Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 36

Jirinụ Ndị Na-eto Eto Nọ n’Ọgbakọ Kpọrọ Ihe

Jirinụ Ndị Na-eto Eto Nọ n’Ọgbakọ Kpọrọ Ihe

“Mma ụmụ okorobịa bụ ike ha.”​—ILU 20:29.

ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe anyị nwere ike ime ma anyị mewe agadi?

ANYỊ katawa ahụ́, ụjọ nwere ike ịbịa anyị na anyị agaghịzi abara Jehova uru otú anyị bara n’oge gara aga. Ọ bụ eziokwu na e nwere ike anyị esighịzi ike otú anyị siri na mbụ, anyị nwere ike iji amamihe anyị nwere nyere ndị na-eto eto aka ka ha jiri ike ha niile jeere Jehova ozi ma wepụtakwuo onwe ha ịrụ ọrụ ndị ọzọ. Otu nwanna bụ okenye kemgbe ọtụtụ afọ sịrị: “Mgbe m mewere agadi, obi tọrọ m ụtọ na e nwere ụmụ okorobịa ruru eru ịrụ ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ.”

2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

2 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị lebara anya n’otú ndị na-eto eto nwere ike isi rite uru ma ha na-eru ndị agadi nso. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú àgwà ndị dị ka ịdị umeala n’obi, mmadụ ịma ebe ike ya ruru na inwe obi ụtọ maka ihe e meere ya, na imesapụ aka ga-esi nyere ndị agadi aka ka ha na ndị na-eto eto na-arụkọ ọrụ, meekwa ka ihe na-aga nke ọma n’ọgbakọ.

DỊ UMEALA N’OBI

3. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 2:​3, 4, gịnị bụ ịdị umeala n’obi, oleekwa otú o nwere ike isi nyere Ndị Kraịst aka?

Ndị agadi kwesịrị ịdị umeala n’obi ma ọ bụrụ na ha chọrọ inyere ndị na-eto eto aka. Onye dị umeala n’obi na-ewere ndị ọzọ ka ndị ka ya. (Gụọ Ndị Filipaị 2:​3, 4.) Ndị agadi dị umeala n’obi na-echeta na e nwere ụzọ dị iche iche Akwụkwọ Nsọ kwadoro e nwere ike isi mee ihe n’ọgbakọ. N’ihi ya, ha anaghị atụ anya ka a na-eme ihe otú e sibu na-eme ya n’oge gara aga. (Ekli. 7:10) Ọ bụ eziokwu na ha nwere ihe ndị ha ga-akụziri ndị na-eto eto, ma, ha kwesịrị icheta na “ihe ndị na-eme n’ụwa a na-agbanwe agbanwe” nakwa na ha kwesịrị ịmụta otú e si eme ihe ugbu a.​—1 Kọr. 7:31.

Ndị mere agadi na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị merela ná ndụ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5) *

4. Olee otú ndị nlekọta sekit si na-eme ihe yiri ihe ndị Livaị mere?

Ndị agadi dị umeala n’obi ghọtara na ka ha na-eme agadi ka ike ha na-agbada. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ndị nlekọta sekit. Ọ bụrụ na ha eruo afọ iri asaa, a na-agbanwere ha ọrụ. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike isitụrụ ha ike, ma obi na-adị ha ụtọ na ha na-ejere ụmụnna ha ozi. Ọrụ mbụ ahụ masịrị ha. Ha chọkwara ịnọ na-arụ ya. Ma ha ghọtara na ọ kacha mma ka ụmụnna na-akatabeghị ahụ́ rụwazie ya. N’ihi ya, ha na-eme ihe yiri ihe ndị Livaị mere n’Izrel oge ochie. Ọ na-abụ onye Livaị ruo afọ iri ise, ya akwụsị ije ozi n’ụlọikwuu. Ihe na-eme ka ndị Livaị ahụ na-enwe obi ụtọ abụghị ụdị ozi ha na-ejere Jehova. Ha ji obi ha niile rụọ ọrụ ha, meekwa ike ha niile inyere ndị na-akatabeghị ahụ́ aka. (Ọnụ Ọgụ. 8:​25, 26) Taa, ọ bụ eziokwu na ndị bụbu ndị nlekọta sekit anaghịzi aga eleta ọgbakọ dị iche iche, ma ha na-enwe obi ụtọ iso ọgbakọ ọ bụla e zigara ha na-eje ozi.

