Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 37

Ị Ga-atụkwasịli Ụmụnna Gị Obi

Ị Ga-atụkwasịli Ụmụnna Gị Obi

“Ịhụnanya . . na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile.”​—1 KỌR. 13:​4, 7.

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere na ọ naghị eju anyị anya na ọtụtụ ndị chere na o nweghị onye ha ga-atụkwasịli obi?

 NDỊ mmadụ amaghị onye ha ga-atụkwasịli obi n’ụwa Ekwensu a. Ọtụtụ mgbe, ndị ahịa, ndị ọchịchị, na ndị isi okpukpe na-agharịpụ ha. Ọ na-eme ka ha gharazie ịtụkwasị ndị enyi ha, ndị agbata obi ha, na ndị ezinụlọ ha obi. O kwesịghị iju anyị anya. Baịbụl kwuru na n’oge ikpeazụ, ‘ndị mmadụ ga-abụ ndị na-agharịpụ ndị ọzọ, ndị na-ekwutọ ndị ọzọ, na ndị na-eme ndị enyi ha ihe ọjọọ.’ Ihe ọ pụtara bụ na ndị mmadụ ga na-akpa àgwà ka chi nke oge a, bụ́ onye a na-agaghị atụkwasịli obi.​—2 Tim. 3:1-4; 2 Kọr. 4:4.

2. (a) Olee ndị anyị ga-atụkwasịli obi kpamkpam? (b) Olee ihe ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche?

2 Ma, ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị ma na anyị ga-atụkwasịli Jehova obi kpamkpam. (Jere. 17:7, 8) Obi siri anyị ike na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ “gaghị ahapụ” ndị enyi ya. (Ọma 9:10) Anyị ga-atụkwasịlikwa Jizọs obi n’ihi na ọ nwụrụ maka anyị. (1 Pita 3:18) Ihe ndị anyị hụrụla egosikwala anyị na ihe Baịbụl kwuru na-aba uru. (2 Tim. 3:16, 17) Obi siri anyị ike na anyị ga-atụkwasịli Jehova, Jizọs, na Baịbụl obi. Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche ma hà ga-atụkwasịli ụmụnna nọ n’ọgbakọ obi. Ọ bụrụ na azịza ya bụ ee, gịnị mere anyị nwere ike iji tụkwasị ha obi?

ỤMỤNNA ANYỊ DỊ ANYỊ MKPA

N’ụwa niile, anyị nwere ụmụnna anyị ga-atụkwasịli obi, ndị hụkwara Jehova n’anya otú anyị hụrụ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)

3. Olee nnukwu ihe ọma meere anyị? (Mak 10:29, 30)

3 Jehova họọrọ anyị ka anyị soro n’ezinụlọ ya zuru ụwa ọnụ. Ihe a bụ nnukwu ihe ọma ga-eme ka anyị nweta ọtụtụ ngọzi. (Gụọ Mak 10:29, 30.) N’ụwa niile, anyị nwere ụmụnna ndị hụrụ Jehova n’anya otú anyịnwa hụrụ ya, na-agbalịkwa ike ha niile ime ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme. Asụsụ anyị, omenala anyị, nakwa ejiji anyị nwere ike ịdị iche, ma anyị hụrụ ha n’anya, ọ bụrụgodị mgbe mbụ anyị hụrụ ha. Obi na-adị anyị ụtọ, karịchaa ma anyị na ha nọkọọ na-efe Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya.​—Ọma 133:1.

4. Gịnị mere ụmụnna anyị ji dị anyị mkpa?

4 Ọ dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. Mgbe ụfọdụ, ha na-enyere anyị aka ebu ibu na-anyịgbu anyị. (Rom 15:1; Gal. 6:2) Ha na-agbakwa anyị ume ka anyị ghara ịkwụsị ife Jehova nakwa ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma. (1 Tesa. 5:11; Hib. 10:23-25) Chegodị otú ọ gaara adị anyị ma a sị na anyị anọghị n’ọgbakọ a na-enyere anyị aka ịlụso ndị iro anyị bụ́ Ekwensu na ụwa ọjọọ ya ọgụ. N’oge na-adịghị anya, Ekwensu na ndị ọ na-achị ga-alụso ndị Chineke ọgụ. Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ n’oge ahụ n’ihi na anyị nwere ụmụnna ga-enyere anyị aka.

