ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 34
ABỤ NKE 107 Ṅomie Ịhụnanya Chineke
Otú Ndị Okenye Ga-esi Egosi Ndị Mere Mmehie na Ha Hụrụ Ha n’Anya ma Na-emere Ha Ebere
“[Chineke] na-achọ inyere gị aka ka i chegharịa maka na ọ dị obiọma.”—ROM 2:4.
IHE A GA-AMỤ
Otú ndị okenye si enyere ndị nọ n’ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ aka.
1. Gịnị nwere ike ime ụfọdụ ndị mere mmehie dị oké njọ?
N’ISIOKWU bu nke a ụzọ, anyị hụrụ ihe Pọl onyeozi mere mgbe otu nwoke mere mmehie dị oké njọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt. Nwoke ahụ echegharịghị, e kewapụ ya n’ọgbakọ. Ma, dị ka amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a gosiri, e nwere ike inyere ụfọdụ ndị mere mmehie dị oké njọ aka. Chineke nwere ike inyere ha aka ka ha chegharịa. (Rom 2:4) Olee otú o nwere ike isi eji ndị okenye enyere ha aka ka ha chegharịa?
2-3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị mata na nwanna mere mmehie dị oké njọ? Maka gịnị?
2 Tupu ndị okenye enyere mmadụ aka, ha kwesịrị ibu ụzọ mara ihe merenụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị amata na e nwere nwanna mere mmehie dị oké njọ, nke nwere ike ime ka e kewapụ ya n’ọgbakọ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Anyị kwesịrị ịgba ya ume ka ọ gaa gwa ndị okenye ka ha nyere ya aka.—Aịza. 1:18; Ọrụ 20:28; 1 Pita 5:2.
3 Ma, ọ bụrụkwanụ na onye ahụ ekweghị agakwuru ndị okenye? Anyịnwa ga-agakwuruzi ndị okenye iji jide n’aka na e nyeere ya aka. Ime otú a na-egosi na anyị hụrụ nwanna ahụ n’anya n’ihi na anyị ma na ndị okenye ga-enyeliri ya aka. Ọ bụrụ na onye ahụ mere mmehie dị oké njọ echegharịghị, ọ ga-emebiri adịm ná mma ya na Jehova na-aga. O nwekwara ike iwetara ọgbakọ aha ọjọọ. N’ihi ya, anyị ga-akata obi gaa gwa ndị okenye mmehie dị oké njọ nwanna mere n’ihi na anyị hụrụ Jehova na nwanna ahụ n’anya.—Ọma 27:14.
OTÚ NDỊ OKENYE SI ENYERE ONYE MERE MMEHIE DỊ OKÉ NJỌ AKA
4. Olee ihe na-abụ mkpa ndị okenye ma ha na onye mere mmehie dị oké njọ nọkọọ?
4 Ọ bụrụ na onye nọ n’ọgbakọ emee mmehie dị oké njọ, ndị okenye na-ahọpụta ndị okenye atọ ka ha soro na kọmitii ga-eleba okwu ahụ anya. a Ha kwesịrị ịma ebe ike ha ruru ma dịrị umeala n’obi. Mgbe ha na-achọ inyere onye mere mmehie dị oké njọ aka ichegharị, ha kwesịrị ịmata na ha agaghị amanyeli mmadụ ichegharị. (Diut. 30:19) Ndị okenye ma na ọ bụghị mmadụ niile mere mmehie dị oké njọ ga-echegharị ka Eze Devid. (2 Sam. 12:13) Ụfọdụ ndị mere mmehie nwere ike ikpebi na ha agaghị anabata ndụmọdụ Jehova na-enye ha. (Jen. 4:6-8) N’agbanyeghị ya, ihe ndị okenye na-ebu n’obi bụ inyere onye ahụ mere mmehie dị oké njọ aka ka o chegharịa ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume. Olee ihe ndị okenye kwesịrị icheta ma ha na onye mere mmehie dị oké njọ nọkọọ?