5. Gịnị ka ị mụtara n’ihe a kọrọ gbasara Nwanna Dan na nwunye ya?

5 Chegodị gbasara otu nwanna aha ya bụ Dan bụ́ onye nlekọta sekit ruo afọ iri abụọ na atọ. Mgbe o ruru afọ iri asaa, a gwara ya na Katie nwunye ya ka ha bụrụzie ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Gịnị ka ha mere ka ozi ọhụrụ a na-atọ ha ụtọ? Nwanna Dan sịrị na ọrụ na-eju ya aka ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ na-arụ ọrụ ọgbakọ, na-enyere ụmụnna aka iru eru ịbụ ndị ohu na-eje ozi, na-azụkwa ndị ọzọ ka ha nwee ike ịna-ezi ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo nakwa n’ụlọ mkpọrọ. Ndị agadi, ma ùnu nọ n’ozi oge niile ma ọ bụ na unu anọghị, unu nwere ike ime ọtụtụ ihe iji nyere ndị ọzọ aka. Olee otú unu ga-esi eme ya? Gbalịanụ ka ọrụ ọhụrụ unu na-atọ unu ụtọ. Kpebienụ ihe ndị unu ga-eme, lekwasịkwanụ anya n’ihe ndị unu ga-emeli kama ilekwasị anya n’ihe ndị unu na-agaghị emeli.

MARA EBE IKE GỊ RURU

6. Gịnị mere o ji dị mma mmadụ ịmara ebe ike ya ruru? Nye ihe atụ.

6 Onye ma ebe ike ya ruru ma ihe ndị ọ ga-emeli na ihe ndị ọ na-agaghị emeli. (Ilu 11:2) Mmadụ ịma ebe ike ya ruru ga-eme ka ọ ghara ịtụ anya ime ihe ndị ọ na-agaghị emeli. Nke ahụ ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ ma na-arụsi ọrụ ike. Anyị nwere ike iji onye ma ebe ike ya ruru tụnyere onye ji ụgbọala na-arị ugwu. Onye na-anya ụgbọala ahụ ga-etinye ya na gịa ga-arịli ugwu ahụ. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ime ka ụgbọala ahụ na-aga nwayọọ nwayọọ, ma, ọ ga na-aga ruo mgbe ọ rịchara ugwu ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye ma ebe ike ya ruru. Ọ ma mgbe ọ ga-adị mkpa ka o jiri nwayọọ nwayọọ na-eme ihe ka o nwee ike ịnọgide na-ejere Jehova ozi ma na-enyere ndị ọzọ aka.​—Fil. 4:5.

7. Olee otú Bazilaị si gosi na ọ ma ebe ike ya ruru?

7 Chegodị gbasara Bazilaị. Ọ dị afọ iri asatọ mgbe Eze Devid gwara ya ka ọ bịa bụrụ otu n’ime ndị ndụmọdụ ya. Ebe Bazilaị ma ebe ike ya ruru, ọ jụrụ ime ihe eze gwara ya. Ọ ma na e nwere ọtụtụ ihe ndị ọ na-agaghịzi emeli n’ihi na ọ gbadala n’afọ ndụ. O kwuziri ka Kimham, bụ́ nwa okorobịa, nọchite anya ya. (2 Sam. 19:​35-37) Dịkwa ka Bazilaị, obi na-atọ ndị mere agadi ụtọ ịhapụrụ ụmụ okorobịa ọrụ ndị ha na-arụbu ka ha rụwa.

