Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 31

ABỤ NKE 12 Jehova Chineke Dị Ukwuu

Ihe Jehova Mere Iji Zọpụta Ụmụ Mmadụ Na-ezughị Okè

Ihe Jehova Mere Iji Zọpụta Ụmụ Mmadụ Na-ezughị Okè

“Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya.”​—JỌN 3:16.

IHE A GA-AMỤ

Otú Jehova si mee ka o kwe anyị omume ịlụso mmehie ọgụ na ime ihe dị ya mma nakwa otú o si mee ka o kwe anyị omume ịdị ndụ ebighị ebi ma gharazie ịbụ ndị mmehie.

1-2. (a) Gịnị bụ mmehie? Olee otú anyị ga-esi emeri n’ọgụ anyị na-alụso ya? (Kwuokwa ihe dị ná “Nkọwakwu.”) (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a nakwa n’isiokwu ndị ọzọ dị n’Ụlọ Nche a? (Kwuokwa ihe e dere n’isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Na-agụ Akwụkwọ A Ga-eburu n’Obi” n’Ụlọ Nche a.)

 Ị̀ GA-ACHỌ ịma otú Jehova Chineke hụruru gị n’anya? Lee otu ụzọ magburu onwe ya ị ga-esi amata azịza ajụjụ a: Mụọ ihe o meerela gị iji zọpụta gị n’aka mmehie na ọnwụ. Mmehie a bụ ajọ onye iro anyị na-agaghị emerili n’onwe anyị. Anyị niile na-emehie kwa ụbọchị. Anyị na-anwụkwa n’ihi mmehie. (Rom 5:12) Ma, e nwere ozi na-eme anyị obi ụtọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ga-enyeliri anyị aka imeri mmehie na ọnwụ kpamkpam.

2 Kemgbe ihe dị ka puku afọ isii (6,000) gara aga, Jehova Chineke na-enyere ụmụ mmadụ aka ịlụso mmehie ọgụ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya malite ná mbido. Ọ bụ ya mere o ji gbaa ezigbo mbọ ka o nyere ha aka imeri n’ọgụ a ha na-alụso mmehie. Chineke ma na mmehie na-akpata ọnwụ. Ọ chọghịkwa ka anyị nwụọ. Ọ chọrọ ka anyị dị ndụ ebighị ebi. (Rom 6:23) Ọ bụ ihe ọ chọrọ ka i nweta. N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ atọ: (1) Olee otú Jehova si mee ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwee olileanya? (2) Gịnị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’oge a na-ede Baịbụl mere ka obi dị Jehova ụtọ? (3) Gịnị ka Jizọs mere iji zọpụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ?

OLEE OTÚ JEHOVA SI MEE KA ỤMỤ MMADỤ NA-EZUGHỊ OKÈ NWEE OLILEANYA?

3. Olee otú nne na nna anyị mbụ si ghọọ ndị mmehie?

3 Mgbe Jehova kere nwoke mbụ na nwaanyị mbụ, ọ chọrọ ka obi dịrị ha ụtọ. O nyere ha ebe mara mma ha ga-ebi, mee ka ha bụrụ di na nwunye, nyekwa ha ọrụ ga-atọ ha ụtọ. Jehova gwara ha ka ha mụjuo ụwa, mee ka ụwa niile bụrụ Paradaịs nke ga-adị ka ogige Iden. Mana, o nyere ha naanị otu iwu na-esighị ike. Ọ dọkwara ha aka ná ntị na ọ bụrụ na ha akpachara anya nupụrụ ya isi, ha ga-anwụ. Anyị ma ihe merenụ. Otu mmụọ ozi dị obi ọjọọ na-ahụghị ma Chineke ma hanwa n’anya bịara nwaa ha ọnwụnwa ka ha mee mmehie. Adam na Iv rubeere ya isi. Ha atụkwasịghị Nna ha hụrụ ha n’anya obi. N’ihi ya, ha mehiere. Anyị makwa na ihe Jehova gwara ha mezuru. Malite n’ụbọchị ahụ gawa, ha tara ahụhụ si ná mmehie ahụ. Ha malitere ịka nká, mechaakwa nwụọ.​—Jen. 1:28, 29; 2:8, 9, 16-18; 3:1-6, 17-19, 24; 5:5.

