Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
N’oge ụmụ Izrel nọ n’ala ịkpa, è nwere ihe ọzọ ha riri ma e wepụ mana na nnụnụ kwel?
N’ime afọ iri anọ ndị Izrel nọrọ n’ala ịkpa, ihe ha kacha rie bụ mana. (Ọpụ. 16:35) E nwekwara ugboro abụọ Jehova nyere ha nnụnụ kwel. (Ọpụ. 16:12, 13; Ọnụ Ọgụ. 11:31) Ma, e nwere ụfọdụ nri ndị ọzọ ndị Izrel riri n’oge ahụ.
Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ụfọdụ Jehova du ụmụ Izrel gaa ‘n’ebe ha ga-ezu ike,’ bụ́ ebe ha ga-aṅụ mmiri, hụkwa nri ha ga-eri. (Ọnụ Ọgụ. 10:33) Otu n’ime ebe ndị ahụ bụ n’Ilim, “bụ́ ebe e nwere isi iyi iri na abụọ na nkwụ iri asaa,” ndị nwere ike ịbụ nkwụ ndị na-amị mkpụrụ det. (Ọpụ. 15:27) Akwụkwọ bụ́ Plants of the Bible kwuru na nkwụ det, nke ‘na-eto ọtụtụ ebe n’ọzara, bụ osisi na-amị mkpụrụ kachanụ e nwere n’ọzara. Ọtụtụ nde mmadụ na-esi na ya enweta nri, mmanụ, na ihe e ji arụ ụlọ.’
Ọ ga-abụ na ndị Izrel kwụsịtụrụ n’otu nnukwu ebe mmiri dị nke a na-akpọ Feran taa, nke so na Ndagwurugwu Feran. a Akwụkwọ bụ́ Discovering the World of the Bible kwuru na ndagwurugwu a ‘dị otu narị kilomita na iri atọ n’ogologo, bụrụkwa otu n’ime ndagwurugwu ndị kacha too ogologo, ndị kacha maa mma, nakwa ndị a kacha mara na Saịnaị.’ Akwụkwọ ahụ kwukwara na ‘ọ bụrụ na mmadụ agaa kilomita iri anọ na ise malite n’ebe ndagwurugwu ahụ banyere n’osimiri, ọ ga-erute na Mbara Ala Feran. Ebe ahụ dị n’elu ugwu, dịrịkwa ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ kilomita ise n’ogologo. Ihe juru na ya bụ nkwụ. Ọ makwara mma nke na e ji ya tụnyere ogige Iden. Ruo ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ na-abịa ebe ahụ n’ihi na e nwere ọtụtụ puku nkwụ ndị na-amị mkpụrụ det.’
Mgbe ndị Izrel si Ijipt na-apụ, ha weere ntụ ọka a gwọrọ agwọ na ihe e ji etinye ya. Ọ ga-abụkwa na ha ji ọka na mmanụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ gaghị egbu oge ihe ndị ahụ agwụ. Ihe ọzọ ha ji pụta n’Ijipt bụ “ìgwè atụrụ na ìgwè ehi dị nnọọ ọtụtụ.” (Ọpụ. 12:34-39) Ma, ebe ọ bụ na ihe anaghị adị mfe n’ọzara, ọ ga-abụ na ọtụtụ anụmanụ ndị ahụ nwụrụ. O nwekwara ike ịbụ na ndị Izrel riri ụfọdụ, jirikwa ụfọdụ chụọ àjà. Ọ ga-abụdị na e nwere ndị ha ji chụọrọ arụsị àjà. b (Ọrụ 7:39-43) Ma, ndị Izrel kpara ụmụ anụmanụ. Ihe mere anyị ji mara bụ ihe Jehova gwara ha mgbe ha nupụụrụ ya isi. Ọ sịrị ha: “Ụmụ unu ndị nwoke ga na-azụ atụrụ n’ala ịkpa a ruo afọ iri anọ.” (Ọnụ Ọgụ. 14:33) N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na mgbe ụfọdụ, ha si n’anụmanụ ndị ahụ nweta mmiri ara, mgbe ụfọdụkwa, ha egbuo ha taa. Ma, o doro anya na anụmanụ ndị ahụ agaghị ezuru ha ruo afọ iri anọ ebe ọ bụ na ha dị ihe dị ka nde mmadụ atọ. c
Olee ebe ụmụ anụmanụ ndị ahụ si na-enweta nri na mmiri? d N’oge ahụ, ọ ga-abụ na otú mmiri si ezo n’ala ịkpa karịrị otú o si ezo na ya n’oge a, nke mere ka e nwee ọtụtụ ahịhịa na ya karịa otú e nwere n’oge a. Akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke Mbụ, kwuru na puku afọ atọ na narị ise (3,500) gara aga, “e nwere mmiri n’ebe ụmụ Izrel nọ n’ọzara ahụ karịa otú ọ dị taa. E nwere ndagwurugwu ndị miri emi mmiri na-adịghị taa. Ihe a gosiri na e nwere mgbe ezigbo mmiri na-ezo n’ebe ahụ nke mere ka e nwee iyi na ya.” N’agbanyeghị ya, ọzara na-atọgbọrọ nkịtị, na-atụkwa ụjọ. (Diut. 8:14-16) Ọ bụrụ na Jehova arụghị ọrụ ebube mee ka ndị Izrel nweta mmiri, ha na anụmanụ ha gaara anwụ.—Ọpụ. 15:22-25; 17:1-6; Ọnụ Ọgụ. 20:2, 11.
Mosis gwara ndị Izrel na Jehova ejirila mana nyejuo ha afọ “ka o wee mee ka [ha] mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta.—Diut. 8:3.
a Gụọ Ụlọ Nche May 1, 1992, peeji nke 24 na nke 25.
b Baịbụl kwuru oge abụọ ụmụ Izrel ji anụmanụ chụọrọ Jehova àjà n’ala ịkpa. Nke mbụ bụ oge a họpụtara ndị nchụàjà, nke abụọ abụrụ oge a na-eme Ememme Ngabiga. E mere ha abụọ n’afọ 1512 Tupu Oge Ndị Kraịst, ya bụ, mgbe ihe dị ka otu afọ gara ndị Izrel pụtachara n’Ijipt.—Lev. 8:14–9:24; Ọnụ Ọgụ. 9:1-5.
c Mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo afọ iri anọ ndị Izrel nọrọ n’ọzara, ha nwetara ọtụtụ puku anụmanụ n’agha ndị ha lụrụ. (Ọnụ Ọgụ. 31:32-34) N’agbanyeghị ya, ha nọkwa na-eri mana ruo mgbe ha banyere n’Ala Nkwa.—Josh. 5:10-12.
d E nweghị ihe gosiri na ụmụ anụmanụ riri mana ebe ọ bụ na mana onye nke ọ bụla na-ewere kwa ụbọchị bụ ole ọ ga-erichali.—Ọpụ. 16:15, 16.