Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 39

Mgbe Onye Anyị Hụrụ n’Anya Hapụrụ Jehova

Mgbe Onye Anyị Hụrụ n’Anya Hapụrụ Jehova

‘Ọtụtụ ugboro ka ha kpasuru ya iwe.’​—ỌMA 78:40.

ABỤ NKE 102 ‘Nyere Ndị Na-adịghị Ike Aka’

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú obi nwere ike ịdị mmadụ ma a chụọ onye ọ hụrụ n’anya n’ọgbakọ?

È NWERE onye ị hụrụ n’anya a chụrụ n’ọgbakọ? Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịgbawa gị obi. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Hilda kwuru, sị: “Mgbe di m mụ na ya lụrụ afọ iri anọ na otu nwụrụ, m chere na ihe kacha njọ emeela m. * Ma mgbe a chụrụ nwa m nwoke n’ọgbakọ, ya ahapụkwa nwunye ya na ụmụ ya, ọ gbawara m obi karịa.”

Jehova ghọtara otú o si ewute anyị mgbe a chụrụ onye anyị n’ọgbakọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2 na nke 3) *

2-3. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 78:​40, 41, olee otú obi na-adị Jehova ma ohu ya hapụ ya?

2 Chegodị otú obi si gbawaa Jehova mgbe ụfọdụ ndị mmụọ ozi nọbu n’ezinụlọ ya nupụụrụ ya isi. (Jud 6) Cheekwa otú obi dị ya mgbe ndị ọ hụrụ n’anya bụ́ ụmụ Izrel nupụụrụ ya isi ọtụtụ ugboro. (Gụọ Abụ Ọma 78:​40, 41.) Ka obi sie gị ike na ọ na-ewute Nna anyị nke eluigwe ma onye ị hụrụ n’anya hapụ ya. Ọ na-aghọta mwute anyị na-enwe, ọ ga-agbakwa gị ume ma kwadoo gị.

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị nwere ike ime ka Jehova nyere anyị aka ma ụdị ihe a mee anyị. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị nwere ike isi nyere ndị ụdị ihe a mere n’ọgbakọ aka. Ma, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe anyị na-ekwesịghị ime ma ụdị ihe a mee.

ATALA ONWE GỊ ỤTA

4. Olee otú ọ na-adị ọtụtụ ndị nne na nna mgbe a chụrụ nwa ha n’ọgbakọ?

Ndị nwa ha ha hụrụ n’anya hapụrụ ọgbakọ nwere ike ịna-eche ma ò nwere ihe ha gaara eme iji nyere nwa ha aka ịnọgide na-efe Chineke. Legodị ihe otu nwanna aha ya bụ Luke kwuru mgbe a chụrụ nwa ya nwoke n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “M na-ata onwe m ụta mgbe ahụ. M rọdịrị nrọ ọjọọ maka ya. Mgbe ụfọdụ, m na-ebegide ákwá, obi ana-afụ m ụfụ.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Elizabeth ụdị ihe a mere jụrụ onwe ya, sị: “Gịnị ka m mejọrọ? Ọ dị m ka agbalịghị m ike m niile ịkụziri nwa m banyere Jehova.”

5. Ọ bụrụ na mmadụ apụọ n’ọgbakọ, ònye ka ụta dịịrị?

5 Anyị niile kwesịrị icheta na Jehova nyere anyị ikike ịhọrọ ihe anyị chọrọ ime. Nke ahụ pụtara na ọ bụ anyị ga-ekpebiri onwe anyị ma ànyị ga-erubere ya isi ma ọ bụ na anyị agaghị erubere ya isi. E nwere ụfọdụ ndị na-eto eto a zụlitere n’ezinụlọ na-anaghị eme nke ọma n’ofufe Chineke, ma ha emechaa kpebie ife Jehova, na-emekwa nke ọma, nweekwa ndị ọzọ nne na nna ha mere ike ha niile kụziere ha ka ha hụ Jehova n’anya, ma ha emechaa dapụ n’ọgbakọ mgbe ha toro. Ihe nke a pụtara bụ na ọ bụ onye nke ọ bụla n’ime anyị ka ọ dịịrị ikpebi ma ọ̀ ga-efe Jehova. (Josh. 24:15) N’ihi ya, ndị nne na nna ihe a gbawara obi, unu echela na ọ bụ unu ka o si n’aka.

