Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 44

Ghọta Okwu Chineke Nke Ọma

Ghọta Okwu Chineke Nke Ọma

‘Ghọta nke ọma otú eziokwu si dị obosara, dị ogologo, dị elu, dịkwa omimi.’​—EFE. 3:18.

ABỤ NKE 95 Ìhè Na-enwusikwu Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Olee ụzọ kacha mma anyị ga-esi na-agụ Baịbụl, na-amụkwa ya? Mee ihe atụ.

 WEREGODỊ ya na e nwere ụlọ ị chọrọ ịzụ. Olee ihe ndị ị ga-achọ ịhụ tupu gị ekpebie ịzụ ya? Ọ̀ bụ naanị foto ihu ụlọ ahụ? O doro anya na ị ga-achọ ịga n’ụlọ ahụ n’onwe gị, gagharịa na ya, baa n’ime ya, lee otú ihe niile gbasara ya dị. I nwedịrị ike ịchọ ka e nye gị ụkpụrụ ụlọ ahụ ka i leruo ya anya ka ị mata otú e si rụọ ya. O doro anya na ị ga-achọ ịmara ihe niile gbasara ụlọ ahụ ị chọrọ ịzụ.

2 Anyị nwekwara ike ime ụdị ihe ahụ ma anyị na-agụ ma ọ bụ na-amụ Baịbụl. Otu onye kwuru na ihe dị na Baịbụl ‘yiri nnukwu ụlọ dị ezigbo elu nke ntọala ya bamikwara n’ime ala.’ N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi amara ihe dị na Baịbụl nke ọma? Ọ bụrụ na anyị agụọ ya ọkụ ọkụ, anyị nwere ike ịmụta naanị ihe ndị na-esighị ike ọ na-akụzi, ya bụ, “ihe ndị na-ataghị akpụ e dere n’okwu dị nsọ nke Chineke.” (Hib. 5:12) Otú ahụ anyị si abanye n’ime ụlọ anyị chọrọ ịzụ ka anyị mata otú ọ dị, anyị kwesịrị ịmụ Baịbụl nke ọma ka anyị nwee ike ịghọta ya nke ọma. Otu ụzọ dị ezigbo mma anyị ga-esi amụ Baịbụl bụ ịchọpụta otú ihe o kwuru n’otu ebe si gbasa ihe o kwuru n’ebe ọzọ. Kpebisie ike na ihe ị ga-aghọta abụghị naanị eziokwu ndị i kweere, kama i kwesịkwara ịghọta ihe mere i ji kwere ha.

3. Olee ihe Pọl onyeozi gwara ụmụnna ya ka ha mee? N’ihi gịnị? (Ndị Efesọs 3:14-19)

3 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta ihe niile Baịbụl na-ekwu nke ọma, anyị kwesịrị ịmụ eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Baịbụl. Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-amụsi Okwu Chineke ike ka ha nwee ike “ịghọta nke ọma otú eziokwu si dị obosara, dị ogologo, dị elu, dịkwa omimi.” Ọ ga-eme ka ha “kwụsie ike, gbanyesiekwa mgbọrọgwụ ike” n’okwukwe ha. (Gụọ Ndị Efesọs 3:14-19.) Anyịnwa kwesịkwara ime otú ahụ. Ka anyị lee otú anyị nwere ike isi mụọ Okwu Chineke nke ọma ka anyị nwee ike ghọtakwuo ihe ọ pụtara.

MỤKWUO EZIOKWU NDỊ GBARA ỌKPỤRỤKPỤ DỊ NA BAỊBỤL

4. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma? Nye ihe atụ.

