Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 37

“Ekwekwala Ka Aka Gị Zuo Ike”

“Ekwekwala Ka Aka Gị Zuo Ike”

“Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị.”—EKLI. 11:6.

ABỤ NKE 68 Ịgha Mkpụrụ Alaeze

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee ihe jikọrọ Ekliziastis 11:6 na ọrụ ikwusa ozi ọma?

NÁ MBA ụfọdụ, ndị mmadụ na-eji obi ha niile anabata ozi ọma anyị na-ekwusa. Ọ bụ ihe ha na-achọ kemgbe. Ma ná mba ndị ọzọ, ndị mmadụ anaghị enwecha mmasị n’ihe banyere Chineke ma ọ bụ Baịbụl. Olee otú ọ dị n’ebe i bi? Nke ọ bụla ọ bụ, Jehova chọrọ ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma ruo mgbe ọ ga-asị na o zuola.

2 Mgbe ọ bụla oge Jehova ruru, ọrụ ikwusa ozi ọma ga-akwụsị, “mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:14, 36) Ma tupu mgbe ahụ, olee otú anyị ga-esi rube isi n’ihe a Baịbụl kwuru, ya bụ, “ekwekwala ka aka gị zuo ike”? *Gụọ Ekliziastis 11:6.

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 Isiokwu gara aga kwuru ihe anọ anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ezigbo “ndị na-akụta mmadụ.” (Matt. 4:19) Isiokwu nke a ga-eleba anya n’ihe atọ ga-enyere anyị aka ime ka anyị kpebisikwuo ike ịna-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. Anyị ga-amata ihe mere o ji dị mkpa (1) ka uche anyị dịrị n’ozi ọma, (2) ka anyị na-enwe ndidi, nakwa (3) ka anyị nwee okwukwe siri ike.

KA UCHE GỊ DỊRỊ N’OZI ỌMA

4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji tinye uche anyị n’ọrụ Jehova nyere anyị?

4 Jizọs kwuru ihe ndị a ga-eji ama oge ikpeazụ a. O kwukwara na ihe ndị ahụ nwere ike ime ka uche ndị na-eso ụzọ ya pụọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma. N’ihi ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-echenụ nche.” (Mat. 24:42) N’oge Noa, e nwere ihe ụfọdụ mere ka uche ndị mmadụ pụọ n’ihe Noa na-agwa ha. Taa, ụdị ihe ndị ahụ nwekwara ike ime ka uche anyị pụọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma. (Mat. 24:37-39; 2 Pita 2:5) N’ihi ya, gbalịsie ike jiri ọrụ a Jehova nyere anyị kpọrọ ihe.

5. Olee otú Ọrụ Ndịozi 1:6-8 si kọwaa ebe a ga-ekwusaru ozi ọma?

5 Anyị kwesịrị itinye uche anyị n’ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze taa. Jizọs kwuru na ọrụ a ga na-ebukwu ibu ma na-aga n’ihu karịa otú ọ dị mgbe ọ nọ n’ụwa. (Jọn 14:12) Mgbe Jizọs nwụchara, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya laghachiri n’ọrụ ịkụ azụ̀. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ rụrụ ọrụ ebube mee ka ndị na-eso ụzọ ya gbute ọtụtụ azụ̀. Mgbe o mechara ihe a, o mere ka o doo ha anya na ọrụ ịkụta ndị mmadụ e nyere ha dị mkpa karịa ọrụ ọ bụla ọzọ. (Jọn 21:15-17) Obere oge tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọrụ ikwusa ozi ọma ọ malitere ga-agafe Izrel, ruo ebe dị anya. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 1:6-8.) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jizọs mere ka Jọn onyeozi hụ ọhụụ gosiri ihe ga-emecha mee “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” * Otu n’ime ihe ọ hụrụ bụ otu mmụọ ozi nke nwere “ozi ọma ebighị ebi” ọ ga-ezisara “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile.” (Mkpu. 1:10; 14:6) N’eziokwu, uche Jehova bụ ka anyị soro zisaa ozi ọma a a na-ezisa n’ụwa niile ruo mgbe ọ ga-asị na o zuola.

