ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 39
Dịrị Nwayọọ Iji Gosi na Ị Dị Ike
“Ohu Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị iji nwayọọ na-emeso mmadụ niile ihe.”—2 TIM. 2:24.
ABỤ NKE 120 Dịrị Umeala n’Obi Ka Jizọs
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ihe e nwere ike ịjụ anyị gbasara ya n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ?
OLEE otú obi na-adị gị ma onye gị na ya na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ nwa klas gị jụọ gị gbasara ihe i kweere? Ụjọ ọ̀ na-atụwa gị? Ọ na-atụ ọtụtụ n’ime anyị. Ma, ihe onye ahụ jụrụ anyị nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe ọ na-eche ma ọ bụ ihe o kweere. Ọ ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe izi ya ozi ọma. Ma, mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịjụ anyị ajụjụ otú na-egosi na o kwetaghị ihe anyị kwuru ma ọ bụ na ọ chọrọ ka anyị na ya rụwa ụka. O kwesịghị iju anyị anya. A sị ka e kwuwe, a kọọrọ ụfọdụ n’ime ha ihe na-abụghị eziokwu gbasara ihe anyị kweere. (Ọrụ 28:22) Ihe ọzọ bụ na anyị bi ‘n’oge ikpeazụ,’ oge ọtụtụ ndị “na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla,” bụrụkwa “ndị tigbuo zọgbuo.—2 Tim. 3:1, 3.
2. Gịnị mere anyị ji achọ ịdị nwayọọ?
2 I nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú m ga-esi wetuo obi ma ọ bụ jiri olu ọma zaghachi mmadụ ma ọ chọọ ka anyị rụwa ụka gbasara ihe m kweere?’ Gịnị ga-enyere gị aka? Ọ bụ ịdị nwayọọ. Onye dị nwayọọ anaghị ewe iwe ngwa ngwa. Kama, ọ na-ejide onwe ya mgbe a kpasuru ya iwe ma ọ bụ mgbe ọ na-amaghị ihe ọ ga-aza. (Ilu 16:32) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị adị mfe mgbe niile ịdị nwayọọ. Gịnị ga-enyere gị aka ịmụta àgwà a? Olee otú i nwere ike isi jiri nwayọọ zaghachi mmadụ ma ọ bụrụ na ọ rụwa gị ụka banyere ihe i kweere. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ka ha mụta iji nwayọọ akọwara mmadụ ihe ha kweere? Ka anyị chọpụta.
OTÚ Ị GA-ESI MỤTA ỊDỊ NWAYỌỌ
3. Gịnị mere e nwere ike iji sị na onye dị nwayọọ dị ike, ọ bụghị onye na-adịghị ike? (2 Timoti 2:24, 25)
3 Ndị dị nwayọọ dị ike. Ha abụghị ndị na-adịghị ike. Ọ bụ onye dị ike ga-ewetu obi ala ma ihe sie ike. Ịdị nwayọọ bụ otu n’ime àgwà ndị so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) Mgbe ụfọdụ, a na-eji okwu Grik a sụgharịrị “ịdị nwayọọ” akọwa ịnyịnya ọhịa a zụrụ azụ. Were ya na ị na-ahụ ịnyịnya ọhịa malitere dịwa nwayọọ. N’agbanyeghị na ọ dị nwayọọ, ọ ka sikwara ezigbo ike. Ebe anyị bụ ụmụ mmadụ, olee otú anyị nwere ike isi mụta ịdị nwayọọ ma dịrịkwa ike? Anyị agaghị emeli ya n’onwe anyị. Otu ụzọ anyị ga-esi mụta ya bụ ikpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ịmụta àgwà a magburu onwe ya. E nweela ọtụtụ ndị mụtara ịdị nwayọọ. Ọtụtụ ụmụnna anyị ejirila nwayọọ zaghachi ndị na-agbalị ịkpasu ha iwe, ya emee ka ndị hụrụ ha lewe Ndịàmà Jehova anya ọma. (Gụọ 2 Timoti 2:24, 25.) Olee otú ị ga-esi mụta ịdị nwayọọ?
4. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta gbasara ịdị nwayọọ n’aka Aịzik?