4 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, ihe anyị kwesịrị ịghọta abụghị naanị ihe ndị dị mfe Baịbụl na-akụzi. Anyị chọrọ ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka ka anyị mụta “ọbụnadị amamihe Chineke nke dị omimi.” (1 Kọr. 2:9, 10) I nwere ike ime ezigbo nchọnchọ ka ị mụta ihe ndị ga-enyere gị aka ịbịaru Jehova nso. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịmụ otú Jehova si gosi ndị fere ya n’oge ochie na ọ hụrụ ha n’anya na otú akụkọ ahụ si egosi na Jehova hụkwara gị n’anya. I nwekwara ike ịmụ gbasara otú Jehova si hazie ka e si na-efe ya n’Izrel oge ochie nakwa otú o si yie otú Ndị Kraịst si efe ya taa. I nwekwara ike imekwu nchọnchọ gbasara amụma ndị Jizọs mezuru mgbe ọ nọ n’ụwa.

5. È nwere isiokwu ị ga-achọ ime ezigbo nchọnchọ banyere ya mgbe ị na-amụ ihe n’onwe gị?

5 A jụrụ ụfọdụ ndị na-amụ Baịbụl nke ọma ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ha ga-achọ ịmụkwu n’Okwu Chineke. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kwuru dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị I Nwere Ike Ịmụ ma Ị Mụwa Baịbụl.” Ịmụ gbasara isiokwu ndị ahụ ga-atọgbu gị atọgbu. Ihe ga-enyere gị aka ịmụ ha bụ Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Ịmụ Baịbụl nke ọma nwere ike ime ka okwukwe gị sikwuo ike, nyekwara gị aka ‘ịmụta banyere Chineke.’ (Ilu 2:4, 5) Ka anyị lebazie anya n’ụfọdụ eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Baịbụl anyị nwere ike ịmụkwu gbasara ha.

CHEBARA NZUBE CHINEKE ECHICHE NKE ỌMA

6. (a) Olee ihe dị iche n’atụmatụ na nzube? (b) Gịnị mere e nwere ike iji sị na nzube Jehova maka ụwa na ụmụ mmadụ na-adịru mgbe ebighị ebi? (Ndị Efesọs 3:11)

6 Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ihe Baịbụl kwuru banyere nzube Chineke. E nwere ezigbo ihe dị iche n’atụmatụ na nzube. Mmadụ ime atụmatụ dị ka onye chọrọ ịga otu ebe, ya enwee ụzọ a kapịrị ọnụ ọ chọrọ isi eru ebe ahụ. Ma, atụmatụ ya nwere ike ịkụ afọ n’ala ma ọ bụrụ na ụzọ ahụ akpọchie. Ma, e nwere ike iji nzube tụnyere ebe anyị chọrọ ịga. Anyị ma ebe anyị chọrọ ịga. Mana, e nweghị naanị otu ụzọ a kapịrị ọnụ anyị bu n’obi isi gaa ya. Anyị nwere ike ikpebi isi ụzọ ọzọ gaa ma ọ bụrụ na otu ụzọ akpọchie. Obi dị anyị ụtọ na Jehova ejirila nwayọọ nwayọọ mee ka anyị si na Baịbụl mata ‘ihe o zubere, ma n’oge gara aga ma n’ọdịnihu.’ (Efe. 3:11) Jehova nwere ike isi n’ụzọ dị iche iche mezuo nzube ya. Ọ na-emezukwa ihe ọ bụla ọ chọrọ n’ihi na ọ “na-eme ka ihe niile mezuo nzube ya.” (Ilu 16:4) Ihe Jehova na-eme ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi. Gịnị bụ nzube Jehova? Oleekwa ihe ụfọdụ ọ gbanwere iji mezuo nzube ya?