6. Olee otú obi nwere ike ịdị mmadụ ma ọ bụrụ na mama ya ma ọ bụ papa ya ahapụ ọgbakọ?

6 Mgbe ụfọdụ, nne ma ọ bụ nna na-esi n’ọgbakọ pụọ ma hapụ ezinụlọ ha. (Ọma 27:10) Ihe a nwere ike ịkacha wute ụmụ ha ma ọ bụrụ na ụmụ ha na-akwanyere ha ezigbo ùgwù ma na-achọkarị iṅomi ha. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Esther a chụrụ nna ya n’ọgbakọ kwuru, sị: “M bere ákwá ọtụtụ ugboro n’ihi na m ma na papa m anọghị na-ala azụ n’ọgbakọ, kama, o kpebiri ịhapụ ọgbakọ. M hụrụ ya n’anya. N’ihi ya, mgbe a chụrụ ya n’ọgbakọ, m nọ na-echegbu onwe m gbasara ya. E nwedịrị mgbe obi na-amapụ m.”

7. Olee otú obi na-adị Jehova maka ndị na-eto eto a chụrụ nne ha ma ọ bụ nna ha n’ọgbakọ?

7 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto a chụrụ nne ya ma ọ bụ nna ya n’ọgbakọ, mara na ọ na-ewute anyị. Biko, obi sie gị ike na Jehova maara otú ọ dị gị n’obi. Ọ hụrụ gị n’anya. Obi dịkwa ya ụtọ maka otú i si nọsie ike n’ọgbakọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa bụ́ ụmụnna gị. Chetakwa na ọ bụghị gịnwa mere ka nne gị ma ọ bụ nna gị kpebie ịpụ n’ọgbakọ. Dị ka anyị kwuru na mbụ, Jehova nyere anyị niile ikike ikpebi ma ànyị ga-efe ya ma ọ bụkwanụ na anyị agaghị efe ya. Onye ọ bụla nyefere Jehova onwe ya, e mee ya baptizim, “ga-ebu ibu nke ya.”​—Gal. 6:5.

8. Olee ihe ndị ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ nwere ike ime ka ha na-eche ka onye ha lọghachikwute Jehova? (Gụọkwa igbe isiokwu ya bụ “ Lọghachikwute Jehova.”)

8 Ọ bụrụ na onye gị ahapụ ọgbakọ, ọ dịghị njọ inwe olileanya na ọ ga-emecha lọghachikwute Jehova. Ma, olee ihe i nwere ike ịna-eme tupu mgbe ahụ? Gbasie mbọ ike na-eme ka okwukwe gị sikwuo ike. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, o nwere ike ime ka ndị ezinụlọ unu ndị ọzọ ma ọ bụdị onye ahụ a chụrụ n’ọgbakọ chọwa ime ka gị. Ọ ga-emekwa ka ọ dịrị gị mfe idi ihe ahụ merenụ. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ i nwere ike ime.

IHE I NWERE IKE IME KA OKWUKWE GỊ SIKWUO IKE

9. Olee ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike? (Gụọkwa igbe isiokwu ya bụ “ Amaokwu Baịbụl Ndị Ga-enye Aka ma Onye Gị Hapụ Jehova.”)

9 Na-eme ihe niile i nwere ike ime ka okwukwe gị sikwuo ike. Ọ dị ezigbo mkpa ka ị nọgide na-eme ihe ndị ga-eme ka okwukwe gị na ndị ezinụlọ gị na-esikwu ike. Olee otú i nwere ike isi na-eme ya? Na-amụchi Okwu Chineke anya, na-atụgharị uche na ya, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Joanna papa ya na nwanne ya nwaanyị pụrụ n’ọgbakọ sịrị: “Obi na-eru m ala ma m gụọ banyere ndị dị ka Abigel, Esta, Job, Josef, na Jizọs. Ihe ndị ha mere na-eme ka m na-eche ihe ndị bara uru, na-emekwa ka ihe ahụ merenụ ghara ịna-ewutebiga m ókè. Egwú ndị a gụrụ n’ihe omume tiivi anyị na-agbakwa m ume.”

