Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 38

Jiri Oge E Nwere Udo Mee Ihe Ndị Bara Uru

Jiri Oge E Nwere Udo Mee Ihe Ndị Bara Uru

“Ala ahụ enweghị nsogbu ọ bụla; e busoghịkwa ya agha n’ime afọ ndị a, n’ihi na Jehova nyere ya ezumike.”—2 IHE 14:6.

ABỤ NKE 60 Ọ Ga-eme Ka Ha Nweta Ndụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee mgbe o nwere ike isiri anyị ike ife Jehova?

OLEE mgbe i chere na ọ kacha esi ike ife Jehova? Ọ̀ bụ mgbe i nwere ọtụtụ nsogbu ka ọ̀ bụ mgbe ihe dịtụụrụ gị mma? Ọ bụrụ na anyị enwee nsogbu, ọ na-adịrị anyị mfe ịtụkwasị Jehova obi. Ma, gịnị ka anyị na-eme mgbe ihe dịịrị anyị mma? Ànyị nwere ike ichefu na anyị kwesịrị ife Jehova? Jehova dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị banyere ụdị ihe a.—Diut. 6:10-12.

Eze Esa gbara mbọ mechie ikpere arụsị n’obodo ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2) *

2. Olee ihe dị mma Eze Esa mere?

2 Eze Esa bụ onye e ji ama atụ n’ihe banyere ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. Mgbe o fere Jehova abụghị naanị mgbe ihe siiri ya ike. Kama, o fekwara ya mgbe e nwere udo. N’oge niile ọ dịrị ndụ, ‘obi ya dum dị n’ebe Jehova nọ.’ (1 Eze 15:14) Otu ụzọ Esa si gosi na o ji obi ya niile na-efe Jehova bụ na o wepụrụ okpukpe ụgha na Juda. Baịbụl kwuru na o wepụrụ “ebe ịchụàjà ndị mba ọzọ na ebe ndị dị elu ma kụtusịa ogidi nsọ dị iche iche, gbutusịakwa ogwe osisi ndị dị nsọ.” (2 Ihe 14:3, 5) Ọ chụpụdịrị nne nne ya bụ́ Meaka n’ọkwá ukwu ọ nọ na ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-akwado ikpere arụsị.—1 Eze 15:11-13.

3. Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ihe Esa mere abụghị naanị iwepụ okpukpe ụgha. O mekwara ka ndị bi na Juda maliteghachi ife Jehova. Jehova gọziri Esa na ụmụ Izrel ma mee ka ha nwee udo. * Ruo afọ iri n’oge ọchịchị Esa, “ala ahụ enweghị nsogbu.” (2 Ihe 14:1, 4, 6) N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe Esa mere n’oge ahụ e nwere udo. Anyị ga-atụlekwa otú Ndị Kraịst oge mbụ si mee ka Esa ma jiri oge e nwere udo mee ihe bara uru. N’ikpeazụ, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Ọ bụrụ na i bi n’ebe a na-anaghị enye Ndịàmà Jehova nsogbu maka okpukpe ha, olee otú i nwere ike isi jiri oge ahụ e nwere udo mee ihe bara uru?

IHE ESA JI OGE E NWERE UDO MEE

4. Dị ka e kwuru na 2 Ihe E Mere 14:2, 6, 7, gịnị ka Esa ji oge e nwere udo mee?

4 Gụọ 2 Ihe E Mere 14:2, 6, 7Esa gwara ndị Izrel na ọ bụ Jehova nyere ha “ezumike gbaa gburugburu.” Esa echeghị na oge a e nwere udo bụ oge ọ ga-eji tụsara ahụ́. Kama, ọ malitere iwu obodo ukwu, mgbidi, ụlọ nche na ọnụ ụzọ ámá dị iche iche. Ọ gwara ndị Juda, sị: “Ala a ka bụ nke anyị.” Gịnị ka ihe a Esa kwuru pụtara? Ihe okwu ya pụtara bụ na ndị mmadụ nwere ike ịgagharị otú ọ bụla masịrị ha n’ala ahụ Chineke nyere ha, na-ewukwa obodo ndị ahụ n’enweghị ndị iro ga-emegide ha. Ọ gwara ha ka ha jiri oge ahụ e nwere udo mee ihe bara uru.

