ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 41
Ihe Anyị Ga-amụta n’Akwụkwọ Ozi Abụọ Pita Dere
“M chọrọ ịna-echetara unu ihe ndị a mgbe niile.”—2 PITA 1:12.
ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Obere oge tupu Pita onyeozi anwụọ, olee ihe Jehova mere ka o mee?
PITA onyeozi ji obi ya niile fee Jehova ruo ọtụtụ afọ. O so Jizọs kwusaa ozi ọma. Ọ bụ ya malitekwara ikwusara ndị na-abụghị ndị Juu ozi ọma, mechaakwa soro n’òtù na-achị isi. Mgbe ọ ma na oge ọ ga-anwụ eruwela, Jehova nyere ya ọrụ ọzọ ọ ga-arụ. N’ihe dị ka n’afọ 62 ruo n’afọ 64 Oge Ndị Kraịst, mmụọ nsọ mere ka o dee akwụkwọ ozi abụọ. Ha bụ Pita nke Mbụ na nke Abụọ. Pita kwuru na o nwere olileanya na akwụkwọ ozi abụọ a ga-enyere Ndị Kraịst aka ma ọ nwụchaa.—2 Pita 1:12-15.
2. Gịnị mere akwụkwọ ozi abụọ Pita dere ji daba adaba?
2 Oge Pita dere akwụkwọ ozi abụọ a bụ oge “ọnwụnwa dị iche iche bịaara” Ndị Kraịst ibe ya. (1 Pita 1:6) Ndị ọjọọ nọ na-agba mbọ ka ọgbakọ Ndị Kraịst nabata nkụzi ụgha na omume ọjọọ. (2 Pita 2:1, 2, 14) N’oge na-adịghị anya, Ndị Kraịst nọ na Jeruselem ga-ahụ “ọgwụgwụ ihe niile,” ya bụ, mgbe ndị agha Rom ga-ebibi obodo ahụ na ụlọ nsọ dị na ya. (1 Pita 4:7) O doro anya na akwụkwọ ozi ndị ahụ Pita dere nyeere Ndị Kraịst ndị ahụ aka ịma ihe ha ga-eme iji die ọnwụnwa ndị bịaara ha n’oge ahụ, kwadebekwa ha maka ọnwụnwa ndị ga-abịara ha n’ihu. b
3. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mụọ akwụkwọ ozi ndị ahụ Pita dere?
3 Jehova mere ka akwụkwọ ozi ndị ahụ Pita dere soro n’Okwu ya n’agbanyeghi na ọ bụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi ka o degaara ha. N’ihi ya, akwụkwọ ozi ndị ahụ nwere ike ịbara anyị uru taa. (Rom 15:4) Ụwa anyị bi na ya na-akwado omume na-adịghị ọcha. Nsogbu ndị na-abịara anyị nwekwara ike ime ka o siere anyị ike ife Jehova. Ihe ọzọ bụ na n’oge na-adịghị anya, e nwere nsogbu ga-abịara anyị karịrị nke bịaara ndị bi n’oge ndịozi Jizọs tupu e bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Anyị ga-ahụ ihe ụfọdụ dị mkpa Pita chetaara anyị n’akwụkwọ ozi ya abụọ ahụ. Ihe ndị ahụ o chetaara anyị ga-enyere anyị aka ịna-atụ anya ụbọchị Jehova, imeri egwu mmadụ, na ịhụ ụmụnna anyị n’anya nke ukwuu. Ụdị ihe ndị ahụ nwekwara ike inyere ndị okenye aka ịhụ otú ha ga-esi na-elekọta atụrụ Chineke nke ọma.
NA-ATỤ ANYA ỤBỌCHỊ JEHOVA
4. Dị ka e kwuru na 2 Pita 3:3, 4, olee ihe nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka?
4 Ndị juru n’ụwa a bụ ndị na-enweghị okwukwe n’amụma ndị e buru na Baịbụl. Ndị mmegide nwere ike ịkwa anyị emo n’ihi na anyị na-atụ anya ọgwụgwụ ụwa kemgbe ọtụtụ afọ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ gadịghị abịa. (Gụọ 2 Pita 3:3, 4.) Ọ bụrụ na onye anyị gara izi ozi ọma, onye ọrụ ibe anyị, ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị ekwuo ụdị ihe a, o nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka. Pita kwuru ihe ga-enyere anyị aka.
