Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 40

“Chee Ihe Ahụ E Nyefere n’Aka Gị Nche”

“Chee Ihe Ahụ E Nyefere n’Aka Gị Nche”

“Timoti, chee ihe ahụ e nyefere n’aka gị nche.”—1 TIM. 6:20.

ABỤ NKE 29 Na-ebi Ndụ Kwesịrị Aha Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Dị ka e kwuru na 1 Timoti 6:20, olee ihe e nyefere Timoti n’aka?

ỌTỤTỤ mgbe, anyị na-enye ndị ọzọ ihe ndị dị oké ọnụ ahịa anyị nwere ka ha lekọta. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike itinye ego anyị n’ụlọ akụ̀. Anyị tinye ego anyị n’ụlọ akụ̀, anyị na-atụ anya na a ga-edebe ya nke ọma ma ghara ikwe ka e zuru ya. Ihe a enyerela anyị aka ịghọta ihe inyefe mmadụ ihe dị oké ọnụ ahịa n’aka pụtara.

2 Gụọ 1 Timoti 6:20. Pọl onyeozi chetaara Timoti na e nwere ihe dị oké ọnụ ahịa e nyere ya, ya bụ, ezi ihe ọmụma banyere nzube Chineke maka ụmụ mmadụ. E nyekwara Timoti ihe ùgwù ‘ikwusa okwu Chineke’ na ịrụ “ọrụ onye na-ezisa ozi ọma.” (2 Tim. 4:2, 5) Pọl gbara Timoti ume ka o chee ihe ahụ e nyefere ya n’aka nche. Dịkwa ka Timoti, e nyere anyị ihe ndị dị oké ọnụ ahịa. Gịnị bụ ihe ndị ahụ? Gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji chebe ihe ndị dị oké ọnụ ahịa Chineke nyere anyị?

E NYERE ANYỊ EZIOKWU NDỊ DỊ OKÉ ỌNỤ AHỊA

3-4. Olee ihe mere eziokwu ndị dị na Baịbụl ji dịrị oké ọnụ ahịa?

3 Jehova mere ka anyị mata eziokwu dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Eziokwu ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa n’ihi na ha na-eme ka anyị mata otú anyị na Chineke ga-esi dịrị ná mma. Ha na-emekwa ka anyị mata ihe ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị anabata eziokwu ndị a ma na-eme ihe ndị ha na-akụziri anyị, anyị ga-enwere onwe anyị ná nkụzi ụgha dị iche iche ma na-ebi ndụ dị ọcha.—1 Kọr. 6:9-11.

4 Ihe ọzọ mere eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke ji dịrị oké ọnụ ahịa bụ n’ihi na Chineke na-ekpughere ya ndị “nwere ezi obi” ma dịrị umeala n’obi. (Ọrụ 13:48) Ụdị ndị a na-anabata ndị Chineke si n’aka ha na-akụziri anyị eziokwu taa. (Mat. 11:25; 24:45) Anyị agaghị amụtali eziokwu ndị ahụ n’onwe anyị. O nweghịkwa ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ịmụta eziokwu ndị a.—Ilu 3:13, 15.

5. Olee ihe ọzọ Jehova nyere anyị?

5 Jehova nyekwara anyị ọrụ ịkụziri ndị ọzọ eziokwu banyere ya na nzube ya. (Mat. 24:14) Ozi ọma anyị na-ezi dị oké ọnụ ahịa n’ihi na ọ na-eme ka ndị mmadụ bata n’ezinụlọ Jehova, na-emekwa ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (1 Tim. 4:16) Ma oge onye ọ bụla n’ime anyị na-etinye n’ikwusa ozi ọma ò buru ibu ma ọ̀ dị ntakịrị, anyị niile na-akwado ọrụ kacha mkpa a na-arụ n’oge a. (1 Tim. 2:3, 4) Ọ bụ ezigbo ihe ọma ka Chineke meere anyị kwe ka anyị na ya na-arụkọ ọrụ.—1 Kọr. 3:9.

JISIE IHE E NYEFERE GỊ N’AKA IKE

Timoti nọgidere na-efe Jehova mgbe ndị ọzọ kpebiri ịhapụ Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Olee ihe mere ụfọdụ ndị n’ihi na ha kwụsịrị iji ihe ndị dị oké ọnụ ahịa kpọrọ ihe?

