Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Ndụ

Ịmụ Gbasara Jehova na Ịkuziri Ya Ndị Ọzọ Na-atọ M Ụtọ

Ịmụ Gbasara Jehova na Ịkuziri Ya Ndị Ọzọ Na-atọ M Ụtọ

Mgbe m na-etolite n’obodo Istịn, Pensụlvenịa, dị n’Amerịka, obi m niile dị n’ịga mahadum n’ihi na m chọsiri ike ịbụ onye a ma ama. Ịgụ akwụkwọ na-atọgbu m atọgbu. Emekwara m nke ọma ná mgbakọ na mwepụ nakwa na sayensị. N’afọ 1956, otu òtù na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ nyere m dọla iri abụọ na ise n’ihi na ọ bụ m bụ nwa akwụkwọ bụ́ onye isi ojii kacha mee nke ọma. M mechara gbanwee ihe m chọrọ iji ndụ m eme. Maka gịnị?

OTÚ M SI MỤTA GBASARA JEHOVA

Obere oge afọ 1940 gachara, mama m na papa m na Ndịamà Jehova malịtere ịmụ Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na ha mechara kwụsị, ma mama m akwụsịghị ịnata ha Teta! na Ụlọ Nche. N’afọ 1950, e nwere mgbakọ mba niile na Niu Yọk Siti, ezinụlọ anyị gakwara ya.

Obere oge mgbakọ ahụ gachara, Nwanna Lawrence Jeffries malitere ịbịa n’ụlọ anyị. Ọ gbara mbọ inyere m aka ịmụta eziokwu. Ná mmalite, ekwetaghị m ihe o kwuru mere Ndịamà Jehova anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’agha. M gwara ya na ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ n’Amerịka ajụ ịga agha, na ndị iro nwere ike ịbata n’obodo ahụ lụso ha agha ma chịwazie ha. Nwanna Jeffries jizi nwayọọ jụọ m, sị̇: “Ka e were ya na mmadụ niile nọ n’Amerika na-efe naanị Jehova. Gịnị ka i chere Jehova ga-eme ma ọ bụrụ na ndị iro ha abịa ịlụso ha ọgụ?” Ihe o kwuru gbasara ihe a na ihe ndị ọzọ nyeere m aka ịmata na ihe m na-eche ezighị ezi. O mere ka m chọkwuo ịmụta eziokwu Baịbụl.

Mgbe e mere m baptizim

M ji ọtụtụ awa gụọ Ụlọ Nche na Teta! ndị ochie mama m dowere n’ebe ọ na-edowe akwụkwọ. Ka oge na-aga, m matara na ihe m na-amụta bụ eziokwu. N’ihi ya, ekwetara m ka Nwanna Jeffries mụwara m Baịbụl. M bidokwara ịga ọmụmụ ihe niile. Ihe ndị m na-amụta tọrọ m ezigbo ụtọ, mụ aghọzie onye nkwusa. Ihe m chọburu iji ndụ m eme gbanwere mgbe m ghọtara na “oké ụbọchị Jehova dị nso.” (Zef. 1:14) Achọghịzi m ịga mahadum. Ihe m chọziri bụ ịna-enyere ndị ọzọ aka ka ha mụta eziokwu Baịbụl.

M gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị n’abalị iri na atọ n’ọnwa Jun, afọ 1956. Mgbe abalị atọ gachara, m mere baptizim n’otu mgbakọ sekit anyị gara. Amaghị m n’oge ahụ na ọtụtụ ihe ọma ga-emere m maka iji ndụ m na-amụ gbasara Jehova ma na-akụziri ya ndị ọzọ.

