Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 39

Aha Gị Ọ̀ Dị “n’Akwụkwọ nke Ndụ”?

Aha Gị Ọ̀ Dị “n’Akwụkwọ nke Ndụ”?

E wee nọrọ n’ihu Jehova dee aha ndị na-atụ egwu ya n’akwụkwọ e dere aha ndị ọ ga-echeta.’​—MAL. 3:16.

ABỤ NKE 61 Ndịàmà Jehova, Gaanụ n’Ihu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Kemgbe ụwa, Jehova na-edeba aha ndị mmadụ “n’akwụkwọ nke ndụ” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)

1. Dị ka e kwuru na Malakaị 3:16, olee akwụkwọ Jehova na-ede ihe na ya kemgbe? Gịnịkwa ka ọ na-ede na ya?

 KEMGBE ọtụtụ puku afọ, e nwere otu akwụkwọ pụrụ iche Jehova na-ede ihe na ya. Ihe ọ na-ede na ya bụ aha ndị mmadụ, malite n’aha onye mbụ rubeere ya isi bụ́ Ebel. * (Luk 11:50, 51) Kemgbe ahụ, Jehova edenyela aha ndị ọzọ n’akwụkwọ ahụ. Aha ọtụtụ nde mmadụ dị na ya taa. Baịbụl kpọrọ akwụkwọ ahụ “akwụkwọ e dere aha ndị ọ ga-echeta,” “akwụkwọ nke ndụ,” na “akwụkwọ mpịakọta nke ndụ.” N’isiokwu a, anyị ga-akpọ ya “akwụkwọ nke ndụ.”​—Gụọ Malakaị 3:16; Mkpu. 3:5; 17:8.

2. Olee ndị a na-ede aha ha n’akwụkwọ nke ndụ, oleekwa otú anyị nwere ike isi eme ka e dee aha anyị na ya?

2 E dere aha ndị niile na-atụ egwu Chineke na ndị niile ji aha ya kpọrọ ihe n’akwụkwọ ahụ pụrụ iche. Ha nwere olileanya inweta ndụ ebighị ebi. Taa, anyị nwere ike ime ka e dee aha anyị n’akwụkwọ ahụ ma ọ bụrụ na anyị na Jehova adịrị n’ezigbo mma n’ihi àjà ahụ Ọkpara ya bụ́ Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Jọn 3:16, 36) Anyị niile chọrọ ka aha anyị dịrị n’akwụkwọ ahụ ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa.

3-4. (a) Ànyị ga-enweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na aha anyị dị ugbu a n’akwụkwọ nke ndụ? Kọwaa. (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya?

3 Ọ̀ pụtara na e denyehaala aha mmadụ n’akwụkwọ nke ndụ, e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara inweta ndụ ebighị ebi? Ihe Jehova gwara Mosis n’Ọpụpụ 32:33 ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Jehova sịrị: “Ọ bụ onye ọ bụla mehiere m ka m ga-ehichapụ aha ya n’akwụkwọ m.” Ihe ọ pụtara bụ na e nwere ike ihichapụ aha e dere n’akwụkwọ ahụ ka à ga-asị na Jehova na-eji pensụl edeba aha ndị ahụ. (Mkpu. 3:5) Anyị kwesịrị ịgba mbọ ka a ghara ihichapụ aha anyị n’akwụkwọ ahụ ruo mgbe a ga-ejizi ịnk dee ya.

4 Ihe a nwere ike ime ka anyị jụwa ajụjụ ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ndị e debara aha ha n’akwụkwọ nke ndụ na ndị a na-edebaghị aha ha na ya? Olee mgbe ndị aha ha dị n’akwụkwọ ahụ ga-enweta ndụ ebighị ebi? Gịnị ga-emekwanụ ndị a na-enyeghị ohere ịmụta gbasara Jehova tupu ha anwụọ? À ka nwere ike idenye aha ha n’akwụkwọ ahụ? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a nakwa n’isiokwu na-eso ya.

OLEE NDỊ AHA HA DỊ N’AKWỤKWỌ AHỤ?

5-6. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:3, olee ndị aha ha dị n’akwụkwọ nke ndụ? (b) Olee mgbe a ga-ede aha ha otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ?

