Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 40

Gịnị Bụ Ezigbo Nchegharị?

Gịnị Bụ Ezigbo Nchegharị?

“Abịara m ịgwa ndị mmehie ka ha chegharịa.”​—LUK 5:32.

ABỤ NKE 36 Anyị Na-echebe Obi Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị dị iche n’ihe ndị eze abụọ ahụ mere, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha?

KA ANYỊ kwuo gbasara ndị eze abụọ biri ndụ ọtụtụ afọ gara aga. Otu n’ime ha chịrị alaeze ebo iri nke Izrel, onye nke ọzọ achịa alaeze ebo abụọ nke Juda. Ọ bụ eziokwu na ha biri ndụ n’oge dị iche iche, ma ọtụtụ ihe ha mere yiri. Ha abụọ nupụụrụ Jehova isi, meekwa ka ndị ha na-achị mehie. Ha abụọ fere arụsị, gbuokwa ndị mmadụ. Ma, e nwere otu ihe dị iche na ha abụọ. Otu n’ime ha megidere ihe ọjọọ ruo mgbe ọ nwụrụ, ma onye nke ọzọ chegharịrị, Jehova agbagharakwa ya mmehie ya niile. Olee ndị ha bụ?

2 Otu n’ime ha bụ Ehab eze Izrel, onye nke ọzọ abụrụ Manase eze Juda. Ihe dị iche n’ihe ha abụọ mere ga-akụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara nchegharị. (Ọrụ 17:30; Rom 3:23) Gịnị bụ nchegharị? Oleekwa otú mmadụ si egosi na o chegharịala? Anyị kwesịrị ịmata azịza ha n’ihi na anyị chọrọ ka Jehova gbaghara anyị ma anyị mee mmehie. Iji zaa ajụjụ ndị a, anyị ga-eleba anya n’otú ndị eze abụọ ahụ si bie ndụ nakwa ihe anyị nwere ike ịmụta na ya. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe Jizọs kụziri gbasara nchegharị.

IHE ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA N’IHE EZE EHAB MERE

3. Olee ụdị eze Ehab bụ?

3 Ehab bụ eze nke asaa chịrị alaeze ebo iri nke Izrel. Ọ lụrụ nwaanyị aha ya bụ Jezibel, bụ́ ada eze Saịdọn. Saịdọn bụ mba bara ọgaranya dị n’ebe ugwu ala Izrel. O nwere ike ịbụ na ọlụlụ ahụ ọ lụrụ Jezibel mere ka mba Izrel baa ọgaranya. Ma, o mere ka mba Izrel mehie Jehova. Jezibel na-efe Bel, o mekwara ka Ehab na-akwado okpukpe a jọgburu onwe ya nke na-eme ka ndị mmadụ na-akwa iko n’ụlọ nsọ ma na-eji ụmụ ha achụ àjà. Mgbe Jezibel bụ eze nwaanyị n’Izrel, ọ chọghị iji anya ahụ ndị amụma Jehova. O gbukwara ọtụtụ n’ime ha. (1 Eze 18:13) Ehab n’onwe ya “mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova karịa ndị niile bu ya ụzọ.” (1 Eze 16:30) Jehova hụrụ ihe niile Ehab na Jezibel mere. Ma, n’ihi obi ebere ya, o ziteere ha Ịlaịja onye amụma ka ọ dọọ ha aka ná ntị ka ha chegharịa mgbe oge ka dị. Ma, Ehab na Jezibel ekweghị echegharị.

4. Olee ihe Jehova kwuru na ọ ga-eme Ehab? Gịnị ka Ehab mere gbasara ya?

4 Jehova mechara kpebie ime ihe. O zigara Ịlaịja ka ọ gaa gwa Ehab na Jezibel ihe ọ ga-eme ha. Ọ ga-egbu ezinụlọ ha niile. Ihe ahụ Ịlaịja gwara Ehab wutere ya nke ukwuu. O mere ka Ehab bụ́ nwoke dị ezigbo mpako ‘weda onwe ya ala.’​—1 Eze 21:​19-29.

Ehab tụbara onye amụma Chineke n’ụlọ mkpọrọ. Nke ahụ gosiri na o chegharịghị n’eziokwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6) *

5-6. Gịnị gosiri na Ehab echegharịghị n’eziokwu?

