Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 35

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

Otú Ndị Okenye Nwere Ike Isi Enyere Ndị E Kewapụrụ n’Ọgbakọ Aka

Otú Ndị Okenye Nwere Ike Isi Enyere Ndị E Kewapụrụ n’Ọgbakọ Aka

“A ga-aṅụrị ọṅụ n’eluigwe ma otu onye mmehie chegharịa karịa ka a ga-aṅụrị n’ihi ndị ezi omume iri itoolu na itoolu ndị nchegharị na-adịghị mkpa.”​—LUK 15:7.

IHE A GA-AMỤ

Ihe mere e ji ekewapụ ụfọdụ ndị n’ọgbakọ nakwa otú ndị okenye nwere ike isi enyere ha aka ichegharị, ha na Jehova adịrịkwa ná mma.

1-2. (a) Olee otú Jehova si ele mmadụ ịkpachara anya na-eme mmehie dị oké njọ anya? (b) Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị mere mmehie mee?

 JEHOVA anaghị anabata omume niile. Ọ kpọrọ mmehie asị. (Ọma 5:4-6) Ọ chọrọ ka anyị na-eme ihe ọ chọrọ, nke e dere n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova anaghị atụ anya ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè zuo okè. (Ọma 130:3, 4) Mana, ọ naghị anabata ‘ndị na-anaghị asọpụrụ ya, ndị na-akụdo aka n’amara ya na-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya.’ (Jud 4) N’eziokwu, Baịbụl kwuru banyere ‘ibibi ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke’ n’agha ya bụ́ Amagedọn.​—2 Pita 3:7; Mkpu. 16:16.

2 Mana, Jehova achọghị ka e bibie onye ọ bụla. Dị ka anyị kwuru n’Ụlọ Nche a, Baịbụl kwuru na “ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Ndị okenye na-eme ka Jehova ma ha nwee ndidi ma nyere onye mere mmehie dị oké njọ aka ichegharị ka ya na Jehova dịrịkwa ná mma. Ma, ọ bụghị mmadụ niile mere mmehie dị oké njọ na-echegharị. (Aịza. 6:9) Ụfọdụ ndị ga-anọkwa na-eme ihe ọjọọ ha na-eme n’agbanyeghị na ndị okenye agbalịala ugboro ugboro inyere ha aka ichegharị. Gịnị ka a ga-eme ma ụdị ihe a mee?

KEWAPỤNỤ ONYE ỌJỌỌ AHỤ

3. (a) Gịnị ka Baịbụl kwuru e kwesịrị ime ndị mmehie na-ekweghị echegharị? (b) Ọ bụrụ na mmadụ ajụ ichegharị, gịnị mere e nwere ike iji kwuo na o ji aka ya họrọ ka e kewapụ ya n’ọgbakọ?

3 Ọ bụrụ na onye mere mmehie ekweghị echegharị, e nweghị ihe ọzọ ndị okenye ga-eme ma ọ bụghị ime ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 5:13, ebe sịrị ka e kewapụ “onye ọjọọ ahụ” n’ọgbakọ. A sị ka e kwuwe, ọ bụ onye ahụ mere mmehie ji aka ya họrọ ka e kewapụ ya. N’ihi ya, ọ na-aghọrọ mkpụrụ yanwa kụrụ. (Gal. 6:7) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na o kweghị anabata aka ndị okenye gbalịrị inyere ya ugboro ugboro ka o chegharịa. (2 Eze 17:12-15) Ihe ndị o mere gosiri na o ji aka ya họrọ inupụrụ iwu Jehova isi.​—Diut. 30:19, 20.