5 Olee ndị aha ha dị n’akwụkwọ nke ndụ? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị kwuo gbasara ụdị ndị mmadụ ise. Aha ụfọdụ n’ime ndị a dị n’akwụkwọ nke ndụ, ma aha ụfọdụ adịghị na ya.

6 Ndị nke mbụ bụ ndị a họọrọ ka ha na Jizọs chịa n’eluigwe. Aha ha ọ̀ dị ugbu a n’akwụkwọ nke ndụ? Ee. Pọl onyeozi gwara ndị ya na ha ‘rụkọrọ ọrụ’ na Filipaị na aha ndị e tere mmanụ dị n’akwụkwọ nke ndụ, ya bụ, ndị a kpọrọ ka ha gaa soro Jizọs chịa. (Gụọ Ndị Filipaị 4:3.) Ma, ọ bụrụ na ha achọghị ka e hichapụ aha ha n’akwụkwọ ahụ, ha kwesịrị ịna-erubere Chineke isi. Ọ bụrụ na a kaa ha akara nke ikpeazụ, a ga-edebazi aha ha n’akwụkwọ ahụ otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ. Ọ ga-abụ tupu ha anwụọ ma ọ bụ tupu oké mkpagbu amalite.​—Mkpu. 7:3.

7. Olee ihe anyị na-aghọta ná Mkpughe 7:16, 17 gbasara mgbe a ga-ede aha oké ìgwè mmadụ so n’atụrụ ọzọ n’akwụkwọ nke ndụ otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ?

7 Ndị nke abụọ bụ oké ìgwè mmadụ so n’atụrụ ọzọ ahụ. È dere aha ha n’akwụkwọ nke ndụ ugbu a? Ee. Aha ha ọ̀ ga-adị na ya ma Amagedọn gachaa? Ee. (Mkpu. 7:14) Jizọs kwuru na ndị a, ndị dị ka atụrụ, “ga-enweta ndụ ebighị ebi.” (Mat. 25:46) Ma ndị gafere Amagedọn agaghị enweta ndụ ebighị ebi ozugbo. E nwere ike ịsị na a ka ji pensụl dee aha ha n’akwụkwọ nke ndụ. N’ime otu puku (1,000) afọ ahụ Jizọs ga-achị, ọ “ga-azụ ha dị ka atụrụ, dugakwa ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.” Ndị a ga-ede aha ha n’akwụkwọ nke ndụ otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ bụ ndị rubeere Jizọs isi, nakwa ndị Jehova kpebiri na ha rubeere ya isi.​—Gụọ Mkpughe 7:16, 17.

8. Olee ndị aha ha na-adịghị n’akwụkwọ nke ndụ? Gịnị ga-emekwa ha?

8 Ndị nke atọ bụ ndị bụ́ ewu, ndị a ga-ebibi n’Amagedọn. E deghị aha ha n’akwụkwọ nke ndụ. Jizọs sị na ha “ga-anwụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Mat. 25:46) Pọl si n’ike mmụọ nsọ gwa anyị na “a ga-ama ndị a ikpe. Ikpe a ga-ama ha bụ mbibi ebighị ebi a ga-ebibi ha.” (2 Tesa. 1:9; 2 Pita 2:9) Ọ bụkwa ihe a ga-eme ndị kpachaara anya na-emehie mmụọ nsọ kemgbe ụwa. A ga-ebibikwa ha mbibi ebighị ebi. Ha agaghị adị ndụ ebighị ebi. O dokwara anya na a gaghị akpọlite ha n’ọnwụ. (Mat. 12:32; Mak 3:28, 29; Hib. 6:4-6) Ka anyị kwuo gbasara ndị abụọ a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa.

NDỊ A GA-AKPỌLITE N’ỌNWỤ

9. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 24:15, olee ndị abụọ a ga-akpọlite n’ụwa, oleekwa ihe dị iche na ha abụọ?

