Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 41

Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Mbụ

Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Mbụ

“E gosiwo na unu bụ akwụkwọ ozi Kraịst nke anyị onwe anyị bụ́ ndị ozi dere.”—2 KỌR. 3:3.

ABỤ NKE 78 ‘Ịkụziri Ndị Mmadụ Okwu Chineke’

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

È nwere ihe ga-aka eme ọgbakọ obi ụtọ karịa ịhụ ka onye a na-amụrụ Baịbụl mere baptizim? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)

1. Olee otú ihe e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 3:1-3 si eme ka anyị mata na ịmụrụ mmadụ ihe, ya emee baptizim bụ ihe ùgwù pụrụ iche? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

OLEE otú obi na-adị gị ma ị hụ ka onye a na-amụrụ Baịbụl n’ọgbakọ unu mere baptizim? O doro anya na obi na-adị gị ụtọ. (Mat. 28:19) Ọ bụrụzie na ọ bụ gịnwa mụụrụ onye ahụ ihe, obi na-atọgbu gị atọgbu ịhụ ka ọ na-eme baptizim. (1 Tesa. 2:19, 20) Otú o si na-eme nke ọma ma mechaa mee baptizim gosiri na gị na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ unu gbara ezigbo mbọ nyere ya aka.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 3:1-3.

2. (a) Olee ajụjụ dị mkpa anyị kwesịrị ịtụle, n’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị bụ ọmụmụ Baịbụl? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

2 Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịmata na kemgbe afọ anọ gara aga, a na-eduziri ihe dị ka nde mmadụ iri ọmụmụ Baịbụl * kwa ọnwa n’ụwa niile. N’oge ndị ahụkwa, e mere ihe karịrị narị puku mmadụ abụọ na puku iri asatọ baptizim kwa afọ, ha aghọọ Ndịàmà Jehova nakwa ndị ọhụrụ na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Olee otú anyị ga-esi enyere ọtụtụ n’ime ndị ahụ a na-amụrụ Baịbụl aka ime baptizim? N’oge a Jehova ka na-enye ndị mmadụ ohere ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ha aka ime baptizim ozugbo. Oge adịghịzi.—1 Kọr. 7:29a; 1 Pita 4:7.

3. Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a banyere iduzi ọmụmụ Baịbụl?

3 Ebe ọ bụ na ọ dị ezigbo mkpa ime ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ugbu a, e si n’aka alaka ụlọ ọrụ dị iche iche chọpụta otú anyị ga-esi nyekwuoro ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka iru eru ime baptizim. N’isiokwu a nakwa n’isiokwu na-eso ya, e nwere ihe ndị anyị ga-amụta n’aka ndị ọsụ ụzọ ma nke a na-akọ, ndị ozi ala ọzọ, na ndị nlekọta sekit. * (Ilu 11:14; 15:22) Ha kwuru ihe anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ga-eme ka Baịbụl anyị na ha na-amụ bakwuoro ha uru. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ise onye ọ bụla a na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ime iji na-eme nke ọma ma ruo eru ime baptizim.

NA-AMỤNỤ IHE KWA IZU

Jụọ onye ị na-amụrụ Baịbụl ma gị na ya ùnu nwere ike ịnọdụ ala mụọ Baịbụl (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 6)

4. Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta gbasara iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ọnụ ụzọ?

4 Ọtụtụ ụmụnna anyị na-anọ n’ọnụ ụzọ ndị mmadụ amụrụ ha Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na e nwere ike isi otú a mee ka mmadụ nwee mmasị na Baịbụl, ma ụdị ọmụmụ Baịbụl a na-adị nkenke. Ọtụtụ mgbe, a naghịkwa amụ ya kwa izu. Iji mee ka onye ahụ nwekwuo mmasị, ụfọdụ na-agwa onye ahụ ka o nye ha akara ekwentị ya. Ha na-akpọ onye ahụ n’ekwentị gwa ya ihe ụfọdụ si na Baịbụl ma ọ bụ zigara ya ozi. Ha na onye ahụ nwere ike isi otú a na-akparịta ruo ọtụtụ ọnwa, ma ha ebidobeghị ọmụmụ Baịbụl ga-arụpụta ezigbo ihe. Onye a ọ̀ ga-emecha ruo eru inyefe Chineke onwe ya, e meekwa ya baptizim, ma ọ bụrụ na ọ bụ naanị ntakịrị oge ha otú a ka ọ na-ewepụta ịmụ Okwu Chineke? Ọ ga-esi ike.

