Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 43

Adala Mbà

Adala Mbà

“Ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ anyị.”​—GAL. 6:9.

ABỤ NKE 68 Ịgha Mkpụrụ Alaeze

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe mere obi ji atọ anyị ụtọ na anyị bụ Ndịàmà Jehova?

OBI dị anyị ụtọ na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Otú anyị si egosi na anyị bụ Ndịàmà ya bụ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. Anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị nyere onye ‘na-akpa àgwà otú na-egosi na ọ chọrọ inweta ndụ ebighị ebi’ aka ya aghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst. (Ọrụ 13:48) Obi na-adị anyị ụtọ otú ahụ ọ dị Jizọs onye ‘mmụọ nsọ mere ka ọṅụ ju obi’ mgbe ndị na-eso ụzọ ya mere nke ọma n’ozi ọma ha gara ikwusa.​—Luk 10:​1, 17, 21.

2. Olee otú anyị si egosi na anyị ji ozi ọma anyị kpọrọ ihe?

2 Ọrụ ikwusa ozi ọma a dị anyị ezigbo mkpa. Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Na-eme ike gị niile ka ị bụrụ onye e ji ama atụ nakwa onye na-akụzi ihe nke ọma.” Ọ gwakwara ya, sị: “N’ihi na ọ ga-eme ka ị zọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.” (1 Tim. 4:16) N’ihi ya, ozi ọma a na-azọ ndụ ndị mmadụ. Anyị na-eme ike anyị niile iji bụrụ ndị e ji ama atụ n’ihi na anyị bụ ụmụ amaala Alaeze Chineke. Anyị na-agbalị ike anyị niile ịhụ na anyị na-ebi ndụ otú ga-eme ka e too Jehova na otú ga-adaba n’ihe anyị na-ekwusara ndị mmadụ n’ozi ọma. (Fil. 1:27) Otú anyị si egosi na anyị na-eme ike anyị niile ịkụzi ihe nke ọma bụ ịkwadebe nke ọma maka ozi ọma nakwa ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka tupu anyị ezie mmadụ ozi ọma.

3. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịchọpụta mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma? Nye ihe atụ.

3 N’agbanyeghị otú anyị si mee ike anyị niile, ụfọdụ ndị nwere ike ghara ige ntị n’ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ekwusa. Chegodị gbasara ihe mere Nwanna Georg Lindal, onye jere ozi n’Aịsland naanị ya, malite n’afọ 1929 ruo n’afọ 1947. O nyefere ọtụtụ puku akwụkwọ. Ma, o nweghị otu onye nabatara eziokwu ahụ. Ọ sịrị: “E nwere ụfọdụ n’ime ha o yiri ka hà na-emegide eziokwu ahụ. Ma ihe ka n’ọtụtụ n’ime ha enweghị mmasị.” E mechakwara ziga ndị ozi ala ọzọ gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilied ebe ahụ. Ma, ha kwusara ozi ọma ebe ahụ ruo afọ itoolu tupu ụfọdụ ndị Aịsland enyefee Jehova onwe ha ma mee baptizim. *

4. Olee otú obi nwere ike ịdị anyị ma ndị mmadụ jụ ige anyị ntị n’ozi ọma?

4 Ọ na-ewute anyị ma ọ bụrụ na ndị mmadụ egeghị ozi ọma anyị. O nwere ike ịdị anyị otú ọ dị Pọl. Ọ “na-eru nnukwu uju,” obi anaghịkwa ezu ya ike n’ihi na ndị Juu niile jụrụ ikweta na ọ bụ Jizọs bụ Mezaya ahụ e kwere ná nkwa. (Rom 9:​1-3) Ọ bụrụkwanụ na n’agbanyeghị mbọ niile anyị gbara na ekpere anyị kpere, onye anyị na-amụrụ ihe anaghị eme nke ọma, ya adịkwa mkpa ka anyị kwụsị ịmụrụ ya Baịbụl? Ọ bụrụkwanụ na e nwebeghị onye anyị nyeere aka ka o ruo eru ime baptizim? Ọ̀ ga-eme ka obi mawa anyị ikpe, anyị echewe na Jehova anaghị agọzi ozi anyị? N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ abụọ ndị a: (1) Olee ihe ndị ga-egosi ma ozi anyị ọ̀ na-aga nke ọma? (2) Olee ihe ndị anyị ga-atụ anya ha n’ozi ọma anyị?