9 Baịbụl kwuru gbasara ndị abụọ a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha enwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ha bụ “ndị ezi omume,” na “ndị ajọ omume.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15.) “Ndị ezi omume” ahụ bụ ndị ji obi ha niile fee Chineke mgbe ha dị ndụ. Ma, “ndị ajọ omume ahụ” bụ ndị na-efeghị Jehova mgbe ha dị ndụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ n’ime ha mere ihe ọjọọ. Ànyị ga-ekwuli na e dere aha ụzọ ndị abụọ a n’akwụkwọ nke ndụ ebe ọ bụ na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị leba ụzọ ndị abụọ a anya n’otu n’otu.

10. Gịnị mere a ga-eji kpọlite ndị ezi omume, oleekwa ihe ụfọdụ n’ime ha ga-abụ? (Kọwaakwa ihe e dere ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ nke gbara n’Ụlọ Nche a gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa.)

10 Ndị nke anọ bụ “ndị ezi omume.” Tupu ha anwụọ, aha ha dị n’akwụkwọ nke ndụ. È wepụrụ aha ha na ya mgbe ha nwụrụ? Mba. Ọ bụ n’ihi na ha ka “dị ndụ” n’anya Jehova. Jehova abụghị “Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, n’ihi na n’anya ya, ha niile dị ndụ.” (Luk 20:38) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na a kpọlite ndị ezi omume n’ọnwụ n’ụwa, aha ha ga-adị n’akwụkwọ nke ndụ. Ma a ga-edegodị ya otú a ga-ehichapụli ya. (Luk 14:14) Ụfọdụ n’ime ndị a a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-abụ “ndị isi n’ụwa niile.”​—Ọma 45:16.

11. Olee ihe e kwesịrị ịkụziri “ndị ajọ omume” tupu e denye aha ha n’akwụkwọ nke ndụ?

11 Ndị nke ise, bụ́ nke ikpeazụ, bụ “ndị ajọ omume.” Tupu ha anwụọ, ha erubereghị Chineke isi. O nwere ike ịbụ n’ihi na ha amaghị iwu Jehova. N’ihi ya, aha ha adịghị n’akwụkwọ nke ndụ. Ma, Jehova ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha nwee ohere ime ka e denye aha ha n’akwụkwọ nke ndụ. A ga-enyere ndị “ajọ omume” a ezigbo aka. N’oge ha dịburu ndụ, ụfọdụ n’ime ha mere ihe ndị jọgburu onwe ha. N’ihi ya, e kwesịrị ịkụziri ha otú ha ga-esi na-eme ihe Jehova chọrọ. Iji mee ya, Alaeze Jehova ga-ahazi ụdị nkụzi a na-akụzitụbeghị kemgbe ụwa malitere.

12. (a) Olee ndị ga-akụziri ndị ajọ omume ihe? (b) Olee ihe ga-eme ndị na-ekweghị eme ihe a na-akụziri ha?

12 Olee ndị ga-akụziri ndị ajọ omume a ihe? Ọ bụ oké ìgwè mmadụ na ndị ezi omume a kpọlitere n’ọnwụ. Ka e nwee ike idenye aha ndị ajọ omume a n’akwụkwọ nke ndụ, ha ga-eme ka ha na Jehova dịrị ná mma, ha enyefeekwa ya onwe ha. Jizọs na ndị e tere mmanụ ga-esi n’eluigwe na-eleru ndị ajọ omume a anya nke ọma ka ha mara otú ha si eme ihe ndị a na-akụziri ha. (Mkpu. 20:4) A ga-egbu onye ọ bụla na-ekweghị eme ihe ndị a na-akụziri ya, ọ bụrụgodị na ọ dị otu narị afọ. (Aịza. 65:20) Jehova na Jizọs na-enyocha obi. Ha agaghị ekwe ka onye ọ bụla mebie ihe n’ụwa ọhụrụ.​—Aịza. 11:9; 60:18; 65:25; Jọn 2:25.

MBILITE N’ỌNWỤ NKE NDỤ NA MBILITE N’ỌNWỤ NKE IKPE

13-14. (a) N’oge gara aga, olee otú anyị si ghọta ihe ahụ Jizọs kwuru na Jọn 5:29? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi gbasara ihe ahụ o kwuru?