5. Gịnị nwere ike ime ka o siere ụfọdụ ike ịtụkwasị ụmụnna ha obi?

5 Ma, ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịtụkwasị ụmụnna ha obi. O nwere ike ịbụ n’ihi na nwanna ha gwara ihe ha na-achọghị ka ndị ọzọ nụ kọọrọ ya ndị ọzọ ma ọ bụ na nwanna emezughị nkwa o kwere ha, ma ọ bụkwanụ na nwanna kwuru ma ọ bụ mee ihe gbawara ha obi. Ụdị ihe ndị a nwere ike ime ka o siere mmadụ ike ịtụkwasị ndị ọzọ obi. Ma, gịnị nwere ike inyere anyị aka ịtụkwasị ụmụnna anyị obi?

ỊHỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊTỤKWASỊ HA OBI

6. Olee otú ịhụ ụmụnna anyị n’anya ga-esi enyere anyị aka ịtụkwasị ha obi? (1 Ndị Kọrịnt 13:4-8)

6 Ọ bụ ịhụnanya na-eme ka anyị tụkwasị mmadụ obi. Ndị Kọrịnt nke Mbụ isi 13 kọwara ọtụtụ ihe gbasara ịhụnanya ga-enyere anyị aka ịtụkwasị ndị ọzọ obi, ma ndị mewara anyị obi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8.) Dị ka ihe atụ, amaokwu nke 4 sịrị na “ịhụnanya na-enwe ndidi, dịrịkwa obiọma.” Jehova na-enwere anyị ndidi ọ bụrụgodị na anyị emehie. N’ihi ya, anyị kwesịrị inwere ụmụnna anyị ndidi ma ha kwuo ma ọ bụ mee ihe were anyị iwe. Amaokwu nke 5 kwuru banyere ịhụnanya, sị: “A naghị akpasu ya iwe ngwa ngwa. Ọ naghị agụkọ ihe ọjọọ e mere ya.” Anyị ekwesịghị ‘ịna-agụkọ ihe ọjọọ e mere anyị,’ ya bụ, ịna-echeta ihe ụmụnna anyị mere anyị ka anyị jiri ya kwuo okwu echi. Ekliziastis 7:9 kwuru na anyị ekwesịghị ikwe ka ‘iwe na-ewe anyị ọsọ ọsọ.’ Ọ ka mma ime ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 4:26. Ebe ahụ sịrị: “Unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.”

7. Olee otú ihe e dere na Matiu 7:1-5 si enyere anyị aka ịtụkwasị ndị ọzọ obi?

7 Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịtụkwasị ụmụnna anyị obi bụ ịna-ele ha anya otú Jehova si ele ha. Chineke hụrụ ha n’anya. Ọ naghị agụkọ mmehie ha. Anyị ekwesịghịkwa ịna-agụkọ mmehie ha. (Ọma 130:3) Kama ịna-elekwasị anya n’ihe ndị ha na-anaghị emeta, anyị kwesịrị ịgbalị na-ahụ àgwà ọma ndị ha nwere, na-echekwa gbasara ihe ọma ndị ha ga-emeli. (Gụọ Matiu 7:1-5.) Anyị na-ekweta na ha bu ihe ọma n’obi eme ihe ọ bụla ha na-eme, ọ bụghị na ha chọrọ imegide anyị n’ihi na ịhụnanya “na-ekwere ihe niile.” (1 Kọr. 13:7) Ihe ebe a kwuru apụtaghị na Jehova chọrọ ka anyị tụkwasị ndị ọzọ obi n’enweghị ihe kpatara ya. Kama, ọ chọrọ ka anyị tụkwasị ha obi n’ihi na ha mere ihe gosiri na a ga-atụkwasịli ha obi. *