10. Olee ihe e kwuru n’Abụ Ọma 32:​6-8 ga-enyere anyị aka mgbe ọ bụla obi jọwara anyị njọ?

10 Gwa Jehova ihe ndị gị na ha na-alụ n’ekpere. Ọ bụrụ na obi ajọwa gị njọ, akwụsịla ikpe ekpere. Rịọ Chineke ka o nyere gị aka ka i si otú yanwa si ele ihe anya lewe ihe ahụ anya, nakwa ka o mee “ka ị mara ihe, zikwa gị ụzọ i kwesịrị iso.” (Gụọ Abụ Ọma 32:​6-8.) Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ịna-ewute anyị ma anyị na-agwa Jehova otú obi dị anyị. Ma Jehova na-aghọta anyị nke ọma. Ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ọ gbakwara anyị ume ka anyị gwa ya ihe ndị ahụ na-enye anyị nsogbu n’obi.​—Ọpụ. 34:6; Ọma 62:​7, 8.

11. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 12:​11, gịnị mere anyị kwesịrị iji kwadoo ihe ndị okenye kpebiri? (Gụọkwa igbe isiokwu ya bụ, “ Otú Ịchụ Mmadụ n’Ọgbakọ Si Egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya.”)

11 Kwadoo ihe ndị okenye kpebiri. Ịchụ mmadụ n’ọgbakọ so ná nhazi Jehova mere n’ọgbakọ ya. Ọ na-abara ma onye ahụ a chụrụ n’ọgbakọ ma ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ uru. (Gụọ Ndị Hibru 12:11.) Ụfọdụ ndị n’ọgbakọ nwere ike ịna-akatọ mkpebi ndị okenye mere ịchụpụ onye mere mmehie n’ọgbakọ. Ma cheta na ọtụtụ mgbe, ndị ahụ na-ekwu otú ahụ anaghị achọ ikwu ihe ọjọọ onye ahụ mere. Anyị amachaghị ihe niile merenụ. N’ihi ya, o kwesịrị ka anyị tụkwasị ndị okenye obi na ha gbalịrị ike ha iji ihe Baịbụl kwuru ‘kpeere Jehova ikpe.’​—2 Ihe 19:6.

12. Olee uru irubere Jehova isi baara ụfọdụ ndị mgbe a chụrụ onye ha n’ọgbakọ?

12 Ọ bụrụ na anyị akwadoo mkpebi ndị okenye mere ịchụ onye anyị hụrụ n’anya n’ọgbakọ, o nwere ike inyere ya aka imecha lọghachikwute Jehova. Nwanna Nwaanyị Elizabeth anyị kwuburu okwu ya sịrị: “O siiri anyị ezigbo ike anyị na nwa anyị nwoke ịkwụsị ịna-emekọrịta ihe. Ma, mgbe ọ lọghachikwutere Jehova, o kwuru na ọ dị mma na a chụrụ ya n’ọgbakọ. O mechara kwuo na ya mụtara ọtụtụ ihe ndị baara ya uru. Ihe a mere ka m jirikwuo ịdọ aka ná ntị Jehova kpọrọ ihe.” Di ya aha ya bụ Mark sịrị: “Mgbe e mechara, nwa anyị nwoke ahụ gwara m na otu ihe mere ya ji chọọ ịlọghachi bụ na anyị mere ihe anyị kwesịrị ime. Obi dị m ezigbo ụtọ na Jehova nyeere anyị aka irubere ya isi.”