4. Gịnị mere Jehova ji kpọọ mmehie asị ma na-enyere anyị aka ịlụso ya ọgụ? (Ndị Rom 8:20, 21)

4 Jehova mere ka e dee ihe a merenụ na Baịbụl ka anyị nwee ike ịghọta ihe dị ezigbo mkpa. Ọ na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere o ji kpọọ mmehie asị. Mmehie na-eme ka anyị na Chineke ghara ịbụ enyi. Ọ na-akpatakwa ọnwụ. (Aịza. 59:2) Ọ bụ ya mere Setan, onye kpatara nsogbu a niile, ji achọ ka ụmụ mmadụ na-eme mmehie. Ọ ga-abụ na o chere na ihe ahụ o mere n’Iden akụghasịala nzube Chineke. Ma, ọ maghị na Jehova bụ Chineke nwere ịhụnanya. Chineke agbanweghị nzube ya maka ụmụ Adam na Iv. Ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. N’ihi ya, ozugbo ahụ, o mere ka ụmụ Adam na Iv nwee olileanya. (Gụọ Ndị Rom 8:20, 21.) Jehova ma na ụfọdụ n’ime ụmụ Adam na Iv ga-ahụ ya n’anya, chọọkwa ka o nyere ha aka ịlụso mmehie ọgụ. Ebe ọ bụ ya kere ha, bụrụkwa Nna ha, o mere ka o kwe ha omume ịbịaru ya nso nakwa ka a napụta ha n’aka mmehie na ọnwụ. Gịnị ka Jehova ga-eme ka ihe a niile kwe omume?

5. Olee oge mbụ Jehova mere ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwee olileanya? Kọwaa. (Jenesis 3:15)

5 Gụọ Jenesis 3:15. Mgbe mbụ Jehova mere ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwee olileanya bụ mgbe o kwuru ihe ga-eme Setan. Jehova buru amụma na a ga-enwe “nwa” ga-azọpụta ụmụ mmadụ. Nwa ahụ ga-emecha bibie Ekwensu, meziekwa nsogbu niile Setan kpatara n’Iden. (1 Jọn 3:8) Ma, nwa ahụ ga-ata ahụhụ tupu ya emechaa ya. Setan ga-ebu ụzọ gbuo ya. Nke ahụ ga-akacha ewute Jehova. Mana, Jehova dị njikere idi ya n’ihi na ọ ga-eme ka a napụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ.

GỊNỊ KA ỤMỤ MMADỤ NA-EZUGHỊ OKÈ N’OGE OCHIE MERE KA OBI DỊ JEHOVA ỤTỌ?

6. Gịnị ka ndị nwere okwukwe, dị ka Ebel na Noa, mere iji bịaruo Jehova nso?

6 Jehova ji nwayọọ nwayọọ mee ka otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike isi bịaruo ya nso dokwuo anya. Ebel, bụ́ nwa nke abụọ Adam na Iv mụtara, bụ mmadụ mbụ nwere okwukwe na Jehova mgbe Adam na Iv nupụchara isi n’ogige Iden. Ebel chụụrụ Chineke àjà n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya, chọọ ime ihe dị ya mma, chọọkwa ịbịaru ya nso. Ebel na-azụ atụrụ. N’ihi ya, o gburu ụfọdụ ụmụ atụrụ ya, jiri ha chụọrọ Jehova àjà. Gịnị ka Jehova mere? O “lere Ebel na onyinye ya anya ọma.” (Jen. 4:4) Jehova nabatakwara àjà ndị ọzọ hụrụ ya n’anya ma tụkwasị ya obi chụụrụ ya. Otu n’ime ha bụ Noa. (Jen. 8:20, 21) Otú Jehova si nabata àjà ndị ahụ ha chụrụ gosiri na ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-emeli ihe dị ya mma, ha na ya adịrịkwa ná mma. b

7. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Ebreham si dịrị njikere iji nwa ya nwoke chụọ àjà?

7 Jehova gwara Ebreham, bụ́ nwoke nwere okwukwe pụrụ iche, ka o mee ihe siri ezigbo ike, ya bụ, ka o jiri nwa ya nwoke bụ́ Aịzik chụọ àjà. Ọ ga-abụrịrị na ihe a gbawara Ebreham obi. N’agbanyeghị ya, o jikeere ime ihe Jehova gwara ya. Ma, mgbe ọ fọrọ obere ka o gbuo nwa ya nwoke, Chineke kwụsịrị ya. N’agbanyeghị ya, ihe ahụ na-akụziri ndị niile nwere okwukwe otu eziokwu dị ezigbo mkpa. Jehova ga-adị njikere iji Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya chụọ àjà. Ọ bụ otú ahụ ka Jehova hụruru ụmụ mmadụ n’anya.​—Jen. 22:1-18.