OLEE IHE NDỊ GA-EGOSI MA OZI ANYỊ Ọ̀ NA-AGA NKE ỌMA?

5. Olee ihe ndị nwere ike ime ka ozi anyị na-ejere Jehova ghara ịga nke ọma otú anyị tụrụ anya ya?

5 Baịbụl kwuru banyere onye na-eme uche Chineke, sị: “Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.” (Ọma 1:3) Ma, nke ahụ apụtaghị na ihe niile anyị na-emere Jehova ga-aga otú anyị tụrụ anya ya. ‘Nsogbu na-ezu anyị ahụ́’ n’ihi ezughị okè, ma nke anyị ma nke ndị ọzọ. (Job 14:1) Ihe ọzọ bụkwa na ndị mmegide nwere ike metụ ka anyị kwụsị ije ozi anyị otú anyị si ejebu. (1 Kọr. 16:9; 1 Tesa. 2:18) Ma, olee otú Jehova si ekpebi ma ozi anyị ọ̀ na-aga nke ọma? Legodị ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ.

Jehova ji mbọ anyị na-agba n’ozi ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị ma ànyị ziri ndị mmadụ ozi ọma ihu na ihu ma ọ bụ jiri akwụkwọ ozi ma ọ bụkwanụ ekwentị zie ha ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Olee otú Jehova si ekpebi ma ozi anyị ọ̀ gara nke ọma?

6Jehova na-ele mbọ anyị na-agba na otú anyị si atachi obi. N’anya Jehova, ozi anyị na-ejere ya na-aga nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ejiri ịhụnanya na ịdị uchu na-arụ ya n’agbanyeghị ma ndị mmadụ hà gere anyị ntị ma ọ bụ na ha egeghị anyị ntị. Pọl dere, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe n’ihi na unu jeere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi.” (Hib. 6:10) Jehova na-echeta mbọ anyị na-agba na otú anyị si jiri ịhụnanya na-ejere ya ozi ọ bụrụgodị na e nweghị onye anyị mụụrụ Baịbụl ya emee baptizim. N’ihi ya, ihe ahụ Pọl gwara ndị Kọrịnt nwere ike ịkasi anyị obi. Ọ sịrị: “Ọrụ Onyenwe anyị unu na-arụsi ike abụghị na nkịtị,” n’agbanyeghị ma mbọ anyị gbara ọ̀ rụpụtara ihe anyị tụrụ anya ya ma ọ bụ na ọ rụpụtaghị.​—1 Kọr. 15:58.

7. Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Pọl onyeozi si kọwaa ozi ya?

7 Pọl onyeozi bụ onye ozi ala ọzọ na-eme nke ọma. O hiwere ọtụtụ ọgbakọ ọhụrụ n’ọtụtụ obodo. Ma, mgbe ọ chọrọ igosi na ya bụ Onye Kraịst na-eme nke ọma, o kwughị gbasara mmadụ ole o nyeere aka ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Kama, ọ sịrị: “Arụọla m ọrụ karịrị nke ha rụrụ.” (2 Kọr. 11:23) Dị ka Pọl kwuru, cheta na ọ bụ mbọ ị gbara na otú i si tachie obi n’ozi gị ka Jehova ji kpọrọ ihe karịchaa.

8. Olee ihe anyị kwesịrị icheta gbasara ozi anyị?

8Ozi anyị na-atọ Jehova ụtọ. Jizọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya iri asaa ka ha gaa kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe ha lọtara, ha nwere ezigbo obi ụtọ. Gịnị mere ha ji nwee ezigbo obi ụtọ? Ha sịrị: “Anyị ji aha gị mee ka ndị mmụọ ọjọọ rubere anyị isi.” Ma Jizọs gbaziri ha, sị ha: “Unu aṅụrịla ọṅụ maka na ndị mmụọ ọjọọ na-erubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ maka na e deela aha unu n’eluigwe.” (Luk 10:​17-20) Jizọs maara na ọ bụghị mgbe niile ka ihe ga-agaziri ha otú a n’ozi ha. N’eziokwu, anyị amaghị mmadụ ole ha ziri ozi ọma mechara ghọọ ndị na-eso ụzọ. Ihe kwesịrị ime ka ndị na-eso ụzọ Jizọs ahụ nwee obi ụtọ abụghị ihe ha rụpụtara, kama, na Jehova nwere obi ụtọ n’otú ha si gbaa mbọ n’ọrụ ha.

9. Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:​7-9, olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị atachie obi n’ozi anyị?

9Ọ bụrụ na anyị atachie obi n’ozi ọma anyị, anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, anyị “na-agha mkpụrụ otú mmụọ nsọ chọrọ” n’ihi na anyị kwere ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị ná ndụ anyị. Ọ bụrụhaala na “ike agwụghị anyị,” Jehova kwere anyị nkwa na anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi n’agbanyeghị ma ò nwere onye anyị nyeere aka inyefe Jehova onwe ya ma ọ bụ na o nweghị.​—Gụọ Ndị Galeshia 6:​7-9.

OLEE IHE ANYỊ NA-ATỤ ANYA NA O NWERE IKE IME N’OZI ỌMA ANYỊ?

10. Olee ihe na-ekpebi otú ndị mmadụ ga-esi anabata ozi ọma anyị?

10Ọ bụ ụdị obi ndị anyị na-ezi ozi ọma nwere ga-ekpebi ma hà ga-ege anyị ntị. Jizọs kọwara eziokwu a n’ihe atụ o mere gbasara ọgha mkpụrụ ahụ ghara mkpụrụ n’ụdị ala dị iche iche. Ọ bụ naanị otu n’ime ala ndị ahụ mịrị mkpụrụ. (Luk 8:​5-8) Jizọs kwuru na ụdị ala ahụ dị iche iche nọchiri anya ụdị obi dị iche iche ndị mmadụ nwere na otú ha ga-esi anabata “okwu Chineke.” (Luk 8:​11-15) Dị ka ọgha mkpụrụ ahụ, ọ bụghị anyị ga-ekpebi mmadụ ole ga-ege anyị ntị ebe ọ bụ na ọ bụ otú obi ha dị ga-ekpebi ma hà ga-ege anyị ntị ma ọ bụ na ha agaghị ege. Ihe bụ́ ọrụ anyị bụ ịnọgide na-agha mkpụrụ nke Alaeze Chineke. Pọl onyeozi kwuru, sị: “A ga-akwụ onye ọ bụla n’ime ha ụgwọ ihe ọ rụrụ,” ọ bụghị dị ka ihe ọ rụpụtara si dị.​—1 Kọr. 3:8.

N’agbanyeghị na Noa ji obi ya niile kwusaa ozi ọma ọtụtụ afọ, o nweghị onye ọzọ so ya banye n’ụgbọ ahụ e wezụga ndị ezinụlọ ya. Ma, ọ nọgidere na-erubere Chineke isi ma jezuo ozi ya (A ga-akọwa ya paragraf nke 11)

11. Gịnị mere Jehova ji were Noa ka onye mere nke ọma n’ozi ya n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị egeghị ya ntị? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

11 Ndị mmadụ egeghị ọtụtụ ndị fere Jehova n’oge gara aga ntị. Dị ka ihe atụ, Noa bụ “onye nọ na-ekwusa ihe bụ́ ezi omume” ruo ihe dị ka afọ iri anọ ma ọ bụ afọ iri ise. (2 Pita 2:5) O doro anya na Noa tụrụ anya na ndị mmadụ ga-ege ya ntị. Ma Jehova ekweghị ya nkwa na ọ ga-adị otú ahụ. Kama, mgbe Jehova na-agwa ya ka ọ rụọ ụgbọ ahụ, ọ sịrị ya: “Ị ga-abanye n’ụgbọ ahụ, gị na ụmụ gị na nwunye gị na ndị nwunye ụmụ gị.” (Jen. 6:18) Ọ bụrụkwa na Noa chere gbasara otú ụgbọ ahụ ọ ga-arụ ga-aha, ọ ga-abụ na ọ matara na ọtụtụ ndị agaghị ege ya ntị. (Jen. 6:15) Ma, mgbe e mechara, o nwedịghị otu onye chegharịrị n’ụwa ọjọọ ahụ. (Jen. 7:7) Nke ahụ ò mere ka Jehova were ya na Noa arụtaghị ọrụ ya? Mba. N’anya Jehova, Noa mere nke ọma n’ihi na o mere ihe niile Jehova gwara ya mee.​—Jen. 6:22.