13 Jizọs kwukwara gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta, ndị mere ezi ihe ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:28, 29, Baịbụl Nsọ​—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ) Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara?

14 N’oge gara aga, anyị ghọtara na ihe ahụ Jizọs kwuru bụ ihe ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-eme mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ, ya bụ, na ụfọdụ ndị ga-ebilite n’ọnwụ mewe ihe ọma, ụfọdụ ndị ebilite n’ọnwụ mewe ihe ọjọọ. Ma, ị̀ chọpụtara na Jizọs ekwughị na ndị ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-eme ihe ọma ma ọ bụ ga-eme ihe ọjọọ? Ihe o kwuru gosiri na ọ bụ ihe ha mere n’oge gara aga. O kwuru gbasara “ndị mere ezi ihe” na “ndị mere ajọ omume.” Ihe a gosiri na ọ bụ ihe ha mere tupu ha anwụọ. Ihe a doro anya n’ihi na o nweghị onye a ga-ekwe ka ọ na-eme ihe ọjọọ n’ụwa ọhụrụ. Ọ ga-abụrịrị na ihe ọjọọ ahụ bụ ihe ha mere tupu ha anwụọ. Gịnịzi ka ihe Jizọs kwuru gbasara “mbilite n’ọnwụ nke ndụ” na “mbilite n’ọnwụ nke ikpe” pụtara?

15. Olee ndị ga-enweta “mbilite n’ọnwụ nke ndụ,” n’ihi gịnịkwa?

15 Ndị ezi omume, bụ́ ndị mere ihe ọma tupu ha anwụọ, ga-enweta “mbilite n’ọnwụ nke ndụ” n’ihi na e deela aha ha n’akwụkwọ nke ndụ. Ihe ọ pụtara bụ na mbilite n’ọnwụ nke “ndị mere ezi ihe” e kwuru okwu ya na Jọn 5:29 bụkwa mbilite n’ọnwụ nke “ndị ezi omume” e kwuru okwu ya n’Ọrụ Ndịozi 24:15. Ihe a a kọwara dabara n’ihe e kwuru ná Ndị Rom 6:7. Ebe ahụ sịrị: “Onye nwụrụ anwụ enwerela onwe ya ná mmehie ya.” Mgbe ndị ezi omume ahụ nwụrụ, a kagburu mmehie ha mere. Ma Jehova ka na-echeta ihe ọma niile ha mere. (Hib. 6:10) Ndị ezi omume a a kpọlitere n’ọnwụ ka kwesịrị ịna-erubere Jehova isi ma ọ bụrụ na ha achọghị ka e hichapụ aha ha n’akwụkwọ nke ndụ.

16. Gịnị ka “mbilite n’ọnwụ nke ikpe” pụtara?

16 Gịnị ga-emekwanụ ndị bụ́ ndị ajọ omume tupu ha anwụọ? Ọ bụ eziokwu na a kagburu mmehie ha mgbe ha nwụrụ, ha efeghị Jehova mgbe ha dị ndụ. Aha ha adịghị n’akwụkwọ nke ndụ. N’ihi ya, mbilite n’ọnwụ nke “ndị mere ajọ omume” bụkwa mbilite n’ọnwụ nke “ndị ajọ omume” e kwuru okwu ya n’Ọrụ Ndịozi 24:15. Ha ga-enweta “mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” * Ihe ọ pụtara bụ na a ga-ele ndị ajọ omume ahụ ule. (Luk 22:30) Ka oge na-aga, Jizọs ga-ama ma hà ruru eru ka e deba aha ha n’akwụkwọ nke ndụ. Ọ bụru na ha ahapụ ihe ọjọọ ndị ahụ ma nyefee Jehova onwe ha, a ga-edenyezi aha ha n’akwụkwọ nke ndụ.

17-18. Olee ihe ndị niile a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa kwesịrị ime? Gịnị bụ “otú ha si kpaa àgwà” e kwuru okwu ya ná Mkpughe 20:12, 13?

