ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 43
Ezigbo Amamihe Na-eti Mkpu
“Ezigbo amamihe na-eti mkpu n’okporo ámá. Ọ na-etisi mkpu ike n’ámá obodo.”—ILU 1:20.
ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ihe ọtụtụ ndị na-eme taa ma ha nụ ezigbo amamihe dị na Baịbụl? (Ilu 1:20, 21)
N’ỌTỤTỤ obodo, a na-ahụkarị ka ụmụnna anyị guzo n’ebe na-ekwo ekwo, na-amụmụ ọnụ ọchị ka ha na-enye ndị na-agafe agafe akwụkwọ. Ì sotụla kwusaa ụdị ozi ọma a? Ọ bụrụ na i sotụla, o nwere ike ịbụ na o mere ka i chee gbasara ihe ahụ e kwuru n’Ilu, ya bụ, na amamihe na-eti mkpu n’ámá obodo ka ndị mmadụ nụ ndụmọdụ ya. (Gụọ Ilu 1:20, 21.) Ọ bụ na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl ka anyị ga-ahụ ezigbo amamihe, ya bụ, amamihe Jehova. Amamihe a dị ndị mmadụ ezigbo mkpa ka ha nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. Obi na-adị anyị ụtọ ma mmadụ nata akwụkwọ anyị. Ma, ọ bụghị mmadụ niile na-anara anyị ya. Ụfọdụ ndị achọghị ịmata ihe Baịbụl na-ekwu. Ụfọdụ ndị na-achị anyị ọchị. Ha chere na Baịbụl bụ akwụkwọ oge ya gaferela. E nwekwara ndị na-akatọ iwu ndị dị na Baịbụl. Ha na-ekwu na ndị na-edebe ha enweghị obi mmadụ nakwa na ha bụ ndị oké ezi omume. Ma, Jehova ka na-emekwa ka onye ọ bụla chọrọnụ nweta ezigbo amamihe. Olee otú o si eme ya?
2. Olee ebe anyị ga-enweta ezigbo amamihe? Oleekwa ihe ọtụtụ ndị họọrọ ime?
2 Otu ụzọ Jehova si eme ka anyị nweta ezigbo amamihe bụ n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ onye ọ bụla ga-enwetali Baịbụl. Akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl kwanụ? Jehova emeela ka ha dịrị n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Ndị na-ege ntị, ya bụ, ndị na-agụ ha ma na-eme ihe ha mụtara, ga-erite uru na ha. Ma, ọtụtụ ndị achọghị ige Jehova ntị. E nwee ihe ha chọrọ ikpebi, ọ na-akara ha mma ime ihe ha chere ma ọ bụ ihe ndị ọzọ chere. Ha nwere ike ịna-eleda anyị anya n’ihi na anyị họọrọ ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ihe mere ndị mmadụ ji eme otú ahụ. Ma, ka anyị burugodị ụzọ mata otú anyị nwere ike isi enweta amamihe Jehova.
ỊMATA JEHOVA NA-EME KA ANYỊ MARA IHE
3. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere ezigbo amamihe?
3 E nwere ike ịsị na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị anyị ma na-ekpebi ihe ndị dị mma. Ma, ọ bụghị naanị ya bụ ezigbo amamihe. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe bụ onye ahụ ịtụ egwu Jehova, ihe na-egosikwa na mmadụ na-aghọta ihe bụ onye ahụ ịmata Onye Kacha Nsọ.” (Ilu 9:10) N’ihi ya, ọ bụrụ na e nwere ihe dị mkpa anyị chọrọ ikpebi, anyị kwesịrị ịchọpụta ihe Jehova, bụ́ “Onye Kacha Nsọ,” chere gbasara ya. Otú anyị nwere ike isi eme ya bụ ịmụ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị nwere ezigbo amamihe.—Ilu 2:5-7.
4. Gịnị mere o ji bụrụ naanị Jehova ga-enyeli anyị ezigbo amamihe?
4 Ọ bụ naanị Jehova ga-enyeli anyị ezigbo amamihe. (Rom 16:27) Gịnị mere o ji bụrụ ya? Nke mbụ bụ na ọ bụ ya kere anyị. Ọ ma ihe niile gbasara ihe niile o kere eke. (Ọma 104:24) Nke abụọ bụ na ihe niile Jehova na-eme gosiri na ọ ma ihe. (Rom 11:33) Nke atọ bụ na ndụmọdụ Jehova na-abara onye gere ya ntị uru mgbe niile. (Ilu 2:10-12) Ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ezigbo amamihe, anyị ga-ekweta ihe atọ ndị a, kwekwa ka ha na-eduzi anyị n’ihe ndị anyị na-ekpebi na ihe ndị anyị na-eme.