5 Ọ bụ eziokwu na Ehab weturu onwe ya ala mgbe Jehova kwuru ihe ọ ga-eme ezinụlọ ya, ihe o mechara mee gosiri na o chegharịghị n’eziokwu. Ọ gbalịghị ịkwụsị ofufe Bel n’Izrel. Ọ gbakwanụghị ndị mmadụ ume ka ha fewe Jehova. Ihe ndị ọzọ Ehab mere gosikwara na o chegharịghị n’eziokwu.

6 Mgbe Ehab gwara Jehoshafat bụ́ eze Juda ka o soro ya gaa lụso ndị Siria agha, Jehoshafat gwara ya ka ha buru ụzọ jụọ onye amụma Jehova ihe ha ga-eme. Ná mmalite, Ehab ekweghị eme ihe o kwuru. Ọ sịrị: “A ka nwere otu nwoke anyị ga-esi n’aka ya jụọ Jehova ase. Ma akpọrọ m ya asị, n’ihi na o nweghị mgbe ọ na-eburu m amụma ihe ọma. Naanị ihe ọ na-eburu m bụ amụma ihe ọjọọ.” N’agbanyeghị ihe ahụ o kwuru, ha mechara gakwuru Mịkaya onye amụma. Ihe Ehab kwuru mere. Mịkaya onye amụma gwara ha ihe ọjọọ ga-eme Ehab. Kama Ehab ime ihe ozugbo ka Jehova gbaghara ya, ọ tụbara onye amụma ahụ n’ụlọ mkpọrọ. (1 Eze 22:​7-9, 23, 27) N’agbanyeghị na Ehab tụbara Mịkaya onye amụma n’ụlọ mkpọrọ, o meghị ka amụma ahụ Mịkaya buru ghara imezu n’isi ya. Mgbe ha gara agha ahụ, e gburu Ehab.​—1 Eze 22:​34-38.

7. Gịnị ka Jehova kwuru gbasara Ehab mgbe ọ nwụchara?

7 Mgbe Ehab nwụrụ, Jehova kwuru otú o si were Ehab. Mgbe Eze Jehoshafat si agha ahụ lọta n’udo, Jehova zigara Jihu onye amụma ka ọ gaa baara ya mba maka iso Ehab gaa agha. Onye amụma Jehova ahụ sịrị ya: “Ì kwesịrị ịna-enyere ndị ajọ omume aka, hụkwa ndị kpọrọ Jehova asị n’anya?” (2 Ihe 19:​1, 2) Chegodị ihe a, a sị na Ehab chegharịrị n’eziokwu, o doro anya na onye amụma ahụ agaraghị akpọ ya onye ajọ omume kpọrọ Jehova asị. Ọ bụ eziokwu na ihe Ehab mere wutere ya, mana o jighị obi ya niile chegharịa.

8. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta gbasara nchegharị n’ihe Ehab mere?

8 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Ehab mere? Mgbe ọ nụrụ ihe Ịlaịja onye amụma buru n’amụma gbasara ya na ezinụlọ ya, o bu ụzọ wetuo onwe ya ala. Ihe ahụ o mere dị mma. Ma, ihe ndị mechara mee gosiri na o jighị obi ya niile chegharịa. N’ihi ya, ihe onye ji obi ya chegharịa kwesịrị ime abụghị naanị ikwu na ihe o mere wutere ya. Ka anyị leba anya n’akụkọ ọzọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mmadụ iji obi ya niile chegharịa pụtara.

IHE ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA N’IHE EZE MANASE MERE

9. Olee ụdị eze Manase bụ?

9 Mgbe ihe dị ka narị afọ abụọ gachara, Manase ghọrọ eze Juda. O nwere ike ịbụ na o mere ihe ọjọọ karịa Ehab. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe ọjọọ o mere, nke kpasuru Jehova iwe, karịrị akarị.” (2 Ihe 33:​1-9) Manase rụụrụ arụsị dị iche iche ebe ịchụàjà, ọ kpụrụ ogwe osisi arụsị, nke nwere ike ịbụ chi nwaanyị ọmụmụ, n’ihu ụlọ nsọ Jehova. O mere anwansi, gbaa afa, meekwa mgbaasị. “Manase gburu ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha.” “Ọ kpọkwara ụmụ ya ọkụ” iji chụọrọ arụsị àjà.​—2 Eze 21:​6, 7, 10, 11, 16.