8. Olee otú i nwere ike isi mụta ịtụkwasị ụmụnna gị obi?

8 Ị manụ na ọ bụ àgwà mmadụ na-eme ka a na-akwanyere ya ùgwù. Otú ahụ ka ịtụkwasị mmadụ obi dị. Ọ na-ewekwa oge. Olee otú ị ga-esi mụta ịtụkwasị ụmụnna gị obi? Mata ha nke ọma. Gị na ha na-ekwurịta okwu n’ọmụmụ ihe. Hazie ka gị na ha rụọ n’ozi ọma. Na-enwere ha ndidi. Na-enye ha ohere igosi na a ga-atụkwasịli ha obi. Ná mmalite, o nwere ike ị gaghị akọrọ onye ị matara ọhụrụ ihe ụfọdụ gbasara onwe gị. Ma, ka gị na ya na-adịkwu ná mma, obi nwere ike iru gị ala ịkọrọ ya otú obi dị gị. (Luk 16:10) Ma, gịnị ka ị ga-eme ma nwanna ị kọọrọ ihe ụfọdụ kọọrọ ya onye ọzọ? Ejila ọkụ ọkụ sị na nke gị na ya agaala. Kama, nweere ya ndidi. Ekwekwala ka ihe ụmụnna ụfọdụ mere mee ka ị gharazie ịtụkwasị ụmụnna obi. Ka anyị lee otú ụfọdụ ndị ohu Jehova si mee ya. Ha ka tụkwasịrị ndị ọzọ obi n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị gharịpụrụ ha.

MỤTA IHE N’AKA NDỊ NA-AKWỤSỊGHỊ ỊTỤKWASỊ NDỊ ỌZỌ OBI

N’agbanyeghị ihe Ịlaị kwuru, Hana akwụsịghị ịtụkwasị nhazi Jehova mere obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. (a) Olee otú Hana si ka tụkwasị nhazi Jehova mere obi n’agbanyeghị ihe na-adịghị mma Ịlaị na ụmụ ya na-eme? (b) Gịnị ka akụkọ Hana na-akụziri gị gbasara ịtụkwasị nhazi Jehova mere obi? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

9 È nweela mgbe okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi gharịpụrụ gị? Ọ bụrụ na e nweela, ịmụ gbasara ihe Hana mere nwere ike inyere gị aka. N’oge ahụ, ọ bụ nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Ịlaị na-eduzi ofufe Jehova n’Izrel. Ma, ezinụlọ ya anaghị eme nke ọma. Ụmụ ya abụọ bụ́kwa ndị nchụàjà na-eme omume rụrụ arụ na omume na-eme ihere. Ma, e nweghị ezigbo mba nna ha baara ha. Jehova akwụsịghị Ịlaị ịbụ nnukwu onye nchụàjà ozugbo. Ma, Hana ka tụkwasịrị nhazi Jehova mere obi. Ọ kwụsịghị ife Jehova n’ụlọikwuu ahụ n’oge ahụ Ịlaị ka bụ nnukwu onye nchụàjà. Mgbe Ịlaị hụrụ ka Hana na-ekpe ekpere ná mwute, o weere ya na ọ ṅụrụ mmanya. Ọ malitere katọwa Hana n’ebughị ụzọ chọpụta ihe merenụ. (1 Sam. 1:12-16) N’agbanyeghị ya, Hana kwere nkwa na ọ mụta nwa nwoke, ọ ga-akpọta ya ka o jewe ozi n’ụlọikwuu ahụ, Ịlaị ana-elekọta ya. (1 Sam. 1:11) Ò nwere ihe e kwesịrị ime gbasara ihe ọjọọ ahụ ụmụ Ịlaị na-eme? Ee. Jehova mekwaranụ ihe mgbe oge ya ruru. (1 Sam. 4:17) Ma, Chineke gọziri Hana, mee ka ọ mụta nwa nwoke.—1 Sam. 1:17-20.