4. Gịnị mere e ji ama ọkwa na e kewapụla onye mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ?

4 E kewapụ onye mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ, a na-amara ọgbakọ ọkwa na onye ahụ abụghịzi Onyeàmà Jehova. Ihe mere e ji ama ọkwa ahụ abụghị ka e menye onye ahụ ihere. Kama, ọ bụ ka ọgbakọ nwee ike ime ihe Baịbụl kwuru ma ‘kwụsị ha na onye ahụ ịna-emekọrịta ihe’ ma ọ bụdị ‘irikọ ihe.’ (1 Kọr. 5:9-11) E nwere ezigbo ihe mere Jehova ji nye iwu ahụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ntakịrị ihe na-eko achịcha na-eme ka ntụ ọka niile a gwakọtara agwakọta koo.” (1 Kọr. 5:6) Ndị mmehie na-ekweghị echegharị nwere ike ime ka ndị ọzọ chewe na ọ dịghị mkpa ka ha na-edebe iwu Jehova.​—Ilu 13:20; 1 Kọr. 15:33.

5. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele onye e kewapụrụ n’ọgbakọ anya? Maka gịnị?

5 Ma, olee otú anyị kwesịrị isi were nwanna e kewapụrụ n’ọgbakọ? Ọ bụ eziokwu na anyị na ya agaghị na-emekọ ihe, mana, anyị agaghị ewere ya na nke ya agwụla. Ọ dị ka atụrụ kpafuru akpafu nke nwere ike ịlọghachite. Cheta na onye ahụ nyefere Jehova onwe ya. Mana, ọ dị mwute na ọ naghịzi emezu nkwa o kwere Jehova mgbe o nyefere ya onwe ya. Ihe a ọ na-eme nwekwara ike ịkpatara ya nsogbu. (Ezik. 18:31) N’agbanyeghị ya, ebe ọ bụ na Jehova bụ Chineke obi ebere, olileanya dị na onye ahụ nwere ike ịlọghachi. Olee otú ndị okenye si enyere onye mere mmehie e kewapụrụ n’ọgbakọ aka?

OTÚ NDỊ OKENYE SI ENYERE NDỊ E KEWAPỤRỤ N’ỌGBAKỌ AKA

6. Gịnị ka ndị okenye na-eme iji nyere onye e kewapụrụ n’ọgbakọ aka?

6 E kewapụ mmadụ n’ọgbakọ, ndị okenye hà na-akwụsị ịgbalị inyere ya aka ka ọ lọghachikwute Jehova? Mba. Mgbe kọmitii ndị okenye na-agwa onye na-ekweghị echegharị na a ga-ekewapụ ya n’ọgbakọ, ha na-akọwara ya ihe ndị ọ ga-eme ka o nwee ike ịlọghachi n’ọgbakọ. Mana, e nwere ihe ọzọ ndị okenye na-eme. Ọtụtụ mgbe, ha na-agwa onye ahụ mere mmehie na ha ga-achọ ka ha na ya nọkọọ ma ọnwa ole na ole gafee ka ha chọpụta ma ọ̀ gbanweela obi ya. Ọ bụrụ na onye ahụ mere mmehie ekweta ka ha na ya hụ ọzọ, ha na ya hụ, ha na-agba ya ume ka o chegharịa. Ọ bụrụgodị na ọ gbanwebeghị obi ya n’oge ahụ, ndị okenye ga na-agakwa ahụ ya ka ha nyere ya aka ka o chegharịa.

7. Olee otú ndị okenye si egosi na ha na-eme ebere ka Jehova ma e kewapụ mmadụ n’ọgbakọ? (Jeremaya 3:12)

7 Ndị okenye na-agbalịsi ike ịna-eme ebere ka Jehova ma ha na-emeso onye e kewapụrụ n’ọgbakọ ihe. Dị ka ihe atụ, Jehova echeghị ka ndị Izrel na-enupụrụ ya isi chegharịa tupu ya enyewere ha aka. Kama, o bu ụzọ na-agwa ha ka ha chegharịa mgbe ha na-emebeghịdị ihe ọ bụla gosiri na ha echegharịala. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu nke abụọ n’Ụlọ Nche a, Jehova mere ihe atụ iji gosi otú o si dị obi ebere. Ọ gwara Hosia ka ọ gaa ka ya na nwunye ya ka na-eme mmehie kpezie. (Hos. 3:1; Mal. 3:7) Ndị okenye na-eme ka Jehova. Ha na-eji obi ha niile achọ ka onye mere mmehie chegharịa. Ha anaghịkwa eme ka o siere onye ahụ ike ichegharị.​—Gụọ Jeremaya 3:12.