10. Olee otú Jehova si dọọ Manase aka ná ntị, oleekwa ihe Manase mere gbasara ya?

10 Manase mere ka Ehab. Ọ jụrụ aka ná ntị Jehova si n’ọnụ ndị amụma ya na-adọ ya. N’ikpeazụ, “Jehova mere ka ndị isi agha eze Asiria bịa lụso [Juda] agha. Ha jidekwara Manase, ganye nko n’ahụ́ ya, tụọkwa ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụga ya Babịlọn.” N’ebe ahụ, a tụrụ ya mkpọrọ. Ọ ga-abụ na Manase chebaara onwe ya echiche mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ. “Ọ nọkwa na-eweda nnọọ onwe ya ala n’ihu Chineke nna nna ya hà.” O nwekwara ihe ọzọ o mere. “Ọ rịọrọ Jehova bụ́ Chineke ya ka o meere ya amara.” “Ọ nọkwa na-ekpe ekpere.” Nke a gosiri na nwoke ọjọọ a agbanwewela. Ọ malitela ịhụ Jehova ka “Chineke ya,” na-ekpe ekpere mgbe niile.​—2 Ihe 33:​10-13.

Manase wepụrụ ikpere arụsị n’obodo ya. Nke ahụ gosiri na o chegharịrị n’eziokwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. Dị ka e kwuru ná 2 Ihe E Mere 33:​15, 16, olee otú Manase si gosi na ya ji obi ya niile chegharịa?

11 Jehova mechara za Manase ekpere ya. Ihe ndị Manase kpere n’ekpere gosiri na ọ gbanweela. N’ihi ya, Jehova gbaghaara ya ma mee ka ọ bụrụkwa eze ọzọ. Manase ji ohere ahụ gosi n’eziokwu na o chegharịala. O mere ihe Ehab na-emeghị. Ọ gbanwere àgwà ya. Ọ gbalịsiri ike iwepụ ikpere arụsị ma gbaa ndị ọzọ ume ka ha fewe Jehova. (Gụọ 2 Ihe E Mere 33:​15, 16.) Ọ dị ya mkpa inwe okwukwe na obi ike iji mee ihe a n’ihi na ruo ọtụtụ afọ, o mere ka ndị ezinụlọ ya, ndị a ma ama, na ndị ọ na-achị na-akpa àgwà ọjọọ. Ma ugbu a ọ kawara nká, ọ gbalịrị imezi ụfọdụ ihe ndị o mejọrọ. O nwere ike ịbụ ya mere nwa nwa ya aha ya bụ Josaya ji bụrụ ezigbo eze.​—2 Eze 22:​1, 2.

12. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta gbasara nchegharị n’ihe Manase mere?

12 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Manase mere? O mere ihe karịrị iwetu onwe ya ala. O kpere ekpere rịọ Jehova ka o meere ya ebere, gbanwee àgwà ya, gbalịakwa imezi ihe ndị o mejọrọ. O mekwara ike ya niile n’ofufe Jehova, nyekwara ndị ọzọ aka ka ha mee otú ahụ. Ihe Manase mere na-eme ka ndị mere mmehie dị oké njọ nwee olileanya na e nwere ike ịgbaghara ha mmehie ha. Akụkọ Manase na-egosi anyị na “Jehova dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” (Ọma 86:5) Jehova ga-agbaghara mmadụ ma o jiri obi ya niile chegharịa.

13. Mee ihe atụ ga-enyere anyị aka ịghọtakwu gbasara nchegharị.

13 Ihe Manase mere abụghị naanị igosi na ihe ọjọọ o mere wutere ya. Ihe a na-akụziri anyị ezigbo ihe gbasara nchegharị. Legodị ihe atụ a: Ka e were ya na ị gara n’ebe a na-eme keeki gwa ha ka ha nye gị keeki, ma kama onye na-ere ya inye gị keeki, ya enye gị àkwá, obi ọ̀ ga-adị gị mma? Mba. Ọ bụrụkwanụ na onye ahụ akọwaara gị na ọ bụ àkwá bụ isi ihe e ji eme keeki? Obi agakwaghị adị gị mma. Otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova, ọ chọrọ ka onye mmehie jiri obi ya niile chegharịa. Ọ bụrụ na ihe ọjọọ onye ahụ mere ewute ya, nke ahụ dị mma. Mana ọ bụghị naanị ya ka a chọrọ. Olee ihe ọzọ a chọrọ? O nwere ihe atụ Jizọs mere ga-enyere anyị aka.

