Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 38

Na-ahụkwu Jehova na Ụmụnna Gị n’Anya

Na-ahụkwu Jehova na Ụmụnna Gị n’Anya

“Ana m alakwuru Nna m na Nna unu.”​—JỌN 20:17.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe anyị nwere ike ịkpọ Jehova?

JIZỌS, bụ́ “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke,” na ọtụtụ ndị mmụọ ozi so n’ezinụlọ Jehova. (Kọl. 1:15; Ọma 103:20) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nyeere ndị mmadụ aka ịghọta na ha nwere ike iwere Jehova ka Nna ha. Mgbe Jizọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya okwu, ọ kpọrọ Jehova “Nna m na Nna unu.” (Jọn 20:17) Ọ bụrụ na anyị enyefee Jehova onwe anyị ma mee baptizim, anyị na-abata n’ezinụlọ ebe onye ọ bụla hụrụ ibe ya n’anya.​—Mak 10:​29, 30.

2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike iwere Jehova ka Nna hụrụ ha n’anya. Ọ na-esikwara ndị ọzọ ike igosi ụmụnna ha na ha hụrụ ha n’anya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Jizọs si enyere anyị aka iwere Jehova ka Nna hụrụ anyị n’anya, onye anyị nwere ike ịbịaru nso. Anyị ga-amụtakwa ụzọ ndị anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova n’otú anyị si emeso ụmụnna anyị.

JEHOVA CHỌRỌ KA ANYỊ BỊARUO YA NSO

3. Olee otú ekpere Onyenwe anyị si eme ka anyị bịarukwuo Jehova nso?

3 Jehova bụ Nna anyị hụrụ anyị n’anya. Jizọs chọrọ ka anyị were Jehova otú yanwa si were ya, ya bụ, ka nna dị obiọma ma hụ ụmụ ya n’anya, onye ụmụ ya nwere ike ịgwa okwu mgbe ọ bụla, ọ bụghị onye obi tara mmiri. Anyị matara nke a n’ekpere Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Otú o si bido ekpere ahụ bụ “Nna anyị.” (Mat. 6:9) Jizọs gaara agwa anyị ka anyị kpọọ Jehova “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” “Onye kere ihe niile,” ma ọ bụ “Eze mgbe ebighị ebi.” Ịkpọ Jehova aha ndị a adịghị njọ n’ihi na ha bụ aha e turu ya na Baịbụl. (Jen. 49:25; Aịza. 40:28; 1 Tim. 1:17) Ma, Jizọs gwara anyị ka anyị kpọọ Jehova “Nna.”

4. Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka anyị bịaruo ya nso?

4 Ọ̀ na-esiri gị ike iwere Jehova ka Nna hụrụ gị n’anya? Ọ na-esiri ụfọdụ n’ime anyị ike. Ọ bụrụ na papa gị ahụghị gị n’anya, o nwere ike isiri gị ike ikweta na e nwere nna nwere ike ịhụ gị n’anya. Ma, ihe ga-eme ka obi ruo anyị ala bụ na Jehova ghọtara nnọọ otú ọ dị anyị. Ọ chọrọ ka anyị na ya dịrị ná mma. Ọ bụ ya mere Okwu ya ji gwa anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Jehova hụrụ anyị n’anya. O kwukwara na ọ ga-abụ Nna kacha mma anyị nwere ike inwe.

5. Dị ka e kwuru na Luk 10:​22, olee otú Jizọs nwere ike isi nyere anyị aka ka anyị na Jehova dịrị ná mma?

5 Jizọs nwere ike inyere anyị aka ịbịaru Jehova nso. Jizọs ma Jehova nke ọma, na-akpakwa àgwà ka ya. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna m.” (Jọn 14:9) Dị ka deede anyị, Jizọs na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-akwanyere Nna anyị ùgwù ma na-erubere ya isi, otú anyị ga-esi ghara ime ihe na-ewute ya, nakwa otú anyị ga-esi na-eme ihe dị ya mma. Otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa nyeere anyị aka ịghọta na Jehova dị obiọma, hụkwa anyị n’anya. (Gụọ Luk 10:22.) Ka anyị lee ihe atụ ụfọdụ.

