Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Okwu Chineke dị ndụ”

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị bụ “okwu Chineke” e kwuru na ọ “dị ndụ ma na-akpa ike” ná Ndị Hibru 4:12?

Amaokwu ndị ọzọ dị́ ná Ndị Hibru isi anọ gosiri na Pọl onyeozi na-ekwu banyere ozi sí n’aka Chineke ma ọ bụ ihe Chineke kwuru bụ́ nzube ya, dị́ ka ihe ndị anyị na-agụ na Baịbụl.

A na-ekwukarị banyere Ndị Hibru 4:12 n’akwụkwọ anyị iji gosi na Baịbụl na-agbanweli ndụ ndị mmadụ. Isi otú ahụ akọwa amaokwu a dabara adaba. Ma, ọ ga-abara anyị uru ma anyị leruo anya n’ihe ndị ọzọ Pọl kwuru ná Ndị Hibru isi anọ. Pọl gbara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ume ka ha na-eme ihe gosiri na ha ghọtara ihe ndị bụ́ nzube Chineke. E dere ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ n’Akwụkwọ Nsọ. Pọl ji ndị Izrel Chineke napụtara n’Ijipt mee ihe atụ. Ha nwere olileanya ịbanye n’ala nkwa “mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,” bụ́ ebe ha ga-ezu ezigbo ike.—Ọpụ. 3:8; Diut. 12:9, 10.

Ihe a bụ ihe Chineke kwuru na ọ bụ nzube ya. Ma, ndị Izrel mechara kpọchie obi, ha enweghịkwa okwukwe. Ọ bụ ya mere ọtụtụ n’ime ha abanyeghị n’izu ike ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 14:30; Jọsh. 14:6-10) Ma, Pọl kwukwara na “nkwa nke ịbanye n’izu ike [Chineke] ka fọdụrụ.” (Hib. 3:16-19; 4:1) O doro anya na “nkwa” ahụ so n’ihe Chineke kwuru bụ́ nzube ya. Anyị kwesịrị ịgụ banyere ihe ahụ bụ́ nzube ya, meekwa ihe gosiri na anyị kwadoro ya otú ahụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru mere. Iji gosi na nkwa ahụ si n’Akwụkwọ Nsọ, Pọl kwughachiri ihe e kwuru na Jenesis 2:2 nakwa n’Abụ Ọma 95:11.

N’eziokwu, o kwesịrị imetụ anyị n’obi na “nkwa nke ịbanye n’izu ike [Chineke] ka fọdụrụ.” Obi siri anyị ike na anyị ga-abanyeli n’izu ike Chineke otú ahụ Baịbụl kwuru. Anyị emeekwala ihe ndị anyị kwesịrị ime ka anyị banye na ya. Otú anyị si mee ya abụghị na anyị na-agba mbọ idewe Iwu Mozis ma ọ bụ ime ihe ọma ndị ọzọ ga-eme ka anyị rụta adịm ná mma anyị na Jehova n’ọrụ. Kama, okwukwe anyị nwere emeela ka anyị jiri obi ụtọ kwado nzube Chineke ma ka na-akwado ya. Ihe ọzọ bụ na ihe anyị kwuburu gosiri na ọtụtụ puku mmadụ n’ụwa niile amalitela ịmụ Baịbụl ma na-amụta ihe Chineke kwuru bụ́ nzube ya. Ọtụtụ n’ime ha agbanweela otú ha si ebi ndụ, nwee okwukwe, ma bụrụ Ndị Kraịst e mere baptizim. Otú ha si gbanwee ndụ ha gosiri n’eziokwu na “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” Ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ nzube Chineke emeela ka ndụ anyị ka mma. Ọ ka ga na-akpa ike ná ndụ anyị.