6. Olee ihe ga-enyere anyị aka itinye uche n’ọrụ ikwusa ozi ọma?

6 Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere otú Jehova si enyere anyị aka, ọ ga-eme ka anyị tinye uche n’ọrụ ikwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ọ na-eji akwụkwọ anyị, ma ndị nke e biri ebi ma ndị nke a na-ebighị ebi, ihe ndị a na-egere egere, vidio, nakwa ihe omume tiivi anyị ndị a na-etinye n’Ịntanet enyeju anyị afọ. Chegodị echiche: E nwere ihe ndị dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet n’ihe karịrị otu puku asụsụ. (Mat. 24:45-47) N’ụwa a ndị mmadụ na-adịghị n’otu n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, okpukpe, ịba ọgaranya na ịda ogbenye, e nwere ihe karịrị nde mmadụ asatọ n’ụwa niile ndị dị n’otu ma na-efe Chineke. Dị ka ihe atụ, na Fraịdee, abalị iri na itoolu n’ọnwa Eprel afọ 2019, Ndịàmà Jehova n’ụwa niile lere otu vidio e ji mee ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụbọchị ahụ. Ná mgbede ya, ìgwè mmadụ dị nde iri abụọ, narị puku itoolu na puku iri na itoolu, na iri anọ na otu zukọtara maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Anyị chee echiche banyere ihe ọma Jehova meere anyị kwe ka anyị hụ ihe ọma ndị a na-emenụ, sorokwa na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze, ọ ga-eme ka anyị tinye uche anyị n’ịrụ ya.

Jizọs ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka uche ya pụọ n’ịgbara eziokwu àmà (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Olee otú iṅomi Jizọs ga-esi enyere anyị aka itinye uche n’ozi ọma?

7 Ihe ọzọ anyị ga-eme iji tinye uche anyị n’ikwusa ozi ọma bụ iṅomi Jizọs. O kweghị ka ihe ọ bụla mee ka uche ya pụọ n’ịgbara eziokwu àmà. (Jọn 18:37) Mgbe Ekwensu chọrọ inye ya “alaeze niile nke ụwa na ebube ha,” o kweghị ka o jiri ya rata ya. Mgbe ndị mmadụ chọkwara ime ya eze, ọ gụghị ya agụụ ịbụ eze ha. (Mat. 4:8, 9; Jọn 6:15) O nweghị mgbe ọ chọrọ ịbụ aka ji akụ̀. Mmegide e megidere ya emeghịkwa ka uche ya pụọ n’ikwusa ozi ọma. (Luk 9:58; Jọn 8:59) Ọnwụnwa bịara anyị, anyị agaghị ekwe ka o mee ka uche anyị pụọ n’ozi ọma ma anyị cheta ihe Pọl kwuru. Ọ gwara Ndị Kraịst ka ha na-eṅomi Jizọs ‘ka ike wee ghara ịgwụ ha, ha ewee daa mbà.’—Hib. 12:3.

NA-ENWE NDIDI

8. Gịnị bụ ndidi, gịnịkwa mere o ji dị ezigbo mkpa ugbu a?

8 Inwe ndidi pụtara mmadụ iji obiọma chere ruo mgbe ihe gbanwere. Anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi n’ihe ndị dị iche iche. O nwere ike ịbụ na anyị na-eche ka ọnọdụ ọjọọ anyị nọ na ya gbanwee ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na o teela anyị chewere ka ihe ọma anyị na-atụ anya ya mee. Habakọk onye amụma tụsiri anya ike mgbe ihe ike a na-eme na Juda ga-akwụsị. (Hab. 1:2) Ndị na-eso ụzọ Jizọs tụrụ anya na Alaeze ahụ “na-aga ịpụta ìhè ozugbo” ma napụta ha n’aka ndị Rom. (Luk 19:11) Taa, anyị na-atụ anya mgbe Alaeze Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ ma weta ụwa ọhụrụ ezi omume. (2 Pita 3:13) Ma, anyị kwesịrị inwe ndidi, chere ka oge Jehova ruo. Lee ụzọ ụfọdụ Jehova si akụziri anyị inwe ndidi.