8. Olee otú ihe atụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu si mee ka anyị ghọtakwuo otú Jehova si emere mmadụ ebere ma na-enwere ya ọmịiko? (Luk 15:7)

8 Cheta ihe atụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu anyị kwuru okwu ya n’isiokwu nke abụọ n’Ụlọ Nche a. Mgbe nna nwa ahụ hụrụ ya ka ọ na-alọta, ọ ‘gbaara ọsọ gaa makụọ ya ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.’ (Luk 15:20) Ọ̀ kwa ị chọpụtara na nna ahụ echeweghị ka nwa ya bịa rịọwa ya mgbaghara? Kama, o bu ụzọ gakwuru nwa ya otú nna hụrụ nwa ya n’anya na-eme. Ndị okenye na-agbalị ime ihe a mgbe ha na-enyere onye mere mmehie aka. Ha chọrọ ka ndị Jehova yiri atụrụ kpafuru akpafu lọghachikwute ya. (Luk 15:22-24, 32) A na-aṅụrị ọṅụ n’eluigwe ma otu onye mmehie chegharịa. A na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ụwa.​—Gụọ Luk 15:7.

9. Gịnị ka Jehova na-agba ndị mere mmehie ume ka ha mee?

9 Ihe ndị anyị mụrụla emeela ka o doo anyị anya na Jehova anaghị achọ ka ndị mmehie na-ekweghị echegharị nọrọ n’ọgbakọ. Ma, ọ naghị ahapụ ha kpamkpam. Ọ chọrọ ka ha lọghachikwute ya. Jehova kwuru otú obi dị ya gbasara ndị mmehie chegharịrị echegharị na Hosia 14:4. Ọ sịrị: “M ga-agwọ ha. Ha agaghịzi ahapụ m. M ga-eji obi m niile hụ ha n’anya, n’ihi na iwe m na-ewesa ha adajụọla.” Ịmata otú obi na-adị Jehova kwesịrị ime ka ndị okenye chọpụta ihe ọ bụla gosiri na mmadụ amalitela ichegharị. O kwesịkwara ime ka obi sie ndị hapụrụ Jehova ike na Jehova hụrụ ha n’anya, chọọkwa ka ha lọghachikwute ya n’egbughị oge.

10-11. Olee otú ndị okenye ga-esi agbalị inyere ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ n’oge gara aga aka?

10 Oleekwanụ otú ndị okenye ga-esi agbalị inyere ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ n’oge gara aga aka, ikekwe, ọtụtụ afọ gara aga? O nwere ike ịbụ na ha akwụsịla ime mmehie ahụ mere ka e kewapụ ha n’ọgbakọ. O nwedịrị ike ha agaghị echeta ihe mere e ji kewapụ ha n’ọgbakọ. N’agbanyeghị afọ ole gaferela kemgbe e kewapụrụ mmadụ n’ọgbakọ, ndị okenye ga-agbalị chọta ya, gaa n’ụlọ ya. Ha ga-agwadị onye ahụ ka ha na ya kpee ekpere, gbaakwa ya ume ka ọ lọghachi n’ọgbakọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na mmadụ anọghịzi n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ, o kwesịrị ịmụtakwu gbasara Jehova na eziokwu ndị dị na Baịbụl. N’ihi ya, ọ bụrụ na onye ahụ egosi na ọ chọrọ ịlọghachi n’ọgbakọ, ndị okenye nwere ike ịhazi ka mmadụ mụwara ya Baịbụl n’agbanyeghị na a nabatabeghị ya n’ọgbakọ. Ọ bụ naanị ndị okenye kwesịrị ịhazi ka a mụọrọ ụdị ndị ahụ Baịbụl.