10. Olee otú Eze Devid si ka tụkwasị ndị ọzọ obi n’agbanyeghị na e nwere ndị gbara ya mgba okpuru?

10 È nwetụla mgbe enyi gị gbara gị mgba okpuru? Ọ bụrụ na e nweela, legodị ihe mere Eze Devid. E nwere enyi ya aha ya bụ Ahitofel. Ma, mgbe Absalọm nwa Devid chọrọ ịnaghara nna ya eze, Ahitofel sonyeere Absalọm. Ọ ga-abụrịrị na ọ gbawara Devid obi na nwa ya na onye ọ kpọrọ ezigbo enyi ya gbara ya mgba okpuru. Ma, ihe ahụ emeghị ka Devid kwụsị ịtụkwasị ndị ọzọ obi. Ọ kwụsịghị ịtụkwasị ezigbo enyi ya ọzọ bụ́ Hushaị obi ebe ọ bụ na o kweghị esonyere ndị iro ya. E nwere ezigbo ihe mere Devid ji tụkwasị Hushaị obi. Hushaị gosiri na ọ bụ ezigbo enyi ya. O medịrị ihe gaara ata isi ya n’ihi Devid.​—2 Sam. 17:1-16.

11. Olee otú otu n’ime ndị ohu Nebal si gosi na ọ tụkwasịrị Abigel obi?

11 Legodị ihe otu n’ime ndị ohu Nebal mere. Devid na ndị ya na ha so ji obiọma chebe ndị ohu otu nwoke Izrel aha ya bụ Nebal. Devid mechara gwa nwoke ahụ bara ọgaranya ka o nye ha nri, ole ọ bụla ọ ga-enyeli ha. Ma Nebal ekweghị. Ezigbo iwe were Devid, ya ekpebie na ọ ga-egbu nwoke ọ bụla nọ n’ụlọ Nebal. Otu ohu Nebal kọọrọ Abigel nwunye Nebal gbasara ya. Ebe ọ bụ onye ezinụlọ ahụ, ọ ma na Abigel ga-azọpụtali ha. Kama ịgbafu, ọ tụkwasịrị Abigel obi na ọ ga-eme ka ọdachi ahụ ghara ịdakwasị ha. Ihe mere o ji tụkwasị Abigel obi otú ahụ bụ maka na ọ ma na ọ bụ nwaanyị nwere ezigbo uche. Ihe mechara mee gosiri na e nwere ezigbo ihe mere o ji tụkwasị nwaanyị ahụ obi. Abigel ji obi ike rịọ Devid ka ọ ghara ime ihe ahụ dị ya n’obi. (1 Sam. 25:2-35) Abigel tụkwasịrị Devid obi na ọ ga-eme ihe dị mma.

12. Olee otú Jizọs si gosi na ọ tụkwasịrị ndị na-eso ụzọ ya obi n’agbanyeghị ihe ndị ha na-emejọ?

12 Jizọs tụkwasịrị ndị na-eso ụzọ ya obi n’agbanyeghị ihe ndị ha na-emejọ. (Jọn 15:15, 16) Mgbe Jems na Jọn rịọrọ Jizọs ka o nye ha ọkwá pụrụ iche n’Alaeze Chineke, Jizọs asịghị na ọ bụ ya mere ha ji bịa fewe Jehova ma ọ bụ jiri maka ya sị na ha abụghịzi ndịozi ya. (Mak 10:35-40) Mgbe e mechakwara, ndị na-eso ụzọ ya niile gbahapụrụ ya n’ụbọchị ahụ a nwụchiri ya. (Mat. 26:56) Ma, o meghị ka Jizọs kwụsị ịtụkwasị ha obi. Ọ ma na ha ezughị okè. Ma, “ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.” (Jọn 13:1) Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, o nyere ndịozi ya iri na otu rubeere ya isi ọrụ dị ezigbo mkpa, ya bụ, ka ha na-elekọta ọrụ ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya nakwa ilekọta atụrụ ya ọ hụrụ n’anya. (Mat. 28:19, 20; Jọn 21:15-17) Obi ahụ ọ tụkwasịrị ụmụ nwoke ahụ na-ezughị okè efughị ọhịa. Ha niile ji obi ha niile rụọ ọrụ ahụ ruo mgbe ha nwụrụ. N’eziokwu, ihe Hana, Devid, ohu Nebal, Abigel, na Jizọs mere gosiri na anyị ga-atụkwasịli ụmụ mmadụ na-ezughị okè obi.

