwụnahụ unu, gosi ụmụ gị otú ha ga-esi chọta ihe ndị ga-akasi ha obi n’Okwu Chineke.—2 Kọr. 1:3, 4; 2 Tim. 3:16.

MỤTA IHE N’AKA JOSEF NA MERI

8. Olee ihe e kwuru na Diuterọnọmi 6:6, 7 Josef na Meri mere?

8 Nne na nna Jizọs nyeere ya aka ịghọ dimkpa ihe ya dị Chineke mma. Ha mere ihe Chineke gwara ndị nne na nna ka ha na-eme. (Gụọ Diuterọnọmi 6:6, 7.) Josef na Meri hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ihe kacha ha mkpa bụ inyere ụmụ ha aka ka ha hụkwa Jehova n’anya.

9. Olee mkpebi ndị dị mma Josef na Meri mere?

9 Josef na Meri haziri otú ha na ụmụ ha ga-esi na-efechi Chineke anya. O doro anya na ha na-aga nzukọ ndị a na-enwe kwa izu n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret, na-agakwa Ememme Ngabiga a na-eme kwa afọ na Jeruselem. (Luk 2:41; 4:16) Ọ ga-abụ na ha ji oge ndị ahụ ha ji eme njem kọọrọ Jizọs na ụmụnne ya akụkọ banyere ndị fere Chineke n’oge ndị gara aga. O nwekwara ike ịbụ na ha ji oge ndị ahụ gaa hụ ebe ụfọdụ a kpọrọ aha na Baịbụl. Ka ha na-amụkwu ụmụ, ọ ga-abụ na ime ihe ndị a sikwuuru ha ike. Ma, ọ baara ha ezigbo uru. Ha na Jehova nọgidere na-adị ná mma n’ihi na ha butere ihe gbasara ofufe ya ụzọ.

10. Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’aka Josef na Meri?

10 Olee ihe ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke nwere ike ịmụta n’aka Josef na Meri? Ihe kacha mkpa ị ga-amụta n’aka ha bụ iji okwu ọnụ gị na omume gị mee ka ụmụ gị mata na i ji obi gị niile hụ Jehova n’anya. Cheta na ihe kacha mkpa ị ga-emere ụmụ gị bụ inyere ha aka ịhụ Jehova n’anya. Otu n’ime ihe kachanụ i nwere ike ịkụziri ha bụ otú ha ga-esi na-amụchi ihe anya, na-ekpe ekpere, na-aga ọmụmụ ihe, ma na-ekwusa ozi ọma. (1 Tim. 6:6) Ma, i kwesịkwara ịna-egboro ụmụ gị mkpa ha. (1 Tim. 5:8) Chetakwa na ihe ga-eme ka ụmụ gị gafere ụwa ochie a banye n’ụwa ọhụrụ Chineke abụghị akụnụba, kama, ọ bụ adịm ná mma ha na Chineke.—Ezik. 7:19; 1 Tim. 4:8.

Obi na-adị anyị ụtọ ịhụ ndị nne na nna na-eme mkpebi dị mma maka ezinụlọ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. (a) Olee otú ihe e kwuru na 1 Timoti 6:17-19 ga-esi enyere ndị nne na nna aka ime mkpebi dị mma mgbe ha na-azụ ụmụ ha? (b) Olee ihe ndị ezinụlọ unu nwere ike ikpebi ime, oleekwa uru ndị o nwere ike ịbara unu? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Olee Ihe Ndị I Nwere Ike Ikpebi Ime?”)

11 Obi dị anyị ụtọ na e nwere ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eme mkpebi ndị dị mma maka ezinụlọ ha. Ha na ụmụ ha na-efechi Chineke anya. Ha na ha na-eso aga ọmụmụ ihe, mgbakọ na ozi ọma. E nwedịrị ụfọdụ ezinụlọ na-aga ezi ozi ọma n’ebe a na-anaghị ezikarị ozi ọma. Ụfọdụ na-aga elegharị anya na Betel ma ọ bụ nye aka n’ịrụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. Ọ na-efu ezinụlọ ndị kpebiri ime ihe ndị a ego. E nwekwara ihe ndị nwere ike isiri ha ike. Ma, Jehova ga-agọzi ha nke ukwuu maka mbọ ha na-agba. (Gụọ 1 Timoti 6:17-19.) Ọtụtụ mgbe, ụmụaka a zụlitere n’ụdị ezinụlọ ndị a na-anọgide na-eme ihe ndị a ma ha too. Ha anaghịkwa akwa mmakwaara n’ihi na nne na nna ha si otú a zụọ ha. *Ilu 10:22.