Mgbe Jehova gwara Devid na ọ bụghị ya ga-ewuru ya ụlọ, Devid nabatara ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. Olee otú Eze Devid si gosi na ọ ma ebe ike ya ruru n’ihe gbasara ịrụ ụlọ nsọ ahụ?

8 Eze Devid mekwara ihe ọzọ magburu onwe ya iji gosi na ọ ma ebe ike ya ruru. O ji obi ya niile chọọ iwuru Jehova ụlọ. Ma, mgbe Jehova gwara ya na ọ bụ nwa ya bụ́ Solomọn ga-arụ ụlọ ahụ, ọ nabatara ihe Jehova kwuru ma jiri obi ya niile kwadoo ọrụ ahụ. (1 Ihe 17:4; 22:5) Devid echeghị na ọ ga-aka mma ka yanwa rụọ ụlọ ahụ n’ihi na Solomọn “bụ obere nwa, o nwebeghịkwa ihe ọ ma.” (1 Ihe 29:1) Devid ma na ihe ga-eme ka ọrụ ahụ gaa nke ọma bụ ma Jehova gọzie ya, ọ bụghị afọ ole onye ga-ebute ụzọ n’ọrụ ahụ dị ma ọ bụ ihe ọ ma. Dịkwa ka Devid, ndị agadi ka na-arụsikwu ọrụ ike n’ozi Jehova ma mgbe ọrụ ha gbanwere. Ha makwa na Jehova ga-agọzi ụmụ okorobịa ndị na-arụ ọrụ hanwa rụburu.

9. Olee otú otu onye so na Kọmitii Alaka si gosi na ọ ma ebe ike ya ruru?

9 N’oge anyị a, otu nwanna aha ya bụ Shigeo gosiri na ọ ma ebe ike ya ruru. N’afọ 1976, mgbe ọ dị afọ iri atọ, a họpụtara ya ka o soro na Kọmitii Alaka. N’afọ 2004, ọ ghọrọ Onye Na-ahaziri Kọmitii Alaka Ọrụ. Mgbe e mechara, ọ matara na ahụ́ ya agaghị ekwe ya ịrụ ọrụ ya nke ọma. O kpere ekpere ma chee uru ọ ga-aba ma ọ bụrụ na nwanna na-akatachabeghị ahụ́ arụwa ọrụ ahụ ọ na-arụ. N’agbanyeghị na ọ bụghịzi ya na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ, ọ ka sokwa na Kọmitii Alaka, ya na ha na-arụkọkwa ọrụ nke ọma. Dị ka anyị hụrụ n’akụkọ Bazilaị, Eze Devid, na Shigeo, onye dị umeala n’obi ma mara ebe ike ya ruru na-elekwasị anya n’ihe ndị na-eto eto ma kama ilekwasị anya n’ihe ndị ha na-amaghị. Ọ ga-ewere ha ka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ, ọ bụghị ndị ya na ha na-ama aka.​—Ilu 20:29.

NA-EGOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ

10. Olee otú ndị agadi kwesịrị isi were ndị na-eto eto n’ọgbakọ?

10 Ndị agadi kwesịrị iwere ndị na-eto eto ka ngọzi Jehova. Ha kwesịrị igosi na obi dị ha ụtọ maka ya. Ka ike ha na-agbada, obi na-atọ ha ụtọ na e nwere ndị na-eto eto ike dị n’ahụ́, dịkwa njikere ịrụ ọrụ n’ọgbakọ.

11. Olee otú Rut 4:​13-16 si gosi uru ọ ga-abara onye agadi ma ọ nabata aka ndị na-eto eto na-enyere ya?

11 Naomi a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl gosiri otú ndị agadi kwesịrị isi gosi na obi dị ha ụtọ n’otú ndị na-eto eto si enyere ha aka. Na mbụ, Naomi gwara nwunye nwa ya di ya nwụrụ aha ya bụ Rut ka ọ laghachikwuru ndị ya. Ma, Rut ekweghị ahapụ Naomi, kama, o so ya laghachi Betlehem. Obi dị Naomi ezigbo ụtọ na Rut so ya. Ọ nabatakwara aka o nyeere ya. (Rut 1:​7, 8, 18) Ihe a baakwara ha abụọ uru. (Gụọ Rut 4:​13-16.) Ịdị umeala n’obi ga-enyere ndị agadi aka ime ka Naomi.