Dị ka Nna hụrụ ụmụ ya n’anya, Jehova ji mmụọ ozi gbaa Jizọs ume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6) *

6. Nye ihe atụ ndị gosiri otú Jehova si gee Jizọs ntị.

6 Jehova na-ege ụmụ ya ntị. Chegodị gbasara otú Jehova si gee Ọkpara ya ntị. O doro anya na Jehova nụrụ ọtụtụ ekpere Jizọs kpere mgbe ọ nọ n’ụwa. (Luk 5:16) Ọ nụrụ ekpere Jizọs kpere mgbe ọ chọrọ ime mkpebi ndị dị ezigbo mkpa, dị ka mgbe ọ chọrọ ịhọta ndịozi iri na abụọ ya. (Luk 6:​12, 13) Jehova nụkwara ekpere Jizọs mgbe ọ na-echegbu onwe ya. Tupu a rara Jizọs nye, o kpesiri ekpere ike ka Nna ya nyere ya aka n’ọnwụnwa tara akpụ na-aga ịbịara ya. Ọ bụghị naanị na Jehova nụrụ ekpere ahụ Jizọs kpere, o zitekwara mmụọ ozi ka ọ gbaa Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ume.​—Luk 22:​41-44.

7. Olee otú obi dị gị ịmata na Jehova na-anụ ekpere ndị ohu ya?

7 Taa, Jehova ka na-anụkwa ekpere ndị ohu ya. Ọ na-aza ya n’oge kwesịrị ekwesị nakwa otú kacha mma. (Ọma 116:​1, 2) Otu nwanna nwaanyị bi n’India hụrụ otú Jehova si za ekpere ya. Ọ nọ na-arịa ezigbo ọrịa na-eme ka ọ na-echegbu onwe ya. O kpesikwara ekpere ike ka Jehova nyere ya aka. O dere, sị: “Ihe omume tiivi anyị nke Mee 2019 nke kwuru gbasara ihe mmadụ nwere ike ime ma ọ na-echegbu onwe ya bụ nnọọ ihe dị m mkpa mgbe ahụ. Jehova ji ya za ekpere m.”

8. Olee ụzọ ndị Jehova si gosi na ọ hụrụ Jizọs n’anya?

8 Jehova hụrụ anyị n’anya, na-elekọtakwa anyị otú ahụ o si hụ Jizọs n’anya ma lekọta ya n’oge ọ nọ n’ụwa a. (Jọn 5:20) O nyeere Jizọs aka ka okwukwe ya sie ike, gbaa ya ume mgbe nsogbu bịaara ya, gbookwara ya mkpa ya. Jehova gwara Jizọs na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na ihe ya masịrị ya. (Mat. 3:​16, 17) O nweghị mgbe owu mara Jizọs n’ihi na ọ ma na Nna ya nke eluigwe hụrụ ya n’anya nakwa na ọ nọnyeere ya.​—Jọn 8:16.

9. Olee otú anyị si mara na Jehova hụrụ anyị n’anya?

9 Dị ka Jizọs, anyị niile esila n’ọtụtụ ụzọ hụ na Jehova hụrụ anyị n’anya. Chegodị ihe a: Jehova dọtara anyị n’ebe ọ nọ, nyekwa anyị ọtụtụ ụmụnna hụrụ anyị n’anya bụ́ ndị na-eme anyị obi ụtọ ma na-agba anyị ume ma anyị nọrọ ná nsogbu. (Jọn 6:44) Jehova na-enyekwa anyị ihe niile ga-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ọ na-enyedịrị anyị aka inweta ihe ndị dị anyị mkpa n’ụbọchị. (Mat. 6:​31, 32) Ka anyị na-eche otú Jehova si hụ anyị n’anya ka anyị na-ahụkwu ya n’anya.