13. Olee ihe ndị nwere ike inyere gị aka idi ihe na-ewute gị?

13 Gwa ezigbo ndị enyi gị ihe dị gị n’obi. Gị na Ndị Kraịst ma nke a na-akọ na-akpakọrịta ka ha nyere gị aka ịna-ele ihe anya otú Jehova si ele ya. (Ilu 12:25; 17:17) Joanna anyị kwuburu okwu ya sịrị: “N’obi m, ọ dị m ka m̀ nọ naanị m. Ma, mgbe m kọọrọ ezigbo ndị enyi m otú obi dị m, o nyeere m aka idi ya.” Ọ bụrụkwanụ na ụfọdụ ndị gị na ha nọ n’ọgbakọ ekwuo ihe ndị nwere ike ime ka ihe ahụ merenụ na-ewutekwu gị?

14. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ‘na-ediri ibe anyị ihe, na-agbagharakwa ibe anyị kpamkpam’?

14 Na-enwere ụmụnna gị ndidi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mmadụ niile ga na-ekwu ihe kwesịrị ekwesị mgbe niile. (Jems 3:2) Anyị niile ezughị okè. N’ihi ya, ya ejula gị anya na ọ ga-esiri ụfọdụ ndị ike ịma ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ ha ekwuo ihe ga-ewute gị n’amaghị ama. Cheta ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi nyere anyị. Ọ sịrị: “Na-edirinụ ibe unu ihe, na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.” (Kọl. 3:13) Otu nwanna nwaanyị a chụrụ onye ikwu ya n’ọgbakọ sịrị: “Jehova nyeere m aka ịgbaghara ụmụnna ndị kpasuru m iwe mgbe ha na-achọ ịgba m ume.” Olee ihe ndị nọ n’ọgbakọ nwere ike ime iji nyere ndị ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ aka?

ỌGBAKỌ NWEKWARA IKE INYE AKA

15. Olee ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ n’oge na-adịghị anya aka?

15 Jiri obiọma na-emeso ndị ezinụlọ ahụ. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Miriam kwuru na ya nọ na-echegbu onwe ya banyere ịga ọmụmụ ihe mgbe a chụrụ nwanne ya nwoke n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “Ụjọ nọ na-atụ m banyere ihe ndị mmadụ ga-ekwu. Ma, e nwere ndị enyi m gwara m okwu ndị nyeere m aka n’ihi na ha ghọtara ihe mụ na ya na-alụ. Ha ekwukwaghị okwu ọjọọ maka nwanne m ahụ a chụrụ n’ọgbakọ. Ihe a ha meere m mere ka owu ghara ịna-ama m.” Nwanna nwaanyị ọzọ kwuru, sị: “Mgbe a chụrụ nwa anyị nwoke n’ọgbakọ, ezigbo ndị enyi anyị kasiri anyị obi. Ụfọdụ n’ime ha kwuru na ha amaghị ihe ha ga-agwa anyị. Ụfọdụ so m bee ákwá, ndị ọzọ edetara m akwụkwọ ozi. Ihe a ha mere nyeere m ezigbo aka.”

16. Olee otú ọgbakọ ga-esi na-enyere ezinụlọ a chụrụ onye ha n’ọgbakọ aka?

16 Nọgide na-enyere ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ aka. Ha chọrọ ka ị hụ ha n’anya ma na-agba ha ume ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Hib. 10:​24, 25) Mgbe ụfọdụ, ndị ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ na-eche na a kpapụla ha n’ọgbakọ. Ekwela ka ọ dị ha otú ahụ. Ndị na-eto eto a chụrụ nne ha ma ọ bụ nna ha n’ọgbakọ bụ ndị ọ kacha mkpa ka a na-agba ume ma na-aja mma. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Maria, onye a chụrụ di ya n’ọgbakọ, ya agbahapụkwa ezinụlọ ya sịrị: “Ụfọdụ ndị enyi m bịara n’ụlọ anyị nye aka siere anyị nri ma nọnyere anyị n’ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị. Ha meteere m ebere, sorokwa m bee ákwá. Ha gbachiteere m mgbe ụfọdụ ndị na-akatọ m. Ihe ndị ha mere gbara m ume n’eziokwu.”​—Rom 12:​13, 15.

Ọgbakọ nwere ike inyere ezinụlọ a chụrụ onye ha n’ọgbakọ aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) *

17. Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-emetere ndị a chụrụ onye ha n’ọgbakọ ebere?