4 Ọtụtụ ihe a kọrọ na Baịbụl gosiri na ịdị nwayọọ bụ àgwà dị ezigbo mkpa. Chegodị banyere Aịzik. Mgbe o bi n’obodo ndị Filistia bụ́ Gira, ndị agbata obi ya malitere imere ya anyaụfụ, kpochie olulu mmiri ndị ohu nna ya gwuru. Kama ịga zọwa ihe ruuru ya, Aịzik kpọọrọ ezinụlọ ya gaa n’ebe dị anya gwuo olulu mmiri ndị ọzọ. (Jen. 26:12-18) Ma, ndị Filistia bịakwara sị na mmiri dị n’ebe ahụ bụ nke ha. Ma, Aịzik mere ka udo dịrị. (Jen. 26:19-25) Gịnị nyeeere ya aka ịdị nwayọọ ma mgbe o yiri ka ndị ọzọ hà kpebisiri ike ịkpasu ya iwe? Ọ ga-abụrịrị na ọ hụrụ ihe nne na nna ya mere. Ọ mụtara otú Ebreham si mee ka ya na ndị ọzọ dịrị n’udo nakwa otú Sera si bụrụ ‘onye obi ruru ala na onye dị nwayọọ.’—1 Pita 3:4-6; Jen. 21:22-34.
5. Olee ihe atụ gosiri na ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwere ike ịkụziri ụmụ ha uru ịdị nwayọọ bara?
5 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst, ka obi sie unu ike na unu nwekwara ike ịkụziri ụmụ unu uru ịdị nwayọọ na-aba. Ka anyị kwuo gbasara Maxence dị afọ iri na asaa. Ọ na-ezute ndị iwe na-ewe ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ozi ọma. Nne na nna ya weturu obi kụziere ya otú ọ ga-esi mụta ịdị nwayọọ. Ha sịrị: “Maxence aghọtala ugbu a na ọ na-adị mfe mmadụ iwewe iwe ma ọ bụ iji iwe mebisịwa ihe ma a kpasuo ya iwe. Ma, onye dị ike na-ejide onwe ya.” Ọ dị mma na Maxence amụtala ịdị nwayọọ.
6. Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka ịna-adịkwu nwayọọ?
6 Olee ihe anyị nwere ike ime ma ndị ọzọ kpasuo anyị iwe, dị ka mgbe mmadụ na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara Chineke ma ọ bụ Baịbụl? Anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya nakwa amamihe ya ka anyị nwee ike iji nwayọọ zaghachi onye ahụ. Ọ bụrụkwanụ na anyị emechaa chọpụta na anyị emedaghị obi zaa onye ahụ otú anyị kwesịrị? Anyị nwere ike ikpe ekpere ọzọ gbasara ya, cheekwa gbasara otú anyị ga-esi mee nke ọma n’oge ọzọ. Jehova ga-enyezi anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ijide onwe anyị ma dịrị nwayọọ.
7. Olee otú ibu amaokwu Baịbụl ụfọdụ n’isi nwere ike isi nyere anyị aka ijide onwe anyị mgbe ihe siri ike? (Ilu 15:1, 18)
7 Amaokwu Baịbụl ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ikwu ihe na-adịghị mma ma a kpasuo anyị iwe. Mmụọ nsọ Chineke nwere ike inyere anyị aka icheta amaokwu Baịbụl ndị ahụ. (Jọn 14:26) Dị ka ihe atụ, ihe ndị e dere n’amaokwu ụfọdụ dị n’akwụkwọ Ilu nwere ike inyere anyị aka ịdị nwayọọ. (Gụọ Ilu 15:1, 18.) Akwụkwọ Ilu gosikwara ihe mere o ji dị ezigbo mma ka anyị na-ejide onwe anyị mgbe ihe siri ike.—Ilu 10:19; 17:27; 21:23; 25:15.
OTÚ NGHỌTA SI ENYERE ANYỊ AKA ỊDỊ NWAYỌỌ
8. Gịnị mere anyị kwesịrị iji chee gbasara ihe mere mmadụ ji rụwa anyị ụka banyere ihe anyị kweere?
8 Nghọta nwekwara ike inyere anyị aka. (Ilu 19:11) Onye nwere nghọta na-ejide onwe ya ma ndị ọzọ rụwa ya ụka n’ihe ndị o kweere. Ụfọdụ ndị jụọ anyị ajụjụ, ha anaghị agwa anyị ihe mere ha ji jụọ anyị ajụjụ ahụ. N’ihi ya, tupu anyị azaa, ọ dị mma ka anyị cheta na o nwere ike anyị amaghị ihe mere onye ahụ ji na-ajụ anyị ajụjụ ahụ.—Ilu 16:23.