5. Olee ihe ga-enyere anyị aka inwe ndidi ma chere ụbọchị Jehova? (2 Pita 3:8, 9)
5 O nwere ike ịdị ụfọdụ ndị ka Jehova ọ̀ na-egbu oge ibibi ụwa ochie a. Ihe Pita kwuru nwere ike inyere anyị aka n’ihi na o chetaara anyị na otú Jehova si agụ oge dị ezigbo iche n’otú ụmụ mmadụ si agụ. (Gụọ 2 Pita 3:8, 9.) N’anya Jehova, otu puku afọ dị ka otu ụbọchị. Jehova na-enwe ndidi. Ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla. N’agbanyeghị ya, ọ ga-ebibi ụwa ochie a mgbe oge ya ruru. Ọ bụ ihe ọma meere anyị na Jehova nyere anyị ohere iso kwusaara ndị mba niile gbasara ya tupu ọgwụgwụ abịa.
6. Olee otú anyị ga-esi “na-echere ụbọchị Jehova, burukwa ya n’uche”? (2 Pita 3:11, 12)
6 Pita gbara anyị ume ka anyị “na-echere ụbọchị Jehova, burukwa ya n’uche.” (Gụọ 2 Pita 3:11, 12.) Olee otú anyị ga-esi eme ya? Anyị ga-agbalị na-atụgharị uche n’ihe ndị magburu onwe ha ga-emere anyị n’ụwa ọhụrụ. Anyị ga na-eme ya kwa ụbọchị ma o kwe omume. Na-ahụ onwe gị ka ị na-ekuru ikuku ọma, na-eri nri na-edozi ahụ́, na-anabata ndị gị nwụrụ anwụ a kpọlitere n’ọnwụ, na-akụzikwara ndị biri ndụ ọtụtụ narị afọ gara aga otú amụma Baịbụl si mezuo. Ịtụgharị uche n’ihe ndị a ga-enyere gị aka ịna-atụsi anya oge ahụ ike, meekwa ka obi sie gị ike na ọgwụgwụ ji ọsọ na-abịa. ‘Ebe anyị matarala ihe ndị a’ ga-eme n’ọdịnihu, anyị agaghị ekwe ka ndị nkụzi ụgha ‘dufuo anyị.’—2 Pita 3:17.
KWỤSỊ ỊTỤ ỤJỌ MMADỤ
7. Gịnị ka egwu mmadụ nwere ike ime anyị?
7 Ebe ọ bụ na anyị ma na ụbọchị Jehova ga-abịa n’oge na-adịghị anya, anyị chọrọ ime ike anyị niile ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ma o nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. N’ihi gịnị? Ọ bụ maka na ụjọ mmadụ nwere ike ịtụtụ anyị. Ụdị ihe ahụ mere Pita. N’abalị e kpere Jizọs ikpe, ụjọ ekweghị Pita kwuo na ya bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ọ gọnahụkwara Jizọs ugboro ugboro. (Mat. 26:69-75) Ma onyeozi ahụ mechara jiri obi ike kwuo, sị: “Ka ihe na-atụ ndị ọzọ egwu ghara ịtụ unu egwu, obi amapụkwala unu.” (1 Pita 3:14) Ihe a Pita kwuru na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-akwụsịli ịtụ ụjọ mmadụ.
8. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ egwu mmadụ? (1 Pita 3:15)
8 Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ mmadụ? Pita gwara anyị, sị: “Jirinụ obi unu kweta na Kraịst bụ Onyenwe anyị nakwa na ọ dị nsọ.” (Gụọ 1 Pita 3:15.) Anyị nwere ike ichetara onwe anyị na Jizọs Kraịst bụ Eze anyị nakwa na o nwere ike dị egwu. Ọ bụrụ na ụjọ atụwa gị mgbe ohere dapụtaara gị izi ndị mmadụ ozi ọma, cheta Eze anyị. Were ya na ị na-ahụ ya ebe ọ nọ n’ocheeze ya n’eluigwe, ndị mmụọ ozi a na-enweghị ike ịgụta ọnụ agbaa ya gburugburu. Cheta na o nwere “ike niile n’eluigwe na n’elu ụwa” nakwa na ọ ‘ga-anọnyekwara anyị ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.’ (Mat. 28:18-20) Pita gbara anyị ume ka anyị ‘jikere mgbe niile’ ịgwa ndị ọzọ ihe anyị kweere. Ị̀ ga-achọ izi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ị na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ? Buru ụzọ chee gbasara ohere nwere ike ịdapụtara gị izi ndị mmadụ ozi ọma, gị akwadebezie ihe ị ga-ekwu. Kpee ekpere ka Chineke mee ka ị kata obi. Ka obi siekwa gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ mmadụ.—Ọrụ 4:29.