8. Gịnị ka ọtụtụ àjà Iwu Mosis kwuru ka a na-achụ na-egosi? (Levitikọs 4:27-29; 17:11)

8 Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru ọtụtụ àjà ha ga-achụ iji kpuchie mmehie ha. (Gụọ Levitikọs 4:27-29; 17:11.) Àjà ndị ahụ gosiri na Jehova ga-achụ àjà ka mma iji zọpụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie kpamkpam. Chineke mere ka ndị amụma ya kọwaa na nwa ahụ e kwere ná nkwa, nke mechara bụrụ Ọkpara Chineke pụrụ iche, ga-ata ahụhụ, e gbuokwa ya. A ga-egbu ya ka atụrụ e ji achụ àjà. (Aịza. 53:1-12) Chegodị echiche: Jehova ga-ahazi ka Ọkpara ọ hụrụ n’anya jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. Gịnwa sokwa.

GỊNỊ KA JIZỌS MERE IJI ZỌPỤTA ỤMỤ MMADỤ?

9. Gịnị ka Jọn Onye Na-eme Baptizim kwuru gbasara Jizọs? (Ndị Hibru 9:22; 10:1-4, 12)

9 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ́ ohu Chineke, kwuru banyere Jizọs onye Nazaret, sị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke onye na-ewepụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Ihe ahụ o kwuru gosiri na Jizọs bụ nwa ahụ e buru amụma kemgbe ọtụtụ narị afọ na ọ ga-abịa. Jizọs ga-eji ndụ ya chụọ àjà. Ihe ọ pụtara bụ na nwa Jehova emechaala bịa ịzọpụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ kpamkpam.​—Gụọ Ndị Hibru 9:22; 10:1-4, 12.

10. Olee otú Jizọs si gosi na ọ bụ ndị mmehie ‘ka ọ bịara ịkpọ’?

10 Ndị Jizọs kacha lekwasị anya bụ ndị obi na-agbawa n’ihi na ha bụ ndị mmehie. Ọ kpọkwara ha ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ ma na ọ bụ mmehie na-akpata nsogbu ndị mmadụ. N’ihi ya, o nyeere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-ata ahụhụ mmehie kpataara ha aka. O ji otu ihe atụ kọwaa ya. Ọ sịrị: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.” Ọ sịkwara: “Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.” (Mat. 9:12, 13) Jizọs mere ihe ahụ o kwuru. O ji obiọma gbaghara otu nwaanyị mmehie ya, ya bụ, nwaanyị ahụ ji anya mmiri ya hichaa ụkwụ ya. (Luk 7:37-50) Ọ kụziiri nwaanyị Sameria eziokwu ndị dị ezigbo mkpa n’akụkụ olulu mmiri n’agbanyeghị na ọ ma na nwaanyị ahụ na-ebi ndụ rụrụ arụ. (Jọn 4:7, 17-19, 25, 26) Chineke nyedịrị Jizọs ike imeri ihe mmehie niile na-akpatara ụmụ mmadụ, ya bụ, ọnwụ. Olee otú o si mee ya? Jizọs kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka ma ndị toro eto.​—Mat. 11:5.

11. Gịnị mere ndị mmehie ji bịakwute Jizọs?

11 Ka a sịkwa ihe mere obi ji ruo ndị mmehie ala ịbịakwute Jizọs. O meteere ha ebere, nweekwara ha ọmịiko. Ụjọ atụghị ha ịgwa ya okwu. (Luk 15:1, 2) Jizọs jakwara ha mma ma gọzie ha maka okwukwe ha nwere na ya. (Luk 19:1-10) Jizọs na-eme ebere otú ahụ Nna ya na-eme. (Jọn 14:9) O si n’okwu ya nakwa n’omume ya gosi na Nna ya, bụ́ onye obi ebere nke nwekwara ọmịiko, hụrụ ndị mmadụ n’anya, chọọkwa inyere onye nke ọ bụla aka imeri ọgụ ọ na-alụso mmehie. Jizọs nyeere ndị mmadụ na-ezughị okè aka ịchọ ịgbanwe ụzọ ọjọọ ha ma soro ya.​—Luk 5:27, 28.