11 Ndị okenye na-agbalị na-eme ebere ka Jehova. N’ihi ya, ha ga-agbalị chọọ ndị niile hapụrụ Jehova ma gbaa ha ume ka ha lọghachikwute ya. Ọ bụrụ na onye mere mmehie egosi na o chegharịala ma hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme, e nwere ike ịnabata ya n’egbughị oge.​—2 Kọr. 2:6-8.

12. (a) Olee mgbe ndị okenye kwesịrị ịkpachara ezigbo anya? (b) Gịnị mere anyị ekwesịghị iche na Jehova emekataghị gbaghara ndị mere ụfọdụ mmehie? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

12 Ma, e nwere mgbe ụfọdụ ndị okenye kwesịrị ịkpachara anya tupu ha anabata mmadụ n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ahụ metọrọ nwatakịrị ma ọ bụ megbuo ya, ma ọ bụ kwụsị ife Jehova gbawa nzukọ Jehova ụkwụ, ma ọ bụkwanụ jiri aghụghọ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm, ndị okenye kwesịrị ijide n’aka na onye ahụ ji obi ya niile chegharịa tupu a nabata ya. (Mal. 2:14; 2 Tim. 3:6) Ha kwesịrị ichebe ụmụnna nọ n’ọgbakọ. Ma ha kwesịkwara ịghọta na Jehova ga-anabata mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ akwụsị ihe ọjọọ ọ na-eme ma jiri obi ya niile chegharịa. N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na ndị okenye kwesịrị ịkpachara anya maka onye ghọgburu ndị ọzọ, mana ha ekwesịghị ikwu na Jehova emekataghị gbaghara ụdị onye ahụ. a​—1 Pita 2:10.

IHE NDỊ NỌ N’ỌGBAKỌ GA-EME

13. Olee ihe dị iche n’otú anyị si emeso onye a dọrọ aka ná ntị na onye e kewapụrụ n’ọgbakọ?

13 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, mgbe ụfọdụ, a na-ama ọkwa na a dọọla nwanna aka ná ntị. Ụdị ihe a mee, anyị na ya ga na-emekọ ihe n’ihi na anyị ma na o chegharịala, hapụkwa omume ọjọọ ya. (1 Tim. 5:20) Ọ ka nọkwa n’ọgbakọ. Ụmụnna ka kwesịrị ịna-agba ya ume ka o nwee ike ịna-eme ihe dị mma. (Hib. 10:24, 25) Ma, ikewapụ mmadụ n’ọgbakọ dị ezigbo iche. ‘Anyị na onye ahụ na-akwụsị ịna-emekọrịta ihe. Anyị na ya anaghịdị erikọ ihe.’​—1 Kọr. 5:11.

14. Olee ihe Onye Kraịst ọ bụla ga-eji akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ kpebie gbasara onye e kewapụrụ n’ọgbakọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 5:11 ọ̀ pụtara na anyị enweghị ike ịkpọ onye e kewapụrụ n’ọgbakọ ka ọ bịa ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ kelee ya ma ọ bịa ọmụmụ ihe? Mba. Mana, anyị na ya ekwesịghị ịna-emekọrịta ihe. Ma, Ndị Kraịst nwere ike iji akọnuche ha e ji Baịbụl zụọ kpebie ma hà ga-akpọ onye e kewapụrụ n’ọgbakọ ka ọ bịa ọmụmụ ihe. Onye ahụ nwere ike ịbụ onye ikwu ha ma ọ bụkwanụ enyi ha tupu e kewapụ ya n’ọgbakọ. Ọ bịakwanụ ọmụmụ ihe? N’oge gara aga, anyị anaghị ekele ya. Mana ugbu a, ọ bụ Onye Kraịst ọ bụla ga-eji akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ kpebie ihe ọ ga-eme n’okwu a. Ụfọdụ ndị nwere ike ikpebi ikele ya ma ọ bụ ịnabata ya ma ọ bịa ọmụmụ ihe. Mana, anyị na ya ekwesịghị ịkpa nkata ruo ogologo oge ma ọ bụkwanụ soro ya na-eme ihe ndị ọzọ.