12. Olee otú Pọl si gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe ọma ndị e meere ya?

12 Obi dị Pọl onyeozi ụtọ maka aka e nyeere ya. Dị ka ihe atụ, o kelere Ndị Kraịst nọ na Filipaị maka onyinye ndị ha ziteere ya. (Fil. 4:16) O gosikwara na obi dị ya ụtọ maka aka Timoti nyeere ya. (Fil. 2:​19-22) Pọl kelekwara Chineke maka ndị bịara gbaa ya ume mgbe a kpọ ya na-aga Rom. (Ọrụ 28:15) Pọl dị ezigbo ike. Ọ gara ọtụtụ kilomita iji zie ozi ọma nakwa iji mee ka ọtụtụ ọgbakọ dị ike. Ma, ọ dị umeala n’obi, nabatakwa aka ụmụnna ya nyeere ya.

13. Olee otú ndị agadi ga-esi gosi na obi dị ha ụtọ maka ndị na-eto eto?

13 Ndị agadi, unu nwere ike isi n’ọtụtụ ụzọ gosi na obi dị unu ụtọ maka ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ unu. Ọ bụrụ na ha chọrọ iburu gị n’ụgbọala, inyere gị aka zụta ihe, ma ọ bụkwanụ imere gị ihe ndị ọzọ, nabata enyemaka ha. Were ya ka otú Jehova si egosi gị na ọ hụrụ gị n’anya. O nwere ike iju gị anya na ihe a nwere ike ime ka gị na ha ghọọ ezigbo enyi. Gbalịa na-enyere ndị na-eto eto aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Na-agwakwa ha otú obi si adị gị ụtọ ma ị na-ahụ ka ndị na-eto eto na-agbalị ime ọtụtụ ihe n’ọgbakọ. Wepụtakwa oge na-akọrọ ha ihe ụfọdụ merela ná ndụ gị. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-egosi na ‘ị na-ekele Chineke’ maka ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ.​—Kọl. 3:15; Jọn 6:44; 1 Tesa. 5:18.

NA-EMESAPỤ AKA

14. Olee otú Devid si gosi na ọ na-emesapụ aka?

14 Eze Devid mekwara ihe ọzọ dị ezigbo mkpa ndị agadi kwesịrị ịna-eme, ya bụ, ịna-emesapụ aka. O nyere ego na ihe ndị ọzọ iji kwadoo ụlọ nsọ a ga-arụ. (1 Ihe 22:​11-16; 29:​3, 4) O mere ihe a n’agbanyeghị na ihe a ga-akpọ ụlọ nsọ ahụ bụ ụlọ nsọ Solomọn. Ọ bụrụ na ike adịghịzi anyị iso na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, anyị nwere ike ịna-enye onyinye otú akpa anyị hà iji na-akwado ya. Anyị nwekwara ike iji ihe ndị anyị mụtara n’ozi anyị jeere Jehova ọtụtụ afọ nyere ndị ka na-eto eto aka.

15. Olee ihe dị ezigbo mkpa Pọl kụziiri Timoti?

15 Ka anyị leekwa otú Pọl onyeozi si mesapụ aka. Ọ kpọrọ Timoti ka o soro ya n’ozi ala ọzọ ọ na-eje, kụziekwara ya otú o si akụzi ihe na otú o si ezi ozi ọma. (Ọrụ 16:​1-3) Ihe ọ kụziiri ya mere ka ọ na-ekwusa ozi ọma nke ọma, na-akụzikwa ihe nke ọma. (1 Kọr. 4:17) Timoti jikwa ihe ndị a ọ mụtara n’aka Pọl zụọ ndị ọzọ.

