Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ihe Jehova Kwuru Na-aba Uru Taa

Ime Ihe Jehova Kwuru Na-aba Uru Taa

EZIGBO MKPEBI OTU NWANNA NWAANYỊ MERE NA POLAND

“M MERE baptizim mgbe m dị afọ iri na ise. Mgbe ọnwa isii gara, m bidoro ịsụ ụzọ inyeaka. Mgbe otu afọ gakwara, m malitere ịsụ ụzọ oge niile. Mgbe m gụchara akwụkwọ sekọndrị, m tinyere akwụkwọ ka e ziga m n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. M chọrọ ịhapụ obodo anyị, hapụkwa nne nne m na-abụghị Onyeàmà Jehova mụ na ya bi kemgbe. O wutere m mgbe onye nlekọta sekit gwara m na ọ bụ obodo ahụ a mụrụ m ga-abụ ókèala m. M gbalịrị ka ọ ghara ịmata otú obi dị m. M kpudoro ihu n’ala pụwa ka m gaa chebara ihe ahụ ọ gwara m echiche. M gwara nwanna nwaanyị mụ na ya ga-eso na-arụ ebe ahụ, sị: ‘Ọ dị m ka m̀ na-eme ka Jona. Ma Jona mechara gaa Ninive. N’ihi ya, mụnwa ga-eje ozi n’ebe a gwara m.’

“Asụọla m ụzọ afọ anọ n’obodo anyị. Ahụkwala m uru ime ihe a gwara m bara. Ihe bụ́bu nsogbu m bụ na otú m si na-ele ebe m ga-eje ozi anya adịghị mma. Ma, obi na-adị m ezigbo ụtọ ugbu a. N’otu ọnwa, m mụụrụ mmadụ iri abụọ na anọ Baịbụl. Jehova nyeere m aka ịmalitere nne nne m na-anabughị eji anya ahụ Ndịàmà Jehova ọmụmụ Baịbụl.”

URU OZI ỌMA OTU NWAANYỊ ZIRI NA FIJI BARA

E nwere otu nwaanyị a na-amụrụ Baịbụl n’obodo Fiji. Otu ụbọchị, ọ dabara na ọ ga-ekpebi ma ọ̀ ga-aga mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova ka ọ̀ ga-eso di ya gaa ememme ụbọchị ọmụmụ onye ikwu ha. Di ya kwetara ka ọ gaa mgbakọ ahụ. Nwunye ya agwa ya na ya nwekwara ike ịbịa ememme ahụ ma a gbasaa mgbakọ ahụ. Ma, mgbe nwaanyị ahụ lọtara, o kpebiri na ya agaghị aga ememme ahụ n’ihi na obi ya gwara ya na ọ ka mma ka ọ ghara ịga ebe nwere ike ime ka o siere ya ike ime ihe Chineke chọrọ.

Di ya gwara ndị ikwu ha na ya gwara nwunye ya ka ọ bịa ma ha gbasaa “nzukọ Ndịàmà Jehova” ọ gara, ha asị ya, “Ọ gaghị abịa. Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ụbọchị ọmụmụ.” *

Obi tọrọ di ya ezigbo ụtọ na nwunye ya guzosiri ike n’ihe o kweere nakwa na o meghị ihe ga-eme ka akọnuche ya pịawa ya ụtarị. Ihe a o mere mere ka o nwee ike izi di ya na ndị ọzọ ozi ọma. Gịnị mechara mee? Di ya kwetara ka a mụwara ya Baịbụl, ya esorokwa nwunye ya na-aga ọmụmụ ihe.

^ para. 7 Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche December 15, 2001.