9. Olee ihe ndị gosiri na Jehova na-enwe ndidi?

9 Ọ bụ Jehova kacha enwe ndidi. O nyere Noa oge buru ibu ọ ga-eji rụchaa ụgbọ ahụ, kwusaakwa ozi ọma. (2 Pita 2:5; 1 Pita 3:20) Jehova gere ntị mgbe Ebreham na-ajụ ya ọtụtụ ajụjụ maka mkpebi o mere ibibi ndị bi na Sọdọm na Gọmọra. (Jen. 18:20-33) Jehova nweere ndị Izrel na-enupụrụ ya isi ndidi ruo ọtụtụ narị afọ. (Nehe. 9:30, 31) Taa, anyị na-ahụkwa na Jehova na-enwe ndidi n’ihi na ọ na-enye ndị niile ọ chọrọ ka ha bụrụ enyi ya ohere ka ha “chegharịa.” (2 Pita 3:9; Jọn 6:44; 1 Tim. 2:3, 4) Ndidi Jehova kwesịrị ime ka anyịnwa na-enwekwa ndidi n’ọrụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe. Jehova jikwa ihe atụ dị n’Okwu ya na-akụziri anyị inwe ndidi.

Otú ahụ onye ọrụ ugbo si arụsi ọrụ ike ma na-enwe ndidi ka anyị kwesịkwara inwe ndidi ka Jehova gọzie ọrụ anyị na-arụsi ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)

10. Gịnị ka ihe e kwuru na Jems 5:7, 8 na-akụziri anyị?

10 Gụọ Jems 5:7, 8Ihe atụ onye ọrụ ugbo na-akụziri anyị inwe ndidi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ mkpụrụ na-eto ngwa ngwa. Ma, e nwere ndị nke na-anọ ọdụ tupu ha etoo. N’Izrel, ọ na-ewe ihe dị ka ọnwa isii tupu ihe ụfọdụ a kụrụ amịa mkpụrụ a ga-aghọrọ. Onye ọrụ ugbo na-akụ mkpụrụ ya mgbe mmiri mbụ zochara, nke dabara n’etiti ọnwa Ọktoba. Ọ na-aghọrọkwa mkpụrụ ya mgbe mmiri kwụsịrị izo, nke dabara n’etiti ọnwa Eprel. (Mak 4:28) Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi dị ka onye ọrụ ugbo ahụ, ọ ga-egosi na anyị ma ihe. Ma, ihe a nwere ike isiri anyị ike.

11. Olee otú inwe ndidi ga-esi enyere anyị aka n’ozi anyị?

11 Ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-achọkarị ka mbọ ha gbara rụpụta ihe ozugbo. Ma, anyị chọọ ka ubi anyị mepụta mkpụrụ anyị ga-aghọrọ, o nwere ihe ndị anyị kwesịrị ime, dị ka, ịkọ ya, ịkụ mkpụrụ na ya, na ịgba ya mmiri. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ịna-eme n’ọrụ ikwusa ozi ọma. Ọ ga-ewe oge tupu anyị emee ka ndị anyị na-ezi ozi ọma kwụsị ịkpa ókè ma hụwa ndị mmadụ n’anya. Inwe ndidi ga-eme ka ike ghara ịgwụ anyị ma ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị ege anyị ntị. Ọ bụrụkwa na e nwere ndị na-ege anyị ntị, anyị ka kwesịkwara ịna-enwe ndidi. Anyị agaghị amanyeli onye anyị na-amụrụ Baịbụl inwe okwukwe na Chineke. O nwedịrị oge ụfọdụ o siiri ndị na-eso ụzọ Jizọs ike ịghọta ihe Jizọs na-akụziri ha. (Jọn 14:9) Ka anyị cheta na anyị nwere ike ịkụ mkpụrụ ma gbaa ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too.—1 Kọr. 3:6.

12. Olee otú anyị ga-esi na-enwere ndị ikwu anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova ndidi ma anyị ziwe ha ozi ọma?

12 O nwere ike isiri anyị ike inwe ndidi ma anyị na-ezi ndị ikwu anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova ozi ọma. Ihe e kwuru n’Ekliziastis 3:1, 7 nwere ike inyere anyị aka. Ọ sịrị: “E nwere oge . . . ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” Anyị nwere ike ime ka àgwà ọma anyị na-agbara ha àmà. Ma, anyị kwesịkwara iji ezigbo ohere ọ bụla dapụtaranụ gwa ha gbasara Jehova. (1 Pita 3:1, 2) Ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusara ndị ikwu anyị na ndị ọzọ ozi ọma, anyị kwesịrị ịna-enwere ha ndidi.