‘JIRINỤ OBI UNU NIILE HỤ IBE UNU N’ANYA’
9. N’otu oge, olee otú Pita si ghara igosi na ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
9 Pita mụtara otú e si ahụ ndị ọzọ n’anya. Ọ nọ ya mgbe Jizọs sịrị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu hụ ibe unu n’anya. Otú m hụrụ unu n’anya, hụnụ ibe unu n’anya otú ahụ.” (Jọn 13:34) N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere mgbe Pita jụrụ iso Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu eri ihe n’ihi egwu mmadụ. Pọl onyeozi kpọrọ ihe a Pita mere ‘ime ihu abụọ.’ (Gal. 2:11-14) Pita nabatara ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ya, mụtakwa ihe na ya. N’akwụkwọ ozi abụọ o dere, o kwuru na ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịhụ ụmụnna anyị n’anya n’obi anyị, kamakwa na anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ ha n’anya.
10 Gịnị ga-enyere anyị aka ‘ịhụ ụmụnna anyị n’anya ka ụmụnne’? (1 Pita 1:22)
10 Pita sịrị na anyị kwesịrị ‘ịhụ ibe anyị n’anya ka ụmụnne.’ (Gụọ 1 Pita 1:22.) Ihe ga-eme ka anyị si otú ahụ hụ ha n’anya bụ ‘otú anyị si na-eme ihe okwu Chineke bụ́ eziokwu kwuru.’ Ihe so n’eziokwu a bụ ihe Baịbụl kụziiri anyị na “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ 10:34, 35) Anyị agaghị edebeli iwu Jizọs nyere anyị ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya ma ọ bụrụ na anyị ahụ ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ n’anya ma hapụ ndị ọzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na ụfọdụ ndị nwere ike ịdị ná mma karịa ndị ọzọ, otú ahụ Jizọs mere. (Jọn 13:23; 20:2) Ma, Pita chetaara anyị na anyị kwesịrị ịgbalị ‘hụ ụmụnna niile n’anya,’ ya bụ, ịhụ ha n’anya ka ndị ezinụlọ anyị.—1 Pita 2:17.
11 Gịnị ka ‘iji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya’ pụtara?
11 Pita gbara anyị ume, sị: “Jirikwanụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya.” N’amaokwu ahụ, ‘iji obi anyị niile’ hụ mmadụ n’anya pụtara na anyị ga-ahụ ya n’anya ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na e nwere otú nwanna si mejọọ anyị ma ọ bụ mee ihe wutere anyị? O nwere ike ịdị anyị ka anyị megwara ya ihe ahụ o mere anyị kama igosi ya ịhụnanya. Ma, Pita si n’aka Jizọs mụta na mmadụ imegwara ihe e mere ya anaghị amasị Chineke. (Jọn 18:10, 11) Pita dere, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ, unu ejikwala mkparị akwụ ụgwọ mkparị. Kama, na-agọzinụ ndị mmadụ.” (1 Pita 3:9) Kwe ka ịhụnanya si n’obi mee ka ị dịrị obiọma, na-echebara ndị ọzọ echiche ọ bụrụgodị na ha mere ihe wutere gị.
12 (a) Olee ihe ọzọ ‘iji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya’ ga-eme ka anyị mee? (b) N’ihi ihe e kwuru na vidio bụ́ Gbaa Mbọ Mee Ka Gị na Ụmụnna Gị Na-adị n’Udo, gịnị ka i kpebiri ịgba mbọ mee?