5. Gịnị ka Jizọs kwuru na Luk 14:27-33 anyị nwere ike iji nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka?

5 O nwere mgbe Jizọs ji ihe atụ kọwaa ihe mmadụ ga-eme iji bụrụ onye na-eso ụzọ ya. O kwuru banyere onye chọrọ iwu ụlọ elu nakwa banyere otu eze nke chọrọ ịga buso eze ọzọ agha. Jizọs kwuru na onye ahụ chọrọ iwu ụlọ elu ga-ebu ụzọ “nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu” ya iji wuchaa ụlọ ahụ. O kwukwara na eze ahụ ga-ebu ụzọ “nọdụ ala gbaa izu,” ka ọ mara ma ọ̀ ga-emerili eze nke ọzọ. (Gụọ Luk 14:27-33.) Jizọs ma na onye chọrọ ịghọ onye na-eso ụzọ ya kwesịrị ịnọdụ ala chee echiche nke ọma banyere ihe ya na ya so. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba ndị chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ume ka anyị na ha na-amụ Baịbụl kwa izu. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

6. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka ọmụmụ ihe anyị na mmadụ na-aga n’ihu n’ihu?

6 Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịgbatịkwu oge gị na onye ahụ ji anọ n’ọnụ ụzọ ya amụ ihe. Gị na ya nwekwara ike ịtụle amaokwu Baịbụl abụọ kama ịtụle naanị otu. Ọ bụrụ na ịnọ ogologo oge otú ahụ dị ya mma, i nwere ike ịjụ ya ma è nwere ebe gị na ya ga-anọdụ ala na-amụ ihe. Ihe ọ zara ga-enyere gị aka ịma ma ò ji ịmụ Baịbụl kpọrọ ihe. Ka oge na-aga, iji nyere ya aka imekwu nke ọma, i nwere ike ịjụ ya ma ùnu nwere ike ịna-amụ ihe ugboro abụọ n’izu. Ma, gị na ya ịmụ ihe otu ugbo ma ọ bụ ugbo abụọ n’izu abụghị ebe okwu biri.

KWADEBE MAKA ỌMỤMỤ IHE NKE Ọ BỤLA

Kwadebe nke ọma maka ọmụmụ ihe unu, gosikwa onye ị na-amụrụ ihe otú ọ ga-esi akwadebe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 ruo na nke 9)

7. Olee otú onye na-amụrụ mmadụ ihe ga-esi kwadebe nke ọma maka ọmụmụ ihe nke ọ bụla?

7 Cheta na ị bụ onye nkụzi. N’ihi ya, i kwesịrị ịna-akwadebe nke ọma maka ọmụmụ ihe nke ọ bụla. Iji bido, i nwere ike ịgụ paragraf ndị unu ga-amụ, gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị dị na ha. Gbalịa ghọta isi ihe paragraf ndị ahụ na-akụzi. Chee banyere isiokwu ya, isiokwu nta ndị dị na ya, ajụjụ paragraf ndị dị na ya, amaokwu Baịbụl ndị e dere “gụọ,” foto ndị dị na ya, na vidio ndị nwere ike ịkọwakwu isiokwu ahụ. Ugbu a, chee banyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe. Chọpụta otú ị ga-esi kọwaara ya ihe dị n’isiokwu ahụ n’ụzọ dị mfe ma doo anya ka o nwee ike ịghọta ya ngwa ngwa ma mee ya emee.—Nehe. 8:8; Ilu 15:28a.

8. Gịnị ka ihe Pọl onyeozi dere ná Ndị Kọlọsi 1:9, 10 na-akụziri anyị banyere ikpe ekpere maka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl?

8 Mgbe ị na-akwadebe, gwa Jehova banyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe na otú ihe si dịrị ya. Rịọkwa Jehova ka o nyere gịnwa aka iji Baịbụl kụziere onye ahụ ihe nke ọma otú ga-eru ya n’obi. (Gụọ Ndị Kọlọsi 1:9, 10.) Jụọ onwe gị ma ò nwere ihe ndị ga-esiri ya ike nghọta ma ọ bụ siere ya ike nkweta. Echefula na ebumnobi gị bụ inyere ya aka ka o ruo eru ime baptizim.