5. Gịnị mere Esa ji mee ka ndị agha ya bukwuo ibu ma sikwuo ike?

5 Esa jikwa oge ahụ e nwere udo mee ka ndị agha ya bukwuo ibu ma sikwuo ike. (2 Ihe 14:8) Ihe a o mere ò gosiri na ọ tụkwasịghị Jehova obi? Mba. Kama, Esa ma na ọ bụ ọrụ dịịrị ya ịkwadebe ndị ya maka oge nsogbu nwere ike ịbịara ha n’ọdịnihu. Esa ma na oge udo ahụ ndị Juda nọ na ya nwere ike ọ gaghị adịgide. Ihe mechara mee gosiri na nke a bụ eziokwu.

IHE NDỊ KRAỊST OGE MBỤ MERE MGBE E NWERE UDO

6. Gịnị ka Ndị Kraịst oge mbụ ji oge e nwere udo mee?

6 N’agbanyeghị na a kpagburu Ndị Kraịst oge mbụ ọtụtụ mgbe, e nwekwara oge ndị ha nwere udo. Gịnị ka ha ji oge ndị ahụ ha nwere udo mee? Ha ji ya kwusasie ozi ọma ike. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru na ha nọ “na-eje ije n’egwu Jehova.” Ha nọgidere na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, “ha nọgidekwara na-amụba.” Jehova gọziri ozi ọma ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa n’oge ahụ e nwere udo.—Ọrụ 9:26-31.

7-8. Gịnị ka Pọl na ndị ọzọ mere mgbe ohere dapụtaara ha? Kọwaa.

Ndị Kraịst oge mbụ ji ohere ọ bụla dapụtaranụ zie ndị mmadụ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl onyeozi matara na e megheerela ya ọnụ ụzọ buru ibu n’Efesọs, o ji oge ahụ kwusaa ozi ọma ma mee ndị na-eso ụzọ n’obodo ahụ.—1 Kọr. 16:8, 9.

8 Ohere ọzọ dapụtaara Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ mgbe e doziri okwu gbasara ibi úgwù n’afọ 49. (Ọrụ 15:23-29) Mgbe e mechara ka ọgbakọ dị iche iche mara ihe e kpebiri banyere ya, ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs gbakwuru mbọ kwusaa “ozi ọma banyere okwu Jehova.” (Ọrụ 15:30-35) Gịnị ka ọ rụpụtara? Baịbụl kwuru na “a nọgidere na-eme ka ọgbakọ dị iche iche dị ike n’okwukwe, ha na-amụbakwa n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.”—Ọrụ 16:4, 5.

IHE ANYỊ KWESỊRỊ IJI OGE ANYỊ NWERE UDO MEE TAA

9. Olee otú ihe si dịrị n’ọtụtụ mba taa, oleekwa ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

9 N’ọtụtụ mba taa, anyị nwere ike ikwusa ozi ọma n’enweghị ndị na-enye anyị nsogbu. Ọ̀ bụ n’ụdị ebe a ka i bi? Ọ bụrụ otú ahụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m ji oge a m nweere onwe m na-eme?’ N’oge ikpeazụ a ọtụtụ ihe na-eme, Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe a na-arụtụbeghị ụdị ya mbụ n’ụwa. (Mak 13:10) E nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ime n’ọrụ a.

Ọtụtụ ndị enwetala ọtụtụ ngọzi n’ihi na ha gara na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha gbara mbọ zie ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 12) *

10. Gịnị ka 2 Timoti 4:2 gbara anyị ume ka anyị mee?

10 Olee otú i nwere ike isi jiri oge e nwere udo mee ihe bara uru? (Gụọ 2 Timoti 4:2.) Gbalịa chebara otú ihe si dịrị gị echiche ma lee ma gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị ò nwere ike ijikwu oge buru ibu na-ekwusa ozi ọma ma ọ bụdị bụrụ ọsụ ụzọ. Ugbu a abụghị oge anyị kwesịrị iji na-akpakọbara onwe anyị akụnụba n’ihi na ihe ndị ahụ agaghị agafe oké mkpagbu.—Ilu 11:4; Mat. 6:31-33; 1 Jọn 2:15-17.