12 N’akwụkwọ ozi mbụ Pita dere, o kwuru na ‘iji obi anyị niile hụ ibe anyị n’anya’ ga-eme ka anyị gbaghara ihe ọjọọ niile ha mere anyị, ọ bụghị ụfọdụ n’ime ha. (1 Pita 4:8) O nwere ike ịbụ na Pita chetara ihe Jizọs kụziiri ya ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ gbasara ịgbaghara mmadụ. Ọ ga-abụ na Pita chere na ya bụ ezigbo mmadụ mgbe o kwuru na ọ ga-agbaghara nwanna ya ruo “ugboro asaa.” Ma, Jizọs kụziiri ya, kụziekwara anyị ka anyị na-agbaghara ruo “ugboro iri asaa na asaa,” nke pụtara ka anyị ghara ịkwụsị ịgbaghara. (Mat. 18:21, 22) Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ime ihe a, adala mbà. A na-enwe mgbe ọ na-esiri ndị ohu Jehova niile na-ezughị okè ike ịgbaghara ndị mejọrọ ha. Ihe dị mkpa ugbu a bụ ka i mee ike gị niile ịgbaghara nwanna gị ma mee ka gị na ya dịrị n’udo. c
NDỊ OKENYE, NA-AZỤNỤ ATỤRỤ JEHOVA
13 Olee ihe nwere ike ime ka o siere ndị okenye ike iwepụta oge na-agba ụmụnna ha ume?
13 O doro anya na Pita echefughị ihe Jizọs gwara ya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Ọ sịrị ya: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” (Jọn 21:16) Ọ bụrụ na ị bụ okenye, ị ma na ihe a a gwara Pita gbasakwara gịnwa. Ma o nwere ike isiri okenye ike inwe ohere ịrụ ọrụ a dị ezigbo mkpa. Ndị okenye kwesịrị ibu ụzọ gbooro ndị ezinụlọ ha mkpa ha, hụkwa na obi ruru onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ha ala, nakwa na ha na Jehova dị ná mma. Ha kwesịkwara ibute ụzọ n’ikwusa ozi ọma, kwadokwa ma mee ihe omume ndị ha nwere n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha so na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ma ọ bụkwanụ ha na Ndị Na-ahụ Maka Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ana-arụkọ ọrụ. Ndị okenye na-ejikarị ọrụ n’aka.
14 Gịnị ga-eme ka ndị okenye chọọ ịna-azụ atụrụ Chineke? (1 Pita 5:1-4)
14 Pita gwara ndị okenye ibe ya, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke.” (Gụọ 1 Pita 5:1-4.) Ọ bụrụ na ị bụ okenye, anyị ma na ị hụrụ ụmụnna gị n’anya nakwa na ị chọrọ ịna-elekọta ha. Ma mgbe ụfọdụ, i nwere ike iche na ị gaghị arụli ọrụ ahụ n’ihi na i nweghị ohere ma ọ bụ na ike gwụchara gị. Gịnị ka i nwere ike ime? Kọọrọ Jehova otú ọ dị gị n’obi. Pita dere, sị: “Onye na-ejere ndị ọzọ ozi, ya jiri ike Chineke na-eje ya.” (1 Pita 4:11) Ụfọdụ nsogbu nwere ike ịbịara ụmụnna gị agaghị enwe ngwọta n’ụwa ochie a. Ma cheta na Jizọs Kraịst, bụ́ “onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ,” nwere ike inyere ha aka karịa gịnwa. O nwere ike inyere ha aka ma ugbu a ma n’ụwa ọhụrụ. Ihe Jehova chọrọ ka ndị okenye mee bụ ka ha hụ ụmụnna ha n’anya, na-azụ ha, ‘na-akpakwa àgwà ìgwè atụrụ Chineke ga na-eṅomi.’
