ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 45
Jiri Ihe Ọma Meere Gị Ife Jehova n’Ụlọ Nsọ Ihe Atụ Ya Kpọrọ Ihe
“Feenụ Chineke, onye kere eluigwe na ụwa.”—MKPU. 14:7.
ABỤ NKE 93 Gọzie Nzukọ Anyị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ihe otu mmụọ ozi na-ekwu, oleekwa otú ihe ahụ si gbasa anyị?
Ọ BỤRỤ na mmụọ ozi ana-agwa gị okwu, ị̀ ga-ege ya ntị? Taa, e nwere mmụọ ozi na-agwa “mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile na agbụrụ niile” okwu. Gịnị ka ọ na-ekwu? Ọ na-asị: “Tụọnụ egwu Chineke, tookwanụ ya . . . Feenụ Chineke, onye kere eluigwe na ụwa.” (Mkpu. 14:6, 7) Ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke, onye onye ọ bụla kwesịrị ịna-efe. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nwere ohere a magburu onwe ya ife Jehova ná nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ya.
2. Gịnị bụ ụlọ nsọ ihe atụ Jehova? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ọ Na-abụghị.”)
2 Gịnị bụ ụlọ nsọ ihe atụ a, oleekwa ebe anyị ga-ahụ ihe ndị e ji kọwaa ya? Ụlọ nsọ ihe atụ abụghị ụlọ nsọ nkịtị. Ọ bụ nhazi Jehova mere ka e nwee ike na-efe ya otú ọ ga-anabata n’ihi àjà Jizọs chụrụ iji gbapụta anyị. Pọl onyeozi kọwakwuru ihe a n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru bi na Judia. b
3-4. Olee ihe nọ na-echegbu Pọl gbasara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru bi na Judia, oleekwa otú o si nyere ha aka?
3 Gịnị mere Pọl ji degara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru bi na Judia akwụkwọ ozi a? O nwere ike ịbụ n’ihi ihe abụọ. Nke mbụ bụ iji gbaa ha ume. Ọtụtụ n’ime ha na-ekpe okpukpe ndị Juu tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. Ọ ga-abụ na ndị ndú okpukpe ha nọbu na ya na-akwa ha emo n’ihi na ha ghọrọ Ndị Kraịst. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ndị Kraịst enweghị ụlọ nsọ ha na-anọ efe Chineke, ebe ịchụàjà ha na-anọ achụrụ Chineke àjà, nakwa ndị nchụàjà na-achụrụ ha àjà. O nwere ike ịbụ na ihe ndị a mere ka Ndị Kraịst ahụ na-ada mbà, meekwa ka okwukwe ha gharazie isi ike. (Hib. 2:1; 3:12, 14) O nwedịrị ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha chere echiche ịga kpewekwa okpukpe ndị Juu.
4 Nke abụọ, Pọl gwara Ndị Kraịst ndị ahụ bụ́ ndị Hibru na ha anaghị agbasi mbọ ike ka ha ghọta ihe ọhụrụ ma ọ bụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ a kụziri, ya bụ, “nri siri ike” dị n’Okwu Chineke. (Hib. 5:11-14) Ọ ga-abụ na ụfọdụ n’ime ha achọbeghị ịkwụsị ịna-edebe Iwu Mosis. Ma, Pọl kọwara na àjà ndị Iwu Mosis kwuru ka a chụọ anaghị ewepụcha mmehie kpamkpam. Ọ bụ ya mere e ji ‘kagbuo’ iwu ahụ. N’ihi ya, Pọl kụziri eziokwu ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ. O chetaara Ndị Kraịst ibe ya na e nwere “olileanya ka mma.” Ihe mere o ji nwee isi bụ àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ nke ga-eme ka ha bịaruo “Chineke nso.—Hib. 7:18, 19.