5. Olee ihe ndị okenye kwesịrị iburu n’obi mgbe ha na onye mere mmehie dị oké njọ na-anọkọ? (2 Timoti 2:24-26) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
5 Ndị okenye ma na n’agbanyeghị na mmadụ mere mmehie dị oké njọ, ọ ka bụ atụrụ Jehova o ji kpọrọ ihe. (Luk 15:4, 6) N’ihi ya, ha na onye ahụ nọkọọ, ha anaghị agwa ya okwu ọjọọ ma ọ bụ meso ya otú na-adịghị mma. Ha anaghịkwanụ ewere ya na naanị ihe ha ga-eme bụ ịjụ ya ajụjụ ka ha mata otú ihe si mee. Kama, ha kwesịrị ime ihe e kwuru na 2 Timoti 2:24-26. (Gụọ ya.) Ndị okenye kwesịrị ịdị nwayọọ, dịrịkwa obiọma ka ha na-agbalị inyere onye ahụ mere mmehie aka ka ọ gbanwee echiche ya.
6. Olee otú ndị okenye si akwadebe obi ha tupu ha na onye mere mmehie dị oké njọ anọkọọ? (Ndị Rom 2:4)
6 Ndị okenye na-akwadebe obi ha. Ha na-agbalị imeso ndị mmehie otú Jehova si emeso ha. Ha na-echeta ihe Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “[Chineke] na-achọ inyere gị aka ka i chegharịa maka na ọ dị obiọma.” (Gụọ Ndị Rom 2:4.) Ndị okenye bụ ndị ọzụzụ atụrụ. Ha kwesịkwara ịna-eso ntụziaka Kraịst ma na-eme ka ya mgbe ha na-elekọta ọgbakọ. (Aịza. 11:3, 4; Mat. 18:18-20) Tupu kọmitii ndị okenye na onye mere mmehie dị oké njọ anọkọọ, ha na-ekpe ekpere ma buru ihe kacha ha mkpa n’obi, ya bụ, inyere onye ahụ mere mmehie aka ka o chegharịa. Ha na-eme nchọnchọ n’Akwụkwọ Nsọ nakwa n’akwụkwọ anyị, na-ekpekwa ekpere ka Jehova nyere ha aka ịghọta onye ahụ na ihe merenụ. Ha na-atụlekwa ihe ọ dị mkpa ka ha mara gbasara onye ahụ mere mmehie nke nwere ike ịbụ ihe mere o ji chee echiche otú o si chee ma ọ bụ mee ihe o mere.—Ilu 20:5.
7-8. Olee otú ndị okenye nwere ike isi enwe ndidi ka Jehova ma ha na onye mere mmehie dị oké njọ nọkọọ?
7 Ndị okenye na-enwe ndidi ka Jehova. Ha na-echeta otú Jehova si gbalịa inyere ndị mere mmehie dị oké njọ aka n’oge gara aga. Dị ka ihe atụ, Jehova nwere ndidi ka ọ na-enyere Ken aka iche echiche nke ọma. Ọ gwara ya ihe ga-eme ya ma ọ bụrụ na ọ gbanweghị, gwakwa ya na ọ ga-agọzi ya ma o rubere ya isi. (Jen. 4:6, 7) Jehova jikwa Netan onye amụma dụọ Devid ọdụ. Netan mere ihe atụ metụrụ eze n’obi. (2 Sam. 12:1-7) Jehova “nọ na-ezigara” ndị Izrel ndị amụma ya “ugboro ugboro” ma ha nupụrụ ya isi. (Jere. 7:24, 25) Ọ naghị eche ka ndị ya chegharịa tupu ya amalite inyere ha aka. Kama, ọ bụ ya na-ebu ụzọ agwa ha ka ha chegharịa mgbe ha ka nọ na-eme mmehie.