NA-EMESO ỤMỤNNA GỊ OTÚ JEHOVA SI EMESO HA

10. Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Jehova si na-emeso ụmụnna anyị?

10 Jehova hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Ma, o nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịhụ ndị anyị na ha nọ n’ezinụlọ Jehova n’anya n’ihi na anyị si n’ebe dị iche iche. Anyị niile na-emekwa ihe nwere ike iwute ndị ọzọ. Ma, anyị ka nwekwara ike ịgbalịsi ike na-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya. Olee otú anyị nwere ike isi mee ya? Ọ bụ ịna-eṅomi Jehova n’igosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya. (Efe. 5:​1, 2; 1 Jọn 4:19) Ka anyị hụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jehova.

11. Olee otú Jizọs si meere ndị ọzọ ebere ka Jehova?

11 Jehova dị “obi ebere.” (Luk 1:78) Obi anaghị adị onye na-eme ebere mma ma ọ hụ ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ọ na-achọ ụzọ ọ ga-esi nyere ha aka. Jizọs mere ka Jehova n’otú o si meso ndị mmadụ. (Jọn 5:19) E nwere mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ma metere “ha ebere, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mat. 9:36) Ọ bụghị naanị na Jizọs meteere ndị ọzọ ebere, ọ gwọrọ ndị ọrịa, nyekwara ‘ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ, ndị e bokwara ibu dị arọ’ aka.​—Mat. 11:​28-30; 14:14.

Na-emere ụmụnna gị ebere, na-emesapụkwa aka ka Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 ruo na nke 14) *

12. Mee ihe atụ gosiri otú anyị nwere ike isi meere ụmụnna anyị ebere.

12 Tupu anyị enwee ike imere ụmụnna anyị ebere, anyị kwesịrị iche gbasara nsogbu ndị ha na ha na-alụ. Dị ka ihe atụ, ezigbo ọrịa nwere ike ịna-arịa otu nwanna nwaanyị. Ọ nakwanụghị ekwu ihe ọ bụla maka ya. Ma, obi nwere ike ịdị ya ezigbo ụtọ ma mmadụ nyere ya aka. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee otú o si egboro ezinụlọ ya mkpa ha?’ ‘Ọ̀ ga-achọ ka mmadụ bịa n’ụlọ ya siere ya nri ma ọ bụ hichaara ya ụlọ?’ O nwere ike ịbụ na a chụrụ otu nwanna n’ọrụ. Anyị nwere ike inye ya ego, o nwere ike anyị agaghị eme ka ọ mara na ọ bụ anyị nyere ya ya, ka o jiri ya na-egbo mkpa ya ruo mgbe o nwetara ọrụ ọzọ.

13-14. Olee otú anyị nwere ike isi na-emesapụ aka ka Jehova?

13 Jehova na-emesapụ aka. (Mat. 5:45) Anyị ekwesịghị ichere ka nwanna bịa rịọ anyị ka anyị nyere ya aka tupu anyị emetere ya ebere. Anyị nwere ike inyere ya aka tupu ya arịọ anyị otú ahụ Jehova na-eme. Ọ na-eme ka anyanwụ waara anyị kwa ụbọchị n’echeghịdị ka anyị rịọ ya. Anyanwụ ahụ na-abakwara onye ọ bụla uru, ọ bụghị naanị ndị na-efe ya. Otú a Jehova si na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa ọ̀ naghị egosi gị na ọ hụrụ anyị n’anya? Anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu n’ihi na ọ dị obiọma, na-emesapụkwa aka.

