ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Septemba 2017

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọktoba 23 ruo Nọvemba 26, 2017.

Mụta Ịna-ejide Onwe Gị

Olee otú ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị? Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị ịna-ejide onwe ha?

Na-enwe Ọmịiko Ka Jehova

Jehova gwara Mozis aha ya na àgwà ya, si otú ahụ mee ka ọ mata onye ọ bụ. Otu àgwà ya ọ gwara Mozis bụ ọmịiko. Gịnị bụ ọmịiko, gịnịkwa mere i ji kwesị ịmụkwu ya?

AKỤKỌ NDỤ

Obi Dị M Ụtọ na Mụ na Ụmụnna Hụrụ Jehova n’Anya Rụkọrọ Ọrụ

David Sinclair kọrọ na obi dị ya ụtọ na ya so ụmụnna hụrụ Jehova n’anya rụkọọ ọrụ afọ iri isii na otu na Betel dị na Bruklin.

“Okwu Chineke Anyị Ga-adịgide Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

Baịbụl bụ akwụkwọ a kacha azụ kemgbe e dechara ya ọtụtụ narị afọ gara aga n’agbanyeghị asụsụ, ndị ọchịchị, na mgba a gbara ịkwụsị ịsụgharị ya.

“Okwu Chineke . . . Na-akpa Ike”

Ọtụtụ ndị emeela mgbanwe ná ndụ ha n’ihi ịmụ Okwu Chineke. Olee ihe anyị ga-eme ka ọ na-akpa ike ná ndụ anyị?

“Nwee Obi Ike . . . Meekwa Ihe”

Gịnị mere obi ike ji dị anyị mkpa, oleekwa otú anyị nwere ike isi nwee ya?