Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ bụ naanị ndị ọchịchị ụwa ka Ekliziastis 5:8 na-ekwu banyere ha, ka ọ̀ na-ekwukwa banyere Jehova?

Amaokwu Baịbụl ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya, na ebe e ji aka ike na-ewepụ ikpe ziri ezi na ezi omume n’ógbè a na-achị achị, ya ejula gị anya, n’ihi na onye dị elu karịa onye ahụ dị elu na-ahụ ihe na-emenụ, e nwekwara ndị dị elu karịa ndị ahụ dị elu.”—Ekli. 5:8.

Anyị lee ya anya otú mmadụ si ele ihe anya, o yiri ka ọ̀ bụ ndị ọchịchị ka amaokwu a na-ekwu banyere ha. Ma, anyị chebara ya echiche nke ọma, anyị ga-achọpụta na e nwere eziokwu dị mkpa ọ na-akụziri anyị banyere Jehova. Eziokwu a na-akasi anyị obi ma na-eme ka obi sie anyị ike.

Ekliziastis 5:8 na-ekwu banyere onye ọchịchị na-emegbu ndị ogbenye ma na-ekpe ha ikpe arụrụala. Onye ọchịchị ahụ kwesịrị icheta na ọ ga-abụ na e nwekwara onye ka ya n’ọchịchị na-ahụ ihe ọ na-eme. E nwekwara ike inwe ndị ọzọ ka ma yanwa ma onye ahụ ka ya. Ma n’ụwa a, ọ dị mwute na ndị ọchịchị ndị a niile nwere ike ịbụcha ndị ọjọọ, ndị ha na-achị ana-ata ahụhụ ya.

Ma, n’agbanyeghị otú ihe si dịrị, obi kwesịrị ịtọ anyị ụtọ n’ihi na Jehova na-ahụ ‘ndị ahụ dị elu’ nọ n’ọchịchị. Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ma tụkwasị ya ibu arọ anyị. (Ọma 55:22; Fil. 4:6, 7) Anyị ma na “anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe 16:9.

N’ihi ya, ihe e kwuru n’Ekliziastis 5:8 na-eme ka anyị ghọta ihe na-eme n’ọchịchị ụmụ mmadụ nakwa na e nwere onye ka ndị ọchịchị ike. Nke kacha mkpa bụ na amaokwu a na-echetara anyị na Jehova bụ Onye Nwere Ikike Kasị Elu. O meekwala Ọkpara ya Eze nke Alaeze ya. Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na onye na-ahụ ihe niile, na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile. Otú ahụ ka ọ dịkwa Ọkpara ya.