MỤTA IHE N’AKA JIZỌS

12. Olee ihe ọ dị mkpa ka Jizọs mee ka ọ nọ na-etolite?

12 Nna Jizọs n’eluigwe na-eme mkpebi ndị dị mma mgbe niile. Nne na nna ya n’ụwa mekwara mkpebi ndị dị mma. Ma ka Jizọs na-eto, o nwere ihe ndị o kwesịrị ikpebi n’onwe ya. (Gal. 6:5) Ọ bụkwa yanwa ka ọ dị n’aka ikpebi ihe ọ ga-eme, otú ahụ ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụ na ọ chọrọ, ọ gaara ekpebi ime ihe dị onwe ya mma. Ma, kama ime otú ahụ, o kpebiri ime ka ya na Jehova nọgide na-adị ná mma. (Jọn 8:29) Olee ihe ndị na-eto eto nwere ike ịmụta n’aka ya taa?

Ndị na-eto eto, unu ahapụkwala ihe nne na nna unu na-akụziri unu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) *

13. Olee mkpebi dị mkpa Jizọs mere mgbe ọ ka na-eto eto?

13 Mgbe Jizọs ka bụ nwata n’ụwa, o kpebiri irubere nne na nna ya isi. O nweghị mgbe ọ jụrụ ige ha ntị, na-eche na ya ka ha mara ihe. Kama, “ọ nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.” (Luk 2:51) O doro anya na Jizọs ejighị ọrụ ya dị ka diọkpara n’ezinụlọ ha gwuo egwu. Ọ gbalịrị mụta ọrụ n’aka nna ya bụ́ Josef ka o nwee ike ịna-enyere ndị ezinụlọ ha aka.

14. Olee otú anyị si mara na Jizọs ji ịmụ Okwu Chineke kpọrọ ihe?

14 O nwere ike ịbụ na nne na nna Jizọs gwara ya gbasara ụzọ dị ịtụnanya e si mụọ ya nakwa ihe mmụọ ozi Chineke kwuru gbasara ya. (Luk 2:8-19, 25-38) Ma, ọ sịghị na nke ahụ a kọọrọ ya ezuorola ya. O jikwa aka ya mụọ Akwụkwọ Nsọ. Olee otú anyị si mara na Jizọs ji ịmụ Okwu Chineke kpọrọ ihe? Otú anyị si mara bụ na mgbe ọ ka bụ nwata, “nghọta o nwere na ihe ọ na-aza [ndị nkụzi nọ na Jeruselem] nọ na-eju” ha anya. (Luk 2:46, 47) Mgbe Jizọs dị naanị afọ iri na abụọ, o doola ya anya na Jehova bụ Nna ya.—Luk 2:42, 43, 49.

15. Olee otú Jizọs si gosi na o kpebiri ime uche Jehova?

15 Mgbe Jizọs matara ihe Jehova chọrọ ka o mee, o kpebiri ime ya. (Jọn 6:38) Ọ ma na ọtụtụ ndị ga-akpọ ya asị. Ọ ga-abụkwa na o nyere ya nsogbu n’obi. N’agbanyeghị nke ahụ, o kpebiri irubere Jehova isi. Mgbe Jizọs mere baptizim n’afọ 29, ihe kacha ya mkpa ná ndụ bụ ime ihe Jehova chọrọ ka o mee. (Hib. 10:5-7) Ọbụna mgbe ọ na-anwụ n’osisi ịta ahụhụ, ọ kwụsịghị ime uche Nna ya.—Jọn 19:30.

16. Olee otu ihe ụmụaka nwere ike ịmụta n’aka Jizọs?

16 Na-erubere nne na nna gị isi. Dị ka Meri na Josef, nne na nna gị ezughị okè. Ma, Jehova họpụtara ha ka ha na-echebe gị, na-azụ gị ma na-eduzi gị. Ọ bụrụ na i jiri ndụmọdụ ha na-enye gị kpọrọ ihe ma na-erubere ha isi, ‘ihe ga-agaziri gị.’—Efe. 6:1-4.