13-14. Olee ndị ụfọdụ nwere ndidi anyị nwere ike iṅomi?

13 Anyị nwere ike ịmụta inwe ndidi n’aka ndị fere Jehova n’oge ochie nakwa n’aka ndị na-efe ya n’oge a. Habakọk nọ na-atụ anya ka ajọ omume kwụsị. O kwuru, sị: “N’ebe m na-anọ eche nche ka m ga na-eguzo.” (Hab. 2:1) Pọl onyeozi kwuru na ọ na-agụsi ya agụụ ike ‘ijezu ozi’ ya. Ma, ọ nọgidere jiri ndidi ‘na-agbasi àmà ike banyere ozi ọma.’—Ọrụ 20:24.

14 Chegodị gbasara otu di na nwunye gara ụlọ akwụkwọ Gilied. E zigara ha n’obodo e nwere Ndịàmà Jehova ole na ole. Okpukpe bụ́ isi a na-ekpe n’ebe ahụ abụghị okpukpe Ndị Kraịst. Ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ enweghịkwa mmasị ịmụ Baịbụl. Ma, ndị ha na ha so gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied e zigara mba ndị ọzọ nọ na-ezitere ha ozi, na-akọrọ ha banyere ọtụtụ ndị ha na-amụrụ Baịbụl na ndị nke na-abata n’ọgbakọ. N’agbanyeghị na ọ dịghị otú a n’ebe ahụ e zigara di na nwunye a, ha nọgidere jiri ndidi na-ekwusa ozi ọma. Mgbe ha ziri ozi ọma n’ókèala ahụ yiri ebe na-anaghị amị mkpụrụ ruo afọ asatọ, ha nwere obi ụtọ mgbe otu onye n’ime ndị ha na-amụrụ Baịbụl mere baptizim. Olee otú ihe ndị a mere n’oge ochie na ndị nke na-eme n’oge a si yie ibe ha? Ndị ahụ a kọrọ akụkọ ha adaghị mbà, ha ekweghịkwa ka aka ha zuo ike. Jehova gọzikwara ha n’ihi na ha nwere ndidi. Ka anyị gbalịa ‘bụrụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.’—Hib. 6:10-12.

NWEE OKWUKWE SIRI IKE

15. Olee otu ụzọ okwukwe si eme ka anyị na-agbalịsikwu ike n’ọrụ ikwusa ozi ọma?

15 Anyị nwee okwukwe n’ozi anyị na-ezi ndị mmadụ, ọ ga-eme ka anyị na-agbalịsi ike izi ya onye ọ bụla anyị hụrụ. Anyị kwetasiri ike ná nkwa ndị Chineke kwere anyị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. (Ọma 119:42; Aịza. 40:8) Anyị na-ahụ ka amụma Baịbụl na-emezu n’oge anyị a. Anyị ahụla otú ndụ ndị mmadụ si ka mma mgbe ha malitere ime ihe Baịbụl kwuru. Ihe a na-eme ka obi sikwuo anyị ike na ozi ọma Alaeze Chineke bụ ozi onye ọ bụla kwesịrị ịnụ.

16. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 46:1-3, olee otú okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova na Jizọs nọ si eme ka anyị na-agbalịsikwu ike n’ọrụ ikwusa ozi ọma?

16 Anyị nwekwara okwukwe n’ebe Jehova nọ, onye ozi anyị na-ekwusa si n’aka. Anyị nwekwara okwukwe n’ebe Eze ọ họpụtara bụ́ Jizọs nọ. (Jọn 14:1) N’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, Jehova ga-anọgide na-abụ ike anyị na ebe mgbaba anyị. (Gụọ Abụ Ọma 46:1-3.) Ihe ọzọ bụ na obi siri anyị ike na Jizọs nọ n’eluigwe jiri ikike Jehova nyere ya na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma anyị na-arụ.—Mat. 28:18-20.