9. Olee otú mmadụ ga-esi enyere onye ọ na-amụrụ Baịbụl aka ịkwadebe maka ọmụmụ ihe? Kọwaa.

9 Anyị chọrọ ka Baịbụl anyị na mmadụ na-amụchi anya mee ka o jiri ihe Jehova na Jizọs meere ya kpọrọ ihe ma chọkwuo ịmụtakwu banyere ha. (Mat. 5:3, 6) Ka onye anyị na-amụrụ Baịbụl nwee ike irite uru n’ihe anyị na-amụrụ ya, o kwesịrị itinye uche ya n’ihe ọ na-amụ. Ka o nwee ike ime ya, mee ka ọ ghọta na ọ dị ezigbo mkpa ka ọ na-akwadebe maka ọmụmụ ihe nke ọ bụla. O kwesịrị ịgụ ebe ndị unu ga-amụ ma chee otú ọ ga-esi eme ihe ọ mụtara. Olee otú ị ga-esi enyere ya aka ime ya? Gị na ya kwadebe ihe unu ga-amụ ka i si otú ahụ gosi ya otú e si akwadebe ọmụmụ ihe. * Kọwaara ya otú e si achọta azịza ajụjụ paragraf nke ọ bụla. Gosikwa ya otú ịkatụ okwu ụfọdụ ihe ga-esi enyere ya aka icheta azịza ajụjụ paragraf ahụ. Gwazie ya ka ọ zaa ajụjụ ahụ n’agụghị ya agụ. Ị ga-esi otú a chọpụta ma ọ̀ ghọtakwara ihe ọ mụrụ. Ma, e nwekwara ihe ọzọ i kwesịrị ịgba onye ị na-amụrụ Baịbụl ume ka o mee.

KỤZIERE YA OTÚ YA NA CHINEKE GA-ESI NA-EKWURỊTA OKWU KWA ỤBỌCHỊ

Kụziere onye ị na-amụrụ Baịbụl otú ọ ga-esi na-ekpe ekpere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 11)

10. Gịnị mere onye anyị na-amụrụ Baịbụl kwesịrị iji na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị? Gịnịkwa ka ọ ga-eme ka ọgụgụ Baịbụl ya baara ya ezigbo uru?

10 Ọ bụ eziokwu na anyị na onye anyị na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ịna-amụ ihe kwa izu, ma e nwekwara ihe ndị ọzọ o kwesịrị ịna-eme n’onwe ya kwa ụbọchị. Ya na Jehova kwesịrị ịna-ekwurịta okwu. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ bụ ịna-ege Jehova ntị na ịna-agwa ya okwu. Otú ọ ga-esi na-ege ya ntị bụ ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. (Jọsh. 1:8; Ọma 1:1-3) Gosi ya otú ọ ga-esi eji “Usoro Ọgụgụ Baịbụl” nke dị na jw.org® * na-agụ Baịbụl. Ma, iji nyere ya aka ka ọgụgụ Baịbụl ya baara ya uru, gbaa ya ume ka ọ na-echebara ihe Baịbụl na-akụziri ya banyere Jehova echiche nakwa otú ọ ga-esi na-eme ihe ọ na-amụta eme.—Ọrụ 17:11; Jems 1:25.

11. Olee otú onye a na-amụrụ Baịbụl ga-esi mụta ikpe ekpere nke ọma, oleekwa ihe mere o ji dị mkpa ka ọ na-ekpe ekpere mgbe niile?

11 Gwa onye ị na-amụrụ ihe ka ọ na-agwa Jehova okwu n’ekpere kwa ụbọchị. Si n’ala ala obi gị kpee ekpere tupu unu amalite ọmụmụ ihe nakwa ná mmechi ọmụmụ ihe unu. Ọ ga-esi n’ekpere ị na-ekpe mụta isi n’obi ya na-ekpe ekpere, mụtakwa ịgwa Jehova Chineke okwu n’ekpere n’aha Jizọs Kraịst. (Mat. 6:9; Jọn 15:16) Chee otú ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị (ya bụ, ige Jehova ntị) na ikpe ekpere (ya bụ, ịgwa Jehova okwu) ga-esi nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ịbịarukwu Chineke nso. (Jems 4:8) Ịmụta ime ihe ndị a ga-enyere ya aka inyefe Jehova onwe ya ma mee baptizim. Ma, olee ihe ọzọ ga-enyere ya aka?