OTÚ E SI AMA ONYE JI OBI YA CHEGHARỊA

Mgbe nwa mmefu ahụ chọpụtara na ihe o mere adịghị mma, o mere ogologo njem laghachi n’ụlọ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15) *

14. N’ihe atụ Jizọs mere, olee otú nwa mmefu ahụ si gosi na o chegharịwala?

14 E nwere ihe atụ Jizọs mere na Luk 15:​11-32 gbasara nwa mmefu. Otu nwa okorobịa nupụụrụ nna ya isi kwapụ n’ụlọ, kwaga “obodo dị anya.” N’ebe ahụ, ọ nọ na-ebi ndụ rụrụ arụ. Mgbe ihe bịara siere ya ike, o chebaara onwe ya ezigbo echiche. Ọ ghọtara na ihe kaara ya mma mgbe ọ nọ n’ụlọ nna ya. Jizọs kwuru na “anya doro” nwa okorobịa ahụ. O kpebiri ịlaghachi n’ụlọ rịọ nna ya ka ọ gbaghara ya. Ọ dị ezigbo mkpa na nwa okorobịa ahụ ghọtara na o mere ihe na-adịghị mma. Ma, ọ̀ bụ naanị ya ka a chọrọ? Mba. O kwesịrị ịgbanwe.

15. Olee otú nwa mmefu ahụ Jizọs ji mee ihe atụ si gosi na o chegharịala?

15 Nwa mmefu ahụ mere ihe gosiri na o ji obi ya niile chegharịa. O mere ogologo njem laghachi n’obodo ha. Mgbe ọ na-agwa nna ya okwu, ọ sịrị: “Emehiela m Chineke bi n’eluigwe, mehiekwa gị. Erukwaghị m eru ka a kpọọ m nwa gị.” (Luk 15:21) Ihe a nwa okorobịa ahụ si n’ala ala obi ya kwuo gosiri na ọ chọrọ ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Ọ ghọtara na ya emejọọla nna ya. Ọ dịkwa njikere ịgbalịsi ike ka ya na nna ya dịghachi ná mma. Ọ chọdịrị ka nna ya were ya ka otu n’ime ndị na-arụrụ ya ọrụ. (Luk 15:19) Ọ bụghị naanị na ihe atụ a na-eru n’obi, ndị okenye ọgbakọ ga-esi na ya mụta ezigbo ihe mgbe ha na-agbalị ịchọpụta ma nwanna mere mmehie dị oké njọ ò chegharịala n’eziokwu.

16. Gịnị nwere ike ime ka o siere ndị okenye ike ịchọpụta ma mmadụ ò chegharịala n’eziokwu?

16 Ọ naghị adịrị ndị okenye mfe ịchọpụta ma onye mere mmehie dị oké njọ ò chegharịala n’eziokwu. N’ihi gịnị? Ndị okenye enweghị ike ịma ihe dị mmadụ n’obi. N’ihi ya, ha na-agbalị ịchọpụta ma è nwere ihe na-egosi na nwanna ahụ echegharịala n’eziokwu. Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike mee mmehie jọgburu onwe ya nke nwere ike ime ka o siere ndị okenye na-eleba okwu ya anya ike ịmata ma ò chegharịala n’eziokwu.

17. (a) Olee ihe atụ na-egosi na naanị mmadụ ikwu na ihe o mere wutere ya ezughị igosi na o chegharịala n’eziokwu? (b) Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 7:​11, gịnị ka onye ji obi ya niile chegharịa kwesịrị ime?

17 Chegodị gbasara ihe atụ a. Otu nwanna lụrụ nwaanyị nọ na-akwa iko ruo ọtụtụ afọ. Kama ịga ka e nyere ya aka, o zochiiri ya nwunye ya, ndị enyi ya, na ndị okenye. N’ikpeazụ, ndị okenye mechara mata. Mgbe ha gosiri ya ihe gosiri na ọ na-akwa iko, o kwetara na o mere ya, meekwa ka ò wutere ya. Nke ahụ ò zuola igosi na o chegharịala? Mba. Ndị okenye ahụ ga-achọ ka o mee ihe karịrị igosi na o wutere ya. Ọ bụghị naanị otu ugboro ka o mere ihe ọjọọ a, kama o meela ya ọtụtụ afọ. Ọ bụghịkwa ya ji aka ya kwupụta ihe ọjọọ o mere, kama ọ bụ onye ọzọ hụrụ ya bịa kwuo. N’ihi ya, ndị okenye ga-achọ ịhụ ihe gosiri na ihe o mere wutere ya nakwa na ọ gbanweela otú o si eche echiche na otú o si akpa àgwà. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 7:11.) O nwere ike iwe ọtụtụ oge tupu ya emee ihe ndị gosiri na o chegharịala. O nwekwara ike ịbụ na a ga-achụ ya n’ọgbakọ ruo mgbe o chegharịrị.​—1 Kọr. 5:​11-13; 6:​9, 10.