17. Nye ihe atụ gosiri na anyị kwesịrị ịnọgide na-ekwusa ozi ọma.

17 Okwukwe na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-agọzi mbọ anyị na-agba. O nwere ike ime ya n’ụzọ anyị na-atụghị anya ya. (Ekli. 11:6) Dị ka ihe atụ, kwa ụbọchị, ọtụtụ puku mmadụ na-abịa ewere akwụkwọ anyị n’ebe anyị na-edowe ha na tebụl ma ọ bụ n’ihe nkwagharị. Isi otú a ekwusa ozi ọma ọ̀ na-aba uru? À na-ajụkwa ajụ? Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Nọvemba 2014 kọrọ gbasara otu nwa agbọghọ nọ na mahadum. Ọ chọrọ ide gbasara Ndịàmà Jehova, ma o nweghị ike ịchọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe ọ ga-ahụ Ndịàmà Jehova. Ma, ọ hụrụ ihe nkwagharị anyị n’akụkụ mahadum ha, hụkwa akwụkwọ nyeere ya aka ide ihe ahụ ọ chọrọ ide. O mechara ghọọ Onyeàmà Jehova e mere baptizim. Ọ bụkwa ọsụ ụzọ oge niile ugbu a. Ụdị akụkọ ndị a na-eme ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma n’ihi na ọ na-egosi na a ka nwere ndị chọrọ ịnụ ozi ọma Alaeze.

KPEBISIE IKE NA Ị GAGHỊ EKWE KA AKA GỊ ZUO IKE

18. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na a ga-arụcha ọrụ ikwusa ozi ọma a n’oge Jehova chọrọ?

18 Obi kwesịrị isi anyị ike na a ga-arụcha ọrụ ikwusa ozi ọma a kpọmkwem n’oge Jehova chọrọ. Chegodị gbasara ihe mere n’oge Noa. Jehova gosiri na ọ na-eme ihe niile n’oge kwesịrị ekwesị. Ihe dị ka otu narị afọ na iri abụọ tupu Iju Mmiri ahụ, Jehova kwuru oge Iju Mmiri ahụ ga-amalite. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jehova nyere Noa ọrụ iwu ụgbọ. Noa nọgidere na-arụsi ọrụ ike ruo ihe dị ka afọ iri anọ ma ọ bụ iri ise tupu Iju Mmiri ahụ amalite. N’agbanyeghị na ndị o ziri ozi ọma ekweghị ege ya ntị, ọ nọgidere na-ezi ha ozi ịdọ aka ná ntị ruo mgbe Jehova gwara ya kpọbata ụmụ anụmanụ n’ụgbọ ahụ. Mgbe oge Jehova ruru, “Jehova mechiri ụzọ.”—Jen. 6:3; 7:1, 2, 16.

19. Olee ihe ọma ga-emere anyị n’ọdịnihu ma ọ bụrụ na anyị ekweghị ka aka anyị zuo ike n’ozi Jehova?

19 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka anyị mata na oge eruola ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma. Mgbe ahụ, ọ ga-ebibi ụwa Setan ma weta ụwa ọhụrụ ezi omume. Tupu mgbe ahụ, ka anyị ṅomie Noa, Habakọk, na ụmụnna anyị ndị na-ekwebeghị ka aka ha zuo ike n’ozi Jehova. Ka anyị nọgide na-etinye uche anyị n’ikwusa ozi ọma, na-enwe ndidi ma na-enwe okwukwe siri ike n’ebe Jehova na nkwa ya nọ.

ABỤ NKE 75 “Lee M, Ziga M”

^ par. 5 Isiokwu bu nke a ụzọ gbara ndị a na-amụrụ Baịbụl ume ka ha za òkù Jizọs na-akpọ ha ka ha bụrụ ndị na-akụta mmadụ. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atọ ga-enyere ndị nkwusa niile aka, ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie, ikpebisikwu ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ruo mgbe Jehova ga-asị na o zuola.

^ par. 2 NKỌWAKWU: N’isiokwu a, okwu bụ́ “ekwekwala ka aka gị zuo ike” pụtara na anyị kwesịrị ikpebisi ike na anyị ga-anọgide na-ekwusa ozi ọma ruo mgbe Jehova ga-asị na o zuola.

^ par. 5 “Ụbọchị Onyenwe anyị” malitere mgbe e chiri Jizọs eze n’afọ 1914. Ọ ga-agwụkwa mgbe Ọchịchị Puku Afọ Kraịst gwụrụ.