7. Mgbe nwoke mbụ na nwaanyị mbụ nupụrụ isi, olee otú Jehova si gbanwee otú ọ ga-esi mezuo nzube ya? (Matiu 25:34)

7 Chineke gwara nwoke na nwaanyị mbụ ihe bụ́ nzube ya maka ha. Ha ga-amụ ‘ọmụmụ, baa ụba, ju n’ụwa, na-elekọtakwa ya, ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ anọrọ n’okpuru ha.’ (Jen. 1:28) Mgbe Adam na Iv nupụrụ isi ma mee ka mmadụ niile nọ n’ụwa bụrụ ndị mmehie, nzube Jehova agbanweghị. Kama, ọ gbanwere otú nzube ya ahụ ga-esi mezuo. Ozugbo ahụ, o kpebiri na ọ ga-ehiwe otu Alaeze n’eluigwe nke ga-emezu nzube mere o ji kee ụwa na ụmụ mmadụ. (Gụọ Matiu 25:34.) Mgbe oge Jehova ruru, ịhụnanya ya mere ka o zite Ọkpara ya n’ụwa ka ọ kụziere ndị mmadụ gbasara Alaeze ya, nakwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Jehova mechara kpọlite Jizọs n’ọnwụ, ya alaa eluigwe bụrụ Eze nke Alaeze Chineke. Ma, e nwere ihe ọzọ anyị ga-amụta gbasara nzube Chineke.

Were ya na ị na-ahụ mgbe ndị niile na-efe Chineke ma n’eluigwe ma n’elu ụwa dị n’otu ma na-erubere Jehova isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. (a) Olee isi ihe e kwuru na Baịbụl? (b) Dị ka a kọwara ná Ndị Efesọs 1:8-11, olee ihe bụ́ nzube Jehova kachanụ? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

8 Isi ihe e kwuru na Baịbụl bụ na a ga-eme ka aha Jehova dị nsọ mgbe ọ ga-eji Alaeze ya nke Kraịst ga-achị mezuo nzube ya maka ụwa. Nzube Jehova anaghị agbanwe agbanwe. O kwere nkwa na ihe niile o kwuru ga-emezu. (Aịza. 46:10, 11; Hib. 6:17, 18) N’oge na-adịghị anya, ụwa niile ga-aghọ paradaịs ebe ụmụ Adam na Iv bụ́ ndị ezi omume ga-ezu okè ma ‘na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.’ (Ọma 22:26) Ọ bụghị naanị ihe a ka Jehova ga-eme. Nzube ya kachanụ bụ ime ka ndị niile na-efe ya dịrị n’otu n’eluigwe na n’ụwa. N’oge ahụ, onye ọ bụla dị ndụ ga na-erubere Jehova isi dị ka Onye Ọchịchị. (Gụọ Ndị Efesọs 1:8-11.) Ọ̀ bụ na otú a magburu onwe ya Jehova si chọọ imezu nzube ya amasịghị gị?

CHEE GBASARA ỌDỊNIHU GỊ

9. Anyị gụwa Baịbụl, olee ihe ndị anyị ga-amata gbasara ọdịnihu?

9 Chee banyere amụma ahụ Jehova buru n’ogige Iden, nke e dere na Jenesis 3:15. b O kwuru gbasara ihe ndị ga-eme ga-emezu nzube Chineke. Ma, ihe ndị ahụ ga-eme mgbe ọtụtụ puku afọ gachara. Dị ka ihe atụ, Chineke gwara Ebreham na onye si n’ezinụlọ ya ga-abụ Kraịst. (Jen. 22:15-18) N’afọ 33 Oge Ndị Kraịst, e merụrụ Jizọs ahụ́ n’ikiri ụkwụ dị ka e buru n’amụma. (Ọrụ 3:13-15) Ihe ikpeazụ e kwuru n’amụma ahụ, ya bụ, igwepịa Ekwensu isi, ka ga-eme ma ihe karịrị otu puku afọ gachaa. (Mkpu. 20:7-10) Baịbụl kwukwara ọtụtụ ihe gbasara ihe ndị ga-eme tupu iro dị n’etiti ụwa Ekwensu a na nzukọ Jehova akwụsị.

10 (a) Gịnị ga-eme n’oge na-adịghị anya? (b) Olee otú anyị ga-esi kwadebe obi anyị? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