MỤTA ỊTỤKWASỊ NDỊ MEWARA GỊ OBI OBI

13. Olee ihe nwere ike ime ka o siere anyị ike ịtụkwasị ndị ọzọ obi?

13 È nweela nwanna ị gwara ihe ị na-achọghị ka onye ọzọ mata, gị emechaa chọpụta na ọ gwara ya onye ọzọ? Ụdị ihe a na-agbawa obi. O nwere otu nwanna nwaanyị gwara otu okenye nsogbu ya, buru n’obi na ọ gaghị agwa ya onye ọzọ. N’echi ya, nwunye okenye ahụ kpọrọ ya ka ọ gbaa ya ume. O doro anya na ọ nụla ihe ahụ ọ kọọrọ okenye ahụ. Ihe ahụ mere ka ọ na-esiziri nwanna nwaanyị ahụ ike ịtụkwasị okenye ahụ obi. Ma, ọ dị mma na nwanna nwaanyị ahụ gara ka e nyere ya aka. Ọ gakwuuru okenye ọzọ, ya enyere ya aka ka ọ malitekwa ịtụkwasị ndị okenye obi.

14. Gịnị nyeere otu nwanna aka ịmalitekwa tụkwasịwa ndị ọzọ obi?

14 E nwere otu nwanna na-ewere okenye abụọ iwe kemgbe ọtụtụ afọ, ya emee ka o chee na ya agaghị atụkwasịli ha obi. Ma, o chere gbasara ihe gbara ọkpụrụkpụ otu nwanna ọ na-akwanyere ezigbo ùgwù kwuru. Nwanna ahụ sịrị: “Ọ bụ Ekwensu bụ onye iro anyị, ọ bụghị ụmụnna anyị.” Nwanna ahụ chebaara ihe ahụ echiche nke ọma, kpee ekpere gbasara ya, ya emeekwa ka ya na ndị okenye abụọ ahụ kpezie.

15. Gịnị mere ibido tụkwasịwakwa onye gharịpụrụ anyị obi nwere ike iji wee oge? Nye ihe atụ.

15 È nweela ọrụ ị na-arụbu n’ọgbakọ a napụrụ gị? Ụdị ihe ahụ na-ewuteru mmadụ n’ọkpụkpụ. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Grete. Ya na mama ya bụ Ndịàmà Jehova mgbe ndị Nazi chịrị Jamani tupu Agha Ụwa nke Abụọ. A machiri ozi ọma anyị iwu n’oge ahụ. E nyere Nwanna Nwaanyị Grete ọrụ iji ígwè taịpraịta na-edepụtara ụmụnna Ụlọ Nche. Ma, mgbe ụmụnna chọpụtara na papa ya achọghị iji ntị anụ gbasara eziokwu Baịbụl, ha napụrụ ya ọrụ ahụ n’ihi na ụjọ na-atụ ha na papa ya ga-agwa ndị mmegide ihe gbasara ọgbakọ. Ọ bụghị naanị ya bụ ihe nwanna nwaanyị a diri. N’oge niile a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, ụmụnna ndị ahụ ekweghịzi enye Nwanna Nwaanyị Grete na mama ya magazin, ha anaghịkwa atụpụrụ ha ọnụ ma ha hụ ha n’ụzọ. Otú ihe ahụ si gbawaa nwanna nwaanyị ahụ obi abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ọ sịrị na o were ya ọtụtụ afọ tupu ya agbaghara ha ma tụkwasịwakwa ha obi. Ma ka oge na-aga, ọ chọpụtara na ọ ga-abụ na Jehova agbagharala ha, yanwa kwesịkwara ịgbaghara ha. *

“Ọ bụ Ekwensu bụ onye iro anyị, ọ bụghị ụmụnna anyị”

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgba mbọ ka anyị na-atụkwasị ụmụnna anyị obi?