5. Gịnị na-eme ma ndị mmadụ jụ ikweta na ọ bụ naanị Jehova ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo amamihe?
5 Ụfọdụ ndị anyị na-ahụ n’ozi ọma na-ekweta na ihe ndị dị ndụ dị ịtụnanya. Ma, ha ekwetaghị na e nwere Onye kere ha. Ha na-ekwu na ihe ndị ahụ nọkatara dịrị. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha kwetara na Chineke dị, ma ha weere Baịbụl ka akwụkwọ oge ya gaferela, kpebizie ịna-eme ihe dị ha mma. Gịnị ka ọ kpatarala? Ihe ọ̀ kala mma n’ụwa n’ihi na ndị mmadụ na-eme ihe dị ha mma kama ige Jehova ntị? Hà na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụ nwee ezigbo olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu? Ihe ndị anyị na-ahụ na-egosi anyị na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “E nweghị amamihe ma ọ bụ nghọta ma ọ bụ ndụmọdụ ọ bụla ga-aghasali nzube Jehova.” (Ilu 21:30) Ihe a kwesịrị nnọọ ime ka anyị na-arịọ Jehova ka o nye anyị ezigbo amamihe. Ma, ọtụtụ ndị anaghị eme otú ahụ. N’ihi gịnị?
IHE MERE NDỊ MMADỤ JI AJỤ EZIGBO AMAMIHE
6. Dị ka e kwuru n’Ilu 1:22-25, olee ndị na-anaghị ege ntị n’ezigbo amamihe?
6 Ọtụtụ ndị anaghị ege ntị mgbe “ezigbo amamihe na-eti mkpu n’okporo ámá.” Baịbụl kwuru na e nwere ụzọ ndị atọ jụrụ amamihe. Ha bụ “ndị na-amaghị ihe,” “ndị na-akwa ndị mmadụ emo,” na “ndị nzuzu.” (Gụọ Ilu 1:22-25.) Ka anyị leba anya n’ihe mere ndị a ji ajụ amamihe Jehova na ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ime ka ha.
7. Gịnị mere ụfọdụ ndị ji jiri aka ha kpebie ịbụ “ndị na-amaghị ihe”?
7 “Ndị na-amaghị ihe” bụ ndị na-ekwere ihe ọ bụla ha nụrụ na ndị a na-aghọgbu ngwa ngwa. (Ilu 14:15) Anyị na-ahụkarị ụdị ndị ahụ n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ọtụtụ nde mmadụ ndị isi okpukpe ma ọ bụ ndị ọchịchị na-aghọgbu. Ọ na-eju ụfọdụ n’ime ha anya ma ha chọpụta na ndị isi ndị ahụ na-aghara ha ụgha. Ma, ndị nke ahụ e kwuru okwu ha n’Ilu 1:22 kpebiri ịbụ ndị na-amaghị ihe n’ihi na ọ bụ otú ha si chọọ ya. (Jere. 5:31) Ha na-eme ihe ha chọrọ, ha achọghịkwa ịmụta ihe Baịbụl kwuru ma ọ bụ irubere iwu ya isi. Ọtụtụ n’ime ha na-eche ihe otu nwaanyị bi na Kwebek dị na Kanada chere. Nwaanyị ahụ ejighị okpukpe ya egwu egwu. Ọ gwara Onyeàmà Jehova bịara izi ya ozi ọma, sị: “Ọ bụrụ na ụkọchukwu anyị na-eduhie anyị, ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ bụghị anyị.” O doro anya na anyị achọghị ime ka ndị a ji aka ha họrọ ịbụ ndị na-amaghị ihe.—Ilu 1:32; 27:12.
8. Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị mara ezigbo ihe?