10 Chee gbasara ihe ndị a dị ịtụnanya Baịbụl kwuru ga-eme. Nke mbụ, mba niile ga-ekwu, sị: “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala.” (1 Tesa. 5:2, 3) “Na mberede,” oké mkpagbu ga-amalite mgbe mba niile ga-alụso okpukpe ụgha niile ọgụ. (Mkpu. 17:16) Nke ahụ gachaa, e nwere ike ịhụ ihe dị ebube ga-egosi na ‘Nwa nke mmadụ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu.’ (Mat. 24:30) Jizọs ga-ekpe ụwa ikpe, họpụta atụrụ iche n’ebe ewu nọ. (Mat. 25:31-33, 46) Ma, n’oge a niile, Setan agaghị anọ nkịtị. Otú o si kpọ ndị Chineke asị ga-eme ka ọtụtụ mba gbakọọ aka ọnụ bịa ịlụso ndị Chineke ọgụ. Baịbụl kpọrọ ha Gọg bụ́ onye Megọg. (Ezik. 38:2, 10, 11) E nwere mgbe ọ ga-eru, a chịkọta ndị e tere mmanụ ha agaa eluigwe soro Jizọs na ndị agha ya nọ n’eluigwe lụọ agha Amagedọn. Ọ bụ ya bụ ihe ikpeazụ ga-eme n’oké mkpagbu. c (Mat. 24:31; Mkpu. 16:14, 16) Nke ahụ mechaa, Jizọs Kraịst ga-amalitezi ịchị ụwa otu puku afọ.​—Mkpu. 20:6.

Olee otú adịm ná mma gị na Jehova ga-adị ma ị mụchaa gbasara ya ruo ọtụtụ ijeri afọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11 Olee otú obi dị gị maka na i nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Ugbu a, chee gbasara ihe ga-eme ma otu puku afọ ahụ gachaa. Baịbụl gwara anyị na Onye kere anyị “medịrị ka ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụụ.” (Ekli. 3:11) Chegodị otú ihe a si gbasa gị nakwa adịm ná mma gị na Jehova. Akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, peeji nke 319, kwuru ihe magburu onwe ya. Ọ sịrị: “Mgbe anyị biworo ndụ ruo ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ puku afọ, ọtụtụ nde afọ, ọbụna ọtụtụ ijeri afọ, anyị ga-amụta nnọọ ọtụtụ ihe banyere Jehova Chineke karịa otú anyị maara ugbu a. Ma ọ ka ga-adịkwa anyị ka e nwere ọtụtụ ihe ndị dị ebube anyị ga-amụta.” O kwukwara na anyị agaghị echeli echiche otú ndụ ebighị ebi ga-esi magbuo onwe ya ma na-atọ ụtọ. Nke kacha mkpa bụ na anyị na Jehova ga na-adịkwu ná mma. Ka ọ dịgodị, ka anyị na-amụ Okwu Chineke, olee ihe ọzọ anyị ga-amụta?

HỤ IHE NDỊ DỊ N’ELUIGWE

12 Olee otú anyị ga-esi hụ ihe ndị na-eme n’eluigwe? Mee ihe atụ.

12 Okwu Chineke tụpenyetụrụ anyị azụ̀ ihe ọ dị ka ya ịnọ n’ihu Chineke “n’ebe dị elu.” (Aịza. 33:5) Baịbụl gwara anyị gbasara Jehova na nzukọ ya nke dị n’eluigwe. (Aịza. 6:1-4; Dan. 7:9, 10; Mkpu. 4:1-6) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịgụ gbasara ihe na-atụ n’anya Ezikiel hụrụ mgbe ‘eluigwe meghere, Chineke emee ka ọ hụwa ọhụụ.​—Ezik. 1:1.

13 Olee otú obi dị gị gbasara ihe Jizọs si n’eluigwe na-emere anyị dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 4:14-16?

13 Cheekwa gbasara ihe Jizọs nọ n’eluigwe na-emere anyị ugbu a ọ bụ Eze anyị na Nnukwu Onye Nchụàjà nke na-enwere anyị ọmịiko. Anyị kpewe ekpere, anyị na-esi n’aka ya abịa nso “n’ocheeze Chineke onye na-eme amara,” na-arịọkwa ya ka o meere anyị ebere ma nyere anyị aka “n’oge anyị chọrọ ka e nyere anyị aka.” (Gụọ Ndị Hibru 4:14-16.) N’ụbọchị ọ bụla, ka anyị na-echebara ihe Jehova na Jizọs meere anyị echiche nakwa ihe ha si n’eluigwe na-emere anyị. Otú ha si hụ anyị n’anya kwesịrị imetụ anyị n’obi, meekwa ka anyị chọọ iji obi anyị niile na-efe Jehova.​—2 Kọr. 5:14, 15.