NYERE YA AKA KA YA NA JEHOVA DỊRỊ NÁ MMA

12. Olee otú i nwere ike isi nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka ya na Jehova dịrị ná mma?

12 Ihe onye anyị na-amụrụ Baịbụl na-amụta kwesịrị ịmasị ya, ruokwa ya n’obi. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ ihe ruru mmadụ n’obi ka ọ ga-eme. Ihe Jizọs kụziri masịrị ndị mmadụ. Ma, ihe mere ndị mmadụ ji sowe ya bụ n’ihi na ihe ọ kụziri ruru ha n’obi. (Luk 24:15, 27, 32) Onye ị na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ịghọta nke ọma na Jehova dị adị, ghọtakwa na ya na ya nwere ike ịbụ enyi, ya ewerekwa ya ka Nna ya, Chineke ya, na Enyi ya. (Ọma 25:4, 5) Ka gị na ya na-amụ Baịbụl, nyere ya aka ịghọta àgwà ọma ndị Chineke nwere. (Ọpụ. 34:5, 6; 1 Pita 5:6, 7) N’agbanyeghị isiokwu gị na ya na-amụ, mee ka ọ ghọta ụdị Onye Jehova bụ. Nyere ya aka ịmata àgwà ọma ndị Jehova nwere, dị ka ịhụnanya ya, obiọma ya, na ọmịiko ya. Jizọs sịrị na “iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ” bụ ịhụ “Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mat. 22:37, 38) Gbalịa nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka o jiri obi ya dum hụ Jehova n’anya.

13. Nye ihe atụ otú e nwere ike isi nyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka ịmata ọmarịcha àgwà ndị Jehova nwere.

13 Mgbe gị na onye ị na-amụrụ ihe na-ekwurịta okwu, mee ka ọ mata ihe mere i ji hụ Jehova n’anya. O nwere ike ime ka ọ gụwakwa ya agụụ ịhụ Jehova n’anya. (Ọma 73:28) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na o nwere ahịrịokwu ma ọ bụ amaokwu Baịbụl dị n’ihe unu na-amụ nke kwuru banyere ọmarịcha àgwà Jehova ndị dị ka, ịhụnanya, amamihe, ikpe ziri ezi, ma ọ bụ ike, ihe ahụ o kwuru eruo gị n’obi, gwa ya onye ahụ ị na-amụrụ ihe. Mee ka ọ mata na ihe ahụ so n’ihe mere i ji hụ Nna gị nke eluigwe n’anya. Ma, o nwekwara ihe ọzọ onye ọ bụla a na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ime ka o nwee ike ịna-eme nke ọma ma ruo eru ime baptizim.

GBAA YA UME KA Ọ BỊAWA ỌMỤMỤ IHE ANYỊ

Gbaa onye ị na-amụrụ Baịbụl ume ka o bido ịbịa ọmụmụ ihe ozugbo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 15)

14. Gịnị ka Ndị Hibru 10:24, 25 kwuru gbasara ịbịa ọmụmụ ihe nke ga-enyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịna-eme nke ọma?

14 Anyị niile chọrọ ka ndị anyị na-amụrụ ihe mechaa mee baptizim. Otu ụzọ anyị nwere ike isi nyere ha aka bụ ịgba ha ume ka ha na-abịa ọmụmụ ihe. Ndị bụ́ aka ochie n’ịkụzi ihe kwuru na ndị a na-amụrụ Baịbụl bidoro ịbịa ọmụmụ ihe ozugbo na-akacha eme nke ọma. (Ọma 111:1) Ụfọdụ ndị na-agwa ndị ha na-amụrụ Baịbụl na e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha ga-amụta ma ha bịa ọmụmụ ihe anyị. Gụọnụ Ndị Hibru 10:24, 25, kọwaakwara ya uru ịbịa ọmụmụ ihe ga-abara ya. Kpọnyere ya vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? * Nyekwara ya aka iji ịbịa ọmụmụ ihe kwa izu kpọrọ ihe.

