ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 41
Ị Ga-enweli Ezigbo Obi Ụtọ
“Onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova ma na-eme ihe ọ chọrọ na-enwe obi ụtọ.”—ỌMA 128:1.
ABỤ NKE 110 “Ọṅụ Jehova”
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ihe Chineke kenyere n’ime anyị? Oleekwa otú o si gbasa inwe obi ụtọ?
EZIGBO obi ụtọ abụghị obi dịtụ mmadụ ụtọ ugbu a, obere oge, obi ajọwa ya njọ. Mmadụ ga-enweli ezigbo obi ụtọ ná ndụ ya niile. Olee otú e si enwe ya? Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ sịrị: “Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ.” (Mat. 5:3) Jizọs ma na e kere ndị mmadụ ka ha na-achọsi ike ịmata Onye kere ha bụ́ Jehova Chineke ma na-efe ya. Ọ bụ ihe Chineke kenyere n’ime anyị. Ebe ọ bụ na Jehova bụ ‘Chineke obi ụtọ,’ ndị na-efe ya nwekwara ike inwe obi ụtọ.—1 Tim. 1:11.
2-3. (a) Olee ndị ọzọ Jizọs kwuru ga-enweli obi ụtọ? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa?
2 Ọ̀ bụ mgbe ihe niile zuuru anyị ka anyị ga-enwe obi ụtọ? Mba. N’ihe ahụ Jizọs kụziri n’elu ugwu, o kwuru ihe nwere ike iju mmadụ anya. Ọ sịrị na “ndị na-eru uju” ga-enweli obi ụtọ. O nwere ike ịbụ ndị obi na-ama ikpe maka ihe ọjọọ ha mere ma ọ bụ ndị nsogbu siri ike bịaara. Jizọs kwukwara otu ihe ahụ banyere “ndị a kpagburu n’ihi ezi omume” ma ọ bụ ndị a na-akọcha maka na ha na-eso ụzọ ya. (Mat. 5:4, 10, 11) Ma, olee otú ụdị ndị ahụ nwere ike isi na-enwe ezigbo obi ụtọ?
3 Ihe Jizọs na-akụziri anyị bụ na ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ abụghị maka na ihe niile zuuru anyị, kama ọ bụ maka na anyị na-amụtakwu gbasara Chineke, na-abịarukwa ya nso. (Jems 4:8) Olee otú anyị ga-esi eme ya? N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ihe atọ anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike ịna-enwe obi ụtọ.
NA-AGỤ MA NA-AMỤ OKWU CHINEKE
4. Olee ihe mbụ anyị kwesịrị ime iji na-enwe obi ụtọ? (Abụ Ọma 1:1-3)
4 IHE NKE 1: Anyị chọọ inwe ezigbo obi ụtọ, anyị kwesịrị ịna-agụ ma na-amụ Okwu Chineke. Jizọs ji Okwu Chineke tụnyere nri. Ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ kwesịrị ịna-eri nri ka ha nwee ike ịdị ndụ. Ma, ọ bụ naanị ndị mmadụ ga-agụli Okwu Chineke. Ha kwesịkwara ịna-eme otú ahụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta.” (Mat. 4:4) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka otu ụbọchị gafee n’agụghị Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. Otu ọbụ abụ sịrị: ‘Onye ọ bụla iwu Jehova na-atọ ụtọ na onye na-agụ iwu ya ehihie na abalị na-enwe obi ụtọ.’—Gụọ Abụ Ọma 1:1-3.
5-6. (a) Olee ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl? (b) Olee uru ịgụ Baịbụl nwere ike ịbara anyị?
5 Otú Jehova si hụ anyị n’anya mere ka o si na Baịbụl mee ka anyị mata otú anyị ga-esi na-enwe ezigbo obi ụtọ. Anyị amụtala ihe o bu n’obi kee anyị. Anyị amụtala otú anyị na ya ga-esi na-adị ná mma nakwa ihe anyị ga-eme ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị. Anyị amụtakwala ihe ndị magburu onwe ha o kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu. (Jere. 29:11) Eziokwu ndị a anyị mụtara na Baịbụl na-eme ka obi bụrụ anyị sọ aṅụrị.
6 Anyị makwa na ihe juru na Baịbụl bụ ndụmọdụ ndị na-abara anyị uru kwa ụbọchị. Anyị mee ha, anyị ga na-enwe obi ụtọ. Mgbe ọ bụla nsogbu mere ka ike gwụwa gị, wepụtakwuo oge na-agụ Okwu Jehova ma na-atụgharị uche na ya. Jizọs sịrị: “Ọ bụ ndị na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya na-enwe obi ụtọ.”—Luk 11:28.