15 Olee otú otu okenye si azụ atụrụ Chineke? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
15 Otu nwanna aha ya bụ William bụ okenye kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ ghọtara na ọ dị mkpa ka ndị okenye na-azụ atụrụ Jehova. Mgbe ọrịa koronavaịrọs malitere, ihe kacha ya na ndị okenye ibe ya mkpa bụ ka onye nke ọ bụla n’ime ha na-akpọtụrụ ndị nọ n’ìgwè ya n’izu ọ bụla. O kwuru ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ụmụnna anyị nọ n’ụlọ ha naanị ha na-echegbu onwe ha. Ihe a nwekwara ike ime ka ọ dị mfe echiche ọjọọ ịbata ha n’obi.” Nwanna nwee nsogbu, Nwanna William na-ege ya ntị nke ọma iji mata ihe ndị na-echegbu ya nakwa ihe ndị dị ya mkpa. Ọ na-agbalị chọta akwụkwọ ma ọ bụ vidio ndị dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ọ ga-eji gbaa nwanna ahụ ume. Ọ sịrị: “Ilekọta atụrụ Chineke dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Anyị na-agba ezigbo mbọ inyere ndị mmadụ aka ịmụta gbasara Jehova. Anyị kwesịkwara ịgbasi mbọ ike otú ahụ inyere atụrụ Jehova aka ka ha nọsie ike n’eziokwu.”
KWE KA JEHOVA ZỤRUO GỊ N’ISI
16 Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi eme ihe anyị mụtara n’akwụkwọ ozi abụọ ahụ Pita dere?
16 Ihe anyị tụlerela bụ naanị ihe ole na ole anyị mụtara n’akwụkwọ ozi abụọ Pita si n’ike mmụọ nsọ dee. Ọ ga-abụ na ị chọpụtala ihe ị ga-achọ imekwu nke ọma na ya. Dị ka ihe atụ, ì nwere ike ịtụgharịkwu uche ná ngọzi ndị ga-abịa n’ụwa ọhụrụ? Ì kpebiela ịna-ekwusa ozi ọma n’ebe ị na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ? Ị̀ hụla ụzọ ndị i nwere ike isi gosikwuo ụmụnna gị na ị hụrụ ha n’anya? Ndị okenye, ùnu ekpebiela iji obi unu niile na-azụ atụrụ Jehova, ya ana-anụkwa unu ọkụ n’obi? Ịgwa onwe gị eziokwu nwere ike ime ka ị chọpụta na e nwere ebe ndị ị na-anaghị emetacha. Mana, adala mbà. “Onyenwe anyị dị obiọma,” ọ ga-enyekwara gị aka imekwu nke ọma. (1 Pita 2:3) Pita mesiri anyị obi ike mgbe o kwuru, sị: “Chineke . . . ga-azụru unu n’isi. Ọ ga-eme ka unu kwụsie ike. Ọ ga-eme ka unu sie ike, meekwa ka unu kwụrụ chịm.—1 Pita 5:10.
17 Ọ bụrụ na anyị anọsie ike n’ozi Jehova ma kwe ka Jehova zụọ anyị, olee uru ọ ga-abara anyị?
17 E nwere mgbe Pita chere na ya erughị eru ịnọ n’ihu Ọkpara Chineke. (Luk 5:8) Mana, Jehova na Jizọs nyeere ya aka n’ihi na ha hụrụ ya n’anya, ya emee ka ọ nọsie ike na-eso ụzọ Jizọs. Ihe a mere ka Jehova kwe ka Pita nwee ike ‘ịbanye n’Alaeze ga-adịru ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.’ (2 Pita 1:11) Ihe a bụ ngọzi na-enweghị atụ. Ọ bụrụ na gịnwa anọsie ike n’ozi Jehova otú ahụ Pita mere, ma kwe ka Jehova zụọ gị, ọ ga-enye gị ndụ ebighị ebi. ‘Okwukwe gị ga-eme ka a zọpụta gị.—1 Pita 1:9.
ABỤ NKE 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya
a N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú ihe ndị anyị ga-amụta n’akwụkwọ ozi ndị Pita dere ga-esi nyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Isiokwu a ga-enyekwara ndị okenye aka ịhụ otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha nke ọma ebe ha na-azụ atụrụ Chineke.
b Ọ ga-abụ na Ndị Kraịst bi na Palestaịn nwetara akwụkwọ ozi abụọ a Pita dere tupu ndị Rom alụso Jeruselem agha nke mbụ ya n’afọ 66 Oge Ndị Kraịst.
c Gaa na jw.org lee vidio bụ́ Gbaa Mbọ Mee Ka Gị na Ụmụnna Gị Na-adị n’Udo.