5. Olee ihe anyị kwesịrị ịghọta n’akwụkwọ Ndị Hibru, maka gịnị?
5 Pọl kọwaara ụmụnna ya bụ́ ndị Hibru ihe mere otú ha si efe Chineke ugbu a ha bụ Ndị Kraịst ji karịa otú ha si na-efe Chineke n’okpukpe ndị Juu. Otú ndị Juu si fee Chineke otú ahụ e kwuru n’Iwu Mosis bụ naanị ihe “nọchiri anya ihe ndị gaje ịbịa, ma onye ihe ndị ahụ ga-emezu n’isi ya bụ Kraịst.” (Kọl. 2:17) N’ihi ya, otú ahụ ndị Juu si fee Chineke n’oge gara aga nọchiri anya ụzọ ka mma a ga-esi efe Chineke n’ọdịnihu. Anyị kwesịrị ịghọta otú Chineke si hazie ka a gbaghara anyị mmehie anyị ka o nwee ike ịnabata ofufe anyị. Ka anyị jiri otú ndị Juu si fee Chineke tụnyere otú Ndị Kraịst si efe Chineke, nke a kọwara n’akwụkwọ Ndị Hibru. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ụlọ nsọ ihe atụ ahụ nakwa otú o si gbasa anyị.
ỤLỌIKWUU
6. Olee ihe a na-anọ n’ụlọikwuu eme?
6 Otú ndị Juu si fee Chineke. Ihe Pọl kọwara bụ ụlọikwuu ahụ Mosis rụrụ n’afọ 1512 Tupu Oge Ndị Kraịst. (Lee chaatị isiokwu ya bụ “Otú ndị Juu Si Fee Chineke —Otú Ndị Kraịst Si Efe Chineke.”) Ndị Izrel na-ebu ụlọikwuu ahụ ma ha si otu ebe na-aga ebe ọzọ. Ha nọ na ya fee Chineke ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ ise (500) mgbe a rụrụ ụlọ nsọ na Jeruselem. (Ọpụ. 25:8, 9; Ọnụ Ọgụ. 9:22) “Ụlọikwuu nzute” a bụ ebe ndị Izrel na-abịa n’ihu Chineke chụọrọ ya àjà, feekwa ya. (Ọpụ. 29:43-46) Ma, e nwere ihe ka mma ụlọikwuu ahụ nọchiri anya ya nke ga-abara Ndị Kraịst uru.
7. Olee mgbe ụlọ nsọ ihe atụ ahụ malitere ịdị?
7 Otú Ndị Kraịst si efe Chineke. Ụlọikwuu oge ochie ahụ ‘nọchiri anya ihe ndị dị n’eluigwe.’ Ọ nọchiri anya nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ Jehova. Pọl kwuru na “ụlọikwuu a bụ ihe atụ maka oge a.” (Hib. 8:5; 9:9) N’ihi ya, n’oge o degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi ahụ, ụlọ nsọ ihe atụ ahụ adịla adị. Mgbe ọ malịtere ịdị bụ n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst. Ọ bụ n’afọ ahụ ka e mere Jizọs baptizim, jiri mmụọ nsọ tee ya mmanụ, ya amalitekwa ịbụ “nnukwu onye nchụàjà kachanụ” n’ụlọ nsọ ihe atụ Jehova. c—Hib. 4:14; Ọrụ 10:37, 38.
NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ
8-9. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 7:23-27, olee ezigbote ihe dị iche ná nnukwu ndị nchụàjà e nwere n’oge ụmụ Izrel na Nnukwu Onye Nchụàjà Kachanụ bụ́ Jizọs Kraịst?
8 Otú ndị Juu si fee Chineke. Nnukwu onye nchụàjà na-anọchite anya ụmụ Izrel n’ihu Jehova. Ọ bụ Erọn bụ nnukwu onye nchụàjà mbụ n’Izrel. Ọ bụ mgbe e nyefere Jehova ụlọikwuu ahụ ka ọ họpụtara Erọn. Ma, Pọl kọwara na “ọtụtụ ndị ghọkwara ndị nchụàjà, onye pụọ ibe ya anọchie, maka na ọnwụ ekweghị ka ha nọgide na-arụ ọrụ ha.” d (Gụọ Ndị Hibru 7:23-27.) Ebe ọ bụ na nnukwu ndị nchụàjà ndị ahụ ezughị okè, ha na-achụ àjà maka mmehie nke ha. Ihe a bụ ezigbo ihe mere Nnukwu Onye Nchụàjà Kachanụ bụ́ Jizọs Kraịst ji dị iche ná nnukwu ndị nchụàjà n’Izrel.