18. Olee otú onye a chụrụ n’ọgbakọ ga-esi egosi na o chegharịala, gịnịkwa ga-eme ma ọ bụrụ na onye ahụ echegharịala n’eziokwu?

18 Onye a chụrụ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-abịachi ọmụmụ ihe anya, na-emekwa ihe ndị okenye gwara ya nke bụ́ ikpechi ekpere anya na ịmụchi ihe anya iji gosi na o ji obi ya niile chegharịa. O kwesịkwara ịgbalịsi ike zere ihe ndị ahụ mere o ji mee mmehie. Ọ bụrụ na ọ gbalịsie ike mee ka ya na Jehova dịghachi ná mma, obi ga-esi ya ike na Jehova ga-agbaghara ya kpamkpam. Ndị okenye ga-anabatakwa ya n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ndị okenye elebawa okwu onye mere mmehie anya, ha na-eburu n’obi na okwu nke ọ bụla dị iche n’ibe ya. N’ihi ya, ha na-asa anya ná mmiri eleba okwu nke ọ bụla anya.

19. Gịnị ka onye chegharịrị n’eziokwu kwesịrị ime? (Ezikiel 33:​14-16)

19 Dị ka anyị mụtara, ihe na-egosi na mmadụ echegharịala abụghị naanị onye ahụ ikwu na ihe o mere wutere ya, o kwesịrị ịgbanwe otú o si eche echiche na otú o si akpa àgwà ma na-eme ihe ndị gosiri na o chegharịala. Ọ ga-akwụsị àgwà ọjọọ ya ma na-eme ihe Jehova chọrọ. (Gụọ Ezikiel 33:​14-16.) Ihe kwesịrị ịbụ mkpa onye ahụ mere mmehie bụ ime ka ya na Jehova dịghachi ná mma.

NYERE NDỊ MMEHIE AKA KA HA CHEGHARỊA

20-21. Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye mere mmehie dị oké njọ aka?

20 Jizọs kwuru otu ihe dị mkpa n’ozi ya. Ọ sịrị: “Abịara m ịgwa ndị mmehie ka ha chegharịa.” (Luk 5:32) O kwesịrị ịdịkwa anyị otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na ezigbo enyi anyị mere mmehie dị oké njọ, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

21 Anyị na-eme enyi anyị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị ekpuchie mmehie ahụ. Anyị agakwanụghị ekpuchili ya n’ihi na Jehova na-ahụ ya. (Ilu 5:​21, 22; 28:13) Otú ị ga-esi enyere enyi gị aka bụ ịgwa ya ka ọ gakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka. Ọ bụrụ na ọ jụ ịgwa ndị okenye, gịnwa kwesịrị ịga gwa ha ya. I mee otú ahụ, o gosiri na ị chọrọ inyere ya aka. Ihe ahụ o mere nwere ike ime ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma.

22. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-esonụ?

22 Ọ bụrụkwanụ na onye ahụ emeela mmehie ahụ ruo ọtụtụ oge nke na ndị okenye kpebiri na a ga-achụ ya n’ọgbakọ, ò gosiri na ha emereghị ya ebere? N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova si enye ndị mere mmehie ntaramahụhụ, na-emetakwara ha ebere, nakwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya.

ABỤ NKE 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị

^ par. 5 Ihe onye ji obi ya niile chegharịa na-eme abụghị naanị ikwu na mmehie o mere na-ewute ya. Isiokwu a ga-eji ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl kụziere anyị ihe mmadụ iji obi ya niile chegharịa pụtara. Ndị ahụ bụ, Eze Ehab, Eze Manase, na nwa mmefu Jizọs ji mee ihe atụ. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịtụle ihe ụfọdụ ndị okenye kwesịrị ichebara echiche ma ha kpebiwe ma onye mere mmehie dị oké njọ ò chegharịala n’eziokwu.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: Ebe Eze Ehab ji iwe na-agwa ndị nche ya ka ha kpọchie Mịkaya onye amụma.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe Eze Manase na-agwa ndị ọrụ ka ha bibie arụsị ọ kpụrụ n’ụlọ nsọ.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ebe ike gwụrụ nwa mmefu ahụ n’ihi ogologo njem o gara. Obi ruru ya ala mgbe o lepụrụ anya hụ ụlọ ha n’ebe dị anya.