17 Ndị niile a kpọlitere n’ọnwụ, ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume, kwesịrị irube isi n’iwu ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta ọhụrụ ndị a ga-emeghe n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị. Jọn onyeozi kọwara ihe ọ hụrụ n’ọhụụ. Ọ sịrị: “Ahụkwara m ndị nwụrụ anwụ, ma ndị ukwu ma ndị nta, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ. E meghekwara akwụkwọ mpịakọta dị iche iche. Ma e meghere akwụkwọ mpịakọta ọzọ. Ọ bụ akwụkwọ mpịakọta nke ndụ. E jikwa ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe otú ha si kpaa àgwà.”​—Mkpu. 20:12, 13.

18 Olee “àgwà” e kwuru okwu ya a ga-eji kpee ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ikpe? Ọ̀ ga-abụ ihe ha mere tupu ha anwụọ? Mba. Cheta na ha enwerela onwe ha ná mmehie ha mgbe ha nwụrụ. Ihe ọ pụtara bụ na “otú ha si kpaa àgwà” agaghị abụ ihe ha mere tupu ha anwụọ. Ọ ga-abụrịrị ihe ha mere mgbe a na-azụ ha n’ụwa ọhụrụ. Ndị rubedịịrị Chineke isi n’oge ochie, dị ka Noa, Samuel, na Devid, ga-amụta gbasara Jizọs Kraịst ma nwee okwukwe n’àjà ọ chụrụ. Ihe ndị ajọ omume ga-amụta ga-akarị nke ahụ.

19. Olee ihe a ga-emecha mee ndị na-ekweghị erubere Jehova isi n’oge ahụ?

19 Gịnị ga-emecha mee ndị na-ekweghị erubere Jehova isi n’oge ahụ? Mkpughe 20:15 kwuru, sị: ‘A tụbara onye ọ bụla a na-edeghị aha ya n’akwụkwọ nke ndụ n’ọdọ ọkụ ahụ.’ A ga-ebibi ha ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị hụ na e dere aha anyị n’akwụkwọ nke ndụ, nakwa na e hichapụghị ya.

Ebe otu nwanna so na-akụziri ndị mmadụ ihe n’ụwa ọhụrụ n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20)

20. Olee ọrụ magburu onwe ya a ga-arụ n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

20 Otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị ga-amagbu onwe ya. Ndị Chineke ga-akụziri ndị mmadụ ihe otú a na-akụzitụbeghị ya n’ụwa. Ma, ọ ga-abụkwa oge a ga-eji ele ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume ule. (Aịza. 26:9; Ọrụ 17:31) Olee otú a ga-esi kụzie ihe ahụ? Isiokwu na-eso nke a ga-enyere anyị aka ịghọta ya, meekwa ka obi dị anyị ụtọ maka nhazi a magburu onwe ya.

ABỤ NKE 147 Jehova Kwere Anyị Nkwa Ndụ Ebighị Ebi

^ Isiokwu a ga-akọwa ihe a gbanwere n’otú anyị sibu ghọta ihe Jizọs kwuru gbasara “mbilite n’ọnwụ nke ndụ” na “mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Ihe e dere n’ala ala peeji Jọn 5:28, 29.) Anyị ga-amụta ihe mbilite n’ọnwụ abụọ a pụtara na ndị ga-eso ná ndị a ga-akpọlite na nke ọ bụla n’ime ha.

^ Ọ malitere ide ihe n’akwụkwọ ahụ kemgbe “a tọrọ ntọala ụwa,” ya bụ, kemgbe a malitere ịmụta ndị a ga-eji àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ gbapụta. (Mat. 25:34; Mkpu. 17:8) N’ihi ya, ọ ga-abụ Ebel, bụ́ nwoke rubeere Jehova isi, bụ onye mbụ e dere aha ya n’akwụkwọ nke ndụ.

^ N’oge gara aga, anyị kwuru na “ikpe” ahụ e kwuru ebe a pụtara ịma ha ikpe ọnwụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na “ikpe” nwere ike ịpụta ịma mmadụ ikpe. Ma, n’amaokwu a, ọ dị ka ihe “ikpe” Jizọs kwuru pụtara bụ ileru mmadụ anya ma ọ bụ ile mmadụ ule. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu Grik kwukwara na ọ pụtara “ileru àgwà mmadụ anya.”