8 Ndị okenye na-eme ka Jehova mgbe ha na-agbalị inyere ndị mere mmehie dị oké njọ aka. Ha ‘na-enwere ha ndidi’ dị ka e kwuru na 2 Timoti 4:2. N’ihi ya, okenye kwesịrị imeda obi ma nwee ndidi ka o nwee ike inyere onye mere mmehie aka ime ihe dị mma. Ọ bụrụ na okenye ewewe iwe ma ọ bụ siwe ọnwụ, o nwere ike onye mmehie ahụ agaghị anabata ndụmọdụ a na-enye ya ma ọ bụkwanụ ya ajụ ichegharị.
9-10. Olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere onye mere mmehie aka ichebara mmehie ahụ o mere echiche?
9 Ndị okenye na-agbalị ịchọpụta ihe ndị mere tupu onye ahụ emee mmehie ahụ. Dị ka ihe atụ, nwanna ahụ ò ji nwayọọ nwayọọ lawa azụ n’ihi na ọ naghịzi amụchi ihe anya n’onwe ya ma ọ bụkwanụ na-agachi ozi ọma anya? Ọ̀ kwụsịrị ikpechi ekpere anya? Ọ̀ nọ na-eche ihe ndị na-adịghị mma? Ò mere mkpebi na-adịghị mma gbasara ndị ya na ha na-akpa ma ọ bụkwanụ ihe ndị o ji eme onwe ya obi ụtọ? Olee otú ihe ndị ọ họọrọ si mee ka o chewe ihe na-adịghị mma? Ọ̀ ghọtara na ihe ndị o mere akpaala adịm ná mma ya na Nna ya bụ́ Jehova aka ọjọọ?
10 Ọ bụrụ na ndị okenye agbalịa jụọ ajụjụ ndị dabara adaba ma ghara itinye anya n’ihe na-agbasaghị ha, ha ga-eji nwayọọ nwayọọ ghọta onye ahụ mere mmehie dị oké njọ ma nyere ya aka ichebara ihe o mere echiche. (Ilu 20:5) Ihe ọzọ bụ na ha nwere ike iji ihe atụ nyere ya aka ịghọta otú ihe o mere jọruru ná njọ otú ahụ Netan ji ihe atụ nyere Devid aka. Mgbe mbụ ha na onye mere mmehie dị oké njọ nọkọrọ, ihe ọjọọ ahụ o mere nwere ike iwute ya. O nwedịrị ike ichegharị.
11. Olee otú Jizọs si meso ndị mmehie?
11 Ndị okenye na-agbalị ime ka Jizọs. Jizọs nyeere Sọl onye Tasọs aka. Ọ jụrụ ya ajụjụ dabara adaba. Ọ jụrụ ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” Jizọs si otú ahụ nyere ya aka ịghọta na ihe ọ na-eme adịghị mma. (Ọrụ 9:3-6) Jizọs kwuru gbasara “nwaanyị ahụ bụ́ Jezibel,” sị: “M nyekwara ya oge ka o chegharịa.”—Mkpu. 2:20, 21.
12-13. Olee otú ndị okenye nwere ike isi nye onye mere mmehie oge ichegharị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
12 Ndị okenye na-eme ka Jizọs ma ha ghara iji ọkụ ọkụ kpebie na onye mere mmehie dị oké njọ agaghị echegharịli. Ụfọdụ ndị nwere ike ichegharị na nke mbụ ha na kọmitii ndị okenye nọkọrọ. E nwekwara ndị nke o nwere ike iwetụ oge. N’ihi ya, ndị okenye nwere ike ịhazi ka ha na onye ahụ mere mmehie nọkọọ ihe karịrị otu ugboro. O nwere ike, mgbe ha na onye ahụ nọchara na nke mbụ ya, ya amalite ichebara ihe ndị a gwara ya echiche. O nwere ike isi n’obi ya kpee ekpere rịọ Jehova ka ọ gbaghara ya. (Ọma 32:5; 38:18) N’ihi ya, ná nnọkọ ọzọ ha na ya ga-enwe, o nwere ike ịbụ na otú o si ele ihe anya mgbe mbụ ha na ya nọkọrọ agbanweela.