6 Ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge Timoti ejighị ọrụ ha na Chineke na-arụkọ kpọrọ ihe. Dimas kwụsịrị iso Pọl na-eje ozi n’ihi na ọ hụrụ ihe nke ụwa a n’anya. (2 Tim. 4:10) O yiri ka ihe mere Faịjelọs na Hemọjinis ji hapụ ozi ha ọ̀ bụ n’ihi na ha chere na e nwere ike ịkpagbu ha otú ahụ a kpagburu Pọl. (2 Tim. 1:15) Haịmeniọs, Alegzanda na Faịlitọs dapụrụ n’ezi ofufe ma kwụsị ife Jehova. (1 Tim. 1:19, 20; 2 Tim. 2:16-18) E nwere mgbe ụkwụ siri ndị a niile ike n’ofufe Jehova. Ma, ha kwụsịrị iji ihe ndị dị oké ọnụ ahịa kpọrọ ihe.

7. Olee ụzọ aghụghọ Setan na-eji achọ ịrata anyị?

7 Olee otú Setan si achọ ime ka anyị kwụsị iji ihe ndị dị oké ọnụ ahịa Jehova nyere anyị kpọrọ ihe? Ka anyị tụlee ụfọdụ aghụghọ Setan. Ọ na-eji ntụrụndụ na ụlọ ọrụ mgbasa ozi akwado echiche na àgwà ndị ọ ma na ha ga-eme ka anyị hapụ eziokwu ahụ. Ọ na-agbalị iji ndị ọgbọ anyị ma ọ bụ mkpagbu eme ka anyị tụọ ụjọ ma kwụsị ikwusa ozi ọma. Ọ na-agbalịkwa ịrata anyị ka anyị na-ege ihe “a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha” nke ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akụzi. Ọ na-eme ihe a ka anyị nwee ike ịhapụ eziokwu.—1 Tim. 6:20, 21.

8. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ otu nwanna aha ya bụ Daniel?

8 Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ hapụ eziokwu. Ka anyị leba anya n’ihe mere otu nwanna aha ya bụ Daniel. * Igwu egwuregwu kọmputa na-amasị ya. Ọ sịrị: “M malitere igwu egwuregwu kọmputa mgbe m dị ihe dị ka afọ iri. Ná mmalite, egwuregwu kọmputa ndị m na-egwu bụ ndị nke na-adịchaghị njọ. Ma ka oge na-aga, m malitere igwu egwuregwu kọmputa ndị a na-eme ihe ike na mgbaasị na ha.” N’oge na-adịghị anya, ọ malitere iji ihe dị ka awa iri na ise egwu egwuregwu kọmputa kwa ụbọchị. Ọ sịrị: “N’ime obi m, m ma na ụdị egwuregwu m na-egwu na awa ole m na-eji egwu ya na-eme ka mụ na Jehova ghara ịdịcha ná mma. Ma, obi m bịara kpọchie, mụ ana-eche na ime ihe Baịbụl kwuru agbasaghị m.” Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ntụrụndụ nwere ike ime ka anyị ghara ijisi eziokwu ike. Ọ bụrụ na nke a emee, anyị nwere ike ịtụfu ihe ndị dị oké ọnụ ahịa Jehova nyere anyị.

OTÚ ANYỊ GA-ESI JISIE EZIOKWU IKE

9. Dị ka e kwuru na 1 Timoti 1:18, 19, olee onye Pọl ji Timoti tụnyere?

9 Gụọ 1 Timoti 1:18, 19. Pọl ji Timoti tụnyere onye agha ma gbaa ya ume ka ọ “na-ebu agha ọma ahụ.” Agha ahụ Pọl gwara ya okwu ya abụghị agha nkịtị. Olee otú Ndị Kraịst si yie ndị agha na-alụ agha? Olee àgwà ndị anyị kwesịrị inwe dị ka ndị agha Kraịst? Ka anyị tụlee ihe ise anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Pọl mere. Ihe ndị anyị ga-amụta ga-enyere anyị aka ijisi eziokwu ike.

10. Gịnị bụ nsọpụrụ Chineke, oleekwa ihe mere o ji dị anyị mkpa?

10 Nwee nsọpụrụ Chineke. Ezigbo onye agha na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ na-alụsi ọgụ ike ka o nwee ike ichebe onye ọ hụrụ n’anya ma ọ bụkwanụ ihe o ji kpọrọ ihe. Pọl gbara Timoti ume ka o nwee àgwà nsọpụrụ Chineke, ya bụ, ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ. (1 Tim. 4:7) Ka anyị na-ahụkwu Chineke n’anya ma na-asọpụrụ ya, ọ ga na-agụsịkwu anyị agụụ ike ijisi eziokwu ike.—1 Tim. 4:8-10; 6:6.

Anyị mechaa ọtụtụ ihe dịịrị anyị n’ụbọchị, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị rụọ ahụ́ anyị ụka ka anyị nwee ike ịga ọmụmụ ihe. Ma, ime ya na-abara anyị uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-arụ ahụ́ anyị ụka?