ỊMỤTA IHE NA ỊKỤZIRI NDỊ ỌZỌ IHE MGBE M BỤ ỌSỤ ỤZỌ

Ọnwa isii m mechara baptizim, amalitere m ịsụ ụzọ oge niile. Ozi Alaeze (Bekee) nke Disemba afọ 1956, peeji nke 3, nwere isiokwu bụ́ “Ị̀ Ga-ejeli Ozi n’Ebe Mkpa Dị Ukwuu?” Eso m ná ndị a jụrụ ajụjụ a. Achọrọ m ịga nye aka n’ebe e nwere naanị mmadụ ole na ole na-ekwusa ozi ọma.​—Mat. 24:14.

Akwagara m n’obodo Ejfild, dị na Saụt Karolaịna. Ọ bụ naanị ndị nkwusa anọ nọ n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ. Mgbe m rutere, anyị dịzi ndị nkwusa ise. Ebe anyị na-anọ amụ ihe bụ n’ọnụ ụlọ mbụ ma a batawa n’ụlọ otu nwanna. N’ọnwa ọ bụla, m na-eji otu narị awa ekwusa ozi ọma. Ịhazi ozi ọma na ime ihe omume n’ọgbakọ mere ka m jiri ọrụ n’aka mgbe niile. Obi dị m ụtọ na ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ mere ka m na-amụtakwu gbasara Jehova.

Otu nwaanyị m na-amụrụ Baịbụl nwere ebe a na-edewe ozu n’obodo a na-akpọ Jọnstịn. Obodo ahụ adịghị anya. Nwaanyị ahụ ji obiọma nye m ọrụ m ga na-arụ ụbọchị ụfọdụ n’izu. O kwekwara ka anyị jiri obere ụlọ ya mere Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Nwanna Jolly Jeffries, bụ́ nwa nwanna ahụ mụụrụ m ihe, sikwa Bruklin dị na Niu Yọk kwafeta n’obodo Ejfild, mụ na ya esoro na-asụ ụzọ. Ebe anyị bi bụ n’obere kọntena otu nwanna nyere anyị.

Ego a na-akwụ ndị ọrụ na Saụt Karolaịna dị obere. A na-akwụ anyị dọla abụọ ma ọ bụ atọ maka ọrụ ụbọchị. E nwere otu ụbọchị m ji obere ego ikpeazụ m nwere gaa zụrụ ihe m ga-eji esi nri. Mgbe m pụtara, otu nwoke bịara jụọ m, sị: “Ị̀ chọrọ ọrụ ị ga-arụ? M ga-akwụ gị otu dọla n’otu awa.” O nyere m ọrụ were ụbọchị atọ, nke bụ́ ịzacha na ikpocha ebe a na-arụ ụlọ. Ọ bịara doo m anya na Jehova na-enyere m aka ka m nwee ike ịnọ n’obodo Ejfild. Ma, m mechara gaa mgbakọ mba niile e nwere na Niu Yọk Siti n’afọ 1958.

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

N’ụbọchị nke abụọ ná mgbakọ ahụ, otu ihe pụrụ iche mere. M matara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ruby Wadlington. Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile n’obodo Galatin, dị na Tenesii. Ebe anyị abụọ chọrọ ịbụ ndị ozi ala ọzọ, anyị gara nnọkọ e nwere ná mgbakọ ahụ maka ndị chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mụ na ya mechara bido iderịta akwụkwọ ozi. A kpọrọ m ka m bịa kwuo okwu ihu ọha na Galatin. M jizi ohere ahụ gwa Ruby na m chọrọ ịlụ ya. M gafere n’ọgbakọ Ruby hà, anyị alụọ n’afọ 1959.

ỊMỤTA IHE NA ỊKỤZIRI NDỊ ỌZỌ IHE N’ỌGBAKỌ

Mgbe m dị afọ iri abụọ na atọ, a họpụtara m ka m bụrụ ohu ọgbakọ (nke a na-akpọzi onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ) n’obodo Galatin. Ọ bụ anyị bụ ọgbakọ mbụ Nwanna Charles Thompson letara mgbe ọ ghọrọ onye nlekọta sekit. N’agbanyeghị na ọ ma ihe nke ọma, ọ jụrụ m ihe m chere banyere ihe ụmụnna chọrọ nakwa ihe ndị nlekọta sekit ndị ọzọ mere gbasara ya. Ihe ahụ o mere kụziiri m na ọ dị mma ijụ ajụjụ na ịghọta ihe niile merenụ tupu mụ ekpebiwe ihe m ga-eme.