12. Gịnị mere Jeremaya onye amụma ji nwee ọṅụ n’ozi ya n’agbanyeghị mmegide nakwa na ọtụtụ ndị egeghị ya ntị?

12 Jeremaya onye amụma kwusakwara ozi ọma ọtụtụ afọ n’agbanyeghị mmegide nakwa na ọtụtụ ndị egeghị ya ntị. Obi dara ya mbà n’ihi na ndị mmegide na-akwa ya “emo, na-akparịkwa” ya, ya achọwadị ịkwụsị ozi ya. (Jere. 20:​8, 9) Ma Jeremaya akwụsịghị ozi ya. Olee ihe nyeere ya aka ịnọgide n’ozi ya ma na-enwe ọṅụ? E nwere ihe abụọ o lekwasịrị anya. Nke mbụ, ozi Jehova ọ na-ezi ndị mmadụ bụ gbasara “ọdịnihu” na “olileanya.” (Jere. 29:11) Nke abụọ, Jehova mere Jeremaya ọnụ na-ekwuru ya. (Jere. 15:16) Anyị na-ezikwa ndị mmadụ ozi ọma ga-eme ka ha nwee olileanya n’ụwa a olileanya na-adịghị, na-azakwa Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ihe abụọ a nyeere Jeremaya aka, ọ ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ n’ozi anyị n’agbanyeghị ma ndị mmadụ hà gere anyị ntị ma ọ bụ na ha egeghị.

13. Olee ihe anyị na-amụta n’ihe atụ Jizọs dị na Mak 4:​26-29?

13Ọ na-ewe ogologo oge tupu mmadụ enwee okwukwe. Jizọs mere ka nke a doo anya n’ihe atụ o mere gbasara ọgha mkpụrụ ahụ na-ehi ụra. (Gụọ Mak 4:​26-29.) Mkpụrụ ọ ghara ji nwayọọ nwayọọ too. O nweghị ihe ọ ga-emeli ka mkpụrụ ahụ too ngwa ngwa. O nwekwara ike iwe oge tupu onye ị na-amụrụ ihe emewe ihe ọ na-amụta. Otú ahụ onye ọrụ ubi na-agaghị amanyeli mkpụrụ ọ kụrụ ka o too otú yanwa chọrọ, anyị agaghịkwa amanyeli onye anyị na-amụrụ ihe ka ọ na-eme nke ọma otú anyị si chọọ. N’ihi ya, adala mbà ma ọ bụrụ na ọ na-ewe oge karịa otú i chere tupu onye ị na-amụrụ ihe emewe nke ọma. Dị ka ọrụ ubi, ime ndị na-eso ụzọ chọrọ ndidi.​—Jems 5:​7, 8.

14. Olee ihe gosiri na o nwere ike iwe oge tupu ndị mmadụ egewe anyị ntị n’ozi anyị?

14 E nwere ike a gaghị ahụ ihe ozi ọma anyị na-arụpụta n’ebe ụfọdụ ruo ọtụtụ afọ. Legodị ihe mere Nwanna Nwaanyị Gladys Allen na nwanne ya Ruby. N’afọ 1959, e zigara ha ka ha gaa bụrụ ndị ọsụ ụzọ oge niile na Kwebek dị na Kanada. * Ọtụtụ ndị ebe ahụ ekweghị ege ntị n’ozi ọma n’ihi na ha na-atụ ụjọ ihe ndị agbata obi ha na ndị isi chọọchị ga-eme ha. Gladys sịrị: “Anyị na-eji awa asatọ aga ozi ụlọ n’ụlọ kwa ụbọchị ruo afọ abụọ n’enweghị onye gere anyị ntị. Ihe ha na-eme bụ, ha rute n’ọnụ ụzọ hụ anyị, ha alaghachi azụ. Ma ike agwụghị anyị.” Mgbe oge na-aga, ndị obodo ahụ malitere ịgbanwe. Ha malitekwara ige ntị n’ozi ọma. E nwere ọgbakọ atọ n’ebe ahụ ugbu a.​—Aịza. 60:22.