11 Mụta ịrụ ahụ́ gị ụka. Onye agha ga-arụ ahụ́ ya ụka ka o nwee ike ịdị njikere mgbe niile maka agha. Ihe nyeere Timoti aka ịdị ka onye agha a bụ na o mere ihe Pọl gwara ya, ya bụ, izere ọchịchọ ọjọọ, ịchụso ezi omume na iso Ndị Kraịst ibe ya na-akpakọrịta. (2 Tim. 2:22) Ọ rụrụ ahụ́ ya ụka tupu ya enwee ike ime ihe ndị a. Anyịnwa kwesịkwara ịna-arụ ahụ́ anyị ụka ka anyị nwee ike imeri ihe ndị na-agụ anụ ahụ́ anyị agụụ. (Rom 7:21-25) Ọ dịkwa anyị mkpa ime otú ahụ ka anyị nwee ike ịna-eyipụ mmadụ ochie ahụ ma na-eyiri mmadụ ọhụrụ ahụ. (Efe. 4:22, 24) Anyị mechaa ọtụtụ ihe dịịrị anyị n’ụbọchị, ike agwụchaa anyị, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị rụọ ahụ́ anyị ụka gaa ọmụmụ ihe.—Hib. 10:24, 25.

12. Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmụtakwu otú e si eji Baịbụl akụzi ihe?

12 Onye agha kwesịrị ịmụta otú ọ ga-esi na-eji ngwá agha ya alụ ọgụ nke ọma. Ọ ga-amụ ya ọtụtụ ugboro iji mụta ya nke ọma. Anyịnwa kwesịkwara ịmụta iji Okwu Chineke na-akụzi ihe nke ọma. (2 Tim. 2:15) Anyị na-amụta ụzọ ụfọdụ e si eji ya akụzi ihe nke ọma n’ọmụmụ ihe. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ka ndị ọzọ kweta na eziokwu Baịbụl bara uru, anyị kwesịrị ịna-amụchi Baịbụl anya n’onwe anyị. Anyị kwesịrị iji Okwu Chineke mee ka okwukwe anyị sie ike. Ihe ọ pụtara bụ na ihe anyị ga na-eme abụghị naanị ịgụ Baịbụl. Anyị ga na-echebara ihe ndị anyị gụrụ na ya echiche, na-emekwa nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka anyị nwee ike ịghọta ihe anyị gụrụ nke ọma ma kọwaa ya n’ụzọ dabara adaba. (1 Tim. 4:13-15) Anyị mee ihe a, anyị ga-enwe ike iji Okwu Chineke na-akụzi ihe nke ọma. Ihe anyị ga na-eme abụghị naanị ịgụrụ ndị mmadụ amaokwu ndị dị na Baịbụl. Kama, anyị kwesịrị inyere ha aka ịghọta ihe amaokwu ahụ na-ekwu na otú ha ga-esi eme ya eme. Ọ bụrụ na anyị ana-amụchi Baịbụl anya, anyị ga na-emekwu nke ọma n’otú anyị si eji ya akụziri ndị ọzọ ihe.—2 Tim. 3:16, 17.

13. N’ihi ihe e kwuru ná Ndị Hibru 5:14, gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee nghọta?

13 Nwee Nghọta. Onye agha kwesịrị ịmata mgbe ọdachi na-abịa ma zere ya. Anyịnwa kwesịkwara ịna-achọpụta ihe ndị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu ma zere ha. (Ilu 22:3; gụọ Ndị Hibru 5:14.) Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ilezi anya mgbe anyị na-ahọrọ ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ. A na-egosikarị omume rụrụ arụ na tiivi nakwa na fim. Chineke kpọrọ ụdị omume ahụ asị, ụdị omume ahụ ga-akpatakwara anyị na ndị ọzọ nsogbu. N’ihi ya, ka anyị gbalịa zere ntụrụndụ ndị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ mee ka anyị kwụsị ịhụ Jehova n’anya.—Efe. 5:5, 6.

14. Olee otú inwe nghọta si baara Daniel uru?

14 Daniel anyị kwuru okwu ya ná mmalite mechara ghọta na igwu egwuregwu vidio a na-eme ihe ike na mgbaasị na ya bụ nsogbu. O ji Watchtower Library chọta akwụkwọ ndị nyeere ya aka. Olee uru ọ baara ya? Ọ kwụsịrị igwu egwuregwu vidio ndị na-adịghị mma. Ọ kwụsịkwara iso ndị ya na ha na-egwu egwuregwu ndị ahụ n’Ịntanet na-akpa. Daniel sịrị: “Kama igwu egwuregwu vidio, m malitere ime ihe ndị ọzọ m nwere ike ịpụ apụ mee ma ọ bụkwanụ iso ụmụnna nọrịa.” Daniel bụzi ọsụ ụzọ ugbu a, bụrụkwa okenye.