11. Olee ihe ụmụnna anyị ụfọdụ mere iji nwee ike izi ọtụtụ ndị ozi ọma?

11 Ọtụtụ ndị nkwusa amụọla asụsụ ọzọ ka ha nwee ike iji ya zie ndị mmadụ ozi ọma ma kụziere ha Baịbụl. Nzukọ Jehova na-ewepụtakwa ihe ndị e ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ iji nyere anyị aka ikwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2010, akwụkwọ anyị dị n’ihe dị ka narị asụsụ ise. Ma taa, ọ dịzi n’ihe karịrị otu puku asụsụ.

12. Olee uru ọ na-abara ndị mmadụ ma ha nụ ozi ọma Alaeze n’asụsụ ha? Nye ihe atụ.

12 Olee uru ọ na-abara ndị mmadụ ma ha nụ eziokwu dị n’Okwu Chineke n’asụsụ ha? Chegodị gbasara otu nwanna nwaanyị na-asụ asụsụ Kinyawanda. Ọ gara otu mgbakọ e mere na Memfis, Tenesii dị n’Amerịka. E ji asụsụ Kinyawanda, bụ́ asụsụ a kacha asụ na Rụwanda, Kongo (Kinshasa), nakwa Yuganda, mee mgbakọ ahụ. Mgbe e mechara mgbakọ ahụ, nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Ihe a bụ nke mbụ ya m ghọtara ihe niile e kwuru ná mgbakọ kemgbe afọ iri na asaa gara aga m bịara Amerịka.” O doro anya na okwu e ji asụsụ nwanna nwaanyị a kwuo ruru ya n’obi. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị omume, ì nwere ike ịmụ asụsụ ọzọ ka i nwee ike inyere ndị mmadụ aka n’ókèala unu? Ihe a nwere ike ịdaba adaba karịchaa ma e nwee asụsụ ndị mmadụ kacha achọ ka e jiri zie ha ozi ọma n’ókèala unu. Ị ga-enwe ezigbo obi ụtọ ma ị gbalịa mee ya.

13. Olee ihe ụmụnna anyị nọ na Rọshịa mere mgbe e nwere udo n’obodo ha?

13 N’obodo ụfọdụ, ndị ọchịchị machiri ụmụnna anyị ikwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, chee banyere ụmụnna anyị nọ na Rọshịa. A kpagburu ha ruo ọtụtụ afọ. Ma n’ọnwa Mach afọ 1991, ndị ọchịchị hapụrụ ha ka ha kpewe okpukpe ha. N’oge ahụ, ndị nkwusa nọ n’obodo ahụ dị puku iri na isii. Mgbe afọ iri abụọ gachara, ha dịzi otu narị puku ndị nkwusa na puku iri isii. Ihe a gosiri na ụmụnna anyị ji oge ahụ ha nweere onwe ha kwusaa ozi ọma nke ọma. Oge ahụ e nwere udo adịteghị aka. Ma, o meghị ka ha kwụsị iji ịnụ ọkụ n’obi na-efe Chineke. Ha ka na-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji na-efe Jehova.

OGE UDO AGAGHỊ ADỊTE AKA

Mgbe Eze Esa kpesichara ekpere ike, Jehova mere ka ndị Juda merie ìgwè ndị agha bịara ịlụso ha agha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)

14-15. Olee otú Jehova si jiri ike ya nyere Esa aka?

14 N’oge Esa, oge udo e nwere adịteghị aka. Ìgwè ndị agha Itiopia bịara ibuso ha agha. Ha dị otu nde. Obi siri onyeisi agha ha bụ́ Zira ike na ndị agha ya ga-emeri Juda. Ma, Esa tụkwasịrị Jehova obi. O kpere ekpere, sị: “Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị dabeere n’ebe ị nọ, anyị jikwa aha gị na-ebuso ìgwè mmadụ a agha.”—2 Ihe 14:11.

15 Ọ bụ eziokwu na ndị agha Itiopia ji okpukpu abụọ karịa ndị agha Juda, Esa tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-eji ike ya nyere ndị ya aka. Jehova agharịpụghị ya. Ha meriri ndị agha Itiopia.—2 Ihe 14:8-13.

