Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Nwanna Joseph F. Rutherford na ụmụnna nwoke ndị ọzọ gara ileta ụmụnna nọ na Yurop

1920—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

1920—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

MALITE ná mbido afọ 1920, ọ nọ na-enu ndị Jehova enu n’obi ịmalite ọrụ chere ha ihu. Isiokwu ha họọrọ maka afọ 1920 bụ “Jaa bụ ebe mgbaba m na ike m.”—Ọma 118:14.

Jehova mere ka ndị ohu ya ndị a ọ na-agụsi agụụ ike ikwusa ozi ọma dị ike. N’afọ ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị kọpọtụa, ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ, si na narị abụọ na iri abụọ na ise ruo narị atọ na iri ise. Ná nke mbụ ya, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ha karịrị puku asatọ. Jehova gọziri ndị ya ma mee ka ọtụtụ ndị nabata ozi ha.

IJI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI PỤRỤ ICHE EKWUSA OZI ỌMA

N’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa Mach afọ 1920, Nwanna Joseph F. Rutherford, onye na-ahazi ọrụ ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ, kwuru okwu isiokwu ya bụ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.” Ndị Mmụta Baịbụl mere ihe niile ha nwere ike ime iji kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa nnọkọ a. Ha kwụrụ ụgwọ ịnọ n’otu n’ime ụlọ ezumeezu kachanụ e nwere na Niu Yọk Siti nwee nnọkọ a, kesaakwa akwụkwọ ịkpọ òkù ruru narị puku atọ na puku iri abụọ.

Akwụkwọ akụkọ e ji kpọsaa okwu ahụ isiokwu ya bụ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị”

Ndị mmadụ zara òkù ahụ karịa otú a tụrụ anya ya. Ihe karịrị mmadụ puku ise jupụtara n’ụlọ ezumeezu ahụ, puku mmadụ asaa lakwara n’ihi na ụlọ ahụ abaghị ha. Ụlọ Nche kpọrọ ya “otu n’ime nnọkọ ndị kacha gaa nke ọma Ndị Mmụta Baịbụl nwetụrụla.”

A bịara mara Ndị Mmụta Baịbụl amara n’ọtụtụ ebe n’ihi na ha na-agwa ndị mmadụ na “ọtụtụ nde ndị dị ndụ ugbu a agaghị anwụ ma ọlị.” N’oge ahụ, ha aghọtachaghị na a ka ga-ekwusa ozi ọma a ruo n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Ma, ha nwere ezigbo ịnụ ọkụ n’obi. Ida Olmstead, bụ́ onye bidoro ịga ọmụmụ ihe n’afọ 1902, kwuru, sị: “Anyị ma na e nwere ọtụtụ ngọzi ụmụ mmadụ ga-enweta n’ọdịnihu. Anyị nọkwa na-agwa ya onye ọ bụla anyị hụrụ n’ozi ọma.”

IJI AKA ANYỊ EBIPỤTA AKWỤKWỌ ANYỊ

Ụmụnna ndị nọ na Betel malitere iji aka ha ebipụta ụfọdụ akwụkwọ anyị ka ihe e ji amụ Okwu Chineke ghara ịkọ ụmụnna anyị. Ha zụtara ngwá ọrụ e ji ebi akwụkwọ ma tinye ya n’ụlọ ha na-akwụ ụgwọ ya na nọmba 35 Myrtle Avenue, Brooklyn, Niu Yọk. Ọ dị nso na Betel.

A kpọrọ Leo Pelle na Walter Kessler ka ha bịa jewe ozi na Betel n’ọnwa Jenụwarị afọ 1920. Walter sịrị: “Mgbe anyị rutere, onye na-ahụ maka ebe obibi akwụkwọ ahụ lere anyị anya, sị anyị: ‘Unu ga-eji otu awa na ọkara rụọ ọrụ tupu oge nri ehihie eruo.’ Ọ gwara anyị ka anyị si n’ebe ahụ a na-ebi akwụkwọ dị n’ala na-ebugota akwụkwọ n’elu.”

Leo chetara ihe mere n’echi ya. Ọ sịrị: “Ọ bụ anyị ketara ịsa ahụ́ ụlọ nke nọ n’ala n’ụlọ elu ahụ. Arụtụbeghị m ọrụ ruru unyi otú ahụ mbụ. Ma, ebe ọ bụ ọrụ Jehova, o wuteghị m.

Ígwè obibi akwụkwọ ahụ e ji bie Ụlọ Nche Bekee

N’ime izu ole na ole, ọ bụzi ụmụnna na-anụ ọkụ n’obi na-ebipụta Ụlọ Nche. Ha bipụtara Ụlọ Nche Bekee February 1, 1920, n’ígwè obibi akwụkwọ dị n’okpukpu nke abụọ nke ụlọ ahụ. Ha bipụtara ya puku iri isii. Ma e nwekwara ígwè obibi akwụkwọ ọzọ dị n’ụlọ dị n’okpuru ụlọ elu ahụ. Ụmụnna na-akpọ ígwè obibi akwụkwọ ahụ “Ụgbọ Mmiri Agha.” Ha bidokwara ibi The Golden Age, malite ná mbipụta nke April 14, 1920. O doro anya na Jehova gọziri mbọ ụmụnna ndị a gbara.