15. Gịnị mere akụkọ ndị na-abụghị eziokwu ji dị njọ?

15 Dị ka Timoti, anyị kwesịrị ịghọta nsogbu dị n’akụkọ ụgha ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akụzi. (1 Tim. 4:1, 7; 2 Tim. 2:16) Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịkọsa ihe na-abụghị eziokwu banyere ụmụnna anyị ma ọ bụkwanụ kwuo ihe ndị nwere ike ime ka anyị nyowe nzukọ Jehova enyo. Ụdị akụkọ ụgha ndị a nwere ike ime ka okwukwe anyị nyụọ ka ọkụ. Anyị ekwesịghị ikwe ka e jiri ụdị akụkọ ndị a ghọgbuo anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị na-agbasa akụkọ ndị a bụ “ndị e merụrụ uche ha emerụ na ndị na-amaghị eziokwu ahụ.” Ihe ha chọrọ bụ ịkpata “oké ajụjụ na ịrụ ụka.” (1 Tim. 6:4, 5) Ha chọrọ ka anyị kweta ihe ha na-ekwu ma na-enyo ụmụnna anyị enyo.

16. Olee ihe ndị na-adọpụ mmadụ uche anyị kwesịrị izere?

16 Zere ihe ndị na-adọpụ mmadụ uche. Timoti bụ “ezi onye agha nke Kraịst Jizọs.” O lekwasịrị anya n’ozi ya kama ikwe ka akụnụba na ihe ndị ọzọ dị n’ụwa megharịa ya anya. (2 Tim. 2:3, 4) Ka anyị ṅomie Timoti. Ka anyị ghara ikwe ka ọchịchọ ịba ọgaranya mee ka uche anyị pụọ n’ozi anyị. “Ike dị aghụghọ nke akụnụba” nwere ike ime ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ, obi ụtọ anyị na-enwe maka Okwu ya, na otú o si agụ anyị agụụ ịkụziri ya ndị ọzọ nyụọ ka ọkụ. (Mat. 13:22) Anyị kwesịrị ịna-ebi ndụ dị mfe ma jiri oge anyị na ike anyị ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’—Mat. 6:22-25, 33.

17-18. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji zere ihe nwere ike imebi adịm ná mma anyị na Jehova?

17 Dịrị njikere ime ihe ozugbo. Onye agha kwesịrị ibu ụzọ kpebie ihe ọ ga-eme iji chebe onwe ya ma nsogbu bịa. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ijidesi ihe ndị Jehova nyere anyị ike, anyị kwesịrị ime ihe ozugbo ma anyị hụ ọdachi ka ọ na-abịa. Gịnị ga-enyere anyị aka ime ihe ozugbo? Anyị kwesịrị ibu ụzọ kpebie ihe anyị ga-eme ma ọdachi bịawa.

18 Dị ka ihe atụ, n’obodo ụfọdụ, tupu ememme ebido, a na-agwa ndị bịara ememme ka ha chọta ebe dị nso ha nwere ike isi gbapụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ ka ha nwee ike ịgbapụ ozugbo ma e nwee nsogbu. Anyịnwakwa nwere ike ibu ụzọ mụgharịa ihe anyị ga-eme ma anyị hụ ebe a na-egosi omume rụrụ arụ, ime ihe ike, ma ọ bụ nkụzi ndị si n’ezi ofufe dapụ na tiivi ma ọ bụ n’Ịntanet. Ọ bụrụ na anyị ejikere maka ihe ndị nwere ike ime, ọ ga-eme ka anyị gbaara ihe ahụ nwere ike imebi adịm ná mma anyị na Jehova ọsọ ngwa ngwa, anyị adịrịkwa ọcha n’anya Jehova.—Ọma 101:3; 1 Tim. 4:12.

19. Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta ma anyị chee ihe ndị Jehova nyefere anyị n’aka nche?

19 Anyị kwesịrị iche ihe ndị Jehova nyere anyị nche, ya bụ, eziokwu dị na Baịbụl na ọrụ ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe akọnuche dị ọcha, bie ndụ nwere isi, nwetakwa obi ụtọ na-adị n’inyere ndị ọzọ aka ịmara Jehova. N’enyemaka Jehova, anyị ga-enwe ike iche ihe ahụ e nyefere anyị n’aka nche.—1 Tim. 6:12, 19.

ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ

^ par. 5 Jehova nyere anyị ọmarịcha onyinye bụ́ ịmara eziokwu banyere ya na ịkụziri ya ndị ọzọ. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ijisi onyinye a ike.

^ par. 8 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.