8 Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị kwụsị ịbụ ndị na-amaghị ihe, kama ka anyị ‘na-eche echiche ka dimkpa.’ (1 Kọr. 14:20) Anyị ga-ama ezigbo ihe ma anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru ná ndụ anyị. Anyị ga-ejizi nwayọọ nwayọọ na-ahụ otú ime ha ga-esi eme ka anyị ghara ịba ná nsogbu, meekwa ka anyị na-ekpebi ime ihe ndị dị mma. Ọ ga-adị mma ma anyị chee gbasara ihe ndị anyị kpebiri ime. Ọ bụrụ na anyị na-amụ Baịbụl, na-agakwa ọmụmụ ihe, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ihe mere na anyị ekpebibeghị inyefe Jehova onwe anyị, e meekwa anyị baptizim. Ọ bụrụ na e meela anyị baptizim, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ma ànyị na-emekwu nke ọma n’ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl? Ihe ndị anyị na-ekpebi ime hà na-egosi na anyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl? Ànyị na-emeso ndị ọzọ ihe otú Jizọs ga-esi emeso ha? Ọ bụrụ na anyị ahụ na e nwere ebe ndị anyị kwesịrị imezikwu ihe, ka anyị chebara ihe Jehova na-echetara anyị echiche. “Ọ na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.”—Ọma 19:7.
9. Olee otú “ndị na-akwa ndị mmadụ emo” si egosi na ha jụrụ amamihe?
9 Ndị nke abụọ jụrụ amamihe Chineke bụ “ndị na-akwa ndị mmadụ emo.” Mgbe ụfọdụ, anyị na-ahụ ụdị ndị ahụ n’ozi ọma. Ịkwa ndị ọzọ emo na-atọ ha ụtọ. (Ọma 123:4) Baịbụl gwara anyị na n’oge ikpeazụ, ọtụtụ ndị ga na-achị ihe dị mma ọchị. (2 Pita 3:3, 4) Ụfọdụ ndị taa na-eme ka ndị ọgọ Lọt. Ha achọghị ịnụ aka ná ntị Chineke na-adọ ndị mmadụ. (Jen. 19:14) Ọtụtụ na-achị ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru ọchị. Ihe mere ha ji na-eme ya bụ na ha chọrọ ịna-eme “ihe ọjọọ na-agụ ha agụụ.” (Jud 7, 17, 18) Ihe a Baịbụl kwuru bụ nnọọ ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ jụrụ Jehova na-eme.
10. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 1:1, gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-eme ka ndị na-akwa ndị mmadụ emo?
10 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-eme ka ndị a na-akwa ndị mmadụ emo? Otu bụ na anyị na ndị na-eme mkpesa gbasara ihe ọ bụla ha hụrụ agaghị na-akpakọrịta. (Gụọ Abụ Ọma 1:1.) Ihe ọ pụtara bụ na anyị agaghị na-egere ma ọ bụ na-agụ ihe ọ bụla si n’aka ndị si n’ezi ofufe dapụ. Anyị ma na ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ọ gaghị esi ike ihe Jehova na nzukọ ya kwuru emewe anyị obi abụọ, anyị akatọwakwa ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-emekarị mkpesa ma e nwee ntụziaka ọ bụla e nyere ma ọ bụ ihe ọhụrụ ọ bụla a kọwara? M̀ na-achọpụtakarị ebe ndị na-eduzi nzukọ Jehova na-emejọ?’ Ọ bụrụ na anyị agbalịa ngwa ngwa kwụsị ime ihe ndị a, anyị ga-eme ka obi dị Jehova ụtọ.—Ilu 3:34, 35.
11. Olee otú “ndị nzuzu” si ele iwu Jehova anya?
11 Ndị nke atọ na-ajụ amamihe bụ “ndị nzuzu.” Ha dị nzuzu n’ihi na ha ekweghị erubere Jehova na iwu ya isi. Ha na-eme ihe dị mma n’anya ha. (Ilu 12:15) Ụdị ndị ahụ jụrụ Jehova, Onye na-enye amamihe. (Ọma 53:1) Anyị hụ ha n’ozi ọma, ha na-eji iwe akatọ anyị maka na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ma, ha agaghị emeli ka anyị nweta ndụ ka mma. Baịbụl sịrị: “E nweghị ihe ga-eme ka onye nzuzu nwee ezigbo amamihe. E nweghị ihe ọ ma ọ ga-ekwu n’ọnụ ụzọ ámá obodo.” (Ilu 24:7) E nweghị ezigbo ndụmọdụ ndị nzuzu nwere ike inye mmadụ. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji dọọ anyị aka ná ntị ka anyị na onye nzuzu ghara imekọ ihe.—Ilu 14:7.
12. Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-eme ka ndị nzuzu?
12 Anyị anaghị eme ka ndị kpọrọ iwu Chineke asị. Anyị na-amụta iji ụzọ Jehova akpọrọ ihe, ma iwu ya niile. Anyị ga-eji ya kpọrọkwuo ihe ma anyị jiri uru irubere ya isi na-aba tụnyere ọghọm na-adị n’inupụrụ ya isi. Chọpụta ụdị nsogbu ndị mmadụ na-akpatara onwe ha n’ihi na ha zuzuuru hapụ ige ntị n’ezigbo ndụmọdụ Jehova na-enye. Chezie otú ndụ gị si ka mma maka na ị na-erubere Jehova isi.—Ọma 32:8, 10.
13. Jehova ọ̀ na-amanye anyị ige ntị na ndụmọdụ ya?
13 Jehova na-eme ka onye ọ bụla nwee ike inweta amamihe. Ma, ọ naghị amanye onye ọ bụla inweta ya. Ma, ọ kọwara ihe ga-eme ndị na-ekweghị ege ntị n’amamihe ya. (Ilu 1:29-32) Ndị kpebiri na ha agaghị ege Jehova ntị ‘ga-eji isi ha buru ihe ha metara.’ Ka oge na-aga, ha ga-ata ahụhụ n’ihi otú ha si ebi ndụ. N’ikpeazụ, Jehova ga-ebibikwa ha. Ma, Jehova kwere ndị gere ntị na ndụmọdụ ya ma mee ihe o kwuru nkwa, sị: “Obi ga-eru onye na-ege m ntị ala, ụjọ ọdachi agaghịkwa atụ ya.”—Ilu 1:33.
EZIGBO AMAMIHE NA-ABARA ANYỊ URU
14-15. Gịnị ka anyị mụtara n’Ilu 4:23?
14 Ige ntị n’amamihe Jehova na-abara anyị uru mgbe niile. Dị ka anyị kwurula, Jehova na-eme ka onye ọ bụla nwee ike inweta amamihe ya. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Ilu niile, o nyere ezigbo ndụmọdụ ndị ga-eme ka ndụ anyị ka mma ma anyị gee ntị na ha. Ka anyị leba anya n’anọ n’ime ndụmọdụ ndị ahụ.
15 Chebe obi gị. Baịbụl kwuru, sị: “N’ime ihe niile ị na-eche nche, chebe obi gị, n’ihi na ọ bụ ya bụ isi ndụ gị.” (Ilu ) Chegodị ihe anyị kwesịrị ime ka obi nkịtị anyị ghara inwe nsogbu. Anyị kwesịrị ịna-eri ezigbo nri, na-emega ahụ́ otú kwesịrị kwesịrị, gharakwa ịna-eme ihe ga-akpatara obi anyị nsogbu. Anyị na-emekwa ụdị ihe ahụ iji chebe obi nke ahụ Baịbụl na-ekwu maka ya. Anyị na-amụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, na-akwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, na-aga ọmụmụ ihe, na-azakwa ajụjụ ma anyị gaa. Anyị na-agbasi mbọ ike na-ekwusa ozi ọma. Anyị anaghịkwa eme ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị mụta àgwà ọjọọ. Otú anyị si eme ya bụ izere ihe ọ bụla nwere ike imebi echiche anyị, ihe ndị dị ka mkpakọrịta ọjọọ na iji ihe na-adịghị mma atụrụ ndụ. 4:23