16 Ọ bụrụ na ụdị ihe a emetụla gị, gbalịa mụta ịtụkwasịwakwa onye ahụ mejọrọ gị obi. O nwere ike iwe gị oge, ma ọ ga-abara gị ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, i rie ihe nyere gị nsogbu n’afọ, ị ga na-akpacharazi anya n’ihe ị na-eri. Ma, ọ gaghị eme ka ị kwụsị iri nri. Otú ahụkwa ka ịtụkwasị ụmụnna anyị obi dị. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọjọọ mmadụ mere anyị mee ka anyị gharazie ịna-atụkwasị ụmụnna anyị niile obi. Anyị ma na ha ezughị okè. Ọ bụrụ na anyị amụta ịtụkwasịwakwa nwanna mejọrọ anyị obi, obi ga na-adịkwu anyị ụtọ. Ọ ga-emekwa ka anyị mata ihe anyị ga-eme ka ụmụnna anyị na-atụkwasịkwu ibe ha obi.

17. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị tụkwasị ụmụnna anyị obi, gịnịkwa ka anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu na-eso nke a?

17 Ọtụtụ ndị anaghịzi atụkwasị ibe ha obi n’ụwa Ekwensu a. Ma, anyị ga-atụkwasịli ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ obi n’ihi na ha hụrụ anyị n’anya, anyịnwa ahụkwa ha n’anya. Ọ bụ ya na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ugbu a, dịrịkwa n’otu. Ọ ga-abakwara anyị uru mgbe ihe ga-esi ezigbo ike n’ọdịnihu. Ọ bụrụkwanụ na e nweela onye ị tụkwasịrị obi, ya emewaa gị obi? Gbalịa lee ihe ahụ merenụ anya otú Jehova si ele ya, mee ihe Baịbụl kwuru, mụta iji obi gị niile hụ ụmụnna gị n’anya, mụtakwa ihe n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Anyị ga-akwụsịli iwe ahụ a kpasuru anyị ma mụta ịtụkwasịwakwa ndị ọzọ obi. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe ọtụtụ ndị enyi ‘hụrụ anyị n’anya karịa nwanne anyị.’ (Ilu 18:24) Ma, anyị tụkwasị mmadụ obi, onye ahụ kwesịkwara ịtụkwasị anyị obi. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-ekwu otú anyị ga-esi gosi na anyị bụ ndị ụmụnna anyị ga-atụkwasịli obi.

ABỤ NKE 99 Anyị Bụ Ìgwè Ụmụnna

^ Anyị kwesịrị ịtụkwasị ụmụnna anyị obi. Ime ya anaghị adị mfe mgbe niile n’ihi na ha na-akpasu anyị iwe mgbe ụfọdụ. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú ime ihe Baịbụl kwuru na iche gbasara ihe mere n’oge ochie nwere ike isi nyere anyị aka ịtụkwasị ụmụnna anyị obi ma ọ bụ ịmalitekwa tụkwasịwa ha obi ma ọ bụrụ na ha mere ihe wutere anyị.

^ Baịbụl kwuru na e nwere ike inwe ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị na-ekwesịghị ịtụkwasị obi. (Jud 4) Ọ bụ eziokwu na ọ naghị emekarị, ma mgbe ụfọdụ, ndị na-abụghị ezigbo ụmụnna nwere ike ịna-ekwu “ihe ndị na-abụghị eziokwu” iji ghọgbuo ndị ọzọ. (Ọrụ 20:30) Anyị anaghị atụkwasị ụdị ndị ahụ obi ma ọ bụ na-ege ha ntị.

^ Ị chọọ ịgụkwu akụkọ Nwanna Nwaanyị Grete, gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova (nke Bekee) nke afọ 1974, peeji nke 129 ruo na nke 131.