7. Olee otú ị ga-esi eme ka oge i ji agụ Okwu Chineke baara gị ezigbo uru?
7 Ị gụwa Okwu Chineke, wepụta oge chebara ihe ị na-agụ echiche. Dị ka ihe atụ, è nwetụla mgbe mmadụ siri ụdị nri na-atọgbu gị atọgbu? Ma, n’ihi na ọ dị gị ọsọ ọsọ ma ọ bụkwanụ na uche gị dị n’ihe ọzọ, i riri ya ọkụ ọkụ n’ewetughị obi tarie ya nke ọma ka ị nụ ụtọ ya. Ozugbo i richara, ọ bịara doo gị anya na i riri ya ọkụ ọkụ, gị echewezie na a sị na ị ma, ị gaara ejiri ya nwayọọ ka obere nke ọ bụla n’ime ya tọọ gị ụtọ n’ọnụ. È nwetụla mgbe ị gụrụ Baịbụl ọkụ ọkụ, ya emee ka ị ghara ịmụta ihe ọ na-ekwu? Ị chọọ ịgụ Baịbụl ka ọ tọọ gị ụtọ, agbala ya ọsọ. Were ya na ị na-ahụ ebe akụkọ ị na-agụ na-eme, na-anụ olu ndị ị na-agụ akụkọ ha, na-echebakwara ihe ị na-agụ echiche. Ime otú ahụ ga-eme ka ị na-enwekwu obi ụtọ.
8. Olee otú “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” si arụ ihe o kwesịrị ịrụ? (Kọwaakwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
8 Jizọs họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ na-enye anyị nri n’oge kwesịrị ekwesị. Ohu ahụ jikwa Okwu Chineke na-enyeju anyị afọ. b (Mat. 24:45) Ọ bụ Okwu Chineke bụ isi sekpụ ntị n’ihe niile ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ewepụtara anyị. (1 Tesa. 2:13) Ihe ohu ahụ ji enyeju anyị afọ na-enyere anyị aka ịmata uche Jehova, nke e dere na Baịbụl. Ọ bụ ya mere anyị ji agụ Ụlọ Nche na Teta! nakwa isiokwu ndị dị na jw.org. Anyị na-akwadebe maka ọmụmụ ihe etiti izu na nke ngwụcha izu. Anyị na-elekwa Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova a na-ewepụta kwa ọnwa. Ọ bụrụ na anyị na-amụ ihe ndị a ohu ahụ na-ewepụtara anyị, ọ ga-enyere anyị aka ime ihe nke abụọ ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ.
NA-ERUBERE IWU JEHOVA ISI
9. Olee ihe nke abụọ anyị ga-eme iji na-enwe ezigbo obi ụtọ?
9 IHE NKE 2: Anyị chọọ ịna-enwe obi ụtọ, anyị kwesịrị ịna-erubere iwu Jehova isi. Otu ọbụ abụ dere, sị: “Onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova ma na-eme ihe ọ chọrọ na-enwe obi ụtọ.” (Ọma 128:1) Ịtụ egwu Jehova pụtara na otú anyị si akwanyere ya ùgwù ga-eme ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-ewe ya iwe. (Ilu 16:6) N’ihi ya, anyị na-agbalịsi ike ka anyị na-erube isi n’iwu Chineke nyere na Baịbụl gbasara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (2 Kọr. 7:1) Anyị ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Jehova chọrọ ma jụ ihe ndị ọ kpọrọ asị.—Ọma 37:27; 97:10; Rom 12:9.
10. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 12:2, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
10 Gụọ Ndị Rom 12:2. Mmadụ nwere ike ịma na ọ bụ Jehova kwesịrị ịna-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, onye ahụ kwesịrị ịna-eme ihe ndị ahụ Jehova kpebiri. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ịma na ọ bụ ndị ọchịchị kwesịrị ikpebi otú onye na-anya ụgbọala ga-eferu ọsọ n’okporo ụzọ awara awara. Ma, o nwere ike ọ gaghị achọ irubere ha isi. N’ihi ya, o nwere ike ịna-agba ọnwụ ọnwụ. Ọ bụ omume anyị ga-egosi ma ànyị kwetara n’eziokwu na ihe ga-akacha baara anyị uru bụ irubere iwu Jehova isi. (Ilu 12:28) Otú ahụ ka ọ dị Devid n’obi. Ọ bụ ihe mere o ji sị Jehova: “Ị na-eme ka m mara ụzọ ndụ. Onye nọ n’ihu gị na-enwe ọṅụ na-enweghị atụ. Onye nọ n’aka nri gị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 16:11.