17. Dị ka e kwuru na Jọshụa 24:15, olee ihe ndị na-eto eto ga-ekpebiri onwe ha?

17 Kpebie onye ị ga-efe. I kwesịrị ịchọpụta n’onwe gị onye Jehova bụ, ihe bụ́ nzube ya, na otú ị ga-esi na-akwado nzube ya. (Rom 12:2) Ọ bụ mgbe ahụ ka ị ga-enwe ike ime mkpebi kacha mkpa ná ndụ gị, ya bụ, ife Jehova. (Gụọ Jọshụa 24:15; Ekli. 12:1) Ọ bụrụ na ị na-agụ Baịbụl ma na-amụchi ya anya, ọ ga-eme ka ị hụkwuo Jehova n’anya, okwukwe gị esikwuokwa ike.

18. Olee ihe ndị na-eto eto ga-ekpebi, oleekwa uru ọ ga-abara ha?

18 Mee ka ime uche Jehova bụrụ ihe mbụ ná ndụ gị. Ụwa Setan na-ekwu na ọ bụrụ na i jiri nkà ndị i nwere mee ihe ga-abara onwe gị uru, ị ga-enwe obi ụtọ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-agbalịsi ike ka ha nweta akụnụba na-eji “ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.” (1 Tim. 6:9, 10) Ma ọ bụrụ na i gee Jehova ntị ma mee ka ime uche ya bụrụ ihe mbụ ná ndụ gị, ihe ga-agaziri gị, ‘ị ga-ejikwa amamihe mee ihe.’—Josh. 1:8.

GỊNỊ KA Ị GA-EKPEBI IME?

19. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị icheta?

19 Ndị nne na nna, meenụ ihe niile unu nwere ike ime ka ezinụlọ unu na-efe Jehova. Tụkwasịnụ ya obi. Ọ ga-enyekwara unu aka ime mkpebi dị mma. (Ilu 3:5, 6) Cheta na ụmụ gị ga-aka amụta ihe n’ihe ị na-eme karịa n’ihe ị na-ekwu. N’ihi ya, mee mkpebi ga-enyere ha aka ime ihe dị Jehova mma.

20. Olee ngọzi ndị na-eto eto ga-enweta ma ha kpebie ife Jehova?

20 Ndị na-eto eto, ndị nne na nna unu nwere ike inyere unu aka ime mkpebi ga-abara unu uru ná ndụ. Ma, ọ bụ ununwa ka ọ dị n’aka ime ihe dị Jehova mma. N’ihi ya, ṅomienụ Jizọs, kpebiekwanụ ife Nna unu nke eluigwe hụrụ unu n’anya. Unu mee ya, ndụ unu ga-enwe isi, obi ana-atọkwa unu ụtọ. (1 Tim. 4:16) N’ọdịnihu, unu ga-enwe obi ụtọ otú unu na-enwetụbeghị mbụ.

ABỤ NKE 133 Fee Jehova n’Oge Ị Na-eto Eto

^ par. 5 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst chọrọ ka ụmụ ha na-efe Jehova ma na-enwe obi ụtọ ma ha tolite. Olee mkpebi ndị nne na nna ga-eme iji nyere ụmụ ha aka ime ihe ndị a? Olee ihe ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ikpebi ime ka ihe gaziere ha. Isiokwu a ga-aza ajụjụ ndị a.

^ par. 11 Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Echeghị M na E Nwere Nne na Nna Ọzọ Dị Ka Papa M na Mama M.” Ọ gbara na Teta! nke Ọktoba 2011, peeji nke 20. Gụọkwa isiokwu bụ́ “Akwụkwọ Ozi Pụrụ Iche Ha Degaara Nne na Nna Ha.” Ọ gbara na Teta! nke July 8, 1999, peeji nke 30.

^ par. 65 NKỌWA FOTO: Ọ ga-abụrịrị na Meri kụziiri Jizọs ịhụ Jehova n’anya. Taa, ndị nne kwesịkwara ịkụziri ụmụ ha ịhụ Jehova n’anya.

^ par. 67 NKỌWA FOTO: Ọ ga-abụrịrị na Josef ejighị ịkpọ ndị ezinụlọ ya aga ụlọ nzukọ egwu egwu. Taa, ndị nna kwesịkwara iji ịkpọ ndị ezinụlọ ha aga ọmụmụ ihe kpọrọ ihe.

^ par. 69 NKỌWA FOTO: Jizọs mụtara ọrụ n’aka nna ya. Taa, ndị na-eto eto nwekwara ike ịmụta ọrụ n’aka nna ha.