Ndị Kraịst nwere ike iji akọnuche ha e ji Baịbụl zụọ kpebie ma hà ga-akpọ onye e kewapụrụ n’ọgbakọ ka ọ bịa ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ kelee ya ekele dị nkenke ma ọ bịa ọmụmụ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)


15. Olee ụdị ndị e kwuru okwu ha na 2 Jọn 9-11? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Jọn na Pọl Hà Na-ekwu Gbasara Otu Ụdị Mmehie?”)

15 Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ na Baịbụl ekwughị na onye kelere ụdị onye ahụ na-akwado ajọ ọrụ ya?’ (Gụọ 2 Jọn 9-11.) Ihe ndị gbara amaokwu ndị ahụ gburugburu gosiri na ndị e bu n’obi kwuo ya bụ ndị kwụsịrị ife Chineke gbawa nzukọ Jehova ụkwụ nakwa ndị na-agba ndị ọzọ ume ka ha mewe omume ọjọọ. (Mkpu. 2:20) N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ na-agba ndị ọzọ ume ịnabata ozizi ndị kwụsịrị ife Chineke gbawa nzukọ Jehova ụkwụ ma ọ bụkwanụ ihe ọjọọ ndị ọzọ, ndị okenye agaghị aga leta ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere olileanya na ụdị onye ahụ ga-emecha ghọta onwe ya. Mana, ruo mgbe ọ ghọtara onwe ya, anyị agaghị ekele ya ma ọ bụ kpọọ ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe.

NA-EME EBERE MA NA-ENWE ỌMỊIKO KA JEHOVA

16-17. (a) Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị mmehie mee? (Ezikiel 18:32) (b) Olee otú ndị okenye na Jehova na-esi arụkọ ọrụ n’inyere ndị mere mmehie dị oké njọ aka?

16 Gịnị ka anyị mụtarala n’isiokwu ise gbara n’Ụlọ Nche a? Jehova achọghị ka e bibie onye ọ bụla. (Gụọ Ezikiel 18:32.) Ọ chọrọ ka ya na ndị mmehie dịrịkwa ná mma. (2 Kọr. 5:20) Ọ bụ ya mere na kemgbe ụwa, Jehova na-agba ndị ohu ya mere mmehie dị oké njọ ume ka ha chegharịa ma lọghachikwute ya. Ndị okenye ọgbakọ bụkwa ndị ha na Jehova na-arụkọ ọrụ. Ha kwesịkwara ịgbalị inyere onye mere mmehie dị oké njọ aka ka o chegharịa.​—Rom 2:4; 1 Kọr. 3:9.

17 Chegodị otú ndị nọ n’eluigwe si enwe ezigbo obi ụtọ ma onye mmehie chegharịa. Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova na-enwe ezigbo obi ụtọ mgbe ọ bụla atụrụ ya kpafuru akpafu lọghachiri n’ọgbakọ. Anyị na-ahụkwu Jehova n’anya ka anyị na-eche banyere otú o si eme ebere, enwe ọmịiko, ma na-emere anyị amara.​—Luk 1:78.

ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

a Baịbụl kwuru na e nwere ụfọdụ ndị Chineke na-agaghị agbaghara. Ụdị ndị ahụ bụ ndị kpebiri na ha ga na-emegide Jehova. Mana, ọ bụ naanị Jehova na Jizọs ga-ekpebi ma mmadụ ọ̀ bụ onye mmehie a na-agaghị agbaghara.​—Mak 3:29; Hib. 10:26, 27.