11-12. (a) Mgbe anyị na-echegbu onwe anyị ma ọ bụ mgbe obi na-ajọ anyị njọ, gịnị ka anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime? (b) Olee otú ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 4:8 nwere ike isi enyere anyị aka mgbe anyị na-ahọrọ ihe anyị ji atụrụ ndụ?
11 Mgbe anyị na-echegbu onwe anyị ma ọ bụ mgbe obi na-ajọ anyị njọ, anyị nwere ike ịchọwa ime ihe ga-enyere anyị aka ịkwụsị ichegbu onwe anyị. O kwere nghọta. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ihe Jehova kpọrọ asị.—Efe. 5:10-12, 15-17.
12 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Filipaị, ọ gwara Ndị Kraịst na ihe ha kwesịrị ịna-echebara echiche bụ ‘ihe ziri ezi, ihe dị ọcha, ihe na-eme ka mmadụ hụ ibe ya n’anya, na ihe bụ́ omume ọma.’ (Gụọ Ndị Filipaị 4:8.) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ntụrụndụ ka Pọl na-ekwu gbasara ya, ma ihe o dere kwesịrị inyere anyị aka ịhọrọ ihe anyị ga-eji na-atụrụ ndụ. Megodị ihe a: N’ebe ọ bụla e dere “ihe” n’amaokwu a, jiri okwu bụ́ “abụ,” “vidio,” “akwụkwọ ọgụgụ,” ma ọ bụ “egwuregwu vidio” dochie ya. I mee ya, ọ ga-enyere gị aka ịmata ndị nke nwere ike ịdị Chineke mma na ndị nke na-agaghị adị ya mma. Anyị chọrọ ịna-erube isi n’iwu ndị magburu onwe ha Jehova nyere anyị. (Ọma 119:1-3) Anyị mee ya, akọnuche anyị agaghị na-ama anyị ikpe ma anyị mewe ihe nke atọ na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ.—Ọrụ 23:1.
WERE IFE JEHOVA KA IHE KACHA MKPA
13. Olee ihe nke atọ anyị kwesịrị ime iji na-enwe ezigbo obi ụtọ? (Jọn 4:23, 24)
13 IHE NKE 3: Mee ka ife Jehova bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. Ebe ọ bụ Jehova kere anyị, ọ bụ ya ka anyị kwesịrị ịna-efe. (Mkpu. 4:11; 14:6, 7) N’ihi ya, ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa bụ ife ya otú ọ chọrọ, ya bụ, “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Gụọ Jọn 4:23, 24.) Anyị chọrọ ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị ka anyị nwee ike ịna-efe ya otú dabara n’eziokwu ndị e dere n’Okwu ya. Anyị kwesịrị iwere ofufe ya ka ihe kacha mkpa ọ bụrụgodị na anyị bi n’ebe a machiri ozi ọma anyị iwu ma ọ bụ sị anyị emela ihe ụfọdụ. Ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ ugbu a naanị maka na ha bụ Ndịàmà Jehova karịrị otu narị. c Ma, ha ji obi ụtọ na-eme ihe ọ bụla ha ga-emeli ka ha nwee ike ịna-ekpe ekpere, na-amụ ihe, na-agwakwa ndị ọzọ banyere Chineke anyị na Alaeze ya. Mgbe a na-akọcha anyị ma ọ bụ na-akpagbu anyị, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na Jehova nọnyeere anyị nakwa na ọ ga-akwụ anyị ụgwọ.—Jems 1:12; 1 Pita 4:14.
ONYE ANYỊ GA-AMỤTA IHE N’AKA YA
14. Olee ihe e mere otu nwanna bụ́ nwa okorobịa n’obodo Tajikistan? N’ihi gịnịkwa?
14 Ihe ndị na-eme eme na-egosi na ihe atọ ndị ahụ anyị ka kwupụrụ banyere ha ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. Chegodị ihe e mere otu nwanna dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Jovidon Bobojonov. Ọ bụ onye Tajikistan. O kweghị abụ onye amị. N’abalị anọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2019, a bịara n’ụlọ ya kpụrụ ya, gaa kpọchie ya ruo ọtụtụ ọnwa, na-eme ya ka ọ̀ bụ onye omekome. Ndị na-agbasa akụkọ ná mba dị iche iche kọrọ banyere otú e si na-emegbu ya. A kọrọ na a kụrụ ya isi aba okpu iji manye ya ka ọ ṅụọ iyi na ya bụzi onye amị, yirikwa uwe ndị amị. Ụlọikpe mechara maa ya ikpe, zigakwa ya n’ụlọ mkpọrọ a ga na-ata ya ahụhụ. Ọ nọ ebe ahụ ruo mgbe onyeisi ala obodo ahụ gbaghaara ya ma nye iwu ka a hapụ ya. N’oge ahụ niile, Jovidon ekweghị enupụrụ Jehova isi. Ọ ka nọkwa na-enwe obi ụtọ. Olee otú o si mee ya? Ọ bụ ịna-egosi mgbe niile na ọ bụ Jehova kwesịrị ịna-eduzi ya.