16. Olee otú anyị si mara na oge udo agaghị adịte aka?

16 Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị ihe ga-eme onye ọ bụla n’ime anyị n’ọdịnihu, ma, ihe anyị ma bụ na oge udo ndị Chineke nwere taa agaghị adịte aka. Jizọs kwuru na ‘mba niile ga-akpọ ndị na-eso ụzọ ya asị’ n’oge ikpeazụ. (Mat. 24:9) Pọl onyeozi kwuru na “a ga-akpagbukwa ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Tim. 3:12) Ekwensu “na-ewe oké iwe.” Anyị na-aghọkwa onwe anyị aghụghọ ma anyị chee na anyị ga-agbanahụ iwe ya.—Mkpu. 12:12.

17. Olee ụzọ ndị e nwere ike isi lee okwukwe anyị ule?

17 N’oge na-adịghị anya, a ga-ele okwukwe anyị ule. A ga-enwekwa “oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a.” (Mat. 24:21) N’oge ahụ, ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịna-emegide anyị. E nwekwara ike ịmachi ọrụ anyị. (Mat. 10:35, 36) Onye ọ bụla n’ime anyị ọ̀ ga-emeli ka Esa ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka ma chebe anyị?

18. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 10:38, 39, gịnị ga-enyere anyị aka ịkwadebe maka mgbe oge udo ga-agwụ?

18 Jehova na-akwadebe anyị taa ka okwukwe anyị sie ike maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọ na-eduzi “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ na-enye anyị ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị’ ka anyị nwee ike ịnọsi ike n’ofufe ya. (Mat. 24:45) Ma, anyịnwa ga-emekwa òkè nke anyị iji mee ka okwukwe anyị sie ike.—Gụọ Ndị Hibru 10:38, 39.

19-20. N’ihi ihe e dere na 1 Ihe E Mere 28:9, olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, n’ihi gịnịkwa?

19 Anyị kwesịrị ‘ịchọ Jehova’ dị ka Eze Esa mere. (2 Ihe 14:4; 15:1, 2) Otú anyị ga-esi ebido ime ya bụ ịmata Jehova na ime baptizim. Ka anyị gbasie mbọ ike mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike. Iji mata ma ànyị na-emekwa ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-abịachi ọmụmụ ihe anya?’ N’ọmụmụ ihe, Jehova na-enye anyị ike anyị ga-eji na-efe ya, ụmụnna anyị na-agbakwa anyị ume. (Mat. 11:28) Anyị nwekwara ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-amụchi Baịbụl anya?’ Ọ bụrụ na gị na ndị ezinụlọ gị ka bi, ùnu na-ewepụta oge kwa izu na-enwe ofufe ezinụlọ? Ọ bụrụkwanụ na naanị gị bi, ị̀ na-ewepụta oge amụ Baịbụl otú ahụ ndị ha na ezinụlọ ha bi na-eme? Ị̀ na-emekwa ike gị niile n’ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ?

20 Gịnị mere anyị ji kwesị ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị ahụ? Baịbụl gwara anyị na Jehova na-enyocha obi anyị. N’ihi ya, anyịnwa kwesịkwara ime otú ahụ. (Gụọ 1 Ihe E Mere 28:9.) Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ịgbanwe n’ihe anyị chọrọ ime, n’àgwà anyị ma ọ bụ n’otú anyị si eche echiche, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ime mgbanwe ndị ahụ. Ugbu a bụ oge anyị nwere iji kwadebe onwe anyị maka ọnwụnwa ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu. Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara iji oge e nwere udo mee ihe bara uru.

ABỤ NKE 62 Abụ Ọhụrụ

^ par. 5 Ì bi n’obodo ebe i nweere onwe gị ife Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka i ji oge a e nwere udo na-eme? Isiokwu a ga-enyere gị aka ịmata otú ị ga-esi eṅomi Eze Esa chịrị Juda, ṅomiekwa Ndị Kraịst oge mbụ. Ha ji oge e nwere udo mee ihe bara uru.

^ par. 3 NKỌWAKWU: Okwu bụ́ “udo” apụtaghị naanị oge a na-anaghị alụ agha. Okwu Hibru e si sụgharịta ya nwekwara ike ịpụta inwe ezi ahụ́ ike, ịnọ ná nchebe, nakwa ihe ịdị mma.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Eze Esa chụpụrụ nne nne ya na-ekpere arụsị n’ọkwá ọ nọ na ya. Ndị na-akwado Esa sooro ya bibie arụsị dị iche iche.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Ebe otu di na nwunye na-ejikere ịkwaga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.