12. Gịnị ka Jizọs kụziri banyere ọnwụ ya?

12 Jizọs ma na ọ ga-eji ndụ ya chụọ àjà. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe karịrị otu ugboro na a ga-enyefe ya n’aka ndị iro ya ma gbuo ya n’osisi ịta ahụhụ. (Mat. 17:22; 20:18, 19) Ọ ma na àjà ahụ ọ ga-achụ ga-eme ka e wepụ mmehie nke ụwa otú ahụ Jọn kwuru nakwa otú ahụ ndị amụma buru n’amụma. Jizọs kụziri na o jirichaa ndụ ya chụọ àjà, ‘ọ ga-adọta ụdị mmadụ niile n’ebe ọ nọ.’ (Jọn 12:32) Ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-emeli ihe dị Jehova mma ma ọ bụrụ na ha anabata Jizọs ka ọ bụrụ Onyenwe ha, na-esokwa nzọụkwụ ya. Ha mee otú ahụ, ha ga-emecha bụrụ ndị ‘e mere ka ha kwụsị ịgbara mmehie ohu.’ (Rom 6:14, 18, 22; Jọn 8:32) N’ihi ya, Jizọs katara obi, wepụtakwa onwe ya ịnwụ ọnwụ ahụhụ iji zọpụta anyị.​—Jọn 10:17, 18.

13. Olee otú Jizọs si nwụọ? Oleekwa ihe ọnwụ ya na-akụziri anyị banyere Jehova Chineke? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 A raara Jizọs nye n’aka ndị iro ya, nwụchie ya, kparịa ya, kwutọọ ya, ma ya ikpe, taadị ya ahụhụ. Ndị agha duuru ya gaa n’ebe a ga-egbu ya, kpọgidekwa ya n’osisi ịta ahụhụ. Ka ọ na-atachi obi n’ahụhụ ahụ niile, e nwere onye ihe ahụ kadị gbawaa obi. Ọ bụ Jehova Chineke. Jehova ga-emeli ka Ọkpara ya ghara ịta ahụhụ. Mana, o meghị otú ahụ. Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ Ọkpara ya n’anya nke ukwuu, gịnị mere o ji kwe ka ọ taa ahụhụ ma nwụọ? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Jizọs sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”​—Jọn 3:16.

Obi gbawara Jehova mgbe o kwere ka e gbuo Ọkpara ya ka e nwee ike ịnapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)


14. Gịnị ka àjà Jizọs chụrụ na-akụziri gị?

14 Àjà ahụ Jizọs chụrụ bụ ihe kacha gosi otú Jehova hụruru ụmụ Adam na Iv n’anya. Ọ na-egosikwa na Jehova hụrụ gịnwa n’anya nke ukwuu. O ji Ọkpara ọ hụrụ n’anya chụọ àjà, diekwa obi mgbawa kachanụ ka o nwee ike ịnapụta gị n’aka mmehie na ọnwụ. (1 Jọn 4:9, 10) N’eziokwu, ọ chọrọ inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka imeri n’ọgụ anyị na-alụso mmehie.

15. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka àjà ahụ Jizọs chụrụ baara anyị uru?

15 Onyinye Chineke nyere anyị, nke bụ́ àjà Ọkpara ọ mụrụ naanị ya chụrụ, mere ka o kwe omume ịgbaghara anyị mmehie anyị. Ma, e nwere ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gbaghara anyị. Gịnị ka ọ bụ? Jọn Onye Na-eme Baptizim na Jizọs n’onwe ya zara ajụjụ ahụ. Ha sịrị: “Chegharịanụ, n’ihi na Alaeze eluigwe adịla nso.” (Mat. 3:1, 2; 4:17) N’ihi ya, anyị ga-echegharị ná mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke dịrị ná mma, nakwa ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị. Ma, gịnị ka nchegharị pụtara? Oleekwa otú o si enyere anyị aka imeri n’ọgụ anyị na-alụso mmehie? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-eso nke a.

ABỤ NKE 18 Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta

a NKỌWAKWU: Na Baịbụl, “mmehie” nwere ike ịpụta ime ihe Chineke sịrị na ọ dịghị mma ma ọ bụ ịhapụ ime ihe ọ sịrị na ọ dị mma. Okwu ahụ bụ́ “mmehie” nwekwara ike ịpụta ezughị okè anyị niile ketara n’aka Adam. Ọ bụ mmehie anyị ketara mere anyị niile ji na-anwụ anwụ.

b Jehova nabatara àjà ndị ji obi ha niile fee ya chụrụ tupu Jizọs abịa n’ụwa n’ihi na ọ ma na Jizọs ga-eji ndụ ya chụọ àjà n’ọdịnihu. Àjà ahụ ga-anapụtakwa ụmụ mmadụ niile kpamkpam ná mmehie na ọnwụ.​—Rom 3:25.