N’ọnwa Mee afọ 1964, a kpọrọ m ka m gaa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere na Saụt Lansịn, dị na Niu Yọk. O were otu ọnwa. Ụmụnna ndị kụziiri anyị ihe n’ụlọ akwụkwọ ahụ mere ka m chọọ ịmụtakwu gbasara Jehova nakwa ka mụ na ya dịkwuo ná mma.

ỊMỤTA IHE NA ỊKỤZIRI NDỊ ỌZỌ IHE N’ỌRỤ SEKIT NA DISTRIKTI

Na Jenụwarị afọ 1965, alaka ụlọ ọrụ gwara m ka m bụrụ onye nlekọta sekit nakwa ka mụ na nwunye m na-eleta ọgbakọ dị iche iche. Sekit mbụ anyị letara buru ibu. Ọ malitere na Nọksvil dị na Tenesii, fọkwa obere ka o ruo Richmọnd dị na Vejinia. Ọgbakọ ndị dị na Nọt Karolaịna, Kentọki, na West Vejinia sokwa na ya. Ọ bụ naanị ọgbakọ ndị isi ojii ka anyị na-eleta n’ihi na n’oge ahụ, iwu ndị ọchịchị n’ebe ndịda Amerịka ekweghị ka ndị ọcha na ndị isi ojii na-anọkọ. Ụmụnna ndị ahụ dara ogbenye. Anyị mụtakwara ịna-enyetụ ndị ihe na-esiri ike ihe ndị anyị nwere. Otu nwanna bụrụla onye nlekọta sekit ọtụtụ afọ kụziiri m otu ihe dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị: “Ị gaa n’ọgbakọ, bụrụ nwanna ha. Agala na-eme ka ị̀ bụ nna ha ukwu. Ị ga-enwe ike inyere ha aka naanị ma ọ bụrụ na ha weere gị ka nwanna ha.”

Mgbe anyị gara ileta otu obere ọgbakọ, nwunye m malitere ịmụrụ otu nwaanyị nwere nwa nwaanyị dị otu afọ Baịbụl. Mgbe a na-enweghị onye nọ n’ọgbakọ ahụ nwere ike ịmụrụ nwaanyị ahụ ihe, nwunye m jizi akwụkwọ ozi na-amụrụ ya ihe. N’oge ọzọ anyị gara ileta ọgbakọ ahụ, nwaanyị ahụ na-abịazi ọmụmụ ihe niile. Mgbe e zitere ụmụnna nwaanyị abụọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ọgbakọ ahụ, ha mụwaara nwaanyị ahụ ihe. N’oge na-adịghị anya, o mere baptizim. N’afọ 1995, ka ihe dị ka afọ iri atọ gachara, otu nwanna nwaanyị bịara kelee nwunye m na Betel dị na Patasịn. Ọ bụ nwa nwaanyị ahụ nwunye m mụụrụ ihe. Nwa ya nwaanyị ahụ na di ya so n’ụmụ akwụkwọ nọ na klas nke otu narị n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied.

Sekit nke abụọ anyị letara dị na Flọrịda. Ụgbọala dị anyị mkpa n’oge ahụ. N’ihi ya, anyị zụtara otu ụgbọala ọnụ ahịa ya dị nnọọ mma. Ma, n’izu nke mbụ ya, otu ihe dị na njin ya gbajiri. Anyị enweghịzi ego anyị ga-eji arụzi ya. M kpọrọ otu nwanna m chere nwere ike inyere anyị aka. Nwanna ahụ gwara otu n’ime ụmụ ọrụ ya ka ọ rụzie ụgbọala ahụ. Ọ naghịkwa anyị ego ọ bụla. Ọ sịrị anyị: “E nweghị ụgwọ unu ji m.” O nyedịrị anyị ego. Ihe a na-egosi otú Jehova si elekọta ndị na-ejere ya ozi. O mere ka anyị cheta na anyịnwa kwesịkwara ịna-emesapụrụ ndị ọzọ aka.