15. Olee ihe anyị nwere ike ime iji nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịna-abịachi ọmụmụ ihe anya?

15 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe abịatụbeghị ọmụmụ ihe anyị ma ọ bụkwanụ na ọ naghị abịachi ya anya? Jiri obi ụtọ gwa ya ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe ị gara na nso nso a. Ọ ga-aka eme ka ọ chọwa ịbịa ọmụmụ ihe karịa naanị ịgwa ya ka ọ bịa. Nye ya Ụlọ Nche ma ọ bụ akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nke a na-amụ n’izu ahụ. Gosi ya ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe na-abịanụ, jụọkwa ya nke masịrị ya n’ime ihe ndị ahụ. Ihe onye ị na-amụrụ ihe ga-ahụ n’ụbọchị mbụ ọ ga-abịa ọmụmụ ihe ga-akarị ihe ọ bụla ọ hụtụrụla n’okpukpe ndị ọzọ ọ gatụrụla. (1 Kọr. 14:24, 25) Ọ ga-ahụ ụmụnna ndị ọzọ ọ ga-esi n’aka ha mụta ezigbo ihe. Ha ga-enyekwara ya aka ịna-eme nke ọma ma ruo eru ime baptizim.

16. Gịnị ka anyị ga-eme ka onye anyị na ya na-amụ Baịbụl mee nke ọma ma ruo eru ime baptizim, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

16 Olee otú anyị ga-esi na-amụrụ ndị mmadụ ihe ka ha nwee ike ịna-eme nke ọma ma ruo eru ime baptizim? Anyị kwesịrị ime ka onye anyị na-amụrụ ihe jiri ọmụmụ ihe anyị na ya kpọrọ ihe. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịgwa ya ka ọ na-ewepụta oge ka anyị na ya na-amụ ihe kwa izu nakwa ka ọ na-akwadebe maka ọmụmụ ihe nke ọ bụla. Anyị kwesịkwara ịgba ya ume ka ọ na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ma na-agbalị ka ya na Chineke dịrị ná mma. Ka anyị gbalịa mee ka ịga ọmụmụ ihe na-agụ ya agụụ. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị A Na-amụrụ Baịbụl Ga-eme Iji Na-eme Nke Ọma ma Ruo Eru Ime Baptizim.”) Ma, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, e nwere ihe ise ọzọ anyị ga-eme iji nyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịna-eme nke ọma ma ruo eru ime baptizim.

ABỤ NKE 76 Olee Otú Ọ Na-adị Gị?

^ par. 5 Ịkụziri mmadụ ihe pụtara inyere onye ahụ aka “ịgbanwe echiche ya, otú obi na-adị ya, nakwa otú o si eme ihe.” Ebe e si nweta isiokwu afọ 2020, ya bụ Matiu 28:19, chetaara anyị mkpa ọ dị ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl na ịkụziri ha ihe ha ga-eme ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst e mere baptizim. N’isiokwu a nakwa nke na-eso ya, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ọrụ a dị ezigbo mkpa.

^ par. 2 NKỌWAKWU: Ọ bụrụ na gị na mmadụ na-ekwurịta ihe dị na Baịbụl ọtụtụ ugboro n’ụzọ a haziri ahazi, ị na-eduziri onye ahụ ọmụmụ Baịbụl. I nwere ike idenye ya n’akụkọ ozi gị ma ọ bụrụ na gị na ya amụọla Baịbụl ugboro abụọ kemgbe i gosichara ya otú e si amụ Baịbụl, ya abụrụkwa na e nwere ezigbo ihe gosiri na unu ga-amụrụ ya na-aga.

^ par. 3 Ihe ndị ọzọ dị n’isiokwu a na n’isiokwu na-eso ya bụ aro ndị si n’isiokwu ndị a kpọrọ “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu” ndị gbara n’Ozi Alaeze Anyị nke July 2004 ruo May 2005.

^ par. 9 Lee vidio ga-ewe nkeji anọ bụ́ Ịkụziri Onye Anyị Na-amụrụ Ihe Ịkwadebe Ihe A Ga-amụ. Na JW Library®, gaa n’ebe e dere MEDIA, pịa OUR MEETINGS AND MINISTRY, pịzie IMPROVING OUR SKILLS.

^ par. 10 Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa AKWỤKWỌ NA BROSHỌ.

^ par. 14 Na JW Library®, gaa n’ebe e dere MEDIA, pịa OUR MEETINGS AND MINISTRY, pịzie TOOLS FOR THE MINISTRY.