Chegodị ụdị obi ụtọ ị ga-enwe n’ụwa ọhụrụ ịmata na i nyeere ndị mmadụ aka ha aghọọ Ndịàmà Jehova nakwa ndị na-eso ụzọ Jizọs (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14 Olee otu n’ime ihe ndị kacha mma anyị nwere ike ime iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs na-emere anyị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

14 Otu n’ime ụzọ ndị kacha mma anyị ga-esi gosi otú obi si dị anyị ụtọ maka ihe Jehova na Ọkpara ya na-emere anyị bụ ịgbasi mbọ ike nyere ndị ọzọ aka ka ha ghọọ Ndịàmà Jehova, bụrụkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:19, 20) Ọ bụ ihe a ka Pọl onyeozi mere n’ihi otú obi si dị ya ụtọ maka ihe Chineke na Jizọs meere ya. Ọ ma na ọ bụ uche Jehova ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha marakwa eziokwu nke ọma.” (1 Tim. 2:3, 4) Ọ gbasiri mbọ ike n’ozi ọma iji nyere ndị niile o nwere ike inyere aka aka ka o nwee ike ‘si otú ọ bụla o nwere ike zọpụta ụfọdụ n’ime ha.​—1 Kọr. 9:22, 23.

KA ỊMỤ OKWU CHINEKE NA-ATỌ GỊ ỤTỌ

15 Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 1:2, gịnị ga-eme anyị obi ụtọ?

15 Onye dere Abụ Ọma nke mbụ kwuru na onye na-enwe obi ụtọ na onye ihe na-agaziri bụ onye ‘iwu Jehova na-atọ ụtọ,’ nakwa onye “na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị.” (Ọma 1:1-3) Otu onye na-asụgharị Baịbụl aha ya bụ Joseph Rotherham kwuru gbasara amaokwu ndị a n’akwụkwọ ya bụ́ Studies in the Psalms. Ọ sịrị na “mmadụ kwesịrị ịna-achọ ka Chineke na-eduzi ya nke na ọ ga na-achọ ya, na-amụ ya, wepụtakwa nnukwu oge na-echebara ya echiche.” O kwukwara na “ọ bụrụ na otu ụbọchị agaa, mmadụ agụghị Baịbụl, na ụbọchị ahụ lara onye ahụ n’iyi.” Ịmụ Baịbụl ga na-atọ gị ụtọ ma ị gbaa mbọ ka ị ghọta ọtụtụ ihe dị mkpa dị na ya nakwa otú ha niile si gbasa ibe ha. Ọ na-atọgbu anyị atọgbu ịghọta ihe niile e kwuru n’Okwu Chineke.

16 Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

16 Eziokwu ndị magburu onwe ha Jehova na-akụziri anyị n’Okwu ya esighị ike nke na anyị agaghị aghọtali ha. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, ya bụ, nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ Jehova nke Pọl kọwara n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru. Ka ịmụ gbasara ya tọọ gị ezigbo ụtọ.

ABỤ NKE 94 Anyị Na-ekele Chineke Maka Okwu Ya

a Ịmụ Baịbụl nwere ike ịna-atọ anyị ụtọ ná ndụ anyị niile. O nwere ike ịbara anyị uru, meekwa ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú anyị ga-esi ghọta nke ọma otú eziokwu dị n’Okwu Chineke “si dị obosara, dị ogologo, dị elu, dịkwa omimi.”

b Gụọ isiokwu bụ́ “Amụma E Buru n’Oge Ochie nke Gbasara Gị,” nke gbara n’Ụlọ Nche Julaị 2022.

c Iji mata otú ị ga-esi kwadebe maka ihe ndị dị egwu ga-eme n’ụwa n’oge na-adịghị anya, gụọ akwụkwọ bụ́ Alaeze Chineke Amalitela Ịchị! peeji nke 230.