Mgbe ọ bụla anyị na-eleta ọgbakọ, anyị na-ebi n’ụlọ ụmụnna anyị. N’ihi ya, anyị metara ọtụtụ ezigbo ndị enyi. Otu ụbọchị, ahapụrụ m akụkọ ozi m na-ede gbasara ọgbakọ anyị na-eleta na taịpraịta pụwa. Mgbe m lọtara ná mgbede, m chọpụtara na obere nwa dị afọ atọ, bụ́ nwa nwanna ahụ anyị nọ n’ụlọ ya, emebiela ihe ahụ m na-ede. Eji m ya chịa ya ọchị ruo ọtụtụ afọ.

N’afọ 1971, alaka ụlọ ọrụ ziteere m akwụkwọ ozi gwa m ka m bụrụ onye nlekọta distrikti na Niu Yọk Siti. O juru anyị anya. Mgbe anyị kwagara ebe ahụ, adị m naanị afọ iri atọ na anọ. Ọ bụ m bụ onye nlekọta distrikti mbụ bụ́ onye isi ojii bịara ileta ha. Ụmụnna nọ ebe ahụ ji ezigbo obi ụtọ nabata anyị.

Ebe m bụ onye nlekọta distrikti, ịkụzi gbasara Jehova ná mgbakọ sekit ná ngwụcha izu ọ bụla na-atọ m ụtọ. Ọtụtụ ndị nlekọta sekit nọ ebe ahụ bu m ụzọ rụwa ọrụ a. Ọ bụ otu n’ime ha kwuru okwu baptizim n’ụbọchị e mere m baptizim. Nwanna nke ọzọ bụ́ Theodore Jaracz mechara soro n’Òtù Na-achị Isi. E nwekwara ọtụtụ ụmụnna ma nke a na-akọ na-eje ozi na Betel dị na Bruklin. Obi dị m ezigbo ụtọ na ndị nlekọta sekit ndị ahụ na ụmụnna ndị ahụ na-eje ozi na Betel mere ka ahụ́ ruo m ala. M ji anya m hụ n’eziokwu na ụmunna ndị a hụrụ atụrụ Chineke n’anya, tụkwasịkwa Okwu Chineke obi ma jiri obi ha niile na-akwado nzukọ Jehova. Otú ha si dịrị umeala n’obi mere ka ọ dịrị m mfe ịrụ ọrụ onye nlekọta distrikti.

ALAGHACHIRI M N’ỌRỤ SEKIT

N’afọ 1974, Òtù Na-achị Isi họpụtara ndị nlekọta sekit ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị nlekọta distrikti, mụnwa abụrụkwa onye nlekọta sekit, ma na nke ugbu a, na Saụt Karolaịna. N’oge ahụ, ndị ọcha na ndị isi ojii nweziri ike ịnọkọta ọnụ. Ihe a mere ụmụnna obi ụtọ.

Ná ngwụcha afọ 1976, e zigara m n’otu sekit dị na Jọjịa n’agbata Atlanta na Kolọmbọs. M chetara nke ọma mgbe m kwuru okwu olili ụmụaka ndị isi ojii ise bụ́ ndị ọkụ regburu mgbe ndị arụrụala gbara ụlọ ha ọkụ. A kpọgara nne ha ụlọ ọgwụ n’ihi ahụ́ o merụrụ. Ọtụtụ ụmụnna anyị, ma ndị ọcha ma ndị isi ojii, bịara n’ụlọ ọgwụ ahụ na-akasi nne na nna ahụ obi. Ahụrụ m na ụmụnna ndị ahụ hụrụ ibe ha n’anya nke ukwuu. Ụdị obiọma a na-enyere ndị ohu Chineke aka idi nsogbu ndị tara akpụ.