14 Ọtụtụ ụmụnna anyị taa na-eme ka Jehova. Ha na-emere ụmụnna ha ihe ọma. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2013, ajọ ifufe kpara mkpamkpa na Filipinz. Ifufe ahụ mebisịrị ụlọ ụmụnna anyị na ihe ndị ọzọ ha nwere. Ma, ụmụnna anyị n’ụwa niile gbakeriri ala nyere ha aka. Ọtụtụ ụmụnna anyị nyere onyinye ma ọ bụ nye aka n’ịrụzigharị ụlọ fọrọ obere ka o ruo narị asaa na iri ise n’ihe na-erughị otu afọ. N’oge ọrịa koronavaịrọs na-akpa ike, ụmụnna gbasiri mbọ ike nyere ụmụnna ha aka. Ọ bụrụ na anyị ana-agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka ozugbo, anyị na-egosi ha na anyị hụrụ ha n’anya.

15-16. Dị ka e kwuru na Luk 6:​36, olee otu ụzọ dị ezigbo mkpa anyị si eme ka Nna anyị nke eluigwe?

15 Jehova na-eme ebere, na-agbagharakwa mmehie. (Gụọ Luk 6:36.) Kwa ụbọchị, anyị na-ahụ otú Nna anyị nke eluigwe si emere anyị ebere. (Ọma 103:​10-14) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ezughị okè. Ma, Jizọs meere ha ebere, gbagharakwa ha. Ọ dịdị njikere iji onwe ya chụọ àjà ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị. (1 Jọn 2:​1, 2) Otú Jehova na Jizọs si emere anyị ebere ma na-agbaghara anyị ọ́ naghị eme ka ị bịarukwuo ha nso?

16 Anyị na-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrịkwuo ná mma ma ọ bụrụ na anyị ana-agbaghara ha “kpamkpam.” (Efe. 4:32) N’eziokwu, o nwere ike isiri anyị ezigbo ike mgbe ụfọdụ ịgbaghara ndị ọzọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike na-eme ya. Otu nwanna nwaanyị kwuru otú otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche si nyere ya aka. Isiokwu ahụ bụ “Na-agbagharanụ Ibe Unu Kpamkpam.” * Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Ịmụ isiokwu a enyerela m aka ịhụ otú ịgbaghara ndị ọzọ si abara m uru. Ọ kọwara na ịgbaghara ndị ọzọ apụtaghị na i kwetara na ihe ha mere dị mma ma ọ bụkwanụ na o wuteghị gị. Ma, ịgbaghara ndị ọzọ pụtara na ị gaghị eburu ha iwe n’obi. Ọ ga-emekwa ka obi ruo gị ala.” Ọ bụrụ na anyị ana-agbaghara ụmụnna anyị, anyị na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya, na-emekwa ka Nna anyị bụ́ Jehova.

GOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ NA I SO N’EZINỤLỌ JEHOVA

Ụmụnna anyị niile ma okenye ma nwata egosila na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) *

17. Dị ka e kwuru na Matiu 5:​16, olee otú anyị nwere ike isi na-eto Nna anyị nke eluigwe?

17 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị so n’ezinụlọ Jehova zuru ụwa ọnụ. Anyị chọkwara ka ọtụtụ ndị soro anyị na-efe Jehova. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-ewetara Jehova ma ọ bụ ndị ya aha ọjọọ. Anyị kwesịrị ịgba mbọ na-akpa àgwà otú ga-eme ka ndị mmadụ chọọ ịmụta gbasara Jehova ma fewe ya.​—Gụọ Matiu 5:16.

18. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịkata obi na-ekwusa ozi ọma?

18 Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịkwa anyị emo ma ọ bụdị na-akpagbu anyị n’ihi na anyị na-erubere Nna anyị nke eluigwe isi. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ụjọ ana-atụ anyị ịgwa ndị ọzọ ihe anyị kweere? Obi ga-esi anyị ike na Jehova na Ọkpara ya ga-enyere anyị aka. Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na ha ekwesịghị ichegbu onwe ha gbasara ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ otú ha ga-esi ekwu ya. N’ihi gịnị? Jizọs kwuru, sị: “A ga-agwa unu ihe unu ga-ekwu n’oge ahụ. N’ihi na ọ bụghị ununwa na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.”​—Mat. 10:​19, 20.