“Ma, ebe ọ bụ ọrụ Jehova, o wuteghị m”

“KA ANYỊ BIRI N’UDO”

Ndị Jehova malitekwara ịdị n’otu, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ma, ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl pụrụ n’ọgbakọ n’ihi nsogbu ndị e nwere malite n’afọ 1917 ruo n’afọ 1919. Olee otú a ga-esi nyere ha aka ịlọghachi?

O nwere isiokwu gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke April 1, 1920. Isiokwu ahụ bụ: “Ka Anyị Biri n’Udo.” Ọ gwara ndị ahụ pụrụ n’ọgbakọ, sị: “Obi siri anyị ike . . . na onye ọ bụla nwere mmụọ Onyenwe anyị . . . ga-adị njikere ichefu ihe ndị mere n’oge gara aga, . . . lọghachi ka anyị dịrị n’otu ma na-emekọ ihe ọnụ ka otu ahụ́.”

Ọtụtụ ndị nabatara ihe a Ụlọ Nche a kwuru ma lọghachi. Otu di na nwunye dere, sị: “Obi dị anyị ụtọ na anyị amatala na anyị agaraghị anọrọ nkịtị kemgbe ihe karịrị otu afọ, ebe ndị ọzọ nọ na-arụ ọrụ [ikwusa ozi ọma]. . . . Anyị agaghị achọ ka ihe ọ bụla ọzọ mee ka anyị laghachi azụ.” E nwere ọtụtụ ọrụ ụmụnna ndị a lọghachirinụ ga-arụ.

IKESA “ZG”

N’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa Jun afọ 1920, Ndị Mmụta Baịbụl malitere ikesa “ZG” n’ike n’ike. “ZG” bụ ihe a na-akpọ The Finished Mystery nke nwere mkpo dị fere fere. * E chekwara ọtụtụ n’ime akwụkwọ ndị a n’oge a machiri ya n’afọ 1918.

A gwara ndị kọpọtụa na ndị nkwusa niile ka ha bịa soro kesaa akwụkwọ a. Akwụkwọ bụ́ Bulletin (ya bụ, Ozi Alaeze Anyị) nke June 1920 kwuru, sị: “Onye ọ bụla e mere baptizim n’ọgbakọ ọ bụla kwesịrị iji obi ụtọ soro kesaa akwụkwọ a ma o kwe ya mee. Ihe onye ọ bụla ga-ebu n’obi bụ inyefe akwụkwọ ZG.” Nwanna Edmund Hooper kwuru na nkesa ahụ e mere bụ nke mbụ ọtụtụ n’ime ndị nkwusa ndị ahụ gara ozi ụlọ n’ụlọ. O kwukwara, sị: “Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ghọtawara na ọrụ ikwusa ozi ọma a ga-agbasa ruo ebe dị anya karịa otú anyị chere na mbụ.”

ỊHAZIGHARỊ ỌRỤ ANYỊ NA YUROP

Ebe ọ bụ na ọ dịghị mfe iso Ndị Mmụta Baịbụl nọ ná mba ndị ọzọ kwurịta okwu n’oge Agha Ụwa nke Mbụ, Nwanna Rutherford chọrọ ịgba ụmụnna ndị a ume ugbu a ma hazigharịa ọrụ ikwusa ozi ọma. N’ihi ya, n’abalị iri na abụọ n’ọnwa Ọgọst afọ 1920, ya na ụmụnna anọ ndị ọzọ gara hụ ụmụnna anyị ndị nọ n’Ịngland na mba ndị ọzọ.

Mgbe Nwanna Rutherford gara Ijipt

Mgbe Nwanna Rutherford rutere Briten, e nwere mgbakọ atọ na nnọkọ iri na abụọ a kpọrọ ọhaneze ka ha bịa. Ọnụ ọgụgụ ndị niile bịara mgbakọ ndị a na nnọkọ ndị a dị ihe dị ka puku mmadụ iri ise. Otu Ụlọ Nche kwuru otú nleta a Nwanna Rutherford gara leta ụmụnna anyị si gaa. Ọ sịrị: “A gbara ụmụnna ndị ahụ ume, ha adịkwa ike. Ha bịara hụkwuo ibe ha n’anya, jirikwa otu obi na-eje ozi ha. Ndị nke obi na-adịbughị mma bịaziri na-aṅụrị ọṅụ.” Na Paris, Nwanna Rutherford kwukwara okwu ahụ isiokwu ya bụ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.” Mgbe okwu ahụ malitere, ụlọ ezumeezu ahụ juru n’ọnụ. Narị mmadụ atọ kwukwara ka a bịa kọwakwuoro ha ihe ndị ọzọ.