ỊMỤTA IHE NA ỊKỤZIRI NDỊ ỌZỌ IHE NA BETEL

N’afọ 1977, a kpọrọ anyị ka anyị bịa nye aka ọnwa ole na ole n’otu ọrụ a na-arụ na Betel dị na Bruklin. Mgbe ọrụ ahụ fọrọ obere ka ọ gwụ, mmadụ abụọ so n’Òtù Na-achị Isi kpọrọ m ma jụọ m ma mụ na nwunye m ànyị ga-achọ ịnọrọwa na Betel na-eje ozi. Anyị kwetara.

Arụrụ m ọrụ na Ngalaba Ije Ozi ruo afọ iri abụọ na anọ. Ụmụnna ndị na-arụ na ngalaba a na-enye aka aza ajụjụ ndị tara akpụ. Kemgbe ọtụtụ afọ, Òtù Na-achị Isi na-enye ntụziaka ndị dabara n’ihe Baịbụl kwuru. Ntụziaka ndị a na-enyere Ngalaba Ije Ozi aka ịza ajụjụ ndị ahụ. A na-ejikwa ntụziaka ndị ahụ azụ ndị nlekọta sekit, ndị okenye, na ndị ọsụ ụzọ. Ihe ndị ahụ e ji azụ ha enyerela ọtụtụ ndị aka ịbụ Ndị Kraịst na-emekwu nke ọma. O meekwala ka ọgbakọ Jehova bụrụ a kwaa a kwụrụ.

Malite n’afọ 1995 ruo n’afọ 2018, m gara leta ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ n’ihi na abụ m onye na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị n’oge ahụ, nke a na-akpọbu onye nlekọta zoonu. Mụ na ndị so na Kọmitii Alaka dị iche iche, ndị na-eje ozi na Betel, na ndị ozi ala ọzọ na-enwe nnọkọ, mụ agbaa ha ume, nyekwara ha aka n’ihe ọ bụla siiri ha ike. Ụmụnna ndị ahụ na-agbakwa mụ na nwunye m ume ma ha kọọrọ anyị ihe ndị merela n’ozi ha. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị gara Rụwanda n’afọ 2000, o metụrụ anyị n’ahụ́ mgbe anyị nụrụ ihe ụmụnna anyị na ndị ezinụlọ Betel hụrụ mgbe a chọrọ igbukpọ otu agbụrụ n’afọ 1994. Ndị mmadụ nwụnahụrụ ọtụtụ n’ime ha. N’agbanyeghị ihe ụmụnna anyị diri n’oge ahụ, ha ka nwere okwukwe, olileanya, na ọṅụ.

Mgbe anyị na-echeta afọ iri ise anyị gbara akwụkwọ

Anyị akarịala afọ iri asatọ ugbu a. M so na Kọmitii Alaka dị n’Amerịka kemgbe afọ iri abụọ. Agaghị m mahadum. Ma, Jehova na nzukọ ya enyela m ọzụzụ kacha mma. O meela ka m ruo eruo ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl, nke ga-abara ha uru ruo mgbe ebighị ebi. (2 Kọr. 3:5; 2 Tim. 2:2) Ahụla m otú ihe Baịbụl kwuru sirila nyere ndị mmadụ aka ka ndụ ha ka mma, meekwa ka ha na Onye kere ha dịrị ná mma. (Jems 4:8) Mgbe ọ bụla o kwere anyị, mụ na Ruby nwunye m na-agba ndị ọzọ ume ka ha jiri ịmụ gbasara Jehova nakwa ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ndị dị na Baịbụl kpọrọ ihe. Ọ bụ ya bụ ihe ọma kachanụ nwere ike imere onye na-ejere Jehova ozi.