19. Nye ihe atụ otu onye katara obi kwusaa ozi ọma.

19 Legodị ihe mere otu nwanna aha ya bụ Robert. N’oge gara aga, mgbe ọ ka malitere ịmụ Baịbụl ọhụrụ ọ na-amabeghị ọtụtụ ihe na Baịbụl, a kpọpụrụ ya n’ụlọikpe dị na Saụt Afrịka, ya ana-akọwara ọkàikpe ihe mere ya agaghị aba amị. Ọ katara obi kọwaara ya na ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya. Obi dị ya ezigbo ụtọ na ọ nọ n’ezinụlọ Jehova. Ọkàikpe ahụ jụrụ ya, sị: “Ndị ole bụ́ ụmụnna gị?” Nwanna Robert atụghị anya ajụjụ ahụ ọ jụrụ ya. Ma, ihe gbatara ya n’obi ozugbo bụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke ụbọchị ahụ. O si na Matiu 12:50 bụ́ ebe sịrị: “Onye ọ bụla nke na-eme uche Nna m nke bi n’eluigwe, onye ahụ bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwaanyị na nne m.” N’agbanyeghị na Nwanna Robert ka malitere ịmụ Baịbụl ọhụrụ n’oge ahụ, mmụọ Jehova nyeere ya aka ịza ajụjụ ahụ nakwa ajụjụ ndị ọzọ ọ na-atụghị anya ha a jụrụ ya. Ọ ga-abụrịrị na obi dị Jehova ezigbo ụtọ maka ihe ahụ Nwanna Robert mere. Obi na-adịkwa Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi ma jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma n’oge ihe siri ike.

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? (Jọn 17:​11, 15)

20 Ka obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ na anyị nọ n’ezinụlọ onye ọ bụla hụrụ ibe ya n’anya. Anyị nwere Nna kacha mma onye ọ bụla nwere ike inwe nakwa ụmụnna hụrụ ibe ha n’anya. Anyị ekwesịghị iji ihe ndị a gwuo egwuregwu. Ekwensu na ndị òtù ya kpọrọ anyị asị na-achọ ime ka obi gharazie isi anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya, na-achọkwa ka anyị na ụmụnna anyị gharazie ịdị n’otu. Ma, Jizọs kpere ekpere rịọ Nna ya ka o chebe anyị, ka anyị dịrịkwa n’otu. (Gụọ Jọn 17:​11, 15.) Jehova na-aza ekpere ahụ. Dị ka Jizọs, ka anyị ghara inwe obi abụọ na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ga-anọgide na-akwado anyị. Ka anyị kpebisie ike na anyị na Jehova na ụmụnna anyị ga-anọgide na-adị ná mma.

ABỤ NKE 99 Anyị Bụ Ìgwè Ụmụnna

^ par. 5 Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịnọ n’ezinụlọ onye ọ bụla hụrụ ibe ya n’anya. Anyị niile chọrọ ịna-ahụkwu ibe anyị n’anya. Olee otú anyị nwere ike isi mee ya? Ọ bụ ịna-eṅomi Jehova n’otú o si na-emeso anyị nakwa ịna-eme ka Jizọs na ụmụnna anyị.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe Jehova zitere mmụọ ozi ka ọ gbaa Jizọs ume n’ogige Getsemeni.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: N’oge ọrịa koronavaịrọs, ọtụtụ ụmụnna nyere aka n’ịkwadebe nri na izigara ya ụmụnna ha.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-enyere nwa ya aka ide akwụkwọ ozi ga-agba otu nwanna nọ n’ụlọ mkpọrọ ume.