Akwụkwọ a na-amapawa n’ahụ́ ájá e ji kpọsaa okwu ahụ e kwuru na Royal Albert Hall dị na Lọndọn

N’izu ndị sochirinụ, ụmụnna ụfọdụ gara Atens, Kaịro, na Jeruselem. Iji nyere ndị nwere mmasị n’ebe ndị ahụ aka, Nwanna Rutherford haziri ka e nwee ebe a ga na-abịa ewere akwụkwọ anyị n’obodo Ramala, nke dị nso na Jeruselem. Ọ laghachiziri Yurop ma hazie ka e nwee ọfis n’ebe ahụ nakwa ka a na-ebi akwụkwọ anyị n’ebe ahụ.

ỊGBA IKPE NA-EZIGHI EZI N’ANWỤ

N’ọnwa Septemba afọ 1920, Ndị Mmụta Baịbụl wepụtara mpịakọta nke iri abụọ na asaa nke akwụkwọ bụ́ The Golden Age. Nke a pụrụ iche n’ihi na o mere ka a mata gbasara mkpagbu a kpagburu Ndị Mmụta Baịbụl n’afọ 1918. Ígwè ahụ e ji ebi akwụkwọ a na-akpọ Ụgbọ Mmiri Agha rụrụ ọrụ ehihie na abalị iji bipụta magazin a ihe karịrị nde anọ.

Foto ndị uwe ojii sere Nwanna Nwaanyị Emma Martin

Ndị gụrụ magazin a matara gbasara ikpe na-ezighị ezi e kpere Nwanna Nwaanyị Emma Martin. Nwanna Nwaanyị Martin bụ onye kọpọtụa na San Benadino dị na Kalịfọnịa. N’abalị iri na asaa n’ọnwa Mach afọ 1918, ya na ụmụnna nwoke atọ ọzọ aha ha bụ E. Hamm, E. J. Sonnenburg na E. A. Stevens, gara obere nnọkọ Ndị Mmụta Baịbụl haziri.

Otu nwoke bịara nnọkọ ahụ abịaghị ka ọ mụọ Baịbụl. O mechara kwuo, sị: “M gara nnọkọ ahụ . . . n’ihi na ụlọ ọrụ gọọmentị na-akpụpụ ndị mmadụ n’ụlọikpe gwara m ka m gaa. Ihe m bu n’obi gaa bụ ka m nweta ihe a ga-eji gbagide ha akaebe.” O nwetakwara ihe o weere na ọ bụ ihe akaebe, ya bụ, akwụkwọ The Finished Mystery. Mgbe abalị ole na ole gachara, e jichiri Nwanna Nwaanyị Martin na ụmụnna nwoke atọ ahụ. E kwuru na ha dara iwu n’ihi na ha na-ekesa akwụkwọ a machiri iwu.

A mara Nwanna Nwaanyị Martin na ụmụnna nwoke atọ ahụ ikpe ịga mkpọrọ afọ atọ. N’abalị iri na asaa n’ọnwa Mee afọ 1920, ohere e nyere ha itinye akwụkwọ maka ikpegharị ikpe ha gwụrụ. A tụziri ha mkpọrọ. Ma, ihe gbanwere n’oge na-adịghị anya.

N’abalị iri abụọ n’ọnwa Jun afọ 1920, Nwanna Rutherford kọrọ banyere ụmụnna ndị a ná mgbakọ e nwere na San Fransisko. Ihe e mere ụmụnna ndị a wutere ndị bịara mgbakọ ahụ. Ha zigaara onye na-achị Amerịka n’oge ahụ ozi telegram ozugbo, sị ya: “Anyị weere ya na ikpe e kpere . . . Oriakụ Martin . . . bụ ikpe na-ezighị ezi . . . Otú ndị ọrụ gọọmentị si jiri ikike ha nwere . . . siere . . . Oriakụ Martin . . . ọnyà ma bo ya ebubo ka ha nwee ike ịtụ ya mkpọrọ jọgburu onwe ya.”

Echi ya, Woodrow Wilson bụ́ onyeisi ala Amerịka nyere iwu ozugbo ka a gbanwee ntaramahụhụ ahụ e nyere Nwanna Nwaanyị Martin, Nwanna Hamm, Sonnenburg, na Stevens. Ọ bụ otú ahụ ka e si kpọpụta ha n’ụlọ mkpọrọ.

Ná ngwụcha afọ 1920, e nwere ọtụtụ ihe nọ na-eme Ndị Mmụta Baịbụl obi ụtọ. Ọrụ a na-arụ n’isi ụlọ ọrụ anyị nọ na-ebukwu ibu. E nweekwala ọtụtụ ezigbo Ndị Kraịst na-akọrọ ndị mmadụ na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ laa. (Mat. 24:14) N’afọ na-eso ya, bụ́ afọ 1921, ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke a ga-arụ ga-ebudị ibu karịa nke afọ 1920.

^ par. 18 The Finished Mystery bụ mpịakọta nke asaa nke akwụkwọ Studies in the Scriptures. “ZG” bụ The Finished Mystery nke nwere mkpo dị fere fere. Ọ bụ ya ka e ji mere Ụlọ Nche nke March 1, 1918. “Z” nọchiri anya Zion’s Watch Tower, ebe “G,” bụ́ mkpụrụ akwụkwọ nke asaa, nọchiri anya mpịakọta nke asaa.