15. Gịnị ka 1 Ndị Kọrịnt 3:​6, 7 na-akụziri anyị gbasara ime ndị na-eso ụzọ?

15Ime ndị na-eso ụzọ abụghị ọrụ otu onye. Ọ bụ mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-enyere mmadụ aka ka o ruo eruo ime baptizim. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:​6, 7.) Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwere ike inye onye nwere mmasị traktị ma ọ bụ magazin n’ozi ọma. Ma, ohere nwanna ahụ ekweghị ya gaghachi na nke onye ahụ, ya agwa nwanna ọzọ ka ọ gaara onye ahụ nletaghachi. Nwanna ahụ agaa na nke onye ahụ, ya na ya amalite ịmụ Baịbụl. Ya emechaakwa kpọrọ ụmụnna ndị ọzọ gaa mụọrọ onye ahụ ihe. Onye nke ọ bụla n’ime ha si n’ụzọ dị iche iche gbaa ya ume. Nwanna ọ bụla gbara ya ume nyeere ya aka ime nke ọma. Ihe a ga-eme ka mmadụ niile gbakọrọ aka nyere onye ahụ aka nwee obi ụtọ ma onye ahụ mee baptizim.​—Jọn 4:​35-38.

16. Gịnị mere i kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ n’ozi gị ọ bụrụgodị na ọrịa ekweghị gị ma ọ bụkwanụ na ike gị agbadala?

16 Ọ bụrụkwanụ na i nweghị ike ikwusa ozi ọma otú ị na-emebu n’ihi ọrịa ma ọ bụkwanụ na ike gị agbadala? Ị ka nwekwara ike ịna-enwe ọṅụ na ị na-eme ike gị n’ikwusa ozi ọma. Legodị ihe mere mgbe Eze Devid na ndị agha ya gara napụta ndị ezinụlọ ha na ngwongwo ha ndị agha Amalek kwakọọrọ. Ike gwụrụ narị mmadụ abụọ n’ime ha, ha anọrọzie na-eche ibu ha nche. Mgbe Devid na ndị agha ya gachara agha ahụ merie ma lọta, o kwuru ka e kenye onye ọ bụla n’ime ha òkè há nhata n’ihe nkwata ha napụtara ha. (1 Sam. 30:​21-25) Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị na-arụ n’ụwa niile, onye ọ bụla mere ike ya niile na-enwe ọṅụ mgbe a napụtara otu onye n’ụwa ọjọọ a ma nyere ya aka ije ije n’ụzọ na-eduba ná ndụ.

17. Olee ihe anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova maka ya?

17 Anyị na-ekele Jehova maka ụzọ magburu onwe ya o si ele ozi anyị na-ejere ya anya. Ọ ma na ọ bụghị anyị ka ọ dị n’aka ime ka ndị mmadụ gee anyị ntị n’ozi anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-ahụ mbọ anyị na-agba n’ozi ya, na-ahụkwa na o si anyị n’obi. Ọ ga-akwụkwa anyị ụgwọ maka ya. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-enwe ọṅụ n’ihe ọ bụla anyị nwere ike ime n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị na-arụ. (Jọn 14:12) Obi kwesịrị isi anyị ike na ozi anyị na-ejere Jehova na-amasị ya ọ bụrụhaala na anyị adaghị mbà.

ABỤ NKE 67 “Kwusaa Okwu Chineke”

^ par. 5 Obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na ndị mmadụ egee ntị n’ozi ọma anyị, na-ajọkwa anyị njọ ma ha jụ ige anyị ntị. Ma, ọ bụrụkwanụ na onye ị na-amụrụ ihe anaghị eme nke ọma, ma ọ bụkwanụ na o nwetụbeghị onye i nyeere aka ya emee baptizim? Nke ahụ ọ̀ ga-eme ka ị sị na ị naghị eme nke ọma n’ozi gị? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere anyị ga-eji na-eme nke ọma n’ozi anyị nakwa otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ma è gere anyị ntị ma ọ bụ na e geghị anyị ntị.

^ par. 3 Gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2005, peeji nke 205 ruo na nke 211.

^ par. 14 Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Nwaanyị Gladys Allen isiokwu ya bụ “Agaghị M Agbanwe Ihe Ọ Bụla!” Ọ gbara n’Ụlọ Nche September 1, 2002.