17 Ndị okenye, jirinụ ohere ọ bụla dapụtaranụ gbaa ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ ume. Ọ bụ ọrụ pụrụ iche dịịrị unu ịgụgụ ndị a chụrụ onye ha n’ọgbakọ. (1 Tesa. 5:14) Na-agba ha ume tupu a malite ọmụmụ ihe nakwa mgbe a gbasara. Na-aga n’ụlọ ha, unu na ha kpeekwa ekpere ma unu gaa. Unu na ha na-arụ n’ozi ọma ma ọ bụkwanụ mgbe ụfọdụ, unu akpọọ ha ka ha bịa n’ụlọ unu soro unu nwee ofufe ezinụlọ. Ndị okenye kwesịrị ịna-emere atụrụ Jehova ihe na-ewute ebere, hụkwa ha n’anya.​—1 Tesa. 2:​7, 8.

ADALA MBÀ, NỌGIDE NA-ATỤKWASỊ JEHOVA OBI

18. Dị ka e kwuru na 2 Pita 3:​9, olee ihe Chineke chọrọ ka ndị si n’ọgbakọ pụọ mee?

18 “O nweghị onye [Jehova] chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (Gụọ 2 Pita 3:9.) N’agbanyeghị na mmadụ nwere ike ime mmehie dị oké njọ, Chineke achọghị ka ọ nwụọ. Chegodị gbasara nnukwu ihe o furu Jehova, ya bụ, àjà o ji Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya chụọ maka onye nke ọ bụla n’ime anyị. N’ihi otú Jehova si hụ ndị hapụrụ ya n’anya, ọ chọrọ ka ha lọghachikwute ya. Ọ chọrọ ka ha mee ihe ahụ nwa mmefu mere n’ihe atụ Jizọs. (Luk 15:​11-32) Ọtụtụ ndị pụrụ n’ọgbakọ alọghachikwutela Nna ha nke eluigwe. Ndị nọ n’ọgbakọ nabatakwara ha nke ọma. Elizabeth anyị kwuburu okwu ya nwere obi ụtọ mgbe nwa ya lọghachiri n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “M na-ekele ndị niile gbara anyị ume ka anyị ghara ịkwụsị inwe olileanya na ọ ga-emecha lọghachi.”

19. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nọgide na-atụkwasị Jehova obi?

19 Anyị nwere ike ịtụkwasị Jehova obi mgbe niile. Ọ naghị agwa anyị mee ihe ga-akpatara anyị nsogbu. Ọ na-emesapụ aka, dị obi ebere, hụkwa ndị niile ji obi ha niile na-efe ya n’anya. Ka obi sie gị ike na Jehova agaghị agbahapụ gị n’oge i nwere nsogbu. (Hib. 13:​5, 6) Mark anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Jehova anaghị agbahapụ anyị. O mekataghị nọrọ anyị n’ebe dị anya mgbe anyị nọ ná nsogbu.” Jehova ga-anọgide na-enye gị “ike karịrị ike mmadụ.” (2 Kọr. 4:7) N’eziokwu, i nwere ike ịnọgide na-enwe okwukwe n’ebe Jehova nọ ma na-enwe olileanya ọ bụrụgodị na onye gị ahapụ Jehova.

ABỤ NKE 44 Ekpere Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

^ par. 5 Ọ na-agbawa obi ma ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya ahapụ Jehova. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú obi na-adị Jehova ma ụdị ihe a mee. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ndị ga-enyere ndị a chụrụ onye ezinụlọ ha n’ọgbakọ aka idi ya nakwa ihe ha nwere ike ime ka okwukwe ha nọgide na-esi ike. Isiokwu a ga-enyekwara anyị aka ịmata ihe mmadụ niile nọ n’ọgbakọ nwere ike ime iji kasie ndị ezinụlọ ha obi ma na-akwado ha.

^ par. 1 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 79 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna hapụrụ ezinụlọ ya na Jehova, nwunye ya na ụmụ ya ana-enwe mwute.

^ par. 81 NKỌWA FOTO: Ebe ndị okenye abụọ bịara ịgba otu ezinụlọ a chụrụ onye ha n’ọgbakọ ume.