13 Ndị okenye kwesịrị imetara onye mere mmehie ebere ma gosi ya obiọma ka ha nwee ike inyere ya aka ichegharị. Olileanya ha bụ ka nwanna ahụ mere mmehie dị oké njọ ghọta ihe ọjọọ o mere ma chegharịa. Ha na-ekpekwa ekpere ka Jehova gọzie mbọ ha na-agba inyere ya aka.—2 Tim. 2:25, 26.
14. Olee onye e kwesịrị ito ma onye mere mmehie chegharịa? Maka gịnị?
14 Ọ bụrụ na onye mere mmehie echegharịa, obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ. (Luk 15:7, 10) Olee onye e kwesịrị ito maka ya? Ọ̀ bụ ndị okenye? Cheta ihe Pọl onyeozi dere gbasara ndị mmehie. Ọ sịrị: “Ikekwe, Chineke ga-eme ka ha chegharịa.” (2 Tim. 2:25) N’ihi ya, ọ bụ Jehova na-enyere Onye Kraịst aka ịgbanwe echiche ya na àgwà ya, ọ bụghị mmadụ. Pọl kọwara ihe ọma ga-eme ma mmadụ chegharịa. Onye ahụ nwere ike ịmatakwu eziokwu nke ọma, ghọta na ihe o mere dị njọ, ma si n’ọnyà Ekwensu pụọ.—2 Tim. 2:25.
15. Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-enyere onye mere mmehie chegharịrị echegharị aka?
15 Ọ bụrụ na onye mmehie echegharịa, kọmitii ndị okenye ga-ahazi ka a na-agara ya nleta ọzụzụ atụrụ, ka e nwee ike inyere ya aka ịlụso ọnyà Setan ọgụ, nyekwara ya aka ịna-eme ihe dị mma. (Hib. 12:12, 13) N’eziokwu, ndị okenye anaghị agwa ndị ọzọ ihe onye mmehie ahụ mere. Ma, olee ihe e nwere ike ịgwa ọgbakọ?
‘NỌRỌ N’IHU MMADỤ NIILE DỌỌ YA AKA NÁ NTỊ’
16. Dị ka e kwuru na 1 Timoti 5:20, ole ndị bụ “mmadụ niile” Pọl na-ekwu okwu ha?
16 Gụọ 1 Timoti 5:20. Onye Pọl degaara okwu ndị a bụ okenye ibe ya bụ́ Timoti. O ji ya na-agwa ya ihe a ga-eme ndị “na-eme mmehie.” Ihe Pọl na-ekwu ọ̀ bụ na e kwesịrị ịdọ onye mmehie ahụ aka ná ntị n’ihu ọgbakọ niile? Ọ bụghị mgbe niile. “Mmadụ niile” ọ na-ekwu okwu ha nwere ike ịbụ ndị ma gbasara mmehie ahụ nwanna ahụ mere. Ndị ma gbasara mmehie ahụ nwere ike ịbụ ndị hụrụ mgbe o mere ya ma ọ bụkwanụ ndị ọ gwara gbasara ya. Ndị okenye ga-eji akọ gwa ha na ha elebarala okwu ahụ anya, nakwa na a gbaziela nwanna ahụ.
17. Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ amara gbasara mmehie dị oké njọ nwanna mere ma ọ bụkwanụ na ha nwere ike ịmata gbasara ya, olee ọkwa a ga-amara ọgbakọ? Maka gịnị?
17 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ amatala gbasara mmehie nwanna mere ma ọ bụkwanụ na ha nwere ike ịmata gbasara ya. Ụdị ihe ahụ mee, “mmadụ niile” ga-abụ ọgbakọ niile. N’ihi ya, otu okenye ga-amara ọgbakọ ọkwa na a dọọla nwanna ahụ aka ná ntị. Maka gịnị? Pọl zara ajụjụ ahụ. Ọ sịrị: “Ka ụjọ ime mmehie wee tụọ ndị ọzọ.”