9. Olee otú Gidiọn si gosi na o nwere nghọta nakwa na ọ dị nwayọọ mgbe ọ na-azaghachi ndị Ifrem?
9 Chegodị gbasara otú Gidiọn si zaghachi ndị Ifrem. Ha ji iwe jụọ ya ihe mere na ọ gwaghị ha ka ha soro ya gaa lụso ndị iro ndị Izrel agha. Gịnị mere ha ji na-ewe ụdị iwe ahụ? Ọ ga-abụ na ha chere na e mere ha ihe ọjọọ. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, Gidiọn gosiri na o nwere nghọta. Ọ gbalịrị ịghọta ihe mere ha ji ewe ụdị iwe ahụ, ma wetuo obi zaghachi ha. Baịbụl gwara anyị na otú o si zaa ha mere ka ‘obi jụrụ ha.—Ikpe 8:1-3.
10 Gịnị ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi zaghachi onye jụrụ anyị ajụjụ gbasara ihe anyị kweere? (1 Pita 3:15)
10 Ka e were ya na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe anyị jụrụ anyị ihe mere anyị ji na-eme ihe Baịbụl kwuru. Anyị kwesịrị iwetu obi kọwaara ya na anyị kwetara na ọ bụ ihe Baịbụl kwuru ga-akacha abara anyị uru. Ma, anyị ga-akwanyere ya ùgwù ma anyị kọwawa ya. (Gụọ 1 Pita 3:15.) N’ihi ya, kama iche na ihe mere o ji ajụ anyị ajụjụ ahụ bụ na ọ chọrọ ịkatọ anyị, ka anyị chee gbasara otú ajụjụ ahụ nwere ike isi mee ka anyị mata ihe dị ya n’obi. N’agbanyeghị ihe mere mmadụ ji jụọ anyị ajụjụ, anyị kwesịrị iji nwayọọ zaa ya. Otú anyị si zaa ya nwere ike ime ka o chebara ihe o kweere echiche. Ọ bụrụgodị na ọ kparịa anyị ma ọ bụ chọọ ịkwa anyị emo, ka anyị gbalịa jiri obiọma zaa ya.—Rom 12:17.
11-12. (a) Gịnị ka anyị nwere ike ichebara echiche tupu anyị azaa mmadụ ajụjụ siri ike ọ jụrụ anyị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.) (b) Mee ihe atụ gosiri otú ajụjụ mmadụ jụrụ nwere ike isi mee ka anyị na ya kparịta ụka nke ọma.
11 Onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ jụọ anyị ihe mere na anyị anaghị eme ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ, ihe anyị nwere ike ịjụ onwe anyị bụ: Ọ̀ ga-abụ na ọ na-eche na a naghị ekwe anyị kporie ndụ? Ka ọ̀ na-eche na ebe ọ bụ na anyị anaghị eme ememme ncheta ọmụmụ, na anyị na ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ agaghị adị ná mma? Anyị nwere ike ibu ụzọ jaa ya mma na ọ na-eche gbasara ndị ọrụ ibe ya ma mee ka obi sie ya ike na anyịnwa chọkwara ka anyị na ndị ọzọ dịrị ná mma. Ime otú ahụ nwere ike ime ka o wetuo obi gee anyị ntị ma anyị na ya na-ekwurịta ihe Baịbụl kwuru gbasara ncheta ọmụmụ.
12 Anyị nwekwara ike ime otú ahụ ma mmadụ jụọ anyị ajụjụ ndị ọzọ siri ike. Dị ka ihe atụ, nwa klas anyị nwere ike ikwu na Ndịàmà Jehova kwesịrị ịgbanwe ihe ha kweere gbasara mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya. Onye ahụ ọ̀ na-ekwu ya maka na ọ ghọtaghị ihe Ndịàmà Jehova kweere gbasara ụdị omume ahụ? Ka ọ̀ bụ na e nwere enyi ya ma ọ bụ onye ikwu ya na-eme ya? Ò chere na anyị kpọrọ ndị na-eme ya asị? Anyị nwere ike ime ka ọ ghọta na anyị hụrụ mmadụ niile n’anya nakwa na anyị kwetara na onye ọ bụla ga-eji aka ya ekpebi ihe ọ ga-eme. b (1 Pita 2:17) Anyị nweziri ike gwa ya ihe Baịbụl kwuru nakwa otú ime ihe ahụ si eme ka anyị na-enwekwu obi ụtọ.