9 Otú Ndị Kraịst si efe Chineke. Ebe Jizọs Kraịst bụ Nnukwu Onye Nchụàjà anyị kachanụ, “ọ na-eje ozi . . . n’ezigbo ụlọikwuu nke Jehova rụrụ, ọ bụghị mmadụ.” (Hib. 8:1, 2) Pọl kwuru na “ebe ọ bụ na [Jizọs] na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, e nweghị onye ga-anọchi ya n’ọrụ nchụàjà ọ na-arụ.” Pọl kwukwara na Jizọs bụ “onye a na-emerụghị emerụ, onye dị iche ná ndị mmehie” nakwa na “ọ dịghị ka nnukwu ndị nchụàjà ahụ, ndị na-achụ àjà kwa ụbọchị” maka mmehie nke ha. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe dị iche n’ebe ịchụàjà ndị Izrel oge ochie na ebe ịchụàjà Ndị Kraịst nakwa n’àjà ndị Izrel chụrụ na n’àjà Ndị Kraịst na-achụ.
EBE ỊCHỤÀJÀ NA ÀJÀ NDỊ A NA-ANỌ NA HA ACHỤ
10 Olee ihe àjà a nọ n’ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa chụọ nọchiri anya ya?
10 Otú ndị Juu si fee Chineke. E nwere ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa mee n’èzí ụlọikwuu ahụ, n’ọnụ ụzọ e si abanye ya. Ọ bụ ebe a na-anọ eji anụmanụ achụrụ Jehova àjà. (Ọpụ. 27:1, 2; 40:29) Ma, àjà ndị ahụ emeghị ka a gbaghara ndị mmadụ mmehie ha kpamkpam. (Hib. 10:1-4) Àjà ndị e ji ụmụ anụmanụ chụọ n’ụlọikwuu ahụ na-egosi na e nwere otu àjà a ga-achụ ga-eme ka a gbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha kpamkpam.
11 Olee ebe ịchụàjà Jizọs nọ chụọ onwe ya n’àjà? (Ndị Hibru 10:5-7, 10)
11 Otú Ndị Kraịst si efe Chineke. Jizọs ma na Jehova zitere ya n’ụwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà maka ụmụ mmadụ. (Mat. 20:28) N’ihi ya, n’oge a na-eme Jizọs baptizim, o wepụtara onwe ya ime uche Jehova. (Jọn 6:38; Gal. 1:4) Ebe Jizọs nọ jiri onwe ya chụọ àjà abụghị ebe ịchụàjà nkịtị. Ebe ịchụàjà ahụ nọchiri anya “uche” Chineke. Uche Chineke bụ ka Ọkpara ya jiri ndụ ya zuru okè chụọ àjà mgbe ọ bụ mmadụ. Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà “naanị otu ugboro” ka o mee ka a gbaghara onye ọ bụla nwere okwukwe na ya mmehie ya kpamkpam. (Gụọ Ndị Hibru 10:5-7, 10.) Ka anyị lebazie anya n’ihe ihe ndị dị n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya ha.
EBE NSỌ NA EBE KACHA NSỌ
12 Olee onye nwere ike ịbanye n’ọnụ ụlọ nke ọ bụla n’ụlọikwuu ahụ?
12 Otú ndị Juu si fee Chineke. Otú e si rụọ ime ụlọikwuu ahụ na otú e si rụọ ụlọ nsọ ndị e mechara rụọ na Jeruselem yiri. N’ime ha, e nwere nkebi abụọ, ya bụ, “Ebe Nsọ” na “Ebe Kacha Nsọ.” Ihe kewara ha abụọ bụ ákwà mgbochi a kpara akpa. (Hib. 9:2-5; Ọpụ. 26:31-33) N’ime Ebe Nsọ ahụ, e nwere ihe e ji ọlaedo rụọ e ji adọsa ọkụ, ebe ịchụàjà a ga na-amụ insens na ya, na tebụl a na-edosa achịcha a na-enye Jehova. Ọ bụ naanị “ndị nchụàjà e tere mmanụ” na-abanye n’Ebe Nsọ ịrụ ọrụ ha dị nsọ. (Ọnụ Ọgụ. 3:3, 7, 10) Ihe dị n’Ebe Kacha Nsọ bụ igbe ọgbụgba ndụ e ji ọlaedo mee, nke na-egosi na Jehova nọ ebe ahụ. (Ọpụ. 25:21, 22) Ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-agafe ákwà mgbochi ahụ banye n’ime Ebe Kacha Nsọ otu ugboro n’afọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. (Lev. 16:2, 17) N’afọ ọ bụla, ọ na-eji ọbara anụmanụ abanye n’Ebe Kacha Nsọ ka o kpuchie mmehie nke ya na nke ndị Izrel niile. Jehova mechara jiri mmụọ nsọ ya mee ka a ghọta ihe ihe ndị a dị n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya ha.—Hib. 9:6-8. e
13 Gịnị ka Ebe Nsọ na Ebe Kacha Nsọ dị n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya ha n’otú Ndị Kraịst si efe Chineke?