16. Gịnị mere Shigeo ji zụọ ndị ọzọ?

16 Taa, ụjọ anaghị atụ ndị agadi na ha agaghịzi aba uru n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha azụọ ndị na-eto eto n’ọrụ ndị ha na-arụ. Dị ka ihe atụ, kemgbe ọtụtụ afọ, Shigeo anyị kwuburu okwu ya zụrụ ụmụnna nwoke na-eto eto so na Kọmitii Alaka. O mere ihe a ka ọrụ a na-arụ iji kwadoo Alaeze Chineke n’obodo ya na-aga nke ọma. Ihe a mere ka e nwee nwanna a zụrụ nke ọma nọchiri ya mgbe oge ruru ka ọ kwụsị ịbụ onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ. Shigeo esorola na Kọmitii Alaka ihe karịrị afọ iri anọ na ise. Ọ na-ejikwa ihe ndị ọ mụtara na-enyere ndị na-eto eto aka. Ụdị ụmụnna ndị a na-abụrụ ndị Jehova ezigbo ngọzi.

17. Dị ka e kwuru na Luk 6:​38, olee ihe ndị agadi nwere ike inye ndị ọzọ?

17 Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị merela agadi, unu bụ ihe àmà na-egosi na mmadụ iji ndụ ya na-ejere Jehova ozi bụ otú kacha mma isi bie ndụ. Ihe ndị unu na-eme na-egosi na mmadụ ịmụta ihe dị na Baịbụl na ime ya na-aba ezigbo uru ná ndụ. Unu ma otú e si mee ihe n’oge gara aga. Ma, unu makwa na unu kwesịrị ịmụta ụzọ ọhụrụ ndị e si eme ihe ugbu a. Unu ndị agadi ka mere baptizim n’oge na-adịbeghị anya nwekwara ọtụtụ uru unu ga-aba. Unu nwere ike ịkọrọ ndị ọzọ otú obi dị unu na Jehova mere ka unu mata ya mgbe unu katarala ahụ́. Obi ga-adị ndị na-eto eto ụtọ ịnụ gbasara ihe ndị mere unu nakwa ihe ndị unu mụtara n’ozi Jehova. Ọ bụrụ na unu ‘ana-enye ihe,’ ya bụ, iji ihe ndị unu mụtarala na-azụ ndị ọzọ, Jehova ga-agọzi unu nke ukwuu.​—Gụọ Luk 6:38.

18. Olee otú ndị na-eto eto na ndị agadi ga-esi na-abara ibe ha uru?

18 Ọ bụrụ na unu bụ́ ndị agadi ana-emetakwu ndị na-eto eto enyi, unu ga-enwe ike ịna-enyere ibe unu aka. (Rom 1:12) Ndị nke ọ bụla nwere ihe bara uru ndị nke ọzọ na-enweghị. Ndị agadi nwere amamihe na ihe ndị ha mụtara kemgbe ndụ ha. Ndị na-eto eto nwere ume. Ọ bụrụ na ndị na-eto eto na ndị agadi ana-emekọ ihe ka enyi, ọ ga-eme ka e too Nna anyị nke eluigwe, baakwara mmadụ niile nọ n’ọgbakọ uru.

ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

^ par. 5 E nwere ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ na-ejere Jehova ozi n’ọgbakọ ya. Ndị agadi nọ n’ọgbakọ Jehova, n’agbanyeghị ebe ha si ma ọ bụ obodo ha, nwere ike inyere ndị na-eto eto aka ime ike ha niile n’ozi Jehova.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: Mgbe otu onye nlekọta sekit ruru afọ iri asaa, a gbanweere ya na nwunye ya ọrụ. Ihe ndị ha mụtarala kemgbe ọtụtụ afọ mere ka ha nyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ha na-eje ozi ugbu a aka.