13 Olee otú i nwere ike isi nyere onye na-akwa gị emo na i kweere na Chineke aka?
13 Mmadụ rụwa anyị ụka, anyị ekwesịghị iche ozugbo na anyị ma ihe o kweere. (Taị. 3:2) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwa akwụkwọ ibe gị kwuru na mmadụ ikweta na Chineke dị bụ ịda iberiibe. Ì kwesịrị iche ozugbo na o kwetara na ihe niile nọkatara dịrị ma ọ bụ na ọ ma ọtụtụ ihe gbasara ya? Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu ihe ọ nụrụ ndị ọzọ kwuru. Kama gị na ya ịbịa rụwa ụka ma ihe niile hà nọkatara dịrị, i nwere ike ịgwa ya ihe ga-eme ka o mechaa chebara isiokwu ahụ echiche. I nwere ike ịsị ya gaa na jw.org ka ọ hụ ihe ndị kwuru gbasara isiokwu ahụ. O nwere ike ka oge na-aga, ya adị njikere ka gị na ya kwurịta otu isiokwu ma ọ bụ vidio ọ hụrụ ebe ahụ. Ịkwanyere ya ùgwù mgbe ị na-aza ya nwere ike ime ka ọ chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl na-akụzi.
14 Olee otú Nwanna Niall si jiri ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet nyere nwa klas ha aka ịgbanwe ihe na-abụghị eziokwu o kweere banyere Ndịàmà Jehova?
14 Otu nwa okorobịa aha ya bụ Niall ji jw.org gosi na ihe ụfọdụ ndị na-ekwu gbasara Ndịàmà Jehova abụghị eziokwu. Ọ sịrị: “E nwere nwa klas anyị gwara m ugboro ugboro na ekwetaghị m ihe sayensị kwuru n’ihi na m tụkwasịrị akwụkwọ bụ́ akụkọ ifo obi kama ịmata nke bụ́ eziokwu.” Mgbe nwa klas ha ahụ na-ekweghị ka ọ kọwaa ihe o kweere, o gosiri ya jw.org, n’ebe e dere “Sayensị na Baịbụl.” Ka oge na-aga, Nwanna Niall ghọtara na o nwere ike ịbụ na nwa klas ha ahụ gụrụ ihe ndị dị n’ebe ahụ. Ọ dịzi njikere ka ha kwurịta otú ndụ si malite. Onye ị gwara okwu nwekwara ike ime ụdị ihe ahụ.
KWADEBE NDỊ EZINỤLỌ GỊ
15 Olee otú nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka iji nwayọọ zaghachi nwa klas ha na-arụ ha ụka gbasara ihe ha kweere?
15 Ndị nne na nna nwere ike ịkụziri ụmụ ha otú ha ga-esi wetuo obi zaghachi onye na-arụ ha ụka gbasara ihe ha kweere. (Jems 3:13) Ụfọdụ ndị nne na nna na-eji oge ofufe ezinụlọ ha enyere ụmụ ha aka ịmụgharị ihe ha ga-ekwu. Ha na ha na-amụ isiokwu ndị e nwere ike ịjụ ajụjụ gbasara ha n’ụlọ akwụkwọ, kwurịta ha, mụgharịakwa otú ha nwere ike isi zaghachi. Ha na-akụzikwara ụmụ ha otú ha ga-esi jiri olu ọma zaghachi onye ahụ—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ezinụlọ Gị Ịmụgharị Ihe Ha Ga-aza Nwere Ike Inyere Ha Aka.”
16-17. Olee otú ezinụlọ ịmụgharị ihe ha ga-aza ga-esi enyere ndị na-eto eto aka?
16 Iwepụta oge mụgharịa ya nwere ike inyere ndị na-eto eto aka ka obi sie ha ike gbasara ihe ha kweere, meekwa ka ha nwee ike ịkọwara ndị ọzọ ihe mere ha ji kwere ihe ha kweere. E nwere akwụkwọ ndị na-eto eto ga-eji edetu ihe n’isiokwu ndị na-agba ná “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” na jw.org. A kwadebere ya ka o mee ka obi sie ndị na-eto eto ike gbasara ihe ha kweere, meekwa ka ha mata ihe ha ga-aza ndị jụrụ ha ajụjụ. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ isiokwu ndị a n’ezinụlọ anyị, anyị niile nwere ike ịmụta otú anyị ga-esi wetuo obi, jiri olu ọma gwa ndị ọzọ ihe anyị kweere.