15. Olee otú Nwanna Jovidon si na-amụ banyere Jehova mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ?
15 Mgbe Jovidon nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ kwụsịghị ịna-amụ banyere Jehova, ma mgbe ọ na-enweghị Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ anyị ọ bụla. Olee otú o si mee ya? Ụmụnna ndị bi nso na-ebutere ya nri ma deere ya ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ n’akpa ndị e ji bute nri ahụ. Otú ahụ ka o si na-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche na ya kwa ụbọchị. Mgbe o si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ndụmọdụ o nyere onye ọnwụnwa tara akpụ na-abịabereghị bụ: “Ọ dị ezigbo mkpa ka i jiri oge a i nweere onwe gị mee ihe niile ị ga-emeli ka i nwee ike ịna-agụ Baịbụl na akwụkwọ anyị iji mụtakwuo banyere Jehova.”
16. Olee ihe Nwanna Jovidon nọ na-eche banyere ya?
16 Nwanna Jovidon rubeere iwu Jehova isi. Kama ịnọ na-eche banyere ihe ọjọọ na-agụ mmadụ ma mewe omume na-adịghị mma, o chewere banyere Jehova na iwu ya. Iche gbasara ọmarịcha ihe ndị Chineke kere na-atọgbu ya atọgbu. O teta ụra n’ụtụtụ, ọ na-egere ubé ụmụ nnụnụ na abụ ha na-abụ. N’abalị, ọ na-anọ na-ele ọnwa na kpakpando. Ọ sịrị: “Onyinye ndị a Jehova nyere anyị gbara m ume, meekwa ka obi na-adị m ụtọ.” Ọ bụrụ na obi na-adị anyị ụtọ maka ihe niile Jehova na-enye anyị nakwa ihe ndị o ji Baịbụl na-akụziri anyị, obi ga na-adị anyị ụtọ. Obi ụtọ ahụ ga-emekwa ka anyị na-atachi obi.
17. Olee otú ihe e kwuru na 1 Pita 1:6, 7 si gbasa onye e mere ụdị ihe ahụ e mere Nwanna Jovidon?
17 Jovidon mekwara ka ife Jehova bụrụ ihe kacha ya mkpa. Ọ ma na irubere Jehova isi dị ezigbo mkpa. Jizọs sịrị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi.” (Luk 4:8) Ma ndị amị ma ndị isi ha chọrọ ka Nwanna Jovidon kwụsị ịbụ Onyeàmà Jehova. Kama ịkwụsị, o kpesiri ekpere ike ehihie na abalị, na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka ka ike ghara ịgwụ ya nakwa ka ọ ghara inupụrụ ya isi. N’agbanyeghị arụrụala niile a rụsara nwanna a, okwukwe ya kwụ chịm. N’ihi ya, obi dị ya ezigbo ụtọ ugbu a maka na e nwere ihe o nwere ugbu a nke ọ na-enweghị mgbe ahụ a kpụụrụ ya, kụọ ya ihe, ma tụọ ya mkpọrọ. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ okwukwe e mere ka o sie ezigbo ike.—Gụọ 1 Pita 1:6, 7.
18. Olee otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ?
18 Jehova ma ihe ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe atọ ndị ahụ na-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ, obi ga na-adị gị ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara gị. Ị ga-enwekwa ike ikwu, sị: “Ndị Jehova bụ Chi ha na-enwe obi ụtọ.”—Ọma 144:15.
ABỤ NKE 89 Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị
a Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike inwe ezigbo obi ụtọ n’ihi na ha na-achọ ya n’ebe ọ na-adịghị. Ha chere na ọ bụ ikpori ndụ, ịchụ akụnụba, ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ndị ọchịchị ga-eme ka obi na-adị ha ụtọ. Ma, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka obi na-adị ha ụtọ. N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe atọ nwere ike inyere anyị aka ịna-enwe ezigbo obi ụtọ.
b Guọ isiokwu bụ́ “Ị̀ Na-enweta ‘Nri n’Oge Kwesịrị Ekwesị’?” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2014.
c Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, chọọ okwu bụ́ “Ebe Ndị A Tụrụ Ndịàmà Jehova Mkpọrọ n’Ihi Ihe Ha Kweere” na jw.org.
d NKỌWA FOTO: Foto e ji gosi ebe ụmụnna na-akụrụ otu nwanna aka mgbe a nwụchiri ya, kpụrụ ya gawa ụlọikpe.