13 Otú Ndị Kraịst si efe Chineke. E ji mmụọ nsọ tee ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ, nke mere ka adịm ná mma ha na Jehova pụọ iche. Ha dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000). Ha na Jizọs ga-abụ ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 1:6; 14:1) Ihe Ebe Nsọ dị n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya ya bụ na Chineke mere ka Ndị Kraịst e tere mmanụ bụrụ ụmụ ya mgbe ha ka nọ n’ụwa. (Rom 8:15-17) Ebe Kacha Nsọ n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya eluigwe, ebe Jehova bi. “Ákwà mgbochi” nke kewara Ebe Nsọ na Ebe Kacha Nsọ nọchiri anya ahụ́ mmadụ Jizọs nwere nke gbochiri ya ịbanye n’eluigwe ma bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà Kachanụ nke ụlọ nsọ ihe atụ ahụ. Mgbe Jizọs nwụrụ, jiri ahụ́ ya chụọ àjà maka ụmụ mmadụ, o mepere ụzọ ka Ndị Kraịst niile e tere mmanụ nwee ike ịdị ndụ n’eluigwe. Hanwa ga-ahapụkwa ahụ́ mmadụ ha ka ha nwee ike inweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe. (Hib. 10:19, 20; 1 Kọr. 15:50) Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ banyere n’Ebe Kacha Nsọ nke ụlọ nsọ ihe atụ ahụ, ebe ndị niile e tere mmanụ ga-emecha bịa sonyere ya.
14 Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 9:12, 24-26, olee ihe mere otú e si efe Jehova n’ụlọ nsọ ihe atụ ya ji ka otú ndị Izrel si fee ya mma?
14 Anyị ahụla na ndokwa Chineke mere ka a na-efe ya ezigbo ofufe n’ihi àjà Jizọs Kraịst chụrụ nakwa onye nchụàjà ọ bụ ka otú ndị Izrel si fee Chineke mma. Nnukwu onye nchụàjà n’oge ụmụ Izrel na-eji ọbara ụmụ anụmanụ abanye n’Ebe Kacha Nsọ e ji aka rụọ. Ma, Jizọs banyere “n’eluigwe” n’ihu Jehova, ebe kacha ebe niile nsọ. N’ebe ahụ, o gosiri Chineke uru àjà ahụ o ji ndụ ya zuru okè chụọ maka anyị bara ka o nwee ike “si n’àjà o ji onwe ya chụọ wepụ mmehie.” (Gụọ Ndị Hibru 9:12, 24-26.) Àjà Jizọs chụrụ bụ àjà kachanụ n’ihi na ọ na-eme ka a gbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha kpamkpam ruo mgbe ebighị ebi. Dị ka anyị ga-emecha mụta, ma ànyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị niile nwere ike ịna-efe Jehova n’ụlọ nsọ ihe atụ ya.
OGIGE ỤLỌ NSỌ
15 Olee ndị jere ozi n’ogige ụlọikwuu ahụ?
15 Otú ndị Juu si fee Chineke. Ụlọikwuu ahụ nwere otu ebe a gbara ogige, ebe ndị nchụàjà na-anọ arụ ọrụ ha. Nnukwu ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ a na-anọ achụ àjà a na-esu ọkụ dịkwa n’ogige ahụ. Ihe ọzọ dị na ya bụ nnukwu ite e ji ọla kọpa rụọ e ji agbanye mmiri ndị nchụàjà na-eji asacha onwe ha tupu ha agawa ịrụ ọrụ dị nsọ. (Ọpụ. 30:17-20; 40:6-8) Ma n’ụlọ nsọ ndị e mechara rụọ, e nwekwara ogige dị n’èzí ndị na-abụghị ndị nchụàjà nwere ike ịbịa fee Jehova.