17 Otu nwa okorobịa aha ya bụ Matthew kwuru otú oge ha ji amụgharị ihe ha ga-aza ndị ọzọ si nyere ya aka. Ya na nne na nna ya na-ejikarị oge ofufe ezinụlọ ha eme nchọnchọ n’isiokwu ndị e nwere ike ikwu gbasara ha n’ụlọ akwụkwọ. Ọ sịrị: “Anyị na-eche gbasara ajụjụ ụmụ klas anyị nwere ike ịjụ, anyị ejirizie ihe anyị metara na nchọnchọ mụgharịa otú anyị ga-esi zaa onye ahụ. Mgbe ọ bụla m ghọtara nke ọma ihe mere m ji kwere ihe m kweere, obi na-esi m ike, ya adịkwara m mfe iji nwayọọ zaa ndị ọzọ.”
18 Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 4:6, gịnị ga-abara anyị uru?
18 N’eziokwu, ọ bụrụgodị na anyị akọwaa ihe nke ọma, ya edoo anya, ọ bụghị mmadụ niile ga-ekweta ihe anyị kwuru. Ma, ọ bụrụ na anyị adịrị akọ, jiri nwayọọ zaghachi, o nwere ike inye aka. (Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6.) Ịgwa mmadụ ihe anyị kweere nwere ike ịdị ka ịtụrụ ya bọl. Anyị nwere ike iji nwayọọ tụọrọ ya bọl ma ọ bụkwanụ tụsie ya ike. Ọ bụrụ na anyị ejiri nwayọọ tụọ ya, ọ ga-adịrị onye ahụ mfe ịghọta ya, anyị na ya atụrụkwa ya na-aga. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma anyị wetuo obi kọwaara ndị mmadụ ihe anyị kweere. Ha nwere ike ige anyị ntị, anyị na ha ekwurukwa na-aga. Ma, ọ bụrụ na ihe mmadụ chọrọ bụ naanị ka anyị na ya rụwa ụka ma ọ bụ ka ọ kwaa anyị emo, anyị na ya ekwesịghị ikwuru na-aga. (Ilu 26:4) Ọ bụghị mmadụ niile na-eme otú ahụ. Ọtụtụ ndị nwere ike ige anyị ntị.
19 Olee ihe kwesịrị ime ka anyị dịrị nwayọọ ma anyị na-agwa ndị ọzọ ihe anyị kweere?
19 N’eziokwu, e nwere ọtụtụ uru anyị ga-erite ma anyị mụta ịdị nwayọọ. Rịọ Jehova ka o nye gị ike ị ga-eji dịrị nwayọọ ma ị na-aza ndị jụrụ gị ajụjụ siri ike ma ọ bụ ndị na-akwa gị emo. Cheta na otú i si zaghachi mmadụ nwere ike ime ka ihe ndị gị na ya na-enweghị otu olu na ha ghara ime ka unu rụwa ụka. Otú i si adị nwayọọ ma na-akwanyere ndị ị na-azaghachi okwu ùgwù nwere ike ime ka ụfọdụ ndị gbanwee ihe ha chere gbasara anyị nakwa eziokwu Baịbụl. ‘Jikere mgbe niile ịza mmadụ ajụjụ’ gbasara ihe i kweere. ‘Meda obi ma ị zawa ya onye ahụ.’ (1 Pita 3:15) N’eziokwu, i nwere ike ịdị nwayọọ iji gosi na ị dị ike.
ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị
a Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi dịrị nwayọọ ma anyị na-agwa ndị ọzọ ihe anyị kweere, ma ha kpasuo anyị iwe, nakwa ma ha na-arụ anyị ụka.
b Ị chọọ ịhụ aro ndị ga-enyere gị aka, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke na Nwoke ma Ọ Bụ Nwaanyị na Nwaanyị Inwe Mmekọahụ,” nke gbara na Teta! Nke 4, 2016.
c I nwere ike ịhụ aro ndị ga-enyere gị aka na jw.org, n’isiokwu ndị dị n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” nakwa “Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Banyere Ndịàmà Jehova.”