16. Gịnị mere ihe e kwuru n’Ilu 23:4, 5 ji abara anyị ezigbo uru taa?
16 Ka ihe i nwere ju gị afọ. Baịbụl gwara anyị, sị: “Adọgbula onwe gị n’ọrụ ka ị kpata akụ̀. . . . I lee ya anya, ị ga-ahụ na ọ dịghịzi n’ihi na ọ ga-epu nku ka ugo fega na mbara igwe.” (Ilu 23:4, 5) E nweghị akụnụba ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ma ịchụ ego na-echu ọtụtụ ndị ụra taa, ma ọgaranya ma ogbenye. Ọ bụ ihe na-emekarị ka ha mee ihe ga-emebi aha ha, ihe ga-eme ka ha na ndị ọzọ gharazie ịdị ná mma, ma ọ bụdị ihe ga-akpatara ha ọrịa. (Ilu 28:20; 1 Tim. 6:9, 10) Ma, amamihe ga-enyere anyị aka ile ego anya otú kwesịrị ekwesị. Ile ego anya otú ahụ ga-eme ka anyị ghara ịdị anyaukwu. Ọ ga-eme ka ihe anyị nwere ju anyị afọ, obi ana-adịkwa anyị ụtọ.—Ekli. 7:12.
17. Olee otú okwu ọnụ anyị ga-esi “na-agwọ ndị mmadụ” otú ahụ e kwuru n’Ilu 12:18?
17 Chee echiche tupu gị ekwuo okwu. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, okwu anyị nwere ike ịkpata ezigbo nsogbu. Baịbụl sịrị: “Okwu mmadụ kwuru n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, Ma okwu ndị ma ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Anyị na ndị ọzọ ga-adị ná mma ma ọ bụrụ na anyị anaghị eji ihe ndị ọzọ na-emejọ agba asịrị. (Ilu 20:19) Anyị chọọ ka okwu anyị na-agwọ ndị mmadụ kama ịna-ama ha ka mma, anyị kwesịrị ịna-amụ Okwu Chineke ma na-echebara ya echiche. (Luk 6:45) Ichebara ihe Baịbụl kwuru echiche ga-eme ka okwu anyị dịrị ka “ebe e si enweta amamihe,” nke na-akasi ndị ọzọ obi.—Ilu 18:4.
18. Olee otú ime ihe e kwuru n’Ilu 24:6 si enyere anyị aka ime nke ọma n’ozi ọma?
18 Na-eso ntụziaka. Baịbụl nyere anyị ndụmọdụ ga-abara anyị uru. Ọ sịrị: “Ezigbo ntụziaka ga-enyere gị aka ịlụ agha, ọtụtụ ndị ndụmọdụ ga-emekwa ka i merie.” (Ilu 24:6) Legodị otú ime ihe a e kwuru ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma anyị. Anyị na-agbalị ime ihe ndị a gwara anyị gbasara ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl kama ịna-eme ya otú anyị chọrọ. N’ọmụmụ ihe, anyị na-amụta ihe n’otú ụmụnna ndị ma nke a na-akọ si eji Baịbụl akụzi ihe. Nzukọ Jehova na-enyekwa anyị vidio na akwụkwọ ndị na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta Baịbụl. Ị̀ na-agbalị ka ị mụta otú ị ga-esi jiri ihe ndị a nyere ndị ọzọ aka n’ozi ọma?
19. Olee otú obi dị gị gbasara amamihe Jehova na-enye? (Ilu 3:13-18)
19 Gụọ Ilu 3:13-18. Obi dị anyị ụtọ na Chineke nyere anyị ezigbo ndụmọdụ n’Okwu ya. Chegodị otú ọ gaara adị anyị ma e wezụga ndụmọdụ ndị a. N’isiokwu a, anyị elebala anya n’ụfọdụ ndụmọdụ magburu onwe ha e nyere n’akwụkwọ Ilu. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova nyere anyị ezigbo ndụmọdụ na Baịbụl niile. Ka anyị kpebisie ike ịna-ege ntị mgbe niile na ndụmọdụ ndị a Jehova nyere anyị. Otú ndị ụwa si were ndụmọdụ ndị ahụ agbasaghị anyị. Obi siri anyị ike na ‘a ga-akpọ ndị na-ejidesi amamihe aka ike ndị na-enwe obi ụtọ.’
ABỤ NKE 36 Anyị Na-echebe Obi Anyị
a Amamihe Jehova na-enye anyị karịrị ihe ọ bụla ụwa ga-enyeli anyị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otu ihe magburu onwe ya e kwuru n’akwụkwọ Ilu, ya bụ, na amamihe na-eti mkpu n’ámá obodo. Anyị ga-ekwu otú anyị nwere ike isi nweta ezigbo amamihe, ihe mere na ụfọdụ ndị anaghị ege ntị n’amamihe Jehova, na uru anyị ga-erite ma anyị gee ntị na ya.