16 Olee ndị na-eje ozi n’ogige ndị dị n’ụlọ nsọ ihe atụ ahụ?
16 Otú Ndị Kraịst si efe Chineke. Tupu ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ agawa eluigwe ka ha soro Jizọs bụrụ ndị nchụàjà, ha na-eji obi ha niile na-efe Chineke n’ogige dị n’ime ụlọ nsọ ihe atụ ahụ. E nwere ihe dị mkpa nnukwu ite ahụ e ji agbanye mmiri n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ ahụ na-echetara ma hanwa ma ndị niile bụ́ Ndị Kraịst. Ọ na-echetara ha na ha kwesịrị ịdị ọcha ma n’ofufe ha na-efe Chineke ma n’àgwà ha. Ma, olee ebe “oké ìgwè mmadụ” ndị ji obi ha niile na-akwado ụmụnna Kraịst e tere mmanụ na-anọ efe Chineke? Jọn onyeozi hụrụ ka ha “guzo n’ihu ocheeze ahụ,” ebe bụ́ ogige dị n’èzí nke dị n’ụwa, ebe ha ‘na-ejere Chineke ozi n’ụlọ nsọ ya ehihie na abalị.’ (Mkpu. 7:9, 13-15) Obi dị anyị ụtọ na anyị niile nwere ebe anyị nọ na-efe Chineke ezigbo ofufe.
IHE ỌMA MEERE ANYỊ NA ANYỊ NA-EFE JEHOVA
17 Olee àjà ndị anyị nwere ike ịchụrụ Jehova?
17 Taa, ihe ọma meere Ndị Kraịst niile na ha na-eji oge ha, ike ha, na akụ̀ ha achụrụ Jehova àjà iji kwado ihe gbasara Alaeze Chineke. Dịkwa ka Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru, anyị nwere ike “na-achụrụ Chineke àjà otuto mgbe niile, ya bụ, okwu ọnụ anyị nke na-akọsa aha Chineke n’ihu ọha.” (Hib. 13:15) Otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma Chineke meere anyị kwe ka anyị na-efe ya bụ ime ike anyị niile n’ozi ya.
18 Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 10:22-25, gịnị ka anyị na-ekwesịghị ileghara anya, gịnịkwa ka anyị na-ekwesịghị ichefu?
18 Gụọ Ndị Hibru 10:22-25. Mgbe Pọl na-emechi akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, o kwuru ihe ụfọdụ gbasara ofufe anyị anyị na-ekwesịghị ileghara anya. Ihe ndị ahụ bụ ikpe ekpere, ikwusa ozi ọma, ịgbakọta ọnụ na-amụ ihe, na ịna-agbakwu ibe anyị ume “ebe anyị na-ahụ ụbọchị [Jehova] ka ọ na-eru nso.” Ná ngwụcha akwụkwọ Mkpughe, mmụọ ozi Jehova sịrị: “Na-efe naanị Chineke.” O kwuru ya ugboro abụọ iji gosi na ọ dị ezigbo mkpa. (Mkpu. 19:10; 22:9) Ka anyị ghara ichefu eziokwu a gbara ọkpụrụkpụ anyị mụtara gbasara nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ Jehova nakwa ihe ọma Chineke meere anyị ife ya.
ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị
a Otu n’ime ozizi ndị kacha gbaa ọkpụrụkpụ n’Okwu Chineke bụ gbasara ụlọ nsọ ihe atụ Jehova. Gịnị bụ ụlọ nsọ ahụ? Isiokwu a ga-akọwa ihe ndị dị n’akwụkwọ Ndị Hibru gbasara ụlọ nsọ ahụ. Ka ịmụ gbasara ya mee ka obi dịkwuo gị ụtọ na Jehova meere gị ihe ọma kwe ka ị na-efe ya.
b Ị chọọ ịhụ ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ Ndị Hibru, gaa na jw.org lee vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Ndị Hibru Na-ekwu.
c Akwụkwọ Ndị Hibru bụ naanị akwụkwọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kpọrọ Jizọs Nnukwu Onye Nchụàjà.
d Otu akwụkwọ kwuru na n’oge e bibiri ụlọ nsọ dị na Jeruselem n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst, na ọ ga-abụ na e nweela ihe ruru nnukwu ndị nchụàjà iri asatọ na anọ n’Izrel.
f Gụọ akwụkwọ A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe, peeji nke 240.
g Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Otú Mmụọ Nsọ Si Mee Ka A Ghọta Ihe Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ Pụtara.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Julaị 15, 2010, peeji nke 22.