18. Gịnị ka ndị okenye na-eme ma nwata na-erubeghị afọ iri na asatọ mere baptizim mee mmehie dị oké njọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
18 Ọ bụrụkwanụ na nwata na-erubeghị afọ iri na asatọ mere baptizim emee mmehie dị oké njọ? Ndị okenye ga-ahazi ka ndị okenye abụọ gakwuru ya na ndị mụrụ ya bụ́ Ndị Kraịst. b Ndị okenye ga-achọpụta ihe ndị nne na nna ya merela iji nyere ya aka ichegharị. Ọ bụrụ na nwa ahụ anabata aka ná ntị nne na nna ya na-adọ ya ma gbanwee, ndị okenye nwere ike ịgwa nne na nna ya ka ha na-enyere ya aka ma kpebie na ọ dịghị mkpa ka e hiwe kọmitii ga-ahụ ha. A sị ka e kwuwe, ọ bụ nne na nna ka Chineke nyere ọrụ ịgbazi ụmụ ha. (Diut. 6:6, 7; Ilu 6:20; 22:6; Efe. 6:2-4) Ihe ndị okenye ga-emezi bụ ha gụrụ gụrụ, ha agakwuru ndị mụrụ nwa ahụ ka ha jide n’aka na a na-enyere ya aka otú kwesịrị ekwesị. Ma, ọ bụrụkwanụ na nwatakịrị ahụ mere baptizim ekweghị echegharị, ya aka na-eme ihe ọjọọ ọ na-eme? A ga-ahọpụta kọmitii ndị okenye ha na nwa ahụ na ndị mụrụ ya bụ́ Ndị Kraịst ga-anọkọ.
‘IHE GBASARA ONYE ỌZỌ NA-EMETỤ JEHOVA N’OBI, Ọ NA-EMEKWA EBERE’
19. Olee otú ndị okenye si eme ka Jehova ma ha na onye mere mmehie dị oké njọ nọkọọ?
19 Jehova chọrọ ka ndị okenye chebe ọgbakọ ka ndị na-ekweghị edebe iwu ya ghara imebi ya. (1 Kọr. 5:7) Ha na-agbalịkwa inyere onye mmehie aka ka o chegharịa, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume. N’ihi ya, ha nyewere mmadụ aka, ha na-enwe olileanya na ọ ga-agbanwe. Maka gịnị? N’ihi na ha na-eme ka Jehova, onye ‘ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ n’obi, nakwa onye na-eme ebere.’ (Jems 5:11) Mgbe Jọn onyeozi mere agadi, legodị otú o si gosi ụmụnna ya ụdị ịhụnanya ahụ. Ọ sịrị: “Ụmụntakịrị m, m na-edere unu ihe ndị a ka unu ghara ime mmehie. Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-enyere anyị aka, onye ya na Nna anyị nọ, ya bụ, Jizọs Kraịst, onye ezi omume.”—1 Jọn 2:1.
20. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-eso nke a?
20 Ọ dị mwute na mgbe ụfọdụ, Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ na-ajụ ichegharị. Ihe a mee, a ga-ekewapụ ya n’ọgbakọ. Olee ihe ndị okenye na-eme ma ụdị ihe a mee? Anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu ikpeazụ dị n’Ụlọ Nche a.
ABỤ NKE 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị
a N’oge gara aga, a na-akpọ ha kọmitii ikpe. Mana, ebe ọ bụ na ihe ha na-arụ abụghị naanị ikpe ikpe, ọ bụghịzi ihe anyị ga na-akpọ ha. Kama, a ga na-akpọ ha kọmitii ndị okenye.
b Ihe e kwuru ebe a banyere nne na nna nwatakịrị na-erubeghị afọ iri na asatọ gbasakwara ndị e nyere ikike ilekọta ya ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ na-arụ ihe nne na nna ya kwesịrị ịrụ.